NKPUGHE 21:27 |
Ọ dịkwaghị ihe ọ bụla rụrụ arụ ga-abata nꞌime ya. Otu a kwa ọ dịkwaghị onye na-eme ihe arụ, ma ọ bụ onye ụgha ga-abata nꞌime ya. Kama ndị ga-abata nꞌime ya bụ nanị ndị ahụ e dere aha ha nꞌakwụkwọ nke ndụ Nwa atụrụ ahụ. |
|
MAK 13:14 |
“Mgbe unu hụrụ ihe arụ ahụ ka o guzo nꞌime ụlọ nsọ ukwu Chineke, ka onye na-agụ ghọta ihe nke a pụtara, gbalaganụ! Gbaranụ ọsọ gaa nꞌugwu Judia! |
|
MATIU 24:15 |
“Ya mere, mgbe unu hụrụ ihe unu na-ahụbeghị mbụ, nke e kwuru okwu ya site nꞌọnụ Daniel onye amụma, ka ọ na-eguzo nꞌebe nsọ, (onye na-agụ tụgharịa uche ghọta ihe ọ pụtara), |
|
ROM 1:26-27 |
[26] Ọ bụ nke a mere Chineke ji hapụ ha ka ha na-eme ihe ọjọọ ndị ahụ na-agụ obi ha agụụ ime. Nꞌihi ya, ọ bụladị ndị inyom na ndị inyom ibe ha nọgidere na-enwe mmekọrịta nꞌụzọ na-ezighị ezi nye ha.[27] Ọzọ kwa, ndị ikom ha họrọ ka ha na ndị ikom ibe ha na-enwe ụdị mmekọrịta a. Nꞌụzọ dị otu a ha natakwara ntaramahụhụ kwesịri ha nꞌihi ihe ọjọọ ndị a ha na-eme. |
|
Igbo Bible 1988 |
No Data |