A A A A A

Mgbakwunye: [Mmanya na-aba n'anya]


1 PITA 4:3
Nꞌoge gara aga unu tụfuru ọtụtụ oge ime ihe ndị ahụ na-atọ ndị na-amaghị Chineke ụtọ. Ndụ unu jupụtara nꞌagụụ ịkwa iko, na agụụ ime ọjọọ, na ịṅụbiga mmanya oke, na ịkpọ oriri, na ife arụsị, nke na-eduba na mmehie ọjọọ dị iche iche.

1 TIMỌTI 5:23
Aṅụkwala nanị mmiri. Kama o kwesịrị ka ị na-aṅụtụ mmanya ntakịrị ntakịrị nꞌihi ọrịa afọ nke ị na-arịa mgbe nile.

EFESỌS 5:18
Unu aṅụbigala mmanya oke nke ga-emerụ unu. Kama jupụtanụ na Mmụọ Nsọ.

ROM 13:13
Bụrụnụ ndị dị ọcha, na ndị na-ekwu eziokwu nꞌihe nile, ma ọ bụ nꞌehihie ma ọ bụkwanụ nꞌabalị. Unu atụfula oge unu ịkpọ oke oriri na ọṅụṅụ, ma ọ bụ ịkwa iko. Ndụ rere ure, esemokwu, ịlụ ọgụ na ekworo, bụ ihe unu na-ekwesịghị ịtụfu oge unu nꞌime ha.

1 KỌRINT 10:23-24
[23] Ọ bụ ezie na anyị nwere ike ime ihe nile, dị ka iri nri e ji chụọra arụsị aja, ma ọ bụghị ihe nile dị mma omume. Anyị nwekwara ike ime ihe nile, ma ọ bụghị ihe nile nwere ike inyere anyị aka.[24] Ka anyị hapụ ịchọ ọdịmma nke anyị nanị, kama anyị ga na-achọ ọdịmma nke ndị ọzọ, ime ihe ga-enyere ha aka.

GALETIA 5:19-21
[19] Mgbe ọ bụla kwa anyị na-agbaso ọchịchọ ọjọọ nile nke ndụ anyị, ọ bụ nanị ihe ọjọọ ndị a ga na-apụta ìhè na ndụ anyị: iche echiche na-adịghị ọcha, ịkwa iko na agụụ ịkwa iko.[20] Ikpere arụsị, iri amusu, ibu iro nꞌobi, na ịlụ ọgụ, ekworo na iwe, ịkpa iche iche, nkewa, ịhọ otu.[21] Ịkpọ asị, igbu ọchụ, ịṅụbiga mmanya oke, oke oriri na ihe ndị ọzọ yiri ha. Ma dị ka m gwara unu nꞌoge gara agwa, ndị na-eme ihe dị otu a agaghị abanye nꞌalaeze Chineke.

1 KỌRINT 9:19-23
[19] Site nꞌụzọ dị otu a, abụghị m ohu onye ọ bụla nꞌihi na o nweghị onye m nọ nꞌokpuru ya nke na-akwụ m ụgwọ ọrụ, kama abụ m onyenwe onwe ya. Ma emeela m onwe m ohu nye mmadụ nile ka m nwee ike site nꞌụzọ dị otu a rite ọtụtụ mkpụrụ obi nꞌuru nye Kraịst.[20] Mgbe ọ bụla m bịara nꞌetiti ndị Juu ana m eme dị ka onye Juu, ka m nwee ike nwetara Kraịst ụfọdụ nꞌime ha. Ọ bụ ezie na anọghị m nꞌokpuru iwu Mosisi, ma mgbe m nọ nꞌetiti ndị mba ọzọ ndị na-ebi ndụ dị ka usoro okpukpe iwu ndị Juu si dị, ana m emekwa dị ka m bụ otu nꞌime ndị nọ nꞌokpuru iwu, ka m si otu a nwee ike ikwusara ha ozi ọma, inyere ha aka.[21] Otu aka ahụ kwa, mgbe mụ na ndị mba ọzọ na-anọghị nꞌokpuru iwu nọkọrọ, ana m eme dị ka ha si eme ka m nwee ike site nꞌụzọ dị otu a mee ka ha mata Kraịst. Ma nke a apụtaghị na m na-akwụsị ime ihe Chineke na-achọ. Mba! Ana m emekwarị dị ka onye nọ nꞌokpuru iwu Kraịst.[22] Ọ bụrụkwa na mụ na ndị okwukwe ha na-esighị ike anọkọọ, ana m emekwa dị ka ha, ka m nwee ike mee ka ha mata Kraịst. Ee, otu ọ bụla mmadụ si dịrị, ana m agbalị chọọ ụzọ m ga-esi mee ka ọ nabata m, ka m nwee ike gwa ya ihe banyere Kraịst, Ka Kraịst zọpụta ya.[23] Ana m eme ihe ndị a ka ozi ọma nwee ike ruo ha nile ntị. Ana m emekwa ya nꞌihi ngọzi m na-enweta mgbe m na-ele ha ka ha na-anabata Jisọs dị ka Onyenwe ha na Onye nzọpụta ha.

ROM 14:15-21
[15] Ọ bụrụkwa na ihe ị na-eri na-ewute nwanna gị, ị naghị egosi na ị hụrụ ya nꞌanya ma ị gaa nꞌihu nọgide na-eri ihe ahụ. Ekwela ka nri ị na-eri bụrụ ihe gaewetara nwanna gị ịla nꞌiyi, nꞌihi na cheta na ọ bụkwa nꞌihi ya ka Kraịst ji bịa nwụọ.[16] A sịkwarị na ihe ị na-eme dị mma, emela ya, ma ọ bụrụ na ọ ga-eme ka ndị ọzọ kwujọọ gị.[17] Nꞌihi na ihe dị mkpa na ndụ onye Kraịst abụghị ihe anyị riri, ma ọ bụ ihe anyị ṅụrụ. Kama ọ bụ ime ka ezi omume, na udo, na ọnụ na-esi nꞌaka Mmụọ Nsọ abịa dịrị na-aga nꞌihu.[18] Nꞌihi na ọ bụrụ na i nye Kraịst ohere ka ọ bụrụ onye ga-ekpebi ụdị omume ị ga-eme, obi ga-atọ Chineke ụtọ, ndị mmadụ ga-ahụkwa ya nꞌime gị.[19] Ka ihe naagụsị gị agụụ ike bụrụ ime ihe gaeweta udo na ime ihe nꞌụzọ a ga-esi mee ka e wulie ndị ọzọ elu.[20] Emebila ọrụ Chineke rụrụ nꞌihi ihe oriri. Cheta na nri nile dị ọcha dịkwa mma, ma erila nke ọ bụla ga-eme ka mmadụ mee mmehie.[21] Nꞌezie, ọ ga-aka mma ịhapụ iri ihe nile ga-eme ka nwanna anyị nwee obi ọjọọ, ma ọ bụ daba nꞌime mmehie.

JỌN 2:3-11
[3] Ọ dịghị anya mgbe ha nọ nꞌebe ahụ, mmanya ha na-aṅụ gwụrụ. Nne Jisọs bịakwutere ya gwa ya sị, “Mmanya ha agwụchaala!”[4] Ma Jisọs zara nne ya sị, “Nne, nke a abụghị nsogbu m. Oge m ji eme ihe ịrịba ama erubeghị.”[5] Nne ya gwara ndị na-eje ozi nꞌebe ahụ sị, “Ihe ọ bụla ọ sị unu mee, meenụ ya.”[6] Nꞌụlọ ahụ ha nọ, a dọbara ite mmiri isii buru ibu. Otu nꞌime ite ndị a na-eri ihe dị ka iri lita mmiri ạnọ. Nꞌime ite a ka ndị Juu na-agbanye mmiri ha ji asa ụkwụ ha, na aka ha, na ihu ha, tupuu ha ekpee ekpere.[7] Jisọs gwara ndị na-eje ozi ahụ okwu sị, “Kujuonụ ite ndị a na mmiri!” Ndị ahụ mere ihe ọ gwara ha.[8] Emesịa Jisọs sịrị ha, “Sitenụ nꞌime ite a kuru ihe ọṅụṅụ bulaara onyeisi oche oriri ọlụlụ di na nwụnye a!” Ha mekwara ihe Jisọs gwara ha.[9] Mgbe onyeisi oche ahụ detụrụ mmiri ahụ e mere ka ọ ghọọ mmanya ọnụ, (ma ọ maghị ebe o si pụta nanị ndị na-eje ozi maara), ọ kpọrọ di nwanyị ọhụrụ ahụ sị ya, “Nꞌoge mmemme ọ bụla, a na-eburu ụzọ nye mmanya dị ụtọ. Mgbe ndị mmadụ ṅụjuchara afọ, ruo na mgbe ‘Kama mmanya dọrọ nꞌite ka ọ dọrọ nꞌafọ,’ e bido na-ebupụta mmanya na-adịghị ụtọ. Ma i meghị nke a! I debere mmanya ọma a ruo ugbu a.”[10] ***[11] Nke a bụ ọrụ ịtụnanya mbụ Jisọs rụrụ nꞌobodo Kena dị nꞌime Galili. Site nꞌihe ịtụnanya a, Jisọs zipụtara ike ya. Ndị na-eso ụzọ ya kwenyekwara na ya.

Igbo Bible 1988
No Data