A A A A A


Chọọ

MATIU 2:18
“Ịkwa akwa na iru uju dị nꞌobodo Rema. Rechel na-akwa akwa nꞌihi ụmụ ya. Ọ dịghị nkasịobi ọ bụla dịrị ya nꞌihi na e gburu ha.”


MATIU 3:9
Unu echekwala nꞌobi unu na ọ dịrị unu mfe ịsị, ‘Anyị bụ ụmụ Eberaham’, nꞌihi na Chineke pụrụ isite na nkume ndị a mepụtara Eberaham ụmụ.


MATIU 4:4
Ma Jisọs sịrị ya, “Lee, akwụkwọ nsọ gwara anyị na ọ bụ nanị site nꞌirube isi nꞌokwu Chineke ka mkpụrụ obi mmadụ ga-eji dị ndụ, ọ bụghị site nꞌiri nri.”


MATIU 5:4
Ndị na-eru uju bụ ndị a gọziri agọzi, nꞌihi na a ga-akasị ha obi.


MATIU 5:5
Ndị dị nwayọọ nꞌobi bụ ndị a gọziri agọzi, nꞌihi na ha ga-eketa ụwa.


MATIU 5:7
Ndị na-enwe obi ebere bụ ndị a gọziri agọzi, nꞌihi na ha ka a ga-emere ebere.


MATIU 5:8
Ndị dị ọcha nꞌobi bụkwa ndị a gọziri agọzị, nꞌihi na ha ga-ahụ Chineke anya.


MATIU 5:12
Ṅụrịanụ ọṅụ nꞌihi ya. Ka obi tọọkwa unu ụtọ. Nꞌihi na ụgwụ ọrụ unu ga-adị ukwuu nꞌeluigwe. Chetanụ na e si nꞌụzọ dị otu a sogbuo ndị amụma bu unu ụzọ.


MATIU 5:28
Ma ana m asị unu, nwoke ọ bụla lere nwanyị ọ bụla anya nꞌụzọ na-adịghị mma, emeelarị mmehie ịkwa iko nꞌime obi ya megide nwanyị ahụ.


MATIU 6:6
Kama, mgbe unu chọrọ ikpe ekpere, baanụ nꞌime ime ụlọ unu, Mechiekwanụ ụzọ unu, kpeere Chineke Nna unu ekpere na nzuzo. Ọ maara ihe nzuzo nke obi unu nile. Ọ ga-azakwa ekpere unu, nyekwa unu ụgwọ ọrụ ruuru unu.


MATIU 6:20
Kama cheenụ akụ unu nꞌeluigwe, ebe ha na-agaghị ata ajarị, ebe nla na-agaghị eri ha, ebe ọ na-adịkwaghị onye ga-ezu ha. Nꞌihi na ebe ọ bụla akụ unu dị ka obi unu ga-adịkwa.


MATIU 6:22
“Anya unu dị ka iheọkụ nke anụ ahụ unu. Ọ bụrụkwa na anya gị adịrị ọcha, obi gị ga-ejupụta nꞌìhè.


MATIU 6:32
Ọ bụ nanị ndị na-amaghị Chineke na-atụfu oge ha iche ihe banyere ihe ndị a. Ọ bụkwa ha ka ihe ndị a na-agụbiga agụụ oke. Kama tụkwasịnụ Chineke obi unu, nꞌihi na ọ maara mkpa unu nile.


MATIU 8:20
Ma Jisọs zara sị ya, “Ewi nwere ọnụ ebe ha na-edina, ụmụ nnụnụ nwekwara akwụ, ma mụ onwe m enweghị ebe obibi.”


MATIU 9:2
Ọ dịghị anya ụfọdụ ndị ikom ji ute butere ya otu nwoke akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ. Mgbe Jisọs hụrụ okwukwe dị nꞌime ndị buteere ya nwoke a, ọ gwara onye ọrịa ahụ okwu sị ya, “Nwee obi ike nꞌihi na agbagharala m gị mmehie gị nile.”


MATIU 9:4
Ma ebe Jisọs maara ihe ha na-eche nꞌobi ha, ọ jụrụ ha ajụjụ sị ha, “Gịnị mere echiche ọjọọ ji jupụta unu obi?


MATIU 9:13
Ma gaanụ chọpụta ihe akwụkwọ nsọ chọrọ ka unu mụta mgbe ọ sịrị, ‘Achọghị m aja unu, kama achọrọ m ka unu nwee obi ebere.’ Unu chọpụta ya, unu ga-aghọta na abịaghị m ịkpọ ndị ezi omume, kama abịara m ime ka ndị mmehie si na mmehie ha chegharịa.”


MATIU 9:21
Nꞌihi na o kwuolarị nꞌime obi ya sị, “Ọ bụrụ nnọọ na m ga-enwe ike metụ uwe ya aka ahụ ga-adị m mma.”


MATIU 9:37
Ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya okwu sị ha, “Lee na mkpụrụ obi a ga-eritere Chineke nꞌuru dị ukwuu. Ma ndị ga-ezisa ozi ọma bụ nanị mmadụ ole na ole.


MATIU 9:38
Ya mere, kpeerenụ Chineke ekpere ka o zite ndị ọrụ ga-abịa nꞌubi a irite mkpụrụ obi ndị mmadụ nꞌuru.”


MATIU 10:12
Mgbe unu na-arịọ ịnọdụ nꞌụlọ onye ọ bụla gosinụ na unu ji obi ọcha bịa, na unu bụ ndị udo.


MATIU 10:26
“Unu atụla egwu ndị na-emenye unu ụjọ. Oge na-abịa mgbe a ga-ekpughe eziokwu nile. A ga-emekwa ka izuzu obi nile zoro ezo pụta ìhè.


MATIU 10:28
“Unu atụla egwu ndị pụrụ igbu nanị anụ ahụ unu, ma ha enweghị ike ịmetụ mkpụrụ obi unu aka. Kama onye unu ga-atụ egwu bụ Chineke nanị, onye nwere ike imebi anụ ahụ unu na mkpụrụ obi unu, tụbakwa ha nꞌọkụ ala mmụọ.


MATIU 11:6
Ziekwanụ ya ozi a, na ngọzi na-adịrị ndị na-enweghị obi abụọ nꞌebe m nọ.”


MATIU 11:8
Ka ùnu lere anya ịhụ onye yi uwe ndị eze? Ndị na-eyi uwe ndị eze bi nꞌobi eze.


MATIU 11:12
Site nꞌoge Jọn omee baptizim malitere izisa ozi ọma ruo ugbu a, ndị ụwa ji ike na-egbochi ọganihu alaeze eluigwe. Ma ọ bụkwa nanị ndị ọ na-anụ ọkụ nꞌobi na-eji ike abanye nꞌime ya.


MATIU 11:29
Soronụ ụzọ m, mụtakwanụ ihe site nꞌaka m. Nꞌihi na adị m nwayọọ, bụrụkwa onye dị umeala nꞌobi. Unu ga-achọtakwara obi unu izuike.


MATIU 12:25
Ma Jisọs maara ihe ha na-eche nꞌobi ha. Ọ gwara ha okwu sị, “Mba ọ bụla ndị bi nꞌime ya na-alụrịta ọgụ enweghị ike ịdịgide ruo oge dị anya. Obodo ọ bụla, ma ọ bụ ezinụlọ ọ bụla e nwere nkewa na ịlụ ọgụ, nke ndị bi nꞌime ya na-egburita ibe ha, agaghị adịgide.


MATIU 12:34
Ụmụ ajụala, olee otu ndị dị njọ dị ka unu ga-esi kwuo okwu ọma? Nꞌihi na ihe mmadụ kwuru bụ ihe si ya nꞌobi pụta.


MATIU 12:35
Ezi mmadụ na-ekwupụta ezi ihe dị ya nꞌime obi. Ajọ mmadụ na-esitekwa nꞌajọ okwu ya kpughee ajọ ihe dị ya nꞌobi.


MATIU 12:44
ọ na-asị nꞌobi ya, ‘Aga m alọghachikwuru nwoke ahụ m si nꞌime ya pụta.’ Mmụọ ọjọọ ahụ na-alọghachikwa jekwuru nwoke ahụ. Mgbe o ruru nꞌebe nwoke ahụ nọ, ọ ga-ahụ na e meela ka obi nwoke ahụ dị ọcha, ma ọ tọgbọrọ nꞌefu, nꞌihi na ọ dịghị ihe ọzọ e tinyere nꞌime ya, mgbe mmụọ ọjọọ ahụ si nꞌime ya pụọ na mbụ.


MATIU 13:15
Nꞌihi na obi ha gbara abụba, dịkwa rọ. Ha mechiri ntị ha, ka ha ghara ịnụ ihe. Ha mechikwara anya ha ka ha ghara ịhụ ụzọ. Ha mechiri obi ha, ka ha ghara ịghọta ma tụgharịa bịakwute m, ka m gwọọ ha.’ Ma a gọziri anya unu na ntị unu agọzi, nꞌihi na ha na-ahụ ụzọ, na-anụkwa ihe.


MATIU 13:19
Mkpụrụ ahụ a ghara bụ okwu Chineke. Ala ebe mkpụrụ ahụ dara nọchiri anya obi mmadụ. Mkpụrụ nke dara nꞌụzọ, nke ụmụ nnụnụ bịara tụrụ loo, nọchiri anya ndụ nụrụ eziokwu nke alaeze ahụ, ma ha aghọtaghị ya. Emesịa ekwensu bịara napụ ha okwu ahụ nꞌobi.


MATIU 13:20
Mkpụrụ nke dara nꞌala nkume nkume nọchiri anya obi mmadụ onye nụrụ ozi ọma ahụ, jirikwa oke ọṅụ nabata ya.


MATIU 13:21
Ma mgbọrọgwụ okwu ahụ gbara nꞌime obi ya esighị ike. Mgbe nsogbu na mkpagbu bịara nꞌihi okwukwe ya, ịnụ ọkụ nke obi ya na-anwụ, onye ahụ adịghị anọgidekwa.


MATIU 13:22
Mkpụrụ nke dara nꞌala ahụ ogwu ogwu dị nọchiri anya obi mmadụ onye nụrụ ozi ọma ahụ, ma ọchịchọ nke ụwa a, ya na itinye obi nꞌakụ nke ụwa, kpagidere okwu dị nꞌime ya, mee ka ọ hapụ ịmị mkpụrụ.


MATIU 13:23
Ma mkpụrụ dara nꞌala ọma ahụ nọchiri anya obi mmadụ onye gere ntị nꞌozi ọma ahụ, ghọtakwa ya. Ọ na-apụ kpọta iri mmadụ anọ, ma ọ bụ iri mmadụ isii, ma ọ bụ narị mmadụ, ndị a ga-eme ka ha baa nꞌalaeze ahụ.”


MATIU 14:3
Nꞌihi na, na mbụ, Herọd jidere Jọn kee ya agbụ tinye ya nꞌụlọ mkpọrọ, maka ime ka obi tọọ nwụnye ya Herodias ụtọ. Herodias bụ rịị nwụnye Filip nwanne Herọd. Ma Herọd mere ka Herodias site nꞌaka Filip gbapụta bịa bụrụ nwụnye nke ya.


MATIU 14:5
Herọd chọrịrị igbu Jọn, ma ọ tụrụ egwu na obi agaghị atọ ndị Juu ụtọ, nꞌihi na mmadụ nile kweere na Jọn bụ onye amụma.


MATIU 14:6
Ma otu ụbọchị, mgbe a na-eme mmemme icheta ọmụmụ Herọd, ada Herọd, nke Herodias mụtara, tere egwu nꞌihu nna ya Herọd, na nꞌihu ndị ọbịa bịara nꞌụbọchị ahụ. Obi tọrọ Herọd ụtọ nke ukwuu.


MATIU 14:9
Arịrịọ a wutere Herọd, nye ya nsogbu nꞌobi. Ma ebe ọ bụ na ọ ṅụrụ iyi nꞌihu ndị ọbịa ya nile, ọ chọghị ịla azụ nꞌokwu ya. O nyere iwu ka e meere ada ya ihe ọ chọrọ.


MATIU 14:31
Na-atụfụghị oge, Jisọs setipụrụ aka ya dọpụta Pita. Ọ gwara Pita okwu sị ya, “Lee ka okwukwe gị siri dị nta! Gịnị mere i ji nwee obi abụọ?”


MATIU 15:8
‘Ndị a ji egbugbere ọnụ ha na-asọpụrụ m, ma obi ha dị anya site nꞌebe m nọ.


MATIU 15:11
Ọ bụghị ihe banyere mmadụ nꞌọnụ na-emerụ ya. Kama ọ bụ ihe si nꞌọnụ onye ahụ pụta, ya na ihe onye ahụ chere nꞌobi ya.”


MATIU 15:12
Ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya sị, “Ị makwaara na obi adịghị ndị Farisii mma nꞌihi okwu ahụ i kwuru.”


MATIU 15:18
Ma ihe si mmadụ nꞌọnụ pụta na-esi ya nꞌobi apụta. Ọ bụ ihe dị otu a na-emerụ mmadụ.


MATIU 15:19
Nꞌihi na ọ bụ nꞌobi mmadụ ka echiche ime ihe ọjọọ ndị a si apụta: igbu mmadụ, ịkwa iko, ịchụ nwanyị, na isogharị nwoke, na izu ohi, na ama ụgha, na nkwutọ.


MATIU 16:8
Ebe ọ bụ na Jisọs matara ihe ha na-eche nꞌobi ha, ọ gwara ha okwu sị ha, “Unu ndị okwukwe nta! Gịnị mere unu ji na-esogbu onwe unu nꞌihi na unu enweghị ihe oriri?


MATIU 18:6
Ma ọ bụrụ na onye ọ bụla nꞌime unu emee ka otu nꞌime ndị a dị nta, bụ ndị tụkwasịrị m obi, daa mba nꞌokwukwe ya, ọ kaara onye ahụ mma na e kedoro ya nkume nꞌolu, tụnye ya nꞌoke osimiri ka mmiri rie ya.


MATIU 18:26
“Ma nwoke ahụ dara nꞌala nꞌihu eze ahụ, gbuokwa ikpere ya nꞌala rịọọ eze ahụ arịrịọ sị, ‘Onyenwe m, biko, nwee ntachi obi nꞌebe m nọ. Aga m akwụghachịkwa gị ụgwọ nile m ji gị.’


MATIU 18:29
“Nwoke ahụ dara nꞌala nꞌihu ya rịọọ ya ka o nye ya nwantịntị oge. Ọ rịọkwara ya sị, ‘Biko enyi m, nwee ntachi obi, aga m akwụghachi gị ụgwọ m ji gị.’


MATIU 18:33
Ebe m gbaghara gị ụgwọ i ji m, o kwesịghị ka i nwee obi ebere nꞌebe ndị ọzọ nọ, dị ka m si nwee obi ebere nꞌebe ị nọ?’


MATIU 18:34
“Mgbe abụ, eze ahụ oke iwe juru obi, zipụrụ nwoke ahụ ka a taa ya ahụhụ, tutuu ruo mgbe ọ kwụsịrị ụgwọ nile o ji, na-afọdụghị otu kobo.


MATIU 19:8
Jisọs zara sị ha, “Mosisi mere nke a nꞌihi na ọ chọpụtara na obi unu siri ike ịnabata ozizi Chineke. Ma site na mbụ Chineke enyeghị iwu dị otu a.


MATIU 19:19
Sọpụrụ nna gị na nne gị. Hụ onye agbata obi gị nꞌanya dị ka onwe gị.”


MATIU 21:21
Jisọs zara sị ha, “Eziokwu ka m na-ekwu, mgbe m na-agwa unu sị, ọ bụrụ na unu enwee okwukwe, gharakwa inwe obi abụọ, unu ga-eme ihe karịrị nke a. Unu pụrụ inye ugwu olivu a iwu sị ya, ‘Si nꞌebe a wezuga onwe gị, gaa danye nꞌoke osimiri,’ ọ ga-emezukwa.


MATIU 21:29
Nwa ahụ zara nna ya sị, ‘Agaghị m aga’. Ma mgbe e mesịrị, ọ gbanwere obi ya gaa.


MATIU 22:18
Ebe Jisọs maara ihe ọjọọ ha bu nꞌobi, ọ zara sị ha, “Ndị ihu abụọ! Gịnị mere unu ji anwa m ọnwụnwa?


MATIU 22:37
Jisọs zara sị ya, “Ọ bụ iwu nke na-asị, ‘Hụ Onyenwe gị bụ Chineke gị nꞌanya site nꞌobi gị nile na site na mkpụrụ obi gị nile, na site nꞌụche gị nile.’


MATIU 22:39
Iwu ọzọ na-eso nke a nꞌịdị mkpa bụ nke a, ‘Hụ onye agbata obi gị nꞌanya dị ka i si hụ onwe gị nꞌanya.’


MATIU 23:23
“Ee, ahụhụ ga-adakwasị unu ndị Farisii na ndị ozizi iwu. Ndị ihu abụọ! Nꞌihi na unu na-asa anya unu mmiri nye, ọ bụladị onyinye otu ụzọ nꞌime ụzọ iri unu ruo nꞌakwụkwọ nri dịkarịsịrị nta dị nꞌubi unu, ma unu akpọghị ikpe ziri ezi na ebere, na ikwesị ntụkwasị obi ihe dị mkpa. Ee, unu kwesịrị inye onyinye unu. Ma unu ekwesịghị ịhapụ ime ihe kachasị mkpa.


MATIU 23:28
Nꞌụzọ dị otu a, unu na-egosi ndị mmadụ onwe unu dị ka ndị dị nsọ, na ndị ezi omume, ma nꞌime obi unu, unu jupụtara nꞌihu abụọ na mmehie.


MATIU 24:13
Ma ndị nwere ntachi obi ruo ọgwụgwụ ka a ga-azọpụta.


MATIU 24:45
“Ị̀ bụ ohu ahụ maara ihe, nke kwesịkwara ntụkwasị obi, onye e mere onyeisi ezinụlọ m, ka ị na-enye ụmụntakịrị m nri nꞌoge ha chọrọ ya?


MATIU 24:48
“Ma ị bụrụ ohu nke na-asị nꞌobi ya, ‘Onyenwe m ga-anọ tee anya tupuu ọ lọta’,


MATIU 25:21
“Nna ya ukwu toro ya, nꞌihi ọrụ ọma ọ rụrụ sị ya, ‘I mere nke ọma ezi ohu kwesịrị ntụkwasị obi. I zipụtala na i kwesịrị ntụkwasị obi site nꞌilekọta ego ntakịrị a. Nꞌihi ya aga m etinye gị nꞌebe ị ga na-elekọta ego dị ukwuu. Bịa soro m ṅụrịa ọṅụ.’


MATIU 25:23
“Nna ya ukwu sịrị, ‘I mere nke ọma. Ị bụ ezi ohu kwesịrị ntụkwasị obi. I zipụtala na i kwesịrị ntụkwasị obi site nꞌilekọta ego ntakịrị a. Nꞌihi ya aga m etinye gị nꞌebe ị ga-elekọta ego dị ukwuu. Bịa soro nna gị ukwu ṅụrịa ọṅụ.’


MATIU 25:29
Nꞌihi na nwoke ahụ na-ejizi ihe e nyere ya ka a ga-enye ihe ọzọ. Ọ ga-enwebigakwa ihe oke. Ma site nꞌaka nwoke ahụ na-ekwesịghị ntụkwasị obi ka a ga-anapụ, ọ bụladị ihe nta ahụ e nyere ya.


MATIU 26:10
Ebe Jisọs matara ihe ha na-atamu nꞌobi ha, ọ jụrụ ha sị, “Gịnị mere unu ji na-ata nwanyị ụta? Ọ̀ bụ nꞌihi na ọ na-emere ihe ọma?


MATIU 26:37
Ọ kpọọrọ Pita tinyere onwe ya, na ụmụ Zebedi abụọ, Jemes na Jọn. Ọ malitere inwe obi mwute nꞌime onwe ya. Obi malitekwara ịlọ ya mmiri.


MATIU 26:38
Mgbe ahụ ọ gwara ha sị, “Ọ na-ewute mkpụrụ obi ruo nꞌọnụ ọnwụ. Nọgidenụ nꞌebe a soro m na-eche nche.”


MATIU 26:58
Pita sogidere Jisọs nꞌazụ site nꞌebe dị anya. O rutere nꞌobi onyeisi nchụaja, baa nꞌime ụlọ, sorokwa ndị na-eje ozi nọdụ ala, ka o nwee ike ịhụ ihe ha ga-eme Jisọs.


MATIU 26:69
Mgbe ihe ndị a na-eme, Pita nọ nꞌime obi onyeisi nchụaja ahụ. Otu nꞌime ụmụ agbọghọ na-ejere onyeisi nchụaja ozi bịakwutere ya sị ya, “Ị bụkwanụ otu nꞌime ndị na-eso ụzọ Jisọs onye Galili.”


MATIU 27:43
Ọ na-atụkwasị Chineke obi, na-asị na ya bụ Ọkpara Chineke. Ka anyị leenụ ma Chineke ọ ga-azọpụta ya ugbu a!”


MATIU 28:17
Mgbe ha hụrụ Jisọs, ha kpọrọ isi ala nye ya. Ma ụfọdụ nꞌime ha nwere obi abụọ.


MAK 1:11
Nꞌotu oge ahụ kwa, olu dị ukwuu sitere nꞌeluigwe daa sị, “Ị bụ Ọkpara m, onye m hụrụ nꞌanya. Ihe nile banyere gị na-enye m obi ụtọ.”


MAK 2:6
Ma ụfọdụ ndị ozizi iwu ndị Juu nọ nꞌebe ahụ enweghị ọṅụ nꞌobi ha nꞌihi okwu a Jisọs kwuru.


MAK 2:8
Ngwangwa Jisọs ghọtara ihe ha na-eche nꞌobi ha. Ọ jụrụ ha ajụjụ a, “Gịnị mere okwu m kwuru jiri wetara unu obi ọjọọ?


MAK 4:15
Mkpụrụ ọka nke dara nꞌakụkụ ụzọ nọchiri anya obi ndị ahụ nụrụ okwu Chineke, ma ekwensu bịara wepụ okwu ahụ ha nụrụ nꞌobi ha ka ọ hapụ ịbara ha uru.


MAK 4:16
Obi ndị ọzọ dị ka ala nkume nkume ebe ụfọdụ mkpụrụ ọka ahụ danyere. Ndị a bụ ndị jiri ọṅụ nabata ozi ọma ahụ.


MAK 4:17
Ma okwu ahụ ha nụrụ adabanyeghị nke ọma nꞌala ala obi ha ọ dịghị anọgidekwa. Ya mere, mgbe nsogbu na mkpagbu bidoro nꞌihi ime ihe ahụ ha nụrụ na Chineke chọrọ ka ha mee, ha na-akwụsị.


MAK 4:18
“Obi ndị ọzọ dị ka ala ahụ ogwu dị, ebe ụfọdụ nꞌime mkpụrụ ọka ahụ danyere. Ndị a bụ ndị nụrụ ozi ọma ahụ nabatakwa ya.


MAK 4:20
“Obi ụfọdụ dị ka ala ọma ahụ. Ndị a bụ ndị nụrụ ozi ọma ahụ, nabata ya nꞌobi ha. Ha na-eji okwu ha nụrụ rụpụta ezi ọrụ. Ụfọdụ na-amị iri mkpụrụ atọ, ndị ọzọ iri mkpụrụ isii, ndị ọzọ narị mkpụrụ karịa nke a kụrụ.”


MAK 4:38
Mgbe ihe ndị a nile na-eme, Jisọs nọrị nꞌime ụgbọ ahụ na-arahụ ụra. O jiri akwa a fụkọtara afụkọta hinye nꞌisi ya. Ndị na-eso ụzọ ya tụrụ oke egwu mgbe ihe ndị a na-eme, gbaara ọsọ tie mkpu kpọtee ya, na-asị, “Nna anyị ukwu! Ọ dịghị emetụ gị nꞌobi na anyị nile ga-anwụ ma ụgbọ anyị mikpuo?”


MAK 5:3
Nꞌihi na ogige ili ahụ bụ ebe o ji mere ebe obibi ya. Ọ bụkwa nwoke dị ike. Mmadụ ọ bụla enweghị ike iji, ọ bụladi eriri igwe kee ya agbụ.


MAK 5:28
Nꞌihi na nwanyị a ekwuolarị nꞌobi ya sị, “Ọ bụrụ nnọọ na m ga-enwe ike metụ uwe ya aka amaara m na ahụ ga-adị m mma.”


MAK 5:29
Ihe nile mekwara dị ka nwanyị a si chee ya nꞌobi ya. Nꞌihi na mgbe o metụrụ Jisọs aka ọbara ahụ kwụsịrị ịgba. Ọ matakwara na ahụ adịla ya mma.


MAK 5:42
Otu mgbe ahụ nwanta ahụ biliri ọtọ bido na-ejegharị nꞌime ụlọ ahụ. Ọṅụ jupụtara obi nne na nna ya.


MAK 6:3
“Onye a ọ̀ bụghị nwa Josef onye kapinta? Meri ọ̀ bụkwaghị nne ya? Jemes, na Josis, na Jud, na Saịmọn ha abụghị ụmụnne ya? Ọ̀ bụ na anyị amaghị ụmụnne ya ndị nwanyị, ndị anyị na ha nọ nꞌebe a?” Obi jọrọ ha njọ nꞌebe ọ nọ.


MAK 6:19
Nꞌihi nke a obi jọrọ Herodịas njọ megide Jọn. Ọ chọkwara igbu Jọn nꞌihi okwu ahụ o kwuru. Ma Herọd ekweghị ka e gbuo Jọn.


MAK 6:20
Nꞌihi na Herọd tụrụ egwu Jọn. Ọ maara na Jọn bụ ezi mmadụ, na onye dị nsọ. Nꞌihi nke a o tinyere ya nꞌụlọ mkpọrọ ichebe ndụ ya. Site nꞌoge ruo nꞌoge, Herọd na-akpọpụta Jọn ka ya na ya kparịa ụka. Ma ọ bụ ezie na Herọd adịghị enwe obi udo mgbe ọ bụla ya na Jọn kaparịtara ụka, ma ọ na-atọkwa Herọd ụtọ ịna anụ ihe Jọn na-ekwu.


MAK 6:21
Otu ụbọchị, Herodịas nwetara ihe ọ na-achọ. Nꞌụbọchị ncheta ọmụmụ Herọd, ọ kpọrọ oriri. Ọ kpọrọ ndị a maara aha ha nọ nꞌobi eze, na ndị ọchịagha ya, na ndị mmadụ dị mkpa bi na Galili ka ha bịa nꞌoriri ahụ.


MAK 6:22
Nꞌoge oriri ahụ, ada Herọd, nke Herodịas mụtara, pụtara tee egwu nꞌihu Herọd na nꞌihu ndị ọbịa ya. Obi tọrọ ndị nọ nꞌebe ahụ ụtọ nꞌihu egwu o tere.


MAK 6:50
Ọ bụkwa ha nile hụrụ ya. Ụjọ tụkwara ha nile. Ma ngwangwa, Jisọs gwara ha sị, “Nweenụ obi ike! Unu atụla egwu, ọ bụ m.”


MAK 6:52
Nꞌihi na ha aghọtabeghị onye Jisọs bụ, ọ bụladị mgbe o nyesịrị puku mmadụ ise ahụ nri. Ha emegheghị obi ha ịnabata ihe nile anya ha hụrụ.


MAK 7:6
Jisọs zara sị ha, “Okwu ahụ Aịzaya kwuru banyere unu ndị ihu abụọ bụ eziokwu. Nꞌihi na Aịzaya buru amụma sị, ‘Ndị a ji ire dị ụtọ na-ekwu okwu banyere m, ma nꞌime obi ha, ha ahụghị m nꞌanya.


MAK 7:7
Ofufe ha na-efe m esiteghị nꞌobi ha pụta. Ihe ha na-ezikwa ndị mmadụ abụghị iwu m, kama ọ bụ iwu nke aka ha, nke ha chepụtara nꞌụche ha.’


MAK 7:15
Ọ dịghị ihe ọ bụla banyere nꞌime mmadụ pụrụ ịmerụ ya. Nri ọ bụla adịghị nke pụrụ ịmerụ mmadụ. Kama ihe na-emerụ mmadụ bụ ihe ahụ na-esite nꞌime ya na-apụta, ihe ọ na-eche nꞌobi ya na nke ọ na-ekwupụta nꞌọnụ ya.”


MAK 7:19
Nꞌihi na ihe unu riri na-abanye nꞌafọ unu, ọ bụghị nꞌobi unu. Ihe ọ bụla banyekwara nꞌafọ na-emesịa pụọ.” (Ihe Jisọs na-akọwa nꞌebe a bụ na ụdị nri ọ bụla dị ọcha dịkwa mma oriri.)


MAK 7:21
Nꞌihi na ọ bụ site nꞌime obi mmadụ ka echiche ọjọọ nile si apụta, ya na ịkwa iko nile dị iche iche, na izu ohi, na igbu mmadụ na ịkwa iko nke ndị nwere di na nwunye,


MAK 8:17
Mgbe Jisọs ghọtara na okwu ha na nke ya adakọtaghị, ọ gwara ha okwu sị, “Gịnị mere unu ji na-ekwu okwu banyere ejighị beredi? Ọ̀ pụtara na unu adịghị aghọta? Ọ̀ pụtara na obi unu siri ike ịnabata okwu m?


MAK 8:36
“Uru gịnị ka ọ ga-abara mmadụ irite ụwa nile nꞌuru ma tufuo mkpụrụ obi ya?


MAK 10:22
Mgbe nwoke ahụ nụrụ ihe Jisọs kwuru, ihu ya gbarụrụ. O sitere nꞌebe ahụ pụọ nꞌobi ọjọọ. Nꞌihi na ọ bụ ọgaranya nke nwere ọtụtụ akụ na ụba.


MAK 10:24
Okwu a Jisọs kwuru juru ndị na-eso ụzọ ya anya. Ma Jisọs kwugharịkwara okwu ahụ ọzọ sị, “Ọ bụ nnọọ ihe rara ahụ na ndị ahụ na-atụkwasị obi ha na akụ na ụba ha ga-abanye alaeze Chineke.


MAK 10:32
Ha nọ nꞌụzọ na-aga Jerusalem mgbe ihe ndị a na-eme. Jisọs kpo ihu, ndị na-eso ụzọ ya egwu juru obi so ya nꞌazụ. Otu a kwa ndị mmadụ nile na-abịa ha nꞌazụ tụkwara ụjọ. Ọzọ kwa, Jisọs kpọọrọ ndị na-eso ụzọ ya pụọ nꞌebe ndị mmadụ nọ bido na-agwa ha ihe na-akwado ịdakwasị ya.


MAK 10:38
Jisọs sịrị ha, “Echeghị m na unu ghọtara ihe unu na-arịọ ka m meere unu. Ùnu chere na unu pụrụ ịṅụ site nꞌiko ilu nke obi ọjọọ, nke mụ onwe m na-aga ịṅụ? Ùnu chere na unu pụrụ ịnagide ụdị ahụhụ nile nke ga-abịakwasị m?”


MAK 11:23
‘Site nꞌebe a wezuga onwe gị, gaa daba nꞌime osimiri.’ Ọ bụrụ na unu enweghị obi abụọ, kama kwere na ihe unu kwuru ga-emezu, ọ ga-emezukwa dị ka unu siri kwuo ya.


MAK 11:25
Kama, mgbe unu na-ekpe ekpere, unu ebula iro nꞌobi unu megide onye ọ bụla. Burunụ ụzọ gbaghara onye ahụ, ka Nna unu bi nꞌeluigwe gbaghara unu mmehie unu.


MAK 12:14
Ndị a bịakwutere Jisọs sị ya, “Onye ozizi, anyị maara na ị bụ nwoke na-ekwu eziokwu na-atụghị egwu. Ị dịghị echegbu onwe gị banyere ihe ndị mmadụ na-ezu megide gị, nꞌihi na ị naghị ele mmadụ anya nꞌihu. Kama ị ji obi ọcha na-ezi otu mmadụ ga-esi mee ihe ga-atọ Chineke ụtọ. Ma ugbu a, anyị chọrọ ka ị gwa anyị, o ziri ezi ịtụ ụtụ nye Siza, ka o zighị ezi.


MAK 12:30
Unu kwesịrị iji obi unu nile na mkpụrụ obi unu nile, na echiche obi unu nile, na ike unu nile hụ Onyenwe anyị bụ Chineke anyị nꞌanya.’


MAK 12:31
“Iwu ṅke abụọ, nke dịkwa mkpa, bụ nke sị, ‘Hụ onye agbata obi gị nꞌanya dị ka onwe gị.’ Iwu ọ bụla ọzọ adịghị nke karịrị ndị a mkpa.”


MAK 12:34
Mgbe Jisọs hụrụ na nwoke a ghọtara ihe ndị a nke ọma, ọ gwara ya sị, “Ị nọ alaeze Chineke nso.” Mgbe nke a gasịrị, ọ dịkwaghị onye ọ bụla ọzọ nwere obi ike ịjụ ya ajụụ ọzọ.


MAK 12:37
Devidi nꞌọnwe ya kpọrọ Onye nzọpụta a Onyenwe anyị. Oleekwanụ ụzọ Onye nzọpụta siri bụrụ nwa Devidi?” Ụdị okwu a tọrọ ndị na-ege Jisọs ntị ụtọ nꞌobi. O mekwara ka ha gezie ntị nke ọma.


MAK 13:13
Mmadụ nile ga-akpọkwa unu asị nꞌihi na unu na-eso ụzọ m. Ma ndị nile nọgidere bụrụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi ruo nꞌogwụgwụ ihe nile, ndị jụrụ ịgọnarị m nꞌoge a, ka a ga-azọpụta.


MAK 14:19
Okwu a Jisọs kwuru mere ka obi jọọ ndị na-eso ụzọ ya njọ. Ha bidoro ịjụ ya nꞌotu nꞌotu sị, “Ọ bụ m? Ọ bụ m?”


MAK 14:33
Ọ gwara Pita na Jemes, na Jọn ka ha soro ya. Mgbe o bidoro ịga nꞌihu o bidokwara inwe obi ọjọọ na obi ịlọ mmiri nke ukwuu.


MAK 14:34
Ọ gwara mmadụ atọ ahụ sị, “Obi m na-achọ itiwa ruo nꞌọnwụ nꞌihi ihe mgbu dị nꞌime ya. Nọdụnụ nꞌebe a soro m chee nche.”


MAK 14:72
Nꞌotu oge ahụ kwa, oke ọkụkọ kwara akwa nke ugboro abụọ. Mgbe ahụ Pita chetara ihe Jisọs gwara ya. Nꞌihi na Jisọs gwara ya sị, “Tupuu oke ọkụkọ akwaa akwa ugboro abụọ, ị ga-agọnarị ugboro atọ.” Mgbe Pita tụlere okwu ndị a nꞌobi ya, o bidoro ịkwa akwa.


MAK 15:15
Ebe ọ bụ na Pailet chọrọ ime ka obi tọọ igwe mmadụ ahụ ụtọ, ọ hapụrụ Barabas. Emesịa, o nyere ndị agha ya iwu ka ha pịa Jisọs ihe. Nꞌikpeazụ, o nyefere ya ka a kpọgide ya nꞌobe.


MAK 15:43
Josef, onye Arimatia, otu nꞌime ndị na-anọ nꞌụlọ ikpe ndị Juu, na onye a na-asọpụrụ, onye bụkwa onye na-ele anya ọbịbịa alaeze ahụ, jiri obi ike jekwuru Pailet rịọ ya ka o nye ya ike ibudata ahụ Jisọs.


MAK 16:8
Ụmụ nwanyị ahụ gbapụtara site nꞌili ahụ nꞌọnọdụ mgbagwoju anya na ahụ ịma jijiji. Ha akọrọghị onye ọ bụla ihe ọ bụla, nꞌihi na ụjọ jupụtara ha obi.


LUK 1:11
Mgbe Zakaraya nọ nꞌime ime ụlọ nsọ ahụ na-achụ aja ya, mmụọ ozi Chineke mere ka Zakaraya hụ ya anya. Mmụọ ozi a bịara guzo nꞌakụkụ aka nri ebe nchụaja ahụ Zakaraya nọ na-achụ aja nsure ọkụ ya. Mgbe Zakaraya hụrụ mmụọ ozi a, obi fepụrụ ya. Ọ tụkwara oke egwu.


LUK 1:14
Ọmụmụ nwanta a ga-ewetara unu oke ọṅụ na obi ụtọ. Ọtụtụ mmadụ ga-esorokwa unu ṅụrịa ọṅụ.


LUK 1:29
Meri enweghị udo nꞌobi ya mgbe ọ nụrụ okwu a mmụọ ozi kwuru. O bidokwara ịtụgharị nꞌuche ya ihe ekele a pụtara.


LUK 1:38
Meri zara sị, “Ahụ m na mkpụrụ obi m bụ nke Onyenwe anyị. Ejikeere m ime ihe ọ bụla ọ chọrọ ka m mee. Ka ihe nile mezuokwa dị ka i si kwuo!”


LUK 1:46
Mgbe ahụ Meri bidoro ikwu okwu sị, “Lee ka obi m siri jupụta nꞌekele nye Onyenwe m.


LUK 1:47
Obi ụtọ ejupụtala mkpụrụ obi m nꞌihi Chineke Onye nzọpụta m.


LUK 1:51
“O gosipụtala ike aka ya; ọ chụsasịala ndị mpako, meekwa ka ihe nile ha na-ezube nꞌobi ha bụrụ ihe efu.


LUK 1:52
Ọ na-esite nꞌocheeze ndị eze dị ike kwatuo ha, buliekwa ndị dị umeala nꞌobi elu.


LUK 1:58
Ndị agbata obi ya na ndị ikwu ya, ndị nụrụ otu Chineke si gosi ya ihuọma, bịara soro ya ṅụrịa ọṅụ.


LUK 1:66
Onye ọ bụla nụrụ akụkọ a chere nꞌobi ya sị, “Ụdị nwanta dị aṅaa ka nke a ga-abụ? Gịnị ka ọ ga-abụ? O were anya na Chineke nọnyeere ya nꞌụzọ dị iche.”


LUK 1:78
Nꞌihi na site nꞌoke obiọma Chineke, anyị ga-abanye na mgbe na-adịghị anya, nꞌụbọchị ọhụrụ nke na-eweta nzọpụta si nꞌeluigwe bịa.


LUK 2:19
Ma Meri nꞌonwe ya debere ihe ndị a nile nꞌobi ya, cheekwa echiche banyere ha.


LUK 2:25
Nꞌoge ahụ kwa, e nwere otu nwoke bi na Jerusalem aha ya bụ Simiọn, onye jupụtara na Mmụọ Nsọ. Simiọn bụ ezi mmadụ, bụrụkwa onye ji obi ya nile na-efe Chineke. Ọ bụkwa onye na-ele anya ịhụ mgbe Chineke ga-azọpụta ndị Izirel.


LUK 2:35
Ọ bụkwa site nꞌụzọ dị otu a ka a ga-ekpughe echiche zoro ezo nke ọtụtụ mmadụ, mee ka ọ pụta ìhè. Obibi ndụ ya ga-ewetakwara gị, bụ nne ya, iru uju. Iru uju gị ga-adị ukwuu dị ka a ga-asị na e ji mma ihu abụọ dụwaa gị mkpụrụ obi.”


LUK 2:36
O nwekwara otu agadi nwanyị ọzọ nọ nꞌụlọ nsọ ukwu ahụ nꞌụbọchị ahụ. Aha ya bụ Ana. Ọ bụ onye amụma, bụrụkwa nwa Fanuel nke si nꞌebo Asha. Ana enweghị di, nꞌihi na di ya nwụrụ mgbe ha biri nanị afọ asaa. Site na mgbe di ya nwụrụ ruo ụbọchị ahụ ọ bịara ụlọ nsọ ukwu Chineke, iri afọ asatọ na anọ agafeela. Oge ndị a nile, Ana jiri ụlọ nsọ ukwu ahụ mere ebe obibi ya. Ebe a ka ọ nọ na-efe Chineke ehihie na abalị, ọ nọkwa na-ekpe ekpere na-ebukwa ọnụ.


LUK 2:44
Ha chere nꞌobi ha na o so ndị enyi ha ọzọ ndị na-alaghachikwa Nazaret. Mgbe ha gasịrị ije otu ụbọchị, ha chọrọ ya ma ha ahụghị ya. Ha bidoro ịchọ ya nꞌetiti ndị ikwu ha na ndị enyi ha.


LUK 2:51
Emesịa, Jisọs sooro ha laa Nazaret. O rubeere ha isi, meekwara ha ihe nile ha chọrọ ka o mee. Ma nne ya debere ihe ndị a nile nꞌobi ya.


LUK 3:15
Nꞌoge a, onye ọ bụla nọ na-ele ọbịbịa Onye nzọpụta ahụ. Ha nọkwa na-atule nꞌobi ha ma Jọn ọ bụ Onye nzọpụta ahụ.


LUK 4:32
Ihe o ziri ha juru ndị mmadụ anya. Nꞌihi na o ziri ha ihe dị ka onye maara ihe bụ eziokwu, dị ka ọpụtaobie, ọ bụghị dị ka onye na-ekwu site nꞌihe ọ nụrụ nꞌọnụ ndị ọzọ.


LUK 5:22
Ebe Jisọs ghọtara ihe ha na-eche, ọ zara ha sị, “Gịnị mere unu ji na-eche nꞌobi unu na m adịghị asọpụrụ Chineke?


LUK 5:26
Ọrụ a tụrụ ndị nile nọ nꞌebe ahụ nꞌanya. Ha bidokwara na-eto Chineke. Oke egwu jupụtara ha nꞌobi, mee ka ha kwuo sị, “Anya anyị ahụla ihe ọ na-ahụbeghị mbụ, ọrụ ebube dị ukwuu!”


LUK 6:8
Ma ebe Jisọs maara ihe ha na-ezube nꞌobi ha, ọ kpọrọ nwoke ahụ nke aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ sị ya, “Pụta bịa guzoro nꞌetiti ụlọ ekpere a.” Nwoke ahụ pụtara bịa guzoro ebe Jisọs sị ya guzo.


LUK 6:11
Mgbe ndị iro Jisọs hụrụ ihe Jisọs mere, ọnụma jupụtara ha obi. Ha zukọtara ikwu otu ha ga-esi jide Jisọs, gbuo ya.


LUK 6:20
Mgbe ihe ndị a na-eme, Jisọs tụgharịrị lee ndị na-eso ụzọ ya anya gwa ha okwu sị, “Lee obi ụtọ dịrị unu, ndị ogbenye, nꞌihi na alaeze eluigwe bụ nke unu.


LUK 6:21
“Lee obi ụtọ dịrị unu, unu ndị agụụ na-agụ nꞌihi na afọ ga-eju unu. Leekwa obi ụtọ dị na-eche unu mgbe ndị mmadụ na-akpọ unu asị, na mgbe a na-achụpụ unu, na-akparị unu, na-asịkwa na unu bụ ajọ mmadụ nꞌihi na unu na-eso m


LUK 6:25
Oke ahụhụ dịkwa na-eche ndị ọgaranya nꞌihi afọ ojuju nke ha na-enwe ugbu a, agụụ ga-agụkwa ha. Ha na-achị ọchị ugbu a, ma ha ga-akwa akwa, tie aka nꞌobi nꞌiru uju.


LUK 6:33
Ọ bụrụkwa nanị ndị na-enyere unu aka ka unu na-enyere aka, obi ò ga-atọ Chineke ụtọ nꞌebe unu nọ? É, è. Nꞌihi na ndị mmehie na-enyekwara ndị na-enyere ha aka aka.


LUK 6:35
“Ma iwu m na-enye unu bụ nke a, hụnụ ndị iro unu nꞌanya, nyekwaranụ ndị ọzọ aka, gbazinyenụ ndị nọ na mkpa ihe ha chọrọ, na-eleghị anya na ha ga-akwụghachi unu. Unu mee nke a, ụgwọ ọrụ unu ga-adị ukwuu, unu ga-egosikwa na unu bụ ụmụ Chineke nꞌezie, nꞌihi na Chineke na-emere ndị na-eme ihe ọjọọ ihe ọma, na-egosikwa ndị na-adịghị ekele ya ekele obi ebere.


LUK 6:36
“Ya mere, nweenụ obi ebere dị ka nna unu bi nꞌeluigwe si enwe obi ebere.


LUK 6:45
Ezi mmadụ na-esite nꞌakụ ọma juru ya obi na-arụpụta ezi ihe, otu a kwa ajọ mmadụ na-esite nꞌobi ọjọọ ya na-arụpụta ajọ ihe. Nꞌihi na ihe ọ bụla dị mmadụ nꞌobi bụ ihe na-apụta nꞌọnụ ya.


LUK 7:23
Gwakwanụ Jọn na ọṅụ dịrị nwoke ahụ nke na-adịghị enwe obi abụọ banyere m.”


LUK 7:25
Gịnị ka unu lere anya ịhụ? Ọ̀ bụ nwoke yi uwe mara mma? Lee na ndị na-eyi uwe mara mma nọ nꞌobi eze.


LUK 7:39
Mgbe nwoke onye Farisii ahụ Jisọs nọ nꞌụlọ ya na-eri nri hụrụ ihe nwanyị a na-eme, o kwuru nꞌobi ya sị, “A sị na nwoke a bụ onye amụma nꞌezie, ọ gaara amata ụdị mmadụ nwanyị a na-emetụ ya aka bụ, ọ gaara amata na nwanyị a bụ akwụla.”


LUK 7:40
Ma Jisọs gwara onye Farisii ahụ okwu sị, “Saimọn, ọ dị ihe m chọrọ ịgwa gị.” Saimọn zara ya sị, “Kwuo ihe dị gị nꞌobi, ana m ege ntị.”


LUK 8:3
na Joana nwụnye nwoke a na-akpọ Chuza onye na-elekọta obi eze Herọd na akụ ya nile, na Suzana, na ọtụtụ ụmụ nwanyị ndị ọzọ so Jisọs na-egboro ya mkpa ya.


LUK 8:12
Mkpụrụ dara nꞌakụkụ ụzọ nọchiri anya ndị na-anụ okwu Chineke, ma ekwensu na-abịa napụ ha okwu ahụ nꞌobi ha, ka ha ghara ikwere ka a zọpụta ha.


LUK 8:13
Mkpụrụ ndị ahụ dara nꞌelu nkume nọchiri anya ndị ahụ nụrụ okwu Chineke jiri ọṅụ nabata ya. Ma okwu ahụ ha nụrụ abanyeghị nꞌime obi ha gbaa mgbọrọgwụ. Ha na-ekwere nanị nwa oge nta, ma mgbe ọnwụnwa bịara nꞌihi ihe ha kweere nꞌime ya, ha adịghị agakwa nꞌihu. Ha na-ada nꞌokwukwe ha.


LUK 8:15
“Ma mkpụrụ ndị ahụ dara nꞌezi ala nọchiri anya ndị mmadụ jiri obi ghere oghe na mmụọ ziri ezi nabata okwu ahụ ma gaakwa nꞌihu ime ihe okwu ahụ kwuru. Ndị a na-apụ jiri ntachi obi gbasaa ozi ọma ahụ, rite ndị ọzọ nꞌuru.


LUK 8:52
Nꞌime ụlọ ahụ, Jisọs hụrụ ọtụtụ ndị nọ na-akwa akwa na-etikwa aka nꞌobi na mwute, nꞌihi ọnwụ nwanta nwanyị ahụ. Jisọs gwara ha sị, “Unu ebekwala akwa, nꞌihi na nwanta nwanyị a anwụghị anwụ, ọ bụ ụra ka ọ na-arahụ.”


LUK 8:56
Ụdị ọṅụ juru ndị mụrụ nwa ahụ obi enweghị ọkụkọ. Ma Jisọs dọrọ ha aka na ntị sị ha agwakwala onye ọ bụla ihe mere.


LUK 9:36
Mgbe olu ahụ kwusịrị okwu, ọ bụkwa nanị Jisọs ka Pita na Jọn na Jemes hụrụ. Ọ dịkwaghị onye ọ bụla ha gwara ihe ha hụrụ, kama ha debere ihe nile nꞌobi ha.


LUK 9:41
Jisọs zara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Unu bụ nnọọ ndị ekweghị ekwe na isi ike juru obi! Ruo olee mgbe ka mụ na unu ga-anọ m na-anagide ekweghị ekwe unu?” Mgbe ahụ ọ gwara nna nwanta ahụ sị, “Kpọtara m nwanta ahụ nꞌebe a!”


LUK 9:51
Mgbe oge Jisọs ji alaghachi nꞌeluigwe na-abịa nnọọ nso, o kpebiri nꞌobi ya ịga Jerusalem.


LUK 10:27
Nwoke ahụ zara ya sị, “Iwu ahụ sịrị, Ì kwesịrị iji obi gị nile, na mkpụrụ obi gị nile, na ike gị nile, na mmụọ gị nile, hụ Onyenwe anyị bụ Chineke gị nꞌanya. I kwesịkwara ịhụ onye agbata obi gị nꞌanya dị ka ị hụrụ onwe gị.”


LUK 10:29
Ma ebe nwoke ahụ na-ezi iwu chọrọ igosi na ya bụ onye na-eme ihe ziri ezi, ọ jụrụ Jisọs ajụjụ sị ya, “Onye kwanụ bụ onye agbata obi m?”


LUK 10:36
Mgbe ahụ Jisọs jụrụ onye ozizi iwu ahụ sị, “Ònye nꞌime mmadụ atọ ndị a ka i chere bụ onye gosiri onwe ya dị ka onye agbata obi nwoke ahụ ndị na-apụnarị mmadụ ihe nꞌike merụrụ ahụ?”


LUK 11:17
Ma Jisọs onye maara ihe ha na-eche nꞌobi ha gwara ha okwu sị, “Obodo ọ bụla ịlụ ọgụ dị nꞌime ya agaghị adịgide ruo mgbe tere anya, ezinụlọ ọ bụla kwa nkewa na ịlụ ọgụ dị nꞌime ya, enweghị ike ịnọkọta.


LUK 11:24
“Mgbe ọ bụla mmụọ ọjọọ si nꞌime mmadụ pụọ, mmụọ ọjọọ ahụ na-ejegharị nꞌala akọrọ na-achọgharị ebe ọ ga-ezu ike. Ọ bụrụ na mmụọ ọjọọ ahụ achọtaghị ebe izuike, ọ na-asị nꞌobi ya, ‘Aga m alaghachikwuru nwoke ahụ m si nꞌime ya pụta.’


LUK 11:25
Mgbe mmụọ ọjọọ ahụ lọghachiri, ọ ga-achọpụta na a zachaala obi nwoke ahụ ma ọ tọgbọrọ nꞌefu.


LUK 11:41
Ọ bụrụ na unu ga-enwe mkpebi nꞌobi unu inyere ndị ogbenye aka, unu ga-achọpụta na ihe nile dị ọcha.


LUK 11:53
Mgbe Jisọs si nꞌebe ahụ na-apụ, ndị ozizi iwu na ndị Farisii sitere nꞌoke iwe juru ha obi kwuo okwu megide ya. Ha jụkwara ya ajụjụ banyere ọtụtụ ihe,


LUK 12:4
“Ndị enyi m, unu atụla egwu ndị chọrọ igbu unu. Nꞌihi na ọ bụ nanị anụ ahụ ka ha nwere ike igbu. Ha enweghị ike ịmetụ mkpụrụ obi unu aka.


LUK 12:17
Nwoke a bidoro na-eche nꞌobi ya sị, ‘Ọ̀ba m nwere ebughị ibu. Ọ gaghị abachakwa mkpụrụ ubi a. Gịnị ka m ga-eme?’


LUK 12:19
Mgbe m mesịrị ihe ndị a, tinyechaa mkpụrụ ubi a nꞌọba ọhụrụ ahụ, aga m agwa onwe m okwu sị, ‘Enyi, i nwejuola nri ị ga-eri ọtụtụ afọ. Kwụsị ịdọgbu onwe gị nꞌọrụ. Zuru ike. Rie nri, ṅụọkwa ihe ọṅụṅụ, mee ka obi tọọ gị ụtọ. Nchegbu ọ bụla adịkwaghi nye gi.’


LUK 12:28
Ọ bụ Chineke na-eme ka ahịhịa maa mma ile anya, ee, ahịhịa nke na-eto taa, nke e nwekwara ike igbutu echi, nke a na-akpọkwa ọkụ ma ọ kpọnwụọ. Ọ bụrụ na Chineke na-eme ka ahịhịa efu maa mma, unu na-eche na ọ gaghị egboro unu mkpa uwe, unu ndị obi abụọ?


LUK 12:31
Ọ ga-enyekwa unu ihe nile na-akpa unu mkpa ụbọchị nile ma ọ bụrụ na unu ga-atụkwasị obi unu nꞌihe gbasara alaeze ya.


LUK 12:34
nꞌihi na ọ bụ ebe ọ bụla ego unu dị ka obi unu ga-adịkwa.


LUK 12:41
Pita zara ya sị, “Ị̀ tụrụ ilu a nꞌihi anyị, ka ọ bụ ndị mmadụ ndị a ka i bu nꞌobi tụọ ya?”


LUK 12:42
Jisọs zara ya sị, “Ị bụrụ odibo ahụ maara ihe, nke kwesịrị ntụkwasị obi, onye nna ya ukwu kpọrọ mee onye na-elekọta ihe nile o nwere mgbe ọ na-apụ ịga njem, ka ị na-enye onye ọ bụla nọ nꞌụlọ ya nri nꞌoge ya,


LUK 12:46
nna gị ukwu ga-alọta nꞌụbọchị ahụ, na oge ahụ ị na-atụghị anya ya, ọ ga-atakwa gị ahụhụ, tinye gị nꞌebe a na-edebe ndị na-ekwesịghị ntụkwasị obi.


LUK 12:50
Ọ dị nnọọ ọrụ dị ukwuu dị nꞌihu m nke m na-aghaghị ịrụ, leekwa ka o si na-anụ m ọkụ nꞌobi imecha ya.


LUK 15:6
Mgbe ọ lọtara ụlọ, gịnị ka ọ ga-eme? Nꞌezie, asị m unu, ọ ga-akpọ ndị enyi ya na ndị agbata obi ya sị ha, ‘Bịanụ soro m ṅụrịa ọṅụ nꞌihi na achọtala m atụrụ m kpafuru akpafu.’


LUK 15:9
Mgbe nwanyị ahụ chọtara otu mkpụrụ ego ahụ, gịnị ka unu chere na ọ ga-eme? Ọ ga-akpọ ndị enyi ya na ndị agbata obi ya sị ha bịa soro ya ṅụrịa ọṅụ nꞌihi na ya achọtala otu mkpụrụ ego furu efu.


LUK 15:18
O kpebiri nꞌobi ya sị, ‘Aga m alaghachikwuru nna m. M ruo ebe ahụ, aga m agwa ya sị, Nna m, emehiela m megide Chineke. Emehiekwala m megide gị. Ekwesikwaghị ka a kpọọ nwa gị ọzọ. Biko were m ka m bụrụ otu nꞌime ndị na-ejere gị ozi.’


LUK 16:3
“Mgbe odibo a nụrụ ihe nna ya ukwu kwuru, o chere nꞌobi ya sị, ‘Gịnị ka m ga-eme ugbu a nna m ukwu na-achọ ịkwụsị m nꞌọrụ? Ike igwu ala adịghị m, ihere agakwaghị ekwe m jegharịa ịrịọ arịrịọ.


LUK 16:10
Onye ọ bụla jiziri ihe dị ntakịrị e nyere ya ga-enwe ike jizie ihe ukwu ọ bụla a ga-etinye ya nꞌaka. Ma onye ahụ a na-enweghị ike ịtụkwasị obi nꞌihe dịkarịsịrị nta ga-abụkwa onye a na-enweghị ike ịtụkwasị obi ijizi ihe buru ibu.


LUK 16:11
Ọ bụrụ na mmadụ enweghị ike tụkwasị gị obi ilekọtazi akụ na ụba nke ụwa a, onye kwanụ ga-atụkwasị gị obi nye gị ezi akụ nke eluigwe?


LUK 16:12
Ọ bụrụkwa na o nweghị onye na-atụkwasị gị obi ijizi akụ onye ọzọ, onye kwanụ ga-atụkwasị gị obi ijizi ihe nke bụ nke gị?


LUK 16:15
Ma Jisọs gwara ha sị, “Nꞌihu ndị mmadụ, unu na-egosi onwe unu dị ka ndị dị nsọ na ndị bụ ndị ezi omume. Ma Chineke maara obi unu. Nꞌihi na ihe ndị mmadụ na-akpọ ihe dị mkpa abaghị uru nꞌihu Chineke.


LUK 16:25
“Ma Eberaham zara ya sị, ‘Nwa m nwoke, chetakwa oge ị nọ nꞌụwa? Nꞌoge ahụ i nwetara ihe ọma nile. Chetakwa na Lazarọs natara nanị ihe ọjọọ nꞌoge ahụ. Ugbu a Chineke na-akasi Lazarọs obi ma ị nọkwa nꞌoke ihe mgbu.


LUK 18:2
Ọ sịrị ha, “O nwere otu ọkaikpe bi nꞌotu obodo, nke na-adịghị atụ egwu Chineke. Ọ naghị emetụ ya nꞌobi ihe ndị mmadụ na-ekwu banyere ya.


LUK 18:4
Ma oge nile nwanyị a na-abịakwute ọkaikpe a, ọkaikpe a ekweghị inyere ya aka. Nꞌikpeazụ, nꞌihi na nwanyị a nyegidere ọkaikpe ahụ nsogbu, ọkaikpe a kwuru sị, ‘Ọ bụ ezie na m adịghị atụ egwu Chineke, ọ nakwaghị emetụ m nꞌobi ihe ndị mmadụ na-ekwu megide m. Ma nwanyị a enyekarịala m nsogbu. Aga m enyere ya aka. Nꞌihi na ọ bụrụ na m ajụ inyere ya aka, ọ ga-aga nꞌihu na-abịakwute m, ọ gaghị enye m ohere izu ike.’ ”


LUK 18:9
Jisọs kọrọ akụkọ a nꞌihi ndị na-eche nꞌobi ha na ha bụ ndị dị mma si otu a na-eleda ndị ọzọ anya.


LUK 18:11
Onye Farisii guzoro ọtọ si otu a kpee ekpere ya nye Chineke sị, ‘Chineke, biko ekelee m gị, nꞌihi na adịghị m ka ndị ọzọ. Adịghị m ka onye ọnaụtụ ahụ. Anaghị m aghọgbu mmadụ, anaghị m akwa iko, abughị m onye mmadụ na-enweghi ike ịtụkwasị obi.


LUK 18:13
“Ma onye ọnaụtụ guzo nꞌebe dị anya enweghị ike iweli isi ya elu lee anya nꞌeluigwe. Kama ọ nọ ebe ahụ tie aka nꞌobi na mwute gwa Chineke okwu sị, ‘Chineke m, biko meere m ebere nꞌihi na abụ m onye mmehie!’


LUK 18:23
Mgbe nwoke ahụ nụrụ okwu a Jisọs kwuru, ihu ya gbarụrụ, obi jọkwara ya njọ, nꞌihi na ọ bụ ọgaranya.


LUK 19:46
Ọ gwara ha sị, “E dere ya nꞌakwụkwọ nsọ na ụlọ m ga-abụ ụlọ ekpere, ma ugbu a unu emeela ya ka ọ bụrụ ebe obibi ndị na-apụnarị mmadụ ihe.”


LUK 20:19
Nꞌoge ahụ, ndị ozizi iwu na ndị isi nchụaja ghọtara na ọ bụ ha ka Jisọs bu nꞌobi mgbe ọ kọrọ akụkọ ahụ. Ha gbalịrị ijide ya, ma ha ejidekwaghị ya nꞌihi na ha tụrụ egwu ihe ndị mmadụ ga-eme ha.


LUK 21:14
Kpebienụ nꞌobi unu na unu agaghị echegbu onwe unu banyere ihe unu ga-ekwu iji gọrọ onwe unu.


LUK 21:19
Kama tachienụ obi, nwee ndidi, nꞌihi na ọ bụ otu a ka unu ga-esi zọpụta ndụ unu.


LUK 21:25
“Ihe ịrịba ama na ìhè ngosi ga-apụta ìhè nꞌanwụ na nꞌọnwa ya na kpakpando. Oke ịta ahụhụ ga-adakwasịkwa mba nile dị nꞌụwa. Ndị mmadụ ga-anọ nꞌoke mgbagwoju anya. Ụjọ ga-ejupụtakwa obi ha mgbe ọ bụla ebili mmiri nke oke osimiri mere mkpọtụ.


LUK 22:3
Mgbe ahụ ekwensu banyere nꞌime obi Judas Iskarịọt, otu nꞌime mmadụ iri na abụọ ahụ na-eso Jisọs.


LUK 22:44
Nꞌime obi nke jupụtara nꞌihe mgbu, Jisọs kpere ekpere kpesie ike, nke mere na ọsụsọ si ya nꞌahụ na-adapụ nꞌala dị ka ọkpụrụkpụ ọbara.


LUK 22:45
Mgbe o kpechara ekpere, o biliri ọtọ, bịakwute ndị na-eso ụzọ ya, hụ na ha na-arahụ ụra, nꞌihi na obi adịghị ha mma.


LUK 23:8
Obi tọrọ Herọd ụtọ mgbe ọ hụrụ Jisọs nꞌihi na ọ dịlarị anya kemgbe ọ chọrọ ịhụ ya anya ihu na ihu. Nꞌihi na ọ nụla ọtụtụ akụkọ banyere Jisọs. O lekwara anya na Jisọs ga-arụ ọrụ ịrịba ama nꞌihu anya ya. Ọ nụla akụkọ Jisọs, nꞌihi ya o nwere olileanya na Jisọs ga-arụrụ ya ụfọdụ nꞌime ọrụ ebube ahụ ọ na-arụ.


LUK 23:48
Mgbe ndị bịara ile otu a ga-esi kpọgbuo Jisọs hụrụ ihe nile mere, ha hapụrụ ebe ahụ laa nꞌụlọ ha, na-eti aka nꞌobi na mwute.


LUK 24:32
Mgbe ahụ mmadụ abụọ ahụ bidoro ịgwarịta onwe ha okwu sị, “Ọ̀ bụ na obi anyị ejupụtaghị nꞌọṅụ mgbe anyị na ya nọ nꞌụzọ ọ na-akọwara anyị ihe dị nꞌakwụkwọ nsọ?”


LUK 24:38
Ma Jisọs zara ha sị, “Gịnị mere ụjọ ji na-atụ unu? Gịnị mere unu ji na-enwe obi abụọ?


LUK 24:41
Ma o siiri ndị na-eso ụzọ ya ike inwe mkpebi na ọ bụ ya nꞌezie. Ọṅụ jupụtara obi ha, ma otu aka ahụ kwa, ha jupụtara nꞌobi abụọ. Mgbe ahụ Jisọs jụrụ ha sị, “Ọ dị ihe oriri unu nwere?”


LUK 24:47
E dekwara ya sị na a ga-ekwusara ndị mmadụ otu ha ga-esi chegharịa nweta mgbaghara site nꞌịtụkwasị m obi. A ga-ekwusa ya nye mmadụ nile na mba nile, bido na Jerusalem.


LUK 24:52
Ndị na-eso ụzọ ya kpọrọ isi ala nye ya nꞌọnọdụ ife ya ofufe. Emesịa ha lọghachiri na Jerusalem; oke ọṅụ jukwara ha obi.


JỌN 2:17
Nꞌoge ahụ ndị na-eso ụzọ ya chetara ihe e dere nꞌakwụkwọ nsọ sị, “Ihe banyere ụlọ gị, Chineke, ka mkpụrụ obi m na-achọsi ike.”


JỌN 2:24
Ma Jisọs atụkwasịghị ha obi nke iwere onwe ya nye ha, nꞌihi na ọ maara ihe mmadụ nile bụ.


JỌN 2:25
Ọ chọghị ka onye ọ bụla gwa ya ihe banyere mmadụ. Nꞌihi na ọ maara ihe dị mmadụ nꞌobi, matakwa na mmadụ pụrụ ịgbanwe mgbe ọ bụla.


JỌN 3:16
Nꞌihi na Chineke hụbigara ụwa nꞌanya oke, na o nyere Ọkpara nke ọ mụrụ nanị ya. Ka onye ọ bụla tụkwasịrị obi na ya ghara ịla nꞌiyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.


JỌN 3:18
“Ikpe agaghị amakwa ndị nile tụkwasịrị Ọkpara Chineke obi kama ndị nile jụrụ ya, abụrụla rị ndị a mara ikpe, nꞌihi na e kpeela ha ikpe ugbu a. Ha bụkwa ndị ikpe Chineke mara nꞌihi na ha ekwenyeghị nꞌỌkpara Chineke.


JỌN 4:22
Ihe dị mkpa abụghị ebe anyị nọ kpọọ isi ala nye Chineke. Kama ọ bụ otu anyị siri kpọọ isi ala. Anyị na-esite nꞌime obi anyị kpọọ isi ala? Anyị na-akpọ isi ala site nꞌinyeaka nke Mmụọ Nsọ? Chineke bụ mmụọ. Anyị apụkwaghị ịkpọ isi ala nye ya nꞌụzọ ziri ezi ma ọ bụghị site nꞌinyeaka ya. Nke a bụ ụdị ịkpọ isi ala Chineke chọrọ site nꞌaka anyị. Unu bụ ndị Sameria maara ntakịrị banyere nke a. Unu na-akpọ isi ala nꞌisi. Anyị ndị Juu maara ihe nile banyere ya nꞌihi na nzọpụta rutere ụwa site nꞌaka ndị Juu!”


JỌN 4:35
Ùnu chere na owuwe ihe ubi naebido nanị nꞌọnwa asatọ nꞌafọ? Leenụ anya gburugburu unu! Ọtụtụ mkpụrụ obi ụmụ mmadụ achaala dị ka mkpụrụ ubi. Ha dịkwa mma ọghụghọ.


JỌN 4:36
Ndị ga-aghọ ha ga-enwe ụgwọ ọrụ dị mma. Ha ga-aghọtakwa mkpụrụ obi ndị ga-abanye nꞌime ọba nke eluigwe. Lee! ọṅụ dị ukwuu dị na-eche ndị na-akụ mkpụrụ na ndị na-ewe ihe ubi a.


JỌN 4:45
Mgbe Jisọs bịaruru ala Galili, ndị obodo ahụ weere obi ha nile nabata ya. Nꞌihi na ọtụtụ nꞌime ha nọ na Jerusalem nꞌụbọchị mmemme Ngabiga ahụ hụ ụfọdụ ihe ịrịba ama Jisọs rụrụ.


JỌN 5:34
Ọ bụghị na m na-atụkwasị obi nꞌama mmadụ. Emere m ka unu cheta ama Jọn ka unu kwere na m, ka a zọpụta unu.


JỌN 5:45
“Agaghị m ebo unu ihe ọ bụla nꞌebe Nna nọ. Mosisi bụ onye ga-ebo unu ebubo nile. Ee, Mosisi ahụ unu na-atụkwasị obi na ọ ga-eduba unu nꞌeluigwe.


JỌN 6:27
Unu atụkwasịla obi unu nꞌihe na-ala nꞌiyi dị ka nri, kama chọọnụ ndụ ebighị nke Nwa nke mmadụ na-enye. Nꞌihi na Chineke Nna zitere ya ime nke a.”


JỌN 6:61
Ma Jisọs nꞌọnwe ya matara nꞌime onwe ya na ndị na-eso ụzọ ya naatamụ ntamụ nꞌetiti onwe ha banyere ozizi ya. Ya mere ọ jụrụ ha ajụjụ sị, “Okwu ndị a o mere ka obi jọọ unu njọ?”


JỌN 8:6
Ha kwuru okwu ndị a ile ma ha gaesite nꞌọsịsa Jisọs ga-enye ha boo ya ebubo ịkwagide mmebi iwu. Ha gere ntị ka ha nụrụ ihe Jisọs ga-ekwu. Ma ebe ọ bụ na Jisọs matara echiche obi ha, ọ gwaghị ha ihe ọ bụla. Kama o huuru ala were mkpịsị aka ya dee ihe nꞌala.


JỌN 8:20
Okwu ndị a nile ka Jisọs kwuru nꞌụlọ nsọ ukwu ha, na mpaghara ụlọ ahụ a na-akpọ Ụlọ Akụ. Ma ọ dịghị onye ọ bụla nwere obi ike ijide ya nꞌihi na oge ọnwụ ya erubeghị.


JỌN 9:8
Ma mgbe ndị agbata obi ya hụrụ ya, ha jụrịtara onwe ha ajụjụ sị, “Onye a ọ̀ bụghị onye ahụ kpuru ìsì? Nwoke a ọ̀ bụghị onye arịrịọ ahụ?”


JỌN 10:20
Ọtụtụ nꞌime ọgbakọ ahụ sịrị, “Mmụọ ọjọọ na-achị achị nꞌobi ya. Ọ bụ onye isi mebiri. Ọ baghị uru ige ya ntị?”


JỌN 11:8
Ma ndị na-eso ụzọ ya egwu juru obi gwara ya sị, “Nꞌoge gara aga ka ndị Juu nwara ọnwụnwa ịtụ gị nkume. Ị na-agakwa ebe ahụ ọzọ?”


JỌN 11:15
Ma nꞌihi unu, obi dị m ụtọ na anọghị m nꞌebe ahụ. Nꞌihi na nke a ga-enye unu ohere ọzọ ikwere na m. Bịanụ, ka anyị gaa lee ya.”


JỌN 11:19
Ọtụtụ ndị Juu bịakwutere Mata na Meri ịkasi ha obi.


JỌN 11:31
Mgbe ndị Juu nọ nꞌụlọ na-akasi Meri obi hụrụ ya ka ọ na-apụ ngwangwa, ha chere na ọ na-aga nꞌakụkụ ili ịkwa akwa. Ha sooro ya.


JỌN 11:33
Mgbe Jisọs hụrụ ya ka ọ na-akwa akwa, hụkwa ndị ahụ bịara ileta ha ka ya na ha na-akwa akwa, o metụrụ ya nꞌobi. O nwere ọmiko dị ukwuu nꞌebe ha nọ.


JỌN 12:6
Ma Judas ekwughị nke a nꞌihi na ihe banyere ndị ogbenye na-emetụ ya nꞌobi. Kama Judas bụ onye na-eche ego ndị na-eso ụzọ Kraịst. Mgbe ụfọdụ, ọ naamanye aka nꞌego ahụ zụfuo nꞌonwe ya.


JỌN 12:27
Ugbu a, mkpụrụ obi m jupụtara nꞌihe mgbu. Gịnị ka m ga-ekwu? M ga-arịọ Nna m ka ọ zọpụta m site nꞌihe na-akwado ịdakwasị m? Mbaa! Ọ bụ nꞌihi nke a ka m ji bịa nꞌụwa.


JỌN 12:40
“Chineke emeela ka ha kpuo ìsì. O meela ka obi ha kpọchie. He enweghị ike ịhụ. Ha apụghị ịghọtakwa. Ha agaghị abịakwute Chineke ka ọ gwọọ ha.”


JỌN 12:44
Jisọs tiri mkpu sị, “Onye ọ bụla tụkwasịrị m obi, tụkwasịrị Chineke obi.


JỌN 12:46
Abịara m nꞌime ụwa dị ka ìhè ka ndị nile tụkwasịrị m obi hapụ ijegharị nꞌọchịchịrị.


JỌN 12:47
Ọ bụrụ na onye ọ bụla nụrụ okwu m ajụ ịtụkwasị m obi, ọ bụghị m ga-ekpe ya ikpe. Abịara m ịzọpụta ụwa, ọ bụghị ikpe ụwa ikpe.


JỌN 13:2
Mgbe a na-eri nri anyasị, ekwensu tinyere atụmatụ ọjọọ nꞌime obi Judas. Atụmatụ a bụ na a ga-arara Jisọs nye nꞌabalị ahụ.


JỌN 13:17
Ugbu a unu maara ihe ndị a nile, meenụ ha. Obi unu ga-ejupụta nꞌọṅụ ma unu mee ha.


JỌN 13:22
Ndị na-eso ụzọ ya lerịtara onwe ha anya na-eche nꞌime obi ha onye ọ ga-abụ.


JỌN 14:1
“Ka obi ghara ịlọ unu mmiri. Kwerenụ na Chineke, kwerekwanụ na m.


JỌN 14:2
Nꞌụlọ Nna m ọtụtụ ụlọ obibi dị ya. Ọ bụrụ na o sighị otu a dịrị, agaara m agwa unu. Ma ana m aga idoziri unu ha.


JỌN 14:12
“Nꞌeziokwu, ana m agwa unu sị, onye ọ bụla tụkwasịrị m obi ga-enwe ike mee ihe ndị a nile. Ọ ga-enwekwa ike ime karịa ihe ndị a nꞌihi na m na-alakwuru Nna m.


JỌN 14:16
Aga m arịọ Nna m ka o zitere unu Onye nkasịobi, onye ga-anọnyere unu ruo mgbe ebighị ebi. Onye a ga-abụ Mmụọ nke eziokwu.


JỌN 14:27
“Udo ka m na-ahapụrụ unu. Udo nke m ka m na-enye unu. Ọ bụghị dị ka ụwa si enye udo ka m na-enye unu udo nke m. Unu ekwela ka obi lọọ unu mmiri. Ka ụjọ hapụkwa ịtụ unu.


JỌN 16:6
Ma nꞌihi na m gwara unu okwu ndị a, obi unu ejupụtala na mwute.


JỌN 16:7
Nꞌezie, ọ dị mkpa ka m hapụ unu laa. Ọ bụrụ na m alaghị, Onye nkasịobi ahụ agaghị abịa. Ọ bụrụ na m laa, aga m ezitere unu ya.


JỌN 16:17
Ụfọdụ ndị na-eso ụzọ ya jụrịtara onwe ha ajụjụ sị, “Gịnị ka okwu dị otu a pụtara? Gịnị ka o bu nꞌobi mgbe ọ na-asị, ‘Ana m alakwuru Nna m?’ Nke a edoghị anyị anya.”


JỌN 16:19
Jisọs matara ihe dị ha nꞌobi. Ọ maara na ha chọrọ ka a kọwaara ha. Nꞌihi ya, ọ sịrị ha, “Ùnu na-ajụrịta onwe unu ihe banyere okwu m kwuru?


JỌN 16:20
Nꞌezie, unu ga-akwa akwa tie aka nꞌobi na mwute. Ma ndị ụwa ga-aṅụrị ọṅụ. Ma mgbe iru uju unu gafesịrị unu ga-aṅụrị ọṅụ.


JỌN 16:33
Agwala m unu ihe ndị a nile ka unu nwee udo nꞌobi unu. Nꞌime ụwa a, unu ga-enwe nsogbu na ọnwụnwa. Ma ka obi hapụ ịlọ unu mmiri, emeriela m ụwa.”


JỌN 17:21
Isi ekpere m nꞌihi ha bụ ka ha nile nwee otu obi na otu mkpebi banyere ihe nile ha ga-eme, dị ka mụ na gị si nwekọọ. Nna, ee, dị ka gị onwe gị dị nꞌime m, dị ka mụ onwe m dịkwa nꞌime gị, achọrọ m ka ndị nile kweere na m nọgide nꞌime anyị. Mgbe ahụ ndị nile nọ nꞌụwa ga-esite nꞌomume dị otu a mata na gị onwe gị zitere m.


JỌN 18:15
Saimọn Pita na otu onye ọzọ na-eso ụzọ Jisọs, nke onyeisi nchụaja maara, sooro Jisọs. Ma ha na-eso ya nꞌazụ site nꞌebe dị anya. Ha sokwa Jisọs baa nꞌime obi onyeisi nchụaja ahụ.


JỌN 18:16
Mgbe ha bịarutere nꞌobi onyeisi nchụaja ahụ, Pita guzoro nꞌezi nꞌọnụ ụzọ e si abata nꞌime ya. Onye nke ọzọ na-eso ụzọ Jisọs nke onyeisi nchụaja maara, bịara gwa nwagbọghọ na-eche ọnụ ụzọ ihe banyere Pita. Emesịa, ọ kpọbatara Pita.


JỌN 20:20
O gosiri ha aka ya na ụkwụ ya. Ọṅụ juru ndị na-eso ụzọ ya obi nꞌihi na ha ahụla Onyenwe ha.


JỌN 21:20
Pita chigharịrị hụ onyeozi ahụ naadabere nꞌobi Jisọs ka ọ na-esokwa ha nꞌazụ. Ọ bụ onyeozi ahụ jụrụ Jisọs ajụjụ banyere onye nꞌime ha ga-arara ya nye.


ỌLU OZI 1:20
E dere ya nꞌakwụkwọ Abụ Ọma sị, ‘Ka ebe obibi ya tọgbọrọ nꞌefu. Ka mmadụ ọ bụla hapụ ibi nꞌime ya. Ka onye ọzọ narakwa ọrụ ya.’


ỌLU OZI 1:24
Ha kpere ekpere rịọ Chineke ka o gosi ha onye ha ga-ahọrọ nꞌime mmadụ abụọ ahụ. Otu a ka ha si kpee ekpere ahụ: “Onyenwe anyị, ị maara obi mmadụ nile. Gosi anyị onye ị họpụtara nꞌime mmadụ abụọ ndị a ka ọ bụrụ onyeozi ga-anọchi anya Judas Iskariọt, onye gara ebe o kwesịrị ka ọ gaa.”


ỌLU OZI 2:5
Nꞌoge ahụ, ụfọdụ ndị Juu ji obi ọcha na-efe Chineke nọ na Jerusalem. Ha si na mba dị iche iche bịa Jerusalem.


ỌLU OZI 2:25
“Devidi kwuru okwu a banyere Jisọs, ‘Ana m ahụ Onyenwe anyị ka ọ na-anọgidekwa nꞌihu m. Ọ nọkwa nꞌaka nri m. Obi m agaghị emekwa mkpatụ.


ỌLU OZI 2:26
Nꞌihi nke a ọṅụ jupụtara m obi. Ire m na-agbakwa ama banyere obi ụtọ m. Nꞌihi na amaara m na anụ ahụ m agaghị anọgide na-enweghị olileanya.


ỌLU OZI 2:27
Ị gaghị ahapụ mkpụrụ obi m nꞌala mmụọ. Ị gakwaghị ahapụ anụ ahụ nke onye gị dị nsọ ka o ree ure.


ỌLU OZI 2:31
Ya mere Chineke jiri mee ka Devidi mata ihe ga-eme nꞌoge dị nꞌihu. Devidi hụrụ, kwuokwa okwu banyere mbilite nꞌọnwụ nke Kraịst. Ọ hụrụ na a hapụghị mkpụrụ obi Kraịst nꞌala mmụọ. Ọ hụkwara na anụ ahụ ya erekwaghị ure.


ỌLU OZI 2:46
Ụbọchị nile, ha na-ezukọ nꞌụlọ nsọ ukwu Chineke ikpe ekpere. Ha na-ezukọkwa nꞌụlọ ndị kwere ekwe dị iche iche, mmadụ ole na ole, iri oriri nsọ. Ha jiri ọṅụ na-eri nri ha, site nꞌobi ekele.


ỌLU OZI 4:24
Mgbe ha nụrụ akụkọ a, ha nile jiri otu obi kpọkuo Chineke sị, “Onyenwe anyị, onye kere eluigwe na ụwa, na osimiri, na ihe nile dị nꞌime ha.


ỌLU OZI 4:32
Ndị nile kwere ekwe nwere otu obi. O nweghị onye ọ bụla gụrụ ihe ọ bụla o nwere dị ka nke aka ya. Kama ha mere ka ndị ọzọ keta oke nꞌihe ha nwere.


ỌLU OZI 4:36
Josef, onye a na-akpọkwa Banabas, nke aha ya pụtara Nwa nkasịobi, onye agbụrụ Livayị, na onye obodo Saịpros, rere ala ya. O wetakwara ego o retara nye ndị ozi.


ỌLU OZI 5:3
Ma Pita maara ihe Ananayas mere. Ọ sịrị ya, “Gịnị mere i ji kwenye ka ekwensu na-achị nꞌobi gị ime ka ị ghọgbuo Mmụọ Nsọ? Gịnị mere ekwensu ji mee ka i kwere izo ụfọdụ nꞌime ego i retara?


ỌLU OZI 5:12
Ndị ozi ahụ rụkwara ọrụ ebube na ọrụ ịtụnanya dị ukwuu nꞌetiti ndị mmadụ. Ndị kwere ekwe nile jiri otu obi zukọọ na mpaghara ụlọ nsọ ukwu Chineke a na-akpọ Mgbe ụlọ Solomọn.


ỌLU OZI 5:33
Mgbe ndị nọ na nzukọ ahụ nụrụ ihe ndị a, okwu a bara ha nꞌobi dị ka a ga-asị na e ji mma dụọ ha. Nke a mere ka ha jupụta nꞌọnụ ma. Ha kpebiri igbu ha.


ỌLU OZI 6:3
Nꞌihi nke a ụmụnna anyị, sitenụ nꞌetiti unu họpụta ụmụ nwoke asaa unu tụkwasịrị obi nke ọma. Ha ga-abụ ndị jupụtara na Mmụọ Nsọ, bụrụkwa ndị maara ihe. Anyị ga-enyefe ha ọrụ a nꞌaka.


ỌLU OZI 7:8
“Chineke mere ka ọgbụgba ndụ obibi ugwu dịrị nꞌetiti ya na Eberaham. Ọ bụ nꞌokpuru ọgbụgba ndụ ahụ ka Eberaham mụrụ Aizik. Aizik mụtara Jekọb. Ọ bụkwa ụmụ nke Jekọb mụtara bụ ndị isi ebo iri na abụọ nke Izirel.


ỌLU OZI 7:39
“Ma nna nna anyị ha jụrụ ige ntị! Ha chọrọrị nꞌobi ha ịlaghachi azụ nꞌala Ijipti!


ỌLU OZI 7:43
É,è, obi unu dịrịị nꞌarụsị unu. Unu na-eche ihe banyere Molok na Refan, bụ chi kpakpando. Echiche unu dị na chi ahụ unu kpụrụ. Nꞌihi nke a, aga m esite nꞌala a wezụga unu, burukwa unu gafee obodo Babilọn.’


ỌLU OZI 7:51
“Unu ndị isi ike! Lee ka obi unu si sie ike dị ka nkume. Lee ka ntị unu si kpọchie ịnụkwa eziokwu! Ruo ole mgbe ka unu ga-anọgide na-enupụ isi megide Mmụọ Nsọ? Nna nna unu nupụrụ isi megide ya! Unu onwe unu na-emekwa otu ihe ahụ taa!


ỌLU OZI 8:21
I nweghị oke nꞌọrụ a, nꞌihi na obi gị adịghị ọcha nꞌihu Chineke.


ỌLU OZI 8:23
Nꞌihi na ahụrụ m na ekworo na mmehie jupụtara gị nꞌobi.”


ỌLU OZI 8:37
Filip zara sị ya, “E nwere ike ime gị baptizim ugbu a, ma ọ bụrụ na i jiri obi gị nile kwere.” Ọnozi ahụ sịrị ya, “Ekweere m na Jisọs Kraịst Ọkpara Chineke.”


ỌLU OZI 10:2
Nwoke a ji obi ya nile na-efe Chineke, ya na ezinụlọ ya. Ọ na-enyekwara ụfọdụ ndị Juu mkpa na-akpa aka. Ọ bụkwa mmadụ na-ekpe ekpere.


ỌLU OZI 10:17
Ma o juru Pita anya nke ukwuu ihe ọhụ ahụ pụtara. Ọ malitekwara iche echiche ihe ọ ga-eme banyere ya. Ma mgbe ọ na-atule ihe ndị a nꞌobi ya, lee, ndị ozi ahụ Kọniliọs zipụrụ abịarutela. Ha guzokwa nꞌọnụ ụzọ ụlọ ahụ ebe Pita nọ.


ỌLU OZI 10:33
Ọ bụkwa nꞌihi nke a ka m jiri zite ndị ozi m. Obi tọrọ m ụtọ nke ukwuu na ị bịara. Anyị nile ezukọtaala ugbu a nꞌihu Chineke ịnụrụ ihe Chineke chọrọ ka anyị mata site nꞌọnụ gị. Ọ bụkwa nke a ka anyị nile chọrọ ịnụ ugbu a.”


ỌLU OZI 11:23
Mgbe Banabas bịaruru Antiọk, ihe ọ hụrụ juru ya anya nke ukwuu. Ọ ṅụrịrị ọṅụ nꞌihi ihe ọ hụrụ. Ọ gwara ha okwu nkasịobi, meekwa ka ha mata na o kwesịrị ka ha jidesie okwukwe ha ike na-eleghị anya nꞌazụ.


ỌLU OZI 12:4
tụba ya nꞌụlọ mkpọrọ, O zipụrụ ndị agha iri na isii ka ha chee ya nche. Ihe Herọd bu nꞌobi bụ ka o nyefee Pita nꞌaka ndị Juu, ka ha gbuo ya mgbe mmemme ngabiga gafere.


ỌLU OZI 12:12
Mgbe Pita tụgharịsịrị ihe nile ndị a nꞌobi ya, ọ malitere ịga nꞌụlọ Meri nne Jọn Mak. Ọtụtụ ndị kwere ekwe zukọtara nꞌebe ahụ na-ekpe ekpere banyere Pita.


ỌLU OZI 13:22
Ma Chineke wepụrụ Sọl, họpụta Devidi ka ọ bụrụ eze nꞌọnọdụ ya. Chineke kwuru okwu banyere Devidi sị, ‘Devidi nwa Jeesi bụ nwoke a họpụtara site nꞌọchịchọ obi m. Ọ bụkwa onye na-eme ihe nile m chọrọ ka o mee mgbe nile.’


ỌLU OZI 13:39
Onye ọ bụla tụkwasịrị ya obi ga-enweta mgbaghara mmehie ya nile. A ga-agụkwa onye ahụ nꞌonye ezi omume. Nke a bụ ihe iwu ndị Juu na-apụkwaghị imezuru onye ọ bụla.


ỌLU OZI 13:48
Mgbe ndị mba ọzọ nọ nꞌebe ahụ nụrụ ihe ndị a, obi tọrọ ha ụtọ nke ukwuu. Ha ṅụrịkwara ọṅụ nꞌihi ozi ọma nke Pọl wetaara ha. Ya mere ndị nile a họpụtara inweta ndụ ebighị ebi kweere nꞌaha Onyenwe anyị Jisọs.


ỌLU OZI 13:50
Mgbe ahụ ndị isi Juu ahụ kpalịrị obi ọtụtụ ụmụ nwanyị na-atụ egwu Chineke tinyere ndị isi obodo ahụ. Ha sitere nꞌọgbakọ ọjọọ ndị a megide Pọl na Banabas, chụpụ ha site nꞌobodo ahụ.


ỌLU OZI 14:17
Ma ọ nọkwa na-agba akaebe banyere onwe ya nꞌime ọgbọ nile, site nꞌọrụ ọma ya nile. Ọ na-enye unu mmiri ozuzo, na mkpụrụ nke ala nꞌoge ha. Ọ na-enyekwa unu nri nke na-eme ka obi na-atọ unu ụtọ.”


ỌLU OZI 14:19
Ma mgbe ụbọchị ole na ole gasịrị, ndị Juu ụfọdụ bịara site nꞌAntiọk na Aikoniọm. Ha kwaliri obi igwe mmadụ ahụ ka ha gbuo Pọl. Nꞌihi ya, ha tụrụ Pọl nkume, dọkpụrụ ya gaa nꞌazụ obodo ahụ, hapụ ya nꞌọnọdụ ọdịndụọnwụkamma.


ỌLU OZI 14:22
Nꞌebe ahụ ha gbara ndị kwere ekwe ume ka ha na-eto eto nꞌịhụnanya nꞌebe Chineke na mmadụ ibe ha nọ. Ha kasịkwara ha obi sị ha jidesie eziokwu ahụ ike, na-agụghị nsogbu nile a na-esogbu ha. Ha mekwara ka ndị kwere ekwe mata na ha aghaghị ịba nꞌalaeze Chineke site nꞌime nsogbu dị iche iche.


ỌLU OZI 14:23
Pọl na Banabas họpụtakwara ndị okenye nꞌime nzụkọ Kraịst dị nꞌebe ahụ. Ha sitere nꞌobubu ọnụ na ekpere tinye ha na nlekọta Onyenwe anyị, onye ha tụkwasịrị obi.


ỌLU OZI 15:1
Mgbe Pọl na Banabas nọ nꞌAntiọk e nwere ụfọdụ mmadụ sitere Judia bịa nꞌebe ahụ. Ndị a malitere izi ndị kwere ekwe na ọ dị mkpa ka ha mezuo omenala ndị Juu banyere obibi ugwu tupuu a zọpụta ha.


ỌLU OZI 15:8
Chineke a, onye maara obi mmadụ nile, anabatala ndị mba ọzọ. O gosiri na ọ nabatala ha site nꞌinye ha onyinye Mmụọ Nsọ dị ka anyị si nata ya na mbụ.


ỌLU OZI 15:9
O gosighị na o nwere ihe dị iche nꞌetiti anyị na ha. Nꞌihi na ọ sachara obi ha nile site nꞌokwukwe.


ỌLU OZI 15:24
“E mere ka anyị mata na ụfọdụ ndị kwere ekwe si nꞌetiti anyị ebuterela unu nsogbu na ọgba aghara banyere nzọpụta unu. Ha etinyerela unu obi ịlọ mmiri. Ma nꞌezie, ọ bụghị anyị zitere ha nꞌebe unu nọ.


ỌLU OZI 15:25
Nꞌihi nke a anyị zukọrọ sitekwa nꞌotu obi nwee mkpebi a. Anyị na-ezitekwa mmadụ abụọ ndị a, bụ ndị ha na Pọl na Banabas so, ka ha nọchite anya anyị.


ỌLU OZI 15:33
Judas na Saịlas nọnyeere ha ụbọchị ụfọdụ. Emesịa, ha laghachiri Jerusalem. Ha jikwa obi ụtọ na ekele laghachikwuru ndị ozi.


ỌLU OZI 16:14
Aha otu nꞌime ndị inyom a bụ Lidia. Ọ bụ onye na-azụ ahịa akwa e sijiri odo odo. Amụrụ ya nꞌobodo Tiatira. Ọ bụkwa nwanyị na-asọpụrụ Chineke. Mgbe ọ nọ na-ege ntị nꞌihe Pọl na-ekwu, Chineke meghere obi ya, mee ka ọ nabata okwu nile Pọl kwuru.


ỌLU OZI 16:15
E mere ya na ezinụlọ ya baptizim. Lidia rịọrọ ka anyị bụrụ ọbịa nꞌụlọ ya. Ọ gwara anyị okwu sị, “Ọ bụrụ nꞌezie na unu gụrụ m dị ka onye kwesịrị ntụkwasị obi, biko batanụ nꞌụlọ m.” Mgbe ọ kwagidesịrị anyị ike, anyị sooro ya.


ỌLU OZI 16:22
Mgbe na-adịghị anya, ha kwalitere obi ọtụtụ mmadụ megide Pọl na Saịlas. Ndị ikpe ahụ nyere igwe mmadụ ahụ ike ịdọkasị uwe Pọl na Saịlas, na itikwa ha ihe.


ỌLU OZI 17:5
Ma ndị isi Juu jupụtara nꞌekworo, nꞌihi ọrụ ndị a. Ha kwalitere obi ụfọdụ mmadụ efu nꞌetiti ha. Ndị a malitekwara ọgba aghara nꞌụzọ dị iche iche. Ha tikasịrị ụlọ Jesin, nꞌihi na ha chọrọ ịdọkpụta Pọl na Sailas, inyefe ha nꞌaka ụlọ ikpe obodo ahụ, ka e nye ha ntaramahụhụ.


ỌLU OZI 17:8
Okwu dị otu a wetara obi ịlọ mmiri nꞌetiti ndị ikpe na mmadụ nile.


ỌLU OZI 17:11
Ma ndị bi na Beria jiri obi ghere oghe nabata okwu Chineke karịa ndị bi na Tesalonaịka. Mgbe ha gere ntị nꞌokwu Chineke, ha jiri ọṅụ nyochaa akwụkwọ nsọ ịchọpụta ma ozizi Pọl na Sailas na-ezi ọ bụ eziokwu. Ha mere nke a ụbọchị nile.


ỌLU OZI 17:22
Nꞌihi nke a Pọl guzoro nꞌelu ugwu ahụ gwa ha okwu sị, “Unu ndị nile bi nꞌAtens. Amatara m na ọ na-anụ unu ọkụ nꞌobi ịsọpụrụ mmụọ nke unu na-efe ofufe.


ỌLU OZI 18:14
Ma mgbe Pọl chọrọ ịkọwa onwe ya nꞌihu Galio, Galio chigharịrị ihu ya lee ndị ahụ na-ebo Pọl ebubo ụgha anya sị ha, “Ndị Juu, geenụ m ntị. Ọ bụrụ na nke a bụ okwu megidere iwu ndị Rom, obi ga-atọ m ụtọ ige unu ntị.


ỌLU OZI 18:25
Nwoke a natara ozizi banyere Ụzọ Onyenwe anyị. O sitekwara nꞌịnụ ọkụ nke obi kuzie nnọọ ihe ziri ezi banyere Jisọs. Ma ihe ọ maara bụ nanị ihe gbasara baptizim Jọn mere.


ỌLU OZI 18:27
Ihe Apọlọs na-ezube nꞌuche ya bụ ijeru obodo Griis. Ụmụnna anyị kasịrị ya obi. Ha degaara ụmụnna nọ nꞌebe ahụ akwụkwọ ka ha lekọtaa Apọlọs anya nke ọma. Mgbe ọ bịaruru Griis, Onyenwe anyị jiri ya rụọ ọrụ dị ukwuu. E sitekwara nꞌaka ya gbaa ụmụ Chineke ume nꞌime nzukọ Kraịst nile dị nꞌobodo ahụ.


ỌLU OZI 19:36
Ebe nke a bụ ihe a maara amara, unu ekwesịghị isogbu onwe unu, ọ bụladị ma mmadụ kwuo okwu megide ya. Unu emela ihe ọ bụla nꞌobi ilu.


ỌLU OZI 20:10
Pọl mere ngwangwa rituo nꞌala selite Yutikọs elu jikụọ ya. Ọ gwara ndị gbakọrọ nꞌebe ahụ sị, “Ka obi hapụ ịlọ unu mmiri ọ dị ndụ.” Nꞌezie, Yutikọs dịkwara ndụ.


ỌLU OZI 20:12
Nwokorọbịa ahụ ha kulitere na ndụ mere ka ọṅụ jupụta ha nꞌobi. Ọ gbakwara ha ume nke ukwuu.


ỌLU OZI 20:19
arụrụ m ọrụ Onyenwe anyị site nꞌobi umeala na anya mmiri. Anatakwara m ntaramahụhụ dị ukwuu site nꞌizu ọjọọ ndị Juu nwere maka ịnapụ m ndụ m.


ỌLU OZI 21:13
Ma Pọl jụru ha ajụjụ sị, “Gịnị mere unu ji na-akwa akwa? Unu na-eme ka obi gbawaa m! Nꞌihi na ọ bụghị nanị na m jikeere ịghọ onye mkpọrọ na Jerusalem, kama ejikeere m iwere ndụ m nye nꞌihi Jisọs.”


ỌLU OZI 21:14
Mgbe mmadụ nile hụrụ na o kpebiela nꞌobi ya ịga Jerusalem, anyị kwụsịrị igbochi ya. Kama anyị nile sịrị, “Ka e mee uche Onyenwe anyị.”


ỌLU OZI 21:17
Ndị nile kwere ekwe bi na Jerusalem jikwa obi ụtọ nabata anyị.


ỌLU OZI 22:3
“Abụ m onye Juu. Amụrụ m na Tasọs nꞌime Silisia. Azụrụ m na Jerusalem nꞌebe a nꞌụkwụ Gamaliel onye nkụzi m. Amụtara m nꞌaka ya usoro ịgbaso iwu anyị dị ka ndị Juu na ịsọpụrụ omenala anyị nꞌụzọ doro anya. Ọ na-anụ m ọkụ nꞌobi dị ka ọ na-anụkwa unu onwe unu taa.


ỌLU OZI 22:24
Ọchịagha ahụ kpọbatara Pọl nꞌụlọ nye iwu ka a pịa ya ụtarị, ka eziokwu pụta ya nꞌọnụ. Ọ chọrọ ịmata ihe mere igwe mmadụ a ji nwee obi ụfụ nꞌebe ọ nọ.


ỌLU OZI 23:35
Emesịa Feliks gwara Pọl okwu sị, “Aga m enye okwu gị ezi ohere mgbe ndị na-ebo gị ebubo bịara.” Feliks nyekwara iwu ka e tinye Pọl nꞌụlọ mkpọrọ dị nꞌobi eze Herọd.


ỌLU OZI 24:10
Emesịa, Feliks feere Pọl aka ka o bilie kwuo okwu. Pọl siri otu a bido. “Amaara m nna anyị, na ị bụrụla onye ọkaikpe nꞌihe gbasara ndị Juu site nꞌogologo afọ ndị a gara aga. Nke a na-enye m ntụkwasị obi mgbe m na-asa ọnụ m.


ỌLU OZI 24:16
Nꞌihi nke a ka m ji na-agbalị mgbe nile ibi obi dị ọcha nꞌihu Chineke na mmadụ.


ỌLU OZI 26:4
“Dị ka ndị Juu maara nke ọma, esitere m na nwanta nwee ọzụzụ nke ibi obi ndị Juu nꞌobodo anyị bụ Tasọs, emesịakwa, na Jerusalem. Ebikwara m obi dị ka onye Juu.


ỌLU OZI 26:5
Ọ bụrụ na eziokwu dị ha nꞌọnụ ha maara na dị ka iwu na omenala ndị Juu siri dị, abụ m onye idebe iwu nile na omenala nile nꞌusoro ndị Farisii na-anụkarị ọkụ nꞌobi karịa ndị ibe m nile.


ỌLU OZI 26:14
Anyị nile dara nꞌala. Ma anụrụ m olu na-agwa m okwu nꞌasụsụ Hiburu sị, ‘Sọl! Sọl! Gịnị mere i ji na-esogbu m? Ị na-enye mkpụrụ obi gị nsogbu!’


ỌLU OZI 27:3
Nꞌechi ya, anyị rutere Saidọn. Juliọs nwere obi ọma nꞌebe Pọl nọ. Ọ ha-pụkwara ya ka o jegharịara onwe ya izute ndị enyi ya. Ndị a lekwara anyị ezi ọbịa.


ỌLU OZI 27:9
Ebe a ka anyị nọrọ ọtụtụ ụbọchị. Ma ihu eluigwe adịghị mma inye mmadụ nkasịobi ịnyalị ụgbọ ije ebe dị anya nꞌihi na ugbu a oge ịchụ aja ngabiga agafeela. Pọl gwara ndị isi ụgbọ ahụ okwu sị,


ỌLU OZI 27:22
Ma otu ọ dị, ana m arịọ unu, nweenụ obi ike! Nꞌihi na o nweghị onye ọ bụla nꞌime anyị a ga-achọ achọ. Ọ bụ ezie na ụgbọ a ga-emikpu.


ỌLU OZI 27:25
Ya mere, nweenụ obi ike! Nꞌihi na enwere m ntụkwasị obi na Chineke ga-eme ihe o kwuru.


ỌLU OZI 27:29
Ha matara nꞌoge a na ebili mmiri ahụ ga-eburu anyị gaa nꞌọnụ mmiri. Ma egwu juru ha obi nꞌihi na ha amaghị ma ha ga-ezute nkume nꞌakụkụ ọnụ mmiri ahụ. Ha tụpụtara ụdọ igwe anọ e ji ejide ụgbọ ma na-arịọ chi ha maka chi ọbụbọ.


ỌLU OZI 27:36
Otu mgbe ahụ, obi ụtọ batara mmadụ nile nꞌobi, ha bidokwara iri nri.


ỌLU OZI 28:6
Mmadụ ndị a na-ele anya ma aka Pọl ga-aza, ma ọ bụ na Pọl ga-ada nwụọ. Ma mgbe ha chegidere hụ na ihe abụọ ndị a emeghị, ha gbanwere obi ha banyere ihe ha na-eche. Ha bidoro iche na Pọl bụ chi.


ỌLU OZI 28:15
Ụmụmma anyị nọ na Rom nụrụ na anyị na-abịa. Ha pụtara chere anyị nꞌebe a na-akpọ Forum, nꞌahịa dị nꞌụzọ Apịa. Ndị ọzọ zutere anyị nꞌebe ọzọ a na-akpọ Ụlọ ndị ije. Mgbe Pọl hụrụ ha o kelere Chineke ma nweekwa obi ike.


ỌLU OZI 28:24
Ụfọdụ kweere, ma ụfọdụ mechiri ntị ha na obi ha.


ỌLU OZI 28:25
Ma mgbe ha tụlechara okwu ndị a nꞌobi ha, ha hapụrụ Pọl laa, ma ha bukwa okwu a Pọl kwuru nꞌobi:


ỌLU OZI 28:27
Nꞌihi na obi unu mara abụba, ntị unu adịkwaghị anụ ihe. Unu mechikwara anya unu nꞌebe nghọta dị. Nꞌihi na unu achọghị ịhụ, unu achọghị ịnụ, unu achọkwaghị ịghọta ma lọghachikwute m ka m gwọ unu.’ ”


ỌLU OZI 28:30
Pọl biri obi nke onwe ya afọ abụọ nꞌụlọ ọ na-akwụ ụgwọ ya. Ọ nabatakwara ndị nile bịara ileta ya,


ROM 1:17
Ọ bụ ozi ọma nke naakọrọ anyị na Chineke edoziela ụzọ anyị ga-esi dị ọcha nꞌihu ya site nꞌokwukwe na ntụkwasị obi anyị nwere na Kraịst. Ozi ọma a na-agwakwa anyị na anyị pụrụ inweta ihe ndị a nile nanị site nꞌokwukwe. Nꞌihi na e deela ya rị nꞌakwụkwọ nsọ sị, “Ọ bụ nanị site nꞌokwukwe ka onye ezi omume ga-esi dị ndụ.”


ROM 1:21
Ọ bụ eziokwu na ha maara na Chineke dị, ma na ndụ ha, ha adịghị ezipụta na ha maara na Chineke dị. Ha anaghị asọpụrụ ya, ha anakwaghị enye Chineke ekele nꞌihi nchebe ọ na-echebe ha. Nanị ihe ha na-eche nꞌobi ha bụ ihe nzuzu, ịtụpụta nꞌuche ha ihe ha chere na Chineke yiri, na ihe ha chere na ọ chọrọ ka ha mee. Ọ bụkwa ụdị echiche dị otu a mere ka obi ha gbaa ọchịchịrị.


ROM 1:24
Nꞌihi na ha gosiri onwe ha dị ka ndị nzuzu, Chineke gbaketara ha azụ, hapụ ha ka ha mee ihe ọjọọ ndị ahụ na-agụ obi ha agụụ, bụ ịhe ọjọọ ndị ahụ ha ji merụọ anụ ahụ ha.


ROM 1:26
Ọ bụ nke a mere Chineke ji hapụ ha ka ha na-eme ihe ọjọọ ndị ahụ na-agụ obi ha agụụ ime. Nꞌihi ya, ọ bụladị ndị inyom na ndị inyom ibe ha nọgidere na-enwe mmekọrịta nꞌụzọ na-ezighị ezi nye ha.


ROM 1:28
Ya mere, ebe ha kpachapụrụ anya jụ ịmata onye Chineke bụ, Chine nyere ha akọnuche ndị nzuzu, nke mere ka ha na-eme ihe ọjọọ nile nke ajọ echiche obi ha chepụtara.


ROM 1:29
Ha jupụtara nꞌajọ omume na mmehie nile, anya ukwu, ekworo, obi ọjọọ, igbu mmadụ, esemokwu, aghụghọ, uche ọjọọ, na ntakwu.


ROM 1:31
Nꞌezie ewu tara akọnuche ha. Ha adịghị emezu nkwa ọ bụla ha kwere. Ihe mmadụ ibe ha adịkwaghị atọ ha ụtọ. Ebe ha bụ ndị kwara obi nꞌazụ ha enweghị obi ebere nꞌebe mmadụ ibe ha nọ.


ROM 2:4
Ka ị na-eleda obi ebere Chineke, na nnagide ọ na-anagide ndụ ọjọọ gị, na ogologo ntachi obi ya anya? Ị maghị na obi ebere o nwere nꞌebe ị nọ kwesịrị ime ka i site na mmehie gị chegharịa?


ROM 2:5
Ma ọ naghị emetụ gị nꞌobi ikwere na Chineke, nꞌihi mkpọchị nke obi gị kpọchịrị! Ma ihe ị na-eme bụ nanị ijikere onwe gị nye ụbọchị ahụ Chineke ga-esite nꞌiwe ya kpee gị ikpe dị egwu. Mgbe Chineke ga-ekpughe na ọ bụ onye na-ekpe ikpe ziri ezi.


ROM 2:7
Chineke gaenye ndị nile sitere na ntachi obi na ezi ọrụ na-achọ otuto na nsọpụrụ na ndụ ahụ na-adịgide adịgide ndụ ebighị ebi.


ROM 2:14
Nꞌezie, mgbe ndị mba ọzọ na-enweghị iwu sitere nꞌobi ha mee ihe iwu kwuru, o gosiri na ha bụ inwu nye onwe ha, ọ bụ ezie na ha enweghị iwu ahụ e dere ede.


ROM 2:15
Nꞌihi na ndụ ha na-egosipụta na e deela ihe ndị ahụ iwu kwuru nꞌobi ha. Akọnuche ha na-egosikwa na nke a bụ eziokwu, ebe ọ bụ na akọnuche ha na-ama ha ikpe mgbe ufọdụ, ma na-etokwa ya mgbe ụfọdụ.


ROM 2:17
Leenụ! gị onye na-akpọ onwe gị onye Juu, onye tụkwasịrị obi gị nꞌiwu ahụ Chineke nyere gị, onye na-anyakwa isi na ị maara Chineke.


ROM 2:29
É, è, onye bụ onye Juu nꞌezie bụ onye ahụ bụ onye Juu nꞌime mmụọ ya, onye e biri obi ya ugwu. Obibi ugwu a bụkwa ọrụ Mmụọ Chineke ọ bụghị ọrụ nke iwu e dere ede na-arụ. Otuto onye dị otu a na-enweta na-esitekwa nꞌebe Chineke nọ bịa, ọ bụghị site nꞌaka mmadụ.


ROM 3:3
Ọ bụ ezie na ụfọdụ ndị Juu ekwesịghị ntụkwasị obi, ma ekwesịghị ntụkwasị obi ha ọ̀ pụrụ ime ka Chineke ghara imezu nkwa o kwere ndị ahụ hụrụ ya nꞌanya?


ROM 3:25
Nꞌihi na Chineke zitere Kraịst ka ọ bụrụ aja a chụrụ nꞌihi ikpuchi mmehie anyị, ka ọbara Kraịst na okwukwe anyị nwere nꞌime ya bụrụ ihe ịjụrụ obi nye ya maka mgbaghara mmehie. Chineke sitere nꞌụzọ a mee ka ọ pụta ìhè na ya bụ onye na-ekpe ikpe ziri ezi, ebe o sitere na ntachi obi ya hapụ ịta ndị ahụ mehiere megide ya nꞌoge mgbe ochie ahụhụ.


ROM 4:5
Ma mmadụ ahụ na-arụghị ọrụ ọ bụla, nke tụkwasịrị Chineke ahụ na-agụ ndị ajọ omume dị ka ndị na-enweghị mmehie obi, ka a na-agụrụ okwukwe ahụ o nwere dị ka ezi omume.


ROM 4:11
Chineke ekwechaala nkwa na ya ga-agọzi Eberaham tupuu e bie ya ugwu. Obibi ugwu ya bụ nanị ihe ngosi na Chineke anabatala ya, gụọ ya nonye ezi omume nihi okwukwe ya nime Chineke. Ọ bụ nke a mere Eberaham ji bụrụ nna ndị nile kweere na Chineke, ndị ahụ ọ gụrụ dị ka ndị ezi omume, ọ bụ ezie na ha bụ ndị a na-ebighị ugwu.


ROM 4:12
Nụzọ di otu a kwa Eberaham bụ nna ndị nile e biri ugwu. Ndụ ya na-egosikwa ha na ọ bụghị obibi ugwu ha na-azọpụta ha, kama ọ bụ okwukwe ha. Nihi na Chineke nabatara Eberaham nanị site nokwukwe o nwere tupuu e bie ya ugwu.


ROM 4:18
Eberaham kweere okwu Chineke mgbe ihe ọ bụla na-adịghị nke ọ pụrụ iji tụkwasị Chineke obi. O sitere nụzọ dị otu a bụrụ nna nke ọtụtụ mba, dị ka Chineke gwara ya na ụmụ ụmụ ya gaamụba.


ROM 4:20
Ọ dịghị mgbe ọ bụla o nwere obi abụọ na Chineke agaghị emezu ihe nile o kwere ya na nkwa. Okwukwe o nwere na Chineke siri nnọọ ike mee ka Eberaham bido ito Chineke nihi mmezu nkwa o kwere ya, tupuu Chineke emeere ya ihe ahụ.


ROM 4:21
O nwere otu obi na Chineke pụrụ imezu ihe nile ọ bụla o kwere ya na nkwa.


ROM 5:3
Ọ bụkwaghị nanị nke a, ma anyị na-aṅụrịkwa ọṅụ nꞌime nsogbu anyị nile, ebe anyị maara na nsogbu ndị a na-enyere anyị aka ịbụ ndị nwere ntachi obi.


ROM 5:4
Ntachi obi na-arụpụta nꞌime anyị mmụọ nke iguzosi ike, nke na-enyere anyị aka ịtụkwasị Chineke obi nꞌọnọdụ ntachi obi ọ bụla, tutuu ruo mgbe olileanya anyị na okwukwe anyị guzosiri ike.


ROM 5:5
Mgbe ahụ, nꞌọnọdụ ọ bụla, anyị pụrụ ịbụ ndị guzo chịm, na-atụghị egwu, nꞌihi na anyị maara na Chineke hụrụ anyị nꞌanya, na o gosikwara ịhụnanya ya mgbe o nyere Ọkpara ya, onye sitere na Mmụọ Nsọ mejupụta obi anyị nꞌịhụnanya Chineke.


ROM 5:6
Leenụ nụ ka obi ebere Chineke siri dị ukwuu. Mgbe ahụ anyị na-enweghị ike ọ bụla, mgbe oge ahụ ruru nnọọ, Jisọs bịara nwụọ ọnwụ nꞌihi anyị ndị mmehie.


ROM 5:15
Leekwa ihe dị iche nꞌetiti mmehie mmadụ mere na mgbaghara mmehie Chineke! Nꞌihi na ọ bụ site na mmehie otu onye ka ọnwụ ji zuo ọha ọnụ. Ugbu a ọ bụkwa site nꞌaka otu onye, Jisọs Kraịst, ka mgbaghara mmehie ji rute mmadụ nile aka site nꞌobi ebere Chineke.


ROM 5:21
Na mbụ ọ bụ mmehie na-achị ụwa. Ọ bụkwa mmehie wetara ọnwụ. Ma ugbu a, obi ebere Chineke na-achị ụwa, obi ebere ya nke kpọbatara anyị nꞌihu ya, ebe anyị guzo ugbu a, obi ebere Chineke, nke ga-eduba anyị na ndụ ebighị ebi site na Jisọs Kraịst Onyenwe anyị.


ROM 7:22
Ihe na-agụ obi m agụụ mgbe nile bụ nanị ime ihe Chineke na-achọ.


ROM 7:23
Ma ana m ahụ na ọ dị akụkụ ahụ m nke na-alụso echiche obi m ọgụ, na-emerikwa ya, si otu a mee m ka m bụrụ ohu mmehie. Nꞌime obi m ọ na-agụ m agụụ ịbụ ezi ohu Chineke, ma ihe m chọpụtara bụ na abụ m mmadụ mmehie na-achị. Leenụ ka o si dị: ndụ ọhụrụ dị nꞌime m na-achọ ime ihe ziri ezi, ma ndụ ochie ahụ bi nꞌime m hụrụ mmehie nꞌanya.


ROM 8:6
Mkpụrụ obi ọ bụla na-agbaso ọchịchọ nke ọdịdị ochie ya ga-anwụ. Ma mkpụrụ obi na-agbaso Mmụọ Nsọ Chineke ga-ebi ndụ nꞌudo.


ROM 8:23
Ọ bụghị nanị nke a, ma anyị onwe anyị bụ ndị Kraịst, ndị nwere Mmụọ Chineke, nọkwa na-asụ ude nꞌime obi anyị, na-eche ọbịbịa nke ụbọchị ahụ, mgbe a ga-ewezugara anyị ihe mgbu na ọrịa nile. Anyị nọkwa na-ele anya ọbịbịa nke ụbọchị ahụ mgbe Chineke ga-enye anyị ihe nile kwesịrị anyị dị ka ụmụ Chineke, ya na ahụ ọhụrụ ahụ o kwere anyị na nkwa, ahụ nke na-agaghị arịakwa ọrịa ọzọ, nke na-agaghị anwụkwa ọzọ.


ROM 8:24
A zọpụtara anyị site na ntụkwasị obi anyị nwere na Chineke. Ịtụkwasị mmadụ obi bụ inwe olileanya na anyị ga-esi nꞌaka ya nata ihe anyị na-enweghị ugbu a. Nꞌihi na ọ baghị uru mmadụ inwe olileanya nꞌihe o ji anya ya na-ahụ ugbu a.


ROM 8:27
Chineke Nna anyị, onye na-enyocha obi mmadụ nile makwaara ihe Mmụọ Nsọ ahụ na-eche, mgbe ọ na-arịọ arịrịọ ahụ nꞌusoro, dị ka Chineke si chọọ.


ROM 9:2
Ihe banyere ọnọdụ ụmụnna m ndị Juu na-ewute m nnọọ nke ukwu. Ana m anọ nꞌobi ọjọọ ehihie na abalị nꞌihi ha.


ROM 9:22
Nꞌụzọ dị otu a, Chineke emeghị ihe ọjọọ ma ọ bụrụ na o kpebiri igosi ike ya na iwe ya site nꞌịla ndị ahụ na-eme ihe ọjọọ nꞌiyi, ebe ha na-adịghị eche uche banyere ndidi na ntachi obi Chineke ji anagide ajọ omume ha.


ROM 9:29
Nꞌebe ọzọ kwa, nꞌakwụkwọ nsọ, Aịzaya onye amụma kwuru sị, “Ọ bụrụ na Chineke abụghị onye obi ọma, ndị Juu nile gaara ala nꞌiyi dị ka e si laa ndị nile bi nꞌobodo Sodọm na Gomora nꞌiyi.”


ROM 9:30
Gịnị ka anyị nwere ikwu banyere ihe ndị a? Anyị ga-asị na Chineke enyela ndị mba ọzọ na-enweghị oge ọ bụla ha ji obi ha chọọ Chineke, ohere ịbụ ndị a ga-anabata site nꞌokwukwe,


ROM 9:33
Nꞌihi na Chineke dọrọ ha aka na ntị sị, “Lee, ana m atọgbọ na Zayọn oke nkume ga-eme ka ụmụ mmadụ sụọ ngọngọ. Ọtụtụ mmadụ ka nkume a ga-eme ka ha daa (oke nkume a bụ Jisọs Kraịst). Ma onye ọ bụla tụkwasịrị ya obi, ihere agaghị eme ya.”


ROM 10:1
Ụmụnna m, ọ na-agụ nnọọ obi m agụụ nke ukwuu ịhụ na a zọpụtara ndị Juu. Nke a mere m ji ekpe ekpere banyere ha mgbe nile.


ROM 10:2
Ana m agba akaebe na ihe banyere Chineke na-anụ ha ọkụ nꞌobi nke ukwuu. Kama ihe na-ewute m bụ na ịnụ ọkụ nꞌobi ha abụghị site na mmazu Chineke.


ROM 10:4
Ha amaghị na Kraịst naenye ndị nile tụkwasịrị ya obi ihe nile ha chọrọ inweta site nꞌidebe iwu. Nꞌihi na ọbịbịa Kraịst mere ka ọgwụgwụ idebe iwu bụrụ ihe dị ire.


ROM 10:8
Kama nzọpụta ahụ, nke okwukwe nꞌime Kraịst na-eweta na-agwa anyị sị, “Ozi ọma nzọpụta ahụ dị onye ọ bụla nso. Nꞌezie ozi ọma ahụ anyị na-ekwusa ihe gbasara ya dị gị nꞌọnụ, dịkwa nꞌime obi gị.


ROM 10:9
Ọ na-ekwu sị, ọ bụrụ na ị ga-eji ọnụ gị kwupụta mmehie gị, ọ bụrụkwa na ị ga-ekwere nꞌobi gị na Chineke mere ka Jisọs Kraịst si nꞌọnwụ bile, a ga-azọpụta gị.


ROM 10:10
Nꞌihi na ọ bụ nanị mgbe i kweere nꞌobi gị, na mgbe i ji ọnụ gị kwupụta mmehie gị, ka a ga-azọpụta gị.”


ROM 11:5
Otu a ka ọ dịkwa. Chineke ahọrọla mmadụ ole na ole zọpụta ha nꞌihi obi ebere ya.


ROM 11:6
Ọ bụrụ na a zọpụtara ha site nꞌobi ebere Chineke mgbe ahụ nzọpụta abụghị site nꞌọrụ ọma ha rụrụ. Nꞌihi na ọ bụrụ na a zọpụtara ha site nꞌọrụ ọma ha amara Chineke agaghị abụkwa onyinye a na-anata nꞌefu.


ROM 11:7
Ya mere, nke a bụ ọnọdụ ihe nile. Ndị Juu ji ike ha nile na-achọ Chineke, ma ha enweghị ike ịchọta ya. Ụfọdụ nꞌime ha achọtala ya, ndị ahụ Chineke nꞌonwe ya họpụtara nꞌetiti ha site na mmalite. Ma Chineke emeela ka obi ndị ọzọ gbaa itiri.


ROM 11:22
Lee otu Chineke si bụrụ onye na-eme ebere na onye na-adịghị eme ebere. Ọ bụ nanị ndị na-adịghị erubere ya isi ka ọ na-emesi ike, ma ọ na-enwe obi ebere nꞌebe ndị ahụ na-anọgịde nꞌime obi ebere ya. Ọ bụrụ na unu anọgideghị nꞌobi ebere ya, ọ ga-anyakapụkwa unu.


ROM 11:32
Nꞌihi na Chineke enyefeela onye ọ bụla nꞌaka mmehie, ka o si otu a gosi mmadụ nile obi ebere ya.


ROM 12:1
Ya mere ụmụnna m, ana m agbakwasị ụkwụ nꞌobi ebere Chineke gosiri unu na-arịọ unu arịrịọ na-asị unu, cheenụ onwe unu nꞌihu Chineke dị ka aja dị ndụ, nke ndị nsọ, na nke na-atọ ya ụtọ. Nꞌihi na nke a bụ ofufe nke ime mmụọ ọ chọrọ site nꞌaka unu.


ROM 12:2
Kwụsịnụ ibi ndụ nꞌụzọ na-atọ ụwa ụtọ, kama kwerenụ ka Chineke nwoghaa unu nꞌime mmụọ unu site nꞌịgbanwe obi unu. Mgbe ahụ unu ga-enwe ike ịmata ihe bụ uche Chineke, matakwa ihe dị mma, na ihe na-atọ ya ụtọ, na ihe zukwara oke.


ROM 12:3
Dị ka onyinye amara Chineke nyere m si dị, ana m adọ onye ọ bụla nꞌime unu aka na ntị sị, Unu atụkwasịla uche nꞌechiche banyere onwe unu karịa ka o si kwesị. Kama jirinụ obi dị umeala lee onwe unu anya dị ka okwukwe Chineke nyere unu ha.


ROM 12:7
Ọ bụrụ na onyinye Chineke nyere gị bụ ijere ndị ọzọ ozi, mee ya, mezie ya emezie. Ọ bụrụkwa na onyinye nke gị bụ izi ihe, were obi dị umeala zie ha.


ROM 12:8
Onyinye gị bụrụ ịgba ndị mmadụ ume site nꞌikwusa okwu Chineke, biko mee ya nꞌụzọ ndị ọzọ gaesi nata inyeaka. Ọ bụrụkwanụ na onyinye gị bụ inye ndị nọ na mkpa ụfọdụ nꞌime ihe i nwere, gbasapụ aka nye ha. Ọ bụrụ na i nwere onyinye ịbụ onyendu, kpachapụ anya duzie ndị i na-edu. Ka ndị Chineke nwere onyinye inwe obi ebere nꞌebe ndị mmadụ nọ, jiri obi ọcha zipụta onyinye ha.


ROM 12:9
Egosila ndị mmadụ na ị hụrụ ha nꞌanya mgbe ị maara nꞌobi gị na ị hụghị ha nꞌanya. Ka ịhụnanya bụrụ ihe si gị nꞌobi pụta. Kpọọ ihe ọjọọ nile asị, guzosie ike ime ihe nile dị mma.


ROM 12:11
Abụla onye umengwụ nꞌọrụ gị. Kama were obi na-anụ ọkụ na-ejere Chineke ozi mgbe nile.


ROM 12:12
Nweenụ obi aṅụrị nꞌihi ihe nile Chineke na-akwado imere unu. Nweenụ ntachi obi nꞌime nsogbu, na-ekpesikwanụ ekpere ike.


ROM 13:4
Onye nọ nꞌọchịchị bụ onyeozi Chineke. Ọ na-arụ ọrụ ya ịhụ maka ọdịmma gị. Ọ bụrụ na i mee ihe ọjọọ, o kwesịrị ka ụjọ ju gị obi na ọ ga-ata gị ahụhụ. Nꞌihi na Chineke ziri ya ka ọ taa ndị na-eme ihe ọjọọ ahụhụ.


ROM 13:9
Nꞌihi na ọ bụrụ na ị hụ onye agbata obi gị nꞌanya dị ka i si hụ onwe gị nꞌanya, ị gaghị achọ igbu ya, i gaghị ezuru ihe o nwere, ị gaghị enwe anya ukwu nꞌebe ihe o nwere dị, ị gakwaghị eduru nwụnye ya ka gị na ya dinakọọ. Nꞌezie, ị pụrụ imezu ihe iwu nile kwuru ma ọ bụrụ na ị hụ onye agbata obi gị nꞌanya dị ka ị hụrụ onwe gị.


ROM 14:3
Onye ahụ kpebiri nꞌobi ya iri ihe nile ekwesịghị ileda onye jụrụ iri ya anya. Otu a kwa, onye ahụ kpebiri na ya agaghị eri ihe nile ekwesịghị ịma onye na-eri ihe ndị a ikpe. Nꞌihi na Chineke anabatala onye ahụ.


ROM 14:6
Ọ bụrụ na o nwere ụbọchị dị iche ị họpụtara dị ka ụbọchị dị nsọ karịa ibe ya, gaa nꞌihu mee ihe ị na-eme nꞌihi na ọ bụ otuto ka ị naenye Chineke. Ọ bụrụkwa na i kpebie nꞌobi gị ịta anụ ọ bụla e ji chụọra arụsị aja, gaa nꞌihu nꞌihe ị na-eme, ọ bụ ihe ziri ezi ka ị na-eme, ebe i nyere Chineke ekele nꞌihi anụ ahụ. Ọ bụrụkwa na ị jụ iso taa ụdị anụ ahụ, i mere nke ọma, nꞌihi na echiche obi gị bụ ime ihe ga-atọ Chineke ụtọ.


ROM 14:13
Ya mere kwụsị ikwujọ nwanna gị, kwụsị ikpe ya ikpe. Kama gbalịa hụ na i biri ndụ gị nꞌụzọ ga-eme ka nwanna gị hapụ ịsụ ngọngọ, mgbe ọ na-ahụ gị ka ị na-eme ihe ahụ o chere nꞌobi ya na ọ bụ mmehie.


ROM 14:18
Nꞌihi na ọ bụrụ na i nye Kraịst ohere ka ọ bụrụ onye ga-ekpebi ụdị omume ị ga-eme, obi ga-atọ Chineke ụtọ, ndị mmadụ ga-ahụkwa ya nꞌime gị.


ROM 14:21
Nꞌezie, ọ ga-aka mma ịhapụ iri ihe nile ga-eme ka nwanna anyị nwee obi ọjọọ, ma ọ bụ daba nꞌime mmehie.


ROM 15:2
Ka onye ọ bụla nꞌime anyị na-eme ihe ga-atọ onye agbata obi ya ụtọ. Ka anyị na-eme ihe ga-enyere ha aka, na ihe ga-ewuli okwukwe ha elu nꞌime Onyenwe anyị.


ROM 15:4
Ihe ndị a nile e dere nꞌakwụkwọ nsọ nꞌoge gara aga bụ maka izi anyị ntachi obi, na ịgba anyị ume. Ka anyị site na ha na-ele anya ọbịbịa nke ụbọchị ahụ Chineke ga-ala ike mmehie na ọnwụ nꞌiyi.


ROM 15:5
Ka Chineke, onye na-enye ntachi obi, onye na-agbakwa ndị na-ada mba ume, nye unu mmụọ nke ịdị nꞌotu, ka unu nwee ike ibi nꞌudo, ka unu nweekwa ike mesoo ibe unu ụdị mmeso ahụ Kraịst mesoro anyị.


ROM 15:6
Nꞌihi na nke a ga-eme ka unu nile jikọtaa obi unu, na olu unu nꞌotu, inye Chineke nna Onyenwe anyị Jisọs Kraịst otuto.


ROM 15:9
Chetakwa na ọ bịara ime ka ndị mba ọzọ bụrụ ndị Chineke ga-anabata, ndị ga-eto Chineke nꞌihi obi ebere ya o gosiri ha. Nke a bụ ihe onye dere akwụkwọ Abụ Ọma bu nꞌobi mgbe o dere sị, “Aga m eto aha gị nꞌetiti ndị mba ọzọ. Aga m abụ abụ otuto nye aha gị.”


ROM 15:13
Ya mere, ekpere m na-ekpe bụ ka Chineke onye na-enye anyị olileanya, were ọṅụ na udo na-adịgide mejupụta unu, mgbe unu na-atụkwasị ya obi, site nꞌike Mmụọ Nsọ ahụ bi nꞌime unu.


ROM 15:27
Ha ji ọṅụ nye onyinye ndị a nꞌihi na o metụrụ ha nꞌobi na o kwesịrị ka ha nyere nzukọ Kraịst dị na Jerusalem aka. Nꞌihi na ọ bụrụ na ọ bụ site nꞌaka ndị Juu ka ha si nata ngọzi nile nke Mmụọ Nsọ, ha ji ụgwọ isite nꞌakụ na ụba ha nwere nyere ndị Juu aka na mkpa ha.


ROM 15:31
Biko, rịọnụ Chineke ka ọ zọpụta m nꞌaka ndị na-amaghị ya nọ na Jerusalem. Kpeekwanụ ekpere ka Chineke mee ka ndị Kraịst ahụ anyị na-ewegara onyinye a jiri obi ọma nata ya.


ROM 16:5
Biko kelekwaranụ m ndị nile naezukọ nꞌụlọ ha. Keleerenụ m ezi enyị m Epinetus. Nwoke a bụ onye bu ụzọ nabata Kraịst nꞌobi ya, nꞌakụkụ Esia nile.


ROM 16:18
Ndị ozizi dị otu a abụghị ndị ozi Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. Ha na-arụ nanị nꞌihi akpa ha. Ha maara otu e si eji ire ụtọ edufu ndị obi ha na-esighị ike.


ROM 16:19
Obi dị m ụtọ nꞌihi na mmadụ nile maara na unu bụ ndị guzosiri ike nꞌeziokwu, bụrụkwa ndị kwesịrị ntụkwasị obi. Ma achọrọ m ka unu nọgide na-abụ ndị maara ihe bụ ezi ihe, na ndị aka ha na-adị ọcha nꞌebe ihe ọjọọ nile dị.


ROM 16:26
Ugbu a, ekpugheela ya, mee ka ọ pụta ìhè, dị ka ndị amụma dere nꞌakwụkwọ nsọ na a ga-eme. A na-ekwusakwa ozi ọma a nꞌebe nile ka mmadụ nile nọ nꞌụwa kwere na Kraịst, ma tụkwasịkwa obi ha na ya.


1 KỌRINT 1:9
Chineke nꞌonwe ya ga-emere unu nke a. Nꞌihi na ọ bụ onye anyị kwesịrị ịtụkwasị obi. Ọ bụkwa Chineke kpọbatara unu nꞌọnọdụ ahụ nke unu na Ọkpara ya bụ Onyenwe anyị Jisọs Kraịst nọ ugbu a na-enwe mmekọrịta.


1 KỌRINT 1:10
Ụmụnna m, eji m aha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst na-arịọ unu, ka unu nile na-ekwekọrịta nꞌihe ọ bụla unu kwuru, ka nkewa ọ bụla gharakwa ịbata nꞌetiti unu. Ana m arịọkwa unu ka unu dị nꞌotu, nꞌechiche obi unu na nꞌizu unu.


1 KỌRINT 2:9
Ọ bụ ihe a ka e dere nꞌakwụkwọ nsọ sị “Ihe ahụ anya mmadụ na-ahụbeghị, ihe ahụ ndị mmadụ na-anụbeghị, ihe ahụ mmadụ na-echebeghị nꞌobi ya, na ọ bụ ihe ga-eme, bụ ihe Chineke kwadoro, debere ndị nile hụrụ ya nꞌanya.”


1 KỌRINT 2:10
Ọ bụ nanị anyị ka Chineke kpugheere ihe omimi a; o sitere na Mmụọ Nsọ ya mee ka anyị mata ya. Mmụọ Nsọ Chineke bụ onye na-enyochapụta ihe omimi na ihe nzuzo nile dị Chineke nꞌobi, ọ bụ ya na-egosikwa anyị ihe ha bụ.


1 KỌRINT 2:11
Ọ dịghị onye ọ bụla pụrụ ịma ihe onye ọzọ na-eche nꞌobi ya. Ọ bụ nanị mmụọ nọ nꞌime onye ahụ bụ onye maara ihe nile banyere ya. Ọ dịkwaghị onye pụrụ ịmata ihe Chineke na-eche nꞌobi ya, ma ọ bụghị nanị Mmụọ Chineke nꞌonwe ya.


1 KỌRINT 2:14
Ma mmadụ ahụ mkpụrụ obi nke onwe ya na-achị enweghị ike ịnabatara onwe ya onyinye si nꞌaka Mmụọ Nsọ Chineke, nꞌihi na onye dị otu a adighị aghọta ihe ha bụ. Nꞌebe ọ nọ, ha bụ ihe nzuzu. Kama ọ bụ nanị ndị Mmụọ Nsọ bi nꞌime ha na-aghọta ihe ọ bụla banyere Mmụọ Nsọ.


1 KỌRINT 2:16
Ma onye ụwa ọ̀ ga-esi aṅaa ghọtakwanụ? Ò nweela oge ọ bụla o ji mata ihe Chineke na-eche nꞌobi ya? Ò nweela mgbe o ji nwee ike ịdụ Chineke ọdụ ịgwa ya ihe ọ ga-eme? Ma dị ka o si dị, anyị bụ ndị nke Kraịst, nwere nꞌime anyị Mmụọ Kraịst.


1 KỌRINT 3:6
Ọ bụ m kụrụ mkpụrụ okwu Chineke nꞌobi unu, Apọlọs bụkwa onye gbara mkpụrụ ahụ mmiri, ma ọ bụ Chineke mere ka o too.


1 KỌRINT 3:8
O nweghị ihe dị iche nꞌetiti mụ bụ onye kụrụ mkpụrụ ahụ na Apọlọs onye gbara mkpụrụ ahụ mmiri. Ọ bụ otu ihe ahụ ka anyị bụ nꞌobi. Chineke ka ọ dịrị ịkwụghachi onye ọ bụla nꞌime anyị dị ka ọrụ anyị si dị.


1 KỌRINT 3:18
Ya mere, ka onye ọ bụla ghara ịghọgbu onwe ya. Ọ bụrụ na onye ọ bụla nꞌime unu na-eche nꞌobi ya na ya bụ onye maara ihe, dị ka ihe ọmụma nke ụwa si dị, ọ ga-akara onye ahụ mma ịghọ ewu, onye na-enweghị uche, kama amimihe ahụ o chere na o nwere ga-eme ya ka ọ hapụ ịnata ezi amamihe ahụ si nꞌelu na-abịa.


1 KỌRINT 3:20
Ọzọ kwa, akwụkwọ nsọ kwuru sị, “Onyenwe anyị maara echiche obi mmadụ, mara na amamihe ya bụ ihe efu.”


1 KỌRINT 4:2
Ma ihe dị mkpa bụ na o kwesịrị ka odibo ọ bụla bụrụ onye kwesịrị ntụkwasị obi nꞌọrụ ọ bụla e tinyere ya nꞌaka.


1 KỌRINT 4:5
Nꞌihi ya jienụ onwe unu aka ikpe onye ọ bụla ikpe tutuu oge ikpe eruo. Cherenụ ruo mgbe Onyenwe anyị nꞌonwe ya ga-abịa igbubi ikpe nile. Ọ ga-eme ka ihe nile ụmụ mmadụ na-eme ugbu a na nzuzo pụta ìhè. Ọ ga-agbakwa ọchịchọ nzuzo dị ndị mmadụ nꞌobi nꞌanwụ. Mgbe ahụ onye ọ bụla ga-anatakwa nꞌotu nꞌotu, otuto ruuru ya site nꞌaka Chineke.


1 KỌRINT 4:11
Tutuu ruo ugbu a anyị na-ebu ọnụ nꞌihi ahụghị ihe anyị ga-eri. Anyị na-ejegharị na-arụ ọrụ nꞌọnọdụ akpịrị ịkpọ nkụ. Anyị enweghị ezigbo uwe anyị ji achụ oyi. Ndị mmadụ na-emeso anyị mmeso ọjọọ, ma anyị enweghị ebe obibi nke aka anyị.


1 KỌRINT 4:17
Ọ bụ nke a mere m ji ezitere unu Timoti ka ọ bịa nyere unu aka ime nke a. Nꞌihi na Timoti bụ ezi nwa m, onye kwesịrị ntụkwasị obi. Ọ ga-eme ka unu mata ihe nile m na-ezi nꞌụlọ nzukọ Kraịst nile m na-aga.


1 KỌRINT 4:21
Ya mere, unu ka ọ dịrị ịhọrọ nke unu chọrọ. Unu chọrọ ka m jiri ụtarị bịakwute unu, ka ọ bụ ka m jiri obi dị umeala na mmụọ nke ịhụnanya bịa?


1 KỌRINT 6:19
Ọ bụ na unu amataghị na ahụ unu bụ ụlọ obibi nke Mmụọ Nsọ ahụ Chineke nyere unu, Onye bi nꞌime unu? Anụ ahụ unu abụkwaghị nke unu onwe unu, kama unu bụ nke Chineke.


1 KỌRINT 7:24
Ụmụnna m, nꞌọnọdụ ọ bụla mmadụ nọ mgbe ọ nabatara Kraịst, ya nọgidesie ike nꞌime ya, kama nanị ihe ọ ga-eme bụ ịtụkwasị Kraịst obi nꞌihi na Onyenwe anyị nọ nꞌebe ahụ inyere ya aka.


1 KỌRINT 7:25
Ajụjụ ọzọ unu jụrụ bụ banyere ụmụ agbọghọ na-alụbeghị di. Unu na-ajụ ma o ziri ezi nꞌezie ka ha lụọ di. Enweghị m iwu ọ bụla site nꞌaka Chineke banyere ajụjụ a, ma o nyere m amamihe nke a pụrụ ịtụkwasị obi. Nꞌihi nke a, leenụ ihe m chere banyere ajụjụ a.


1 KỌRINT 7:28
Ma ọ bụrụ na i kpebie nꞌobi gị ịlụ nwụnye, i meghị mmehie ọ bụla; ọ bụrụkwa na nwagbọghọ ekpebie na ọ ga-alụ di, o meghị mmehie. Ma chezie echiche ma ị ga-ebulitekwa nsogbu nke ya na mkpebi gị so nꞌoge a.


1 KỌRINT 7:30
Ka ndị na-akwa akwa bie ndụ dị ka ndị na-enweghị obi ọjọọ ọ bụla, ka ndị na-achị ọchị dịrị ka ndị obi na-adịghị atọ ụtọ. Ka ndị na-azụ ahịa dịrị dị ka ndị na-enweghị ngwa ahịa ọ bụla.


1 KỌRINT 7:34
Nꞌụzọ dị otu a, ọ na-enwekwa obi abụọ nꞌihe ọ bụla ọ chọrọ ime. Otu a ka ọ dịkwa nwagbọghọ lụrụ di. Echiche ya nile bụ ime ka ihe dị nꞌezinụlọ ya dị mma, na ime ihe ga-atọ di ya ụtọ. Ma ọchịchọ nwagbọghọ na-enweghị di bụ ime ihe ga-atọ Chineke ụtọ.


1 KỌRINT 7:35
Ihe m na-eme abụghị ịgbalị igbochi unu ịlụ di ma ọ bụ nwụnye, kama ọ bụ inyere unu aka. Ya mere, achọrọ m ka unu mee ihe ahụ unu maara ga-enyere unu aka iji otu obi rụọra Chineke ọrụ.


1 KỌRINT 7:37
Ma ọ bụrụ na nwoke ekpebie nꞌobi ya na ọ gaghị alụ nwụnye ma nweekwa ike ijide onwe ya aka, ọ bụ ihe dị mma ka o mere.


1 KỌRINT 7:40
Nꞌuche m, ọ ga-enwe ọṅụ nꞌobi ya karịa ma ọ bụrụ na ọ lụghị di ọzọ. Ana m echekwa na ndụmọdụ ndị a m nyere unu si na Mmụọ Chineke bịa.


1 KỌRINT 8:10
Nꞌihi na ọ bụrụ na onye ahụ chere na nri e nyere arụsị bụ ihe ọjọọ, ahụ gị ka ị nọ na-eri nri nꞌụlọ arụsị, ọ ga-enwe obi ike soro gị nọdụ rie nri ahụ. Ma mgbe ọ na-eri ya akọnuche ya ga-anọ na-ama ya ikpe na o meela ihe ọjọọ.


1 KỌRINT 9:9
Nꞌihi na e dere ya nꞌakwụkwọ nsọ ahụ Chineke nyere Mosisi sị, “Ị gaghị ekechi ọnụ ehi nke na-arụ ọrụ nꞌubi gị, ime ka ọ ghara ịta ọka mgbe ọ na-azọcha mkpụrụ ọka.” Unu chere na ọ bụ nanị ehi ka Chineke bu nꞌobi kwuo okwu a?


1 KỌRINT 9:10
É, è! O bukwa anyị nꞌobi kwuo ya. Nꞌezie, e dere ihe ndị a nꞌihi anyị, nꞌihi na onye kụrụ mkpụrụ nꞌubi na onye gara wee ihe dị nꞌubi ahụ, kwesịrị iketa oke site na mkpụrụ e si nꞌubi ahụ weta.


1 KỌRINT 9:11
Mkpụrụ anyị kụrụ nꞌime obi unu bụ mkpụrụ nke mmụọ. Ọ̀ ga-abụ ihe ọjọọ ma anyị sị unu nyetụ anyị ihe oriri na akwa oyiyi unu?


1 KỌRINT 9:12
Echere m na ọ bụ anyị kwesịrị isite nꞌaka unu nata ihe ndị a karịa ndị ọzọ a unu na-enye ihe ndị a. Ma ọ dịbeghị mgbe anyị rịọrọ unu ihe ọ bụla, kama anyị na-agbalịsi ike ịhụ na ọ dịghị ihe ga-egbochi unu iji ezi obi na-ege ntị nꞌozi ọma Kraịst nke anyị wetara.


1 KỌRINT 9:19
Site nꞌụzọ dị otu a, abụghị m ohu onye ọ bụla nꞌihi na o nweghị onye m nọ nꞌokpuru ya nke na-akwụ m ụgwọ ọrụ, kama abụ m onyenwe onwe ya. Ma emeela m onwe m ohu nye mmadụ nile ka m nwee ike site nꞌụzọ dị otu a rite ọtụtụ mkpụrụ obi nꞌuru nye Kraịst.


1 KỌRINT 9:25
Mgbe ọgba ọsọ na-ejikere ịgba ọsọ ya, ọ na-enwe ntachi obi nꞌọtụtụ ahụhụ nke ya na ọzụzụ so. Ma ọgba ọsọ a na-azụ onwe ya nanị ka o nweta okpu mmeri okoko osisi na-emebi emebi, ma ọ bụ iko ọlaọcha. Ma ọsọ anyị na-agba bụ ka anyị nweta okpu mmeri nke eluigwe nke na-adịghị emebi emebi.


1 KỌRINT 10:12
Ọ bụrụ na ị na-eche nꞌobi gị na ị nweghị ike ime ihe ndị a, leziekwa onwe gị anya, nꞌihi na ị pụrụ ịdabakwa na mmehie.


1 KỌRINT 10:13
Ma matakwa nke ọma na ọnwụnwa na-abịara gị adịghị iche site nꞌọnwụwa na-adakwasị ndị ọzọ. Ọ dịkwaghị ọnwụnwa mmadụ na-enweghị ike imeri. Ọ bụrụ na ị tụkwasị Chineke obi, ọ ga-enye gị ike iguzosi ike nꞌoge ọnwụnwa, zikwa gị ụzọ ị ga-esi merie ọnwụnwa ọ bụla. Nꞌihi na Chineke agaghị ekwe ka ọnwụnwa ọ bụla ka gị ike dakwasị gị.


1 KỌRINT 10:20
Ihe m na-ekwu bụ na ndị nile na-achụrụ arụsị aja jikọtara onwe ha nꞌotu obi ịchụrụ ekwensu aja ahụ, ọ bụghị Chineke. Achọkwaghị m ka unu bụrụ ndị e jikọtara ha na ekwensu mgbe unu so ha rie nri ahụ ha ji chụọra arụsị ha aja.


1 KỌRINT 10:26
Nꞌihi na akwụkwọ nsọ kwuru sị, “Ụwa nile na ihe ọma nile dị nꞌime ya bụ nke Chineke. Ọ dịkwara anyị iji ha ime onwe anyị obi ụtọ.”


1 KỌRINT 11:2
Ọṅụ juru m obi nꞌihi na unu na-echeta m na nꞌihi na unu na-eme ihe m ziri unu.


1 KỌRINT 13:4
Ịhụnanya na-enwe ogologo ntachi obi, na-enwekwa obi ebere. Ọ dịghị ekwo ekworo, ọ naghị enwe anya ukwu, ọ naghị anya isi. Ọ nakwaghị ebuli onwe ya elu.


1 KỌRINT 13:7
Ọ bụrụ na ị hụ mmadụ ibe gị nꞌanya, ị ga-ejikere mgbe nile ilefu ihe ọjọọ o mere gị anya, ị ga-atụkwasị ya obi, nwee okwukwe nꞌime ya, ma nagide ihe ọ bụla si nꞌaka ya dapụta.


1 KỌRINT 13:11
Ọ dị nnọọ dị ka mgbe m bụ nwanta. Mgbe ahụ, ekwuru m okwu dị ka nwanta, echiche m nile bụ echiche nwanta. Izuzu obi m nile bụkwa nke ụmụntakịrị. Ma mgbe m toro ghọọ dimkpa, adịkwaghị m akpa agwa dị ka nwantakịrị ọzọ.


1 KỌRINT 13:12
Otu aka ahụ kwa, ihe anyị na-ahụ na ihe anyị na-aghọtakwa bụ nanị ihe ntakịrị banyere Chineke, dị ka a ga-asị na anyị na-ele anya nꞌime enyo gbajiri ojii. Ma otu ụbọchị, anyị ga-ahụ ya ihu na ihu. Ugbu a, ihe mụ onwe m maara banyere ya dị ntakịrị, ma oge na-abịa mgbe m ga-ama ihe nile nke ọma, dị ka Chineke si mara obi m ugbu a.


1 KỌRINT 14:3
Ma onye ahụ na-ebu amụma na-ezisa ozi ọma, na-agwa ndị mmadụ okwu na-enyere ha aka ito eto nꞌime Onyenwe anyị. Ọ na-agwakwa ha okwu nkasiobi na okwu na-ebuli mmụọ ha elu.


1 KỌRINT 14:24
Ma ọ bụrụ na unu nile nọ na-ebu amụma na-ezisa ozi ọma Chineke, mgbe onye na-ekweghị ekwe ma ọ bụ onye bụ onye Kraịst ọhụrụ batara nꞌụlọ chọọchị unu, okwu nile ọ ga-anụ ga-emetụ ya nꞌobi, maakwa ya ikpe mmehie. Akọnuche ya agaghị enwekwa ozuzu ike nꞌihi ihe nile ọ nụrụ.


1 KỌRINT 14:31
Nꞌụzọ dị otu a, ndị nile nwere onyinye ibu amụma nwere ike izisa ozi ọma Chineke. Nꞌụzọ dị otu a kwa, a ga-enyere mmadụ nile aka kasiekwa ha obi.


1 KỌRINT 15:2
E si nꞌozi ọma a zọpụta unu, ma ọ bụrụ na unu ejiri obi unu nile jidesie ihe unu kweere na ya ike. Inwe okwukwe nꞌihe ọzọ dị iche agaghị enyere unu aka.


1 KỌRINT 15:10
Ma site nꞌamara Chineke, abụ m ihe m bụ taa. Chineke meere m ebere dị ukwuu, wụkwasị m amara ya. Ana m egosikwa na obi ebere Chineke nꞌebe m nọ abụghị ihe efu, nꞌihi na arụọla m ọrụ karịa ndị ozi nile. Ma nꞌezie ọ bụghị m na-arụ ọrụ a, kama ọ bụ Chineke nꞌonwe ya na-arụ ọrụ ya nꞌime m, ịgọzi m.


1 KỌRINT 15:17
Ma ọ bụrụ na Kraịst esighị nꞌọnwụ nilie, unu bụ nnọọ ndị nzuzu inọgide na-atụkwasị obi na Chineke ga-azọpụta unu. Karịsịa, unu nọkwa ugbu a nꞌime mmehie unu.


1 KỌRINT 15:44
Ọ bụ nanị anụ ahụ mmadụ ka ha bụ mgbe e liri ya, ma mgbe e si nꞌọnwụ kpọlite ha, ha ga-abụ anụ ahụ nke mmụọ na-achị. Dị ka e nwere anụ ahụ nke mkpụrụ obi mmadụ na-achị, otu a kwa ka e nwere anụ ahụ nke mmụọ na-achị.


1 KỌRINT 16:16
ka unu na-eso ihe ọ bụla ndị dị otu a gwara unu. Nyekwaranụ ha aka, ha na ndị ọzọ nile so unu jiri obi ha nile na-arụ ọrụ.


1 KỌRINT 16:17
Obi tọrọ m ụtọ na Stefanas na Fọtunetus na Akaikọs bịara nꞌebe a ileta m. Ha emeelara m ihe unu gaara emere m, ma a sị na unu nọ nꞌebe a.


1 KỌRINT 16:18
Ha mesiri m obi ike, dị ka m si chee na ha sikwa otu a na-agba unu ume. Eji m aka na unu na-egosi ndị dị otu a na ọrụ ha dị unu mma.


1 KỌRINT 16:20
Ụmụnna nꞌime Kraịst nile nọ nꞌebe a na-ekele unu. Jirinụ ikwe nꞌaka nke obi aghụghọ na-adịghị kelerịtaa onwe unu.


2 KỌRINT 1:3
Ka anyị nye Chineke Nna nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst ekele nꞌihi na ọ bụ Nna nke obi ebere, bụrụkwa Chineke onye inyeaka anyị na-esite nꞌaka ya abịa.


2 KỌRINT 1:5
Nꞌihi na dị ka anyị si eketa oke nꞌime ọtụtụ ahụhụ nke Kraịst, otu a ka Chineke si na-akasị anyị obi nꞌime Kraịst.


2 KỌRINT 1:6
Ma ọ bụrụ na anyị na-ahụ ahụhụ, ọ bụ nꞌihi na anyị chọrọ ka a kasie unu obi, na ka a zọpụta unu. Ọ bụrụkwa na a na-akasị anyị obi, e sikwa ụzọ dị otu a enyere unu aka, nꞌihi na a na-enye unu ike na ume iji ntachi obi die ụdị ahụhụ nke anyị onwe anyị na-edikwa.


2 KỌRINT 1:7
Anyị nwere olileanya na ọ bụrụ na unu enwee nsogbu dị ka anyị nwere, Chineke ga-akasị unu obi, ma nyekwara unu aka dị ka o si nyere anyị aka nꞌime nsogbu anyị.


2 KỌRINT 1:9
Ee, ọ dị nnọọ nꞌoge ahụ, dị ka a ga-asị na a mara anyị ikpe ọnwụ. Ma anyị maara na o si otu a mee ka anyị nwee ike ịmụta na o kwesịghị ka anyị tụkwasị obi nꞌike nke aka anyị, kama ka anyị nwee olileanya nꞌime Chineke, onye pụrụ ime ka ndị nwụrụ anwụ si nꞌọnwụ bilie.


2 KỌRINT 1:10
Ọ bụ Chineke bụ onye dọpụtara anyị site nꞌime oke ọnwụ dị otu a. Ọ bụ Chineke ga-adọpụtakwa anyị nꞌoge dị nꞌihu. Anyị nwekwara ntụkwasị obi na ọ ga-aga nꞌihu na-adọpụtakwa anyị.


2 KỌRINT 1:12
Nꞌihi na otu ihe anyị ji na-anya isi, nke akọnuche anyị na-agwakwa anyị na ọ bụ eziokwu, bụ na mmeso anyị na-emeso ndị ọzọ, karịsịa mmeso anyị na-emeso unu, bụ mmeso nke obi ịdị ọcha na ikwu eziokwu site na ndabere anyị nꞌime Onyenwe anyị. Anyị emeghị nke a site nꞌamamihe ụwa a, kama site nꞌamara Chineke.


2 KỌRINT 1:15
Ọ bụ nꞌihi ntụkwasị obi m nwere na unu ga-aghọta, ka m ji zubekwa na mbụ ịbịakwute unu.


2 KỌRINT 1:16
Ebu m ya nꞌobi na m ga-akwụsị hụ unu mgbe m na-agafe ịga Masidonia. Ebukwa m ya nꞌobi na mgbe m si Masidonia na-alaghachi na m ga-akwụsịkwa ileta unu, ka m si otu a bụrụ ngọzi nye unu ugboro abụọ, ka unu nweekwa ike inyere anyị aka mgbe anyị bidoro ịlaghachi Judia.


2 KỌRINT 1:17
Ùnu chere na mgbe m zubere ime nke a, na ihe m zubere ime edoghị m anya? Ka ùnu chere na mgbe m zubere nke a, na m zubere ime ya dị ka onye ụwa, nke na-asị, ee, mgbe ihe o bu nꞌobi bụ é,è?


2 KỌRINT 1:18
Mbaa! Dị ka Chineke si bụrụ onye kwesịrị ntụkwasị obi, abụghị m onye na-ekwu otu ihe mee ihe ọzọ. Nꞌihi na ee m bụ ee! Ọ dịghị m, bụkwa ọ dịghị.


2 KỌRINT 1:19
Nꞌihi na Jisọs Kraịst Ọkpara Chineke, onye e sitere nꞌọnụ Sailas na Timoti na mụ onwe m bụ Pọl kwusaa abụghị onye na-asị ee, mgbe ihe o bu nꞌobi bụ ọ dịghị, kama Kraịst bụ onye na-eme ihe o kwuru.


2 KỌRINT 1:22
Chineke akakwasịla anyị akara ya igosi na anyị bụ ndị nke ya. O nyekwala anyị Mmụọ Nsọ ya nꞌime obi anyị dị ka ihe akaebe na anyị ga-anata ihe nile o zubere inye anyị.


2 KỌRINT 1:23
Chineke bụ onye akaebe m, nꞌihi na ọ maara obi m, ọ maara na ekpebiri m ịhapụ ịbịa Kọrint nꞌihi na achọghị m ime ka obi jọọ unu njọ site na mba nke m bu nꞌobi ịbara unu.


2 KỌRINT 2:1
Ekpebiri m nꞌime obi m na agaghị m abịakwute unu ọzọ, ime ka obi jọọ unu njọ.


2 KỌRINT 2:2
Nꞌihi na ọ bụrụ na m eme ka obi jọọ unu njọ, onye kwanụ gaakasị m obi? Ọ̀ bụghị unu onwe unu ndị m mere ka obi jọọ njọ?


2 KỌRINT 2:3
Ọ bụ nke a mere m ji deere unu akwụkwọ ahụ ka unu nwee ike idozicha ihe nile tupuu ọbịbịa m. Achọghị m ka ndị ahụ kwesịrị ime ka obi tọọ m ụtọ, bụrụ ndị ga-eme ka obi jọọ m njọ. O doro m anya na ọ bụrụ na m ejiri obi ụtọ bịa, obi gaadịkwa unu ụtọ.


2 KỌRINT 2:4
Nꞌezie, akwụkwọ ahụ m detaara unu wutere mmụọ m nke ukwuu. Nꞌihi na ọ bụ nꞌọnọdụ oke mkpagbu na ihe mgbu, ya na anya mmiri, ka m ji dee ya. Edeghị m ya ime ka unu nọọ nꞌihe mgbu, kama edere m ya ka unu mara otu m si hụ unu nꞌanya, na otu o si na-emetụ m nꞌobi bụ ihe na-eme nꞌetiti unu.


2 KỌRINT 2:5
Ọ bụghị nanị m ka nwoke ahụ m deere unu ihe banyere ya wetaara obi ọjọọ. Ana m ekwu ihe banyere nwoke ahụ butere nsogbu ndị a nile. Kama o wetakwaara unu obi ọjọọ. Ya mere, achọghị m ka ọ hụọ ahụhụ karịa ka o kwesịrị.


2 KỌRINT 2:7
Ugbu a, bikonụ ụmụnna m, o kwesịrị ka unu gbaghara ya, ma kasie ya obi, ka ọ hapụ inwe obi ilu ma ọ bụ daa mba na mmụọ ya, nke ga-eme ka o kpebie ịhapụ iso Kraịst ọzọ.


2 KỌRINT 2:13
Ma enweghị m izuike nꞌime obi m, nꞌihi na ahụghị m Taitọs ezi nwanna m nꞌebe ahụ. Ọ bụ nꞌihi nke a ka m ji sị ndị Troas nọdụnụ nke ọma, mgbe m hapụrụ ha palie ije ịga Masidonia ịgbalị ịchọ Taitọs.


2 KỌRINT 3:3
Ọ pụtara ìhè na unu bụ akwụkwọ ozi si nꞌebe Kraịst nọ bịa, nke anyị dere. Ọ bụghị ihe e ji mkpịsị akwụkwọ dee na mbadamba nkume, kama e dere ya nꞌobi mmadụ site na mmụọ Chineke na-adị ndụ.


2 KỌRINT 3:4
Anyị pụrụ ikwu ụdị okwu a banyere onwe anyị nꞌihi na anyị nwere ntụkwasị obi nꞌime Chineke site na Kraịst, na ọ ga-enyere anyị aka iguzosi ike nꞌeziokwu ahụ anyị na-ekwu.


2 KỌRINT 3:14
Ma nꞌezie, ọ bụghị nanị ihu Mosisi ka e jiri akwa kpuchie, kama e mechiri obi ụmụ Izirel ruo taa. Nꞌihi na mgbe ọ bụla ụmụ Izirel gụrụ akwụkwọ nsọ, ọ na-adị ka e ji akwa kpuchie obi ha, nꞌihi na ha adịghị ahụ ma ọ bụ aghọta ihe ha gụrụ. Ma a pụrụ iwepụ akwa mkpuchi dị otu a, nanị ma ọ bụrụ na nwoke ọ bụla ekwere na Kraịst.


2 KỌRINT 3:15
Ee, tutuu ruo taa, mgbe ọ bụla ha na-agụ akwụkwọ iwu ahụ Mosisi dere, ihe mkpuchi na-adịgide nꞌobi ha, ime ka ha chee na a ga-azọ-puta ha site nꞌidebe iwu.


2 KỌRINT 4:6
Nꞌihi na Chineke ahụ sịrị ka ìhè si nꞌime ọchịchịrị nwupụta, bụ Chineke ahụ mere ka ìhè ya nwuo nꞌime obi anyị, ka anyị nwee ike ịmata na ìhè ebube ahụ pụtara ìhè nꞌihu Kraịst, bụ ebube nke ya.


2 KỌRINT 4:8
A na-akpagbu anyị nꞌakụkụ nile, ma a dịghị akpagbubiga anyị oke. Mgbe ụfọdụ anyị na-enwe obi abụọ nꞌihi na anyị adịghị aghọta otu ihe nile si aga, ma anyị adịghị anọgide nꞌobi abụọ.


2 KỌRINT 4:16
Ọ bụ nke a mere ike adịghị agwụ anyị nꞌobi. Ọ bụ ezie na anụ ahụ anyị na-anwụ anwụ, ma Chineke na-agba mmụọ anyị ume kwa ụbọchị.


2 KỌRINT 5:6
Nꞌihi nke a anyị nwere obi ike na ntụkwasị obi mgbe nile, nꞌihi na anyị maara na mgbe anyị na-aga nꞌihu naadị ndụ nꞌụwa a, anyị anọghị nꞌụlọ anyị dị nꞌeluigwe.


2 KỌRINT 5:7
Nꞌihi na ọ bụ okwukwe ka anyị ji mata na ihe ndị a bụ eziokwu site nꞌịtụkwasị Onyenwe anyị obi. Ọ bụghị nꞌihi na anyị ahụla ha.


2 KỌRINT 5:8
Ya mere, anyị nwere obi ike, ụjọ adịghị atụ anyị. Ọ dị anyị nnọọ ezi mma ịnwụ anwụ anwụ, nꞌihi na site nꞌụzọ dị otu a, anyị ga-alakwuru Onyenwe anyị nꞌụlọ anyị dị nꞌeluigwe.


2 KỌRINT 5:11
Ọ bụ nꞌihi na anyị maara nnọọ ihe ịtụ egwu Onyenwe anyị pụtara, ka anyị ji na-arụsị ọrụ ike ikwusara ndị ọzọ ozi ọma Kraịst. Chineke makwaara obi anyị na ha dị ọcha. Enwekwara m olileanya na unu maara m nke ọma nꞌime obi unu.


2 KỌRINT 6:1
Dị ka ndị ha na Chineke na-arụkọ ọrụ nꞌotu, anyị na-arịọ arịrịọ sị unu ahapụla ịnara amara a Chineke na-enye unu nꞌefu, nꞌihi na Chineke egosila unu oke obi ebere o nwere nꞌebe unu nọ.


2 KỌRINT 6:4
Kama nꞌime ihe nile, anyị na-agbalịsi ike ime ka ndị mmadụ mara na anyị bụ ndị ji eziokwu na-ejere Chineke ozi. Anyị ji ndidi na ntachi obi na-edi nsogbu nile na mkpagbu nile na ahụhụ nile naadakwasị anyị.


2 KỌRINT 6:6
Anyị emeekwala ka unu mata na anyị bụ ndị sitere na ndụ dị ọcha anyị na-ebi, na ezi nghọta anyị ghọtara ozi ọma ahụ, na ogologo ntachi obi na-ejere Chineke ozi. Anyị egosikwala unu na anyị bụ ndị nwere obi ọma, ndị hụrụ unu nꞌanya, na ndị jupụtara na Mmụọ Nsọ Chineke.


2 KỌRINT 6:10
Anyị na-anọ nꞌihe mwute mgbe nile, ma lee ọṅụ Onyenwe anyị na-enye juru anyị obi. Anyị bụ ndị ogbenye, ma anyị na-eme ka ọtụtụ mmadụ bụrụ ndị ọgaranya. Anyị enweghị ihe ọ bụla, ma lee anyị nwere ihe nile.


2 KỌRINT 6:11
Ndị enyi anyị nọ na Kọrint, anyị agwala unu ihe nile dị anyị nꞌobi, anyị emeghepụla obi anyị nye unu.


2 KỌRINT 6:12
Anyị ji obi anyị nile hụ unu nꞌanya, ma ọ bụ unu mechiri obi unu nꞌebe anyị nọ.


2 KỌRINT 6:13
Ana m ekwuru unu okwu ugbu a dị ka a ga-asị na ọ bụ ụmụ nke aka m ka m na-agwa okwu. Anyị chọrọ ka unu gosi na unu hụrụ anyị nꞌanya dị ka anyị onwe anyị si hụ unu nꞌanya. Megheenụ obi unu nꞌebe anyị nọ.


2 KỌRINT 7:2
Megheenụ obi unu nabata anyị, nꞌihi na o nweghị onye ọ bụla nꞌetiti unu anyị mere ihe ọjọọ. O nwekwaghị onye anyị duhiere. Ọ dịkwaghị onye ọ bụla anyị rigburu.


2 KỌRINT 7:3
Anaghị m ekwu okwu ndị a ime ka ihere mee unu, nꞌihi na dị ka m si gwa unu na mbụ, ana m echeta unu nꞌime obi m mgbe nile. Ma o doro m anya, ma ọ bụ na ndụ o, ma anyị na-anwụ anwụ, anyị aghaghị ịnọkọta nꞌotu.


2 KỌRINT 7:4
Enwere m ntụkwasị obi dị ukwuu nꞌebe unu nọ, ana m anyakwa isi nꞌihi unu. Unu agbaala m ume nke ukwuu. Unu emeela ka m ṅụrịa ọṅụ ọ bụladị nꞌime ahụhụ m.


2 KỌRINT 7:5
Nꞌihi na mgbe anyị bịaruru ala Masidonia, anyị enweghị izuike ma ọlị. Kama mkpagbu si nꞌaka nri na aka ekpe bịakwute anyị. Egwu jupụtakwara anyị obi.


2 KỌRINT 7:7
Ọ bụkwaghị nanị nꞌihi na ọbịbịa Taitọs nyere anyị obi ụtọ, kama akụkọ o ji bịa, gbasara otu unu si nabata ya, na otu unu si kasie ya obi, ma gbaakwa ya ume, mekwara ka anyị ṅụrịa ọṅụ. Mgbe ọ gwakwara anyị otu unu si na-ele anya ịhụ m, na otu unu si na-eru uju nꞌihi ihe nile mere, na otu unu si guzosie ike nꞌukwu m, na ụdị ịhụnanya unu nwere nꞌebe m nọ, obi tọrọ m ụtọ nke ukwuu.


2 KỌRINT 7:8
Ọ naghị ewutekwa m ugbu a na m deere unu akwụkwọ ahụ, ọ bụ ezie na o wutere m mgbe ahụ m na-ede ya, nꞌihi na amaara m na ọ ga-ewetara unu obi ọjọọ mgbe unu gụrụ ya. Ma obi ọjọọ ahụ abụrụla nanị nke nwa oge nta.


2 KỌRINT 7:9
Ma ugbu a ana m aṅụrị ọṅụ na m dere akwụkwọ ahụ. Ọ bụghị nꞌihi na ọgụgụ ya wetaara unu obi ọjọọ, kama ọ bụ nꞌihi na mwute o wutere unu emeela ka unu chegharịa. Ụdị mwute unu nwere bụ ụdị mwute Chineke chọrọ ka ndị nke ya nwee. Ya mere, o nweghị ihe ọjọọ bịakwasịrị unu nꞌihi akwụkwọ anyị deere unu.


2 KỌRINT 7:11
Leenụ ihe Chineke rụpụtara site nꞌihe mwute dakwaịrị unu. Ugbu a unu abụrụla ndị ọ na-anụ ọkụ nꞌobi na ndị jikeere izi anyị na aka unu abụọ dị ọcha. Lee otu unu si zi iwe unu, otu unu si zikwa na ihe ahụ wutere unu. Lee otu unu si tụọ ụjọ ihe mmehie ahụ nwere ike iwetara unu. Leekwa otu unu si mee ihe nile igosi na unu kwagidere m. Leekwanụ otu unu si nye onye ahụ mere mmehie ahụ ntaramahụhụ ngwangwa. Unu egosila na aka unu dị ọcha nꞌokwu ndị a nile.


2 KỌRINT 7:12
Ọ bụ ezie na m deere unu akwụkwọ ahụ, ma edeghị m ya nꞌihi onye ahụ mehiere, ma ọ bụ nꞌihi onye ahụ e mehiere megide. Kama edere m ya ime ka Onyenwe anyị gosi unu otu ihe gbasara anyị si na-anụ unu ọkụ nꞌobi.


2 KỌRINT 7:14
Nꞌihi na tupu ọ hapụ anyị bịakwute unu, anyaara m isi nꞌihu ya banyere unu; ugbu a obi dị m ụtọ nke ukwuu nꞌihi na unu emeghị ka ihere mee m. Anyị ekwuola eziokwu nye unu. Ugbu a ịnya isi m nꞌebe Taitọs nọ egosila na anyị bụ ndị eziokwu.


2 KỌRINT 7:16
Nke a na-enyekwa m obi ụtọ nꞌihi na enwere m ntụkwasị obi nꞌebe unu nọ nꞌime ihe nile.


2 KỌRINT 8:2
Ọ bụ eziokwu na ha nọ nꞌime oke mkpagbu na ihe mwute mgbe nile, ma ha nwere ịnụ ọkụ nꞌobi dị nnọọ ukwuu ruo na ha gbasara aka ha nye ndị ọzọ ihe, ewezugakwa na ọ bụ ezie na ha bụ ndị ogbenye.


2 KỌRINT 8:7
Unu babigara ụba oke nꞌihe nile unu nwere. Unu nwere okwukwe dị ukwuu, nweekwa ọtụtụ mmadụ ndị maara ikwusa ozi ọma nke ọma, na ndị maara ihe. Unu hụkwara anyị nꞌanya nke ukwuu ma gosikwa ịnụ ọkụ nꞌobi unu inye aka. Nꞌihi nke a anyị chọrọ ka unu gbasaa aka unu ịrụ ọrụ ịhụnanya a.


2 KỌRINT 8:8
Anaghị m enye unu iwu, kama site nꞌizi unu otu o si na-anụ ndị ọzọ ọkụ nꞌobi inye aka, achọrọ m ịchọpụta ma ịhụnanya unu na ịnụ ọkụ nꞌobi unu ọ ga-adakọtakwa.


2 KỌRINT 8:9
Nꞌihi na unu maara ụdị oke ịhụnanya na obi ọma nke Onyenwe anyị Jisọs nwere. Ọ bụ ezie na ọ bụ ọgaranya, ma ọ họọrọ ịbụ ogbenye nꞌihi unu, ka unu onwe unu site nꞌogbenye ya bụrụ ọgaranya.


2 KỌRINT 8:11
Ma ugbu a achọrọ m ka unu mezuo ihe unu chepụtara ime. Ka ịnụ ọkụ nꞌobi unu nwere na mbụ ịrụ ọrụ a bụrụkwa ihe unu ga-eji mezuo ya dị ka ihe unu nwere si dị.


2 KỌRINT 8:16
Anyị kelere Chineke onye nyere Taitọs obi inyere unu aka ekele, dị ka ihe banyere unu si emetụ anyị nꞌobi.


2 KỌRINT 8:17
Ọ bụghị nanị na o kweere ime dị ka anyị si rịọrọ ya, kama nꞌihi ịhụnanya o nwere nꞌebe unu nọ, o kpebiri nꞌime obi ya ịbịakwute unu na inyere unu aka.


2 KỌRINT 8:22
Ugbu a anyị na-ezitekwara unu nwanna anyị nwoke ọzọ ka o soro ha bịakwute unu, nwanna anyị a bụ onye anyị nwapụtara, onye ọ na-anụ ọkụ nꞌobi inye aka. Ugbu a o nwekwara ntụkwasị obi dị ukwuu nꞌebe unu nọ.


2 KỌRINT 9:2
Amaara m na unu jikeere inyere ha aka, dị ka m nyara isi nye ndị Masidonia banyere unu. Nꞌihi na agwara m ha na unu ndị bi na Akaịa ejikerelarị inyere ha aka kemgbe afọ gara aga. Ọ bụkwa ịnụ ọkụ nꞌobi unu kwaliri obi ha, ime ihe ha mere.


2 KỌRINT 9:7
Ka onye ọ bụla nye dị ka o buru ụzọ kpebie nꞌime obi ya inye. Ka ọ ghara inye nꞌihi na mmadụ kwagidere ya, ma ọ bụ inye nꞌihi na ndị ọzọ na-enye, nꞌihi na Chineke hụrụ ndị ji obi ụtọ nye oninye ha nꞌanya.


2 KỌRINT 9:10
Ma Chineke ahụ na-enye onye ọrụ ubi mkpụrụ nke ọ na-akụ nꞌubi ya, onye na-enyekwa ya nri nꞌoge owuwe ihe ubi, ga-enyekwa unu nile mkpụrụ dị unu mkpa, nke unu ga-eji kụọ mkpụrụ obi ọma. Ọ ga-emekwa ka mkpụrụ ndị a too eto, meekwa ka owuwe ihe ubi unu hie nne.


2 KỌRINT 9:14
Nke a ga-emekwa ka ha nile jiri obi jupụtara nꞌekele kpeere unu ekpere, nꞌihi ịdị ukwu nke amara ahụ Chineke gosiri nꞌebe unu nọ.


2 KỌRINT 10:2
Olileanya m bụ na mgbe ọ bụla m bịara ka m ghara inwe obi ike nꞌetiti unu, nꞌihi omume unu nꞌebe m nọ. Nꞌihi na o doro m anya na m nwere ike imesi ndị ahụ na-eche na anyị na-eme ihe dị ka ndị ụwa si eme ya ike.


2 KỌRINT 10:5
Anyị na-eji ngwa agha ndị a emegide okwu ụgha nile na okwu nganga nile, nke ndị mmadụ na-eji ekpuchi eziokwu nile gbasara Chineke. Anyị na-ejikwa ngwa agha ndị a eme ka obi nile bụrụ ihe e meriri emeri irubere Kraịst isi.


2 KỌRINT 10:7
Ihe na-enye unu nsogbu bụ na unu na-ele m anya nanị nꞌelu anụ ahụ chee na m adịghị ike, ma unu adịghị ele m anya nꞌime obi. Ọ bụrụ na onye ọ bụla echee na o nwere ike nke Kraịst na-enye ndị bụ ndị nke ya, ya matakwa na mụ onwe m nwekwara ụdị ike ahụ.


2 KỌRINT 11:1
Echere m na unu ga-anagide ya ma ọ bụrụ na m ekwuo okwu ndị a dị ka onye nzuzu. Biko nweenụ ndidi nꞌebe m nọ mgbe m na-ekwu ihe dị m nꞌobi.


2 KỌRINT 11:2
Ana m echegbu nnọọ onwe m nꞌihi unu, ihe banyere unu na-emetụ m nꞌobi dị ka o si emetụ Chineke nꞌobi. Ọ na-agụ obi m agụụ ịhụ na Kraịst nanị bụ onye unu gaahụ nꞌanya. Achọrọ m ka unu hụ Kraịst nꞌanya dị ka nwagbọghọ naamaghị nwoke si ahụ onye na-achọ ịlụ ya nꞌanya, na-edebekwa onye ya ọcha nꞌihi nwoke ahụ.


2 KỌRINT 11:3
Ma ana m atụ egwu, nꞌihi na ọ na-adị m ka unu gaekwe ka ụfọdụ mmadụ duhie unu, mee ka unu ghara iwere obi unu nile hụ Onyenwe anyị nꞌanya, dị ka agwọ ahụ si jiri aghụghọ ghọgbuo Iiv.


2 KỌRINT 11:19
Ọ bụ unu na-akpọ onwe unu ndị nwere uche, ma unu na-eji obi ụtọ na-ege ntị, na-anabatakwa ihe nile ndị nzuzu na-agwa unu.


2 KỌRINT 11:29
Ònye bụ onye ahụ na-adịghị ike nke m na-adịghị eso ya kere oke na-adịghị ike ya? Ònye ka e mere ka ọ daa mba nke ịda mba ya na-adịghị emetụ m nꞌobi, ime ka m baara onye mesoro ya mmeso ahụ mba?


2 KỌRINT 12:9
Ma ihe ọ zara bụ nke a, “Amara m ezuolara gị. Nꞌihi na ike m na-apụta ìhè karịa nꞌahụ ndị nile na-adịghị ike.” Ugbu a obi dị m ụtọ ịnya isi banyere adịghị ike m. Nꞌihi na ọ bụ site nꞌọnọdụ adịghị ike m ka ike ebube Kraịst ga-esi nọgide nꞌahụ m.


2 KỌRINT 12:10
Ya mere, ebe m maara na ahụ mgbu a na-ewetara Kraịst otuto, obi dị m ụtọ na m nwere ya. Ana m aṅụrịkwa ọṅụ mgbe a naakọcha m, mgbe m nọ nꞌọnọdụ mkpa, mgbe a na-akpagbu m, na nꞌọnọdụ nsogbu nile. Nꞌihi na mgbe ahụ m na-adịghị ike, mgbe ahụ ka Kraịst naenye m ike.


2 KỌRINT 12:12
Mgbe m nọ nꞌetiti unu o nweghị ụzọ m na-esighị gosi unu na m bụ onyeozi Kraịst. Nꞌezie, egosiri m unu na m bụ onye Chineke nꞌonwe ya ziteere unu. Eji m obi dị umeala rụọ ọrụ ebube na ihe ịrịba ama nꞌetiti unu.


2 KỌRINT 12:13
Ihe ọzọ m na-emere ụlọ nzukọ ndị ọzọ nke m jụrụ imere unu bụ ịnara unu ihe oriri na ịrịọ unu ebe obibi. Bikonụ gbaghara m nꞌihi ihe ọjọọ a m mere unu.


2 KỌRINT 13:12
Jirinụ ekele obi ọcha keleere m ibe unu nke ọma.


GALETIA 1:11
Ụmụnna m, achọrọ m ime ka unu mata, na ozi ọma ahụ m kwusaara unu abụghị ihe mmadụ chepụtara nꞌuche ya, kama ọ bụ ihe si nꞌobi Chineke Nna anyị pụta.


GALETIA 1:14
Abụ m otu nꞌime ndị a maara aha ha nꞌetiti ndị ọgbọ m, nꞌihe banyere ofufe ndị Juu. Enwekwara m oke ịnụ ọkụ nꞌobi ịgbaso, na idebezu ụkpụrụ na omenala ofufe ndị Juu, nke nna nna anyị ha nyere anyị nꞌaka idebe.


GALETIA 2:4
Okwu banyere obibi ugwu agaraghị adapụta, ma ọ bụghị na e nwere ndị kpọrọ onwe ha ndị Kraịst, ndị na-abụkwaghị ndị Kraịst nꞌezie, ndị batara nꞌọgbakọ ahụ na nzuzo. Ndị a batara inyocha ụdị inwe onwe anyị nke anyị nwere nꞌime Kraịst Jisọs, na ịchọpụta ma anyị na-erubekwa isi nꞌiwu ndị Juu. Ndị a gbalịrị iji iwu ndị Juu kee anyị agbụ ime anyị ka anyị bụrụ ndị ohu nke iwu ahụ.


GALETIA 2:6
Ndị isi chọọchị nile nọ nꞌebe ahụ, atụkwasịghị ihe ọ bụla nꞌozi ọma m na-ekwusa nꞌetiti ndị mba ọzọ. Ma ihe banyere ọnọdụ ha dị ka ndị ozi emetụghị m nꞌobi, nꞌihi na anyị nile bụ otu nꞌihu Chineke.


GALETIA 2:17
Ọ bụrụ na anyị atụkwasị Kraịst obi ka ọ zọpụta anyị, mesịa chọpụta na anyị jehiere ụzọ ịtụkwasị ya obi, nꞌihi na nzọpụta dị nanị mgbe e biri anyị ugwu, na mgbe anyị debere iwu ndị Juu, ọ̀ gaghị abụ ihe ziri ezi ma ọ bụrụ na anyị ekwuo na okwukwe anyị nwere na Kraịst abụrụla ihe wetaara anyị ịla nꞌiyi? Ma Chineke ekwela na mmadụ ga-eche ụdị echiche a banyere Onyenwe anyị.


GALETIA 3:7
Matanụ nke a, na ndị bụ ụmụ Eberaham nꞌezie bụ ndị nile na-atụkwasị Chineke obi dị ka Eberaham mere.


GALETIA 3:8
Akwụkwọ nsọ lere anya oge ahụ dị nꞌihu, nke bụ ugbu a, mgbe Chineke ga-azọpụta ndị mba ọzọ, site nꞌokwukwe ha nwere nꞌime ya. Nꞌihi na Chineke gwara Eberaham okwu nꞌoge gara aga sị ya, “Aga m agọzi ndị nile tụkwasịrị m obi na mba dị iche iche, dị ka i si tụkwasị m obi.” Ya mere ndị nile tụkwasịrị Kraịst obi, bụkwa ndị na-eso Eberaham eketa ngọzi ahụ Chineke gọziri ya.


GALETIA 3:11
Ugbu a ọ bụ ihe pụtara ìhè na ọ dịghị onye ọ bụla Chineke ga-agụ nꞌonye ezi omume nꞌihi na o debere iwu. Akwụkwọ nsọ agwala anyị na ọ bụ nanị site nꞌịtụkwasị Chineke obi ka mmadụ ọ bụla pụrụ inwe ndụ.


GALETIA 3:12
Leenụ ka ụzọ ịtụkwasị Chineke obi si dị iche site nꞌụzọ nke idebe iwu. Nꞌihi na iwu kwuru na a ga-azọpụta onye na-edebe iwu nanị ma o debezuchara iwu nile Chineke nyere.


GALETIA 3:23
Tupuu Jisọs Kraịst abịa, e ji iwu na-eche anyị nche. Iwu nọ ọnọdụ dị ka ụlọ mkpọrọ ebe e tinyere anyị tutuu ruo mgbe anyị ga-enwere onwe anyị site nꞌịtụkwasị Kraịst Onye nzọpụta ahụ na-abịa obi.


GALETIA 4:6
Ebe ọ bụ na anyị bụ ụmụ ya, Chineke zitere Mmụọ Nsọ ya, ka ọ bịa biri nꞌobi anyị, inyere anyị aka, ikpere Chineke Nna anyị ekpere nꞌụzọ ziri ezi.


GALETIA 4:15
Èbee ka mmụọ nke obi ụtọ ahụ unu nwere dị, nke anyị nile ji nọkọọ nꞌoge ahụ? Nꞌihi na unu maara nꞌoge ahụ, na a sị na ọ bụ ihe a pụrụ ime, unu gaara aghụpụta anya unu, tinye ya nꞌọnọdụ anya nke m, iji nyere m aka.


GALETIA 4:17
Ndị ozizi ụgha ahụ ihe banyere unu na-anụ ọkụ nꞌobi achọghị ịdọtara unu onwe ha nꞌihi ọdịmma unu. Kama ihe ha na-achọ ime bụ ka nkewa dị nꞌetiti mụ na unu, ka unu si otu a hapụ ige m ntị.


GALETIA 4:18
Ọ bụkwanụ ihe dị mma, ma ọ bụrụ na ndị mmadụ ejiri obi na-anụ ọkụ na obi zuru oke na-achọ ọdịmma unu, nke ka nke, ọ bụrụ na ha adịghị eme ya nanị mgbe m nọ nꞌetiti unu.


GALETIA 5:2
Geenụ m ntị! Mụ onwe m bụ Pọl na-agwa unu nke a. Ọ bụrụ na unu echee na obibi ugwu na idebe iwu ndị Juu ga-eme ka unu bụrụ ndị ezi omume nꞌihu Chineke, Kraịst enweghị ike ịzọpụta unu.


GALETIA 5:10
Ana m atụkwasị Onyenwe anyị obi ka ọ kpọghachite unu nꞌọnọdụ okwukwe ahụ ga-eme ka unu kwenye nꞌihe nile dị ka m si kwenye na ha. Chineke ga-atakwa onye ahụ ahụhụ, bụ onye ahụ buteere unu nsogbu a, ma na-agbalị iduhie unu.


GALETIA 5:20
Ikpere arụsị, iri amusu, ibu iro nꞌobi, na ịlụ ọgụ, ekworo na iwe, ịkpa iche iche, nkewa, ịhọ otu.


GALETIA 5:22
Ma mgbe Mmụọ Nsọ na-achị achị na ndụ anyị, ụdị ndụ a ga-apụta ìhè nꞌime anyị: ndụ ịhụnanya, na ọṅụ, na udo, na ogologo ntachi obi, na obi ọma, na ịdị mma, na ikwesị ntụkwasị obi, na


GALETIA 5:26
Mgbe anyị na-eso ụzọ a, anyị agaghị abụ ndị na-ele anya ka ndị ọzọ sọpụrụ anyị, ma ọ bụ too anyị, nꞌihi na nsọpụrụ na otuto dị otu a, na-ebute ekworo na obi ilu nꞌetiti anyị.


GALETIA 6:1
Ụmụnna m, asị na nwa Chineke ọ bụla adaba na mmehie, unu onwe unu bụ ndị Mmụọ Nsọ na-achị kwesịrị iji mmụọ nke ịdị nwayọọ na obi dị umeala nyere onye ahụ aka, ime ka ọ gazie nꞌezi ụzọ. Nꞌihi na ònye ma ihe ga-eme echi? Ònye ma onye ọ bụ nꞌetiti unu nke ga-adaba na mmehie echi?


GALETIA 6:4
Ka onye ọ bụla nꞌetiti unu ghọta ma kpebie nꞌobi ya na ihe ọ na-eme ziri ezi. Mgbe ahụ ọ ga-enwe afọ ojuju nꞌime onwe ya na ọrụ ya bụ ezi ọrụ. Ọ gaghị adịkwa mkpa na ọ ga-eji onwe ya tụnyere onye ọzọ.


GALETIA 6:13
Ndị ozizi ahụ na-ezi unu na obibi ugwu bara uru, adịghị agbalị idebe iwu ndị Juu ndị ọzọ. Ma ha chọrọ ka e bie unu ugwu, ka ha site na ya na-anya isi, na unu bụ ndị na-eso ụzọ ha.


EFESỌS 1:1
Akwụkwọ ozi a sitere nꞌaka mụ onwe m bụ Pọl, onye Chineke họpụtara ịbụ onyeozi Jisọs Kraịst. Ọ bụ unu ka m na-edere ya, unu ụmụ Chineke bi nꞌEfesọs. Ee, ọ bụ unu ka m na-edere akwụkwọ a, unu bụ ụmụ Chineke kwesịrị ntụkwasị obi.


EFESỌS 1:5
Ọ bụ rị uche ya ime anyị ụmụ ya site nꞌihe Kraịst ga-eme. Ma o mekwara ihe ndị a nile nꞌihi na ọ tọrọ ya ụtọ nꞌobi ime ya.


EFESỌS 1:6
Ka anyị site na nke a too ya nꞌihi obi ọma ya bara ụba nke ukwuu, nke o gosiri anyị, na ihuọma ya, nke o mere ka o rute anyị aka nꞌihi na anyị bụ ndị nke Jisọs Kraịst, Nwa ya ọ hụrụ nꞌanya.


EFESỌS 1:7
Lee otu obi ọma Chineke siri dị ukwuu nꞌebe anyị nọ! Nꞌihi na site nꞌọnwụ Kraịst, o mere ka anyị nwere onwe anyị. Ọ bụkwa site nꞌọnwụ Kraịst ka ọ gbaghaara anyị mmehie anyị.


EFESỌS 1:12
Ya mere, ka anyị bụ ndị buru ụzọ tụkwasị Kraịst obi, too ebube Chineke nꞌihi ihe ndị a o meere anyị.


EFESỌS 1:14
Mmụọ Nsọ nọkwa ọnọdụ dị ka ihe akaebe igosi na anyị ga-anata ihe nile Chineke kwere nkwa inye ndị ya. Mmụọ Nsọ a bụkwa ihe ga-eme ka anyị nwee obi siri ike na Chineke ga-arụzu ọrụ mgbapụta nke ndị ahụ nile bụ nke ya. Ya mere, ka anyị too ebube Chineke.


EFESỌS 1:18
Ana m arịọkwa Chineke ka o meghee obi unu ka unu hụ ìhè ya, ka unu matakwa ụdị olileanya unu nwere nꞌihi ọkpụkpọ ọ kpọrọ unu. Ana m arịọkwa Chineke ka o nyere unu aka ịmata ụdị ngọzi ndị ahụ dị ebube o kwere nkwa inye ndị ya.


EFESỌS 2:3
Ọ bụkwa nꞌetiti ndị dị otu a ka anyị jegharịrị nꞌoge gara aga, na-agbaso ọchịchọ nile nke anụ ahụ ma na-emekwa ihe ọ bụla ahụ anyị na obi anyị chọrọ. Nꞌihi na site nꞌọdịdị anyị, anyị na ndị ọzọ nọ nꞌọmuma ikpe Chineke.


EFESỌS 2:7
Chineke mere nke a igosi ịdị ukwuu nke amara ya nꞌọgbọ nile, na igosi obi ọma ya nꞌebe anyị nọ nꞌime Kraịst.


EFESỌS 2:21
Kraịst bụkwa onye na-ejikọta ụlọ obibi ahụ nile nke ọma. Ọ bụkwa ya na-eme ka o too bụrụ ụlọ dị nsọ, nke e doro iche nye Chineke.


EFESỌS 2:22
Ọ bụkwa nꞌime Kraịst ka a na-ewusi unu ike dị ka e si ewusi ndị ọzọ ike, ka unu nile bụrụ ebe obibi nke Chineke site na Mmụọ Nsọ.


EFESỌS 3:12
Ya mere, mgbe anyị bịakwutere Kraịst tukwasị obi anyị nꞌime ya, anyị nwere ike ịbịa nꞌihu Chineke na-atụghị egwu nꞌihi na anyị maara na ọ ga-anabata anyị.


EFESỌS 3:17
Ana m arịọkwa ka Kraịst mee ka obi unu bụrụ ebe obibi ya site nꞌokwukwe unu nꞌime ya. Ana m arịọkwa ka Chineke mee ka unu bụrụ ndị gbara mgbọrọgwụ nꞌime ịhụnanya Chineke.


EFESỌS 4:2
Bụrụnụ ndị dị umeala nꞌobi, ndị dị nwayọọ na ndị na-enwe ntachi obi oge nile. Sitekwanụ nꞌịhụnanya na-anabatakwa ibe unu ọ bụladị mgbe ha mejọrọ unu.


EFESỌS 4:14
Mgbe ahụ anyị agaghị adịkwa ka ụmụntakịrị ndị na-agbanwe obi ha mgbe nile banyere ihe ha kweere nꞌime ya, mgbe ha nụrụ ihe ọzọ dị iche ma ọ bụ mgbe onye ọzọ jiri aghụghọ kwuo okwu ụgha nke ga-adị ka eziokwu.


EFESỌS 4:18
Ndị obi ha jupụtara nꞌọchịchịrị. Ndị dị otu a enweghị òke na ndụ ahụ Chineke na-enye, nꞌihi na ha mechiri obi ha nꞌebe Chineke nọ. Ha adịghị aghọtakwa ụzọ ya.


EFESỌS 4:19
Ihere adịghị eme ha; ihe ọ bụla adịkwaghị emetụ ha nꞌobi. Ha enyefeela onwe ha ime ihe rụrụ arụ nile na-ajụghị ajụjụ banyere ihe ọjọọ ha na-eme.


EFESỌS 4:26
Ọ bụrụ na iwe ewee gị, emehiela site nꞌibu iro nꞌobi gị. Ewela iwe site nꞌụtụtụ ruo nꞌanyasị.


EFESỌS 4:30
Unu emela ka obi jọọ Mmụọ Nsọ bi nꞌime unu njọ. Nꞌihi na Mmụọ Nsọ bụ akara Chineke kwakwasịrị unu igosi na unu bụ nke ya. Ọ nọ dị ka ihe akaebe nke na-egosi na otu ụbọchị na-abịa mgbe Chineke ga-eme ka unu nwere onwe unu.


EFESỌS 4:31
Wepụnụ obi ilu, na obi ọjọọ na iwe nꞌetiti unu. Wepụkwanụ ise okwu na ịkọ ọnụ nꞌetiti unu.


EFESỌS 4:32
Nꞌọnọdụ ihe ndị a nile, nweenụ obi ọma nꞌebe ibe unu nọ. Gbagharanụ ibe unu dị ka Chineke sitere nꞌamara ya gbaghara unu nꞌihi na unu bụ nke Kraịst.


EFESỌS 5:19
Gosinụ ọṅụ unu site nꞌisoro ndị enyi unu ịbụ abụ ọma, na abụ nile dị iche iche e ji eto Onyenwe anyị. Bụọnụ abụ mgbe nile na-eto Onyenwe anyị nꞌobi unu.


EFESỌS 6:5
Ndị na-eje ozi, ruberenụ ndị unu na-ejere ozi isi. Jirinụ nsọpụrụ na obi ọcha jeere ha ozi dị ka a ga-asị na ọ bụ Kraịst ka unu na-ejere ozi ahụ.


EFESỌS 6:6
Ọ bụghị nanị mgbe ha nọ unu nso na-ele unu anya, kama sitenụ nꞌobi unu nile jeere ha ozi dị ka ndị ozi Kraịst.


EFESỌS 6:14
Ime nke a, meenụ ka eziokwu dịịrị unu dị ka eriri akwa nke a na-eji ekesi akwa ike. Ezi omume bụkwa ihe dị mkpa dị ka ihe agha unu ji ekpuchi obi unu.


EFESỌS 6:21
Tikikọs nwanna anyị nke anyị hụrụ nꞌanya, na onye bụkwa onye kwesịrị ntụkwasị obi nꞌọrụ Onyenwe anyị, ga-akọrọ unu ihe nile banyere ọnọdụ m nꞌebe a.


EFESỌS 6:22
Ana m ezitere ya unu nꞌihi nke a, ka o mee ka unu mata ọnọdụ anyị meekwa ka obi sie unu ike.


EFESỌS 6:24
Ka amara na ngọzi Chineke dịnyere ndị nile ji obi ọcha na-ahụ Onyenwe anyị Jisọs Kraịst nꞌanya.


FILIPAI 1:2
Ka Chineke gọzie unu nile. Ọ bụkwa ekpere m ka Chineke nna anyị, onye bi nꞌeluigwe, na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst gọzie unu nile. Ka o nyekwa unu udo zuru oke nꞌime obi unu.


FILIPAI 1:4
Nꞌime arịrịọ nile m na-arịọ ya nꞌekpere m nꞌihi unu, obi m na-ejupụta nꞌọṅụ.


FILIPAI 1:7
Ọ bụ ihe ziri ezi nꞌebe m nọ iche ụdị echiche dị otu a banyere unu nile nꞌihi na unu dị m nꞌobi. Mụ na unu esorola keta oke na ngọzi ahụ Chineke na-enye ọ bụladị mgbe m nọ nꞌụlọ mkpọrọ, na mgbe m si nꞌụlọ mkpọrọ pụta na-arụ ọrụ igbasa ozi ọma.


FILIPAI 1:8
Chineke pụrụ ịgbara m ezi ama, otu m si hụ unu nꞌanya, na otu ihe gbasara unu si na-emetụ mmụọ m, site nꞌụdị obi ebere Jisọs dị nꞌime m.


FILIPAI 1:10
Ka unu si otu a bụrụ ndị na-enwe nghọta banyere ihe dị iche nꞌetiti ihe ọma na ihe ọjọọ. Ka unu bụrụkwa ndị dị ọcha nꞌobi unu, ndị onye ọ bụla na-agaghị enwe ihe ọjọọ ha ga-ekwu megide unu, tutuu ruo ụbọchị ahụ Kraịst ga-alọghachi.


FILIPAI 1:15
Ọ bụ eziokwu na ụfọdụ nꞌime ha ji ekworo na anya ụfụ na-ezisa ozi ọma a. Ma ụfọdụ kwa na-ezisa ya site nꞌọchịchọ obi nke ziri ezi.


FILIPAI 1:16
Ndị ji obi dị ọcha na-ezisa ozi ọma ahụ na-eme ya nꞌihi na ha hụrụ m nꞌanya, ebe ọ bụ na ha maara na ọ bụ Onyenwe anyị mere ka m nọọ nꞌụlọ mkpọrọ nꞌihi ịkwali ọrụ izisa ozi ọma. Ndị ọzọ na-ezisa ozi ọma ahụ ime ka obi jọọ m njọ. Echiche ha bụ na ịga nꞌihu nke ozi ọma ha na-ekwusa ga-eme ka obi jọọ m njọ nꞌụlọ mkpọrọ karịa.


FILIPAI 1:20
Nꞌihi na olileanya m na ntụkwasị obi m bụ na Chineke agaghị ekwe ka m mee ihe ọ bụla ga-eme ka ihere mee m nꞌụzọ ọ bụla. Enwekwara m olileanya na m ga-aga nꞌihu nọdụ na njikere ikwupụta okwu na-atụghị egwu nꞌihi Kraịst, ọ bụladị ugbu a m nọ nꞌahụhụ ndị a. Aga m ekwupụta okwu ahụ dị ka m si ekwu ya nꞌoge gara aga. Aga m agakwa nꞌihu ịhụ na ndụ m bụ ihe ga-ewetara Kraịst otuto nꞌọnọdụ ọ bụla, ma ọ bụ na ndụ ma ọ bụ nꞌọnwụ.


FILIPAI 1:27
Ma nꞌọnọdụ ọ bụla m nọ, na-ebinụ ndụ ga-egosi na unu bụ ndị Kraịst nꞌezie. Ka ọ bụrụ na a sị na m mesịrị nwee ike ịbịa ịnọnyere unu, ma ọ bụ, a sị na m enweghị ike ịbịa ịnọnyere unu, akụkọ m ga na-anụ banyere unu ga-abụ nke ga-akọ otu unu si jiri otu obi guzosie ike, jikọtaa onwe unu nꞌotu, ikwusa ozi ọma Kraịst,


FILIPAI 2:1
Ugbu a, ọ bụrụ na e nwere nkasiobi ọ bụla dịrị anyị nꞌihi njikọta e jikọtara anyị na Kraịst, ọ bụrụkwa na e nwere ihe dị ka inyeaka nke si nꞌịhụnanya na-abịa, ọ bụrụkwa na ọ dị nnwekọ ọ bụla anyị na-enwekọ nꞌime Mmụọ Nsọ, ọ bụrụ na unu nwere obi ebere, jikerekwa ime ebere,


FILIPAI 2:2
meenụ ka m ṅụrịa ọṅụ nke ukwuu, site nꞌibi obi nke ịhụrịta onwe unu nꞌanya, site nꞌinwe nkwekọta nꞌihe ọ bụla, sitekwa nꞌiji otu obi, otu nzube, na otu mmụọ na-arụkọta ọrụ unu.


FILIPAI 2:12
Nꞌihi ihe ndị a, ndị enyi m, mgbe mụ na unu nọ, unu na-erube isi nꞌihe ọ bụla m gwara unu. Ugbu a kwa m na-anọghị unu nso, gbalịanụ ime ihe ndị ahụ ya na nzọpụta a zọpụtara unu so. Jirinụ ịtụ egwu na-eme ihe Chineke chọrọ, ma na-alanụ azụ nꞌihe ọ bụla pụrụ ime ka obi jọọ ya njọ nꞌebe unu nọ.


FILIPAI 2:15
Bienụ ndụ unu dị ka ụmụ Chineke, ndị a na-apụghị ịta ụta, ndị dị ọcha na ndị a na-apụghị ibo ebubo nꞌime ụwa ọjọọ a, nꞌetiti ndị gbagọrọ agbagọ, na nꞌetiti ndị nwere obi nꞌazụ. Na-enwunụ nꞌetiti ha dị ka ìhè.


FILIPAI 2:19
Ọ bụrụ na Onyenwe anyị Jisọs ekwe, aga m ezite Timoti ka ọ bịa hụ unu na mgbe na-adịghị anya. Olileanya m bụ na mgbe ọ bịasịrị lee unu lọghachi, ọ ga-akọrọ m ihe banyere unu, na ọnọdụ unu, si otu a kasie m obi.


FILIPAI 2:20
Enweghị m onye ọzọ nọ m nso, bụ onye kwesịrị ntụkwasị obi, na onye ga-akpachapụ anya banyere ọdịmma unu dị ka Timoti.


FILIPAI 2:28
Nꞌihi nke a, ọ na-anụ m ọkụ nꞌobi izite ya nꞌebe unu nọ. Nꞌihi na amaara m na ọbịbịa ọ ga-abịakwute unu ga-eme ka unu ṅụrịa ọṅụ. Ọ ga-emekwa ka ọnọdụ nchegbu m dị mfe.


FILIPAI 3:3
Nꞌihi na obibi ugwu nke elu ahụ abụghị ihe dị mkpa ime anyị ụmụ Chineke. Kama ọ bụ iji mmụọ anyị na-efe Chineke. Nke a bụkwa ihe bụ ezigbo obibi ugwu. Anyị bụ ndị Kraịst na-anya isi nꞌihe ahụ Kraịst Jisọs meere anyị, anyị ghọtakwara na anyị enweghị ike ọ bụla ịzọpụta onwe anyị.


FILIPAI 3:5
Nꞌihi na a mụrụ m nꞌezinụlọ ndị Juu, ezinụlọ si nꞌagbụrụ Benjamin pụta. E biri m ugwu nꞌụbọchị nke asatọ site na mgbe a mụrụ m, nke mere ka m bụrụ onye Juu nꞌezie. Karịsịa, eso m nꞌotu ndị Farisii, ndị ahụ ọ na-anụ ọkụ nꞌobi idebe iwu nile na omenala nile ndị Juu nwere.


FILIPAI 3:6
Igosi na m nwere ịnụ ọkụ nꞌobi dị ukwuu banyere ihe m kwenyere nꞌime ya, emesiri m nzukọ Kraịst ike, kpagbuo ndị nọ nꞌime ya. Agbalịrị m idebezu iwu ndị Juu, bụrụkwa onye a pụrụ ịkpọ onye ezi omume tozuru oke, dị ka idebe iwu ndị Juu si dị.


FILIPAI 3:7
Ma ihe ndị a nile m gụrụ dị ka ihe bara uru nꞌoge gara aga, bụụrụ m ugbu a, ihe na-abaghị uru. Ugbu a, achịfuola m ha nile, ka m nwee ike ịtụkwasị Kraịst obi, na inwe olileanya nanị nꞌime ya.


FILIPAI 3:9
Ka m nwee ike bụrụ onye e jikọtara ya na Kraịst, onye na-adịghị agụkwa onwe ya dị ka onye pụrụ ịzọpụta onwe ya site nꞌezi omume ya, ma ọ bụ site nꞌidebezu iwu Chineke. Kama ka m bụrụ onye a na-azọpụta nanị site nꞌịtụkwasị Kraịst obi. Nꞌihi na ụzọ ahụ Chineke chọrọ isi mee ka anyị na ya dịrị nꞌudo dabeere nꞌokwukwe, ọ dabeere nꞌokwukwe anyị nꞌime Kraịst nanị.


FILIPAI 4:5
Meenụ ka mmadụ nile jiri anya ha hụ na unu bụ ndị obi ọma nꞌihe nile unu na-eme. Chetanụ na ọbịbịa Onyenwe anyị dị nso.


FILIPAI 4:7
Udo Chineke, nke dị ukwuu karịa ihe ọ bụla mmadụ nwere ike ịghọta ga-eche echiche uche unu na obi unu nche nꞌime Kraịst Jisọs.


FILIPAI 4:10
Obi dị m nnọọ ụtọ nꞌihi inyeaka unu nyeere m ọzọ. Ana m etokwa Onyenwe anyị nꞌihi ya. Amaara m na ọ dị unu nꞌobi kemgbe izitere m ihe unu nwere ike, ma unu enwebeghị ohere ime ya.


FILIPAI 4:17
Ọ bụ ezie na obi na-atọ m ụtọ nꞌihi onyinye unu na-enye m, ma ihe na-enyekarị m ọṅụ nꞌobi m, bụ ncheta m na-echeta ụgwọ ọrụ zuru ezu, unu ga-anata nꞌihi obi ọma unu.


KỌLỌSI 1:6
Ozi ọma ahụ e kwusaara unu bụkwa otu ozi ọma ahụ a na-agbasa nꞌụwa nile, nke na-eweta mgbanwe na ndụ ndị nụrụ ya, dị ka o si wetara unu mgbanwe mgbe unu nụrụ ya, ghọtakwa ụdị obi ebere Chineke nwere nꞌebe ndị mmehie nọ.


KỌLỌSI 1:23
Ihe ọzọ Chineke chọrọ nꞌaka unu bụ ka unu nọgide bụrụ ndị guzosiri ike nꞌihe unu kwenyere, na ndị guzosiri ike nꞌime Onyenwe anyị, ndị ozi ọma ahụ doro anya nke ọma. Ozi ọma ahụ nke kwuru na Jisọs nwụrụ nꞌihi unu. Hụnụ na unu esiteghị nꞌozi ọma a wezuga onwe unu, ma ọ bụ kwụsị ịtụkwasị ya obi ịzọpụta unu. Nke a bụ ozi ọma ahụ e wetaaara unu nke a na-ezisakwa nꞌụwa nile. Mụ onwe m bụ Pọl, jikwa ọṅụ na-agwa ya ndị ọzọ.


KỌLỌSI 1:27
Ọ bụkwa ọchịchọ Chineke ime ka ndị mba ọzọ mata ịba ụba na ịdị ebube nke nzube ya dị omimi. Ihe omimi ahụ bụkwa nke a, na obibi nke Kraịst bi nꞌime unu, bụ nanị olileanya unu nwere iketa oke nꞌebube Chineke.


KỌLỌSI 2:6
Ya mere, dị ka unu si nabata Kraịst Jisọs kwere na ya ịzọpụta unu, sikwanụ otu a tụkwasị ya obi inyere unu aka na nsogbu unu nke ụbọchị nile. Na-ebinụ ndụ unu nꞌime ya.


KỌLỌSI 2:11
Mgbe unu bịakwutere Kraịst o mere ka unu nwere onwe unu site nꞌike ọchịchọ ọjọọ nke anụ ahụ jupụtara na mmehie. O meghị ka unu nwere onwe unu site nꞌibi unu ugwu nke elu ahụ, kama o mere ya site nꞌobibi ugwu nke ime mmụọ, ime mkpụrụ obi unu baptizim.


KỌLỌSI 2:23
Ọ bụ ezie na iwu ndị a na-adị ka ihe dị mma, nꞌihi na onye na-edebe ha kwesịrị itunyezi uche ya idebe ha, bụrụkwa ihe na-ewetara mmadụ obi umeala na ihe na-enye ahụ anyị ahụhụ, ma o nweghị uru ha bara nꞌihe gbasara inwe mmeri nꞌebe echiche ọjọọ na ọchịchọ ọjọọ mmadụ dị. Ihe iwu a na-eme bụ nanị ime ka mmadụ na-afụli onwe ya elu.


KỌLỌSI 3:1
Ebe e mere ka unu bụrụ ndị so Kraịst bilie nꞌọnwụ, tụkwasịnụ obi unu nꞌakụ na ọṅụ dị nꞌeluigwe ebe Kraịst nọ nꞌocheeze ya nꞌakụkụ Chineke.


KỌLỌSI 3:2
Ka echiche gbasara eluigwe ju unu obi. Unu atụfukwala oge ichegbu onwe unu banyere ihe dị nꞌụwa.


KỌLỌSI 3:8
Ma ugbu a bụ oge iwezụga ihe ndị a na ndụ unu: iwe, na ọnụma, na obi ọjọọ, na nkwulu nile, ya na okwu ihere nile na-esi unu nꞌọnụ na-apụta.


KỌLỌSI 3:12
Ebe Chineke họpụtara unu mee unu ndị nke ya site nꞌinye unu ndụ ọhụrụ a, ebe ọ bụkwa nꞌihi na ọ hụrụ unu nꞌanya ka o ji họpụta unu, bụrụnụ ndị nwere obi ebere, ndị obi ọma, ndị dị nwayọọ, na ndị na-enwe ogologo ntachi obi.


KỌLỌSI 3:13
Jirinụ obi dị umeala na-anagide mmejọ ibe unu mejọrọ unu, ma gbagharakwa ha. Chetanụ na Chineke nꞌonwe ya gbaghaara unu, ya mere gbaghakwaranụ ibe unu.


KỌLỌSI 3:15
Ka udo ahụ Chineke na-enye bụrụ ihe ga-adị nꞌobi unu, ma pụtakwa ìhè na ndụ unu. Nꞌihi na ebe unu bụ akụkụ nke otu anụ ahụ ahụ, Chineke kpọrọ unu ka unu nọdụ nꞌudo. Mgbe nile kwa nọọnụ na-ekele Chineke ekele.


KỌLỌSI 3:16
Kwerenụ ka okwu Kraịst nwee ọnọdụ nꞌime unu, ime unu ndị bara ụba nꞌamamihe. Zikwanụ ndị ọzọ okwu amamihe a. Na-abụnụ abụ ọma na abụ na-ebuli mmụọ elu. Na-abụkunụ Onyenwe anyị abụ ndị a site nꞌobi jupụtara nꞌekele.


KỌLỌSI 3:17
Ka ihe nile unu na-eme, ya na okwu unu na-ekwu, bụrụ nke e mere na nke e kwuru site nꞌaha Onyenwe anyị Jisọs. Jirikwanụ obi ekele bata nꞌihu Chineke bụ Nna anyị site nꞌaha Kraịst.


KỌLỌSI 3:19
Ma unu ndị bụ di, unu enwela obi ilu nꞌebe nwụnye unu nọ, kama na-ahụnụ ha nꞌanya.


KỌLỌSI 3:21
Unu bụ nne na nna, unu emela ihe ga-ebutere ụmụ unu iwe, ka ha ghara inwe obi ụfụ nꞌebe unu nọ.


KỌLỌSI 3:22
Ndị bụ ohu, na-asọpụrụnụ nna unu ukwu nꞌihe nile. Na-emenụ ihe ha gwara unu mee, ọ bụghị nanị mgbe ha nọ na-ele unu anya, kama werenụ obi unu nile jeere ha ozi, nꞌihi na unu bụ ndị kwesịrị ime ihe ga-atọ Onyenwe anyị ụtọ.


KỌLỌSI 3:23
Ihe ọ bụla unu na-eme, werenụ obi unu nile mee ya. Ka ọ dị ka ọ bụ Chineke ka unu na-arụrụ ya, ọ bụghị dị ka unu na-arụrụ ya mmadụ.


KỌLỌSI 4:1
Unu ndị nwe odibo, werenụ ezi obi na obi dị umeala na-emeso odibo unu mmeso. Chetakwanụ na ọ dị onye ka unu ukwu, Onyenwe unu, nke bi nꞌeluigwe, onye nọkwa na-ele unu anya.


KỌLỌSI 4:7
Tikikọs, ezi nwanna anyị, onye kwesịkwara ntụkwasị obi nꞌọrụ Onyenwe anyị, onye anyị na ya na-ejekọ ozi nꞌọrụ Onyenwe anyị, ga-akọrọ unu akụkọ nile banyere m.


KỌLỌSI 4:9
Ezi nwanna anyị nwoke bụ Onisimọs, onye kwesịrị ntụkwasị obi, onye bụkwa otu nꞌime unu, so ya na-abịa. Ha ga-agwa unu ihe nile na-eme nꞌebe a.


KỌLỌSI 4:10
Aristakọs, onye mụ na ya nọ nꞌụlọ mkpọrọ, na-ekele unu. Mak nwanne Banabas na-ekelekwa unu. Dị ka m kwuru na mbụ, jirinụ obi unu nile nabata Mak mgbe ọ bịarutere nꞌebe unu nọ.


KỌLỌSI 4:11
Jisọs, onye aha ya ọzọ bụ Jọstus na-ekelekwa unu. Mmadụ atọ ndị a bụ nanị ndị Juu mụ ha na-arụkọ ọrụ alaeze Chineke nꞌebe a. Ha na-eme nnọọ nke ọma, na-enye m obi ụtọ.


1 TESALỌNAIKA 1:6
Nke a mere unu ji bụrụ ndị na-eso ụzọ anyị na ndị na-eso ụzọ Onyenwe anyị. Nꞌihi na unu jiri ọṅụ Mmụọ Nsọ na-enye nabata ozi ọma anyị, na-ajụghị ajụjụ banyere ọnwụnwa na obi ọjọọ o wetaara unu.


1 TESALỌNAIKA 2:2
Unu maara ụdị ahụhụ anyị tara na Filipai tupuu anyị abịakwute unu. Unu makwaara ụdị ahụhụ anyị tara na Tesalonaịka mgbe anyị bịaruru. Ma Chineke nyekwara anyị obi ike ikwukwara unu ozi ọma ahụ, ọ bụladị mgbe anyị maara na ndị iro gbara anyị gburugburu.


1 TESALỌNAIKA 2:3
Dị ka unu ga-echeta, anyị agwaghị unu ihe ọ bụla site nꞌọchịchọ nke na-adịghị ọcha, ma ọ bụ site nꞌobi nke aghụghọ dị. Kama anyị gwara unu ihe nile hoo haa, nꞌụzọ guzo ọtọ, nke eziokwu.


1 TESALỌNAIKA 2:4
Nꞌihi na anyị na-ekwu okwu anyị dị ka ndị ozi Chineke họpụtara, ndị ọ tụkwasịrị obi ikwu eziokwu, tinye ọrụ ozi ọma a nꞌaka. Anyị adịghị agbalị ime ihe ga-atọ ndị mmadụ ụtọ, kama anyị chọrọ ime ihe ga-atọ Chineke ụtọ, Chineke ahụ na-enyocha echiche obi zoro ezo.


1 TESALỌNAIKA 3:2
Anyị zipụrụ Timoti, nwanna anyị, onye anyị na ya na-arụkọ ọrụ ọma Jisọs Kraịst, ka ọ bịakwute unu, kasie unu obi, nyekwara unu aka nꞌokwukwe unu.


1 TESALỌNAIKA 3:7
Nꞌihi nke a, ụmụnna anyị, anyị abụrụla ndị a kasịrị obi nke ukwuu ọ bụladị nꞌime mkpagbu nile nke anyị nọ nꞌime ya, nꞌihi iguzosi ike nke unu guzoro nꞌokwukwe unu.


1 TESALỌNAIKA 3:10
Nꞌihi na ehihie na abalị nile, na-esepụghị aka, ka anyị na-arịọ Chineke arịrịọ banyere unu site na ntọ ala obi anyị. Arịrịọ anyị na-arịọ ya bụ ka o mee ka anyị hụ unu anya ọzọ. Ka anyị nwee ike inyere unu aka nꞌokwukwe unu.


1 TESALỌNAIKA 3:13
Nke a ga-eme ka Chineke Nna anyị nye unu obi siri ike, nke dị nsọ, na nke na-enweghị ntụpọ ọ bụla, ka unu nwee ike iguzo nꞌihu ya dị ka ndị a na-apụghị ịta ụta nꞌụbọchị ahụ Jisọs na ndị ya nile ga-alọghachi.


1 TESALỌNAIKA 4:11
Jisienụ ike ibi obi nke ịdị nwayọọ, na ibi obi nke ilezi ọrụ nke aka unu anya nke ọma, dị ka anyị gwara unu.


1 TESALỌNAIKA 4:12
Ka ndị na-abụghị ndị Kraịst sọpụrụ unu, ma tụkwasịkwa unu obi. Ka ọ hapụ ịdị mkpa na unu ga-elekwasị ndị ọzọ anya inyere unu aka, inye unu ego, ma ọ bụ igbo mkpa unu.


1 TESALỌNAIKA 4:18
Ya mere, werenụ okwu ndị a, na-akasịrịta ibe unu obi mgbe nile.


1 TESALỌNAIKA 5:11
Ya mere, na-akasịrịtanụ onwe unu obi. Na-emekwanụ ihe ọ bụla ga-ewuli ibe unu elu dị ka unu si eme.


1 TESALỌNAIKA 5:14
Ma ugbu a, anyị na-arịọ unu, ụmụnna anyị, ka unu dọọ ndị ahụ nile aka na ntị, bụ ndị na-adịghị agazi ije ha, ha na ndị umengwụ. Kasienụ ndị ụjọ na-atụ obi. Lekọtazienụ ndị na-adịghị ike. Jirinụ ntachi obi na-anagideritanụ ibe unu nꞌime ịhụnanya.


1 TESALỌNAIKA 5:23
Ka Chineke nꞌonwe ya, onye bụ isi udo, mee ka unu dị nsọ nꞌihe nile. Ka Onyenwe anyị debezuo mmụọ unu na mkpụrụ obi unu na anụ ahụ unu nsọ, na-enweghị ntụpọ ọ bụla ruo ụbọchị ọbịbịa Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.


1 TESALỌNAIKA 5:24
Onye ahụ kpọbatara anyị nꞌokwukwe a ga-emezu ihe ndị a, nꞌihi na ọ bụ onye kwesịrị ntụkwasị obi.


2 TESALỌNAIKA 1:4
Nꞌihi nke a, anyị na-eji unu na-anya isi nꞌetiti nzukọ Kraịst nile. Anyị na-akọrọ ha otu unu si jiri ntachi obi nọgidesie ike nꞌime nsogbu nile dakwasịrị unu, na otu unu si nwee okwukwe dị ukwuu nꞌime Chineke, ọ bụladị nꞌetiti oke mkpagbu a na-akpagbu unu.


2 TESALỌNAIKA 1:12
Mgbe ahụ, mmadụ nile ga-eto aha Onyenwe anyị mgbe ha ga-ahụ ọrụ ọ rụpụtara nꞌime unu. Nsọpụrụ dị oke elu nke unu ga-enwe ga-abụ na unu bụ ndị Chineke. Ọ bụ obi ebere Chineke anyị na obi ebere Onyenwe anyị Jisọs mere ka ihe dị otu a rute unu aka.


2 TESALỌNAIKA 2:11
Nꞌihi ọjụjụ nke ha jụrụ eziokwu ahụ, Chineke ga-ahapụ ha ka e duhie ha, ka ha jiri obi ha nile nabata okwu ụgha ndị a.


2 TESALỌNAIKA 2:16
Ka Onyenwe anyị Jisọs Kraịst nꞌonwe ya, na Chineke Nna, onye sitere nꞌobi ebere ya hụ anyị nꞌanya, nye anyị nkasịobi na olileanya ebighị ebi nke anyị na-ekwesịghị iketa.


2 TESALỌNAIKA 2:17
Ya nye unu nkasịobi na ụdị ike ahụ ga-enyere unu aka ịrụ ọrụ ọma, na ikwu okwu ọma.


2 TESALỌNAIKA 3:3
Ma Chineke bụ onye kwesịrị ntụkwasị obi. Ọ ga-eme ka unu dịrị ike. Ọ ga-echebekwa unu ka unu hapụ ịdaba nꞌaka ekwensu.


2 TESALỌNAIKA 3:4
Anyị nwere olileanya na ntụkwasị obi nꞌime Onyenwe anyị Jisọs Kraịst na unu na-eme ihe ahụ nile anyị ziri unu, na unu ga-agakwa nꞌihu na-eme ha.


2 TESALỌNAIKA 3:5
Ka Onyenwe anyị duzie unu ịghọta ịhụnanya Chineke nwere nꞌebe unu nọ. Ee, ka o duziekwa unu ịghọta ụdị ntachi obi ahụ na-esite nꞌebe Kraịst nọ abịa.


2 TESALỌNAIKA 3:12
Anyị na-enye ndị dị otu a iwu, na-adụsịkwa ha ọdụ ike site nꞌaha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, sị ha wetuo obi ha ala rụsie ọrụ ha ike. Ka ha riekwa nri ha ji aka ha rụpụta.


1 TIMỌTI 1:2
Timoti ezi nwa m dị ka okwukwe anyị nwere nꞌime Onyenwe anyị si dị. Ka Chineke Nna na Kraịst Onyenwe anyị gosi gị obi ọma ya. Ya meekwara gị ebere, nyekwa gị udo nke obi na nke mmụọ.


1 TIMỌTI 1:5
Ihe m chọrọ ịhụ bụ ka ụmụ Chineke nile jupụta nꞌịhụnanya nke na-esite nꞌobi dị ọcha. Achọkwara m ịhụ na ha nwere akọnuche zuru oke, na okwukwe siri ike, nke aghụghọ na-adịghị.


1 TIMỌTI 1:9
Ma emeghị iwu ahụ nꞌihi anyị ndị a zọpụtara. Kama e mere ya nꞌihi ndị ahụ na-emebi iwu, ndị na-akpọ Chineke asị, ndị ahụ naenupụ isi nꞌobi ha megide Chineke, ndị mmehie, na ndị obi ha na-adịghị ọcha, ndị ahụ na-egbu nne na nna ha, na ndị na-egbu mmadụ ibe ha.


1 TIMỌTI 1:12
Ana m ekele Kraịst Jisọs Onyenwe anyị ekele, onye na-enye m ike ikwusa ozi ọma. Ana m ekelekwa ya ekele nꞌihi na ọ gụrụ m dị ka onye e kwesịrị ịtụkwasị obi mgbe ọ họpụtara m ijere ya ozi.


1 TIMỌTI 1:14
Ma lee ka obi ọma Onyenwe anyị si dị ukwuu, nꞌihi na o gosiri m ụzọ m ga-esi tụkwasị ya obi, na otu ịhụnanya Kraịst ga-esi jupụta m obi.


1 TIMỌTI 1:15
Okwu a bụ okwu e kwesịrị ịtụkwasị obi. Ọ na-agụkwa m ka onye ọ bụla mata ya nke ọma, ma kwerekwa ya, na Kraịst Jisọs bịara nꞌụwa ịzọpụta ndị mmehie, nke mụ onwe m bụ onyeisi ha.


1 TIMỌTI 1:16
Ma Chineke meere m ebere ime ka Kraịst Jisọs were m gosi ndị ọzọ otu o si bụrụ onye ogologo ntachi obi nꞌebe ndị ajọ omume nọ, ka m bụrụ ihe àma nye ndị ọzọ na ha onwe ha nwekwara ike inweta ndụ ebighị ebi.


1 TIMỌTI 2:8
Nꞌihi nke a, achọrọ m ka ndị ikom nile nọ nꞌebe nile, ndị aka ha dị ọcha, na ndị aka ha na-ejupụtaghị na mmehie, ndị naebughị iro nꞌobi na ndị na-adịghị arụ ụka, ka ha chilie aka ha elu kpọkuo Chineke nꞌekpere.


1 TIMỌTI 2:9
Achọkwara m ka ndị inyom chọọ onwe ha mma nꞌụzọ uche zuru oke, nꞌihe gbasara uwe ha na-eyi na omume ha. Ihe e kwesịrị iji mata ndị inyom Kraịst abụghị otu ha si kpaa isi ha, ma ọ bụ ụdị uwe mara mma ha na-eyi ma ọ bụkwanụ ụdị ihe olu ma ọ bụ mgba nꞌaka ha na-eyi, kama ọ bụ ụdị ndụ ha na-ebi. Ndụ obi ọma na ịdị mma.


1 TIMỌTI 2:11
Ndị inyom kwesịkwara iji obi dị umeala na obi dị nwayọọ gee ntị mụtakwa ihe mgbe a na-ezi ihe.


1 TIMỌTI 3:1
Okwu ahụ bụ okwu anyị kwesịrị ịtụkwasị obi nke na-asị na nwoke ọ bụla chọrọ ịbụ ụkọchukwu na-achọ ezi ọrụ.


1 TIMỌTI 3:2
Ya mere, onye na-achọ ụdị ọrụ a aghaghị ịbụ ezi mmadụ, onye mmadụ nile na-enweghị ike ikwujọ. Ọ ga-enwe nanị otu nwụnye. Ọ ghaghị ịbụkwa onye na-arụ ọrụ ọma. Ọ ghaghị ịbụ onye ọ na-atọ ụtọ ịnabata ndị ọbịa nꞌụlọ ya, bụrụkwa onye maara akwụkwọ nsọ, nwee ike izi ihe. Ọ gaghị abụ onye na-aṅụbiga mmanya oke, onye na-ese okwu, kama ọ ga-abụ onye dị nwayọọ na onye obi ọma. Ọ gaghị abụ onye hụrụ ego nꞌanya.


1 TIMỌTI 3:8
Otu ahụ kwa, ndị a họpụtara ijere chọọchị ozi aghaghị ịbụ ndị omume ha dị mma na ndị kwesịrị ntụkwasị obi. Ha agaghị abụ ndị na-aṅụbiga mmanya oke na ndị hụrụ ego nꞌanya.


1 TIMỌTI 3:9
Ha ga-abụ ndị ji obi ọcha na-ejidesi eziokwu nke okwukwe anyị ike.


1 TIMỌTI 3:10
Tupuu a họpụta ha ịrụ ọrụ a a ga-ebu ụzọ nye ha ọrụ ọzọ dị iche nꞌime chọọchị iji nwapụta ike ije ozi ha na ikwesị ntụkwasị obi ha. Ọ bụrụ na ha agafee ule ahụ, mgbe ahụ a ga-eme ha ndị na-eje ozi na chọọchị.


1 TIMỌTI 3:11
Nwụnye ndị a ga-enye ọrụ a kwesịrị ịbụ ndị nwere ezi agwa, ndị a na-asọpụrụ nꞌime chọọchị, na ndị na-adịghị akpa asịrị, ndị kwesịrị ntụkwasị obi, ndị na-adịghị aṅụbiga mmanya oke.


1 TIMỌTI 4:4
Ihe nile Chineke kere dị mma, ọ dịkwaghị ihe oriri ọ bụla anyị na-ekwesịghị iri ma ọ bụrụ na anyị ji obi ụtọ na ekele nara ya,


1 TIMỌTI 5:4
Kama ọ bụrụ na nwanyị ọ bụla di ya nwụrụ nwere ụmụ, ma ọ bụ ụmụ ụmụ, ndị a bụ ndị kwesịrị ibu mkpa ha. Nꞌihi na anyị kwesịrị isite nꞌụlọ anyị gosi obi ọma anyị inyere ndị mụrụ anyị aka. Nꞌihi na omume dị otu a na-atọ Chineke ụtọ.


1 TIMỌTI 5:6
Ma nwanyị di ya nwụrụ nke weere onwe ya nyefee nꞌaka ịgbaso ihe na-eme ya obi ụtọ bụ rịị onye nwụrụ anwụ, ọ bụ ezie na ọ ka dị ndụ.


1 TIMỌTI 6:5
Ndị a hụrụ irụ ụka nꞌanya, ndị mmehie kpuchiri obi, amaghị otu e si ekwu eziokwu. Nꞌebe ndị dị otu a nọ, ozi ọma a bụ ụzọ dị mfe ha si akpata ego. Si nꞌebe ha nọ wezuga onwe gị.


1 TIMỌTI 6:6
Ị chọrọ ịbụ onye nwere akụ hie nne? Lee na akụ i nwere dị ukwuu, ma ọ bụrụ na ị bụ onye nwere obi ụtọ na onye na-eme ezi ihe.


1 TIMỌTI 6:10
Nꞌihi na ịhụ ego nꞌanya bụ nzọ ụkwụ mbụ nke ime ihe ọjọọ nile dị iche iche. Ụfọdụ ndị hụrụ ego nꞌanya, ndị na-achọsi ya ike, esitela nꞌebe Chineke nọ wezuga onwe ha, si otu a tinye onwe ha nꞌọtụtụ ọnọdụ na-ewetara ha obi ọjọọ na iru uju.


1 TIMỌTI 6:11
Timoti, gị onwe gị bụ onye nke Chineke, gbanarị ihe ọjọọ ndị a nile, ma rụsie ọrụ ike ịgbaso ezi omume na ihe dị mma. Mụta ịtụkwasị Chineke obi na ịhụ ndị ọzọ nꞌanya, na inwe ogologo ntachi obi na ịdị nwayọọ.


1 TIMỌTI 6:17
Gwa ndị nile nwere akụ hie nne ka ha ghara ịnya isi. Gwakwa ha ka ha ghara ịtụkwasị obi ha nꞌego ha nke ga-agwụ mgbe nwa oge gafere. Kama gwa ha ka ịnya isi ha, na ntụkwasị obi ha, dịrị na Chineke dị ndụ, onye naenyeju mmadụ nile ihe na-akpa ha, nke ga-eme ka ha nile ṅụrịa ọṅụ mgbe nile.


1 TIMỌTI 6:18
Gwa ndị ahụ nile nwere ego ka ha jiri ego ha rụọ ọrụ ọma. Ha kwesịrị ịbụ ndị bụ ọgaranya nꞌịrụ ọrụ ọma, na iji obi ụtọ na-enyere ndị nọ na mkpa aka. Gwa ha ka ha nọọ na njikere mgbe nile ikenye ndị ọzọ ihe nile Chineke nyere ha.


2 TIMỌTI 1:2
Ọ bụ gị nwoke m hụrụ nꞌanya Timoti, ezi nwa m, ka m na-edere akwụkwọ a. Ka Chineke Nna, na Kraịst Jisọs Onyenwe anyị, wụkwasị gị obi ebere na amara ya na udo ya.


2 TIMỌTI 1:5
Amatara m ụdị ntụkwasị obi i nwere nꞌime Onyenwe anyị, ụdị ntụkwasị obi ahụ buru ụzọ dịrị nꞌime nne gị Yunaịsi, na nꞌime nne nne gị Lọịsi. Enwekwara m olileanya na ị na-atụkwasịkwa Onyenwe anyị obi ugbu a karia.


2 TIMỌTI 1:9
Ọ bụ Chineke zọpụtara anyị, kpọbata anyị nꞌọrụ ya dị nsọ. Ọ bụghị nꞌihi na anyị kwesịrị ka a kpọọ anyị, kama ọ bụ rịị nzube ya ịkpọ anyị tupuu a tọọ ntọ ala ụwa a, nꞌihi na ọ chọrọ isite nꞌihe ọ ga-emere anyị gosi anyị ịhụnanya ya na obi ọma ya, na amara ya site na Jisọs Kraịst.


2 TIMỌTI 1:10
Ugbu a o meela ka ihe nile o zubere ime nꞌobi ya pụta ìhè site nꞌọbịbịa nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, onye lara ike nke ọnwụ nꞌiyi zi anyị ụzọ anyị gaesi nwee ndụ ebighị ebi site nꞌịtụkwasị ya obi.


2 TIMỌTI 1:12
Ọ bụkwa nꞌihi nke a ka m ji naahụ ahụhụ ndị a nꞌime ụlọ mkpọrọ nꞌebe a, ma nꞌeziokwu, ihere adịghị eme m, nꞌihi na amaara m onye m naatụkwasị obi, amakwaara m nke ọma, na o nwere ike ichebe ihe nile m nyere ya nꞌaka idebe tutuu ruo ụbọchị ahụ ọ ga-alọghachi.


2 TIMỌTI 2:2
Nꞌihi na ị ghaghị izi ndị ọzọ ihe ahụ nile gị na ndị ọzọ nụrụ site nꞌọnụ m. Zi ndị kwesịrị ntụkwasị obi eziokwu ahụ, ndị nwekwara ike izi ndị ọzọ ihe ndị a.


2 TIMỌTI 2:11
Ihe na-enye m nkasịobi bụ eziokwu a, na ọ bụrụ na anyị ahụọ ahụhụ nwụọ nꞌihi Kraịst, nke a na-egosi na anyị amalitelarị isoro Kraịst na-adị ndụ nꞌeluigwe.


2 TIMỌTI 2:13
Ma ọ bụrụ na anyị adaa mba, nọọ nꞌọnọdụ nke enweghị okwukwe ọ bụla, ya onwe ya na-anọgide bụrụ onye anyị kwesịrị ịtụkwasị obi, na onye ga-enyere anyị aka. Ọ gaghị agọnarị anyị, nꞌihi na anyị bụ akụkụ anụ ahụ ya, ọ ga-emezukwa nkwa ya nile o kwere anyị.


2 TIMỌTI 2:17
Nꞌihi na okwu ndị a bụ okwu na-eweta obi ọjọọ. Ha dị ka nsi nke na-egbu mmadụ. Haimenaus na Filetus, ndị hụrụ ịrụ ụka nꞌanya, bụ ndị na-ekwu ụdị okwu ndị a.


2 TIMỌTI 2:22
Gbanarị ihe ọ bụla na-etinye ụdị echiche ọjọọ nke ụmụ okorọbịa naenwe nꞌime gị. Kama nọọ nso ihe ọ bụla ga-eme gị ịchọ ime ezi ihe. Bụrụ onye nwere okwukwe na ịhụnanya na onye mmekọrịta nke ya ndị hụrụ Onyenwe anyị nꞌanya na ndị nwere obi ọcha na-atọ ụtọ.


2 TIMỌTI 2:24
O kwesịkwaghị ka ụmụ Chineke bụrụ ndị na-ese okwu ma ọ bụ ndị na-alụ ọgụ. Kama ha ga-abụ ndị dị nwayọọ na ndị ji ntachi obi na-ezi ndị jehiere ụzọ ihe.


2 TIMỌTI 2:25
Jiri obi dị nwayọọ mgbe ị na-ezi ndị naadịghị agbaso ụzọ eziokwu ahụ ihe. Nꞌihi na ọ bụrụ na i jiri obi dị nwayọọ na nsọpụrụ gwa ha okwu, ha nwere ike site nꞌinyeaka Chineke chegharịa, site nꞌihe na-abụghị eziokwu kwere nꞌihe bụ eziokwu.


2 TIMỌTI 3:2
Nꞌihi na ndị mmadụ ga-abụ ndị na-ahụ nanị onwe ha nꞌanya, na ndị na-ahụ ego nꞌanya. Ha ga-abụ ndị mpako, na ndị na-anya isi, ndị na-ekwulu Chineke, ndị na-adịghị asọpụrụ ndị mụrụ ha, ma ọ bụ ikele ha ekele, na ndị na-adịghị ọcha nꞌobi ha.


2 TIMỌTI 3:3
Ndị na-enweghị ịhụnanya nꞌobi ha, ndị na-enweghị obi mgbaghara, ndị nkwutọ, ndị okwu na ụka na-atọ ụtọ, ndị na-agha ụgha mgbe nile, ndị na-eme omume dị ka anụ ọhịa, na ndị ihe ọma na-adịghị atọ ụtọ.


2 TIMỌTI 3:6
Ụfọdụ nꞌime ha bụ ndị na-abanye nꞌime ụlọ ndị mmadụ na-eduhiekwa ụmụ nwanyị na-enweghị uche, ndị ibu mmehie ha na-anyịgbu, na ndị a pụrụ iduhie nꞌihi ọtụtụ ihe ọjọọ na-agụ mkpụrụ obi ha agụụ. Ọ bụ ụdị ụmụ nwanyị a ka ha na-ezi ozizi ọhụrụ ha.


2 TIMỌTI 3:8
Dị ka Jenas na Jembaras si lụso Mosisi ọgụ, otu a ka ndị a na-alụsokwa eziokwu ahụ ọgụ. Ila bụ ndị nwere obi rụrụ arụ, na ndị ndụ ha mere ka ha bụrụ ndị a jụrụ ajụ nꞌebe okwukwe anyị dị.


2 TIMỌTI 3:10
Ma gị onwe gị amatala omume m, matakwa na adịghị m ka ha. Ị maara ihe m kweere, na ụzọ m si ebi ndụ m, na ihe m chọrọ. Ị maara ụdị okwukwe m nwere nꞌime Kraịst na ahụhụ m nile. Ị maara ịhụnanya m nwere nꞌebe ị nọ, na ntachi obi m.


2 TIMỌTI 3:14
Ma gị onwe gị, nọgidesie ike nꞌime eziokwu ahụ e ziri gị. Nọgidesie ike nꞌime ha, nꞌihi na gị onwe gị maara na ha bụ eziokwu. Ndị ziri gị eziokwu a bụkwa ndị i kwesịrị ịtụkwasị obi.


2 TIMỌTI 3:15
Ị maara na ọ bụ site nꞌoge ị bụ nwantakịrị ka e ji zi gị ihe e dere nꞌakwụkwọ nsọ. Ọ bụ ihe ndị a nyere gị uche ịnata nzọpụta Chineke site na ntụkwasị obi na okwukwe i nwere nꞌime Kraịst Jisọs.


2 TIMỌTI 4:2
kwusaa okwu Chineke mgbe nile, mgbe ọ bụlạ i nwere ohere, mgbe a naanabata ya na mgbe a na-adịghị anabata ya, mgbe o kwesịrị ekwesị; na mgbe ọ na-ekwesịghị ekwesị, na-egosi ndị mmadụ ajọ omume ha, na-abara ha mba mgbe o kwesịrị ka a baara ha mba. Na-agba ha ume ka ha mee ezi ihe, ma jiri ntachi obi na-enyeju ha okwu Chineke afọ.


2 TIMỌTI 4:7
Alụọla m ọgụ ukwu na nke nta nꞌihi Onyenwe m. Nꞌime ha nile kwa, edebeziela m onwe m nye ya dị ka onye e kwesịrị ịtụkwasị obi. Ugbu a oge ahụ ezuola mgbe m gaakwụsị ịlụ ọgụ ma zuru ike.


TAITỌS 1:8
Ha ga-abụ ndị na-anabata ndị ọbịa, na ndị hụrụ ihe ọma nꞌanya. Ha ga-abụ ndị nwere uche, ndị dị ọcha nꞌobi ha, ndị dị nsọ, na ndị isi zuru oke.


TAITỌS 1:12
Ọ bụ otu onye nꞌime ha, onye bụkwa onye amụma ha kwuru okwu banyere ha sị, “Ndị Kriit nile bụ ndị ụgha. Ha kwara obi nꞌazụ dị ka anụ ọhịa jọrọ njọ. Ha bụ ndị umengwụ nwere akpịrị ogologo.”


TAITỌS 1:15
Onye ọ bụla obi ya dị ọcha na-ahụ nanị ihe dị mma na ihe dị ọcha nꞌihe nile. Ma onye ahụ obi ya na-adịghị ọcha, nke na-adịghị atụkwasị onye ọ bụla obi, ọ bụ nanị ihe ọjọọ ka ọ na-ahụ nꞌihe nile. Nꞌihi na obi ruru unyi, nke na-ekweghị ekwe, na-eme ka ihe nile ọ na-ahụ bụrụ nanị ihe rụrụ arụ.


TAITỌS 2:2
Gwa ndị agadi nwoke ka ha nwee anya udo, ka ha nwee akọnuche zuru oke, ka ha bụrụ ndị kwesịrị nsọpụrụ, ndị okwukwe ha siri ike, ndị na-ahụ ibe ha nꞌanya, na ndị nwekwara ntachi obi.


TAITỌS 2:5
Ka ha bụrụkwa ndị akọnuche ha zuru oke, ndị dị ọcha nꞌobi, ndị bụ ezi nwụnye na-edozi ezinụlọ di ha, ndị na-edo onwe ha nꞌokpuru di ha, ime ka onye ọ bụla ghara ikwulu ozi ọma Chineke.


TAITỌS 2:10
Gwa ha ka ha hapụ izu ohi, kama ka ha gosi na ha bụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi. Nꞌụzọ dị otu a, ha ga-eme ka ndị mmadụ chọọ ikwere nꞌOnyenwe anyị na Chineke anyị.


TAITỌS 3:3
Nꞌihi na mbụ, anyị bụ ndị nzuzu, ndị na-enupụ isi, na ndị na-enweghị uche. Anyị bụ ohu agụụ ihe ọjọọ na ihe ụtọ dị iche iche. Anyị biri ndụ obi ọjọọ, na ekworo, na ịkpọrịta onwe anyị asị.


TAITỌS 3:4
Ma mgbe ịhụnanya na obi ọma Chineke Onye nzọpụta anyị pụtara ìhè,


TAITỌS 3:5
ọ zọpụtara anyị. Ma ọ zọpụtaghị anyị nꞌihi ọrụ ọma anyị rụrụ, kama ọ zọpụtara anyị nanị site nꞌobi ebere ya na ọmiko ya. Ọ sachapụrụ mmehie anyị, nyekwa anyị ọṅụ ọhụrụ nke ya na Mmụọ Nsọ bi nꞌime anyị so.


TAITỌS 3:7
O sitekwara nꞌobi ebere ya dị ukwuu gụọ anyị na ndị ga-eketa oke na ndụ ebighị ebi ahụ ọ na-enye. Anyị naelekwa anya ọbịbịa oge ahụ anyị gaanata ya.


FAILIMON 1:7
Ịhụnanya gị na-enye mụ onwe ọṅụ nke nkasịobi, ezi nwanna m Faịlimọn, nꞌihi na e sitela nꞌobi ọma gị zụọ ọtụtụ ụmụ Chineke.


FAILIMON 1:12
Ana m eme ka ọ laghachikwute gị. Ma mgbe ọ na-alọghachikwute gị achọrọ m ka ị mata na mkpụrụ obi m so ya na-alọta.


FAILIMON 1:14
Ma otu ọ dị, ekpebiri m na ebe ọ bụ na ị maghị ihe ọ bụla banyere ya agaghị m ejide ya. Achọghị m ka i nyere m aka nꞌihi na a kwagidere gị, kama ọ dị mma ka o si gị nꞌobi pụta.


FAILIMON 1:16
Ugbu a, ọ naghị alọghachi nanị dị ka ohu, kama ọ na-alọghachi dị ka onye karịrị ohu. Nꞌihi na ugbu a Onisimọs bụ nwanna anyị nꞌime Kraịst. Nꞌezie, Faịlimọn, Onisimọs dị m nꞌobi nke ukwuu.


FAILIMON 1:19
Aga m akwụghachi gị ya! Ka m jiri aka m dee ya nꞌebe a: mụ onwe m bụ Pọl ga-akwụghachi gị. Ọ bakwaghị uru ichetara gị ụgwọ i ji m. Nꞌihi na ụgwọ i ji m bụ mkpụrụ obi gị nꞌonwe ya.


FAILIMON 1:20
Biko nwanna m, nꞌaha Onyenwe anyị, ana m arịọ gị ka i meere m nke a, ka obi m nwee izuike. Meere m ya dị ka nwanna m nꞌime Kraịst.


FAILIMON 1:21
Obi siri m ike na ị ga-emere m ihe m rịọrọ gị nꞌime akwụkwọ a, ọ bụladị mee karịa dị ka m rịọrọ.


HIBRU 2:1
Anyị anụla akụkọ nzọpụta a Jisọs wetaara anyị. Ka anyị ṅazie ntị nke ọma jidesiekwa ihe anyị nụrụ ike ka anyị hapụ ikwe ka ha si nꞌobi anyị pụọ.


HIBRU 2:6
Otu onye nꞌime ndị dere ihe nꞌakwụkwọ nsọ, chere echiche banyere ihe ndị a sị, “Chineke, gịnị mere i ji gụọ mmadụ na-abụghị ihe ọ bụla dị ka ihe? Gịnị mere i ji enwe obi ọcha nꞌebe mmadụ nọ? Gịnị mere gị na nwa nke mmadụ ji enwe mmekọ?


HIBRU 2:13
Nꞌebe ọzọ nꞌakwụkwọ nsọ, o sitere nꞌọnụ onye ọzọ kwuokwa sị “Aga m eji obi m nile kwere na Chineke. Olileanya nke m, na nke ụmụ Chineke nyere m ga-adịgide nꞌime gị Chineke.” Nꞌebe ọzọ kwa nꞌakwụkwọ nsọ o kwukwara sị “Lee mụ na ụmụ nke Chineke nyere m.”


HIBRU 2:17
Ọ dị mkpa na Jisọs bịara nꞌụdị anyị bụ ụmụnna ya. Nꞌihi na ọ bụ nanị site nꞌụzọ dị otu a, ka ọ pụrụ ịbụ onyeisi nchụaja nwere obi ebere nꞌebe anyị nọ, na onyeisi nchụaja kwesịrị ntụkwasị obi nꞌihu Chineke, ikwuchitere anyị ọnụ anyị nꞌihi mgbaghara mmehie anyị.


HIBRU 3:2
Jisọs sitere nꞌaka Chineke nata nke a. Ọ rụkwara ọrụ ya dị ka onye kwesịrị ntụkwasị obi nꞌihe nile e zitere ya ka o mee. Dị ka Jisọs, Mosisi bụkwa nwoke biri ndụ kwesịrị ntụkwasị obi.


HIBRU 3:3
Ma Jisọs nwere nsọpụrụ dị elu karịa Mosisi. Nꞌihi na Jisọs nꞌonwe ya bụ ntọ ala ebe obibi ahụ. O nwekwara ugwu na nsọpụrụ karịa ebe obibi ahụ na ozi nile e jere nꞌime ya.


HIBRU 3:5
Mosisi jere ozi ya nile dị ka ohu kwesịrị ntụkwasị obi mgbe ọ nọ nꞌọrụ Chineke. Ma ọ bụ nanị ohu nꞌoge ahụ. Ọrụ nile ọ rụrụ tụrụ aka gosi anyị ihe ga-eme nꞌoge dị nꞌihu.


HIBRU 3:6
Ma Kraịst bụ onye kwesịrị ntụkwasị obi dị ka Ọkpara e nyefere nlekọta ụlọ Chineke nꞌaka. Anyị bụkwa ụlọ ya, ma ọ bụrụ na anyị anọgide bụrụ ndị nwere obi ike na ntụkwasị obi nꞌihe ahụ anyị na-ele anya ya.


HIBRU 3:8
unu ekwela ka obi unu sie ike dị ka nkume, dị ka unu mere mgbe unu nupụrụ isi megide Chineke, dị ka unu mere nꞌụbọchị ahụ nꞌime ọzara mgbe unu nwara ya ọnwụnwa.


HIBRU 3:12
Ya mere, lezienụ anya ụmụnna m, ka ajọ omume nile na ekweghị ekwe nile nke obi ghara ịdị nꞌime onye ọ bụla nꞌetiti unu, nke ga-eme ka unu site nꞌiso Chineke dị ndụ tụgharịa.


HIBRU 3:13
Kama na-agbanụ onwe unu ume kwa ụbọchị, ogologo ụbọchị ahụ nile ihe banyere ụbọchị ahụ bụ Taa metụtara unu. Ka a hapụ inwekwa onye ọ bụla a ga-esite nꞌaghụghọ nke mmehie mee ka obi ya sie ike.


HIBRU 3:14
Nꞌihi na anyị abụrụla ndị ga-eso Kraịst keta oke, ma ọ bụrụ na anyị ga-ejidesi ntụkwasị obi anyị nwere na mmalite ruo ọgwụgwụ.


HIBRU 3:15
Chetanụ nke ọma ihe akwụkwọ nsọ na-ekwu sị: “Taa, ọ bụrụ na unu anụ olu ya, unu emela ka obi unu sie ike dị ka nkume, dị ka unu mere mgbe unu nupụrụ isi nꞌebe m nọ.”


HIBRU 4:7
Ma mgbe ọtụtụ afọ gasịrị, Chineke kwuru okwu. Nꞌoge Devidi, Chineke kwuru okwu ọzọ banyere ozuzu ike. Ọ dọrọ ha aka na ntị sị “Gee ntị nꞌolu ya taa ụnu emekwala ka obi unu sie ike dị ka ndị ahụ mere ka iwe wee m.”


HIBRU 4:12
Nꞌihi na okwu Chineke dị ndụ dịkwa nkọ. Ọ dị nkọ karịa mma ihu abụọ ọ bụla. Ọ na-adụba ruo nꞌebe mkpụrụ obi na mmụọ kewara onwe ha, na ruo nꞌebe nkwonkwo na ụmị kewakwara onwe ha. Ọ na-enyocha gbaa nꞌanwụ ọchịchọ na echiche obi ndị mmadụ.


HIBRU 6:11
Anyị chọrọ ka unu nọgide na-eme ka ịnụ ọkụ nꞌobi unu dịgide na-aga nꞌihu tutuu ruo ọgwụgwụ ndụ. Unu ga-anata ụgwọ ọrụ unu nke zuru ezu.


HIBRU 6:12
Anyị achọghị ka unu bụrụ ndị umengwụ, kama na-adịnụ ka ndị ahụ ji okwukwe na ntachi obi na-anata ihe ọ bụla Chineke kwere na nkwa.


HIBRU 6:15
Eberaham jiri ntachi obi chere tutuu Chineke emezuo nkwa ya. Eberaham nwetara nwa nwoke.


HIBRU 6:17
Chineke jiri ịṅụ iyi kee onwe ya agbụ, ka ndị nile nwere nkwa ya hapụ inwe obi abụọ. Ha agaghị eche na Chineke ga-agbanwe ihe o zubere ime.


HIBRU 6:18
Ugbu a Chineke ji ụzọ ihe abụọ nke na-enweghị mgbanwe kee onwe ya agbụ ime ka nkwa ya guzosie ike. Ọ bụ ihe na-apụghị ime eme na Chineke ga-ekwu okwu ụgha. Ya mere, anyị nwere oke ntụkwasị obi na ọ ga-echebe anyị mgbe anyị gbakwuuru ya,


HIBRU 6:19
Ntụkwasị obi nchebe ebighị ebi a nke guzo chịm bụ ebe mkpụrụ obi anyị na-adabere nꞌime olileanya. Ntụkwasị obi a dị ka eriri nke jikọtara anyị na Chineke.


HIBRU 8:10
Ma otu a ka ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ ga-esi dịrị nꞌetiti mụ onwe m na ụmụ Izirel. Aga m etinye iwu m nile nꞌime mmụọ ha ka ha nwee ike ịmata ihe m chọrọ ka ha mee. Aga m edekwa iwu m nile nꞌime obi ha ka ha hapụ ichefu iwu m nile. Aga m akpọbata ha dị ka ụmụ nke m. Mụ onwe m ga-abụ Chineke ha.


HIBRU 8:11
Ọ dịkwaghị onye ọ bụla nꞌetiti ha ga-ezi ibe ya ma ọ bụ zisaa ozi ọma nye nwanne ya, ma ọ bụ gwa onye agbata obi ya okwu sị, ‘O kwesịrị ka ị mata Chineke!’ Nꞌihi na onye ọ bụla nꞌime ha, onye ukwu na onye nta, ga-amata m, sọpụrụ m site nꞌobi ha nile.


HIBRU 8:12
Mgbe ahụ, aga m enwe obi ebere banyere amaghị ihe ha. Aga m agbaghara ha mmehie ha nile. Agaghị m echetakwa mmehie ha nile ọzọ.”


HIBRU 9:14
ọbara Kraịst ọ̀ pụghị ime ka anyị dị ọcha karịa? Nꞌezie ọbara ya zubigara oke ịsachpụ mmehie anyị nile, nꞌihi na Kraịst sitere na Mmụọ nke na-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi were onwe ya nye na-enweghị ntụpọ. Ọbara ya zubigara oke ịsacha obi anyị na ime anyị ka anyị dị ọcha site nꞌajọ ọrụ nile, bụ ọrụ nke na-eweta ọnwụ. Aja o jiri onwe ya chụọ, mere ka anyị nwere onwe anyị, ka anyị nwee ike ife Chineke onye dị ndụ.


HIBRU 10:16
“Nke a bụ ọgbụgba ndụ mụ na ụmụ Izirel ga-agba mgbe ụbọchị ndị ahụ gasịrị, ka Onyenwe anyị kwuru. Aga m eme ka ha mara iwu nꞌime obi ha. Aga m ede ha nꞌime mmụọ ha. Ha ga na-echeta ha nꞌechiche ha nile.


HIBRU 10:22
Ka anyị bịaruo Chineke nso site nꞌobi nke aghụghọ na-adịghị, obi nke nwere okwukwe na ọ ga-anabata anyị, obi nke e fesara ọbara maka ime ka anyị si nꞌechiche ọjọọ nile nke obi gbagọrọ agbagọ dị ọcha, na ahụ nke e ji mmiri dị ọcha sachapụ.


HIBRU 10:23
Ya mere, ka anyị were obi nke egwu na-adịghị jidesie nkwupụta olileanya anyị ike. Ka anyị kwupụta nke a na-enweghị obi abụọ. Nꞌihi na Chineke aghaghị imezu nkwa ya. Ọ bụ onye kwesịrị ntụkwasị obi. Ọ ga-emezu okwu ya nile.


HIBRU 10:34
Unu sooro ndị ha tinyere nꞌụlọ mkpọrọ hụkọọ ahụhụ. Mgbe ha na-apụnara unu akụ unu na ihe obibi unu nile unu jiri obi ụtọ nꞌime Onyenwe anyị nara nke a. Nꞌihi na unu maara na unu nwere akụ na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.


HIBRU 10:35
Ya mere, unu etufula ntụkwasị obi ahụ unu nwere. Nꞌihi na ntụkwasị obi unu ga-ewetara unu ụgwọ ọrụ na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.


HIBRU 11:1
Gịnị bụ okwukwe? Okwukwe bụ inwe ntụkwasị obi na ihe anyị na-ele anya ya ga-amezu. Ọ bụkwa inwe ntụkwasị obi siri ike banyere ihe anyị na-ahụghị anya.


HIBRU 11:5
Enọọk tụkwasịkwara Chineke obi nꞌụzọ dị otu a. Nꞌihi nke a, Chineke kuuru ya laa nꞌeluigwe na-anwụghị anwụ. Otu mgbe ahụ o furu mgbe Chineke wezụgara ya. Akwụkwọ nsọ gwara anyị na Enọọk mere ihe tọrọ Chineke ụtọ.


HIBRU 11:10
Eberaham mere nke a nꞌihi na ọ na-ele anya ala eluigwe ahụ. Ọ tụkwasịrị Chineke onye wuru obodo ahụ obi na ọ ga-akpọbata ya nꞌala ahụ.


HIBRU 11:11
Sera emeela agadi ịmụta nwa. Ma ọ tụkwasịrị obi na Chineke ga-edebezu nkwa ya. Nꞌihi nke a Chineke nyere ya ike ịmụta nwa.


HIBRU 11:16
Nke a bụ nꞌihi na ha chọrọ ibi nꞌụlọ ha dị nꞌeluigwe. Nꞌihi nke a Chineke naara ha dị ka ụmụ ya. Ihere ha emeghị ya. Nꞌihi na o dozielara ha ebe obibi nꞌeluigwe.


HIBRU 11:19
Nꞌime nke a Eberaham tụkwasịrị Chineke obi. O nwere okwukwe na a sịkwa na Aizik anwụọ na Chineke ga-eme ka ọ dị ndụ ọzọ. Ee, Chineke anọghị nꞌụra! O chebere ndụ Aizik.


HIBRU 11:35
Site nꞌokwukwe ụmụ nwanyị ụfọdụ ka e nyeghachiri ụmụ ha site nꞌọnwụ. Ndị ọzọ naara ntaramahụhụ nꞌihi na ha sitere nꞌokwukwe jụ ịgọnarị Chineke. Ha kweere na Chineke ga-enye ha mbilite nꞌọnwụ kachasị mma ma ọ bụrụ na ha nọgide bụrụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi.


HIBRU 11:36
E mere ụfọdụ ihe ọchị, tiekwa ha ihe otiti. A tụrụ ndị ọzọ mkpọrọ. Ma ha nọgidesịrị ike bụrụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi.


HIBRU 12:2
Ka anyị lekwasịkwa Jisọs anya. Ọ bụ onyendu na onye mmezu okwukwe anyị. Ihe ihere nke obe ahụ amasịghị ya. Ma ọ tachiri obi nagide ihe ihere ahụ. O lere anya ọṅụ nke ga-eso ahụhụ nile ọ hụrụ nꞌelu obe. Site na nke a, ọ nọ ugbu a nꞌaka nri ocheeze Chineke.


HIBRU 12:7
Tachie obi, mụta ihe site nꞌahụhụ. Nꞌihi na Chineke na-emeso gị mmeso dị ka nna ọ bụla hụrụ ụmụ ya nꞌanya si emeso ha mmeso. Nwanta ọ bụla adịghị nke nna ya na-adịghị abara mba.


HIBRU 12:11
Anyị maara na ahụhụ adịghị atọ ụtọ mgbe ọ bụla. Kama ọ na-eweta obi ọjọọ nꞌoge ahụ. Ma emesịa, mkpụrụ na-esi nꞌahụhụ na-egosi onwe ya na ndụ anyị, mgbe anyị na-ebi obi udo na nke ezi omume. Ọ bụkwa nanị ndị sitere nꞌahụhụ gafee na-ebi ụdị ndụ a.


HIBRU 12:15
Ka onye ọ bụla hapụ ime ihe ga-egbochi ihuọma Chineke. Ekwela ka obi ilu gbaa mgbọrọgwụ nꞌime unu ibutere unu nsogbu. Ụdị obi ilu ahụ pụrụ ime ka ndị ọzọ daa mba nꞌokwukwe ha.


HIBRU 12:28
Chineke kwadoro inye anyị alaeze nke ihe ọ bụla na-apụghị ịgbanwe. Ka anyị na-ele anya mgbe nke a ga-emezu. Ka anyị jiri obi ekele na-ejere Chineke ozi. Ka anyị fee ya ofufe nꞌụzọ ọ ga-anabata. Ka anyị jiri egwu na nsọpụrụ fee ya ofufe.


HIBRU 13:7
Chetanụ ndị isi unu ndị wetaara unu ozi ọma Chineke. Ha bụ mkpụrụ ndụ ọma ahụ. Unu ga-ejekwa ije na nzọ ụkwụ ha, tụkwasịkwa Chineke obi dị ka ha mere.


HIBRU 13:9
Unu ekwela ka e jiri ozizi ọhụrụ nke dịkwa iche duhie unu site nꞌịgbaso ezi ụzọ ahụ. Ọ dị mma ka e site nꞌamara mee ka mkpụrụ obi anyị bụrụ ihe dị ike, ọ bụghị site nꞌidebe iwu ụfọdụ e nwere maka iri nri. Ndị na-edebe iwu ndị a enweghị inye aka ọ bụla site na ya.


HIBRU 13:17
Ruberenụ ndị isi unu isi. Gbalịanụ ime ihe ha gwara unu. Nꞌihi na ọrụ ha bụ ịhụ maka mkpụrụ obi unu. Chineke ga-ekpekwa ha ikpe dị ka ọrụ ha si dị. Ruberenụ ha isi ka ha nwee obi aṅụrị ịrụ ọrụ ha. Nꞌihi na ọ bụrụ na ha ejiri ihu mgbarụ rụọ ọrụ ha, ọrụ ha agaghị abara unu uru.


HIBRU 13:22
Ụmụnna m bikonụ werenụ ntachi obi nụrụ okwu agbamume m gwara unu nꞌime akwụkwọ mkpụmkpụ a.


JEMES 1:2
Ụmụnna m, ka obi unu jupụta nꞌọṅụ mgbe ọ bụla ọnwụnwa dị iche iche gbara unu gburugburu.


JEMES 1:3
Nꞌihi na mgbe a na-anwa okwukwe unu ọnwụnwa, ntachi obi unu na-enwe ohere ito eto.


JEMES 1:4
Ya mere, agbalịla ịgbara nsogbu ọsọ, ma ọ bụ ịchọ ụzọ dị mfe ị ga-esi wepụ onwe gị na nsogbu ahụ. Kama nye ntachi obi gị ohere ka o too. Nꞌihi na mgbe o toro tozuo oke, ị ga-abụkwa onye pụrụ iguzo chịm, onye zuru ezu nꞌime onwe ya, nke ihe ọ bụla naagaghị akọ.


JEMES 1:6
Ma mgbe ọ rịọrọ arịrịọ ahụ, ya site na mmụọ nke na-enweghị obi abụọ, mmụọ nke nwere ntụkwasị obi na Chineke ga-eme ihe ọ rịọrọ ya ka o mee. Nꞌihi na onye sitere nꞌobi abụọ rịọ Chineke ihe ọ bụla dị ka mpempe akwụkwọ nke ikuku naebugharị.


JEMES 1:8
Nꞌihi na onye ahụ dịkwa ka nwoke na-enwe obi abụọ mgbe nile, nke na-adịghị enwe mkpebi nꞌime onwe ya banyere ihe ọ bụla ọ chọrọ ime.


JEMES 1:14
Kama ọnwụnwa na-abịara mmadụ site nꞌọchịchọ nke obi ya. Ọ bụkwa ọchịchọ ọjọọ nke mmadụ na-arafu ya, dọkpụfuo ya.


JEMES 1:15
Ọ bụ ọchịchọ ọjọọ a, mgbe ha bara ụba nꞌime obi, na-eduba mmadụ na mmehie. Mgbe anyị mehiekwara, ọ bụ mmehie na-eduba nꞌọnwụ.


JEMES 1:21
Ya mere, wezuganụ ụzọ rụrụ arụ nile na ihe ọ bụla dị njọ nke fọdụrụ nꞌime ndụ unu. Nꞌọnọdụ ya nabataranụ onwe unu okwu ndụ ahụ nke a kụrụ nꞌobi unu, nke nwere ike ịzọpụta unu.


JEMES 2:8
Ọ bụrụ na unu na-edebe iwu ahụ dị mkpa dị nꞌakwụkwọ nsọ nke na-asị “Hụnụ ndị agbata obi unu nꞌanya dị ka unu onwe unu,” unu na-eme ihe ziri ezi.


JEMES 3:13
Ọ̀ dị onye ọ bụla nꞌime unu na-agụ onwe ya dị ka onye maara ihe na onye nwere nghọta? Ya gosi amamihe ya na nghọta ya site nꞌibi ezi ndụ na ịrụ ọrụ ọma site nꞌobi umeala nke ịnya isi na-adịghị.


JEMES 3:14
Ma ọ bụrụ na obi unu ejupụta nꞌihe ilu na ekworo, o kwesịghị ka unu kwusie okwu ike banyere amamihe unu na ịdị mma unu. Nꞌihi na nke a abụghị eziokwu.


JEMES 3:16
Nꞌihi na ebe ọ bụla obi ilu na ekworo dị, ebe ahụ ka unu ga-achọta igba aghara na omume ọjọọ.


JEMES 3:17
Ma amamihe na-esite nꞌebe Chineke nọ abịa dị ọcha. Ọ hụrụ udo nꞌanya, ọ na-eme obi ọma, o jupụtara nꞌebere, na-ewepụtakwa ọrụ ọma. Ihu abụọ na obi abụọ adịkwaghị nꞌime ya.


JEMES 4:3
Ọ bụladị mgbe unu rịọrọ Chineke, ọ dịghị enye unu ihe unu rịọrọ ya nꞌihi na ihe unu chọrọ iji ihe ndị ahụ mee abụghị ezi ihe. Ọ bụ iji ha mee nanị ihe ga-atọ obi unu ụtọ.


JEMES 4:4
Ndị na-ekwesịghị ntụkwasị obi! Ọ̀ bụ na unu amaghị na unu na ụwa bụrụ enyi, unu ga-esi otu a bụrụ ndị iro Chineke? Ọ bụrụ na uche unu bụ inwe aṅụrị nꞌihe nke ụwa, unu apụghị ịbụ enyi Chineke.


JEMES 4:5
Gịnị ka unu na-eche na akwụkwọ nsọ na-ekwu mgbe e dere nꞌime ya sị, “Mmụọ Nsọ Chineke bi nꞌime anyị na-eche anyị nche ka anyị hapụ ịbụ ndị na-ekwesịghị ntụkwasị obi nꞌebe Chineke nọ?”


JEMES 4:6
Ma Chineke na-enye anyị amara anyị pụrụ isite na ya jụ ime ihe ọchịchọ ọjọọ nke obi anyị na-achọ. Nꞌihi na akwụkwọ nsọ kwuru sị, “Amara Chineke dịịrị ndị dị umeala nꞌobi, ma ọ naeguzo megide ndị na-ebuli onwe ha elu.”


JEMES 4:8
Bịakwụtenụ Chineke nso, ya onwe ya ga-abịakwutekwa unu nso. Kwọọnụ aka unu, ndị mmehie, ma meekwanụ ka obi unu dị ọcha. Unu abụla ndị obi abụọ.


JEMES 4:9
Ruonụ uju, tienụ aka nꞌobi nꞌọnọdụ mwute, kwaakwanụ akwa. Ka ọchị unu ghọọ ihu mgbarụ, ka iru uju werekwa ọnọdụ ịṅụrị ọṅụ ọ bụla dị nꞌime unu.


JEMES 5:6
Unu amaala ndị aka ha dị ọcha ikpe ọmụma, gbuokwa ha, ọ bụladị mgbe ọ na-adịghị ihe ọjọọ ha bu nꞌobi ha megide unu.


JEMES 5:11
Anyị na-agụ ha ugbu a dị ka ndị a gọziri agọzi nꞌihi na ha diri ahụhụ. Unu anụla akụkọ Job, otu o siri hụọ ahụhụ na otu Chineke siri gọzie ya nꞌikpeazụ. Chineke bụ onye jupụtara nꞌobi ebere na ọmiko.


JEMES 5:20
onye ahụ kpọghachiri onye njehie ahụ nꞌebe Chineke nọ azọpụtala mkpụrụ obi kpafuru akpafu site nꞌọnwụ. Ọ bụ ihe pụrụ ime na mkpụrụ obi ahụ ga-anata mgbaghara nꞌihi ọtụtụ mmehie ya.


1 PITA 1:3
Ka otuto na nsọpụrụ nile dịrị Chineke, Nna Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, nꞌihi na ọ bụ site nꞌobi ebere ya nke o nwere nꞌebe anyị nọ ka o ji nye anyị ndụ ọhụrụ ahụ mere ka a kpọbata anyị nꞌezinụlọ ya. Ugbu a anyị nwere olileanya iketa ndụ ebighị ebi nꞌihi na Kraịst esitela nꞌọnwụ bilie.


1 PITA 1:5
Ihe ndị a nile ga-abụ nke unu nꞌihi na Chineke ji ike ya na-eche unu nche nꞌihi na unu tụkwasịrị ya obi. Chineke ga-enye unu ya nꞌụbọchị ọgwụgwụ oge ahụ nꞌụzọ ọ ga-apụta ìhè nye mmadụ nile.


1 PITA 1:8
Ọ bụ ezie na unu ejibeghị anya unu hụ Kraịst mgbe ọ bụla, ọ bụkwa ezie na unu adịghị ahụ ya anya ugbu a, ma unu hụrụ ya nꞌanya. Nꞌezie, ọ bụladị ugbu a unu nwere obi nke jupụtara nꞌụdị ọṅụ ahụ ọnụ na-apụghị ịkọwa.


1 PITA 1:9
Ụgwọ ọrụ ọzọ unu ga-enweta nꞌihi ntụkwasị obi unu nꞌime ya ga-abụ nzọpụta a ga-azọpụta mkpụrụ obi unu.


1 PITA 1:13
Nꞌihi ya, kwadoonụ obi unu, nọọkwanụ na njikere dị ka ndị maara ihe ha na-eme. Tụkwasịkwanụ olileanya unu na ngọzi ahụ Chineke ga-enye unu, mgbe a ga-eme ka Jisọs Kraịst bịa ọzọ.


1 PITA 1:21
Ọ bụkwa site nꞌaka ya ka unu ji tụkwasị Chineke obi, onye mere ka Kraịst si nꞌọnwụ bilie, na onye nyekwara ya ebube. Ya mere, tụkwasịnụ okwukwe unu na olileanya unu na Chineke.


1 PITA 1:22
Ugbu a, ebe unu sitere nꞌirubere eziokwu ahụ isi mee ka obi unu dị ọcha, na-ahụrịtanụ onwe unu nꞌanya, werenụ obi unu nile hụ onwe unu nꞌanya.


1 PITA 2:2
Ọ bụrụ na unu edetụla obi ebere Onyenwe anyị ite, mara na ọ dị mma, na-adịnụ dị ka ụmụ a mụrụ ọhụrụ, ndị agụụ ịṅụ mmiri ara na-agụ. Bụrụnụ ndị ọ na-agụ agụụ ịṅụ mmiri ara ka unu bụrụ ndị na-eto eto, na ndị a zọpụtara.


1 PITA 2:10
Nꞌoge gara aga, unu abụghị ndị Chineke, ma ugbu a, unu bụ ndị ya. Na mgbe ochie, unu amaghị ihe ọ bụla banyere obi ebere Chineke, ma ugbu a obi ebere ya erutela unu aka.


1 PITA 2:11
Nꞌihi ya ndị enyi m, ana m arịọ unu, dị ka ndị ọbịa na ndị na-agba ọsọ ndụ unu bụ nꞌụwa a na-asị unu, unu enyefela onwe unu nꞌaka ihe na-agụ unu agụụ nꞌihi na ha bụ ihe na-alụso mkpụrụ obi unu agha.


1 PITA 2:18
Ndị bụ odibo ruberenụ ndị nwe unu isi, na-enyekwa ha nsọpụrụ na ugwu ruuru ha. Unu emela nke a nye nanị ndị bụ ezi mmadụ, na ndị nwere obi ọma nꞌebe unu nọ, kama meekwanụ ya ọ bụladị nye ndị afọ tara mmiri.


1 PITA 2:19
Chineke ga-agọzi unu ma ọ bụrụ na unu ejiri ntachi obi na-edi ahụhụ ga-adakwasị unu nꞌihi na unu na-eme ihe Chineke na-achọ.


1 PITA 2:20
Unu maara na o nweghị otuto ọ bụla dịrị unu mgbe a tara unu ahụhụ nꞌihi ihe ọjọọ unu mere. Ma ọ bụrụ na unu enwee ntachi obi mgbe a na-ata unu ahụhụ nꞌihi ihe ọma unu na-eme, nke a na-atọ Chineke ụtọ.


1 PITA 2:25
Na mbụ, unu dị ka ụmụ atụrụ na-awagharị na-achọ ụzọ, ma ugbu a e meela ka unu laghachikwute onye na-azụ unu dị ka atụrụ, na onye na-echebe mkpụrụ obi unu.


1 PITA 3:5
Nke a bụ ụdị ịma mma a hụrụ na ndụ ndị inyom ihe ha dị Chineke mma na mgbe ochie. Ndị inyom tụkwasịrị Chineke obi, na ndị echiche ha na nzube di ha dakọtara.


1 PITA 3:8
Ihe ọzọ m chọrọ ịgwa unu bụ nke a, nweenụ otu obi, ka ihe na-ewute ibe unu na-ewute unu. Bụrụnụ ndị nwere obi ọma na obi dị umeala.


1 PITA 3:14
Ma a sịkwarị na ha ataa unu ahụhụ nꞌihi na unu mere ihe dị mma, ngọzi dịrị unu. Unu atụla ha egwu, ka obi gharakwa ịlọ unu mmiri.


1 PITA 3:15
Na-enyenụ Chineke nsọpụrụ nꞌime obi unu. Nọọkwanụ na njikere mgbe nile iguzo kọwaara onye ọ bụla jụrụ unu ajụjụ banyere olileanya ahụ unu nwere nꞌime unu. Ma werenụ obi dị umeala na nsọpụrụ na-eme ya.


1 PITA 3:16
Meenụ obi unu ka ọ dị ọcha, ka ndị na-akọ unu ọnụ na ndị na-ekwulu unu bụrụ ndị ihere ga-eme mgbe ha hụrụ na ihe ha na-ebo unu ebubo banyere ya bụ ihe ọma.


1 PITA 3:20
Nke a bụ mmụọ ndị ahụ jụrụ ime ihe Chineke chọrọ mgbe ahụ o ji ntachi obi chere ha nꞌoge ahụ Noa nọ na-ewu ụgbọ mmiri ya. Ọ bụ nanị mmadụ asatọ nꞌime ndị bi nꞌoge ahụ ka a zọpụtara site na mmiri ahụ riri ndị bi nꞌụwa.


1 PITA 3:21
Nke a bụ ihe ịma atụ na-ezi anyị ihe baptizim pụtara. Mgbe e mere anyị baptizim, anyị na-egosi na a zọpụtala anyị site nꞌọnwụ na mbibi nꞌihi mbilite nꞌọnwụ Kraịst. O gosighị na e meela ka anụ ahụ anyị dịrị ọcha nꞌihi baptizim e mere anyị, kama ọ na-egosi na anyị, ndị e mere baptizim na-alọghachikwute Chineke na-arịọ ya ka ọ sachaa mmehie dị nꞌobi anyị.


1 PITA 4:1
Ebe ọ bụ na Kraịst hụrụ ahụhụ nꞌanụ ahụ, unu kwesịkwara inwe ụdị obi ahụ o nwere. Unu kwesịrị ijikere ịhụ ahụhụ. Nꞌihi na mgbe anụ ahụ unu na-ahụ ahụhụ ime mmehie anaghị atọkwa ya ụtọ.


1 PITA 4:2
Unu atụfula oge unu ịgbaso ọchịchọ ọjọọ nile na-agụ unu agụụ, kama bụrụnụ ndị ọ na-anụ ọkụ nꞌobi ime ihe Chineke chọrọ.


1 PITA 4:9
Jirinụ obi ọma na-elerita ibe unu ọbịa na-enweghị ntamu ọ bụla.


1 PITA 4:13
Kama ṅụrịanụ ọnụ nꞌihi na ọnwụnwa ndị a na-enyere unu aka iketa oke nꞌahụhụ Kraịst. Mgbe ọnwụnwa ndị a gabigasịrị, obi unu ga-ejupụta nꞌọṅụ mgbe a ga-eme ka unu soro ya keta oke nꞌebube ya nꞌụbọchị ahụ a ga-eme ka ọ pụta ìhè.


1 PITA 4:19
Ya mere, ọ bụrụ na unu na-ata ahụhụ dị ka nzube Chineke si dị, gaanụ nꞌihu na-eme ihe ziri ezi. Nyefeekwanụ onwe unu nꞌaka Chineke onye kere unu, onye kwesịrị ntụkwasị obi.


1 PITA 5:2
Ya mere ndị okenye ibe m, nke a bụ arịọrọ m na-arịọ unu. Bụrụnụ ndị na-azụ atụrụ ahụ Chineke nyefere unu nꞌaka. Ka nlekọta unu na-elekọta ha bụrụ nke si nꞌime ime obi unu pụta. Unu elekọtala ha nꞌihi ego unu ga-enweta. Kama lekọtaa ha nꞌihi na ọ bụ ihe na-agụ unu agụụ isi otu a jeere Onyenwe anyị ozi.


1 PITA 5:3
Unu abụla ọpụtaobie nꞌebe ndị e nyefere unu nꞌaka nọ, kama bụrụnụ ihe ịma atụ nye ha.


1 PITA 5:5
Nꞌotu aka ahụ, unu ụmụ okorọbịa, doonu onwe unu nꞌokpuru ndị bụ okenye. Unu nile werenụ obi umeala na-ejeritara onwe unu ozi, nꞌihi na Chineke na-enye onye dị umeala nꞌobi amara na ngọzi ya, ma onye mpako ka ọ na-eguzo imegide.


1 PITA 5:6
Nꞌihi nke a, werenụ obi dị umeala doo onwe unu nꞌokpuru Chineke onye dị ike. Mgbe oge ya rukwara ọ ga-eweli unu elu.


1 PITA 5:7
Hapụrụnụ Chineke nsogbu unu na nchegbu unu, nꞌihi na ihe banyere unu na-emetụ ya nꞌobi. Ọ mazukwara nsogbu unu nile.


1 PITA 5:9
Guzosienụ ike nꞌokwukwe unu mgbe ọ ga-alụso unu ọgụ. Unu ekwela ka o merie unu, kama tụkwasịnụ Onyenwe anyị obi. Chetanụ na e nwere ọtụtụ ndị kwere ekwe dị ka unu ndị nọkwa nꞌụdị ahụhụ a unu na-ahụ nꞌụwa nile.


1 PITA 5:10
Ma ahụhụ ndị a ga-adị nanị nwa oge. Chineke anyị, onye jupụtara nꞌobi ebere ga-enye unu ebube ya nke na-adịghị agwụ agwụ site na Kraịst. Ọ ga-abịa nꞌonwe ya ịkpọbata unu nꞌebe unu ga-abụ ndị dị nnọọ ike.


1 PITA 5:12
Ọ bụ site nꞌinyeaka Saịlas ka m ji deere unu mkpụrụ okwu ole na ole a dị nꞌime akwụkwọ a. Dị ka unu maara nke ọma, Saịlas bụ nwanna anyị kwesịrị ntụkwasị obi. Ọ bụ olileanya m na a ga-eji ihe m dere nꞌebe a gbaa unu ume, nꞌihi na edeere m unu ihe bụ eziokwu gbasara otu Chineke si agọzi ndị ya. Ihe nile m dere nꞌebe a bụ ihe ga-enyere unu aka iguzosi ike nꞌịhụnanya ya.


2 PITA 1:5
Ọ bụrụ na anyị achọọ ịnata onyinye ndị a nile, anyị kwesịrị ime ihe karịrị ịtụkwasị Chineke obi nanị; anyị kwesịrị ịgbalịsi ike ịbụ ndị dị mma. Ma ịdị mma abụghị nanị ọrụ dịrị anyị. Anyị kwesịkwara ịga nꞌihu ịmụta ihe nile banyere Chineke. Ihe ọzọ anyị ga-atụkwasị nꞌelu ihe ọmụma bụ mmụọ nke emebigaghị ihe ọ bụla oke,


2 PITA 1:6
ka anyị si otu a bụrụ ndị nwere ntachi obi na ndị dị nsọ.


2 PITA 1:19
Nꞌezie, anyị ahụla, nwapụtakwa na amụma ahụ ndị amụma buru emezuola. Ọ ga-abara unu uru ilezi anya nꞌihe ahụ nile ndị amụma dere, nꞌihi na ozi ha dị ka ìhè nke na-acha nꞌakụkụ ụlọ gbara ọchịchịrị. Okwu ha na-enyere anyị aka ịghọta ọtụtụ ihe gaara esiri anyị ike ịghọta. Mgbe unu tulere eziokwu ahụ dị nꞌokwu ahụ ndị amụma kwuru, ìhè ga-enwụbata nꞌobi unu, mgbe ahụ kwa Kraịst onye dị ka kpakpando na-acha nꞌisi ụtụtụ ga-eme ka ihè ya chabata nꞌime unu.


2 PITA 1:21
Nꞌihi na o nweghị okwu amụma ọ bụla ndị amụma ochie sitere nꞌobi ha chepụta dee ma ọ bụ kwuo. Kama ọ bụ Mmụọ Nsọ bi nꞌime ha nyere ha ozi ahụ Chineke chọrọ ka ha kwuo.


2 PITA 2:8
Ụbọhcị nile, ehihie na abalị, ihe ọjọọ nile ọ na-anụ, na nke o ji anya ya na-ahụ, wutere mkpụrụ obi ya nke ukwuu.


2 PITA 2:12
Ma ana m eche na ndị ozizi ụgha a bụ ndị nzuzu. Ha na-eme ihe ọ bụla ha kpebiri nꞌobi ha. Ha dị ka ụmụ anụ ọhia ndị a na-amụ nanị nꞌihi ka ndị mmadụ gbuo ha rie. Lee ka ha si ekwulu ndị dị ike ha na-aghọtaghị ihe ọ bụla banyere. A ga-alakwa ha nꞌiyi, ha na mmụọ ọjọọ nile na ike nile nke ọkụ ala mmụọ.


2 PITA 2:13
Nke a ga-abụ ahụhụ dịrị ndị ozizi ụgha ahụ nꞌihi mmehie ha. Nꞌihi na ihe na-atọ ha ụtọ bụ nanị ibi ndụ nke imejupụta ihe ọjọọ ahụ nile na-agụ anụ ahụ ha agụụ. Ha bụ ndị na-ewetara unu ihe ihere mgbe ọ bụla ha so unu na-eri oriri ịhụnanya unu, nꞌihi na nꞌotu akụkụ, ha na-ebi ndụ ajọ omume. Ma ha na-eso unu ezukọ dị ka a ga-asị nꞌezie, na ha bụ ndị dị ọcha nꞌobi ha.


2 PITA 2:14
O nweghị nwanyị si nꞌebe ha nọ gafee nke ha na-adịghị ele anya ọjọọ; mmehie ịkwa iko anaghị ejukwa ha afọ, nꞌihi na agụụ ime mmehie dị nꞌime ha adịghị akwụsị akwụsị. Ha maara otu ha si arafu ụmụ nwanyị ndị okwukwe ha na-esighị ike, mee ka ha soro ha mee mmehie. Ha na-azụ obi ha inwe anya ukwu. Nꞌezie, Chineke bụrụ ha ọnụ.


2 PITA 3:9
Onyenwe anyị anaghị etufu oge imezu nkwa ya, dị ka ndị mmadụ na-ekwu, kama o sitere ogologo ntachi obi na-eche ndị mmehie ka ha chegharịa, nꞌihi na ọ chọghị ka onye ọ bụla laa nꞌiyi, kama ọ chọrọ ka onye ọ bụla si na mmehie ya chegharịa.


2 PITA 3:15
Chetakwanụ ihe mere Onyenwe anyị adịghị eme ngwangwa ịlọghachi. Ọ na-enye anyị ohere ime ka ndị ọzọ nata ozi ọma ahụ ga-ewetara ha nzọpụta. Nwanna anyị Pọl ejirila amamihe Chineke nyere ya dee ihe banyere okwu a nꞌọtụtụ akwụkwọ ozi ọ na-ede. E nwere ụfọdụ ihe o kwuru nke siri ike ịghọta. Ma ọ bụ nꞌụdị okwu a ka a na-ahụ ọtụtụ ndị nzuzu, ndị na-akọwa okwu ndị a dị ka ha si chepụta nꞌobi ha. Ha asụgharịala ihe o dere isi, mee ka a ghọta okwu ndị a nꞌụzọ na-abụghị ụzọ Pọl onye dere ha chọrọ ka anyị ghọta ha. Nke a bụkwa ihe ha na-emekwa mpaghara akwụkwọ nsọ ụfọdụ si otu a na-ewetara onwe ha ịla nꞌiyi.


1 JỌN 1:9
Ma ọ bụrụ na anyị ekwupụta mmehie anyị nile nꞌihu Chineke, ọ bụ onye anyị pụrụ ịtụkwasị obi na onye na-eme ihe ziri ezi, ọ ga-agbaghara anyị mmehie anyị, sachapụkwa anyị site nꞌomume ọjọọ nile anyị mere.


1 JỌN 2:14
Ana m agwa unu ndị bụ nna maara Chineke ahụ na-adị ruo mgbe ebighị ebi, na-agwakwa unu ụmụ okorọbịa dị ike, ndị okwu Chineke juru obi, ndị na-emeri ekwensu nꞌọgụ ọ na-alụso unu sị


1 JỌN 2:28
Ugbu a ụmụ m, ndị m hụrụ nꞌanya, nọgidesienụ ike nꞌime Kraịst. Mgbe ọ bịara ọzọ ka obi unu bụrụ ihe kwenyesịrị ike nꞌime ya. Nꞌụzọ dị ọtu a unu agaghị abụ ndị ihere ga-eme mgbe unu hụrụ ya. Unu agaghị abụkwa ndị na-adọghachi onwe ha azụ site nꞌebe ọ nọ.


1 JỌN 3:15
Onye ọ bụla kpọrọ nwanna ya asị bụ ogbu mmadụ nꞌime obi ya. Anyị maara na o nweghị onye na-eche echiche igbu mmadụ pụrụ inwe ndụ ebighị ebi.


1 JỌN 3:17
Ọ bụrụ na otu nwanna nꞌime Kraịst mkpa na-akpa bịakwutere otu onye kpọrọ onwe ya onye Kraịst nwere akụ na ụba na ihe oriri, ma nwanna nwere akụ na ụba ahụ emechie obi ya nꞌebe nwanna ahụ nọ, jụ inyere ya aka, ịhụnanya Chineke ò si aṅaa dịrị nꞌime onye dị otu a?


1 JỌN 3:21
Ndị m hụrụ nꞌanya, ọ bụrụ na akọnuche anyị amaghị anyị ikpe anyị pụrụ iji ntụkwasị obi na obi dị ọcha bịakwute Chineke


1 JỌN 4:10
Site nꞌihe a Chineke meere anyị, anyị na-ahụ ihe a na-akpọ ịhụ mmadụ nꞌanya nꞌezie. Ọ bụghị na anyị buru ụzọ hụ Chineke nꞌanya kama ọ bụ na Chineke nꞌonwe ya hụrụ anyị nꞌanya zite Ọkpara ya ka ọ bụrụ ihe ịjụrụ ya obi nꞌihi mmehie anyị.


1 JỌN 4:17
Ọ bụrụ na anyị na-ebi ndụ nꞌime Kraịst, ịhụnanya anyị gaaba ụba tutuu ruo mgbe ọ ghọrọ ihe zuru oke. Mgbe ahụ ihere agaghị eme anyị nꞌụbọchị ikpe ahụ. Kama anyị ga-eji ntụkwasị obi na ọṅu guzoro nꞌihi Chineke nꞌụbọchị ahụ, nꞌihi na ọ hụrụ anyị nꞌanya dị ka anyị onwe anyị si hụ ya nꞌanya.


1 JỌN 5:7
Mmụọ Nsọ, onye okwu ya nile bụ eziokwu, kwukwara otu ihe ahụ. Ya mere, anyị nwere ndị akaebe atọ: Olu Mmụọ Nsọ na-ekwu okwu nꞌobi anyị, na olu ahụ si nꞌelu kwuo okwu nꞌoge e mere Jisọs baptizim, na nꞌoge ọnwụ ya. Olu ndị a nile na-ekwukwa otu ihe ahụ, na Jisọs bụ Ọkpara Chineke.


1 JỌN 5:12
Onye ọ bụla nabatara Jisọs nꞌime obi ya nwere ndụ. Ma onye na-anabataghị Ọkpara Chineke enweghị ndụ ahụ.


1 JỌN 5:14
Anyị nwekwara ntụkwasị obi na Chineke ga-anụ ekpere anyị mgbe ọ bụla anyị nịọrọ ya ihe ọ bụla dị ka ọchịchọ ya si dị.


1 JỌN 5:15
Ọ bụrụ na anyị maara na ọ na-ege anyị ntị mgbe ọ bụla anyị kpọkuru ya chee mkpa anyị nꞌihu ya, anyị nwere ntụkwasị obi na ọ ga-aza ekpere anyị.


2 JỌN 1:2
Ebe ọ bụ na eziokwu ahụ anyị maara ga-adịgide nꞌime obi anyị ruo mgbe ebighị ebi,


2 JỌN 1:3
Chineke Nna anyị na Jisọs Kraịst Ọkpara ya gaagọzi anyị site nꞌigosi anyị obi ọma ya na inye anyị udo ya nke dị ukwuu. Ọ ga-ejikwa eziokwu ya na ịhụnanya ya gọzie anyị.


2 JỌN 1:12
Otu ọ dị, enwere m ọtụtụ ihe m chọrọ ikwu, ma achọghị m ide ha dum nꞌakwụkwọ a, nꞌihi na ọ bụ nkwadebe m ịbịa ịhụ gị nꞌoge na-adịghị anya. Mgbe ahụ, anyị ga-anọ tulee okwu ndị a nile, nweekwa oge ime onwe anyị obi ụtọ.


3 JỌN 1:2
Enyi m, ana m ekpere gị ekpere mgbe nile na-arịọ Chineke ka o mee ka ihe na-agara gị nke ọma, ka ahụ sie gị ike, dị ka ihe si agara mkpụrụ obi gị nke ọma.


3 JỌN 1:3
Ụfọdụ nꞌime ụmụnna anyị nꞌime Kraịst ndị si nꞌebe a na-agafe akọọrọla m akụkọ mere ka obi tọọ m ụtọ. Akụkọ ha kọrọ bụ akụkọ banyere otu i si ebi ndụ dị ọcha na nke eziokwu, na otu ibi ndụ gị si bụrụ dị ka okwu Chineke si chọọ.


JUD 1:6
Chetakwanụ ihe mere ndị mmụọ ozi nupụrụ isi, ndị ahụ hapụrụ ebe obibi ha, họrọ ibi ndụ mmehie. Ugbu a Chineke ekeela ha eriri igwe tụnye ha nꞌolulu ọchịchịrị, ebe ọ hapụrụ ha tutuu ruo ụbọchị ahụ a ga-ama ha ikpe.


JUD 1:8
Ma ndị ozizi ụgha a na-aga nꞌihu na-ebi ndụ ọjọọ na ndụ rụrụ arụ ha. Ha na-emerụ anụ ahụ ha, na-eji ndị nọ ha nꞌisi eme ihe ọchị. Ha na-akparịkwa mmụọ ndị ahụ dị ebube, bụ mmụọ ọjọọ ndị ahụ dị ike, ndị hapụrụ ebe obibi ha.


JUD 1:10
Ma ndị a na-ekwulu ihe ọ bụla ha na-aghọtaghi. Dị ka ụmụ anụmanụ a na-azụghị azụ, ha na-eme ihe ọ bụla dị ha mma nꞌanya si otu a na-emerụ mkpụrụ obi ha.


JUD 1:18
Ndị ozi a gwara unu sị, “Nꞌọgwụgwụ oge ahụ, ọ dị ndị ga-abịa jiri unu na-eme ihe ọchị. Ndị a bụ ndị ọchịchọ obi ha bụ nanị ime ihe ọjọọ ọ bụla na-atọ ha ụtọ.


JUD 1:22
Gosinụ ndị na-enwe obi abụọ ebere.


JUD 1:23
Gbalịanụ ịzọpụta ụfọdụ dị ka a ga-asị na ọ bụ site nꞌọkụ ka unu si azọpụta ha. Ma nyekwaranụ ndị ọzọ aka ịchọta nzọpụta site nꞌigosi ha obi ebere. Kama kpachapụnụ anya ịhụ na mgbe unu na-enyere ha aka na ha adọkpụrụghị unu banye nꞌime mmehie ha. Mgbe unu na-enyere ha aka kpọọnụ ajọ omume ha nile asị.


NKPUGHE 1:5
Ka amara sitekwara nꞌebe Jisọs Kraịst nọ, onye sitere nꞌikwesị ntụkwasị obi ya kpughee eziokwu a nye anyị dịrị unu. Ya onwe ya bụ onye mbụ sitere na ndị nwụrụ anwụ bilite. Ọ gaghị anwụkwa ọzọ. Ọ dị elu karịa ndị eze nile nke ụwa. Ka otuto dịrị ya nꞌihi na ọ hụrụ anyị nꞌanya, na nꞌihi na o sitere nꞌọbara ọ wụsịrị dọpụta anyị site na mmehie anyị nile.


NKPUGHE 1:9
Ọ bụ mụ onwe m nwanne unu nwoke Jọn, onye unu na ya na-ahụrịta ahụhụ nꞌihi Onyenwe anyị, na-edere unu akwụkwọ a. Mụ onwe m esorola keta oke nꞌime ntachi obi Onyenwe anyị Jisọs na-enye. Anyị nile ga-esorokwa keta alaeze ya. Ma ọ bụ nꞌihi okwu Chineke ka e ji site nꞌebe ndị mmadụ bi zipụ m ka m gaa biri nꞌala Patmọs, ala ntakịrị mmiri gbara gburugburu. E zigara m nꞌebe ahụ nꞌihi na m kwusara okwu Chineke ma kọwaakwa eziokwu ahụ Jisọs kpughere nye anyị.


NKPUGHE 1:13
Nꞌetiti oriọna ndị a, ahụrụ m otu onye yiri Jisọs, onye kpọrọ onwe ya Nwa nke mmadụ, ka o guzo. O yikwasịrị onwe ya uwe mwụda. Ma o nwere akwa ọzọ na-acha dị ka ọlaedo e ji dụchie gburugburu ebe ahụ obi ya dị.


NKPUGHE 2:2
Amaara m ihe nile banyere ọrụ ọma gị nile. Ahụkwala m ịrụsị ọrụ ike gị na ntachi obi gị. Amaara m na ị dịghị anabata ma na-anagịde mmehie nꞌetiti ndị gị. Ị nwapụtakwala okwu nke ndị nile na-akpọ onwe ha ndị ozi, ma ha abụghị ndị ozi nꞌezie, na-ekwu. Ị chọpụtala ekwesịghị ntụkwasị obi ha.


NKPUGHE 2:3
I jirila ntachi obi hujuo anya nꞌihi m, ma ike agwụghị gị.


NKPUGHE 2:13
Amaara m nke ọma na i bi nꞌime obodo ebe ekwensu wukwasịrị ocheeze ya. Ọ bụkwa eziokwu na ekwensu gbara ofufe gị gburugburu. Ma ị na-anọgidesị ike nꞌime m. Ị jụrụ ịgọnarị m ọ bụladị nꞌoge Antipas ohu m ahụ kwesịrị ntụkwasị obi tọgbọrọ ndụ ya nꞌihi m site nꞌaka ndị na-ejere ekwensu ozi.


NKPUGHE 2:19
“Nke a bụ ihe o kwuru. Amaara m ezi ọrụ gị nile, tinyere obi ebere i nwere nꞌebe ndị ogbenye nọ. Ahụkwara m onyinye ọma ị na-enye ha, na ije ozi ị na-ejere ha. E wezụga ihe ndị a, amaara m ịhụnanya gị, na okwukwe gị, na ntachi obi gị. Ahụkwara m ịnụ ọkụ nke obi gị, na ezi ọchịchọ dị nꞌime gị imezu ha.


NKPUGHE 2:21
Enyela m nwanyị a oge kwesịrị ka o site nꞌechiche ọjọọ ya na omume amaghị Chineke ya pụta chegharịa. Ma o sitela na mpako nke obi ya hapụ ichegharị.


NKPUGHE 2:23
Ma nꞌebe ụmụ ya nọ, aga m etigbu ha ka ha nwụọ. Nzukọ nile ga-amata na abụ m onye na-ahụzu echiche na ọchịchọ obi ụmụ mmadụ. Onye ọ bụla ga-anatakwa ụgwọ ọrụ kwesịrị ya.


NKPUGHE 3:10
“Nꞌime nsogbu ndị a ha na-enye gị nꞌihi aha m, i sitela na ntachi obi sọpụrụ okwu m nile. Nꞌihi nke a, aga m ekpuchi gị site nꞌoke mkpagbu ahụ, ya na oke ọnwụnwa ahụ ga-abịakwasị ụwa. Ihe ndị a bụ ihe ga-anwapụta okwukwe ndị ga-adị ndụ.


NKPUGHE 3:14
“Dee akwụkwọ a nye mmụọ ozi nzukọ dị na Laodisia. Ọzi a sitere nꞌaka onye ahụ a na-apụghị iwezụga nꞌọnọdụ ya. Ọ bụkwa onye àma kwesịrị ntụkwasị obi banyere ihe nile dị ugbu a, na nke dịrị na mgbe ochie, na nke gaje ịdị ruo mgbe ebighị ebi. Ya onwe ya bụkwa onye kachasị ihe nile elu, bụrụkwa isi mmalite ihe nile Chineke kere.


NKPUGHE 3:19
Onye ọ bụla m hụrụ nꞌanya ka m na-ezi ihe site nꞌịta ya ahụhụ. Nꞌihi nke a, aghaghị m ịta gị ahụhụ pụrụ iche ma ọ bụrụ na i chegharịghị site nꞌọrụ ọjọọ gị na enweghị nghọta dị nꞌime gị bụrụ onye nwere ịnụ ọkụ nꞌobi nꞌihe Chineke.


NKPUGHE 3:20
“Lee, ana m eguzo ugbu a nꞌọnụ ụzọ obi gị na-akụ aka. Ọ bụrụ na onye ọ bụla anụ olu m mgbe m na-akpọ oku meghepụrụ m ụzọ, aga m abata bịakwute ya, sorokwa ya nwekọọ ihe. Ya onwe ya ga-esorokwa m nwekọọ ihe.


NKPUGHE 6:9
Ma mgbe a nyakapụrụ akara nke ise, ahụrụ m otu ebe ịchụ aja. Nꞌokpuru ebe ịchụ aja ahụ ka m hụrụ mkpụrụ obi ndị nile nwụrụ anwụ nꞌihi ozi ọma nke Chineke na nꞌihi na ha guzosịrị ike ịgba ama nke eziokwu na nke ndụ zuru oke.


NKPUGHE 9:9
Ha yikwasịrị onwe ha ihe mgbochi obi e ji igwe kpụọ. Nku ha na-eme mkpọtụ dị ka mkpọtụ a na-anụ mgbe ụsụ ndị agha na-aga ibu agha.


NKPUGHE 9:17
Nꞌime ọhụ m, ahụrụ m inyinya ha, hụkwa ndị nọkwasịrị ha nꞌelu. Ndị nọ nꞌelu inyinya ndị a yi uwe igwe e ji ekpuchi obi, nke ụfọdụ nꞌime ha na-acha ọbara ọbara. Ụfọdụ na-acha dị ka akpụkpọ eluigwe, ụfọdụ na-acha odo odo. Ụfọdụ na-acha dị ka anwụrụ ọkụ. Isi inyinya ha dị ka isi ọdụm, anwụrụ ọkụ na ọkụ na nkume ọkụ si ha nꞌọnụ na-apụta.


NKPUGHE 9:20
Ma ndị mmadụ ahụ nile e mere ka ha dịrị ndụ, ndị ọnwụ a na ihuju anya ndị a na-adakwasịghị, mechiri obi ha, jụ ịkpọ isi ala nye Chineke. Ha jụrụ ịkwụsị ife mmụọ ọjọọ ofufe. Ha jụkwara ịkwụsị ife arụsị ha nile nke ha ji ọlaedo na ọlaọcha na igwe na nkume na osisi kpụọ. Chi ndị a nwere anya ma ha adịghị ahụ ụzọ, nke nwere ụkwụ, ma ha adịghị eje ije.


NKPUGHE 9:21
Ọ dịkwaghị mgbe ọ bụla ha chigharịrị site nꞌizu ọjọọ nke obi ha, nke igbu mmadụ na ikpere arụsị na ịkwa iko na izu ohi pụta.


NKPUGHE 11:6
A ga-enyekwa ndị àma abụọ ahụ ike imechi eluigwe ime ka mmiri ozuzu ọ bụla ghara izo nꞌụwa nꞌime afọ atọ na ọkara ahụ ha ga-ebu amụma ha. A ga-enyekwa ha ike ime ka osimiri na mmiri nta nile ghọọ ọbara. Ha ga-enwekwa ike ime ka ụdị ọrịa dị iche iche bịakwasị ụwa nile nꞌoge ọ bụla ha chepụtara nꞌobi ha.


NKPUGHE 12:12
Ṅụrịanụ ọṅụ ndị nile bi nꞌeluigwe. Unu ụmụ nke eluigwe ṅụrịanụ. Ka obi tọọkwa unu ụtọ. Ma ahụhụ dịrị unu ndị bi nꞌụwa, nꞌihi na ekwensu ejirila oke ọnụma bịakwute unu. Ọ makwaara na oge o nwere ehighị nne.”


NKPUGHE 12:17
Mgbe ahụ agwọ ahụ nke iwe juru obi megide nwanyị ahụ, jikesịrị ike pụọ, ibu agha megide ụmụ nwanyị ahụ nile fọdụrụ, bụ ndị nile na-edebe iwu Chineke na ndị na-ekwupụta na ha bụ ndị nke Jisọs.


NKPUGHE 13:10
Ụmụ Chineke ndị e buru ụzọ gbaa ama na a ga-adọta ha nꞌagha, ọ bụ ha ka a ga-adọtakwa nꞌagha, ma ndị a gbara ama na ha ga-anwụ ka a ga-egbukwa. Ka obi ghara ịlọ unu mmiri nꞌihi na nke a bụ ohere unu nwere igosi ntachi obi unu na okwukwe unu.


NKPUGHE 14:12
Ka nke a bụrụ ihe ịgba ume nye ndị Chineke, ime ha ka ha nwee ntachi obi nꞌọnwụnwa na nsogbu nile, nꞌihi na ha bụ ndị nsọ ya, ndị na-eguzosi ike bụrụ ndị na-erube isi nꞌiwu ya, na nꞌokwukwe ha nꞌime Jisọs ruo ọgwụgwụ ihe nile.”


NKPUGHE 15:6
Mmụọ ozi asaa ndị ahụ e nyere ike ịwụkwasị ụwa ihe otiti asaa ahụ sitere nꞌụlọ nsọ ahụ pụta. Ha yi uwe dị nnọọ ọcha, nke na-enweghị ntụpọ. Ha jikwa akpụkpọ dị warara e ji ọlaedo mee kee gburugburu obi ha.


NKPUGHE 16:9
Okpomọkụ ahụ si nꞌanwụ bịa rere onye ọ bụla ọkụ nꞌahụ. Nke a mere ka ndị mmadụ bido ịkọcha aha Chineke, onye zidatara ihe otiti ndị a. Ma ihe otiti a emeghị ka ha chegharịa nꞌobi ha, o meghị ka ha bido inye Chineke otuto.


NKPUGHE 17:14
Mgbe he kwekọtarịtara, ha ga-ebu agha megide Nwa atụrụ ahụ. Kama Nwa atụrụ ahụ ga-emeri ha nꞌihi na ọ bụ onyeisi nꞌebe ndị nile nwe mmadụ nọ. Ọ bụkwa eze ndị eze nile. Ndị ya bụkwa ndị a kpọrọ na ndị a họpụtara, na ndị kwesịkwara ntụkwasị obi.”


NKPUGHE 17:17
Nꞌihi na Chineke ga-eme ka ha zube ime otu ihe, ihe ga-emezu ọchịchọ obi ya. Ha nile ga-ekwekọtakwa iwere ike ọchịchị ha nyefee anụ ọhịa ahụ na-acha ọbara ọbara nꞌaka. A ga-esitekwa otu a mezuo okwu Chineke.


NKPUGHE 18:2
Mmụọ ozi a jiri olu dị ukwuu tie mkpu sị, “Obodo ukwu ahụ bụ Babilọn adaala. Ọ ghọọkwala ọgba ndị mmụọ ọjọọ na ebe obibi ndị mmụọ ọjọọ, na ebe obibi ụmụ nnụnụ rụrụ arụ.


NKPUGHE 18:3
Nꞌihi na mba nile esorola ya ṅụọ site na mmanya ọnụma ahụ na-eweta ọnwụ, nke e mere ka ọ bịakwasị ya nꞌihi ịkwa iko ya. Ndị ọchịchị nile nke ụwa esorola nwanyị a nwekọọ obi ụtọ. Ndị na-azụ ahịa nꞌụwa aghọọkwala ndị ọgaranya site nꞌịba ụba nke nwanyị a.”


NKPUGHE 18:7
O biela ndụ ime onwe ya obi ụtọ, na inwezu ihe nile gụrụ ya agụụ, mee ka ọnọdụ ya ugbu a bụrụ nanị iru uju na ahụ mgbakasị. Ọ na-anya isi na-asị, ‘Abụ m eze nwanyị nọ nꞌelu ocheeze m. Abụghị m nwanyị ihe ọ bụla kọrọ, dị ka nwanyị di ya nwụrụ, iru uju ọ bụla adịghị nye m.’


NKPUGHE 18:8
Ebe okwu dị otu a si ya nꞌọnụ pụta, iru uju nke ọnwụ na-eweta, ya na obi ọjọọ, na ọnwụ ga-abịakwasị ya nꞌotu ụbọchị. A ga-eji ọkụ rechapụ ya, nꞌihi na Onyenwe anyị, onye na-ekpe ya ikpe, bụ onye pụrụ ime ihe nile.”


NKPUGHE 18:13
Ha na ụda dị iche iche na mmanụ otite dị iche iche, na ọkpụrụkpụ eso osisi na-esi isi ụtọ, a na-akpọ frankinsensi, na mmanya na mmanụ olivu, na ụtụ ọka na ọka, na anụ ụlọ, na atụrụ, na inyinya na ụgbọ ala, na ndị ohu, na mkpụrụ obi mmadụ.


NKPUGHE 18:19
Ha ga-ekpokwasị aja nꞌisi igosi obi ọjọọ ha na-eti mkpu akwa na-asị, “Ewoo! Ewoo! Leenụ ka obodo a si laa nꞌiyi o! Obodo ukwu ahụ mere anyị ka anyị bụrụ ndị ọgaranya site nꞌakụ dị nꞌime ya. Ma ugbu a nꞌotu ntabi anya, ihe nile dị nꞌime ya erechapụla ọkụ!”


NKPUGHE 18:23
Abalị nile ga-abụkwa nanị oge ọchịchịrị nꞌihi na a gaghị ahụ, ọ bụladị otu oriọna nꞌime ya. Ọṅụ nke oriri ọlụlụ di na nwụnye agaghị adịkwa ọzọ. Olu obi ụtọ nke nwoke na nwanyị na-alụ di na nwụnye agaghị adịkwa. Nꞌụwa nile ka a maara ndị ahia nile si nꞌobodo a, ọ bụkwa mgbaasị ya ka o ji ghọgbuo mba nile nke ụwa.


NKPUGHE 19:7
Ka anyị ṅụrịanụ ọṅụ, ka obi tọọkwa anyị ụtọ. Ka anyị sọpụrụkwanụ ya nꞌihi na oge mmemme ọlụlụ di na nwụnye nke Nwa atụrụ ahụ eruola, nwụnye ya edoziekwala onwe ya.


NKPUGHE 19:11
Mgbe ahụ kwa elere m anya hụ ka eluigwe meghere. Ahụkwara m otu inyinya dị ọcha guzo nꞌebe ahụ. Onye nọkwasịrị nꞌelu ya bụ onye a kpọrọ aha ya Onye kwesịrị ntụkwasị obi na Onye eziokwu. Ọ bụ onye na-ebu agha na onye na-enye ahụhụ nꞌụzọ ziri ezi.


NKPUGHE 20:4
Mgbe ahụ ahụkwara m ocheeze, hụkwa ndị nọ nꞌelu ya. Ha bụ ndị e nyere ike ikpe ikpe. Ahụkwara m mkpụrụ obi ndị ahụ e bipụrụ isi nꞌihi ịgba ama banyere Jisọs na nꞌihi ikwusa okwu Chineke, na ndị ahụ e bipụrụ isi nꞌihi na ha akpọghị isi ala nye anụ ọhịa ahụ na oyiyi ya a tụrụ atụ, ma ọ bụ kwere ka a kaa ha akara ya nꞌegedege ihu ha, ma ọ bụ nꞌaka ha. Ha esitela nꞌọnwụ ghọọ ndị dị ndụ ọzọ, sorokwa Kraịst ugbu a na-achị isi otu puku afọ.


NKPUGHE 21:3
Anụkwara m oke olu si nꞌocheeze ahụ kwuo okwu sị, “Leenụ! Ebe obibi Chineke adịla ugbu a nꞌetiti ụmụ mmadụ. Ya na ha ga-ebikwa. Ha ga-abụkwa ndị ya. Ee, nꞌezie, Chineke nꞌonwe ya ga-anọkwa nꞌetiti ha bụrụkwa Chineke ha.


NKPUGHE 21:5
Onye ahụ nọ nꞌocheeze ahụ gwara m okwu sị, “Lee, ana m eme ka ihe nile dị ọhụrụ. Dee ihe ndị a nꞌakwụkwọ nꞌihi na ihe m na-agwa gị ugbu a bụ ihe e kwesịrị ịtụkwasị obi, bụrụkwa eziokwu.


NKPUGHE 21:8
Ma ndị na-atụ ụjọ, ndị na-alaghachi azụ site nꞌiso m, ha na ndị na-adịghị atụkwasị m obi, na ndị na-emetọ onwe ha, na ndị ogbu mmadụ, na ndị na-akwa iko, na ndị ha na mmụọ ọjọọ na-akparịta ụka, na ndị na-ekpere arụsị, na ndị ụgha nile, ihe ha ga-eketa bụ ikpe ọmụma nke ịbanye nꞌime olulu ahụ e ji nkume na-enwụ ọkụ kwanye ọkụ.”


NKPUGHE 22:6
Mgbe ahụ mmụọ ozi ahụ gwara m okwu sị m, “Okwu ndị a kwesịrị ka a tụkwasị ha obi. Ha bụkwa eziokwu. Onyenwe anyị Chineke, onye na-enye ndị amụma Mmụọ ya ezitela mmụọ ozi ya ịgwa gị ihe ndị ahụ ga-emezu nꞌoge na-adịghị anya.


Igbo Bible 1988
No Data