1 TIMỌTI 5:8 |
Ọ bụrụ na onye ọ bụla ajụ inyere ikwu na ibe ya ka, nke ka nke, onye ọ bụla jụrụ inyere ndị ezinụlọ nke aka ya aka, ekwesịghị ịkpọ onwe ya onye nke Kraịst. Nꞌihi na onye dị otu a dị njọ karịa onye na-ekpere arụsị. |
|
2 KỌRINT 9:8 |
Chineke nwere ike inye unu karịa ihe na-akpa unu, ka unu naenwezukwa ihe unu chọrọ mgbe nile. Mgbe ahụ unu ga-enwezukwa ihe nile unu ji arụ ọrụ ọma. |
|
EFESỌS 3:20 |
Ugbu a, ka otuto dịrị Chineke onye nwere ike imere anyị karịa ka anyị pụrụ ịrịọ ya, ma ọ bụ karịa ka anyị pụrụ ichepụta nꞌuche anyị, site nꞌike ya na-arụ ọrụ nꞌime anyị. Ka otuto dịrị ya nꞌime nzukọ ya bụ chọọchị na nꞌime Kraịst mgbe nile, na site mgbe ebighị ebi ruo ebighị ebi! Amin. |
|
JEMES 1:17 |
Onyinye ọ bụla dị mma, na nke zuru oke na-esite nꞌeluigwe abịa. Ọ na-esite nꞌebe Chineke dị ukwuu nke eluigwe, onye kere ihe nile na-abịa. Chineke enweghị oge ọ na-agbanwe, nꞌihi na ọ dịghị ka onyinyo mmadụ nke na-agbanwe agbanwe. |
|
JỌN 10:10 |
Onye ohi na-abịa ka o bibie. Ma mụ onwe m na-abịa inye ndụ nke na-ejubiga oke. |
|
LUK 6:38 |
Kenyenụ ndị ọzọ ihe unu nwere, Chineke ga-enyeghachikwa unu. Onyinye unu ga-anata ga-abụ onyinye juru juru eju, nke a bịadara nke ọma, nke a yọgharịrị mee ka o jubiga oke, na nke na-asọgharị. Kama ọ bụ ụdị onyinye unu nyere, onyinye ukwu ma ọ bụ onyinye nta, ka Chineke ga-enyeghachikwa unu.” |
|
LUK 6:45 |
Ezi mmadụ na-esite nꞌakụ ọma juru ya obi na-arụpụta ezi ihe, otu a kwa ajọ mmadụ na-esite nꞌobi ọjọọ ya na-arụpụta ajọ ihe. Nꞌihi na ihe ọ bụla dị mmadụ nꞌobi bụ ihe na-apụta nꞌọnụ ya. |
|
MATIU 6:33 |
Ọ ga-enyekwa unu ihe ndị a nile, ma ọ bụrụ na unu eburu ụzọ nye ya onwe unu, na-adịkwa ndụ dị ka o si chọọ. |
|
FILIPAI 4:19 |
Ọ bụ Chineke m ga-egboro unu mkpa unu nile, site nꞌụlọ akụ ebube ya nke eluigwe, nꞌihi ihe Kraịst Jisọs meere anyị. |
|
ROM 15:13 |
Ya mere, ekpere m na-ekpe bụ ka Chineke onye na-enye anyị olileanya, were ọṅụ na udo na-adịgide mejupụta unu, mgbe unu na-atụkwasị ya obi, site nꞌike Mmụọ Nsọ ahụ bi nꞌime unu. |
|
Igbo Bible 1988 |
No Data |