A A A A A

Chọọ
MATIU 1:1
Ndị a bụ nna nna Jisos onye nzọpụta nwa Devidi na Eberaham.


MATIU 1:16
Jekọb mụrụ Josef onye bụ di Meri nne Jisos onye nzọpụta.


MATIU 1:18
Banyere ọmụmụ Jisos onye nzọpụta, Chineke mere ka Meri nne ya bụ nwagbọghọ na-amaghị nwoke dịrị ime site nꞌike Mmụọ Nsọ, mgbe otu nwoke a na-akpọ Josef na-achọ ịlụ ya.


MATIU 2:4
Herọd kpọrọ ndị isi nchụaja na ndị ozizi iwu jụọ ha sị, “Ebee ka ndị amụma kwuru na a ga-anọ mụọ Onye nzọpụta ahụ?”


MATIU 2:23
Mgbe o ruru Galili, ha gara biri nꞌobodo nta Nazaret. Site nꞌụzọ dị otu a, ihe ndị amụma kwuru banyere Onye nzọpụta mezuru. Nꞌihi na ha buru amụma sị, “A ga-akpọ ya onye Nazaret.”


MATIU 12:23
Ọrụ a Jisọs rụrụ juru igwe mmadụ nọ nꞌebe ahụ anya. Nꞌihi ya, ha kwuru sị, “Ọ̀ ga-abụ na nwoke a bụ Onye nzọpụta ahụ, Nwa Devidi?”


MATIU 16:16
Saịmọn Pita zara sị ya, “Ị bụ Onye nzọpụta ahụ, Ọkpara Chineke dị ndụ.”


MATIU 16:20
Mgbe ahụ, Jisọs nyere ndị na-eso ụzọ ya iwu ka ha ghara ime ka ndị ọzọ mata na ya bụ Onye nzọpụta ahụ.


MATIU 22:42
“Gịnị ka unu na-eche banyere Onye nzọpụta ahụ? Nwa onye ka ọ bụ?” Ha zara sị ya, “Ọ bụ nwa Devidi.”


MATIU 23:10
Unu ekwela ka a kpọọ unu ndị ndu, nꞌihi na ọ bụ nanị otu onyendu ka unu nwere, onye bụ Onye nzọpụta ahụ.


MATIU 24:5
Nꞌihi na ọtụtụ mmadụ ga-abịa ndị ga-asịkwa, ‘Abụ m Onye nzọpụta ahụ.’ Ha ga-eduhiekwa ọtụtụ ndị ọzọ.


MATIU 24:23
“Mgbe ahụ, ọ bụrụ na onye ọ bụla asị unu, ‘Ahụrụ m Onye nzọpụta ahụ, ọ nọ nꞌebe a, ma ọ bụ nꞌebe ọzọ’ unu ekwela.


MATIU 24:24
Nꞌihi na ndị ga-asị na ha bụ Onye nzọpụta, ha na dị amụma ụgha ga-apụta. Ha ga-eme ihe ịtụnanya dị iche iche. Ọ bụrụ na ọ gaara ekwe mee, ha ga-esite nꞌọrụ ebube ha ga-arụ duhie, ọ bụladị ndị ahụ Chineke họpụtara.


MATIU 24:26
“Ya mere, ọ bụrụ na onye ọ bụla agwa unu na Onye nzọpụta abịala, na ọ nọ nꞌime ọzara, ma ọ bụ na ọ dị ebe o zoro onwe ya, unu ekwela.


MATIU 26:63
Ma Jisọs ekwụghị ihe ọ bụla. Onyeisi nchụaja jụkwara ya ajụjụ ọzọ sị, “Eji m aha Chineke dị ndụ nye gị iwu, sị gị, gwa anyị, ị bụ Onye nzọpụta ahụ, Ọkpara Chineke?”


MATIU 26:64
Jisọs zara ya sị, “Ee, abụ m ya. Nꞌezie asị m unu, na mgbe na-adịghị anya, unu ga-ahụ m, bụ Onye nzọpụta ahụ, ka m na-anọdụ nꞌaka nri Chineke. Unu ga-ahụkwa m mgbe m ga-abịa nꞌigwe ojii nke eluigwe.”


MATIU 26:68
“Ị bụrụ onye amụma nꞌezie, bụrụkwa Onye nzọpụta ahụ, kpọọ aha onye tiri gị ihe.”


MATIU 27:17
Mgbe ndị Juu nile zukọrọ, Pailet jụrụ ha ajụjụ sị, “Onye ka unu chọrọ ka m hapụrụ unu, ọ̀ bụ Barabas ka ọ bụ Jisọs onye a na-akpọ Onye nzọpụta?”


MATIU 27:22
Pailet jụrụ ha ajụjụ sị, “Gịnị ka unu chọrọ ka m jiri Jisọs Onye nzọpụta mee?” Ha nile tiri mkpu nꞌoke olu sị, “Kpọgide ya nꞌobe!”


MATIU 27:42
“Ọ na-azọpụta ndị ọzọ, ma o nweghị ike ịzọpụta onwe ya. Ị bụkwaghị eze ndị Juu? Ọ dị mma, si nꞌelu obe rịdata, anyị ga-ekwerekwa na ị bụ Onye nzọpụta.


MAK 8:29
Ma Jisọs jụrụ ha sị, “Onye ka unu onwe unu na-eche na m bụ?” Pita zara sị ya, “Ị bụ Kraịst, Onye nzọpụta ahụ anyị na-ele anya ya!”


MAK 12:35
Emesịa, mgbe Jisọs nọ na-ezi ndị mmadụ ihe, ọ jụrụ ha ajụjụ sị, “Gịnị mere ndị ozizi iwu unu ji na-sị na Onye nzọpụta ahụ na-abịa bụ nwa Devidi?


MAK 12:37
Devidi nꞌọnwe ya kpọrọ Onye nzọpụta a Onyenwe anyị. Oleekwanụ ụzọ Onye nzọpụta siri bụrụ nwa Devidi?” Ụdị okwu a tọrọ ndị na-ege Jisọs ntị ụtọ nꞌobi. O mekwara ka ha gezie ntị nke ọma.


MAK 13:5
Jisọs sịrị ha, “Lezienụ anya ka onye ọ bụla hapụ iduhie unu. Nꞌihi na ọtụtụ mmadụ ga-abịa nꞌaha m sị na ha bụ Onye nzọpụta ahụ. Ha ga-eduhiekwa ọtụtụ mmadụ ndị ga-ege ha nti.


MAK 13:21
“Nꞌoge ahụ, ọ bụrụ na onye ọ bụla abịakwute unu sị, ‘Lee! onye a bụ Onye nzọpụta ahụ, ma ọ bụ onye ahụ bụ Onye nzọpụta ahụ,’ unu ekwela.


MAK 13:22
Nꞌihi na ọtụtụ ndị nzọpụta ụgha na ndị amụma ụgha ga-apụta ìhè nꞌoge ahụ. Ha ga-arụ ọrụ ebube ha ga-eji gbalịa ịghọgbu ndị Chineke họpụtara, ma ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee.


MAK 14:61
Ma Jisọs ekwughị okwu ọ bụla. Ọzọ kwa, onyeisi nchụaja jụrụ Jisọs sị, “Ị̀ bụ Onye nzọpụta ahụ, Ọkpara Chineke bụ Onye a gọziri agọzi?”


MAK 15:32
Ha tikuru Jisọs sị ya, “Bịa, Onye nzọpụta, eze Izirel, si nꞌelu obe ahụ rịdata! Anyị ga-ekwerekwa na ị bụ ihe nile i kwuru na ị bụ.” Ndị ahụ akpọgidekọrọ ha na Jisọs nꞌobe nọkwa na-abụ ya ọnụ.


LUK 1:17
Dị ka Ịlaija siri bụrụ nwoke dị ike, na onye jupụtara na Mmụọ Nsọ, otu a ka Jọn ga-adị. Ọ bụ ya ga-aga nꞌihu Onye nzọpụta ahụ na-abịa, kwadoo ndị mmadụ ịnabata Onyenwe anyị. Jọn ga-emekwa ka udo dịrị nꞌetiti ndị nna na ụmụ ha, ọ ga-akpọghachitekwa ndị na-enupụ isi mee ka ha bụrụ ndị ga-eche uche dị ka ndị ezi omume.”


LUK 1:47
Obi ụtọ ejupụtala mkpụrụ obi m nꞌihi Chineke Onye nzọpụta m.


LUK 1:69
O nyela anyị Onye nzọpụta dị ike site nꞌezinụlọ ohu ya nwoke bụ Devidi,


LUK 1:76
“Gị nwa m nwoke, a ga-akpọ gị onye amụma nke Chineke kachasị ihe nile elu. Nꞌihi na ị ga-aga nꞌihu Onye nzọpụta ahụ, ikwado ụzọ maka ọbịbịa ya.


LUK 1:77
Ịgwa ndị mmadụ otu ha ga-esi chọta nzọpụta site nꞌinwe mgbaghara nꞌihi mmehie ha.


LUK 1:78
Nꞌihi na site nꞌoke obiọma Chineke, anyị ga-abanye na mgbe na-adịghị anya, nꞌụbọchị ọhụrụ nke na-eweta nzọpụta si nꞌeluigwe bịa.


LUK 2:11
Nꞌihi na taa, na Betilehem, obodo Devidi, ka a nọ mụọra unu onye nzọpụta nke bụ onye ahụ Onyenwe anyị họpụtara!


LUK 2:26
Ma Mmụọ Nsọ Chineke mere ka Simiọn mata na ọ gaghị anwụ tutuu ruo mgbe ọ hụrụ Onye nzọpụta ahụ Chineke kwere nkwa izite.


LUK 2:30
Nꞌihi na anya m ahụla nzọpụta ahụ i kwere na nkwa izite, nke i kwadoro nꞌihi ndị bi nꞌụwa.


LUK 2:34
Emesịa, Simiọn gọziri ha, tụgharịa gwa Meri okwu sị ya, “Ị hụrụ nwanta a? Ọ bụ onye Chineke họpụtara ịbụ ụzọ nzọpụta na ịla nꞌiyi nye ọtụtụ ndị Izirel. Nꞌihi na ụdị ụzọ e si enwe ndụ ọhụrụ nke ọ ga-egosi ndị mmadụ, bụ ụzọ nke ọtụtụ mmadụ ga-ekwukwa okwu megide.


LUK 3:6
Mmadụ nile ga-ahụkwa nzọpụta Chineke!”


LUK 3:15
Nꞌoge a, onye ọ bụla nọ na-ele ọbịbịa Onye nzọpụta ahụ. Ha nọkwa na-atule nꞌobi ha ma Jọn ọ bụ Onye nzọpụta ahụ.


LUK 4:41
Mmụọ ọjọọ dị iche iche si nꞌime ọtụtụ mmadụ pụta na-eti mkpu na-asị, “Ị bụ Ọkpara Chineke!” Ma Jisọs baara ha mba, kwụsị ha ikwu okwu, nꞌihi na ha maara na ọ bụ Onye nzọpụta ahụ.


LUK 9:20
Ma Jisọs jụrụ ha sị, “Unu kwanụ? Onye ka unu sị na m bụ?” Pita zara ya sị, “Ị bụ Kraịst Onye nzọpụta ahụ Chineke zitere.”


LUK 11:16
Ndị ọzọ nwakwara ya ọnwụnwa sị ya gosi ha ihe ịrịba ama na mbara eluigwe iji gosi na ọ bụ Onye nzọpụta.


LUK 11:29
Mgbe ọtụtụ mmadụ na-abịa, na-agba Jisọs gburugburu, Jisọs gwara ha sị, “Ndị ọgbọ a bụ nnọọ ndị ọjọọ. Ha nọgidesịrị ike na-arịọ m ka m meere ha ihe ịrịba ama nke ga-egosi ha na m bụ Onye nzọpụta. Ma ọ dịghị ihe ịrịba amua ọ bụla a ga-egosi ha karịa ihe ịrịba ama Jona.


LUK 15:7
“Nꞌụzọ dị otu a, ọṅụ na-adị nꞌeluigwe nꞌihi otu onye mmehie nke chegharịrị, karịa ndị ezi omume iri toolu na toolu ndị mkpa nzọpụta na-adịghị akpa.


LUK 18:31
Mgbe ahụ Jisọs kpọrọ mmadụ iri na abụọ ahụ na-eso ụzọ ya gwa ha okwu sị, “Leenụ anya ugbu a, anyị na-aga Jerusalem. Nꞌebe ahụ ihe nile ndị amụma dere na ọ ga-adakwasị Onye nzọpụta ahụ ga-adakwasị m.


LUK 20:41
Ma Jisọs jụrụ ha sị, “Gịnị mere ndị mmadụ ji na-asị na Onye nzọpụta ahụ na-abịa bụ nwa Devidi?


LUK 20:44
Devidi nꞌonwe ya kpọrọ Onye nzọpụta ahụ Onyenwe anyị. Oleekwanụ otu Onye nzọpụta siri bụrụ nwa Devidi?”


LUK 21:8
Jisọs zara ha sị, “Kpacharanụ anya unu, ka onye ọ bụla hapụ iduhie unu. Nꞌihi na ọtụtụ ndị mmadụ ga-abịa nꞌoge dị nꞌihu, ndị ga-asị na ha bụ Kraịst, onye nzọpụta ahụ. Ha ga-asịkwa na oge ahụ eruola. Ma unu esokwala ha.


LUK 22:67
Mgbe ahụ ha bidoro ịjụ ya ajụjụ sị, “Ọ bụrụ na ị bụ Onye nzọpụta ahụ, gwa anyị.” Ma Jisọs gwara ha sị, “Ọ bụrụ na m agwa unu, unu agaghị ekwenye.


LUK 23:35
Ọtụtụ mmadụ guzoro na-ele Jisọs anya. Kama ndị ndu ndị Juu nọ na-achị ya ọchị. Ha gwara ya okwu sị, “Leenụ ya ugbu a! Ọ na-azọpụta ndị ọzọ ma o nweghị ike ịzọpụta onwe ya. A sị na ọ bụ Onye nzọpụta, onye Chineke họpụtara, ya zọpụtanụ onwe ya.”


LUK 23:39
Otu nꞌime ndị na-emebi iwu ahụ a kpọgidere nꞌelu obe nꞌụbọchị ahụ kwujọkwara Jisọs sị ya, “Ana m eche na ị bụ Onye nzọpụta. Zọpụtanụ onwe gị, zọpụtakwa anyị!”


LUK 24:46
Ọ gwara ha sị, “E dere ya rị nꞌoge gara aga na Onye nzọpụta ahụ ga-ahụ ahụhụ, nwụọ, na ọ ga-ebilikwa nꞌụbọchị nke atọ.


JỌN 1:20
Ma Jọn omee baptizim ezoghị ihe ọ bụla nꞌebe ha nọ. Kama ọ gwaghere ha ọnụ sị ha, “Mụ onwe m abụghị m Onye nzọpụta ahụ.”


JỌN 1:25
Ha jụrụ Jọn ajụjụ ọzọ sị, “Ọ bụrụ na ị bụghị Onye nzọpụta ahụ, ma ọ bụ Ịlaịja, ma ọ bụ onye amụma ahụ, gịnị mere i ji eme ọtụtụ mmadụ baptizim?”


JỌN 1:41
Anduru siri nꞌebe ahụ pụọ chọta Pita nwanne ya sị ya “Anyị achọtala Onye nzọpụta ahụ.”


JỌN 1:45
Emesịa, Filip pụrụ chọta nwoke a ana-akpọ Nataniel gwa ya sị, “Anyị ahụla Onye nzọpụta ahụ. Onye ahụ Mosisi na ndị amụma kwuru ihe banyere ya, Jisọs nwa Josef, onye obodo Nazaret.”


JỌN 1:50
Jisọs jụrụ Nataniel ajụjụ sị, “Ì kweere na m bụ Onye nzọpụta ahụ nꞌihi na m gwara gị na m hụrụ gị nꞌokpuru osisi fiigi ahụ? Nꞌezie, ị ga-ahụ ihe dị ukwuu karịa nke a, nke pụrụ igosi gị na mụ onwe m bụ Onye nzọpụta ahụ nꞌeziokwu.


JỌN 1:51
Ị ga-ahụ ka eluigwe meghere, hụkwa ndị mmụọ ozi Chineke ka ha na-arigo naarịdatakwa ịbịakwute m bụ Onye nzọpụta.”


JỌN 2:23
Nꞌihi ihe ịrịba ama nile Jisọs mere na Jerusalem, igwe mmadụ kweere na ọ bụ Onye nzọpụta ahụ nꞌezie.


JỌN 3:13
Ọ gwụchaala Onye nzọpụta ahụ si nꞌeluigwe rịdata. Ọ bụkwa mụ onwe m bụ ya. Ọ bụkwa m ga-alaghachi azụ nꞌeluigwe.


JỌN 3:17
Chineke eziteghị Ọkpara ya nꞌụwa ka ọ bịa kpee ụwa ikpe. Kama o zitere ya, ka ụwa site nꞌaka ya nwee nzọpụta.


JỌN 3:28
Unu nile ga-agbara m ama na m gwara unu na mbụ sị, ‘Abụghị m Onye nzọpụta ahụ.’ Ọrụ m bụ nanị ikwadebere ya ụzọ, na ime ka mmadụ nile mara ya.


JỌN 4:22
Ihe dị mkpa abụghị ebe anyị nọ kpọọ isi ala nye Chineke. Kama ọ bụ otu anyị siri kpọọ isi ala. Anyị na-esite nꞌime obi anyị kpọọ isi ala? Anyị na-akpọ isi ala site nꞌinyeaka nke Mmụọ Nsọ? Chineke bụ mmụọ. Anyị apụkwaghị ịkpọ isi ala nye ya nꞌụzọ ziri ezi ma ọ bụghị site nꞌinyeaka ya. Nke a bụ ụdị ịkpọ isi ala Chineke chọrọ site nꞌaka anyị. Unu bụ ndị Sameria maara ntakịrị banyere nke a. Unu na-akpọ isi ala nꞌisi. Anyị ndị Juu maara ihe nile banyere ya nꞌihi na nzọpụta rutere ụwa site nꞌaka ndị Juu!”


JỌN 4:25
Nwanyị ahụ zara ya sị, “Amaara m na Onye nzọpụta ga-abịa, onye ahụ ha na-akpọ Kraịst. Mgbe ọ bịara, ọ gaeme ka ihe nile doo anyị anya.”


JỌN 4:26
Mgbe ahụ Jisọs gwara ya sị, “Abụ m Onye nzọpụta ahụ!”


JỌN 4:29
“Bịanụ lee nwoke gwara m ihe nile m mere! Ọ̀ ga-abụ na nwoke a bụ Onye nzọpụta ahụ?”


JỌN 4:39
Ọtụtụ nꞌime ndị sitere nꞌobodo Sameria kweere na Jisọs bụ Onye nzọpụta ahụ nꞌihi ama nwanyị ahụ gbara, na-asị, “Ọ gwara m ihe nile m mere.”


JỌN 4:53
Otu mgbe ahụ nwoke a ghọtara ihe mere ahụ jiri dị nwa ya mma. Oge ahụ bụ mgbe Jisọs gwara ya sị, “Ahụ nwa gị nwoke adịla ya mma.” Nwoke ahụ na ezinụlọ ya nile kweere na Jisọs bụ Onye nzọpụta ahụ.


JỌN 7:26
Lee! Ọ na-ekwusi okwu ike ma o nweghị ihe ha na-agwa ya! Ma eleghị anya ndị isi achọpụtala na ọ bụ Onye nzọpụta ahụ ga-abịa.


JỌN 7:27
Ma anyị maara ebe a mụrụ nwoke a. Mgbe Onye nzọpụta ahụ ga-abịa mmadụ ọ bụla agaghị ama ebe o siri pụta.”


JỌN 7:31
Ma ọtụtụ mmadụ nọ nꞌebe ahụ kweere na ya. Ihe ha kwuru bụ nke a, “Mgbe Onye nzọpụta ahụ ga-abịa, ọ̀ ga-arụ ọrụ ebube ọzọ karịrị nke nwoke a rụrụ?”


JỌN 7:41
Ụfọdụ sịrị, “Nke a bụ Onye nzọpụta ahụ e kwere na nkwa.” Ma ụfọdụ sịrị, “Onye nzọpụta ahụ e kwere na nkwa ọ̀ ga-esi Galili pụta?


JỌN 7:48
Ò dị onyeisi ndị Juu ma ọ bụ onye Farisii unu hụrụ kweere na nwoke a bụ Onye nzọpụta ahụ?


JỌN 8:24
Ọ bụ nꞌihi nke a ka m ji gwa unu na unu ga-anwụ nꞌime mmehie unu. Nꞌihi na ọ bụrụ na unu ekweghị na abụ m Onye nzọpụta ahụ, Ọkpara Chineke, unu ga-anwụ nꞌime mmehie unu.”


JỌN 8:28
Nꞌihi nke a, Jisọs dọrọ ha aka na ntị sị, “Mgbe unu mere ka m nwụọ, unu ga-amata na unu egbuola Onye nzọpụta ahụ, bụ onye Chineke zitere. Unu ga-amatakwa na ihe nile m gwara unu esiteghị nꞌuche m kama ha bụ ihe nile Nna m chọrọ ka m gwa unu.


JỌN 8:56
Nna unu Eberaham ṅụrịrị ọṅụ nke ukwuu ma chọsiekwa ike ịhụ ụbọchị ndị a anya. Ọ ṅụrịrị ọṅụ nꞌihi na ọ matara na mụ onwe m ga-abụ Onye nzọpụta ahụ.”


JỌN 9:22
Ihe a ka ndị mụrụ ya kwuru nꞌihi na ha na-atụ egwu ndị Juu. Ndị Juu ekpebiela na ọ bụrụ na onye ọ bụla ekwuo na Jisọs bụ Onye nzọpụta ahụ, ha ga-achụpụ onye ahụ site nꞌụlọ ekpere ha.


JỌN 10:24
Nꞌebe ahụ ndị Juu gbara ya gburugburu sị ya, “Ruo ole mgbe ka ị gaedebe anyị nꞌọnọdụ olileanya? Ọ bụrụ na ị bụ Onye nzọpụta ahụ, gwaghee anyị ọnụ!”


JỌN 11:27
Mata zara ya sị, “E, Onyenwe m, ekweere m na ị bụ Onye nzọpụta ahụ. Ọkpara Chineke, Onye anyị na-ele anya ya.”


JỌN 12:34
Ndị mmadụ jụrụ ya sị. “A na-akuziri anyị nꞌime akwụkwọ iwu na onye ahụ bụ Onye nzọpụta agaghị anwụ anwụ. Na ọ ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. Gịnị mere i ji na-asị na Onye nzọpụta ga-anwụ?”


JỌN 20:31
Kama e dere ihe ndị a nile ka unu site nꞌịgụ ya kwere na Jisọs bụ Onye nzọpụta ahụ. Ka unu kwere na ọ bụ Ọkpara Chineke. Ọ bụrụ na unu ekwere, unu ga-enwe ndụ ọhụrụ site nꞌaha ya.


ỌLU OZI 2:36
“Ya mere, ana m eme ka ndị Izirel nile mara nke ọma, na Chineke emeela Jisọs onye unu kpọgidere nꞌobe ka ọ bụrụ Onyenwe anyị na Onye nzọpụta!”


ỌLU OZI 3:20
Onyenwe anyị ga-emekwa ka agbamume nke ime mmụọ rute unu aka. Ọ ga-ezitekwara unu Jisọs Onye nzọpụta ahụ unu na-ele anya ya.


ỌLU OZI 4:27
Nꞌihi na Herọd, na Pailet na ndị ụwa nile, na ndị Izirel ezukọtaala imegide Jisọs, Ohu gị dị nsọ, onye ị họpụtara ka ọ bụrụ Onye nzọpụta!


ỌLU OZI 5:31
Chineke ebuliela ya elu mee ya ka ọ nọdụ nꞌaka nri ya, ka ọ bụrụ Onyendu na Onye nzọpụta, iwetara Izirel nchegharị, na mgbaghara mmehie.


ỌLU OZI 7:52
Kpọọ onye amụma ahụ aha nke nna nna unu na-akpagbughị! Ha gburu ndị ahụ buru amụma banayere ọbịbịa onye ezi omume ahụ, bụ Onye nzọpụta ahụ unu raara nye, onye e gbukwara.


ỌLU OZI 7:56
Ọ gwara ndị Juu ahụ okwu sị, “Lee! Ahụrụ m ka eluigwe meghere, hụkwa Jisọs Onye nzọpụta ka o guzo nꞌaka nri Chineke!”


ỌLU OZI 8:12
Ma mgbe Filip kwusasịrị ozi ọma, ha kweere na Jisọs, na ọ bụ Onye nzọpụta. Ha kwekwara ihe nile Filip kwuru banyere alaeze Chineke. E mere ọtụtụ nꞌime ha baptizim, nwoke na nwanyị ha.


ỌLU OZI 9:22
Ma Sọl akwụsịghị ikwusa ozi ọma! Kama ike ikwusa ozi ọma ya na-aba ụba. Ọ gara nꞌihu imeri ndị Juu site nꞌụzọ o siri gosi ha site nꞌakwụkwọ nsọ na Jisọs bụ Onye nzọpụta ahụ.


ỌLU OZI 10:36
Ana m eche na unu anụla ihe banyere ozi ọma ahụ Chineke zigaara ndị Juu. Ozi ọma nke na-asị na udo dị ugbu a nꞌetiti Chineke na mmadụ site nanị na Jisọs, Onye nzọpụta na Onyenwe ihe nile.


ỌLU OZI 10:48
Nꞌihi nke a, Saimọn Pita mere ha baptizim nꞌaha Jisọs Kraịst Onye nzọpụta. Mgbe ihe ndị a gasịrị, Kọniliọs rịọrọ Pita ka o soro ya bikọọ ụbọchị ụfọdụ.


ỌLU OZI 11:14
Mmụọ ozi ahụ gwakwara ya sị, ‘Pita ga-akọwara gị ihe nile banyere nzọpụta nke gị na nke ndị ezinụlọ gị nile.’


ỌLU OZI 13:23
Jisọs, onye si nꞌezinụlọ Devidi pụta, bụkwa Onye nzọpụta ahụ Chineke kwere nkwa izite.


ỌLU OZI 13:25
Nꞌoge Jọn omee baptizim na-akwado ịrụsị ọrụ ya, ọ jụrụ ndị Juu nile ajụjụ sị, ‘Unu chere na abụ m Onye nzọpụta ahụ? Ọ dịghị, abụghị m ya. Kama lezienụ anya, nꞌihi na ọ ga-abịa nꞌoge na-adịghị anya. A pụkwaghị iji m tụnyere ya, nꞌihi na etozughị m oke ịtọpụ akpụkpọ ụkwụ o yi nꞌụkwụ ya.’


ỌLU OZI 13:26
“Ya mere ụmụnna m, unu ụmụ Eberaham, na unu bụ ndị mba ọzọ na-asọpụrụ Chineke. Nzọpụta a dịịrị anyị nile.


ỌLU OZI 13:27
Ndị Juu bi na Jerusalem na ndị isi ha amataghị na Jisọs bụ Onye nzọpụta ahụ. Ha aghọtakwaghị okwu nile ndị amụma dere, okwu nke a na-agụpụta na ntị ha kwa izu. Ma ha mere ka okwu ahụ ndị amụma kwuru mezuo, mgbe ha mara Jisọs ikpe ọnwụ.


ỌLU OZI 13:47
Nꞌihi na nke a bụ ihe Chineke nyere nꞌiwu mgbe o kwuru sị, ‘E meela ka unu bụrụ ìhè nye ndị mba ọzọ, ka unu site nꞌebe nile ụwa sọtụrụ dubata ha nꞌụzọ nzọpụta.’ ”


ỌLU OZI 15:24
“E mere ka anyị mata na ụfọdụ ndị kwere ekwe si nꞌetiti anyị ebuterela unu nsogbu na ọgba aghara banyere nzọpụta unu. Ha etinyerela unu obi ịlọ mmiri. Ma nꞌezie, ọ bụghị anyị zitere ha nꞌebe unu nọ.


ỌLU OZI 17:3
Ọ na-akọwakwa ihe ndị amụma kwuru banyere ahụhụ nile Onye nzọpụta ga-ahụ na mbilite nꞌọnwụ ya. Site nꞌokwu ndị a o mekwara ka ha mata na Jisọs bụ Onye nzọpụta ahụ.


ỌLU OZI 18:5
Mgbe Sailas na Timoti sitere na Masidonia bịa izute Pọl, Pọl tinyere oge ya nile ikwu okwu Chineke na ịkọwara ndị Juu na Jisọs bụ Onye nzọpụta ahụ.


ỌLU OZI 18:28
Nꞌihu ndị mmadụ nile, o guzoro kwuo okwu megide ozizi ọjọọ na ịrụ ụka nile nke ndị Juu. O gosiri ha site nꞌakwụkwọ nsọ na Jisọs bụ Onye nzọpụta ahụ.


ỌLU OZI 20:27
Nꞌihi na esepụghị m aka ikwupụta nzọpụta Chineke nye unu.


ỌLU OZI 22:14
“Mgbe ahụ ka ọ gwara m sị, ‘Chineke nna anyị ha ahọpụtala gị ịmara uche ya na ịhụ Onye nzọpụta ahụ na ịnụ okwu ya.


ỌLU OZI 24:14
“Ma otu ihe ka m na-ekwupụta, ya bụ, na m kweere nꞌụzọ nzọpụta ahụ ha na-akpọ Otu onye Nazaret. Ana m eso uzọ a na-efe Chineke nna anyị ha ofufe. Ma ekwenyesịrị m ike nꞌiwu Mosisi, tinyere ihe nile e dere nꞌiwu Mosisi na nꞌakwụkwọ ndị amụma.


ỌLU OZI 26:23
Na Onye nzọpụta ahụ ga-ahụ ahụhụ bụrụkwa onye ga-esi nꞌọnwụ bilie iwetara ndị Juu na ndị mba ọzọ nzọpụta!”


ỌLU OZI 28:20
Akpọrọ m unu taa ka mụ na unu hụkọọ ka unu matakwa na anọ m nꞌagbụ nꞌihi okwukwe m kweere na Onye nzọpụta abịala.”


ỌLU OZI 28:28
Pọl kwukwara sị, “Ya mere, achọrọ m ka unu ghọta na okwu nzọpụta a si nꞌaka Chineke bịa dịkwaara ndị mba ọzọ. Ha ga-anatakwa ya.”


ROM 3:27
Ọ bụrụ na o si otu a dịrị, ọ dị ihe inya isi ọ bụla dị nye anyị? Chineke ọ zọpụtara anyị nꞌihi na anyị debere iwu? É,è, nzọpụta anyị dabeere nꞌokwukwe anyị nwere nꞌime Kraịst.


ROM 4:1
Ka anyị lee anya nihe ịma atụ anyị nwere nakwụkwọ nsọ. Gịnị ka anyị nwere ikwu banyere Eberaham, nna nna ndị Juu? Gịnị pụtara ìhè na ndụ Eberaham banyere inwe okwukwe na nzọpụta?


ROM 6:13
Ekwekwala ka akụkụ ọ bụla nke ahụ gị bụrụ ngwa ọrụ mmehie. Kama nyefee onwe gị kpamkpam nꞌaka Chineke, akụkụ ahụ gị nile, ka ị bụrụkwa ezi ngwa ọrụ nꞌaka ya. Nꞌihi na ọ bụ nzọpụta ka a zọpụtara gị site nꞌaka ọnwụ. Ka Chineke jiri gị rụpụta nzube ọma ya nile.


ROM 9:8
Nke a na-egosi na ọ bụghị ụmụ nile a mụrụ nꞌezinụlọ Eberaham bụ ụmụ Chineke. Kama ndị bụ ụmụ Chineke bụ ụmụ Eberaham ndị kweere nkwa nzọpụta ahụ Chineke kwere Eberaham.


ROM 10:6
Ma nzọpụta ahụ si nꞌokwukwe rute mmadụ aka adịghị ajụ ajụjụ sị, “Ònye pụrụ irigo nꞌeluigwe ịchọta Kraịst kudata ya nꞌụwa ka o nyere anyị aka?”


ROM 10:7
Nzọpụta ahụ adịghị ajụkwa sị, “Ònye kwa pụrụ ịrịdata nꞌime ili, ime ka Kraịst si nꞌọnwụ bilie dịrị ndụ ọzọ?”


ROM 10:8
Kama nzọpụta ahụ, nke okwukwe nꞌime Kraịst na-eweta na-agwa anyị sị, “Ozi ọma nzọpụta ahụ dị onye ọ bụla nso. Nꞌezie ozi ọma ahụ anyị na-ekwusa ihe gbasara ya dị gị nꞌọnụ, dịkwa nꞌime obi gị.


ROM 10:19
O dokwara ndị Juu anya na ọ bụrụ ha ha ajụ ịnabatara onwe ha ụzọ nzọpụta a, na Chineke ga-ewere ya nye ndị ọzọ. Nꞌihi na Mosisi kwuru sị na Chineke ga-akpasu ndị Juu iwe mee ka ha kwosi ndị mba ọzọ ekworo, nꞌihi nzọpụta ọ ga-enye ndị mba ọzọ.


ROM 11:6
Ọ bụrụ na a zọpụtara ha site nꞌobi ebere Chineke mgbe ahụ nzọpụta abụghị site nꞌọrụ ọma ha rụrụ. Nꞌihi na ọ bụrụ na a zọpụtara ha site nꞌọrụ ọma ha amara Chineke agaghị abụkwa onyinye a na-anata nꞌefu.


ROM 11:11
Nke a ò gosiri na Chineke ajụla ndị Juu ruo mgbe ebighị? Mbaa! Kama nzube Chineke bụ na ọ ga-esite nꞌọdịda ndị Juu mee ka nzọpụta ruo ndị mba ọzọ aka. Ọ chọkwara ka nnabata a ga-anabata ndị mba ọzọ kpalie mmụọ ekworo ndị Juu ịchọrọ onwe ha nzọpụta ahụ.


ROM 11:26
Mgbe ahụ a ga-azọpụta Izirel. Nꞌihi na nke a bụ ihe e dere nꞌakwụkwọ nsọ sị, “Onye nzọpụta ga-esi na Zayọn bịa. Ọ ga-eme ka ndị Juu nile site na ndụ ekweghị na Chineke tụgharịa.


1 KỌRINT 3:15
Ma ọ bụrụ na ọkụ erechapụ ihe ọ bụla mmadụ ji rụọ ọrụ ya, ọrụ ọ rụrụ ga-ala nꞌiyi, ma a ga-azọpụta onye ahụ, ma nzọpụta ahụ ga-adị ka a ga-asị na e si nꞌụlọ na-ere ọkụ zọpụta ya.


1 KỌRINT 9:23
Ana m eme ihe ndị a ka ozi ọma nwee ike ruo ha nile ntị. Ana m emekwa ya nꞌihi ngọzi m na-enweta mgbe m na-ele ha ka ha na-anabata Jisọs dị ka Onyenwe ha na Onye nzọpụta ha.


2 KỌRINT 3:6
Ọ bụ nanị Chineke mere ka anyị zuo oke ịbụ ndị ozi ya, na-akọwara ndị mmadụ ihe banyere ọgbụgba ndụ ọhụrụ nke Chineke chọrọ iji zọpụta ha. Anyị anaghị agwa ha na ọ dị mkpa ka ha debe iwu nile Chineke nyere, kama anyị na-agwa ha na ndụ dịrị ha site na Mmụọ Nsọ. Nꞌihi na ụzọ ochie ahụ nke inwe nzọpụta site nꞌidebe iwu na-eweta ọnwụ, ma nꞌime ụzọ ọhụrụ a, Mmụọ Nsọ na-enye ha ndụ.


2 KỌRINT 6:2
Ma geenụ ntị nꞌihe Chineke na-ekwu, “Nꞌoge a na-anara mmadụ nke ọma ka akwa unu rutere m ntị. Ọ bụkwa nꞌụbọchị nzọpụta ka m nyeere unu aka.” Ya mere, ugbu a bụ oge Chineke chọrọ inyere gị aka. Taa ka Chineke jikeere ịzọpụta gị.


GALETIA 1:7
Nꞌihi na ọ dịghị ozi ọma ọzọ dị, ma ọ bụghị nanị ozi ọma nzọpụta ahụ anyị kwusaara unu. Ma ụfọdụ mmadụ a, ndị na-agbanwe ozi ọma Kraịst, na eziokwu dị nꞌime ya, na-eduhie unu ime ka unu si nꞌezi ụzọ jehie.


GALETIA 2:17
Ọ bụrụ na anyị atụkwasị Kraịst obi ka ọ zọpụta anyị, mesịa chọpụta na anyị jehiere ụzọ ịtụkwasị ya obi, nꞌihi na nzọpụta dị nanị mgbe e biri anyị ugwu, na mgbe anyị debere iwu ndị Juu, ọ̀ gaghị abụ ihe ziri ezi ma ọ bụrụ na anyị ekwuo na okwukwe anyị nwere na Kraịst abụrụla ihe wetaara anyị ịla nꞌiyi? Ma Chineke ekwela na mmadụ ga-eche ụdị echiche a banyere Onyenwe anyị.


GALETIA 2:18
Kama aga m abụ onye na-emebi iwu ma ọ bụrụ na m ebido na-akwalị ozizi ochie ahụ m na-agbalị ịla nꞌiyi, bụ ozizi nke na-asị na nzọpụta na-adịrị nanị ndị debere iwu ndị Juu.


GALETIA 3:23
Tupuu Jisọs Kraịst abịa, e ji iwu na-eche anyị nche. Iwu nọ ọnọdụ dị ka ụlọ mkpọrọ ebe e tinyere anyị tutuu ruo mgbe anyị ga-enwere onwe anyị site nꞌịtụkwasị Kraịst Onye nzọpụta ahụ na-abịa obi.


GALETIA 5:11
Ụfọdụ mmadụ dị ndị na-asị na m na-ekwusa na-asị na ibi mmadụ ugwu na idebe omenala ndị Juu dị mkpa tupuu azọpụta mmadụ. Ọ bụrụ nꞌezie na m na-ekwusa ihe dị otu a, agaghị m abụ onye a na-akpagbu, nꞌihi na ụdị okwu dị otu a adịghị ewetara onye na-ekwusa ya nsogbu. Ma ebe ọ bụ na a na-akpagbu m, o gosiri na ihe m na-ekwusa bụ na nzọpụta dị nanị site nꞌokwukwe nꞌobe Kraịst.


EFESỌS 1:13
Nꞌihi na otu a ka ọ dịkwa unu onwe unu. Unu kweere nꞌozi ọma ahụ na-eweta nzọpụta mgbe unu nụrụ ya. Mgbe unu kwekwara, Chineke nyere unu Mmụọ Nsọ ya ka o biri nꞌime unu dị ka akara a kakwasịrị unu igosi na unu bụ ndị nke ya.


EFESỌS 2:9
Ọ dịghị ihe ọ bụla unu pụrụ isite nꞌihi ya nyaa isi, ebe ọ bụ na nzọpụta a esiteghị nꞌihe unu jiri aka unu rụpụta.


EFESỌS 3:9
Chineke zikwara m ịkọwara mmadụ nile na Chineke bụkwa onye nzọpụta nke ndị mba ọzọ. Nꞌihi na nke a bụ ihe onye kere ihe nile zubere na nzuzo ime site na mbụ.


EFESỌS 4:13
tutuu anyị nile ekwekọtaa nꞌotu ihe ahụ banyere nzọpụta anyị, tutuu anyị enwee ọmụma ihe juru eju banyere Ọkpara Chineke. Na tutuu anyị abụrụ ndị tozuru oke nꞌime Onyenwe anyị, mgbe e mere ka ọdịdị Kraịst jupụta nꞌime anyị.


EFESỌS 5:23
Nꞌihi na nwoke bụ isi nwụnye ya, dị ka Kraịst siri bụrụ isi nzukọ ya bụ chọọchị, na onye nzọpụta nke nzukọ ahụ bụ anụ ahụ ya.


EFESỌS 6:17
Nabatanụ nzọpụta dị ka okpu igwe, werekwanụ okwu Chineke dị ka mma agha nke Mmụọ Nsọ na-enye unu.


FILIPAI 2:12
Nꞌihi ihe ndị a, ndị enyi m, mgbe mụ na unu nọ, unu na-erube isi nꞌihe ọ bụla m gwara unu. Ugbu a kwa m na-anọghị unu nso, gbalịanụ ime ihe ndị ahụ ya na nzọpụta a zọpụtara unu so. Jirinụ ịtụ egwu na-eme ihe Chineke chọrọ, ma na-alanụ azụ nꞌihe ọ bụla pụrụ ime ka obi jọọ ya njọ nꞌebe unu nọ.


1 TESALỌNAIKA 1:10
Ha na-akọkwa otu unu si na-ele anya nlọghachi Okpara Chineke site nꞌeluigwe, Jisọs ahụ Chineke mere ka o si nꞌọnwụ bilie, onye bụ Onye nzọpụta anyị site nꞌiwe Chineke dị egwu megide mmehie.


2 TESALỌNAIKA 1:8
Ọ ga-ata ndị ahụ na-amaghị Chineke ahụhụ ebighị ebi nꞌọkụ ala mmụọ. Ee, ọ ga-ata ndị ahụ ahụhụ, bụ ndị jụrụ ịnabata ụzọ nzọpụta ya nke o mere ka ọ pụta ìhè nꞌime Jisọs Kraịst.


1 TIMỌTI 1:1
Mụ onwe m Pọl, onye Chineke Onye nzọpụta anyị, na Kraịst Jisọs, onye bụ olileanya anyị họpụtara zipụ ịbụ onyeozi Kraịst, na-edegara gị akwụkwọ a.


1 TIMỌTI 2:3
Nke a bụkwa ihe dị mma na ihe na-atọ Chineke onye nzọpụta anyị ezi ụtọ.


2 TIMỌTI 3:15
Ị maara na ọ bụ site nꞌoge ị bụ nwantakịrị ka e ji zi gị ihe e dere nꞌakwụkwọ nsọ. Ọ bụ ihe ndị a nyere gị uche ịnata nzọpụta Chineke site na ntụkwasị obi na okwukwe i nwere nꞌime Kraịst Jisọs.


TAITỌS 1:3
Ugbu a oge imezu nkwa ahụ ruru, o meela ka ozi ọma a pụta ìhè. O nyefekwara m ọrụ ịgwa onye ọ bụla ihe gbasara ozi ọma a. Nkwusa nke m na-ekwusakwa ya bụ dị ka Chineke Onye nzọpụta anyị si chọọ.


TAITỌS 1:4
Ọ bụ gị Taitọs, ezi nwa m nwoke nꞌime okwukwe nke anyị nwekọrọ, ka m naedetara akwụkwọ ozi a. Ka Chineke onye bụ Nna, na Kraịst Jisọs Onye nzọpụta anyị, nye gị amara ya na udo ya.


TAITỌS 2:11
Nꞌihi na Chineke na-enye onye ọ bụla chọrọ ịnara ya onyinye amara nzọpụta ebighị ebi ahụ nꞌefu.


TAITỌS 2:13
Ndụ ile anya ọbịbịa ụbọchị ahụ a gọziri agọzi, mgbe a ga-eme ka ebube Chineke anyị na Onye nzọpụta anyị bụ Jisọs Kraịst pụta ìhè.


TAITỌS 3:4
Ma mgbe ịhụnanya na obi ọma Chineke Onye nzọpụta anyị pụtara ìhè,


TAITỌS 3:6
O sitere nꞌịba ụba nke ebere ya wụkwasị anyị Mmụọ Nsọ ya nꞌihi ihe ahụ nile Jisọs Kraịst Onye nzọpụta anyị mere.


HIBRU 1:14
E, è! O nweghị mmụọ ozi ọ bụla Chineke gwara okwu dị otu a! Nꞌihi na ndị mmụọ ozi ya bụ nanị mmụọ na-eje ozi. Ha bụ ndị a na-ezipụ ka ha nye aka. Ha na-elekọtakwa ndị ahụ ga-anata nzọpụta Chineke.


HIBRU 2:1
Anyị anụla akụkọ nzọpụta a Jisọs wetaara anyị. Ka anyị ṅazie ntị nke ọma jidesiekwa ihe anyị nụrụ ike ka anyị hapụ ikwe ka ha si nꞌobi anyị pụọ.


HIBRU 2:3
Ndị nupụrụ isi natara ntaramahụhụ kwesịrị ihe ọjọọ ha mere. Ọ bụrụ na a tara ha ahụhụ nꞌihi ihe ọjọọ ha mere, anyị ga-esi aṅaa gbanarị ntaramahụhụ ma ọ bụrụ na anyị elefuo oke nzọpụta ahụ anya, bụ nke Kraịst wetara? Ọ dịghị! anyị apụghị ịgbanarị ahụhụ. Onyenwe anyị nꞌonwe ya kwuru okwu nzọpụta a. Ndị na-eso ụzọ ya, bụ ndị nụrụ okwu ya kwukwara ya, gosi anyị na ọ bụ eziokwu.


HIBRU 2:10
E mere ka ọ bụrụ ihe ziri ezi nꞌanya Chineke, onye kere ihe nile, na Jisọs ga-ahụ ahụhụ. Nꞌihi na Chineke sitere nꞌọnwụ ya mee ka ọtụtụ mmadụ bịaruo nso nzọpụta. Ma ahụhụ Jisọs hụrụ mere ya ka ọ bụrụ onyeisi zuru oke nke nwere ike iduba ndị ya na mmeri nke nzọpụta.


HIBRU 5:9
Ma Kraịst sitere nꞌahụhụ ghọọ onye zuru oke. Ọ ghọrọ ụzọ nzọpụta zuru oke, nye mmadụ nile bụ ndị na-erubere ya isi.


HIBRU 6:9
Ma echeghị m na ọ bụ unu ka okwu a dịrị ụmụnna m. Unu bụ ndị kwere ekwe, ya mere unu na-amị ezi mkpụrụ nke ya na nzọpụta unu so bịa.


HIBRU 9:12
Otu mgbe nanị ka Kraịst bara nꞌebe kachasị nsọ nke ụlọ ikwu ahụ. O jighị ọbara ewu na ọbara ebule chụọ aja. Kama o jiri ọbara nke ya onwe ya. O jiri ọbara ya chụọ aja nanị otu mgbe. O sitere na nke a mee ka anyị nweta nzọpụta ebighị ebi.


HIBRU 9:28
otu a kwa, Kraịst nwụrụ nanị otu ugboro, dị ka aja a chụrụ nꞌihi mmehie mmadụ nile. Ọ nwụrụ ma Chineke mere ka o site nꞌọnwụ bilie. Ọ ga-abịa ọzọ! Ma ọ bụghị maka ịchụ aja ọzọ nꞌihi mmehie anyị, kama ọ ga-abịa iwetara ndị nile ji okwukwe na olileanya na-eche ọbịbịa ya nzọpụta.


1 PITA 1:9
Ụgwọ ọrụ ọzọ unu ga-enweta nꞌihi ntụkwasị obi unu nꞌime ya ga-abụ nzọpụta a ga-azọpụta mkpụrụ obi unu.


1 PITA 1:10
Nzọpụta a bụ ihe ndị amụma na-aghọtaghị nke ọma. Ha dere ọtụtụ ihe banyere ya, jụọkwa ọtụtụ ajụjụ banyere ihe nzọpụta ahụ pụtara.


2 PITA 1:1
Ọ bụ Saịmọn Pita, odibo Jisọs Kraịst na onyeozi na-edegara ndị nile nwere ụdị okwukwe anyị nwere akwụkwọ a. Okwukwe m na-ekwu ihe banyere ya bụ ụdị okwukwe ahụ Jisọs Kraịst Chineke anyị na Onye nzọpụta anyị na-enye. Ọ bụ okwukwe dị oke ọnụ ahịa, nke na-egosikwa ịdị mma onye nyere anyị ya.


2 PITA 1:4
Ọ bụkwa site nꞌike aka ya ka o ji nye anyị onyinye ahụ dị ukwuu, nke o kwere anyị na nkwa. Nkwa o kwere anyị, nke o mezuru, bụ nzọpụta ọ zọpụtara anyị site nꞌagụụ ihe ọjọọ nile, na ndụ rere ure nile dị nꞌụwa, na inye anyị ọdịdị ya onwe ya bụ Chineke.


2 PITA 1:11
Chineke ga-emeghekwara unu ụzọ, nye unu ike ịbanye nꞌalaeze ahụ na-adịgide adịgide, bụ alaeze Onyenwe anyị na Onye nzọpụta anyị Jisọs Kraịst.


2 PITA 2:18
Ha na-agwa ndị a ha na-eduhie okwu sị, “A zọpụtaghị unu nꞌihi ọrụ ọma unu rụrụ, ya mere ọ bụghị ihe ọjọọ ma unu gaa nꞌihu ime mmehie. Nꞌihi nzọpụta a zọpụtara unu, unu enwerela onwe unu, meenụ ihe ọ bụla dị unu mma nꞌanya.” Ma ndị ozizi a na-ezi ndị ọzọ ụzọ ha ga-esi nwere onwe ha site nꞌiwu, bụ ohu mmehie na ịla nꞌiyi nꞌonwe ha. Nꞌihi na mmadụ bụ ohu nye ihe ọ bụla na-achị ya.


2 PITA 2:20
Mgbe mmadụ sitere nꞌụzọ ọjọọ nke ụwa gbapụ, nꞌihi na ọ mụtala ihe banyere Onyenwe anyị na Onye nzọpụta anyị Jisọs Kraịst, ọ ga-abụ onye ọnọdụ ya ga-ajọ njọ karịa ka ọ dị na mbụ, ma ọ bụrụ na onye ahụ emesịa bido ime mmehie, nke ga-eme ka ọ ghọọ ohu mmehie.


2 PITA 3:2
Nꞌime ha abụọ ihe m mere bụ ichetara unu ihe ndị ahụ nile unu maara, nke bụ ihe nile unu mụtara site nꞌaka ndị amụma dị nsọ, na site nꞌọnụ anyị bụ ndị ozi, ndị wetaara unu okwu Onyenwe anyị na Onye nzọpụta anyị.


2 PITA 3:15
Chetakwanụ ihe mere Onyenwe anyị adịghị eme ngwangwa ịlọghachi. Ọ na-enye anyị ohere ime ka ndị ọzọ nata ozi ọma ahụ ga-ewetara ha nzọpụta. Nwanna anyị Pọl ejirila amamihe Chineke nyere ya dee ihe banyere okwu a nꞌọtụtụ akwụkwọ ozi ọ na-ede. E nwere ụfọdụ ihe o kwuru nke siri ike ịghọta. Ma ọ bụ nꞌụdị okwu a ka a na-ahụ ọtụtụ ndị nzuzu, ndị na-akọwa okwu ndị a dị ka ha si chepụta nꞌobi ha. Ha asụgharịala ihe o dere isi, mee ka a ghọta okwu ndị a nꞌụzọ na-abụghị ụzọ Pọl onye dere ha chọrọ ka anyị ghọta ha. Nke a bụkwa ihe ha na-emekwa mpaghara akwụkwọ nsọ ụfọdụ si otu a na-ewetara onwe ha ịla nꞌiyi.


2 PITA 3:18
Bụrụnụ ndị na-eto eto nꞌime mmụọ unu, bụrụkwanụ ndị na-aga nꞌihu ịmụta ihe banyere Onyenwe anyị na Onye nzọpụta anyị Jisọs Kraịst nke ọma. Ka otuto dịrị ya ugbu a na mgbe nile ebighị ebi. Amin.


1 JỌN 2:12
Ana m edere unu ihe ndị a ụmụntakịrị m nꞌihi na a gbagharala unu mmehie nile site nꞌaha Jisọs Onye nzọpụta anyị.


1 JỌN 4:14
Karịsịa, anyị ejirila anya anyị hụ Ọkpara ahụ Chineke zitere. Ugbu a anyị na-akọrọ ụwa nile na Chineke zitere Ọkpara ya ka ọ bụrụ Onye nzọpụta ụwa.


1 JỌN 5:1
Ọ bụrụ na i kwere nꞌezie na Jisọs bụ Kraịst onye nzọpụta gị na Ọkpara Chineke, ị bụ nwa Chineke. Ndị nile kwa hụrụ Chineke nꞌanya naahụkwa ụmụ Chineke nꞌanya.


JUD 1:3
Ndị m hụrụ nꞌanya, ọ gụọla m agụụ idere unu akwụkwọ banyere nzọpụta ahụ anyị nwekọrọ nꞌotu, ma a chọpụtara m na ọ dị mkpa ugbu a ịdọ unu aka na ntị ka unu na-agbalịsị ike ichebe okwukwe ahụ Chineke nyere ndị ya, ka a ghara ịgbanwe ya.


JUD 1:23
Gbalịanụ ịzọpụta ụfọdụ dị ka a ga-asị na ọ bụ site nꞌọkụ ka unu si azọpụta ha. Ma nyekwaranụ ndị ọzọ aka ịchọta nzọpụta site nꞌigosi ha obi ebere. Kama kpachapụnụ anya ịhụ na mgbe unu na-enyere ha aka na ha adọkpụrụghị unu banye nꞌime mmehie ha. Mgbe unu na-enyere ha aka kpọọnụ ajọ omume ha nile asị.


NKPUGHE 7:10
Ha nile nọ na-eti mkpu nke ukwuu na-asị, “Nzọpụta na-abịa site nꞌaka Chineke anyị onye nọ nꞌelu ocheeze ya. Ọ na-abịakwa site nꞌaka Nwa atụrụ ahụ.”


NKPUGHE 12:10
Mgbe ahụ anụrụ m oke olu si nꞌeluigwe na-ada sị, “O mezuola nꞌikpeazụ, nzọpụta Chineke na ike na ọchịchị na ịchị isi Kraịst, ha abụrụla ihe dị ire nꞌihi na e sitela nꞌeluigwe chụtuo onye ahụ na-ebo ụmụnna anyị ebubo. Ọ na-ebo ha ebubo ehihie na abalị nꞌihu Chineke anyị.


NKPUGHE 19:1
Mgbe ihe ndị a gasịrị, anụrụ m ụzụ nke ọtụtụ igwe mmadụ nꞌeluigwe. Ha nile na-eti mkpu na-asị, “Haleluya, keleenụ Onyenwe anyị. Ọ bụ nꞌaka Chineke anyị ka nzọpụta si bịa, ọ bụkwa nanị ya ka nsọpụrụ na ike nile dịrị.


Igbo Bible 1988
No Data