A A A A A

Mgbakwunye: [Ogbugbu]


1 KỌRINT 6:18-20
[18] Ọ bụ nꞌihi nke a ka m ji na-agwa unu sị, gbaaranụ mmehie ịkwa iko ọsọ. Ọ dịghị mmehie ọzọ na-emekụta anụ ahụ mmadụ dị ka mmehie ịkwa iko. Ọ bụ mmehie mmadụ na-eme megide anụ ahụ ya.[19] Ọ bụ na unu amataghị na ahụ unu bụ ụlọ obibi nke Mmụọ Nsọ ahụ Chineke nyere unu, Onye bi nꞌime unu? Anụ ahụ unu abụkwaghị nke unu onwe unu, kama unu bụ nke Chineke.[20] Chineke jikwa ihe dị oke ọnụ ahịa zụpụta unu. Ya mere jirinụ anụ ahụ unu nye Chineke otuto.

NKPUGHE 19:16
Otu aha ka e dere nꞌelu uwe ya na nꞌelu apata ya. Ọ bụ, Eze ndị eze nile, na Onyenwe ndị nwe mmadụ nile.

1 KỌRINT 10:23-31
[23] Ọ bụ ezie na anyị nwere ike ime ihe nile, dị ka iri nri e ji chụọra arụsị aja, ma ọ bụghị ihe nile dị mma omume. Anyị nwekwara ike ime ihe nile, ma ọ bụghị ihe nile nwere ike inyere anyị aka.[24] Ka anyị hapụ ịchọ ọdịmma nke anyị nanị, kama anyị ga na-achọ ọdịmma nke ndị ọzọ, ime ihe ga-enyere ha aka.[25] Nke a bụ ihe i kwesịrị ime. Ọ bụrụ na ị gaa ahịa, zụrụ ụdị anụ ọ bụla ị chọrọ nke a na-ere nꞌahịa, ajụla ajụjụ ọ bụla ịmata ma e ji ya chụọra arụsị aja ma ọ dịghị, nꞌihi na ọsịsa ị ga-anata pụrụ iwute mmụọ gị.[26] Nꞌihi na akwụkwọ nsọ kwuru sị, “Ụwa nile na ihe ọma nile dị nꞌime ya bụ nke Chineke. Ọ dịkwara anyị iji ha ime onwe anyị obi ụtọ.”[27] Ọ bụrụ na onye na-ekweghị ekwe akpọọ gị, sị gị bịa nꞌụlọ ya, gaa, riekwa nri ọ bụla e nyere gị na-ajụghị ajụjụ. Nꞌihi na ọsịsa ya pụrụ imerụ mmụọ gị.[28] Ma ọ bụrụ na e nwee onye gwara gị sị, “E jikwa anụ a chụọra arụsị aja” erila ya, nꞌihi nwoke ahụ gwara gị na e ji ya chụọ aja, na nꞌihi na ọ ga-ewute mmụọ ya ma i rie ya.[29] Nꞌoge a ihe dị mkpa abụghị ihe i chere banyere anụ ahụ, kama ihe dị mkpa bụ ime ka mmụọ nwoke ahụ gwara gị na e ji ya chụọra arụsị aja hapụ ịda mba. I nwere ike ịjụ ajụjụ sị, “Gịnị mere m ga-eji hapụ ime ihe ọ bụla nꞌihi na ọ ga-ewute mmụọ onye ọzọ?[30] Ọ bụrụ na m nwere ike kelee Chineke ekele nꞌihi ya, were nri m rie, olee otu o si gbasa onye bịara ịjụ m ọnụ?”[31] Ka m gwa gị ihe mere o ji dị mkpa. I kwesịrị ime ihe ọ bụla ị na-eme, ma ọ bụ iri nri ma ọ bụ ịṅụ ihe ọṅụṅụ, i kwesịrị ime ihe nile nꞌụzọ ọ ga-esi wetara Chineke otuto.

EFESỌS 5:10
Gbalịanụ mgbe nile ịchọpụta na ịmụta ihe na-atọ Chineke ụtọ.

1 KỌRINT 3:16-17
[16] Ọ bụ na unu aghọtaghị na unu bụ ụlọ nsọ Chineke. Ọ̀ bụ na unu aghọtakwaghị na Mmụọ Nsọ Chineke bi nꞌime unu?[17] Ọ bụrụ na onye ọ bụla emebie ụlọ nsọ Chineke, Chineke ga-emibikwa onye ahụ. Nꞌihi na ụlọ Chineke bụ ụlọ dị nsọ, unu bụkwa ụlọ ahụ.

1 KỌRINT 9:27
Dị ka ọgba ọsọ, ana m azụ ahụ m, na-enye ya ahụhụ, na-azụ ya ka ọ na-eme ihe kwesịrị ekwesị, ọ bụghị ihe ọ chọrọ ime. Nꞌihi na achọghị m ka ọ bụrụ na mgbe m gbalịsịrị ike mee ka ọtụtụ mmadụ bụrụ ndị na-eso nꞌọsọ a, mụ onwe m a bụrụ onye a jụrụ ajụ, nke na-agaghị enweta ihe a na-agbata nꞌọsọ.

ROM 12:1
Ya mere ụmụnna m, ana m agbakwasị ụkwụ nꞌobi ebere Chineke gosiri unu na-arịọ unu arịrịọ na-asị unu, cheenụ onwe unu nꞌihu Chineke dị ka aja dị ndụ, nke ndị nsọ, na nke na-atọ ya ụtọ. Nꞌihi na nke a bụ ofufe nke ime mmụọ ọ chọrọ site nꞌaka unu.

Igbo Bible 1988
No Data