A A A A A

Mgbakwunye: [Gamlụ karịa otu nwanyị]


1 KỌRINT 7:1-5
[1] Ugbu a, achọrọ m ịsa ajụjụ ndị ahụ unu jụrụ nꞌakwụkwọ unu deteere m. Ndị a bụ ọsịsa m banyere ajụjụ ịlụ nwanyị. Ọ dị mma ma ọ bụrụ na nwoke emetụghị nwanyị aka.[2] Ma ọ ka mma ka onye ọ bụla lụọ nwanyị, nwoke ọ bụla nwụnye nke aka ya, nwanyị ọ bụla di nke aka ya. Nke a ga-eme ka ha ghara ime mmehie.[3] Ka nwoke ọ bụla nwere nwụnye nye nwụnye ya ihe nile ruuru ya dị ka nwanyị nwere di. Nwanyị ọ bụla ga-emekwara di ya otu aka ahụ.[4] Nꞌihi na nwanyị ọ bụla lụrụ di adịkwaghị achị ahụ ya, kama ọ bụ di ya na-achị ya. Otu aka ahụ, di anakwaghị achị ahụ ya, kama ọ bụ nwụnye ya na-achị ya.[5] Ka di na nwụnye hapụ igbochi ibe ha mmekọrịta nke anụ ahụ ruuru ha. Karịakwa ma ọ bụ na mkpebi ha nwere nꞌetiti onwe ha ịnọrọ iche nwoge nta nꞌihi inyefe onwe ha ikpe ekpere nye Chineke. Mgbe oge a gasịrị, ha ga-agakwa nꞌihu na mmekọrịta ha, ka e site otu a hapụ inye ekwensu ohere ịnwa ha ọnwụnwa nꞌihi enweghị ike ha ijide onwe ha aka.

Igbo Bible 1988
No Data