A A A A A

Mgbakwunye: [Igbu onwe onye]


JỌN 10:10
Onye ohi na-abịa ka o bibie. Ma mụ onwe m na-abịa inye ndụ nke na-ejubiga oke.

1 JỌN 4:4
Ma unu bụ ụmụ Chineke, ndị enyi m. Unu emeriela ndị ozizi ụgha ndị a nile. Nꞌihi na onye ahụ bi nꞌime unu dị ike karịa onye ahụ nọ nꞌụwa.

MAK 16:16
Ndị kweere na ndị e mere baptizim ka a ga-azọpụta. Ma ndị jụrụ ikwere ka ọmụma ikpe dịrị.

ROM 8:1-2
[1] Ya mere, ikpe ọmụma ọ bụla adịkwaghị ugbu a nye ndị nile nọ nꞌime Jisọs Kraịst.[2] Nꞌihi na ike ahụ Mmụọ na-enye ndụ na-enye abụrụla nke m, site nꞌịdị nꞌotu nke mụ na Kraịst. Ike a emekwaala ka m nwere onwe m nꞌebe ike nile nke mmehie na ọnwụ dị.

ROM 8:38-39
[38] Nꞌihi na nke a bụ ihe m maara nke ọma, bụrụkwa ihe doro m anya, na ọ dịghị ihe pụrụ ikewapụ anyị site nꞌịhụnanya Chineke. Ọnwụ, ma ọ bụ ndụ enweghị ike ya, ndị mmụọ ozi ma ọ bụ ike nile dị nꞌeluigwe enweghị ike igbochi Chineke ịhụ anyị nꞌanya. Ọ bụladị ihe ọjọọ nile na-eme nꞌụwa taa, na nchegbu banyere ihe ga-eme echi, apụghị igbochi ịhụnanya Chineke.[39] Ịhụnanya Chineke ga-erute anyị ebe ọ bụla anyị nọ, nꞌelu mbara eluigwe, ma ọ bụ nꞌokpuru osimiri nke ụwa. Nꞌezie, ọ dịghị ihe ọ bụla Chineke kere eke pụrụ ikewapụ anyị site nꞌịhụnanya Chineke.

MATIU 27:3-4
[3] Mgbe Judas, onye ahụ rara Jisọs nye, nụrụ na a mara Jisọs ikpe ọnwụ, o chigharịrị weghachikwara ndị isi nchụaja na ndị okenye ego ahụ ha kwụrụ ya.[4] Ọ gwara ha sị, “Emehiela m, nꞌihi na araara m nwoke na-emeghị ihe ọjọ ọ bụla nye nꞌaka ọnwụ.” Ma ha zara ya sị, “Nke ahụ agbasaghị anyị, ọ bụ ihe dịrị gị.”

Igbo Bible 1988
No Data