A A A A A

Mgbakwunye: [Verygba Ohu]


1 KỌRINT 7:21
Ọ bụrụ na ị bụ ohu echegbula onwe gị nꞌihi ya. Kama ọ bụrụ na ọ dị ụzọ ị pụrụ isi nwere onwe gị, mee ya.

1 PITA 2:16-18
[16] Bienụ ndụ unu dị ka ndị na-anọghị nꞌokpuru iwu. Ma unu ejikwala onwunwe unu nwe onwe unu eme ihe ọ bụla masịrị unu. Unu ejila ya eme ihe ọjọọ, kama na-ebinụ ndụ unu ime nanị ihe Chineke chọrọ mgbe nile.[17] Sọpụrụnụ mmadụ nile. Na-ahụkwanụ ndị nile kwere ekwe nꞌanya. Na-atụnụ egwu Chineke Nna, na-asọpụrụnụ ndị na-achị achị.[18] Ndị bụ odibo ruberenụ ndị nwe unu isi, na-enyekwa ha nsọpụrụ na ugwu ruuru ha. Unu emela nke a nye nanị ndị bụ ezi mmadụ, na ndị nwere obi ọma nꞌebe unu nọ, kama meekwanụ ya ọ bụladị nye ndị afọ tara mmiri.

1 TIMỌTI 1:10
Ee, Chineke nyere iwu a ime ka ndị naakwa iko pụta ìhè dị ka ndị mmehie. Ha na ndị na-eche uche na-adịghị ọcha, na ndị ikom na-emerụ onwe ha nꞌebe ndị ikom ibe ha nọ, ndị na-eme ihe ọjọọ dị iche iche megide ezi ozizi na-eweta ndụ.

1 TIMỌTI 6:1
O kwesịrị ka ndị Kraịst bụ ohu naarụsiri ndị nwe ha ọrụ ike, ma naenyekwa ha nsọpụrụ kwesịrị ha. Ha emekwala ihe ọ bụla ga-eme ka ndị mmadụ sị na ụmụ Chineke bụ ndị na-adịghị arụsị ọrụ ike. Ekwekwala ka a chịa aha Chineke ọchị, ma ọ bụ ka a chịa ihe a na-ezi banyere ya ọchị nꞌihi nke a.

KỌLỌSI 3:22
Ndị bụ ohu, na-asọpụrụnụ nna unu ukwu nꞌihe nile. Na-emenụ ihe ha gwara unu mee, ọ bụghị nanị mgbe ha nọ na-ele unu anya, kama werenụ obi unu nile jeere ha ozi, nꞌihi na unu bụ ndị kwesịrị ime ihe ga-atọ Onyenwe anyị ụtọ.

KỌLỌSI 4:1
Unu ndị nwe odibo, werenụ ezi obi na obi dị umeala na-emeso odibo unu mmeso. Chetakwanụ na ọ dị onye ka unu ukwu, Onyenwe unu, nke bi nꞌeluigwe, onye nọkwa na-ele unu anya.

EFESỌS 6:5-9
[5] Ndị na-eje ozi, ruberenụ ndị unu na-ejere ozi isi. Jirinụ nsọpụrụ na obi ọcha jeere ha ozi dị ka a ga-asị na ọ bụ Kraịst ka unu na-ejere ozi ahụ.[6] Ọ bụghị nanị mgbe ha nọ unu nso na-ele unu anya, kama sitenụ nꞌobi unu nile jeere ha ozi dị ka ndị ozi Kraịst.[7] Jirinụ ọṅụ na ihuọma rụọ ọrụ unu dị ka ọ bụ Onyenwe anyị ka unu na-arụrụ ya.[8] Nꞌihi na unu maara na ọrụ ọma ọ bụla mmadụ rụrụ ka ọ ga-anata ụgwọ ọrụ ya site nꞌaka Onyenwe anyị, ohu ma ọ bụ onye nweere onwe ya.[9] Ndị a na-ejere ozi, mesonụ ndị na-ejere unu ozi mmeso nꞌụzọ dị otu a. Abarala ha mba. Chetakwanụ na unu na ndị na-ejere unu ozi bụ ohu Kraịst onye nọ nꞌeluigwe. Ọ dịghị ele mmadụ anya nꞌihu mgbe ọ na-eme ihe ọ chọrọ ime.

GALETIA 3:28
Ọ dịkwaghị ihe dị iche ugbu a. Nkewa ọ bụla adịkwaghị. A naghị ahụkwa anyị dị ka ndị Juu, ma ọ bụ ndị Griik, ma ọ bụ ndị ohu, ma ọ bụ ndị nwere onwe ha, ma ọ bụkwanụ ndị nwoke ma ọ bụ ndị nwanyị, kama anyị nile bụ ndị nke Kraịst, ndị e jikọtara nꞌotu nꞌime Kraịst Jisọs.

GALETIA 5:1
Ugbu a, Kraịst emeela ka anyị pụọ nꞌohu. Ya mere, gbalịanụ ịhụ na unu nọ dị ka ndị nwe onwe ha. Unu alaghachikwala azụ idebe iwu na omenala ndị Juu.

LUK 4:18
“Mmụọ nke Onyenwe anyị dị nꞌahụ m, nꞌihi na ọ họpụtala m ikwusa ozi ọma nye ndị ogbenye, Ọ họpụtala m ikwusa na ndị e kere agbụ ga-enwere onwe ha, na ndị kpuru ìsì ga-ahụkwa ụzọ ọzọ, na ndị a na-emegbu ga-esite nꞌaka ndị na-emegbu ha nwere onwe ha,

FAILIMON 1:16
Ugbu a, ọ naghị alọghachi nanị dị ka ohu, kama ọ na-alọghachi dị ka onye karịrị ohu. Nꞌihi na ugbu a Onisimọs bụ nwanna anyị nꞌime Kraịst. Nꞌezie, Faịlimọn, Onisimọs dị m nꞌobi nke ukwuu.

TAITỌS 2:9-10
[9] Gwa ndị ohu ka ha na-erubere ndị nwe ha isi, ka ha na-eme ihe ga-atọ onyenwe ha ụtọ mgbe nile. Ka ha hapụ ịsa ndị nwe ha okwu.[10] Gwa ha ka ha hapụ izu ohi, kama ka ha gosi na ha bụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi. Nꞌụzọ dị otu a, ha ga-eme ka ndị mmadụ chọọ ikwere nꞌOnyenwe anyị na Chineke anyị.

LUK 12:47-48
[47] Ya mere, odibo ahụ maara ihe nna ya ukwu chọrọ ka o mee, ma jụ ijikere chere nna ya ukwu, ma ọ bụ kpebie ịhapụ ime ihe nna ya ukwu chọrọ, a ga-eti ya ezigbo ihe otiti.[48] “Ma odibo ahụ na-amaghị ihe nna ya ukwu chọrọ ka o mee, ma mee ihe ahụ na-ewetara ndị mere ya ihe otiti, a ga-eti ya ihe ntakịrị. Nꞌihi na ọ bụ onye e nyere ihe hiri nne ka a ga-ele anya ịnata ihe hiri nne nꞌaka ya. Nwoke ahụ ndị mmadụ nyere ihe hiri nne nꞌaka, ka ha ga-ele anya ịnata ya ihe hiri nne ha tinyere ya nꞌaka.

1 TIMỌTI 6:1-2
[1] O kwesịrị ka ndị Kraịst bụ ohu naarụsiri ndị nwe ha ọrụ ike, ma naenyekwa ha nsọpụrụ kwesịrị ha. Ha emekwala ihe ọ bụla ga-eme ka ndị mmadụ sị na ụmụ Chineke bụ ndị na-adịghị arụsị ọrụ ike. Ekwekwala ka a chịa aha Chineke ọchị, ma ọ bụ ka a chịa ihe a na-ezi banyere ya ọchị nꞌihi nke a.[2] Ọ bụrụ na ndị nwe ha bụ ndị Kraịst, nke a ekwesịghị ime ka ha hapụ ịrụzi ọrụ ha, kama ha kwesịrị ịrụsi ọrụ ike nꞌihi na ọ bụ nwanna nꞌime okwukwe ka ha na-enyere aka. Na-ezi ndị mmadụ eziokwu ndị a. Naagbakwa ha ume ka ha mee ihe ndị a.

EFESỌS 6:5-9
[5] Ndị na-eje ozi, ruberenụ ndị unu na-ejere ozi isi. Jirinụ nsọpụrụ na obi ọcha jeere ha ozi dị ka a ga-asị na ọ bụ Kraịst ka unu na-ejere ozi ahụ.[6] Ọ bụghị nanị mgbe ha nọ unu nso na-ele unu anya, kama sitenụ nꞌobi unu nile jeere ha ozi dị ka ndị ozi Kraịst.[7] Jirinụ ọṅụ na ihuọma rụọ ọrụ unu dị ka ọ bụ Onyenwe anyị ka unu na-arụrụ ya.[8] Nꞌihi na unu maara na ọrụ ọma ọ bụla mmadụ rụrụ ka ọ ga-anata ụgwọ ọrụ ya site nꞌaka Onyenwe anyị, ohu ma ọ bụ onye nweere onwe ya.[9] Ndị a na-ejere ozi, mesonụ ndị na-ejere unu ozi mmeso nꞌụzọ dị otu a. Abarala ha mba. Chetakwanụ na unu na ndị na-ejere unu ozi bụ ohu Kraịst onye nọ nꞌeluigwe. Ọ dịghị ele mmadụ anya nꞌihu mgbe ọ na-eme ihe ọ chọrọ ime.

Igbo Bible 1988
No Data