A A A A A

Mgbakwunye: [Nchebe Onwe]


LUK 11:21
“Mgbe nwoke dị ike jiri egbe na mma chee ụlọ ya nche, mmadụ ọ bụla enweghị ike bata nꞌime ụlọ ahụ zuo ohi.

ỌLU OZI 12:4
tụba ya nꞌụlọ mkpọrọ, O zipụrụ ndị agha iri na isii ka ha chee ya nche. Ihe Herọd bu nꞌobi bụ ka o nyefee Pita nꞌaka ndị Juu, ka ha gbuo ya mgbe mmemme ngabiga gafere.

LUK 22:52
Mgbe ahụ Jisọs tụgharịrị gwa ndị isi nchụaja ahụ, na ndị isi agha ahụ na-eche ụlọ nsọ ukwu ahụ, na ndị okenye ahụ bịara ijide ya okwu sị, “Ùnu chịịrị mma agha na osisi bịa ijide m dị ka a ga-asị na m bụ onye na-apụnarị mmadụ ihe nꞌike?

LUK 10:29-37
[29] Ma ebe nwoke ahụ na-ezi iwu chọrọ igosi na ya bụ onye na-eme ihe ziri ezi, ọ jụrụ Jisọs ajụjụ sị ya, “Onye kwanụ bụ onye agbata obi m?”[30] Jisọs zara sị, “Ọ dị otu nwoke sitere nꞌobodo Jerusalem na-aga nꞌobodo Jeriko. Mgbe ọ na-aga nꞌụzọ, o zutere ndị ohi na-apụnarị mmadụ ihe nꞌike, ndị napụrụ ya ihe nile o nwere, tie ya ihe, hapụ ya nꞌọnọdụ ọdịndụ ọnwụkamma laa.[31] “Ma dị ka ihe si eme, otu onye nchụaja nke ụlọ nsọ ukwu Chineke dị na Jerusalem sitere ụzọ ahụ na-aga njem ya. Mgbe ọ hụrụ nwoke a, o sitere nꞌakụkụ ụzọ ahụ gafee.[32] Otu a kwa, otu onye Livayị na-enyere ndị nchụaja aka nꞌụlọ nsọ ukwu Chineke bịarutekwara nꞌebe nwoke ahụ tọgbọ nꞌala hụ ya. Ma o sitere nꞌakụkụ ụzọ ahụ gafeekwa.[33] “Ma otu onye Sameria, onye mba ọzọ, onye ndị Juu kpọrọ asị, sitere nꞌụzọ ahụ na-agakwa njem ya. Mgbe ọ bịarutere hụ ebe nwoke a tọgbọ nꞌala, o nwere ọmiko nꞌahụ ya.[34] O sitere nꞌelu inyinya ibu ya rịdata, gaa nso nꞌebe nwoke ahụ dina. O ji mmanya saa ọnya ya, tee ya mmanụ, were akwa kechie ya. Mgbe o mesịrị ihe ndị a, o buliri nwoke ahụ elu, tụkwasị ya nꞌelu inyinya ibu ya, buru ya gaa nꞌụlọ ndị ije, ebe ọ nọ lekọtazie ya anya nke ọma.[35] Nꞌechi ya, mgbe ọ na-akwado ịpụ, o wepụtara naịra abụọ nye onye na-elekọta ụlọ ndị ije ahụ sị ya, ‘Lezie nwoke a anya nke ọma. Ọ bụrụ na i mefuo ego ọzọ karịrị ego a m nyere gị, mgbe m lọghachiri, aga m akwụ gị ya.’ ”[36] Mgbe ahụ Jisọs jụrụ onye ozizi iwu ahụ sị, “Ònye nꞌime mmadụ atọ ndị a ka i chere bụ onye gosiri onwe ya dị ka onye agbata obi nwoke ahụ ndị na-apụnarị mmadụ ihe nꞌike merụrụ ahụ?”[37] Onye ozizi iwu ahụ zara sị ya, “Ọ bụ onye ahụ lekọtaziri ya anya nke ọma.” Mgbe ahụ Jisọs zara ya sị, “Ugbu a laa, gaa mee dị ka nwoke ahụ siri mee.”

LUK 22:36
Mgbe ahụ Jisọs gwara ha okwu sị, “Ugbu a, ka onye ọ bụla nwere ego were ya, ka onye nwere akpa sere ya. Ọ bụrụkwa na ọ dị onye na-enweghị mma agha, ya ree uwe ya, nweta ego zụrụ otu.

MATIU 5:39
Ma ana m asị unu alụsịla onye na-achọ imeru unu ahụ ọgụ. Kama ọ bụrụ na mmadụ akụọ gị aka nꞌotu nti, tụgharịara ya nti nke ọzọ.

ROM 12:19
Ụmụnna m, unu abọla ọbọ. Hapụrụnụ Chineke ọrụ ịbọrọ unu ọbọ. Nꞌihi na Chineke kwuru sị, “Ịbọ ọbọ bụ ọrụ m, aga m akwụghachi ha.”

MATIU 5:38-39
[38] “Iwu Mosisi nyere kwuru sị, ‘Ọ bụrụ na mmadụ aghụpụ anya gị, ghụpụkwara anya nke ya. Kụpụkwa eze onye kụpụrụ eze gị.’[39] Ma ana m asị unu alụsịla onye na-achọ imeru unu ahụ ọgụ. Kama ọ bụrụ na mmadụ akụọ gị aka nꞌotu nti, tụgharịara ya nti nke ọzọ.

ROM 13:4
Onye nọ nꞌọchịchị bụ onyeozi Chineke. Ọ na-arụ ọrụ ya ịhụ maka ọdịmma gị. Ọ bụrụ na i mee ihe ọjọọ, o kwesịrị ka ụjọ ju gị obi na ọ ga-ata gị ahụhụ. Nꞌihi na Chineke ziri ya ka ọ taa ndị na-eme ihe ọjọọ ahụhụ.

LUK 22:36-38
[36] Mgbe ahụ Jisọs gwara ha okwu sị, “Ugbu a, ka onye ọ bụla nwere ego were ya, ka onye nwere akpa sere ya. Ọ bụrụkwa na ọ dị onye na-enweghị mma agha, ya ree uwe ya, nweta ego zụrụ otu.[37] Nꞌihi na ọ bụ eziokwu ka m na-ekwu mgbe m na-asị na ihe ahụ akwụkwọ nsọ kwuru banyere m sị, ‘A gụkọrọ ya na ndị mmehie’, ga-emezu.”[38] Mgbe ahụ ha gwara ya sị, “Onyenwe anyị, lee, anyị nwere mma agha abụọ.” Jisọs zara ha sị, “Nke ahụ ezuole.”

1 TIMỌTI 5:8
Ọ bụrụ na onye ọ bụla ajụ inyere ikwu na ibe ya ka, nke ka nke, onye ọ bụla jụrụ inyere ndị ezinụlọ nke aka ya aka, ekwesịghị ịkpọ onwe ya onye nke Kraịst. Nꞌihi na onye dị otu a dị njọ karịa onye na-ekpere arụsị.

ROM 12:18
Gị na onye ọ bụla esela okwu. Dị ka ike gị nile ha, mee ka gị na onye ọ bụla biri nꞌudo.

MATIU 26:51
Otu onye nꞌime ndị ha na Jisọs nọ mịpụtara mma agha ya jiri ya bipụ ntị ohu onyeisi nchụaja.

JỌN 18:10
Mgbe ahụ, Saimọn Pita mịpụtara mma ya were ya gbupụ ntị aka nri onye a na-akpọ Malkus. Malkus a bụ ohu onyeisi nchụaja.

MATIU 5:9
Ndị na-achọ udo nꞌetiti mmadụ na ibe ha bụ ndị a gọziri agọzi, nꞌihi na a ga-akpọ ha ụmụ Chineke.

MATIU 26:52-54
[52] Ma Jisọs sịrị ya, “Mịghachi mma agha gị nꞌọbọ ya, nꞌihi na mmadụ ọ bụla na-eji mma egbu mmadụ ibe ya, ga-anwụ site na mma.[53] I cheghị na m pụrụ ịkpọ Nna m oku ka o zitere m igwe ndị mmụọ ozi, ka ha bịa napụta m?[54] Ọ bụrụkwanụ na m emee otu a, a ga-esi aṅaa mee ka ihe akwụkwọ nsọ kwuru mezuo? Nꞌihi na akwụkwọ nsọ kwuru na ihe ndị a na-eme ugbu a aghaghị imezu otu a.”

MATIU 24:43
“Dị ka nna nwe ụlọ pụrụ isi gbochie ndị ohi ka ha ghara igbuka ụlọ ya site nꞌịnọ na nche abalị nile,

JỌN 18:10-11
[10] Mgbe ahụ, Saimọn Pita mịpụtara mma ya were ya gbupụ ntị aka nri onye a na-akpọ Malkus. Malkus a bụ ohu onyeisi nchụaja.[11] Ma Jisọs gwara Pita sị, “Mịghachi mma gị nꞌọbọ ya! Ị̀ na-eche na m agaghị aṅụ site nꞌiko ahụhụ ahụ Nna m nyere m ka m ṅụọ?”

ROM 12:17
Bie ndụ ga-egosi ndị mmadụ na ị bụ onye Kraịst. Ejikwala ihe ọjọọ akwụghachi ihe ọjọọ e mere gị.

MATIU 26:51-54
[51] Otu onye nꞌime ndị ha na Jisọs nọ mịpụtara mma agha ya jiri ya bipụ ntị ohu onyeisi nchụaja.[52] Ma Jisọs sịrị ya, “Mịghachi mma agha gị nꞌọbọ ya, nꞌihi na mmadụ ọ bụla na-eji mma egbu mmadụ ibe ya, ga-anwụ site na mma.[53] I cheghị na m pụrụ ịkpọ Nna m oku ka o zitere m igwe ndị mmụọ ozi, ka ha bịa napụta m?[54] Ọ bụrụkwanụ na m emee otu a, a ga-esi aṅaa mee ka ihe akwụkwọ nsọ kwuru mezuo? Nꞌihi na akwụkwọ nsọ kwuru na ihe ndị a na-eme ugbu a aghaghị imezu otu a.”

MATIU 5:38-44
[38] “Iwu Mosisi nyere kwuru sị, ‘Ọ bụrụ na mmadụ aghụpụ anya gị, ghụpụkwara anya nke ya. Kụpụkwa eze onye kụpụrụ eze gị.’[39] Ma ana m asị unu alụsịla onye na-achọ imeru unu ahụ ọgụ. Kama ọ bụrụ na mmadụ akụọ gị aka nꞌotu nti, tụgharịara ya nti nke ọzọ.[40] Ọ bụrụ na mmadụ agbaara gị akwụkwọ nꞌụlọ ikpe ka ọ nara gị uwe ime ahụ gị, nyekwa ya uwe elu ahụ gị.[41] Ọ bụrụ na mmadụ esite nꞌike chọọ ka i soro ya gaa puku nzọ ụkwụ atọ, soro ya gaa puku nzọ ụkwụ isii, ma ọ bụrụ na nke a ga-eme ka udo dịrị.[42] Nye onye ọ bụla rịọrọ gị ihe. Achụghachikwala ndị na-abịa ka ị binye ha ego.[43] “A gwara unu sị, ‘Hụnụ ndị enyi unu nꞌanya, ma kpọọkwanụ ndị iro unu asị.’[44] Ma asị m unu, hụnụ ndị iro unu nꞌanya, kpeekwaranụ ndị na-esogbu unu ekpere.

ROM 12:18-21
[18] Gị na onye ọ bụla esela okwu. Dị ka ike gị nile ha, mee ka gị na onye ọ bụla biri nꞌudo.[19] Ụmụnna m, unu abọla ọbọ. Hapụrụnụ Chineke ọrụ ịbọrọ unu ọbọ. Nꞌihi na Chineke kwuru sị, “Ịbọ ọbọ bụ ọrụ m, aga m akwụghachi ha.”[20] Kama, ọ bụrụ na agụụ na-agụ onye iro gị, nye ya nri ka o rie. Nye ya mmiri, ma ọ bụrụ na ọ chọọ ịṅụ mmiri. Nꞌịhi na ọ bụrụ na ị na-eme otu a, ọrụ ọma gị ga-eme ka ihere mee ya mgbe o chetara ihe ọjọọ o mere gị.[21] Ekwela ka ihe ọjọọ na-achị gị, kama site nꞌezi ọrụ ị na-arụ merie ihe ọjọọ nile.

LUK 22:50
Otu nꞌime ndị na-eso ụzọ ya jiri mma agha gbupụ ntị otu onye na-ejere onyeisi nchụaja ozi.

Igbo Bible 1988
No Data