A A A A A

Chọọ
MATIU 6:30
Ya mere, ọ bụrụ na Chineke sitere nꞌebere ya mee ka okoko osisi ndị a maa mma ile anya, bụ okoko osisi dị ndụ taa, nke pụkwara ịkpọnwụ mgbe chi echi bọrọ, gịnị mere unu jiri chee na ọ gaghị emere unu karịa nke a, unu ndị okwukwe nta?


MATIU 8:10
Okwu a juru Jisọs anya nke ukwuu. Ọ gwara igwe mmadụ ahụ okwu sị ha, “Nꞌezie, ahụbeghị m okwukwe dị otu a ebe ọ bụla, ọ bụladị nꞌala Izirel nile.


MATIU 8:13
Jisọs gwara ọchịagha ahụ okwu sị ya, “Laa! E meerela gị dị ka okwukwe gị sịrị dị.” Ahụ dịrị ohu ya mma nꞌotu ntabi anya ahụ.


MATIU 8:26
Ma Jisọs zara sị ha, “Unu ndị okwukwe nta, gịnị mere ụjọ ji na-atụ unu?” O biliri baara ifufe ahụ na ebili mmiri ahụ mba. Ha dara jụụ, ebe nile deere jii.


MATIU 9:2
Ọ dịghị anya ụfọdụ ndị ikom ji ute butere ya otu nwoke akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ. Mgbe Jisọs hụrụ okwukwe dị nꞌime ndị buteere ya nwoke a, ọ gwara onye ọrịa ahụ okwu sị ya, “Nwee obi ike nꞌihi na agbagharala m gị mmehie gị nile.”


MATIU 9:22
Jisọs chigharịrị lee ya anya sị ya, “Ada m, atụla egwu, nꞌihi na e sitela nꞌokwukwe gị mee ka ahụ dị gị mma.” Ahụ dịkwara nwanyị ahụ mma site nꞌoge ahụ.


MATIU 9:29
Jisọs metụrụ ha aka nꞌanya sị ha, “Ya dịrị unu dị ka okwukwe unu si dị.”


MATIU 10:22
Ụmụ mmadụ ga-akpọ unu asị nꞌihi na unu bụ ndị nke m. Ma ndị nile ga-anọgide nꞌokwukwe ha ruo ọgwụgwụ ka a ga-azọpụta.


MATIU 12:39
Ma Jisọs zara sị ha, “Ọ bụ nanị ajọ mba nke na-enweghị okwukwe ga-achọkwa ka e gosi ha ihe ịrịba ama ọzọ. Ma ọ dịkwaghị ihe ịrịba ama ọzọ a ga-egosi unu karịa ihe ịrịba ama Jona onye amụma.


MATIU 13:21
Ma mgbọrọgwụ okwu ahụ gbara nꞌime obi ya esighị ike. Mgbe nsogbu na mkpagbu bịara nꞌihi okwukwe ya, ịnụ ọkụ nke obi ya na-anwụ, onye ahụ adịghị anọgidekwa.


MATIU 13:58
Ya mere, ọ rụghị ọtụtụ ọrụ ebube nꞌebe ahụ, nꞌihi na ha enweghị okwukwe nꞌime ya.


MATIU 14:31
Na-atụfụghị oge, Jisọs setipụrụ aka ya dọpụta Pita. Ọ gwara Pita okwu sị ya, “Lee ka okwukwe gị siri dị nta! Gịnị mere i ji nwee obi abụọ?”


MATIU 15:28
Jisọs zara sị ya, “Nwanyị, okwukwe gị dị ukwuu! Laa, e meerala gị ihe ị na-arịọ.” Nꞌotu oge ahụ a gwọrọ ada ya.


MATIU 16:8
Ebe ọ bụ na Jisọs matara ihe ha na-eche nꞌobi ha, ọ gwara ha okwu sị ha, “Unu ndị okwukwe nta! Gịnị mere unu ji na-esogbu onwe unu nꞌihi na unu enweghị ihe oriri?


MATIU 17:17
Jisọs zara sị, “Ụmụ ọgbọ a na-enweghị okwukwe, ndị na-adịghị erubekwa isi! Ruo ole mgbe ka mụ na unu ga-anọ? Ruo ole mgbe ka m ga-anọ na-anagide ekweghị ekwe unu? Kutere m nwanta ahụ nꞌebe a!”


MATIU 17:20
Jisọs zara sị ha, “Ọ bụ nꞌihi na okwukwe unu nwere ehighị nne. Ọ bụrụ na unu nwere okwukwe nke dịkarịsịrị nta, nke ga-aha ka mkpụrụ mọsụtadị, unu nwere ike nye ugwu a iwu sị ya, ‘Site nꞌebe a wezụga onwe gị,’ ọ ga-apụkwa.


MATIU 18:6
Ma ọ bụrụ na onye ọ bụla nꞌime unu emee ka otu nꞌime ndị a dị nta, bụ ndị tụkwasịrị m obi, daa mba nꞌokwukwe ya, ọ kaara onye ahụ mma na e kedoro ya nkume nꞌolu, tụnye ya nꞌoke osimiri ka mmiri rie ya.


MATIU 21:21
Jisọs zara sị ha, “Eziokwu ka m na-ekwu, mgbe m na-agwa unu sị, ọ bụrụ na unu enwee okwukwe, gharakwa inwe obi abụọ, unu ga-eme ihe karịrị nke a. Unu pụrụ inye ugwu olivu a iwu sị ya, ‘Si nꞌebe a wezuga onwe gị, gaa danye nꞌoke osimiri,’ ọ ga-emezukwa.


MATIU 21:22
Ihe ọ bụla kwa unu sitere nꞌokwukwe rịọọ Chineke nꞌekpere, unu ga-anatakwa ya.”


MATIU 24:10
Ọtụtụ ga-ada site nꞌokwukwe ha nꞌoge ahụ. Ha ga-emekwa ka ibe ha maa nꞌọnya, kpọọkwa ibe ha asị.


MATIU 24:11
Mgbe ahụ ọtụtụ ndị amụma ụgha ga-apụta. Ha ga-eduhiekwa ọtụtụ nꞌokwukwe ha.


MAK 2:5
Mgbe Jisọs hụrụ na ndị a nwere okwukwe dị ukwuu nꞌime ya ịgwọ enyi ha nwoke, ọ sịrị onye ọrịa ahụ, “Nwa m, a gbagharala gị mmehie gị.”


MAK 4:40
Mgbe ahụ Jisọs jụrụ ndị na-eso ụzọ ya sị, “Gịnị mere ụjọ ji na-atụ unu? Ebee ka okwukwe unu gara?”


MAK 5:34
Jisọs zara sị, “Ada m, okwukwe gị emeela ka ahụ dị gị mma. Laa nꞌudo. Bụrụkwa onye nweere onwe ya site na nrịrịa!”


MAK 5:36
Mgbe Jisọs nụrụ ozi ahụ, ọ gwara Jaịrọs okwu sị, “Atụla egwu. Nanị ihe ị ga-eme bụ inwe okwukwe.”


MAK 9:19
Jisọs sịrị ndị na-eso ụzọ ya, “Lee ka okwukwe unu si dị nta! Ruo ole mgbe ka mụ na unu ga-anọ tupuu unu ekwere? Ruo ole mgbe ka m ga-anọgide na-edi ekweghị ekwe unu? Kpọtara m nwanta nwoke ahụ!”


MAK 9:23
Jisọs jụrụ nna nwanta ahụ sị, “Gịnị mere i ji na-asị Ọ̀ bụrụ na i nwere ike? Ọ dịghị ihe onye ọ bụla nwere okwukwe na-agaghị enweta.”


MAK 9:24
Nna nwanta ahụ zara sị, “Ekweere m, biko mee ka m nwee okwukwe karịa.”


MAK 10:52
“Laa!” Ka Jisọs gwara ya, “Okwukwe gị agwọọla gị!” Nꞌotu oge ahụ Batimiọs bidoro ịhụ ụzọ, soro Jisọs na-agbada ụzọ ahụ.


MAK 11:22
Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya okwu sị, “Nweenụ okwukwe nꞌime Chineke. Nꞌihi na m na-agwa unu sị, ọ bụrụ na unu enwee okwukwe nꞌime Chineke, unu pụrụ ịgwa ugwu olivu a okwu sị,


MAK 11:24
“Ya mere, ka m gwa unu, ihe ọ bụla unu rịọrọ mgbe unu kpere ekpere, nweenụ okwukwe na unu anatala ya, ọ ga-emezukwara unu dị ka unu siri kpee ya.


MAK 16:14
Emesịa, Jisọs gosiri ndị na-eso ụzọ ya iri na otu ahụ onwe ha, mgbe ha nile nọkọrọ na-eri nri. Ọ baara ha mba nꞌihi enweghị okwukwe ha, na nꞌihi na ha jụrụ ikwenye nꞌihe Meri na ndị ọzọ hụrụ ya gwara ha banyere mbilite nꞌọnwụ ya.


MAK 16:17
“Ndị kweere ga-enwekwa ihe iriba ama a ga-egosi okwukwe ha. Ha ga-esite nꞌaha m chụpụ mmụọ ọjọọ. Ha ga-ekwukwa okwu nꞌasụsụ ọhụrụ dị iche iche.


LUK 5:20
Mgbe Jisọs hụrụ na ndị a nwere okwukwe na ya nwere ike ịgwọ enyi ha nwoke, ọ gwara onye ọrịa ahụ okwu sị, “Enyi m, a gbagharala gị mmehie gị.”


LUK 7:9
Mgbe Jisọs nụrụ ozi ọchịagha ahụ ziri ka e zie ya, o juru ya anya nke ukwuu. Mgbe ahụ ọ tụgharịrị lee ndị mmadụ na-eso ya anya sị ha, “Nꞌezie, o nwebeghị oge m hụrụ onye nwere okwukwe dị ka ọchịagha a si nwee okwukwe. Nꞌezie ahụbeghị m ụdị okwukwe a nꞌala Izirel nile.”


LUK 7:50
Ma Jisọs gwara nwanyị ahụ sị, “Ọ bụ okwukwe i nwere nꞌime m zọpụtara gị.”


LUK 8:13
Mkpụrụ ndị ahụ dara nꞌelu nkume nọchiri anya ndị ahụ nụrụ okwu Chineke jiri ọṅụ nabata ya. Ma okwu ahụ ha nụrụ abanyeghị nꞌime obi ha gbaa mgbọrọgwụ. Ha na-ekwere nanị nwa oge nta, ma mgbe ọnwụnwa bịara nꞌihi ihe ha kweere nꞌime ya, ha adịghị agakwa nꞌihu. Ha na-ada nꞌokwukwe ha.


LUK 8:25
Mgbe ahụ Jisos jụrụ ndị na-eso ụzọ ya si, “Ebeekwanụ ka okwukwe uni di?” Ma ha tụrụ nnọọ oke egwu sịritaa onwe ha, “Onye ka nwoke a bụ, onye ikuku na ebili mmiri na-eme ihe o nyere ha nꞌiwu.”


LUK 8:48
Jisọs gwara ya sị, “Ada m nwanyị, atụla egwu, okwukwe i nwere nꞌime m agwọọla gị.”


LUK 17:5
Ndị na-eso ụzọ ya rịọrọ Jisọs otu ụbọchị sị ya, “Nyere anyị aka ka anyị nwee okwukwe karịa nke anyị nwere.”


LUK 17:6
Ma Jisọs zara ha sị, “Ọ bụrụ na unu nwere okwukwe nke ga-aha ka mkpụrụ mọsụtadị, unu nwere ike ịsị osisi ukwu a, ‘Site na mgbọrọgwụ fopụta onwe gị, burukwa onwe gị gaa daba nꞌosimiri,’ ọ ga-emekwa ihe unu nyere ya nꞌiwu.


LUK 22:32
ma ekpeelara m gị ekpere, rịọ Chineke, ka o mee ka okwukwe gị sie ike, ka ị hapụ ịda. Mgbe ị tụgharịrị bụrụ onye na-eso m nꞌezie, gbaakwa ụmụnna gị ndị a ume.”


JỌN 11:26
Ọ dịkwaghị onye dị ndụ nke nwere okwukwe nꞌime m, ga-anwụ anwụ. Mata, ị kweere nke a?”


JỌN 14:29
Ana m agwa unu ihe ndị a mgbe ihe ọ bụla na-emebeghị, ka ọ bụrụ na mgbe o mere unu ga-enwe okwukwe.


JỌN 16:1
“Ana m agwa unu ihe ndị a nile ka unu ghara ịda mba nꞌokwukwe unu.


JỌN 20:27
Ọ gwara Tọmọs sị ya, “Rụnye mkpịsị aka gị nꞌapa ntu dị m nꞌaka, tinyekwa aka gị nꞌakụkụ m. Abụla onye na-enweghị okwukwe kama kwere!”


ỌLU OZI 3:16
Ọ bụ okwukwe nwoke a nwere nꞌaha Jisọs ka e ji mee ka ọ dịkwa ike ọzọ. Unu nile na-ahụ ya. Unu makwaara ya. Ee! Okwukwe ya mere ka ahụ dị ya mma, dị ka unu ji anya unu na-ahụ!


ỌLU OZI 6:5
Mmadụ nile nabatara atụmatụ a nke ọma. Ha họpụtara Stivin, nwoke tozuru oke nꞌokwukwe, bụrụkwa onye jupụtara na Mmụọ Nsọ. Ha họpụtakwara Filip, na Prokorọs, na Nikanọ, na Timọn, na Pamenas, na Nikolas, onye Antiọk. Na mbụ Nikolas bụrị onye Griik na-efe Chineke nꞌụzọ ndị Juu si efe ya.


ỌLU OZI 9:31
Nꞌihi na Sọl ghọrọ onye kwere ekwe mere ka a kwụsị ịkpagbu ndị kwere ekwe. Nzukọ Kraịst nile, ndị dị na Judia, Galili na Sameria, nọọrọ nꞌudo, guzosiekwa ike nꞌokwukwe ha. Ndị kwere ekwe biri ndụ ịsọpụrụ Chineke site nꞌinyeaka nke Mmụọ Nsọ. Ha gakwara nꞌihu na-amụba.


ỌLU OZI 11:23
Mgbe Banabas bịaruru Antiọk, ihe ọ hụrụ juru ya anya nke ukwuu. Ọ ṅụrịrị ọṅụ nꞌihi ihe ọ hụrụ. Ọ gwara ha okwu nkasịobi, meekwa ka ha mata na o kwesịrị ka ha jidesie okwukwe ha ike na-eleghị anya nꞌazụ.


ỌLU OZI 11:24
Banabas bụ nwoke jupụtara nꞌọrụ ebere na nꞌike Mmụọ Nsọ. O nwekwara okwukwe dị ebube, nꞌihi ya ọtụtụ mmadụ chegharịkwara bịakwute Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.


ỌLU OZI 14:9
O gere ntị mgbe Pọl na-ekwu okwu Chineke. Ma Pọl legidere ya anya hụ na ọ bụ nwoke nwere okwukwe nke a ga-eji mee ka ahụ dị ya ike.


ỌLU OZI 15:9
O gosighị na o nwere ihe dị iche nꞌetiti anyị na ha. Nꞌihi na ọ sachara obi ha nile site nꞌokwukwe.


ỌLU OZI 15:32
Ma ebe Judas na Saịlas nwere onyinye ikwuwa okwu, ha kwupụtara okwu Onyenwe anyị nꞌime nzụkọ Kraịst oge ahụ nile, mee ka okwukwe ndị kwere ekwe nọ nꞌobodo ahụ guzosie ike.


ỌLU OZI 16:5
Ihe ndị a nile mere ka nzukọ Kraịst too eto nꞌokwukwe na nꞌọnụ ọgụgụ.


ỌLU OZI 20:21
Ọ bụ nanị otu ozizi ahụ ka m nyere ndị Juu na ndị mba ọzọ, ozizi mkpa ọ dịrị mmadụ nile ịhapụ mmehie ha ma lọghachikwute Chineke site nꞌokwukwe nꞌime Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.


ỌLU OZI 20:32
“Ugbu a ana m etife unu nꞌaka Chineke na nlekọta ya. Ana m etifekwa unu nꞌaka okwu amara ya nke pụrụ ịgba okwukwe unu eme na inyekwa unu akụ na ụba o kwadobeere ndị ahụ ọ họpụtara ka ha dị iche nye onwe ya.


ỌLU OZI 23:6
Mgbe Pọl ghọtara na ndị bịara nzukọ ahụ dị ụzọ mmadụ abụọ, ndị Sadusii nꞌotu ụzọ, ndị Farisii nꞌụzọ nke ọzọ, o tiri mkpu sị, “Ụmụnna m, abụ m onye Farisii. Nna m bụkwa onye Farisii. A na-ekpe m ikpe taa nꞌihi okwukwe m nwere na mbilite nꞌọnwụ dị.”


ỌLU OZI 23:29
Ma na-atụfughị mgbe achọpụtara m na ọ bụ ihe banyere okwukwe ndị Juu. Nꞌeziokwu o nweghị ihe ọ bụla kwesịrị mkpọrọ ma ọ bụ onwụ nꞌime ya.


ỌLU OZI 24:21
Karịa na m kwuru nanị otu ihe mgbe m tiri mkpu sị, ‘Unu na-ekpe m ikpe taa nꞌihi okwukwe m na ndị nwụrụ anwụ ga-adị ndụ ọzọ.’ ”


ỌLU OZI 24:24
Mgbe abalị ole na ole gasịrị, Feliks na nwụnye ya Drusila bụ onye Juu, batara nꞌụlọ ikpe. O ziri ka a kpọọ Pọl. Ya na nwụnye ya gere ntị mgbe Pọl gwara ha okwu banyere inwe okwukwe nꞌime Jisọs Kraịst.


ỌLU OZI 26:18
Imeghe anya ha ka ha hụ ọnọdụ ha. Ka ha chegharịa biekwa ndụ nꞌime ìhè nke Chineke, kama ịwagharị nꞌọchịchịrị bụ ụzọ nke ekwensu. Ka ha soro ndị ọzọ nꞌebe nile nata mgbaghara mmehie na nketa nke Chineke na-enye ndị nile a sachapụrụ mmehie na ndị e sitere nꞌokwukwe ha mee ka ha bụrụ ndị Chineke doro iche.’


ỌLU OZI 28:20
Akpọrọ m unu taa ka mụ na unu hụkọọ ka unu matakwa na anọ m nꞌagbụ nꞌihi okwukwe m kweere na Onye nzọpụta abịala.”


ROM 1:8
Aghaghị m imalite site nꞌikele Chineke ekele nꞌihi unu, site nꞌaha Jisọs Kraịst. Nke a bụ nꞌihi na ụwa nile anụla ihe gbasara okwukwe unu, nꞌihi na ebe ọ bụla m gara ana m anụ ka a na-ekwu okwu banyere okwukwe unu nwere na Chineke.


ROM 1:11
Ọ na-agụ m agụụ nke ukwuu ịbịa hụ unu anya, nꞌihi na achọrọ m ka unu keta oke nꞌonyinye Mmụọ Nsọ nke Chineke nyere m, nke ga-enyere unu aka iguzsi ike nꞌokwukwe.


ROM 1:17
Ọ bụ ozi ọma nke naakọrọ anyị na Chineke edoziela ụzọ anyị ga-esi dị ọcha nꞌihu ya site nꞌokwukwe na ntụkwasị obi anyị nwere na Kraịst. Ozi ọma a na-agwakwa anyị na anyị pụrụ inweta ihe ndị a nile nanị site nꞌokwukwe. Nꞌihi na e deela ya rị nꞌakwụkwọ nsọ sị, “Ọ bụ nanị site nꞌokwukwe ka onye ezi omume ga-esi dị ndụ.”


ROM 3:25
Nꞌihi na Chineke zitere Kraịst ka ọ bụrụ aja a chụrụ nꞌihi ikpuchi mmehie anyị, ka ọbara Kraịst na okwukwe anyị nwere nꞌime ya bụrụ ihe ịjụrụ obi nye ya maka mgbaghara mmehie. Chineke sitere nꞌụzọ a mee ka ọ pụta ìhè na ya bụ onye na-ekpe ikpe ziri ezi, ebe o sitere na ntachi obi ya hapụ ịta ndị ahụ mehiere megide ya nꞌoge mgbe ochie ahụhụ.


ROM 3:26
Ugbu a, Chineke na-anabata ndị mmehie site nꞌụzọ a igosikwa na ya bụ onye na-ekpe ikpe ziri ezi na Onye ahụ na-agụ ndị nile nwere okwukwe nꞌime Jisọs dị ka ndị na-emeghị mmehie.


ROM 3:27
Ọ bụrụ na o si otu a dịrị, ọ dị ihe inya isi ọ bụla dị nye anyị? Chineke ọ zọpụtara anyị nꞌihi na anyị debere iwu? É,è, nzọpụta anyị dabeere nꞌokwukwe anyị nwere nꞌime Kraịst.


ROM 3:28
Ya mere Chineke zọpụtara anyị nꞌihi okwukwe anyị nwere na Kraịst, ọ bụghị nꞌihi na anyị mere ihe iwu kwuru.


ROM 3:29
Chineke ọ na-azọpụta nanị ndị Juu? Mba! Nꞌihi na Chineke bụkwa Chineke ndị mba ọzọ. Ọ ga-anabatakwa ndị mba ọzọ bụ ndị bịakwutere ya site nꞌokwukwe nꞌime Kraịst.


ROM 3:30
Nꞌihi na dị ka Chineke si emeso ndị Juu omume, otu a ka o si emesokwa ndị mba ọzọ. Ọ ga-anabata ndị Juu nile kweere na Kraịst, nabatakwa ndị mba ọzọ site nꞌokwukwe ha nꞌime Jisọs Kraịst.


ROM 3:31
Ọ bụrụ na Chineke na-anabata anyị site nꞌokwukwe anyị nwere na Kraịst, ọ̀ pụtara na iwu adịkwaghị mkpa? Mba! Kama anyị na-enye iwu ọnọdụ kwesịrị ya.


ROM 4:1
Ka anyị lee anya nihe ịma atụ anyị nwere nakwụkwọ nsọ. Gịnị ka anyị nwere ikwu banyere Eberaham, nna nna ndị Juu? Gịnị pụtara ìhè na ndụ Eberaham banyere inwe okwukwe na nzọpụta?


ROM 4:5
Ma mmadụ ahụ na-arụghị ọrụ ọ bụla, nke tụkwasịrị Chineke ahụ na-agụ ndị ajọ omume dị ka ndị na-enweghị mmehie obi, ka a na-agụrụ okwukwe ahụ o nwere dị ka ezi omume.


ROM 4:9
Onye ka ngọzi a Devidi kwuru okwu ya dịịrị? Ọ dịịrị ndị Juu kweere na Kraịst ma na-edebekwa iwu? Ka ọ dịịrị ndị ahụ kweere na Kraịst ma ha adịghị edebekwa iwu? Ka anyị lee anya na ndụ Eberaham. Ihe anyị kwuru bụ na Chineke nabatara ya nihi okwukwe ya. Chineke ọ nabatara ya nihi okwukwe ya nanị? Ka ọ nabatara ya nihi na o debekwara iwu?


ROM 4:11
Chineke ekwechaala nkwa na ya ga-agọzi Eberaham tupuu e bie ya ugwu. Obibi ugwu ya bụ nanị ihe ngosi na Chineke anabatala ya, gụọ ya nonye ezi omume nihi okwukwe ya nime Chineke. Ọ bụ nke a mere Eberaham ji bụrụ nna ndị nile kweere na Chineke, ndị ahụ ọ gụrụ dị ka ndị ezi omume, ọ bụ ezie na ha bụ ndị a na-ebighị ugwu.


ROM 4:12
Nụzọ di otu a kwa Eberaham bụ nna ndị nile e biri ugwu. Ndụ ya na-egosikwa ha na ọ bụghị obibi ugwu ha na-azọpụta ha, kama ọ bụ okwukwe ha. Nihi na Chineke nabatara Eberaham nanị site nokwukwe o nwere tupuu e bie ya ugwu.


ROM 4:13
Ọ pụtala ìhè ugbu a na nkwa ahụ Chineke kwere Eberaham na agbụrụ ya na ha ga-eketa ụwa abụghị nihi na Eberaham debere iwu Chineke, kama ọ bụ nihi na o kweere na Chineke. Ọ bụkwa site nokwukwe ya, ka Chineke ji gụọ Eberaham nonye ezi omume.


ROM 4:14
Nihi na ọ bụrụ na nkwa Chineke dịịrị nanị ndị na-edebe iwu, inwe okwukwe abaghị uru, inwe okwukwe bụkwa nzuzu, nihi na nkwa ahụ Chineke kwere enwekwaghị isi ọ bụla.


ROM 4:16
Ya mere Chineke na-enye anyị ngọzi ya nile site nokwukwe anyị nwere nime ya. Ọ na-enyekwa anyị ya nefu. Anyị ga-anata onyinye ndị a ma ọ bụrụ na anyị enwee ụdị okwukwe Eberaham nwere. Ya mere nihe gbasara inwe okwukwe nime Chineke, Eberaham bụ nna anyị.


ROM 4:20
Ọ dịghị mgbe ọ bụla o nwere obi abụọ na Chineke agaghị emezu ihe nile o kwere ya na nkwa. Okwukwe o nwere na Chineke siri nnọọ ike mee ka Eberaham bido ito Chineke nihi mmezu nkwa o kwere ya, tupuu Chineke emeere ya ihe ahụ.


ROM 4:22
Ọ bụ nihi ụdị okwukwe a Eberaham nwere ka Chineke ji gụọ ya nonye ezi omume, onye na-enwekwaghị mmehie ọ bụla.


ROM 5:1
Ugbu a ebe e sitere nꞌokwukwe anyị mee ka anyị na Chineke dịrị na mma, udo dị ugbu a nꞌetiti anyị na Chineke nꞌihi ihe Onyenwe anyị Jisọs Kraịst meere anyị.


ROM 5:2
Nꞌihi na site nꞌokwukwe anyị, Kraịst akpọbatala anyị nꞌime amara nke Chineke, ebe anyị nọ ugbu a. Anyị nọ nꞌọṅụ nweekwa olileanya na Chineke ga-eme ka anyị keta oke nꞌebube ya.


ROM 5:4
Ntachi obi na-arụpụta nꞌime anyị mmụọ nke iguzosi ike, nke na-enyere anyị aka ịtụkwasị Chineke obi nꞌọnọdụ ntachi obi ọ bụla, tutuu ruo mgbe olileanya anyị na okwukwe anyị guzosiri ike.


ROM 9:30
Gịnị ka anyị nwere ikwu banyere ihe ndị a? Anyị ga-asị na Chineke enyela ndị mba ọzọ na-enweghị oge ọ bụla ha ji obi ha chọọ Chineke, ohere ịbụ ndị a ga-anabata site nꞌokwukwe,


ROM 9:32
Gịnị gbochiri ha? Ọ bụ nꞌihi na ha achọghị isite nꞌokwukwe bụrụ ndị Chineke ga-anabata. Ha chere na ha pụrụ isite nꞌịrụ ọrụ ọma bụrụ ndị Chineke ga-anabata. Site nꞌụzọ dị otu a, ha abụrụla ndị sụrụ ngọngọ nꞌoke nkume ịsụ ngọngọ ahụ.


ROM 10:6
Ma nzọpụta ahụ si nꞌokwukwe rute mmadụ aka adịghị ajụ ajụjụ sị, “Ònye pụrụ irigo nꞌeluigwe ịchọta Kraịst kudata ya nꞌụwa ka o nyere anyị aka?”


ROM 10:8
Kama nzọpụta ahụ, nke okwukwe nꞌime Kraịst na-eweta na-agwa anyị sị, “Ozi ọma nzọpụta ahụ dị onye ọ bụla nso. Nꞌezie ozi ọma ahụ anyị na-ekwusa ihe gbasara ya dị gị nꞌọnụ, dịkwa nꞌime obi gị.


ROM 11:20
Nke ahụ bụ eziokwu. Ma cheta na a nyakapụrụ ha nꞌihi na ha enweghị okwukwe. Ma ị nọ nꞌebe ahụ nꞌihi na i kweere. Ya mere anyala isi banyere ọnọdụ gị, kama tụọ egwu.


ROM 11:23
Otu aka ahụ, ọ bụrụ na ndị Juu ahụ e bipụrụ nꞌihi enweghị okwukwe emesịa bụrụ ndị kweere na Chineke, a ga-anyapagidekwa ha dị ka alaka osisi ahụ.


ROM 12:3
Dị ka onyinye amara Chineke nyere m si dị, ana m adọ onye ọ bụla nꞌime unu aka na ntị sị, Unu atụkwasịla uche nꞌechiche banyere onwe unu karịa ka o si kwesị. Kama jirinụ obi dị umeala lee onwe unu anya dị ka okwukwe Chineke nyere unu ha.


ROM 12:6
Anyị nwere onyinye dị iche iche nke e sitere nꞌamara nye anyị. Ọ bụrụ na onyinye gị bụ onyinye ibu amụma, buo amụma dị ka okwukwe i nwere ha.


ROM 14:1
Nabatanụ ụmụnna ndị akọnuche ha na-esogbu ma ha soro ndị ọzọ okwukwe ha siri ike mee ihe ha na-eme. Unu ekwujọla ha, nꞌihi na ụzọ ha si ele ihe anya abụghị ụzọ unu si ele ya.


ROM 14:2
Nꞌihi na, dị ka ịma atụ, ọ dị ndị okwukwe ha siri ike, ndị kweere na ha nwere ike iri anụ ọ bụla. Ọ dịkwa ndị ọzọ okwukwe ha na-esighị ike ndị na-eri nanị ahihia nri.


ROM 14:22
Ka okwukwe i nwere banyere ihe dị mma oriri dịrị nꞌetiti gị na Chineke. Egosila ya nꞌebe ọ ga-ewute ndị ọzọ, na mmụọ ha. Ngọzi na-adịrị onye na-adịghị emehie nꞌihi na ọ maara na ihe bụ ezi ihe.


ROM 14:23
Ma onye ahụ maara na ihe ọ na-achọ ime bụ ihe ọjọọ ekwesịghị ime ya. Nꞌihi na ọ bụrụ na onye ahụ emee ya, ọ bụụrụ ya mmehie. Nꞌihi na ihe ọ bụla na-esiteghị nꞌokwukwe bụ mmehie.


ROM 15:1
Ya mere, ka anyị nile ndị okwukwe ha siri ike hapụ ichefu na anyị ka ọ dịrị inyere ndị okwukwe ha na-esighị ike aka. Anyị ekwesịghị ime nanị ihe na-atọ anyị ụtọ.


ROM 15:2
Ka onye ọ bụla nꞌime anyị na-eme ihe ga-atọ onye agbata obi ya ụtọ. Ka anyị na-eme ihe ga-enyere ha aka, na ihe ga-ewuli okwukwe ha elu nꞌime Onyenwe anyị.


ROM 16:17
Ugbu a, ụmụnna m, o nwere otu ihe ọzọ m chọrọ ịgwa unu tupuu m mechie akwụkwọ ozi a. Wezuganụ onwe unu site nꞌebe ndị ọrụ ha bụ iweta nkewa, ndị na-eme ka okwukwe ndị ọzọ hapụ iguzosi ike nꞌihi ozizi ha na-ezi banyere Kraịst nke megidere ihe ahụ nile e ziri unu.


1 KỌRINT 2:5
Ejighị m okwu na-ezipụta oke mmụta m gwa unu okwu, nꞌihi na achọghị m ka okwukwe unu dabere na mmụta mmadụ, kama ọ bụ ọchịchọ m ka okwukwe unu guzosie ike nꞌime Chineke.


1 KỌRINT 2:6
Otu ọ dị, mgbe ọ bụla m nọ na-ekwuru ndị okwukwe ha siri ike nꞌime Kraịst okwu, ana m eji okwu amamihe gwa ha okwu. Ma okwu amamihe nke m na-ekwu ihe banyere ya abụghị okwu amamihe nke ụwa a, ọ bụghị okwu amamihe nke na-atọ ndị ọkachamara ụwa a ụtọ, nꞌihi na ndị dị otu a aghaghị ịla nꞌiyi.


1 KỌRINT 4:10
Okwukwe anyị kwere na Kraịst emeela ka anyị ghọọ ndị nzuzu nꞌihu unu, ma unu onwe unu bụkwa ndị Kraịst maara ihe! Lee ka anyị si bụrụ ndị na-adịghị ike, mgbe unu na-awụgharị dị ka agụ. Lee ka anyị si bụrụ ndị a jụrụ ajụ na ndị a na-agụ dị ka ndị na-abaghị uru, ma unu bụ ndị a na-asọpụrụ!


1 KỌRINT 6:7
Ebe unu na-enwe esemokwu nke unu ji aga nꞌụlọ ikpe, ọ pụtara ìhè na unu na-ala azụ nꞌokwukwe unu. Gịnị gbochiri gị idi na ịnagide mmejọ e mejọrọ gị na nghọgbu a ghọgburu gị?


1 KỌRINT 8:9
Ọ bụ eziokwu na anyị pụrụ iri ihe ọ bụla, ma jie onwe gị aka ka ị ghara iri ihe ga-eme ka nwanna gị nꞌime Kraịst, nke okwukwe ya na-esighị ike daba nꞌime mmehie.


1 KỌRINT 9:22
Ọ bụrụkwa na mụ na ndị okwukwe ha na-esighị ike anọkọọ, ana m emekwa dị ka ha, ka m nwee ike mee ka ha mata Kraịst. Ee, otu ọ bụla mmadụ si dịrị, ana m agbalị chọọ ụzọ m ga-esi mee ka ọ nabata m, ka m nwee ike gwa ya ihe banyere Kraịst, Ka Kraịst zọpụta ya.


1 KỌRINT 12:9
Otu Mmụọ Nsọ a na-enye onye ọzọ onyinye inwe okwukwe pụrụ iche, na-enyekwa onye ọzọ onyinye inwe ike ịgwọ ọrịa.


1 KỌRINT 13:2
A sịkwa na m nwere onyinye ibu amụma, bụrụ onye pụrụ ikwu ihe nile gaje ime nꞌoge dị nꞌihu, na onye maara ihe nile, ma ahụghị mmadụ ibe m nꞌanya olee uru onyinye ndị a baara m? A sịkwa na m nwere okwukwe nke m pụrụ isite na ya nye ugwu buru ibu iwu sị ya site nꞌebe ọ nọ gaa nꞌebe ọzọ, ma ahụghị mmadụ ibe m nꞌanya, abụghị m ihe ọ bụla.


1 KỌRINT 13:7
Ọ bụrụ na ị hụ mmadụ ibe gị nꞌanya, ị ga-ejikere mgbe nile ilefu ihe ọjọọ o mere gị anya, ị ga-atụkwasị ya obi, nwee okwukwe nꞌime ya, ma nagide ihe ọ bụla si nꞌaka ya dapụta.


1 KỌRINT 13:13
Ọ dị ihe atọ na-adịgide adịgide. Ha bụ okwukwe, olileanya, na ịhụnanya. Ma nꞌime ihe atọ ndị a, ihe kachasị ha nile bụ ịhụnanya.


1 KỌRINT 15:2
E si nꞌozi ọma a zọpụta unu, ma ọ bụrụ na unu ejiri obi unu nile jidesie ihe unu kweere na ya ike. Inwe okwukwe nꞌihe ọzọ dị iche agaghị enyere unu aka.


1 KỌRINT 15:14
Ọ bụrụkwa na e meghị ka Kraịst si nꞌọnwụ bilie, ihe anyị na-ezisa bụ ihe efu, okwukwe unu nwere nꞌime Chineke bụ ihe efu.


1 KỌRINT 15:58
Ya mere, ụmụnna m, ebe unu maara na unu ga-emeri nꞌikpeazụ, guzosienụ ike nꞌokwukwe unu. Bụrụnụ ndị guzo chịm, ndị nọgidesịrị ike na-arụ ọrụ Onyenwe anyị, nꞌihi na unu maara na ọ dịghị ọrụ ọ bụla unu rụụrụ Onyenwe anyị bụ ihe efu, ebe ha ga-adị mgbe anyị bilitere nꞌọnwụ.


2 KỌRINT 1:24
Ọbịbịa m ga-abịa abụghị ka m gwa unu ihe unu na-aghaghị ikwere, nꞌihi na okwukwe unu siri ike. Kama, ihe m chọrọ bụ ime ka ọṅụ unu dịwanye ukwuu.


2 KỌRINT 5:7
Nꞌihi na ọ bụ okwukwe ka anyị ji mata na ihe ndị a bụ eziokwu site nꞌịtụkwasị Onyenwe anyị obi. Ọ bụghị nꞌihi na anyị ahụla ha.


2 KỌRINT 8:7
Unu babigara ụba oke nꞌihe nile unu nwere. Unu nwere okwukwe dị ukwuu, nweekwa ọtụtụ mmadụ ndị maara ikwusa ozi ọma nke ọma, na ndị maara ihe. Unu hụkwara anyị nꞌanya nke ukwuu ma gosikwa ịnụ ọkụ nꞌobi unu inye aka. Nꞌihi nke a anyị chọrọ ka unu gbasaa aka unu ịrụ ọrụ ịhụnanya a.


2 KỌRINT 10:15
Ọ bụghị na anyị na-ekwu na ọ bụ anyị rụrụ ọrụ nile, ya na ọrụ nke ndị ọzọ rụrụ nꞌetiti unu, kama olileanya anyị bụ na okwukwe unu nꞌime Chineke ga na-eto eto mgbe nile, ka ọrụ ahụ Chineke chọrọ ka anyị rụọ nꞌetiti unu bụrụ nke ga-eto eto.


GALETIA 2:16
ma anyị bụ ndị Juu maara na mmadụ ọ bụla na Chineke enweghị ike ịdị nꞌudo, site nꞌidebe iwu ndị Juu, kama, na udo na-adị nꞌetiti Chineke na mmadụ nanị site nꞌokwukwe anyị nwere na Jisọs ịsachapụ mmehie anyị. Ọ bụ nke a mere anyị ji kwere na Jisọs Kraịst, ka e mee ka Chineke nabata anyị, site nꞌokwukwe anyị, ọ bụghị nꞌihi na anyị debere iwu ndị Juu. Nꞌihi na o nweghị onye ọ bụla a ga-azọpụta nꞌihi na o debere iwu ndị Juu.


GALETIA 2:17
Ọ bụrụ na anyị atụkwasị Kraịst obi ka ọ zọpụta anyị, mesịa chọpụta na anyị jehiere ụzọ ịtụkwasị ya obi, nꞌihi na nzọpụta dị nanị mgbe e biri anyị ugwu, na mgbe anyị debere iwu ndị Juu, ọ̀ gaghị abụ ihe ziri ezi ma ọ bụrụ na anyị ekwuo na okwukwe anyị nwere na Kraịst abụrụla ihe wetaara anyị ịla nꞌiyi? Ma Chineke ekwela na mmadụ ga-eche ụdị echiche a banyere Onyenwe anyị.


GALETIA 2:20
ọ bụkwaghị mụ onwe m na-adị ndụ ugbu a, kama ọ bụ Kraịst na-adị ndụ ya nꞌime m. Ndụ ahụ nke m na-adị ugbu a, nꞌanụ ahụ m, bụ nke m na-adị nꞌihi okwukwe m nwere nꞌime Ọkpara Chineke, onye hụrụ m nꞌanya, ma werekwa onwe ya nye ka a kpọgide ya nꞌobe nꞌihi m.


GALETIA 3:8
Akwụkwọ nsọ lere anya oge ahụ dị nꞌihu, nke bụ ugbu a, mgbe Chineke ga-azọpụta ndị mba ọzọ, site nꞌokwukwe ha nwere nꞌime ya. Nꞌihi na Chineke gwara Eberaham okwu nꞌoge gara aga sị ya, “Aga m agọzi ndị nile tụkwasịrị m obi na mba dị iche iche, dị ka i si tụkwasị m obi.” Ya mere ndị nile tụkwasịrị Kraịst obi, bụkwa ndị na-eso Eberaham eketa ngọzi ahụ Chineke gọziri ya.


GALETIA 3:14
Ugbu a Chineke nwere ike iji ngọzi ahụ o kwere Eberaham na nkwa gọziekwa ndị mba ọzọ. Anyị nile kwa, dị ka ndị Kraịst, nwere ike isite nꞌokwukwe anyị nwere nꞌime ya nata Mmụọ Nsọ ahụ e kwere na nkwa.


GALETIA 3:17
Ihe m na-akọwa bụ nke a: Chineke ekweela nkwa ịzọpụta ndị sitere nꞌokwukwe bịakwute ya. O kwuola ya, dee ya nꞌakwụkwọ, mgbanwe ọ bụla apụghị ịdịkwa. Ọ bụ ezie na mgbe narị afọ anọ na iri afọ atọ gasịrị, Chineke mesịrị nye ndị Juu iwu iri ya, ma nke a apụtaghị na a kagbuola nkwa mbụ ahụ Chineke kwere Eberaham ịzọpụta mmadụ site nꞌokwukwe.


GALETIA 3:22
Nꞌihi na e deela ya nꞌakwụkwọ nsọ sị na anyị bụ ndị mmehie kere agbụ. Ụzọ mgbapụ dịịrị anyị bụ inwe okwukwe nꞌime Jisọs Kraịst.


GALETIA 3:24
Iwu ahụ dịkwa ka onye ozizi anyị, iduzi anyị nꞌụzọ anyị ga-agbaso, tutuu Kraịst abịa, mee ka anyị bụrụ ndị ezi omume nꞌihu Chineke, site nꞌokwukwe anyị nwere nꞌime ya.


GALETIA 3:26
Nꞌihi na anyị nile abụrụla ụmụ Chineke ugbu a, site nꞌokwukwe anyị nwere nꞌime Kraịst Jisọs.


GALETIA 4:31
Ụmụnna m, anyị abụghị ụmụ nwanyị ohu mụtara, ndị a mụrụ ka ha na-edebe iwu ndị Juu, kama anyị bụ ụmụ nwanyị nwere onwe ya, nne nwe ụlọ, ndị Chineke na-anabata nꞌihi okwukwe anyị nwere nꞌime ya.


GALETIA 5:6
Anyị, ndị Kraịst mere ka anyị keta oke na ndụ ebighị ebi, adịghị echegbu onwe anyị ma anyị bụ ndị e biri ugwu ma anyị abụghị. Anyị adịkwaghị echegbu onwe anyị ma anyị na-edebe iwu na omenala ndị Juu, ma anyị adịghị edebe ha. Ihe dị anyị mkpa bụ okwukwe nke si nꞌịhụnanya na-egosi onwe ya.


GALETIA 5:7
Unu naara ejezi ije okwukwe unu nke ọma, ònye bịara gbochie unu ịga nꞌihu nꞌije a?


GALETIA 5:10
Ana m atụkwasị Onyenwe anyị obi ka ọ kpọghachite unu nꞌọnọdụ okwukwe ahụ ga-eme ka unu kwenye nꞌihe nile dị ka m si kwenye na ha. Chineke ga-atakwa onye ahụ ahụhụ, bụ onye ahụ buteere unu nsogbu a, ma na-agbalị iduhie unu.


GALETIA 5:11
Ụfọdụ mmadụ dị ndị na-asị na m na-ekwusa na-asị na ibi mmadụ ugwu na idebe omenala ndị Juu dị mkpa tupuu azọpụta mmadụ. Ọ bụrụ nꞌezie na m na-ekwusa ihe dị otu a, agaghị m abụ onye a na-akpagbu, nꞌihi na ụdị okwu dị otu a adịghị ewetara onye na-ekwusa ya nsogbu. Ma ebe ọ bụ na a na-akpagbu m, o gosiri na ihe m na-ekwusa bụ na nzọpụta dị nanị site nꞌokwukwe nꞌobe Kraịst.


EFESỌS 1:15
Ọ bụ nꞌihi ihe ndị a nile, site na mgbe m nụrụ akụkọ otu okwukwe unu siri sie ike nꞌime Onyenwe anyị Jisọs, nụkwa otu unu siri na-ahụ ndị kwere ekwe nọ ebe nile nꞌanya,


EFESỌS 2:8
Nꞌihi na ọ bụ site nꞌamara Chineke ka e ji zọpụta unu site nꞌokwukwe unu nwere nꞌime ya. Nke a esiteghị nꞌihe aka unu rụpụtara. Ọ bụ onyinye Chineke!


EFESỌS 2:20
Unu bụkwa ndị a na-ewusi ike nꞌokwukwe site na ntọ ala nke ndị ozi Kraịst na ndị amụma ya tọrọ. Kraịst bụkwa nkume dị mkpa na ntọ ala ahụ.


EFESỌS 3:17
Ana m arịọkwa ka Kraịst mee ka obi unu bụrụ ebe obibi ya site nꞌokwukwe unu nꞌime ya. Ana m arịọkwa ka Chineke mee ka unu bụrụ ndị gbara mgbọrọgwụ nꞌime ịhụnanya Chineke.


EFESỌS 4:5
Ọ bụ nanị otu Onyenwe anyị dị, otu okwukwe na otu baptizim.


EFESỌS 6:16
Mgbe nile unu echefula ijide okwukwe unu dị ka ọta nke unu ga-eji kụchapụ akụ nile na-enwu ọkụ nke ajọ onye ahụ ga-agba nꞌebe unu nọ.


EFESỌS 6:23
Ka Chineke nye unu udo, ụmụnna m. Ka o nyekwa unu ịhụnanya nke ya na okwukwe unu nwere nꞌime ya so, nke na-esite nꞌebe Chineke Nna na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst nọ abịa.


FILIPAI 1:25
Nꞌezie, amaara m na m nwere ọrụ nke m ga-arụ nꞌụwa. Nꞌihi ya amaara m na m ga-anọgide ịdị ndụ. Ka mụ na unu jikọtaakwa aka rụọ ọrụ Onyenwe anyị, nke ga-enyere unu aka ito eto nꞌokwukwe, na inwe ọṅụ nꞌime Kraịst.


FILIPAI 2:17
Nꞌezie, ọ bụrụ na a wụsịa ọbara m dị ka ihe ịchụ aja nye Chineke nꞌihi okwukwe unu, ee, a sị na e gbuo m nꞌihi unu, aga m aṅụrị ọṅụ meekwa ka unu soro m ṅụrịa ọṅụ.


FILIPAI 3:9
Ka m nwee ike bụrụ onye e jikọtara ya na Kraịst, onye na-adịghị agụkwa onwe ya dị ka onye pụrụ ịzọpụta onwe ya site nꞌezi omume ya, ma ọ bụ site nꞌidebezu iwu Chineke. Kama ka m bụrụ onye a na-azọpụta nanị site nꞌịtụkwasị Kraịst obi. Nꞌihi na ụzọ ahụ Chineke chọrọ isi mee ka anyị na ya dịrị nꞌudo dabeere nꞌokwukwe, ọ dabeere nꞌokwukwe anyị nꞌime Kraịst nanị.


KỌLỌSI 1:2
na-edegara ndị Kraịst nọ na Kọlọsị akwụkwọ a. Ndị ahụ bụ ụmụnna anyị nꞌime Kraịst site nꞌokwukwe ha. Ka Chineke Nna anyị nye unu amara ya na udo ya.


KỌLỌSI 1:4
Nꞌihi na anyị anụla ihe banyere okwukwe unu nꞌime Kraịst Jisọs, na otu unu si hụ ndị Chineke nꞌanya.


KỌLỌSI 1:5
Mgbe eziokwu ahu bụ ozi ọma rutere unu, unu nụrụ banyere olileanya dịrị ndị nabatara ya. Nꞌihi ya okwukwe unu na ịhụnaya unu na-ele anya ya, bụ ihe e chebere nke ọma nꞌihi unu nꞌeluigwe.


KỌLỌSI 2:5
Nꞌihi na ọ bụ ezie na anọghị m unu nso, ma anọ m nꞌetiti unu nꞌime mmụọ oge nile. Ọ na-atọ m ụtọ nke ukwuu na unu guzosiri ike nꞌokwukwe unu nꞌime Kraịst.


KỌLỌSI 2:8
Ekwelanụ ka onye ọ bụla jiri okwu amamihe nke ụwa mebie ọṅụ unu, na okwukwe unu, okwu amamihe ahụ nke ọsịsa ya nile dabeere nꞌechiche na ntụpụta mmadụ, kama ịdabere nꞌihe Kraịst kwuru.


KỌLỌSI 4:12
Epafras, odibo Kraịst Jisọs na onye bụkwa otu onye nꞌime ọgbakọ unu na-ekele unu. Oge nile ka ọ na-ekpe ekpere nꞌihi unu, na-arịọ ka unu guzosie ike nꞌokwukwe dị ka ndị tozuru oke, ndị maara ihe ha na-eme, ndị weere onwe ha nyefee nꞌaka ọchịchọ Chineke.


1 TESALỌNAIKA 1:3
Mgbe nile ka anyị na-echeta nꞌekpere nye Chineke bụ Nna, ihe gbasara ọrụ unu nke sitere nꞌokwukwe, ya na ịrụsị ọrụ ike unu nke sitere nꞌịhụnanya, na iguzosị ike unu nke sitere nꞌolileanya unu nwere nꞌOnyenwe anyị Jisos Kraịst.


1 TESALỌNAIKA 1:8
Ugbu a unu esitela na ndụ unu mee ka ozi ọma Onyenwe anyị gbasaa gabiga Masidonia na Griis. Nꞌihi na ebe ọ bụla anyị gara anyị na-ahụ ndị na-agwa anyị ihe banyere okwukwe dị iche unu nwere. Anyị adịkwaghị agwa ndị mmadụ ihe banyere okwukwe unu.


1 TESALỌNAIKA 3:2
Anyị zipụrụ Timoti, nwanna anyị, onye anyị na ya na-arụkọ ọrụ ọma Jisọs Kraịst, ka ọ bịakwute unu, kasie unu obi, nyekwara unu aka nꞌokwukwe unu.


1 TESALỌNAIKA 3:5
Dị ka m na-ekwu na mbụ, mgbe m hụrụ na m apụghị ịnagide ihe ndị ahụ, ezipụrụ m Timoti, ka ọ bịa chọpụta ma okwukwe unu ọ dịkwa chịm. Nꞌihi na ihe tụrụ m ụjọ bụ na ma eleghị anya onye ọnwụnwa ọjọọ ahụ bụ ekwensu ga-emeri unu nꞌoge ọnwụnwa ndị a, mee ka ọrụ nile anyị rụrụ nꞌetiti unu bụrụ ihe lara nꞌiyi.


1 TESALỌNAIKA 3:6
Ma ugbu a, Timoti esitela nꞌebe unu nọ lọghachikwute anyị. O mere ka anyị mata na okwukwe unu guzo chịm; o mekwara ka anyị mata na unu na-echeta anyị mgbe nile. Na ọ na-akpasị unu mkpa ike ịhụ anyị anya, dị ka o si akpa anyị mkpa ịhụ unu anya.


1 TESALỌNAIKA 3:7
Nꞌihi nke a, ụmụnna anyị, anyị abụrụla ndị a kasịrị obi nke ukwuu ọ bụladị nꞌime mkpagbu nile nke anyị nọ nꞌime ya, nꞌihi iguzosi ike nke unu guzoro nꞌokwukwe unu.


1 TESALỌNAIKA 3:10
Nꞌihi na ehihie na abalị nile, na-esepụghị aka, ka anyị na-arịọ Chineke arịrịọ banyere unu site na ntọ ala obi anyị. Arịrịọ anyị na-arịọ ya bụ ka o mee ka anyị hụ unu anya ọzọ. Ka anyị nwee ike inyere unu aka nꞌokwukwe unu.


1 TESALỌNAIKA 4:14
Nꞌihi na ebe ọ bụ na anyị kweere na Jisọs nwụrụ ma sitekwa nꞌọnwụ bilie ọzọ, anyị nwekwara ike inwe okwukwe na mgbe Jisọs ga-abịa ọzọ, Chineke ga-eme ka ndị Kraịst nile nwụrụ anwụ soro Jisọs lọghachi na ndụ.


1 TESALỌNAIKA 5:8
Ka anyị nile, bụ ndị bi nꞌìhè bụrụ ndị anya doro, ndị ji okwukwe na ịhụnanya kpuchie onwe ha, na ndị yikwasịrị onwe anyị okpu igwe ahụ nke bụ olileanya anyị na a ga-azọpụta anyị.


1 TESALỌNAIKA 5:9
Nꞌihi na Chineke akwadebeghị ikpe ọmụma na egwu nye anyị. Kama ọ bụ nzube ya ka ọ zọpụta anyị site nꞌokwukwe anyị nwere nꞌOnyenwe anyị Jisọs Kraịst.


1 TESALỌNAIKA 5:16
Na-aṅụrịnụ ọṅụ nꞌime okwukwe unu oge nile.


1 TESALỌNAIKA 5:24
Onye ahụ kpọbatara anyị nꞌokwukwe a ga-emezu ihe ndị a, nꞌihi na ọ bụ onye kwesịrị ntụkwasị obi.


2 TESALỌNAIKA 1:3
Inye Chineke ekele nꞌihi unu abụghị nanị ihe dị mma ka anyị mee, kama ọ bụ ụgwọ ọrụ anyị ji Chineke, ụmụnna anyị, karịsịa, mgbe anyị chetara na dị ka unu si na-eto eto nꞌime okwukwe unu na otu a ka oke ịhụnanya unu nwere nꞌebe ibe unu dị si bụrụ ihe a na-enweghị ihe a ga-eji tụnyere ya.


2 TESALỌNAIKA 1:4
Nꞌihi nke a, anyị na-eji unu na-anya isi nꞌetiti nzukọ Kraịst nile. Anyị na-akọrọ ha otu unu si jiri ntachi obi nọgidesie ike nꞌime nsogbu nile dakwasịrị unu, na otu unu si nwee okwukwe dị ukwuu nꞌime Chineke, ọ bụladị nꞌetiti oke mkpagbu a na-akpagbu unu.


2 TESALỌNAIKA 1:11
Ebe ihe ga-esi otu a dịrị, anyị na-arịọ Chineke arịrịọ nꞌihi unu, ka o mee unu ụdị ụmụ ya ọ chọrọ ka unu bụrụ. Ka o mee ka unu dị mma dị ka ọ chọrọ, ka o site nꞌokwukwe unu nye unu ike ya.


2 TESALỌNAIKA 2:13
Ma ụmụnna anyị, ndị Chineke anyị hụrụ nꞌanya, ọ bụ ọrụ anyị ikele Chineke ekele mgbe nile nꞌihi na o buru ụzọ họpụta anyị maka ịzọpụta anyị na ịsacha anyị site nꞌọrụ Mmụọ Nsọ rụrụ, na site nꞌokwukwe anyị nwere nꞌeziokwu ahụ.


1 TIMỌTI 1:2
Timoti ezi nwa m dị ka okwukwe anyị nwere nꞌime Onyenwe anyị si dị. Ka Chineke Nna na Kraịst Onyenwe anyị gosi gị obi ọma ya. Ya meekwara gị ebere, nyekwa gị udo nke obi na nke mmụọ.


1 TIMỌTI 1:4
Mee ka ha kwụsị ịkọ ogologo akụkọ, na inyocha ihe gbasara usoro ọmụmụ dị iche iche nke na-adịghị agwụ agwụ. Nꞌihi na ihe ndị a na-eweta ajụjụ na ịrụ ụka na-abaghị uru, kama inyere ndị mmadụ aka ịnabata ụzọ ahụ Chineke kwadoro site nꞌokwukwe.


1 TIMỌTI 1:5
Ihe m chọrọ ịhụ bụ ka ụmụ Chineke nile jupụta nꞌịhụnanya nke na-esite nꞌobi dị ọcha. Achọkwara m ịhụ na ha nwere akọnuche zuru oke, na okwukwe siri ike, nke aghụghọ na-adịghị.


1 TIMỌTI 1:6
Nꞌihi na ndị ozizi ụgha ahụ esitela nꞌokwukwe anyị wezụga onwe ha. Ha nọ ugbu a na-atụfu oge ịjụ ajụjụ na ikwu okwu nzuzu.


1 TIMỌTI 1:19
Jidesie okwukwe i nwere nꞌime Kraịst ike. Meekwa ka akọnuche gị dị ọcha mgbe nile. Nꞌihi na ụfọdụ mmadụ eleziela anya jụ ime ezi ihe akọnuche ha gwara ha. Ma ha emeela ihe ahụ ha maara na ọ jọrọ njọ. Ugbu a ọ bụghị ihe iju anya na ha esitela nꞌokwukwe anyị dapụ.


1 TIMỌTI 2:7
A họpụtakwala m nꞌeziokwu ka m bụrụ onyeozi Chineke, ikwusara na izi ndị mba ọzọ ozi ọma a, na igosi ha ụzọ ahụ Chineke kwadoro isi zọpụta ndị mmadụ site nꞌokwukwe.


1 TIMỌTI 2:15
Ma ọ ga-azọpụta ndị inyom site nꞌọmụmụ nwa ha ma ọ bụrụ na ha anọgide na-ebi ndụ okwukwe na ịhụnanya, na ịdị nsọ, na nke uche zuru oke.


1 TIMỌTI 3:9
Ha ga-abụ ndị ji obi ọcha na-ejidesi eziokwu nke okwukwe anyị ike.


1 TIMỌTI 3:13
Nꞌihi na ndị ahụ rụrụ ọrụ ije ozi ha nke ọma nwere ụgwọ ọrụ. Ụgwọ ọrụ ha bụkwa nsọpụrụ ahụ ndị ọzọ ga-asọpụrụ ha, na nkuwa okwu ha nwere banyere okwukwe ha nꞌime Kraịst Jisọs.


1 TIMỌTI 4:6
Ọ bụrụ na ị kọwaara ndị ọzọ ihe ndị a nke ọma, mee ka ụmụnna anyị mata ha, ị ga-abụ onye na-arụ ọrụ gị nke ọma, onye a na-esite nꞌokwukwe ị nwere, ya na ezi ozizi ọma nke ị naagbaso, na-azụju afọ.


1 TIMỌTI 4:12
Ekwela ka onye ọ bụla lelịa gị anya nꞌihi na ị bụ okorọbịa. Kama mee ka ị bụrụ ihe ịma atụ na ihe ilere anya nye ndị kwere ekwe. Mee ka ha soro ụzọ i si ezi ihe na ụzọ i si ebi ndụ gị. Bụrụkwa ihe ịma atụ nye ha, ma ọ bụ ihe ilere anya nꞌime okwukwe gị, na ịhụnanya gị, na iche uche zuru oke gị.


1 TIMỌTI 6:2
Ọ bụrụ na ndị nwe ha bụ ndị Kraịst, nke a ekwesịghị ime ka ha hapụ ịrụzi ọrụ ha, kama ha kwesịrị ịrụsi ọrụ ike nꞌihi na ọ bụ nwanna nꞌime okwukwe ka ha na-enyere aka. Na-ezi ndị mmadụ eziokwu ndị a. Naagbakwa ha ume ka ha mee ihe ndị a.


1 TIMỌTI 6:12
Gbasie ọsọ ọma nke okwukwe gị ike. Jidesiekwa ndụ ebighị ebi ahụ Chineke nyere gị aka ike. Ndụ ebighị ebi ahụ i nwere, nke i kwupụtakwara ihe banyere ya nꞌihu ọtụtụ ndị ama.


2 TIMỌTI 1:1
Akwụkwọ ozi a si nꞌaka m Pọl, onyeozi Kraịst Jisọs, onye Chineke zipụrụ ịgwa ndị nile nọ nꞌebe nile, nwoke na nwanyị, ihe banyere ndụ ebighị ebi o kwere ha na nkwa site nꞌokwukwe nꞌime Jisọs Kraịst.


2 TIMỌTI 1:13
Jidesie eziokwu ahụ aka ike, ụdị eziokwu ahụ nke mụ onwe m ziri gị, eziokwu ahụ nke gbasara okwukwe ahụ, na ịhụnanya ahụ dị nꞌime Kraịst Jisọs.


2 TIMỌTI 2:13
Ma ọ bụrụ na anyị adaa mba, nọọ nꞌọnọdụ nke enweghị okwukwe ọ bụla, ya onwe ya na-anọgide bụrụ onye anyị kwesịrị ịtụkwasị obi, na onye ga-enyere anyị aka. Ọ gaghị agọnarị anyị, nꞌihi na anyị bụ akụkụ anụ ahụ ya, ọ ga-emezukwa nkwa ya nile o kwere anyị.


2 TIMỌTI 2:18
Ha ahapụla ịgbaso ụzọ eziokwu ahụ bido na-ekwusa okwu ụgha, naasị na oge mbilite nꞌọnwụ mmadụ nile agafeela. Site nꞌokwu a, ha naemekwa ka ụfọdụ ndị na-ekwere okwu ha bụrụ ndị na-ada mba nꞌokwukwe ha.


2 TIMỌTI 2:22
Gbanarị ihe ọ bụla na-etinye ụdị echiche ọjọọ nke ụmụ okorọbịa naenwe nꞌime gị. Kama nọọ nso ihe ọ bụla ga-eme gị ịchọ ime ezi ihe. Bụrụ onye nwere okwukwe na ịhụnanya na onye mmekọrịta nke ya ndị hụrụ Onyenwe anyị nꞌanya na ndị nwere obi ọcha na-atọ ụtọ.


2 TIMỌTI 3:8
Dị ka Jenas na Jembaras si lụso Mosisi ọgụ, otu a ka ndị a na-alụsokwa eziokwu ahụ ọgụ. Ila bụ ndị nwere obi rụrụ arụ, na ndị ndụ ha mere ka ha bụrụ ndị a jụrụ ajụ nꞌebe okwukwe anyị dị.


2 TIMỌTI 3:10
Ma gị onwe gị amatala omume m, matakwa na adịghị m ka ha. Ị maara ihe m kweere, na ụzọ m si ebi ndụ m, na ihe m chọrọ. Ị maara ụdị okwukwe m nwere nꞌime Kraịst na ahụhụ m nile. Ị maara ịhụnanya m nwere nꞌebe ị nọ, na ntachi obi m.


2 TIMỌTI 3:15
Ị maara na ọ bụ site nꞌoge ị bụ nwantakịrị ka e ji zi gị ihe e dere nꞌakwụkwọ nsọ. Ọ bụ ihe ndị a nyere gị uche ịnata nzọpụta Chineke site na ntụkwasị obi na okwukwe i nwere nꞌime Kraịst Jisọs.


TAITỌS 1:4
Ọ bụ gị Taitọs, ezi nwa m nwoke nꞌime okwukwe nke anyị nwekọrọ, ka m naedetara akwụkwọ ozi a. Ka Chineke onye bụ Nna, na Kraịst Jisọs Onye nzọpụta anyị, nye gị amara ya na udo ya.


TAITỌS 1:13
Nꞌezie, ọ bụ eziokwu ka o kwuru. Nꞌihi nke a gwasie ha okwu ike banyere mmehie ha na-atụghị ụjọ. Ọ bụ nanị nke a ga-enyere ha aka ibi ezi ndụ nꞌime okwukwe anyị.


TAITỌS 2:2
Gwa ndị agadi nwoke ka ha nwee anya udo, ka ha nwee akọnuche zuru oke, ka ha bụrụ ndị kwesịrị nsọpụrụ, ndị okwukwe ha siri ike, ndị na-ahụ ibe ha nꞌanya, na ndị nwekwara ntachi obi.


FAILIMON 1:5
Nꞌihi na oge nile ka m na-anụ ihe banyere otu i si hụ ụmụ Chineke nile nꞌanya, na ụdị okwukwe i nwere nꞌebe Onyenwe anyị Jisọs nọ.


FAILIMON 1:22
Were okwukwe kwadooro m ebe m ga-anọ nꞌihi na enwere m olileanya na Chineke ga-aza ekpere unu ime ka m si nꞌebe a pụta bịakwute unu.


HIBRU 3:1
Ya mere ụmụnna m nꞌime Onyenwe anyị, unu ndị Chineke doro iche mee unu ndị nke ya na ndị ozi ya. Chineke emeela unu ndị ezinụlọ ya. Ọ bụkwa ihe kwesịrị ekwesị ka unu cheta Jisọs Kraịst onye e mere onyeisi ozi nke Chineke, na onyeisi nchụaja nke okwukwe anyị.


HIBRU 4:2
E kwusaalara anyị ozi ọma a. Ha onwe ha nụkwara ya. Ma ozi ọma ahụ ha nụrụ enyereghị ha aka. Nꞌihi na ha ejighị okwukwe nara ya, ha egekwaghị ntị.


HIBRU 4:14
Ma anyị nwere Jisọs Ọkpara Chineke dị ka onyeisi nchụaja ukwu nke ndụ anyị. Ọ nọ ugbu a nꞌeluigwe nꞌihu Chineke. Nꞌihi nke a ka anyị jidesie okwukwe ahụ anyị kwupụtara aka ike.


HIBRU 6:1
Ya mere ka anyị hapụtụ ozizi ndị ahụ a na-ezi ndị kweere na Kraịst ọhụrụ, ma ka anyị lenye anya nꞌokwu ndị ọzọ gbara ọkpụrụkpụ. Ọ kwesịghị ka anyị malitekwa tọwa ntọ ala gbasara inwe okwukwe na Chineke, na inwe nchegharị site na ndụ ọjọọ ndị ahụ na-eweta ọnwụ.


HIBRU 6:12
Anyị achọghị ka unu bụrụ ndị umengwụ, kama na-adịnụ ka ndị ahụ ji okwukwe na ntachi obi na-anata ihe ọ bụla Chineke kwere na nkwa.


HIBRU 9:28
otu a kwa, Kraịst nwụrụ nanị otu ugboro, dị ka aja a chụrụ nꞌihi mmehie mmadụ nile. Ọ nwụrụ ma Chineke mere ka o site nꞌọnwụ bilie. Ọ ga-abịa ọzọ! Ma ọ bụghị maka ịchụ aja ọzọ nꞌihi mmehie anyị, kama ọ ga-abịa iwetara ndị nile ji okwukwe na olileanya na-eche ọbịbịa ya nzọpụta.


HIBRU 10:22
Ka anyị bịaruo Chineke nso site nꞌobi nke aghụghọ na-adịghị, obi nke nwere okwukwe na ọ ga-anabata anyị, obi nke e fesara ọbara maka ime ka anyị si nꞌechiche ọjọọ nile nke obi gbagọrọ agbagọ dị ọcha, na ahụ nke e ji mmiri dị ọcha sachapụ.


HIBRU 10:38
Ma ndị ahụ e mere ka ha zuo oke nꞌihu Chineke site nꞌokwukwe ga-adịkwa ndụ site nꞌokwukwe. Ọ bụrụ na ha alaa azụ nꞌokwukwe ha ihe banyere ha agaghị atọ Chineke ụtọ.


HIBRU 10:39
Ma dị ka ọ dị, anyị abụghị ndị na-ala azụ si otu a laa nꞌiyi. Kama anyị nwere okwukwe, bụrụkwa ndị a zọpụtara.


HIBRU 11:1
Gịnị bụ okwukwe? Okwukwe bụ inwe ntụkwasị obi na ihe anyị na-ele anya ya ga-amezu. Ọ bụkwa inwe ntụkwasị obi siri ike banyere ihe anyị na-ahụghị anya.


HIBRU 11:2
Ọ bụ site nꞌokwukwe ha ka ndị mbụ kweere na Chineke ji nwee nnwapụta ọma ya.


HIBRU 11:3
Ọ bụ site nꞌokwukwe ka anyị ji mara na e mere ụwa na ihe nile anyị na-ahụ anya site nꞌokwu Chineke. Nꞌihi nke a, ihe anyị na-ahụ anya ugbu a bụ ihe e mere site nꞌihe anyị na-adịghị ahụ anya.


HIBRU 11:4
Ebel bụ nwoke nwere okwukwe nꞌime Chineke. Ọ chụrụ aja dị mma nye Chineke karịa aja nke nwanne ya Ken chụrụ. Site nꞌokwukwe o nwere nnwapụta Chineke na ọ bụ onye ezi omume. Chineke nabatara Ebel nꞌihi na o nyere onyinye ya site nꞌokwukwe. Ma ugbu a, ọ bụ ezie na Ebel anwụọlarị, anyị nwere ike ịmụta ihe site na ndụ ya banyere inwe okwukwe nꞌime Chineke.


HIBRU 11:6
Ọ bụ ihe siri ike mmadụ ime ihe ga-atọ Chineke ụtọ ma ọ bụrụ na onye ahụ enweghị okwukwe. Nꞌihi na onye na-abịakwute Chineke nso aghaghị inwe okwukwe na Chineke dị. Na ọ bụkwa onye na-akwụghachi onye ọ bụla na-achọ ya.


HIBRU 11:7
Noa bụ otu onye nꞌime ndị nwere okwukwe na Chineke. Chineke dọrọ Noa aka na ntị banyere ihe gaje ime. Noa kweere. Ọ bụ ezie na otu mkpụrụ igwe ojii adịghị nꞌeluigwe, ma na-atụfughị mgbe, Noa wuru ụgbọ mmiri o ji zọpụta onwe ya na ndị ezinụlọ ya. Okwukwe Noa adịghị ka nke ndị ọzọ nọ nꞌụwa nꞌoge ahụ. Ya mere, Noa sitere nꞌokwukwe bụrụ onye nketa alaeze Chineke.


HIBRU 11:8
Site nꞌokwukwe, Eberaham rubeere Chineke isi. Chineke gwara ya ka ọ hapụ ala ya gaa nꞌala ọzọ dị anya Chineke ga-egosi ya. Ọ bụ nanị ala e kwere na nkwa! Ma Eberaham biliri gaa, ma ọ mataghị ebe ọ na-aga.


HIBRU 11:9
Site nꞌokwukwe Eberaham biri nꞌala ahụ Chineke kwere ya na nkwa. Ma ọ bụ ọbịa nꞌebe ahụ. Otu aka ahụ Jekọb na Aizik bikwara nꞌebe ahụ dị ka ndị ọbịa. Ma Chineke kwere ha nkwa na ha ga-enwe ala ahụ.


HIBRU 11:13
Ndị a nile bụ ndị nwere okwukwe nꞌime Chineke. Ma ha nwụrụ na-ele anya nkwa Chineke kwere ha. Ha ṅụrịrị ọṅụ nꞌihi nke a, na-aghọtakwa na ha bụ ndị ọbịa nꞌụwa.


HIBRU 11:17
Ọ bụ okwukwe Eberaham nwere nꞌime Chineke mere o ji kwere iwere nwa ya Aizik chụọ aja mgbe Chineke nwara ya ọnwụnwa. Eberaham bụ onye Chineke kwere nkwa ma o kwadoro iji nwa ahụ ọ mụrụ nanị ya chụọra Chineke aja.


HIBRU 11:19
Nꞌime nke a Eberaham tụkwasịrị Chineke obi. O nwere okwukwe na a sịkwa na Aizik anwụọ na Chineke ga-eme ka ọ dị ndụ ọzọ. Ee, Chineke anọghị nꞌụra! O chebere ndụ Aizik.


HIBRU 11:20
Ọ bụ okwukwe ka Aizik jiri nye Jekọb na Ịsọ ngọzi banyere ihe dị nꞌihu.


HIBRU 11:21
Ọ bụ okwukwe ka Jekọb ji gọzie ụmụ Josef tupuu ọ nwụọ. Ọ kpọrọ isi ala nye Chineke mgbe ọ na-adabere na mkpa nꞌaka ya.


HIBRU 11:22
Josef gosiri okwukwe tupuu ọ nwụọ. O kwuru okwu banyere otu ndị Izirel ga-esi hapụ ala Ijipti, nye ndụmọdụ banyere ịchịkọta ọkpụkpụ ya.


HIBRU 11:23
Nne na nna Mosisi zipụtara okwukwe mgbe ha mụrụ Mosisi. Ha zoro ya ọnwa atọ nꞌihi na ọ bụ nwa mara mma. Ha atụkwaghị egwu iwu nke eze ala Ijipti bụ Fero nyere.


HIBRU 11:24
Mosisi nwere okwukwe mgbe o toro ghọọ dimkpa. O kweghị ka a kpọọ ya nwa ada Fero.


HIBRU 11:27
Okwukwe ka Mosisi ji hapu Ijipti. Ọ tụghị egwu iwe eze nꞌihi na ọ dị ka ọ na-ahụ Chineke anya, na Chineke nọnyere ya mgbe nile.


HIBRU 11:28
O sitekwara nꞌokwukwe debe mmemme ngabiga. O fesara ọbara ka mmụọ ozi ahụ Chineke zipụrụ igbu ụmụ ndị Ijipti nile e buru ụzọ mmụọ, hapụ imetụ ụmụ ndị Izirel aka.


HIBRU 11:30
Mgbidi Jeriko dara mgbe ụmụ Izirel jiri okwukwe gaa ya gburugburu ụbọchị asaa.


HIBRU 11:31
Rehaab (nwanyị akwụla), esoghị ndị na-ekweghị ekwe lakọọ nꞌiyi nꞌobodo Jeriko nꞌihi na ọ bụ site nꞌokwukwe ka o jiri lekọtaa ndị Izirel ledoro obodo Jeriko anya.


HIBRU 11:32
Ọ dịkwa ọtụtụ ndị ọzọ bụ ndị biri ndụ okwukwe. Ma enweghị m oge ikwu ihe banyere ha. Ndị dị ka Berak, Samsin, Jefta, Devidi, Samuel na ndị amụma.


HIBRU 11:33
Okwukwe ka ha jiri merie mba dị iche iche. Okwukwe ka ha jiri bie ndụ ezi omume, nata nkwa dị iche iche. Okwukwe ka ha jiri meekwa ka ike ọdụm ghara ịdị ire.


HIBRU 11:34
Ọ bụkwa okwukwe ka ha jiri nọọ nꞌime ọkụ na-enweghị mmerụ ahụ. Okwukwe ka ọtụtụ jiri gbanarị ọnwụ. Okwukwe ka ndị dara mba jiri dịrị ike, meekwa ka ụmụ ndị iro dị ike gbalaga.


HIBRU 11:35
Site nꞌokwukwe ụmụ nwanyị ụfọdụ ka e nyeghachiri ụmụ ha site nꞌọnwụ. Ndị ọzọ naara ntaramahụhụ nꞌihi na ha sitere nꞌokwukwe jụ ịgọnarị Chineke. Ha kweere na Chineke ga-enye ha mbilite nꞌọnwụ kachasị mma ma ọ bụrụ na ha nọgide bụrụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi.


HIBRU 11:39
Ma lee! ndị a nile natara ezi ọgbụgba ama site nꞌokwukwe ha, ma ha anataghị nkwa ahụ Chineke kwere ha.


HIBRU 11:40
Ha enwetaghị nkwụghachi okwukwe ha nꞌihi na Chineke pịara na ha ga-echere soro anyị keta ihe nketa kachasị mma nke Chineke kwadooro anyị.


HIBRU 12:1
Ugbu a, igwe ndị okwukwe a nile nọ na-ele anyị anya. Ha gbara anyị gburugburu. Ka anyị wezuga ihe nile ga-egbochi anyị. Ka anyị tụpụ mmehie nile tụhịkọtara onwe ya nꞌahụ anyị. Ka anyị jiri ike anyị nile, na-eleghị anya nꞌazụ gbaa ọsọ ahụ dị anyị nꞌihu.


HIBRU 12:2
Ka anyị lekwasịkwa Jisọs anya. Ọ bụ onyendu na onye mmezu okwukwe anyị. Ihe ihere nke obe ahụ amasịghị ya. Ma ọ tachiri obi nagide ihe ihere ahụ. O lere anya ọṅụ nke ga-eso ahụhụ nile ọ hụrụ nꞌelu obe. Site na nke a, ọ nọ ugbu a nꞌaka nri ocheeze Chineke.


HIBRU 12:15
Ka onye ọ bụla hapụ ime ihe ga-egbochi ihuọma Chineke. Ekwela ka obi ilu gbaa mgbọrọgwụ nꞌime unu ibutere unu nsogbu. Ụdị obi ilu ahụ pụrụ ime ka ndị ọzọ daa mba nꞌokwukwe ha.


JEMES 1:3
Nꞌihi na mgbe a na-anwa okwukwe unu ọnwụnwa, ntachi obi unu na-enwe ohere ito eto.


JEMES 2:5
Geenụ ntị ka m gwa unu ụmụnna m, ọ̀ bụ na unu amataghị na Chineke ahọpụtala ndị ahụ ụwa gụrụ dị ka ndị ogbenye mee ha ka ha bụrụ ọgaranya site nꞌokwukwe ha, ka ha ketakwa alaeze ahụ Chineke kwere nkwa inye ndị hụrụ ya nꞌanya?


JEMES 2:14
Olee utu ọ bara ụmụnna m, na mmadụ kpọrọ onwe ya onye nwere okwukwe nꞌime Chineke, ma ọ bụrụ na ndụ ya na omume ya adakọtaghị nꞌihe ọ na-akpọ onwe ya? Ụdị okwukwe ahụ ọ̀ pụrụ ime ka Chineke nabata ya?


JEMES 2:17
Nꞌụzọ dị otu a, okwukwe gị nꞌime Chineke abaghị uru, ma ọ bụrụ na ndụ gị na omume gị egosighị ihe ndị a nile.


JEMES 2:18
Mmadụ pụrụ ịgwa m sị, “I nwere okwukwe ma e nwere m ọrụ ọma.” Ma ihe m ga-asa onye ahụ bụ nke a, “Zi m otu i siri nwee okwukwe nꞌime Chineke mgbe ị na-arụghị ọrụ ọma ọ bụla iji gosi ya, ma mụ onwe m ga-egosikwa gị na m bụ onye nwere okwukwe nꞌime Chineke site nꞌọrụ ọma m naarụ.”


JEMES 2:20
Onye nzuzu, ruo olee mgbe ka ị ga-amụta na ọ bụ nanị site nꞌọrụ ị rụrụ ka ị pụrụ igosi na i nwere okwukwe nꞌime Chineke.


JEMES 2:22
Site na nke a ka anyị jiri mata na okwukwe o nwere nꞌime Chineke gosiri onwe ya nꞌọrụ ọma ọ rụrụ. Ọ bụkwa ọrụ ọma ya mere ka okwukwe ya zuo oke.


JEMES 2:26
Ya mere, dị ka o siri bụrụ ihe rara ahụ na a pụrụ ịhụ mmadụ dị ndụ nke na-enweghị mmụọ, otu a kwa, okwukwe nke na-adịghị egosi onwe ya site nꞌọrụ ọma, bụ ihe nwụrụ anwụ.


JEMES 5:15
Ọ bụrụkwa na ha sitere nꞌokwukwe kpeere Chineke ekpere ha, a ga-eme ka ahụ dị onye ọrịa ahụ mma. Onyenwe anyị ga-emekwa ka o site nꞌute ọrịa bilie. Ọ bụrụkwa na o mehiere, ọ ga-agbaghara ya mmehie ya.


1 PITA 1:7
Ọnwụnwa na mkpagbu ndị a na-enyere unu aka ịnwapụta ma okwukwe unu nwere o sikwara ike. A na-anwa okwukwe unu dị ka a ga-asị na ọ bụ ọlaedo e ji ọkụ na-anwapụta. Ọ bụ ezie na ọlaedo bụ ihe pụrụ imebi emebi, ma a ga-eji ọkụ nwaa ya, ịmata nke bụ ezi ọlaedo, na nke na-abụghị ya. Ya mere, ebe ọ bụ na okwukwe unu dị oke ọnụ ahia karịa ọlaedo, a ga-anwakwa unu ịhụ ma ọ ga-eguzosikwa ike. Ọ bụrụ na okwukwe unu eguzo chịm nꞌọnọdụ ọnwụnwa ndị a nile, iguzosi ike unu ga-ewetara unu otuto, ebube na nsọpụrụ nꞌụbọchị ahụ Jisọs ga-alọghachi.


1 PITA 1:21
Ọ bụkwa site nꞌaka ya ka unu ji tụkwasị Chineke obi, onye mere ka Kraịst si nꞌọnwụ bilie, na onye nyekwara ya ebube. Ya mere, tụkwasịnụ okwukwe unu na olileanya unu na Chineke.


1 PITA 5:9
Guzosienụ ike nꞌokwukwe unu mgbe ọ ga-alụso unu ọgụ. Unu ekwela ka o merie unu, kama tụkwasịnụ Onyenwe anyị obi. Chetanụ na e nwere ọtụtụ ndị kwere ekwe dị ka unu ndị nọkwa nꞌụdị ahụhụ a unu na-ahụ nꞌụwa nile.


2 PITA 1:1
Ọ bụ Saịmọn Pita, odibo Jisọs Kraịst na onyeozi na-edegara ndị nile nwere ụdị okwukwe anyị nwere akwụkwọ a. Okwukwe m na-ekwu ihe banyere ya bụ ụdị okwukwe ahụ Jisọs Kraịst Chineke anyị na Onye nzọpụta anyị na-enye. Ọ bụ okwukwe dị oke ọnụ ahịa, nke na-egosikwa ịdị mma onye nyere anyị ya.


2 PITA 1:9
Ma onye ọ bụla na-atụkwasịghị ihe ndị a nꞌokwukwe ya nọ nꞌọchịchịrị. Ọ naghị ahụ ụzọ. Ọ bụkwa onye na-echefu na Chineke sachapụrụ mmehie ya nile ime ka o bie ndụ dị mma nꞌihu Onyenwe anyị.


2 PITA 2:14
O nweghị nwanyị si nꞌebe ha nọ gafee nke ha na-adịghị ele anya ọjọọ; mmehie ịkwa iko anaghị ejukwa ha afọ, nꞌihi na agụụ ime mmehie dị nꞌime ha adịghị akwụsị akwụsị. Ha maara otu ha si arafu ụmụ nwanyị ndị okwukwe ha na-esighị ike, mee ka ha soro ha mee mmehie. Ha na-azụ obi ha inwe anya ukwu. Nꞌezie, Chineke bụrụ ha ọnụ.


JUD 1:3
Ndị m hụrụ nꞌanya, ọ gụọla m agụụ idere unu akwụkwọ banyere nzọpụta ahụ anyị nwekọrọ nꞌotu, ma a chọpụtara m na ọ dị mkpa ugbu a ịdọ unu aka na ntị ka unu na-agbalịsị ike ichebe okwukwe ahụ Chineke nyere ndị ya, ka a ghara ịgbanwe ya.


NKPUGHE 2:19
“Nke a bụ ihe o kwuru. Amaara m ezi ọrụ gị nile, tinyere obi ebere i nwere nꞌebe ndị ogbenye nọ. Ahụkwara m onyinye ọma ị na-enye ha, na ije ozi ị na-ejere ha. E wezụga ihe ndị a, amaara m ịhụnanya gị, na okwukwe gị, na ntachi obi gị. Ahụkwara m ịnụ ọkụ nke obi gị, na ezi ọchịchọ dị nꞌime gị imezu ha.


NKPUGHE 3:10
“Nꞌime nsogbu ndị a ha na-enye gị nꞌihi aha m, i sitela na ntachi obi sọpụrụ okwu m nile. Nꞌihi nke a, aga m ekpuchi gị site nꞌoke mkpagbu ahụ, ya na oke ọnwụnwa ahụ ga-abịakwasị ụwa. Ihe ndị a bụ ihe ga-anwapụta okwukwe ndị ga-adị ndụ.


NKPUGHE 3:11
Ma mata nke a, na ana m abịa ọsịịsọ. Jidesiekwa okwukwe nta ahụ i nwere aka ike, ka onye ọ bụla ghara ịnapụ gị okpu eze ahụ a kwadobere inye gị.


NKPUGHE 13:10
Ụmụ Chineke ndị e buru ụzọ gbaa ama na a ga-adọta ha nꞌagha, ọ bụ ha ka a ga-adọtakwa nꞌagha, ma ndị a gbara ama na ha ga-anwụ ka a ga-egbukwa. Ka obi ghara ịlọ unu mmiri nꞌihi na nke a bụ ohere unu nwere igosi ntachi obi unu na okwukwe unu.


NKPUGHE 14:12
Ka nke a bụrụ ihe ịgba ume nye ndị Chineke, ime ha ka ha nwee ntachi obi nꞌọnwụnwa na nsogbu nile, nꞌihi na ha bụ ndị nsọ ya, ndị na-eguzosi ike bụrụ ndị na-erube isi nꞌiwu ya, na nꞌokwukwe ha nꞌime Jisọs ruo ọgwụgwụ ihe nile.”


NKPUGHE 19:10
Mgbe ọ gwasịrị m okwu a, adara m nꞌala nꞌụkwụ ya ịkpọ isi ala nye ya, ma ọ gwara m sị, “O kwesịghị ka ị kpọọ isi ala nye m nꞌihi na abụ m nanị onyeozi Chineke dị ka gị onwe gị, na dị ka ọtụtụ ụmụnna gị ndị na-agba ama banyere okwukwe ha nwere nꞌime Jisọs. Ọ bụ nanị Chineke ka i kwesịrị ịkpọ isi ala nye. Nꞌihi na isi amụma nile na isi ihe ndị a nile m ziri gị bụ ịgwa gị ihe banyere Jisọs.”


Igbo Bible 1988
No Data