A A A A A

Mgbakwunye: [Talent]


EFESỌS 2:10
Ọ bụ Chineke mere anyị ihe anyị bụ! O kere anyị ọhụrụ nꞌime Kraịst Jisọs ka anyị nwee ike ịrụ ọrụ ọma. Nꞌihi na ọ bụ otu a ka o siri kwadoo na anyị kwesịrị ibi ndụ ụbọchị nile.

JEMES 1:17
Onyinye ọ bụla dị mma, na nke zuru oke na-esite nꞌeluigwe abịa. Ọ na-esite nꞌebe Chineke dị ukwuu nke eluigwe, onye kere ihe nile na-abịa. Chineke enweghị oge ọ na-agbanwe, nꞌihi na ọ dịghị ka onyinyo mmadụ nke na-agbanwe agbanwe.

1 KỌRINT 12:5-6
[5] Anyị na-esite nꞌụzọ dị iche iche na-efe Chineke, ma ọ bụ nanị otu Chineke ahụ ka anyị na-efe.[6] E nwere ụzọ dị iche iche Chineke si arụ ọrụ nꞌime anyị, ma ọ bụkwa otu Chineke ahụ na-arụ ihe ndị a nile nꞌime mmadụ nile.

1 PITA 4:10-11
[10] Ka onye ọ bụla jiri onyinye pụrụ iche Chineke nyere ya na-enyere ndị ọzọ aka. Bụrụnụ ndị ji onyinye dị iche iche Chineke nyere unu na-achịzi ezinụlọ Kraịst nke ọma.[11] Ọ bụrụ na Chineke nyere gị onyinye izisa ozi ọma na-ezisa ya dị ka a ga-asị na Chineke si nꞌọnụ gị na-ekwu okwu. Ọ bụrụ na ị bụ onye na-enyere ndị ọzọ aka, were ike ahụ nile Chineke nyere gị mee ya. Ka e site nꞌime ihe nile nye Chineke otuto site nꞌaha Jisọs Kraịst Onyenwe ike na otuto ruo mgbe nile ebighị ebi. Amin.

MATIU 5:14-16
[14] Unu bụ ìhè nke ụwa. Unu dị ka obodo e wuru nꞌelu ugwu nke a na-apụghị izo ezo.[15] Ndị mmadụ adịghị amụnye iheọkụ dọnye ya nꞌokpuru igbe, kama a na-adọkwasị ya nꞌelu ihe ịdọba iheọkụ, ka o nye ndị nile nọ nꞌụlọ ahụ ìhè.[16] Ya mere, unu ezokwala ìhè unu. Kwerenụ ka ìhè unu nwuore mmadụ nile, ka ndị mmadụ hụ ọrụ ọma unu, tookwa Nna unu bi nꞌeluigwe.

MATIU 6:1-4
[1] “Unu arụla ọrụ ọma unu nꞌebe ndị mmadụ ga-ahụ unu malite ito unu. Nꞌihi na unu mee nke a, unu agaghị enweta ụgwọ ọrụ ọ bụla site nꞌaka Nna unu bi nꞌeluigwe.[2] Unu afụla opi mgbe unu na-enye ndị ogbenye onyinye, nꞌihi na otu a ka ndị ihu abụọ na-eme. Ha na-achọ ka ndị mmadụ too ha.[3] Mgbe unu chọrọ ịrụ ọrụ ebere, mmenụ ya na nzuzo. Ekwela ka aka ekpe gị mata ihe aka nri gị na-achọ ime.[4] Chineke bụ Nna gị, onye maara ihe nzuzo nile, ga-akwụghachi gị ụgwọ zuru ezu.

ROM 12:3-8
[3] Dị ka onyinye amara Chineke nyere m si dị, ana m adọ onye ọ bụla nꞌime unu aka na ntị sị, Unu atụkwasịla uche nꞌechiche banyere onwe unu karịa ka o si kwesị. Kama jirinụ obi dị umeala lee onwe unu anya dị ka okwukwe Chineke nyere unu ha.[4] Dị ka anyị nile nꞌotu nꞌotu si nwee anụ ahụ nke nwere akụkụ dị iche iche, bụ akụkụ ndị na-arụ ọrụ dị iche iche,[5] otu a ka ọ dịkwa nꞌanụ ahụ Kraịst. Ọ bụ ezie na anyị dị ọtụtụ, ma anyị nile bụ otu anu ahụ e jikọtara ya na Kraịst. E sikwa otu a jikọtaa anyị nile nꞌotu nꞌotu, dị ka akụkụ dị iche iche nke dị nꞌotu anụ ahụ.[6] Anyị nwere onyinye dị iche iche nke e sitere nꞌamara nye anyị. Ọ bụrụ na onyinye gị bụ onyinye ibu amụma, buo amụma dị ka okwukwe i nwere ha.[7] Ọ bụrụ na onyinye Chineke nyere gị bụ ijere ndị ọzọ ozi, mee ya, mezie ya emezie. Ọ bụrụkwa na onyinye nke gị bụ izi ihe, were obi dị umeala zie ha.[8] Onyinye gị bụrụ ịgba ndị mmadụ ume site nꞌikwusa okwu Chineke, biko mee ya nꞌụzọ ndị ọzọ gaesi nata inyeaka. Ọ bụrụkwanụ na onyinye gị bụ inye ndị nọ na mkpa ụfọdụ nꞌime ihe i nwere, gbasapụ aka nye ha. Ọ bụrụ na i nwere onyinye ịbụ onyendu, kpachapụ anya duzie ndị i na-edu. Ka ndị Chineke nwere onyinye inwe obi ebere nꞌebe ndị mmadụ nọ, jiri obi ọcha zipụta onyinye ha.

1 KỌRINT 12:1-11
[1] Ugbu a ụmụnna m, ka anyị gafee nꞌokwu gbasara onyinye dị iche iche Mmụọ Nsọ na-enye. Aga m akọwa ya nꞌụzọ ọ ga-esi doo unu nile anya.[2] Unu ga-echeta na tupuu unu abụrụ ndị na-eso ụzọ Kraịst unu bụ rị ndị na-eso arụsị nke na-adịghị ekwu okwu ọ bụla.[3] Ugbu a e nwere ọtụtụ ndị na-asị na Mmụọ Nsọ Chineke si nꞌọnụ ha na-ekwu okwu. Ùnu ga-esi aṅaa mata na ọ bụ Chineke si nꞌọnụ ha ekwu okwu nꞌezie? O nweghị onye ọ bụla pụrụ ịkpọku aha Jisọs sị, “Jisọs bụ Onyenwe m” ma ọ bụghị site nꞌike Mmụọ Nsọ. Ọ dịkwaghị onye ọ bụla Mmụọ Chineke na-achị nke pụrụ ịsị, “Jisọs bụ onye a bụrụ ọnụ.”[4] Ọ bụ ezie na onyinye Mmụọ Nsọ Chineke dị ọtụtụ, ma ọ bụ otu Mmụọ Nsọ ahụ na-enye ha.[5] Anyị na-esite nꞌụzọ dị iche iche na-efe Chineke, ma ọ bụ nanị otu Chineke ahụ ka anyị na-efe.[6] E nwere ụzọ dị iche iche Chineke si arụ ọrụ nꞌime anyị, ma ọ bụkwa otu Chineke ahụ na-arụ ihe ndị a nile nꞌime mmadụ nile.[7] Mmụọ Nsọ na-arụpụta ọrụ ya nꞌime onye ọ bụla nꞌụzọ ọ ga-esi bara chọọchị nile uru.[8] Mmụọ Nsọ na-enye otu onye onyinye ikwu okwu amamihe, na-enyekwa onye ọzọ onyinye ịma ihe ọmụma, dị ka o si chọọ.[9] Otu Mmụọ Nsọ a na-enye onye ọzọ onyinye inwe okwukwe pụrụ iche, na-enyekwa onye ọzọ onyinye inwe ike ịgwọ ọrịa.[10] Ụfọdụ ka ọ na-enye onyinye ịrụ ọrụ ịtụnanya, ndị ọzọ ike ibu amụma. Onye ọzọ ka ọ na-enye ike ịkọwa ụdị mmụọ dị iche iche, ma onye ọzọ kwa ka ọ na-enye ike ịsụ asụsụ dị iche iche. Ma ọ na-enyekwa onye ọzọ ike ịkọwa ihe onye na-asụ asụsụ ndị a na-ekwu.[11] Ọ bụ otu Mmụọ ahụ na-enye onyinye ndị a nile. Ọ na-enye onye ọ bula onyinye dị iche iche dị ka o si kpebie na dị ka o si dị ya mma.

Igbo Bible 1988
No Data