A A A A A

Mgbakwunye: [Sayensị]


1 TIMỌTI ๖:๒๐
Biko, Timoti, ahapụkwala imezu ihe ndị a Chineke tinyere gị nꞌaka ime. Wezuga onwe gị nꞌirụ ụka nzuzu nile nke ndị ahụ na-anya isi banyere amamihe ha nwere, na-achọ ka i soro ha rụọ ụka. Ndị a na-esite nꞌinya isi ha gosi nꞌezie na ha amaghị ihe ọ bụla.

LUK 11:52
“Ahụhụ dịrị unu ndị ozizi iwu nꞌihi na unu na-ezonarị ndị mmadụ eziokwu ka ha hapụ ịmata ya, ma unu onwe unu jụrụ ịnabata eziokwu ahụ. Unu adịkwaghị enye ndị ọzọ ohere ka ha nabata ya, kwerekwa ya.”

ROM 2:20
Ị na-agụkwa onwe gị dị ka onye nkuzi ndị na-amaghị ihe, na onye nkuzi ụmụntakịrị, nꞌihi na ị maara iwu Chineke nke ọma, jupụtakwa nꞌamamihe na eziokwu.

NKPUGHE 11:15-18
[15] Nꞌihi na mgbe ahụ kwa ka mmụọ ozi nke asaa fụrụ opi ike ya. Mgbe ọ fụrụ opi ya oke olu dị iche iche sitere nꞌeluigwe na-ada nꞌike nꞌike na-asị, “Alaeze nile nke ụwa abụrụla alaeze Onyenwe anyị, ya na Kraịst ya. Ya onwe ya ga-achịkwa achị nꞌebe ihe nile e kere eke dị ruo mgbe nile ebighị ebi.”[16] Mgbe ahụ kwa iri ndị okenye abụọ na anọ ahụ na-anọkwasị nꞌocheeze ndị ahụ dị nꞌihu ocheeze Chineke na-ada nꞌala, na-akpọ isi ala nye Chineke. Ha na-enyekwa ya otuto site nꞌife ya ofufe na-asị,[17] “Anyị na-enye gị otuto, gị Onyenwe anyị, Chineke, Onye pụrụ ime ihe nile. Onye na-adị site na mmalite, onye dịkwa ugbu a, nꞌihi na i werela ike nile nꞌaka gị. Ị malitekwala ọchịchị gị.[18] Ụwa nile were oke iwe megide gị, ma ugbu a bụ oge gị iweso ha iwe dị ọkụ. Ugbu a bụ oge ikpe ndị nwụrụ anwụ ikpe, na ịkwụghachi ndị na-ejere gị ozi ụgwọ ọrụ ha, bụ ndị nile na-ezisa ozi ọma gị na ndị gị nile, bụ ndị na-atụ egwu gị. Ndị dị nta na ndị dị ukwuu. Oge eruokwala mgbe ịla nꞌiyi ga-abịakwasịkwa ndị nile e siri nꞌaka ha webata mmebi nꞌebe ihe Chineke kere dị.”

KỌLỌSI 1:15-16
[15] Kraịst bụ nnọọ oyiyi Chineke onye anyị na-apụghị ịhụ anya. Ọ nọ na-adị ndụ tupuu Chineke ekee ihe ọ bụla e kere eke.[16] Nꞌezie, ọ bụ site nꞌaka Kraịst ka e ji kee ihe nile dị nꞌụwa na nke dị nꞌeluigwe, ndị anyị pụrụ ịhụ anya na ndị anyị na-apụghị ịhụ anya. Ike nile dị iche iche, ma ike nile nke mmụọ dị iche iche, ya na ndị isi ha nile, na alaeze ha, ma ndị na-achị achị nꞌetiti ha, ma ndị na-atụ ihe ga-eme eme. Kraịst kere ihe nile. O kere ha iji ha ịrụ ọrụ dị ka o si dị ya mma, na isite na ha wetara onwe ya otuto.

NKPUGHE 1:5
Ka amara sitekwara nꞌebe Jisọs Kraịst nọ, onye sitere nꞌikwesị ntụkwasị obi ya kpughee eziokwu a nye anyị dịrị unu. Ya onwe ya bụ onye mbụ sitere na ndị nwụrụ anwụ bilite. Ọ gaghị anwụkwa ọzọ. Ọ dị elu karịa ndị eze nile nke ụwa. Ka otuto dịrị ya nꞌihi na ọ hụrụ anyị nꞌanya, na nꞌihi na o sitere nꞌọbara ọ wụsịrị dọpụta anyị site na mmehie anyị nile.

NKPUGHE 5:6
Mgbe m lere anya, ahụrụ m otu Nwa atụrụ ka o guzo nꞌihu iri ndị okenye abụọ na anọ ahụ, nꞌihu ocheeze ukwu ahụ, na nꞌihu ihe e kere eke anọ ahụ. Nwa atụrụ ahụ nwekwara apa dị iche nꞌahụ ya, bụ nke mere ka ọ nwụọ nꞌoge ọ nwụrụ. O nwekwara mpi asaa na anya asaa nke nọ ọnọdụ mmụọ asaa nke Chineke, nke a na-ezipụ ịga nꞌebe dị iche iche nꞌime ụwa.

NKPUGHE 13:14
Ọ na-arụ ọrụ ịtụnanya a mgbe ọ bụla anụ ọhia nke mbụ nọ na-ele ya anya. Ọ na-arụkwa ọrụ ndị a iji ya iduhie mmadụ nile nọ nꞌebe nile. O nyekwara iwu ka ndị nile bi nꞌụwa kpụọ ihe yiri anụ ọhia nke mbụ ahụ nwere ọnya gaara ewetara ya ọnwụ nꞌotu isi ya, bụ anụ ọhia e mekwara ka ọnya ya laa.

NKPUGHE 17:18
Ma nwanyị a ị hụrụ nꞌime ọhụ gị nọchiri anya obodo ukwu ahụ na-achị ndị eze nile dị nꞌụwa.

JUD 1:9
Ndị a na-eme ihe Maikel, onyeisi ndị mmụọ ozi nọ nꞌeluigwe na-emeghị. Nꞌihi na mgbe mmụọ ozi Maikel chọrọ iburu ozu Mosisi, ya na ekwensu sere okwu. Ma mgbe ha naazọ ozu ahụ, Maikel ekwulughị ekwensu, kama ọ sịrị ya, “Onyenwe anyị baara gị mba”.

KỌLỌSI 1:15
Kraịst bụ nnọọ oyiyi Chineke onye anyị na-apụghị ịhụ anya. Ọ nọ na-adị ndụ tupuu Chineke ekee ihe ọ bụla e kere eke.

1 TESALỌNAIKA 4:16
Nꞌihi na Onyenwe anyị nꞌonwe ya ga-esi nꞌeluigwe rịdata. Mgbe ọ na-arịdata ọ ga-eji olu dị ike kpọọ oku. Ee, ọ ga-eji ube akwa nke ndị isi mmụọ ozi tie mkpu, ọ ga-afụkwa opi ike Chineke. Mgbe ahụ ndị Kraịst nile dara nꞌụra ọnwụ ga-eburu ụzọ si nꞌọnwụ bilite.

NKPUGHE 3:14
“Dee akwụkwọ a nye mmụọ ozi nzukọ dị na Laodisia. Ọzi a sitere nꞌaka onye ahụ a na-apụghị iwezụga nꞌọnọdụ ya. Ọ bụkwa onye àma kwesịrị ntụkwasị obi banyere ihe nile dị ugbu a, na nke dịrị na mgbe ochie, na nke gaje ịdị ruo mgbe ebighị ebi. Ya onwe ya bụkwa onye kachasị ihe nile elu, bụrụkwa isi mmalite ihe nile Chineke kere.

JỌN 1:18
Ọ dịbeghị onye ọ bụla ji anya ya hụ Chineke anya mgbe ọ bụla, ma Jisọs Kraịst, onye nanị ya bụ Ọkpara Chineke, bụrụkwa onye ya na Chineke nọ rị site na mbụ egosila anyị onye Chineke bụ, meekwa ka anyị mata ya.

Igbo Bible 1988
No Data