A A A A A

Mgbakwunye: [Revival]


JEMES 4:8
Bịakwụtenụ Chineke nso, ya onwe ya ga-abịakwutekwa unu nso. Kwọọnụ aka unu, ndị mmehie, ma meekwanụ ka obi unu dị ọcha. Unu abụla ndị obi abụọ.

ỌLU OZI 2:17-18
[17] Nꞌihi na Joel buru amụma sị, ‘Nꞌoge ikpeazụ, nke a bụ ihe na-aghaghị ime, dị ka Onyenwe anyị kwuru. Aga m awụkwasị mmadụ nile Mmụọ m. Nꞌoge ahụ ụmụ unu ndị ikom na ụmụ unu ndị inyom ga-ebu amụma. Ndị okorọbịa unu ga-ahụ ọhụ. Ndị okenye nꞌetiti unu ga-arọkwa nrọ.[18] Ndị bụ ohu nꞌetiti unu, nwoke ha na nwanyị nꞌime ha, ka m ga-awụkwasị Mmụọ m. Ha ga-ebukwa amụma.

2 TIMỌTI 4:3-4
[3] Nꞌihi na oge na-abịa mgbe ụfọdụ mmadụ na-agaghị anagidekwa eziokwu ahụ, kama ha ga-agagharị gburugburu ịchọ ndị ozizi ndị ga-ezi ha ihe ha chọrọ ịnụ.[4] Ha agaghị ege ntị nꞌihe akwụkwọ nsọ na-ekwu, kama ha gaege ntị nꞌakụkọ na-enweghị isi.

EFESỌS 5:14
Nꞌihi na ìhè na-eme ka a hụzie ihe ọ bụla anya nke ọma. Ọ bụ nꞌihi nke a ka akwụkwọ nsọ jiri kwuo sị, “Bilie gị onye na-arahụ ụra. Site nꞌọnwụ bilie! Kraịst ga-emekwa ka ìhè ya mụkwasị gị.”

MATIU 6:33
Ọ ga-enyekwa unu ihe ndị a nile, ma ọ bụrụ na unu eburu ụzọ nye ya onwe unu, na-adịkwa ndụ dị ka o si chọọ.

ỌLU OZI 2:38
Ma Pita sịrị ha, “Chegharịanụ! Sitekwanụ na mmehie unu tụgharịa bịakwute Chineke! Ka e mee unu baptizim baa nꞌaha Jisọs, nꞌihi mgbaghara mmehie unu. Unu mee nke a, unu ga-anata onyinye a, bụ Mmụọ Nsọ.

ỌLU OZI 3:19-21
[19] “Chegharịanụ ugbu a, lọghachikwutenụ Chineke! Ọ ga-ehichapụ mmehie unu.[20] Onyenwe anyị ga-emekwa ka agbamume nke ime mmụọ rute unu aka. Ọ ga-ezitekwara unu Jisọs Onye nzọpụta ahụ unu na-ele anya ya.[21] Onye nọ nꞌeluigwe ugbu a. Ebe ahụ ka ọ ga-anọgide tutuu e dozie ihe nile. Nꞌihi na otu a ka Chineke kwuru site nꞌọnụ ndị amụma ya na mgbe ochie.

LUK 15:7
“Nꞌụzọ dị otu a, ọṅụ na-adị nꞌeluigwe nꞌihi otu onye mmehie nke chegharịrị, karịa ndị ezi omume iri toolu na toolu ndị mkpa nzọpụta na-adịghị akpa.

MAK 1:15
Nke a bụ isi okwu ya, “Oge ahụ eruola. Oge Chineke ga-ebido ọchịchị ya nꞌụwa. Chegharịanụ, nabatakwaranụ onwe unu ozi ọma a!”

MATIU 3:6
Mgbe ha kwupụtasịrị mmehie ha nile, o mere ha baptizim nꞌosimiri Jọdan.

MATIU 11:20-24
[20] Mgbe ahụ Jisọs bidoro ịkọcha obodo nile ebe ọ rụrụ ọtụtụ ọrụ ebube, nꞌihi na obodo ndị a echegharịghị bịakwute Chineke.[21] “Ahụhụ dịrị gị obodo Korazin, ahụhụ dịkwara gị obodo Betsaida, nꞌihi na a si na ọ bụ nꞌime obodo Taịa na Saịdọn ka m rụrụ ọrụ ebube nile m rụrụ nꞌime unu, ha gaara echegharị gosi nchegharị ha site nꞌiyi uwe nkịkara, na ikpokwasị onwe ha ntụ nꞌisi.[22] Nꞌezie asị m unu na ọ ga-adịrị unu njọ nꞌụbọchị ikpe ahụ karịa obodo Taịa na Saịdọn.[23] Ọ bụ ezie na gị Kapanọm bụ obodo a na-asọpụrụ, ma ị ga-arịdaru ọkụ ala mmụọ. Nꞌihi na a sị na m rụrụ ọrụ ebube m rụrụ nꞌime gị nꞌobodo Sodọm, agaraghị ala ya nꞌiyi. Ọ gaara adịrị ruo taa.[24] Nꞌezie, ọ ga-adịrị gị njọ nꞌụbọchị ikpe ahụ karịa obodo Sodọm.”

1 PITA 4:17
Nꞌihi na oge ikpe ikpe eruola, ọ ga-amalịtekwa nꞌebe ndị Chineke nọ. Ọ̀ bụrụ na a ga-ebu ụzọ kpee anyị ikpe, gịnị ga-abụkwanụ ọnọdụ ndị ahụ na-ekwereghị na Kraịst?

1 PITA 5:10
Ma ahụhụ ndị a ga-adị nanị nwa oge. Chineke anyị, onye jupụtara nꞌobi ebere ga-enye unu ebube ya nke na-adịghị agwụ agwụ site na Kraịst. Ọ ga-abịa nꞌonwe ya ịkpọbata unu nꞌebe unu ga-abụ ndị dị nnọọ ike.

EFESỌS 1:18
Ana m arịọkwa Chineke ka o meghee obi unu ka unu hụ ìhè ya, ka unu matakwa ụdị olileanya unu nwere nꞌihi ọkpụkpọ ọ kpọrọ unu. Ana m arịọkwa Chineke ka o nyere unu aka ịmata ụdị ngọzi ndị ahụ dị ebube o kwere nkwa inye ndị ya.

ROM 6:4
Ya mere, e likọtara anyị na ya na baptizim ka anyị si otu a keta oke nꞌọnwụ ya. Ka anyị sikwa otu a keta oke na ndụ ọhụrụ, mgbe e sitere nꞌike dị ebube nke Nna mee ka Kraịst si nꞌọnwụ bilie.

Igbo Bible 1988
No Data