A A A A A

Mgbakwunye: [Inyere Ndị Ogbenye Aka]


GALETIA 2:10
Kama nanị otu ihe ha rịọrọ anyị, bụ ka anyị cheta inyere ndị ogbenye aka. Nke a bụkwa ihe m na-achọsi ike inyere ha aka.

MATIU 19:21
Jisọs zara sị ya, “Ọ bụrụ na ị chọrọ ịbụ onye zuru oke nꞌezie, laa nꞌụlọ gị ree ihe nile i nwere. Nyekwa ndị ogbenye ego i retara. Ị ga-enwe akụ na ụba nꞌeluigwe. Bịakwa soro m.”

LUK 12:33-34
[33] Reenụ ihe nile unu nwere nye ndị ogbenye. Nke a ga-eme ka akpa unu, nke dị nꞌelu, ju eju. Akpa ahụ dị nꞌelu epughị epu. Akụ unu dị nꞌeluigwe enwekwaghị ike ifu efu. Onye ohi ọ bụla enwekwaghị ike ịga nꞌebe ahụ zuo ha, nla apụkwaghị iricha ha[34] nꞌihi na ọ bụ ebe ọ bụla ego unu dị ka obi unu ga-adịkwa.

LUK 14:12-14
[12] Jisọs gwakwara onye ahụ kpọrọ ya oriri ahụ sị, “Mgbe ọ bụla ị chọrọ ịkpọ oriri, akpọla nanị ndị enyi gị na ụmụnne gị na ndị ikwu gị na ndị ọgaranya, nꞌihi na ọ bụrụ na ọ bụ ụdị ndị a nanị ka ị kpọrọ, ha ga-akpọkwa gị nꞌoge nke ha.[13] Kama mgbe ị na-akpọ oriri, kpọọ ndị ogbenye na ndị ụkwụ rụrụ na ndị ngwụrọ na ndị ìsì.[14] Ebe ọ bụ na ndị a enweghị ike ịkwụghachi gị, Chineke ga-agọzi gị, kwụghachikwa gị, dị ka ọ ga-esi kwụghachi gị mgbe ndị nwụrụ anwụ ga-esi nꞌọnwụ bilie.”

LUK 6:20-21
[20] Mgbe ihe ndị a na-eme, Jisọs tụgharịrị lee ndị na-eso ụzọ ya anya gwa ha okwu sị, “Lee obi ụtọ dịrị unu, ndị ogbenye, nꞌihi na alaeze eluigwe bụ nke unu.[21] “Lee obi ụtọ dịrị unu, unu ndị agụụ na-agụ nꞌihi na afọ ga-eju unu. Leekwa obi ụtọ dị na-eche unu mgbe ndị mmadụ na-akpọ unu asị, na mgbe a na-achụpụ unu, na-akparị unu, na-asịkwa na unu bụ ajọ mmadụ nꞌihi na unu na-eso m

2 KỌRINT 8:9
Nꞌihi na unu maara ụdị oke ịhụnanya na obi ọma nke Onyenwe anyị Jisọs nwere. Ọ bụ ezie na ọ bụ ọgaranya, ma ọ họọrọ ịbụ ogbenye nꞌihi unu, ka unu onwe unu site nꞌogbenye ya bụrụ ọgaranya.

JEMES 2:5
Geenụ ntị ka m gwa unu ụmụnna m, ọ̀ bụ na unu amataghị na Chineke ahọpụtala ndị ahụ ụwa gụrụ dị ka ndị ogbenye mee ha ka ha bụrụ ọgaranya site nꞌokwukwe ha, ka ha ketakwa alaeze ahụ Chineke kwere nkwa inye ndị hụrụ ya nꞌanya?

MAK 14:7
Unu na ndị ogbenye na-anọ oge nile. Unu nwekwara ohere inyere ha aka mgbe ọ bụla unu chọrọ. Ma mụ na unu agaghị anọ tee anya.

LUK 6:38
Kenyenụ ndị ọzọ ihe unu nwere, Chineke ga-enyeghachikwa unu. Onyinye unu ga-anata ga-abụ onyinye juru juru eju, nke a bịadara nke ọma, nke a yọgharịrị mee ka o jubiga oke, na nke na-asọgharị. Kama ọ bụ ụdị onyinye unu nyere, onyinye ukwu ma ọ bụ onyinye nta, ka Chineke ga-enyeghachikwa unu.”

MATIU 5:42
Nye onye ọ bụla rịọrọ gị ihe. Achụghachikwala ndị na-abịa ka ị binye ha ego.

JEMES 1:27
Ezi okpukpe Chineke, nke Chineke na-anabata dị ka okpukpe dị ọcha, na nke na-enweghị ọrụ, bụ ka anyị lekọtaa ndị na-enweghị nne na nna nꞌime nsogbu ha. Ka anyị debe onwe anyị iche hapụ ịmerụ onwe anyị nꞌụwa.

1 JỌN 3:17
Ọ bụrụ na otu nwanna nꞌime Kraịst mkpa na-akpa bịakwutere otu onye kpọrọ onwe ya onye Kraịst nwere akụ na ụba na ihe oriri, ma nwanna nwere akụ na ụba ahụ emechie obi ya nꞌebe nwanna ahụ nọ, jụ inyere ya aka, ịhụnanya Chineke ò si aṅaa dịrị nꞌime onye dị otu a?

MATIU 25:31-46
[31] “Mgbe mụ bụ Nwa nke mmadụ ga-abịa nꞌebube m, mụ na ndị mmụọ ozi nile dị nsọ, mgbe ahụ ka m ga-anọ nꞌelu ocheeze ebube m.[32] Mba nile nke ụwa ga-ezukọtakwa nꞌihu m. M ga-ekewapụta ha, otu obodo site nꞌibe ya, dị ka onye ọzụzụ atụrụ si ekewapụta ụmụ atụrụ site nꞌụmụ ewu.[33] M ga-edebe ụmụ atụrụ ahụ nꞌakụkụ aka nri m, ma ụmụ ewu ga-anọ nꞌaka ekpe m.[34] “Mgbe ahụ, mụ bụ eze, ga-asị ndị nọ nꞌaka nrị m, batanụ nꞌime alaeze m, unu ndị Nna unu gọziri agọzi. Batanụ nꞌime alaeze nke e doziiri unu site na mgbe e kere ụwa.[35] Nꞌihi na mgbe agụụ gụrụ m unu nyere m nrị. Mgbe akpịrị kpọrọ m nkụ unu nyere m mmiri ọṅụṅụ. Mgbe m na-agba ọtọ, unu zụtara uwe nye m, mgbe m dara ọrịa unu lekọtara m. Anọkwara m nꞌụlọ mkpọrọ unu bịara leta m.[36] ***[37] “Ndị ezi omume ahụ ga-ajụ m sị, ‘Onyenwe anyị, olee mgbe anyị hụrụ gị ka agụụ na-agụ gị anyị enye gị nri? Olee mgbe anyị hụrụ gị ka akpịrị na-akpọ gị nkụ, anyị ekuru mmiri ọṅụṅụ nye gị?[38] Olee mgbe kwa ka anyị hụrụ gị dị ka onye ọbịa anyị akpọbata gị nꞌime ụlọ anyị? Olee mgbe kwa ka anyị hụrụ gị ka ị na-agba ọtọ anyị enye gị uwe?[39] Olee mgbe kwa ka anyị hụrụ gị nꞌọrịa, ma ọ bụ nꞌụlọ mkpọrọ anyị abịa leta gị?’[40] “Mụ bụ eze ahụ ga-azaghachi ha sị, nezie asị m unu, mgbe unu mesoro otu nꞌime ndị a dị nta nꞌime ụmụnne m omume ọma, ọ bụ m ka unu mesoro omume ahụ.[41] “Mgbe ahụ aga m asịkwa ndị nọ nꞌaka ekpe m, pụọnụ nꞌihu m unu ndị a bụrụ ọnụ. Baanụ nꞌime ogbu ọkụ ebighị ahụ a kwadobeere ekwensu na ndị mmụọ ozi ya.[42] Nꞌihi na mgbe agụụ na-agụ m, unu enyeghị m ihe ọ bụla ka m rie. Mgbe akpịrị na-akpọ m nkụ unu ekunyeghị m mmiri ka m ṅụọ.[43] Mgbe m nọ dị ka ọbịa unu akpọbataghi m nꞌulo unu, mgbe m na-agba ọtọ unu enyeghị m uwe ka m kpuchie ọtọ m. Mgbe ahụ na-esighị m ike unu elekọtaghị m. Mgbe m nọ nꞌụlọ mkpọrọ, unu abịaghị leta m.[44] “Mgbe ahụ ha ga-azakwa sị, ‘Onyenwe anyị, olee mgbe anyị hụrụ gị ka agụụ na-agụ gị, ma ọ bụ ka akpịrị na-akpọ gị nkụ, ma ọ bụ oge ị bụ onye ọbịa, ma ọ bụ oge ị na-agba ọtọ, ma ọ bụ oge ị nọ nꞌọrịa, ma ọ bụ ị nọ nꞌụlọ mkpọrọ, ma anyị elekọtaghị gị?’[45] “M ga-aza ha sị, eziokwu ahụ bụ nke a, mgbe ahụ unu jụrụ inyere otu nꞌime ndị a dị nta aka, ọ bụ m ka unu jụrụ inyere aka.[46] “Ndị a ga-aba nꞌita ahụhụ ebighị ebi. Ma ndị ezi omume ga-aba na ndụ ebighị ebi.”

ỌLU OZI 20:35
Nꞌoge ọ bụla, abụkwa m ihe ilere anya nye unu banyere inyere ndị ogbenye aka. Nꞌihi na echetara m okwu ahụ Onyenwe anyị kwuru mgbe ọ sịrị, ‘Ọ̀ dị mma inye enye karịa ịnara anara.’ ”

LUK 3:11
Jọn zara sị ha, “Ọ bụrụ na i nwere uwe abụọ, nye onye na-enweghị uwe ọ bụla otu. Ọ bụrụkwa na i nwere nri, kenye ndị agụụ na-agụ.”

EFESỌS 4:28
Ka onye na-ezu ohi kwụsị izu ohi. Kama ya jiri aka ya abụọ rụpụta ego, ka o nwee ike inyere ndị ọzọ nọ na mkpa aka.

1 JỌN 3:17-18
[17] Ọ bụrụ na otu nwanna nꞌime Kraịst mkpa na-akpa bịakwutere otu onye kpọrọ onwe ya onye Kraịst nwere akụ na ụba na ihe oriri, ma nwanna nwere akụ na ụba ahụ emechie obi ya nꞌebe nwanna ahụ nọ, jụ inyere ya aka, ịhụnanya Chineke ò si aṅaa dịrị nꞌime onye dị otu a?[18] Ndị m hụrụ nꞌanya, ka ngosi anyị na-egosi ịhụnanya anyị nꞌebe ndị ọzọ nọ ghara ịbụ nanị nꞌegbugbere ọnụ anyị na ikwu okwu efu. Kama ka anyị na-egosi ya site nꞌokwu ọnụ anyị na omume anyị.

MATIU 25:40
“Mụ bụ eze ahụ ga-azaghachi ha sị, nezie asị m unu, mgbe unu mesoro otu nꞌime ndị a dị nta nꞌime ụmụnne m omume ọma, ọ bụ m ka unu mesoro omume ahụ.

GALETIA 6:2
Na-eburịtanụ nsogbu dịrị ibe unu, ma sitenụ otu a debezuo iwu Onyenwe anyị.

HIBRU 13:16
Unu echefula iyikwasị onwe unu ịma mma dị ka uwe. Meekwanụ ka ndị nile chọrọ inye aka unu soro unu nwekọọ ihe unu nwere. Nke a bụ ụdị aja na-atọ Chineke ụtọ.

ROM 12:13
Ọ bụrụ na ụmụnna unu nꞌime Kraịst anọọ na mkpa, meenụ ka ha keta oke nꞌihe unu nwere. Na-elekọtakwanụ ndị ọbịa nke ọma.

LUK 3:10-11
[10] Ndị mmadụ ahụ jụrụ Jọn sị ya, “Gịnị ka ị chọrọ ka anyị mee?”[11] Jọn zara sị ha, “Ọ bụrụ na i nwere uwe abụọ, nye onye na-enweghị uwe ọ bụla otu. Ọ bụrụkwa na i nwere nri, kenye ndị agụụ na-agụ.”

Igbo Bible 1988
No Data