A A A A A


Chọọ

MATIU 5:9
Ndị na-achọ udo nꞌetiti mmadụ na ibe ha bụ ndị a gọziri agọzi, nꞌihi na a ga-akpọ ha ụmụ Chineke.


MATIU 5:23
“Ọ bụrụ na ị gaa inye onyinye gị nꞌụlọ nsọ Chineke, ma i cheta nꞌebe ahụ na gị na nwanne gị adịghị nꞌudo,


MATIU 5:24
hapụ onyinye gị nꞌebe ịchụ aja laa ka gị na nwanne gị kpezie. Mgbe unu dịrị nꞌudo, laghachi bịa nye onyinye gị.


MATIU 5:41
Ọ bụrụ na mmadụ esite nꞌike chọọ ka i soro ya gaa puku nzọ ụkwụ atọ, soro ya gaa puku nzọ ụkwụ isii, ma ọ bụrụ na nke a ga-eme ka udo dịrị.


MATIU 10:12
Mgbe unu na-arịọ ịnọdụ nꞌụlọ onye ọ bụla gosinụ na unu ji obi ọcha bịa, na unu bụ ndị udo.


MATIU 10:34
“Unu echekwala na m bịara iweta udo nꞌụwa. Abịaghị m iweta udo, kama ọ bụ iwebata mma agha.


Markuksen 5:34
Jisọs zara sị, “Ada m, okwukwe gị emeela ka ahụ dị gị mma. Laa nꞌudo. Bụrụkwa onye nweere onwe ya site na nrịrịa!”


Markuksen 6:20
Nꞌihi na Herọd tụrụ egwu Jọn. Ọ maara na Jọn bụ ezi mmadụ, na onye dị nsọ. Nꞌihi nke a o tinyere ya nꞌụlọ mkpọrọ ichebe ndụ ya. Site nꞌoge ruo nꞌoge, Herọd na-akpọpụta Jọn ka ya na ya kparịa ụka. Ma ọ bụ ezie na Herọd adịghị enwe obi udo mgbe ọ bụla ya na Jọn kaparịtara ụka, ma ọ na-atọkwa Herọd ụtọ ịna anụ ihe Jọn na-ekwu.


Markuksen 9:50
“Nnu bụ ihe dị mma. Ma ọ bụrụ na nnụ etufuo ụtọ ya, gịnị ka a ga-eji mee ka ọ dị ụtọ ọzọ? Ya mere, unu etufula ụtọ unu. Unu na ibe unu biri nꞌudo.”


LUK 8:12
Tien laitaan pudonnut siemen tarkoittaa ihmisiä, jotka kuulevat sanan mutta joiden sydämestä Paholainen heti tulee ottamaan sen pois, jotta he eivät uskoisi ja pelastuisi.


LUK 8:13
Kalliolle pudonnut siemen tarkoittaa niitä, jotka sanan kuullessaan ottavat sen iloiten vastaan mutta uskovat vain hetken aikaa. Heillä ei ole juurta, ja niin he koetukseen joutuessaan luopuvat.


LUK 8:14
Ohdakkeisiin pudonnut osa tarkoittaa niitä, jotka kuulevat sanan mutta sitten tukahtuvat elämän huoliin, rikkauteen ja nautintoihin. He eivät tuota kypsää satoa.


LUK 8:15
Mutta hyvään maahan pudonnut siemen tarkoittaa niitä, jotka sanan kuultuaan pysyvät siinä puhtain ja ehein sydämin ja kestävinä tuottavat satoa.


LUK 11:47
"Voi teitä! Te rakennatte muistomerkkejä profeettojen haudoille, mutta ketkä heidät tappoivat? Teidän isänne.


JỌN 5:28
Älkää ihmetelkö tätä! Tulee aika, jolloin kaikki, jotka lepäävät haudoissaan, kuulevat hänen äänensä.


JỌN 5:29
He nousevat haudoistaan -- hyvää tehneet elämän ylösnousemukseen, pahaa tehneet tuomion ylösnousemukseen.


JỌN 19:23
Ristiinnaulittuaan Jeesuksen sotilaat ottivat hänen vaatteensa ja jakoivat ne neljään osaan, kullekin sotilaalle osansa. He ottivat myös paidan, mutta kun se oli saumaton, ylhäältä alas samaa kudosta,


ỌLU OZI 2:47
Ha nọgidere ito Chineke. Chineke mekwara ka udo dị nꞌetiti ha na ndị bị na Jerusalem. Chineke mekwara ka ọtụtụ mmadụ bụrụ ndị a na-azọpụta. Ndị a a zọpụtara na-ejikọ onwe ha nꞌọgbakọ ndị nile kwere ekwe.


ỌLU OZI 7:26
“Nꞌụbọchị nke abụọ ya, Mosisi hụrụ ụmụnna ya abụọ ka ha na-alụ ọgụ. Ọ gbalịrị ime ka udo dịrị nꞌetiti ha. Ọ gwara ha sị, ‘Unu bụ ụmụnna, gịnị mere unu ji emegburita onwe unu?’


ỌLU OZI 9:31
Nꞌihi na Sọl ghọrọ onye kwere ekwe mere ka a kwụsị ịkpagbu ndị kwere ekwe. Nzukọ Kraịst nile, ndị dị na Judia, Galili na Sameria, nọọrọ nꞌudo, guzosiekwa ike nꞌokwukwe ha. Ndị kwere ekwe biri ndụ ịsọpụrụ Chineke site nꞌinyeaka nke Mmụọ Nsọ. Ha gakwara nꞌihu na-amụba.


ỌLU OZI 10:36
Ana m eche na unu anụla ihe banyere ozi ọma ahụ Chineke zigaara ndị Juu. Ozi ọma nke na-asị na udo dị ugbu a nꞌetiti Chineke na mmadụ site nanị na Jisọs, Onye nzọpụta na Onyenwe ihe nile.


ỌLU OZI 12:20
Mgbe Herọd nọ na Sizaria, ndị obodo Taịa na Saidọn zipụrụ ndị ozi ha izute ya nꞌihi na Herọd na-eweso ha iwe. Ma ndị ozi a buru ụzọ mee ka ha na Blastọs ode akwụkwọ eze bụrụ enyi. Ha rịọrọ ya ka o mee ka udo dịrị. Nꞌihi na ndị obodo ahụ na-esite nꞌobodo nke Herọd na-achị na-enweta ihe oriri ha.


ỌLU OZI 23:24
“Gaanụ jikere narị ndị agha abụọ. Ndị a ga-aga Sizaria nꞌelekere toolu nke abalị a. Họpụtakwa narị ndị na-ama ube abụọ na iri ndị na-agba inyinya asaa. Nyekwa Pọl inyinya nke ọ ga-agba, ma mee ka o rute nꞌebe Feliks onye na-achị akụkụ a nọ nꞌudo.”


ỌLU OZI 24:2
Mgbe a kpọbatara Pọl, Tatulọs pụtara guzo kwuo sị, “Onye a na-asọpụrụ ka gị Feliks bụ. I nyela anyị ndị Juu ahụ udo. I meela ka anyị hapụ ịbụkwa ndị a na-eleda anya.


ỌLU OZI 27:7
Anyị nwere ọtụtụ ụbọchị nke na-enyeghị anyị ahụ udo. Nꞌoge anyị na-erute nso Snidus, oke ifufe bidoro ifesi ike. Anyị enwekwaghị ike ịga nꞌihu nꞌụzọ ahụ. Nꞌihi ya anyị chigharịrị ihu site ụzọ ọnụ mmiri Salmone.


ỌLU OZI 27:44
Ma ọ sịrị ndị na-enweghị ike igwu mmiri gbalịa ịchọ ụzọ ọzọ, site nꞌịghọnye aka na mkpirikpi osisi na nꞌihe ndị ọzọ si nꞌahụ ụgbọ ahụ. Ya mere mmadụ nile rutere elu ala nꞌudo.


ROM 1:7
Nꞌihi ya, ana m edere unu nile bi na Rom akwụkwọ a, unu ndị Chineke hụrụ nꞌanya, ndị a kpọkwara ka ha dị nsọ. Ekpere m bụ ka Chineke nna anyị na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, nye unu amara ya na udo ya.


ROM 2:10
Ma otuto na nsọpụrụ na udo nke si nꞌebe Chineke nọ, ga-abụ nke onye ọ bụla na-eme ihe Chineke na-achọ, ee, onye Juu ọ bụla na ndị mba ọzọ.


ROM 3:17
Ha amaghị ihe a na-akpọ udo.


ROM 3:21
Ma ugbu a, Chineke egosila anyị ụzọ ọhụrụ, nke ya na ụmụ mmadụ ga-esi dịrị nꞌudo. Ọ bụghị ụzọ metụtara idebe iwu. Ọ bụ ụzọ ọhụrụ. Nꞌezie, ọ bụghị ụzọ ọhụrụ, nꞌihi na ndị amụma agbaalarị ama, e dekwara ya nꞌakwụkwọ iwu, na Chineke ga-eme ihe dị otu a.


ROM 5:1
Ugbu a ebe e sitere nꞌokwukwe anyị mee ka anyị na Chineke dịrị na mma, udo dị ugbu a nꞌetiti anyị na Chineke nꞌihi ihe Onyenwe anyị Jisọs Kraịst meere anyị.


ROM 5:10
Nꞌihi na ọ bụrụ na mgbe anyị bụ ndị iro ya, Chineke mere ka anyị na ya dịrị nꞌudo, site nꞌọbara ahụ Kraịst kwafuru, ọ̀ bụkwaghị eziokwu na Chineke ga-azọpụta anyị ugbu a o bi nꞌime anyị, nꞌihi na e meela ka anyị na ya dịrị nꞌudo?


ROM 5:11
Ọ bụkwaghị nanị nke a, ma anyị na-aṅụrịkwa ọṅụ nꞌọnọdụ ọhụrụ a, nke anyị na Chineke ịnọ nꞌudo, nke e mere ka ọ dịrị site nꞌihe Onyenwe anyị Jisọs Kraịst meere anyị mgbe ọ nwụrụ, ka e site nꞌaka ya mee ka mgbaghara Chineke rute anyị aka.


ROM 5:18
Nꞌezie, mmehie nke Adam mehiere, bụ ihe wetara ikpe ọmụma nye mmadụ nile, ma ezi omume nke Kraịst, bụ ihe na-eme ka mmadụ na Chineke dịrị nꞌudo.


ROM 8:6
Mkpụrụ obi ọ bụla na-agbaso ọchịchọ nke ọdịdị ochie ya ga-anwụ. Ma mkpụrụ obi na-agbaso Mmụọ Nsọ Chineke ga-ebi ndụ nꞌudo.


ROM 9:31
ma ndị Juu nọ kemgbe na-agbalisi ike ime ka ha na Chineke dịrị nꞌudo site nꞌidebe iwu, enwebeghị ike ime onwe ha ndị Chineke ga-anabata?


ROM 10:15
Oleekwanụ otu mmadụ ga-esi pụọ gaa kwusaa, ma ọ bụrụ na o nweghị ndị zipụrụ ya? Nke a bụ ihe akwụkwọ nsọ na-ekwu mgbe ọ sịrị, “Lee ka ọbịbịa ndị na-ekwusa ozi ọma udo nke dị nꞌetiti Chineke na mmadụ si maa mma.”


ROM 12:16
Soronụ ndị ọzọ biri nꞌudo. Anyala isi, kama wedata onwe gị ala. Jirikwa ọṅụ mee ka gị na ndị ọnọdụ ha dị ala na-enwe mmekọrịta, echekwala na ị maara ihe nile.


ROM 12:18
Gị na onye ọ bụla esela okwu. Dị ka ike gị nile ha, mee ka gị na onye ọ bụla biri nꞌudo.


ROM 14:17
Nꞌihi na ihe dị mkpa na ndụ onye Kraịst abụghị ihe anyị riri, ma ọ bụ ihe anyị ṅụrụ. Kama ọ bụ ime ka ezi omume, na udo, na ọnụ na-esi nꞌaka Mmụọ Nsọ abịa dịrị na-aga nꞌihu.


ROM 14:19
Ka ihe naagụsị gị agụụ ike bụrụ ime ihe gaeweta udo na ime ihe nꞌụzọ a ga-esi mee ka e wulie ndị ọzọ elu.


ROM 15:5
Ka Chineke, onye na-enye ntachi obi, onye na-agbakwa ndị na-ada mba ume, nye unu mmụọ nke ịdị nꞌotu, ka unu nwee ike ibi nꞌudo, ka unu nweekwa ike mesoo ibe unu ụdị mmeso ahụ Kraịst mesoro anyị.


ROM 15:13
Ya mere, ekpere m na-ekpe bụ ka Chineke onye na-enye anyị olileanya, were ọṅụ na udo na-adịgide mejupụta unu, mgbe unu na-atụkwasị ya obi, site nꞌike Mmụọ Nsọ ahụ bi nꞌime unu.


ROM 15:33
Ugbu a ka Chineke anyị onye na-enye udo, nọnyere unu nile. Amin.


ROM 16:20
Mgbe na-adịghị anya, Chineke onye na-enye udo ga-azọpịa ekwensu na ndị ọrụ ya nꞌokpuru ụkwụ unu. Ka amara Onyenwe anyị Jisọs dịnyere unu. Yenwe anyị Jisọs dịnyere unu.


1 KỌRINT 1:3
Ka Chineke nna na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst nye unu amara na udo nke na-esi nꞌaka ya na-abịa.


1 KỌRINT 7:15
Ma ọ bụrụ na di ma ọ bụ nwụnye nke na-ekweghị ekwe achọọ ikewapụ onwe ya, ka di ma ọ bụ nwụnye nke kwere ekwe ghara ịkwụsị ha. Ha kewapụ onwe ha. Nke a bụ nꞌihi na Chineke chọrọ ka ụmụ ya bie ndụ udo nꞌezinụlọ ha.


1 KỌRINT 9:16
Ọ bụghị na ọ dị ihe ọzọ pụrụ iche ikwusa ozi ọma na-ewetara m. Enweghị m ike ịkwụsị ikwusa ozi ọma. Nꞌihi na ọ bụrụ na m akwụsị ikwusa ozi ọma, agaghị enwe udo na ọṅụ ọ bụla. Onye a bụrụ ọnụ ka m ga-abụ ma ọ bụrụ na m akwụsị ikwusa ozi ọma Onyenwe anyị.


2 KỌRINT 1:2
Ka amara na udo na-esite nꞌebe Chineke Nna anyị, na nꞌebe Onyenwe anyị Jisọs Kraịst nọ, dịrị unu.


2 KỌRINT 3:9
Ọ bụrụ na ụzọ ahụ na-eweta ọnwụ ji ebube bịa, ebube nke ụzọ ọhụrụ ahụ na-eweta udo nꞌetiti Chineke na mmadụ ga-adịkwa ukwuu.


2 KỌRINT 3:16
Ma mgbe onye ọ bụla si na mmehie ya chegharịa, lọghachikwute Onyenwe anyị, mgbe ahụ a na-eme ka ihe mkpudo ahụ gharakwa ịdị.


2 KỌRINT 3:18
Ma anyị nile ndị bụ ụmụ Chineke enweghị ihe mkpudo ọ bụla nꞌihu anyị. Anyị dị ka enyo na-egosi ndị mmadụ ebube Chineke. Mgbe Mmụọ Onyenwe anyị na-arụ ọrụ ya nꞌime anyị, ọ na-agbanwe anyị, ime ka anyị dịrị ka ya.


2 KỌRINT 5:18
Ma ọ bụ Chineke bụ onye na-eme ihe ndị a. Ọ bụ ya onwe ya sitere nꞌaka Kraịst mee ka anyị na ya dịrị nꞌudo. Ma ugbu a o nyela anyị ọrụ ije ozi, ịkpọ ndị ọzọ ka ha bịa ka ya na ha dịrịkwa nꞌudo.


2 KỌRINT 5:19
Ozi ọma Chineke ziri anyị ikwusa bụ na ọ chọrọ ka ya na mmadụ nile dị nꞌudo site na Kraịst. Chineke agụkwaghị mmehie nile mmadụ mere megide ya, kama o jirila ọbara Kraịst sachapụ ha.


2 KỌRINT 13:11
Ugbu a ụmụnna m nꞌime Kraịst, ka m jiri okwu ndị a mechie akwụkwọ ozi a. Na-aṅụrịnụ ọnụ! Na-etokwanụ eto nꞌime Kraịst. Werenụ okwu ndị a m gwara unu rụọ ezi ọrụ. Na-ebikwanụ nꞌudo. Ka Chineke onye hụrụ anyị nꞌanya, na onye na-enye anyị udo dịnyeere unu.


GALETIA 1:3
Ka amara na udo nke na-esite nꞌaka Chineke bụ Nna anyị na nꞌaka Onyenwe anyị Jisọs Kraịst apụta dịnyere unu nile.


GALETIA 2:16
ma anyị bụ ndị Juu maara na mmadụ ọ bụla na Chineke enweghị ike ịdị nꞌudo, site nꞌidebe iwu ndị Juu, kama, na udo na-adị nꞌetiti Chineke na mmadụ nanị site nꞌokwukwe anyị nwere na Jisọs ịsachapụ mmehie anyị. Ọ bụ nke a mere anyị ji kwere na Jisọs Kraịst, ka e mee ka Chineke nabata anyị, site nꞌokwukwe anyị, ọ bụghị nꞌihi na anyị debere iwu ndị Juu. Nꞌihi na o nweghị onye ọ bụla a ga-azọpụta nꞌihi na o debere iwu ndị Juu.


GALETIA 5:22
Ma mgbe Mmụọ Nsọ na-achị achị na ndụ anyị, ụdị ndụ a ga-apụta ìhè nꞌime anyị: ndụ ịhụnanya, na ọṅụ, na udo, na ogologo ntachi obi, na obi ọma, na ịdị mma, na ikwesị ntụkwasị obi, na


GALETIA 6:16
Ka udo na ebere dinyere ndị nile na-ebi ndụ ha dị ka ụkpụrụ ndị a nile si dị. Ka udo na ebere dịkwara ndị nile nọ ebe nile, bụ ndị nke Chineke nꞌezie.


EFESỌS 1:2
Ka amara na udo nke na-esite nꞌebe Chineke Nna anyị na nꞌebe Onyenwe anyị Jisọs Kraịst nọ dịrị unu.


EFESỌS 2:14
Nꞌihi na Kraịst wetaara anyị udo. O mere ka ndị Juu na ndị mba ọzọ buru otu. Ọ kwaturu mgbidi kewera ha na mgbe ochie.


EFESỌS 2:15
Ọ kagburu iwu ndị Juu ka o nwee ike mee ndị Juu na ndị mba ọzọ otu agbụrụ ndị e jikọtara ọnụ nꞌime ahụ ya. Site nꞌụzọ dị otu a, o mere ka udo dịrị.


EFESỌS 4:3
Nọọnụ nꞌudo nꞌetiti onwe unu gbalịakwanụ ime ka ịdị nꞌotu unu dịgide nꞌime Mmụọ Nsọ.


EFESỌS 6:15
Meenụ ka njikere unu mgbe nile ikwusa ozi ọma nke udo bụrụ ihe dị ka akpụkpọ e yikwasịrị nꞌụkwụ unu.


EFESỌS 6:23
Ka Chineke nye unu udo, ụmụnna m. Ka o nyekwa unu ịhụnanya nke ya na okwukwe unu nwere nꞌime ya so, nke na-esite nꞌebe Chineke Nna na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst nọ abịa.


FILIPAI 1:2
Ka Chineke gọzie unu nile. Ọ bụkwa ekpere m ka Chineke nna anyị, onye bi nꞌeluigwe, na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst gọzie unu nile. Ka o nyekwa unu udo zuru oke nꞌime obi unu.


FILIPAI 3:9
Ka m nwee ike bụrụ onye e jikọtara ya na Kraịst, onye na-adịghị agụkwa onwe ya dị ka onye pụrụ ịzọpụta onwe ya site nꞌezi omume ya, ma ọ bụ site nꞌidebezu iwu Chineke. Kama ka m bụrụ onye a na-azọpụta nanị site nꞌịtụkwasị Kraịst obi. Nꞌihi na ụzọ ahụ Chineke chọrọ isi mee ka anyị na ya dịrị nꞌudo dabeere nꞌokwukwe, ọ dabeere nꞌokwukwe anyị nꞌime Kraịst nanị.


FILIPAI 4:7
Udo Chineke, nke dị ukwuu karịa ihe ọ bụla mmadụ nwere ike ịghọta ga-eche echiche uche unu na obi unu nche nꞌime Kraịst Jisọs.


FILIPAI 4:9
Na-emenụ ihe ọ bụla unu si nꞌaka m mụta, ma ọ bụ ihe unu hụrụ m ka m na-eme. Chineke onye na-enye udo ga-anọnyekwara unu.


KỌLỌSI 1:2
na-edegara ndị Kraịst nọ na Kọlọsị akwụkwọ a. Ndị ahụ bụ ụmụnna anyị nꞌime Kraịst site nꞌokwukwe ha. Ka Chineke Nna anyị nye unu amara ya na udo ya.


KỌLỌSI 1:20
Ọ bụ site nꞌihe Ọkpara ya mere ka Chineke ji kpebie ka ụwa nile bịaghachikwute ya. Nꞌihi na site nꞌọnwụ nke Kraịst nwụrụ nꞌelu obe, na ọbara ọ wụsịrị, e meela ka udo dịrị nꞌetiti Chineke na mmadụ nile. Ihe nile dị nꞌụwa na nꞌeluigwe nwekwara ike ịbịakwute Chineke ugbu a.


KỌLỌSI 3:15
Ka udo ahụ Chineke na-enye bụrụ ihe ga-adị nꞌobi unu, ma pụtakwa ìhè na ndụ unu. Nꞌihi na ebe unu bụ akụkụ nke otu anụ ahụ ahụ, Chineke kpọrọ unu ka unu nọdụ nꞌudo. Mgbe nile kwa nọọnụ na-ekele Chineke ekele.


1 TESALỌNAIKA 1:1
Akwụkwọ ozi a si nꞌaka anyị, Pọl na Saịlas na Timoti, na-abịara nzukọ Kraịst dị na Tesalonaịka, ndị e jikọtara ha na Chineke Nna, na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. Ka Chineke gọzie unu, ma nyekwa unu udo.


1 TESALỌNAIKA 5:3
Mgbe ọtụtụ mmadụ ga-asị, “Udo dị, ihe nile na-aga nke ọma,” mgbe ahụ, na mberede, ka oke ịla nꞌiyi dị egwu ga-adakwasị ha, ọ dịkwaghị otu onye ga-agbanarị ihe ọjọọ ahụ. Ihe mgbu ahụ ga-adị ka ihe mgbu na-adakwasị nwanyị ime na-eme.


1 TESALỌNAIKA 5:13
Ka unu na-akwanyere ha ugwu site nꞌịhụnanya nꞌihi ụdị ọrụ ha na-arụ. Ka unu na mmadụ ibe unu birikwa nꞌudo.


1 TESALỌNAIKA 5:23
Ka Chineke nꞌonwe ya, onye bụ isi udo, mee ka unu dị nsọ nꞌihe nile. Ka Onyenwe anyị debezuo mmụọ unu na mkpụrụ obi unu na anụ ahụ unu nsọ, na-enweghị ntụpọ ọ bụla ruo ụbọchị ọbịbịa Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.


2 TESALỌNAIKA 1:2
Ka Chineke bụ Nna anyị na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst gọzie unu, ma tụkwasịkwara unu udo nke ya.


2 TESALỌNAIKA 3:16
Ugbu a, ka Onyenwe anyị, onye udo na-esi nꞌaka ya abịa tụkwasịrị unu udo ya mgbe nile, nꞌime ọnọdụ ọ bụla unu nọ nꞌime ya. Ka ọ nọnyekwara unu.


1 TIMỌTI 1:2
Timoti ezi nwa m dị ka okwukwe anyị nwere nꞌime Onyenwe anyị si dị. Ka Chineke Nna na Kraịst Onyenwe anyị gosi gị obi ọma ya. Ya meekwara gị ebere, nyekwa gị udo nke obi na nke mmụọ.


1 TIMỌTI 2:2
Kpeekwara ndị eze ekpere, ha na ndị nile nọ nꞌọnọdụ dị elu, ma ọ bụ ndị na-achị anyị. Ka anyị nwee ike ibi ndụ udo na nke ịdị nwanyọọ, jiri oge anyị nile na-ebi ndụ ịsọpụrụ Chineke, na nke ime ezi omume.


1 TIMỌTI 2:5
Ka ha ghọta na ọ bụ nanị otu Chineke dị, na e nwekara nanị otu onye na-ekpe udo nꞌetiti Chineke na mmadụ, onye ahụ bụ Kraịst Jisọs, onye weere ndụ ya nye nꞌihi ịgbapụta mmadụ nile.


2 TIMỌTI 1:2
Ọ bụ gị nwoke m hụrụ nꞌanya Timoti, ezi nwa m, ka m na-edere akwụkwọ a. Ka Chineke Nna, na Kraịst Jisọs Onyenwe anyị, wụkwasị gị obi ebere na amara ya na udo ya.


TAITỌS 1:4
Ọ bụ gị Taitọs, ezi nwa m nwoke nꞌime okwukwe nke anyị nwekọrọ, ka m naedetara akwụkwọ ozi a. Ka Chineke onye bụ Nna, na Kraịst Jisọs Onye nzọpụta anyị, nye gị amara ya na udo ya.


TAITỌS 2:2
Gwa ndị agadi nwoke ka ha nwee anya udo, ka ha nwee akọnuche zuru oke, ka ha bụrụ ndị kwesịrị nsọpụrụ, ndị okwukwe ha siri ike, ndị na-ahụ ibe ha nꞌanya, na ndị nwekwara ntachi obi.


FAILIMON 1:3
Ka Chineke Nna anyị na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst nye unu amara ya na udo ya.


HIBRU 7:2
Eberaham kewapụtara otu ụzọ nꞌụzọ iri nke ihe nile ọ dọtara nꞌagha nye ya. Otu ụzọ nꞌụzọ iri a bụ onyinye ọchụchụ aja nꞌomume ndị na-efe Chineke. Ugbu a ihe aha a bụ Melikizedeki pụtara bụ Eze ezi omume. Aha obodo ya bụ Salem pụtara Udo. Nꞌihi nke a, a kpọkwara Melikizedeki Eze Udo.


HIBRU 12:11
Anyị maara na ahụhụ adịghị atọ ụtọ mgbe ọ bụla. Kama ọ na-eweta obi ọjọọ nꞌoge ahụ. Ma emesịa, mkpụrụ na-esi nꞌahụhụ na-egosi onwe ya na ndụ anyị, mgbe anyị na-ebi obi udo na nke ezi omume. Ọ bụkwa nanị ndị sitere nꞌahụhụ gafee na-ebi ụdị ndụ a.


HIBRU 12:14
Gbalisie ike mee ka gị na ndị ọzọ biri nꞌudo. Bie ndụ dị nsọ, nꞌihi na ọ bụ nanị ndị dị nsọ ga-ahụ Chineke.


HIBRU 13:20
Ugbu a ka Chineke ahụ na-enye udo, Chineke ahụ sitere nꞌọbara ọgbụgba ndụ ebighị ebi ahụ kpọghachite Onyenwe anyị Jisọs Onye ọzụzụ atụrụ ukwuu ahụ ndụ site nꞌọnwụ


JEMES 2:16
ma ị sị enyi gị ahụ, “Laa nꞌudo nwanna m, Chineke gọzie gị. Ya nyekwa gị uwe ị ga-eji chụọ oyi, na nri ị ga-eji zụọ afọ gị,” ma ọ dịghị ihe ọ bụla i mere iji nyere ya aka igbo mkpa agụụ na-agụ ya na oyi na-atụ ya, ọ̀ dị ụzọ okwu ọma nile i kwuru siri nyere ya aka?


JEMES 3:17
Ma amamihe na-esite nꞌebe Chineke nọ abịa dị ọcha. Ọ hụrụ udo nꞌanya, ọ na-eme obi ọma, o jupụtara nꞌebere, na-ewepụtakwa ọrụ ọma. Ihu abụọ na obi abụọ adịkwaghị nꞌime ya.


JEMES 3:18
Ma ndị ahụ bụ ndị na-eme udo bụ ndị na-agha mkpụrụ udo. Ha ga-aghọta mkpụrụ nke ezi omume.


1 PITA 1:2
Ndị enyi m, nꞌoge gara aga, Chineke onye bụ Nna họpụtara unu dị ka nzube ya si dị. Ọ makwaara na unu ga-emesị bụrụ ụmụ ya. Mmụọ Nsọ ya emeekwala ka unu bụrụ ndị dị nsọ, ndị a sachara nꞌọbara Jisọs Kraịst, na ndị na-erubere ya isi. Ka amara na udo dịrị unu.


1 PITA 3:11
Ya sitekwa nꞌajọ omume ya tụgharịa bido ime ezi ihe. Ya gbalịakwa ibi ndụ udo, ma na-agbasokwa ndụ udo.


1 PITA 5:14
Jirinụ isurịta ọnụ ịhụnanya ndị Kraịst kelerịtaa onwe unu. Ka udo Chineke dịnyere unu nile nọ nꞌime Kraịst.


2 PITA 1:2
Ka mara na udo Chineke dịnyere unu na mmaji na mmaji, ụdị udo na amara ya na-esite na mmazu unu maara ya na-abịa.


2 PITA 3:14
Bikonụ ndị m hụrụ nꞌanya, mgbe unu nọ na-eche ọbịbịa nke ụbọchị ahụ jisienụ ike hụ na aka unu dị ọcha, kwerekwanụ ka unu na ndị ọzọ biri nꞌudo, ka a hapụ ịchọta ntụpọ ọ bụla nꞌime unu mgbe unu ga-eguzo nꞌihu Chineke.


2 JỌN 1:3
Chineke Nna anyị na Jisọs Kraịst Ọkpara ya gaagọzi anyị site nꞌigosi anyị obi ọma ya na inye anyị udo ya nke dị ukwuu. Ọ ga-ejikwa eziokwu ya na ịhụnanya ya gọzie anyị.


JUD 1:2
Ka ebere na udo na ịhụnanya Chineke bụrụ nke unu. Ka ha mụbaakwa nꞌetiti unu.


NKPUGHE 1:4
Ọ bụ m Jọn na-ede akwụkwọ a nye nzukọ asaa dị nꞌobodo Tọkị. Ka amara na udo Chineke, onye ahụ dị ndụ ugbu a, na onye ga-adịgide ndụ gaa nꞌihu dịrị unu. Ka amara na-esitekwa nꞌebe Mmụọ asaa ahụ na-eguzo nꞌihu ocheeze ya dịrị unu.


NKPUGHE 6:4
Nꞌoge a, inyinya ahụ na-acha ọbara ọbara gbapụtara. E nyere onye ahụ na-anọkwasị nꞌelu ya mma agha dị ogologo nyekwa ya ike ime ka udo hapụ ịdịkwa nꞌụwa. E nyekwara ya ike iwebata ọchịchị nke ndị na-emegide emegie nꞌime ụwa. Mgbe ahụ ibu agha dị iche iche na igbu mmadụ jupụtara nꞌebe nile.


Igbo Bible 1988
No Data