A A A A A

Mgbakwunye: [Ndị uwe ojii]


2 TIMỌTI 1:7
Nꞌihi na Chineke enyeghị anyị mmụọ ịtụ ụjọ, kama o nyere anyị Mmụọ na-emejupụta anyị nꞌike, na ịhụnanya, na uche zuru oke.

JỌN 15:13
Ịhụnanya kachasị ibe ya ukwuu bụ na mmadụ tọgbọrọ ndụ ya nꞌihi ndị enyi ya.

LUK 1:79
Ụbọchị ọhụrụ nke ga-ewetara ndị nọ nꞌọchịchịrị, na ndị nọ na ndagwurugwu nke ọnwụ ìhè. Ụbọchị ọhụrụ nke ga-edu anyị nꞌụzọ ga-eweta udo.”

LUK 10:19
Geenụ ntị. Enyela m unu ike ịzọkwasị agwọ na akpị ụkwụ, ha agaghị emerụkwa unu ahụ. Enyekwala m unu ike imegide ike nile nke onye iro.

LUK 5:9
Nꞌihi na o juru Pita na ndị ya na ha so anya ịhụ ọtụtụ azụ ndị a ha gbutere.

TAITỌS 3:1-2
[1] Chetara ndị gị mkpa ọ dị ido onwe ha nꞌokpuru ọchịchị gọomenti na nꞌokpuru ndị na-achị achị. Ka ha naerubere ha isi, bụrụkwa ndị ọ na-agụ agụụ ime ezi ihe.[2] Gwa ha ka ha ghara ikwulu onye ọ bụla, ka ha gharakwa ịlụ ọgụ, kama ka ha bụrụ enyi mmadụ nile, na-egosikwa ịdị nwayọọ ha nꞌebe mmadụ nile nọ.

1 PITA 2:13-17
[13] Ana m arịọ unu nꞌaha Onyenwe anyị ka unu doo owe unu nꞌokpuru ọchịchị nile. Sọpụrụnụ ndị eze na ndị isi ọchịchị obodo.[14] Sọpụrụnụ ndị na-ejere ndị isi ọchịchị ozi nꞌihi na ha bụ ndị e zitere ịta ndị na-eme ihe ọjọọ ahụhụ na itokwa ndị na-eme ezi ihe.[15] Ọ bụ uche Chineke ka unu site nꞌihe ọma unu na-eme na ndụ unu kpuchie ọnụ ndị nzuzu, na okwu na-abaghị nꞌihe ha na-ekwu megide ozi ọma ahụ ha na-amaghị ihe ọ pụrụ imere ha, na ike dị nꞌime ya.[16] Bienụ ndụ unu dị ka ndị na-anọghị nꞌokpuru iwu. Ma unu ejikwala onwunwe unu nwe onwe unu eme ihe ọ bụla masịrị unu. Unu ejila ya eme ihe ọjọọ, kama na-ebinụ ndụ unu ime nanị ihe Chineke chọrọ mgbe nile.[17] Sọpụrụnụ mmadụ nile. Na-ahụkwanụ ndị nile kwere ekwe nꞌanya. Na-atụnụ egwu Chineke Nna, na-asọpụrụnụ ndị na-achị achị.

ROM 13:1-14
[1] Ruberenụ ndị na-achị achị isi nꞌihi na ọ bụ Chineke tọrọ ntọ ala ọchịchị nile dị nꞌụwa taa. Ọ dịghị ọchịchị gọọmentị dị, ma ọ bụghị nke Chineke tọrọ ntọ ala ya.[2] Ya mere ndị ọ bụla na-eguzo imegide ọchịchị ọ bụla, na-emegide Chineke. Ọ na-ewetakwara ha ikpe ọmụma.[3] Ndị na-achị achị anaghị esogbu ndị na-emeghị ihe ọjọọ. Kama ọ bụ ndị mehiere iwu ka ha na-ahụ. Nꞌihi na onye na-emeghị ihe, ihe anaghị eme ya. Ọ bụrụ na ị chọghị ka e sogbuo gị, mee ihe iwu chọrọ.[4] Onye nọ nꞌọchịchị bụ onyeozi Chineke. Ọ na-arụ ọrụ ya ịhụ maka ọdịmma gị. Ọ bụrụ na i mee ihe ọjọọ, o kwesịrị ka ụjọ ju gị obi na ọ ga-ata gị ahụhụ. Nꞌihi na Chineke ziri ya ka ọ taa ndị na-eme ihe ọjọọ ahụhụ.[5] Nꞌihi nke a, rube isi nꞌiwu gọọmentị nile, na iwu ndị na-achị achị nyere. Ọ bụghị nanị nꞌihi na Chineke ga-esite nꞌaka ha taa onye na-erubeghị isi ahụhụ, kama ọ bụ ihe kwesịrị ekwesị ka anyị mee.[6] Ọ bụkwa nꞌihi nke a ka unu ga-eji tụọ ụtụ taksi unu nꞌoge, ka ndị ọrụ gọọmentị nwee ike nọgide na-arụ ọrụ ahụ Chineke nyere ha ịrụ.[7] Kwụọnụ ụgwọ ọ bụla unu ji, ọ bụrụ na ị tụbeghị ụtụ taksi gị, gaa tụọ ya. Ruberenụ ndị isi unu isi. Sọpụrụnụ ndị nsọpụrụ ruru, ma na-akwanyerenụ ndị nkwanye ugwu ruru.[8] Kwụọnụ ụgwọ nile unu ji. Ka ụgwọ unu ga-ejide ndị mmadụ bụrụ ụgwọ ịhụ ha nꞌanya. Nꞌihi na mgbe ị na-ahụ ndị mmadụ nꞌanya, ị na-emezu ihe nile iwu Chineke chọrọ.[9] Nꞌihi na ọ bụrụ na ị hụ onye agbata obi gị nꞌanya dị ka i si hụ onwe gị nꞌanya, ị gaghị achọ igbu ya, i gaghị ezuru ihe o nwere, ị gaghị enwe anya ukwu nꞌebe ihe o nwere dị, ị gakwaghị eduru nwụnye ya ka gị na ya dinakọọ. Nꞌezie, ị pụrụ imezu ihe iwu nile kwuru ma ọ bụrụ na ị hụ onye agbata obi gị nꞌanya dị ka ị hụrụ onwe gị.[10] O nweghị onye na-echere onye ọ hụrụ nꞌanya echiche ọjọọ. Ọ bụ nke a mere ịhụnanya ji bụrụ idebezu iwu nile.[11] Ihe ọzọ mere o ji dị mkpa ibi ezi ndụ bụ nke a. Unu maara na oge ahụ anyị na-ele anya ya na-abịa nso. Ya mere, sitenụ nꞌụra bilie! Ọbịbịa Onyenwe anyị dị nso. Nꞌezie ọ dị nso karịa mgbe ahụ anyị kweere na mbụ.[12] Abalị ekeela abụọ, ọ fọdụrụ ntakịrị ugbu a, ọ bụrụ ụtụtụ, mgbe Kraịst ga-alọghachi. Ya mere, wezuganụ ọrụ ọjọọ nile nke ọchịchịrị, yikwasịkwanụ onwe unu ihe agha nke ezi ndụ, ụdị nke ndị bi nꞌihè kwesịrị iyiri.[13] Bụrụnụ ndị dị ọcha, na ndị na-ekwu eziokwu nꞌihe nile, ma ọ bụ nꞌehihie ma ọ bụkwanụ nꞌabalị. Unu atụfula oge unu ịkpọ oke oriri na ọṅụṅụ, ma ọ bụ ịkwa iko. Ndụ rere ure, esemokwu, ịlụ ọgụ na ekworo, bụ ihe unu na-ekwesịghị ịtụfu oge unu nꞌime ha.[14] Kama yikwasịnụ Onyenwe anyị Jisọs Kraịst ka o nyere unu aka ibi ezi ndụ. Ka ihe unu na-eche nꞌobị unu hapụ ịbụ otu unu ga-esi na-eme ihe ọjọọ nke na-agụ anụ ahụ mmehie unu.

LUK 11:21
“Mgbe nwoke dị ike jiri egbe na mma chee ụlọ ya nche, mmadụ ọ bụla enweghị ike bata nꞌime ụlọ ahụ zuo ohi.

MATIU 5:9
Ndị na-achọ udo nꞌetiti mmadụ na ibe ha bụ ndị a gọziri agọzi, nꞌihi na a ga-akpọ ha ụmụ Chineke.

Igbo Bible 1988
No Data