A A A A A

Chọọ
MATIU 1:21
Ọ ga-amụkwa nwa nwoke, onye ị ga-akpọ aha ya Jisọs, nꞌihi na ọ ga-azọpụta ndị ya site na mmehie ha.


MATIU 3:6
Mgbe ha kwupụtasịrị mmehie ha nile, o mere ha baptizim nꞌosimiri Jọdan.


MATIU 3:11
Ana m eme nanị ndị chegharịrị site na mmehie ha baptizim, ma onye ka m ukwuu na-abịa. Ọ dị nnọọ ukwuu na etorughị m ibu akpụkpọ ụkwụ ya. Ọ ga-eji Mmụọ Nsọ na ọkụ mee unu baptizim.


MATIU 4:17
Site nꞌoge ahụ gaa nꞌihu Jisọs bidoro na-ekwusa na-asị, “Chegharịanụ, sitenụ na mmehie unu bịakwute Chineke, nꞌihi na alaeze eluigwe na-abịa nso.”


MATIU 5:28
Ma ana m asị unu, nwoke ọ bụla lere nwanyị ọ bụla anya nꞌụzọ na-adịghị mma, emeelarị mmehie ịkwa iko nꞌime obi ya megide nwanyị ahụ.


MATIU 5:29
Nꞌihi nke a, ọ bụrụ na anya gị achọọ iduba gị na mmehie, ghụpụ ya tufuo. Ọ kaara gị mma na i ji otu anya baa nꞌalaeze eluigwe karịa na i ji anya abụọ baa nꞌọkụ ala mmụọ.


MATIU 5:32
Ma geenụ ntị nꞌiwu m na-enye. Nwoke ọ bụla kewapụrụ onwe ya site nꞌebe nwụnye ya nọ, nke ọ na-ejideghị nꞌebe ọ na-akwa iko emehiela, nꞌihi na ọ na-etinye nwanyị ahụ nꞌọnọdụ ga-eme ka ọ kwaa iko. Ọ bụrụ na nwanyị ahụ alụọ di ọzọ, nwoke ahụ lụrụ nwanyị ahụ na-emekwa mmehie ịkwa iko.


MATIU 6:12
Gbaghara anyị mmehie anyị, dị ka anyị si agbaghara ndị na-emehie megide anyị.


MATIU 6:14
Nna unu bi nꞌeluigwe ga-agbaghara unu mmehie unu ma ọ bụrụ na unu agbagharakwa ndị na-emehie megide unu. Ọ bụrụkwanụ na unu ajụ ịgbaghara ndị na-emehie megide unu, ọ gaghị agbaghara unu.


MATIU 7:11
Ebe unu ndị mmehie pụrụ inye ụmụ unu ezi onyinye, Nna unu bi nꞌeluigwe ga-enyekwa unu karịa, ma ọ bụrụ na unu arịọọ ya.


MATIU 9:2
Ọ dịghị anya ụfọdụ ndị ikom ji ute butere ya otu nwoke akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ. Mgbe Jisọs hụrụ okwukwe dị nꞌime ndị buteere ya nwoke a, ọ gwara onye ọrịa ahụ okwu sị ya, “Nwee obi ike nꞌihi na agbagharala m gị mmehie gị nile.”


MATIU 9:5
Olee nke karịrị ịdị mfe ikwu? Ọ bụ ịsị na a gbagharala nwoke a mmehie ya, ka ọ bụ ịsị ya bilie gaa ije?


MATIU 9:6
Ma ime ka unu mata na m nwere ike ịgbaghara mmadụ mmehie ya nꞌụwa a, ana m asị gị, nwoke, bilie, chịrị ute gị laa!”


MATIU 9:10
Emesịa, Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya banyere nꞌụlọ Matiu iri nri. Ọtụtụ ndị ọzọ, bụ ndị ọnaụtụ na ndị mmehie sooro Jisọs nọdụ na-eri nri.


MATIU 9:11
Mgbe ndị Farisii hụrụ Jisọs ka o so ndị a na-eri nri, ha jụrụ ndị na-eso ụzọ ya ajụjụ sị ha, “Gịnị mere nna unu ukwu ji eso ndị ọnaụtụ na ndị mmehie na-eri nri?”


MATIU 9:13
Ma gaanụ chọpụta ihe akwụkwọ nsọ chọrọ ka unu mụta mgbe ọ sịrị, ‘Achọghị m aja unu, kama achọrọ m ka unu nwee obi ebere.’ Unu chọpụta ya, unu ga-aghọta na abịaghị m ịkpọ ndị ezi omume, kama abịara m ime ka ndị mmehie si na mmehie ha chegharịa.”


MATIU 11:19
Ma Nwa nke mmadụ bịara soro ndị mmadụ na-eri nri, na-anụkwa ihe ọṅụṅụ, ma gịnị ka unu na-ekwu banyere m? ‘Lee onye na-eri oke nri, na onye oke aṅụmaṅụ abịala!’ Unu na-akpọkwa m enyi ndị ọnaụtụ, na enyi ndị mmehie. Otu ọ dị, e sitela nꞌọrụ ọma a rụpụtara gosi na ụzọ ọ bụla Chineke si arụ ọrụ ya ziri ezi.”


MATIU 12:31
“Ya mere, ana m agwa unu sị, na a ga-agbaghara mmadụ mmehie ya nile, ma ọ bụ nkwulu ya nile. Ma onye ọ bụla na-ekwulu Mmụọ Nsọ agaghị enweta mgbaghara.


MATIU 13:41
Aga m ezipụ ndị mmụọ ozi m ka ha gaa chịkọtaa ndị nile na-eme ka ndị mmadụ mee mmehie, na ndị nile na-arụ ọrụ ọjọọ.


MATIU 18:3
Mgbe ahụ Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya okwu sị, “Ọ bụrụ na unu esiteghị na mmehie unu chegharịa bịakwute Chineke dị ka ụmụntakịrị, unu agaghị abata nꞌime alaeze eluigwe.


MATIU 18:7
“Ahụhụ dịrị ụwa nꞌihi mmehie nile dị nꞌime ya. Ọnwụnwa na-eduba mmadụ ime ihe ọjọọ na-adị oge nile. Ma ahụhụ ga-adịrị nwoke ahụ na-ewetara ibe ya ihe ọnwụnwa.


MATIU 18:15
“Ọ bụrụ na nwanne gị emehie megide gị, jekwuru ya na nzuzo tụọ ya mmehie ya nꞌihu. Ọ bụrụ na o gee gị ntị, rịọọkwa mgbaghara, i ritela nwanne gị nꞌuru.


MATIU 19:9
Ma ana m asị unu, onye ọ bụla ga-ahapụ nwụnye ya lụrụ onye ọzọ, ma ọ bụghị nꞌihi na o jidere nwụnye ya na mmehie ịkwa iko, onye ahụ emeela mmehie ịkwa iko ma ọ lụọ nwanyị ọzọ. Onye ọ bụla ga-alụkwa nwanyị ahụ di ya hapụrụ, na-emekwa mmehie ịkwa iko.”


MATIU 23:28
Nꞌụzọ dị otu a, unu na-egosi ndị mmadụ onwe unu dị ka ndị dị nsọ, na ndị ezi omume, ma nꞌime obi unu, unu jupụtara nꞌihu abụọ na mmehie.


MATIU 24:12
Mmehie ga-aba ụba nꞌebe nile, mee ka ịhụnanya ndị mmadụ nꞌebe ibe ha nọ jụọ oyi nke ukwuu.


MATIU 26:28
Nꞌihi na nke a bụ ọbara m nke bụ akara ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ. A na-awụsa ya nꞌihi mgbaghara mmehie ọtụtụ mmadụ.


MATIU 26:45
Mgbe ọ lọghachikwutere ndị na-eso ụzọ ya, ọ gwara ha okwu sị, “Unu nọrịrị na-arahụ ụra, na-ezukwa ike? Mbaa! Lee, oge ahụ abịala! Oge a ga-arara m nye nꞌaka ndị mmehie.


MAK 1:4
Nwoke ahụ Chineke zitere bụ Jọn omee baptizim. O bi nꞌọzara, sitekwa nꞌebe ahụ jegharịa ebe nile. Ọ na-akpọku ndị mmadụ ka ha site na mmehie ha chegharịa, ka e mee ha baptizim, ka Chineke gbaghara ha.


MAK 1:5
Ọtụtụ mmadụ sitere Judia na obodo nile dị Jerusalem gburugburu bịakwute ya. Ha jekwuuru ya nꞌosimiri Jọdan ebe ọ nọ na-ekwusa nkwusa ya. Mgbe ha kwupụtasịrị mmehie ha o mere ha baptizim.


MAK 2:5
Mgbe Jisọs hụrụ na ndị a nwere okwukwe dị ukwuu nꞌime ya ịgwọ enyi ha nwoke, ọ sịrị onye ọrịa ahụ, “Nwa m, a gbagharala gị mmehie gị.”


MAK 2:7
Ha jụrịtara onwe ha ajụjụ na-asị, “Gịnị mere nwoke a ji esi otu a ekwu okwu ikwulu Chineke? Ọ bụ nanị Chineke pụrụ ịgbaghara mmadụ mmehie ya.”


MAK 2:9
Olee nke dị mfe ikwu? Ọ̀ bụ ịgwa nwoke a akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ na a gbagharala ya mmehie ya, ka ọ bụ ịgwa ya ka o bilie chịrị ute ya laa?


MAK 2:10
Ma igosi unu na Nwa nke mmadụ nwere ike nꞌụwa ịgbaghara mmehie,


MAK 2:15
Nꞌabalị ahụ, Livayị kpọrọ Jisọs oriri nꞌụlọ ya. Ọ kpọkwara ọtụtụ ndị enyi ya, ndị ọnaụtụ dị ka ya onwe ya, na ọtụtụ ndị mmehie. Ha nile na Jisọs nọkọkwara nꞌotu tebulu na-eri nri. Ndị a ha na Jisọs na-erikọ nri bụkwa ụdị ndị na-esogharị ya ebe ọ bụla ọ na-ekwusa ozi ọma.


MAK 2:16
Mgbe ndị ozizi iwu na ndị Farisii hụrụ Jisọs ka o so ndị mmehie na ndị ọnaụtụ na-eri nri, ha jụrụ ndị na-eso ụzọ Jisọs ajụjụ sị ha, “Gịnị mere nna unu ukwu ji eso ndị mmehie na ndị ọnaụtụ na-erikọ nri?”


MAK 2:17
Mgbe Jisọs nụrụ ajụjụ ha na-ajụ, ọ sịrị ha, “Mkpa dibia adịghị akpa ndị ahụ dị mma, kama ọ bụ ndị ọrịa ka ọ na-akpa. Abịaghị m ịgwa ndị ezi omume ka ha chegharịa, kama abịara m ịgwa ndị mmehie ka ha si na mmehie ha chegharịa.”


MAK 3:28
“Ana m agwasị unu okwu a ike na-asị na mmehie ọ bụla adịghị nke mmadụ mere megide Chineke nke mgbaghara na-adịghị. Ọ dịkwaghị ụdị nkwulu ọ bụla Chineke na-agaghị agbaghara.


MAK 3:29
Ma onye ọ bụla kwuluru Mmụọ Nsọ agaghị anata mgbaghara. A gaghị agbaghara ya mmehie nkwulu a nꞌụwa a ma ọ bụ nꞌụwa ọzọ.”


MAK 6:12
Emesịa, ndị na-eso ụzọ ya pụrụ ikwusara ndị mmadụ ozi ọma. Ha na-agwa ndị mmadụ ka ha si na mmehie ha chegharịa.


MAK 8:38
Ọ bụrụ na ihere na-eme onye ọ bụla nꞌihi m, na nꞌihi okwu m nꞌụwa ọjọọ a, na nꞌụwa mmehie a, ọ ga-abụkwara mụ bụ Nwa nke mmadụ ihe ihere mụ na onye ahụ inwekọ ihe ọ bụla, mgbe m ga-abịaghachi nꞌebube nke Nna m, mụ na ndị mmụọ ozi dị nsọ.”


MAK 10:11
Jisọs gwara ha sị, “Nwoke ọ bụla kewapụrụ onwe ya nꞌebe nwụnye ya nọ, lụọ onye ọzọ, na-eme mmehie ịkwa iko megide nwụnye ya ahụ o si na ya kewapụ onwe ya.


MAK 10:12
Nwanyị ọ bụla kwa, kewapụrụ onwe ya site nꞌebe di ya nọ lụọ nwoke ọzọ na-emekwa mmehie ịkwa iko.”


MAK 11:25
Kama, mgbe unu na-ekpe ekpere, unu ebula iro nꞌobi unu megide onye ọ bụla. Burunụ ụzọ gbaghara onye ahụ, ka Nna unu bi nꞌeluigwe gbaghara unu mmehie unu.


MAK 11:26
“Ma ọ bụrụ na unu ajụ ịgbaghara, Nna unu bi nꞌeluigwe agaghị agbaghara unu mmehie unu.”


LUK 1:77
Ịgwa ndị mmadụ otu ha ga-esi chọta nzọpụta site nꞌinwe mgbaghara nꞌihi mmehie ha.


LUK 3:3
Nꞌihi ozi a, Jọn biliri gaa nꞌobodo nile dị nꞌakụkụ osimiri Jọdan na-ekwusa, na-agwa ndị mmadụ sị, “Sitenụ na mmehie unu chegharịa ka e mee unu baptisim, ka Chineke gbaghara unu mmehie unu.”


LUK 5:8
Mgbe Pita hụrụ azụ nile ndị a nꞌime ụgbọ mmiri ndị a, o gburu ikpere nꞌihu Jisọs sị ya, “Onyenwe m biko site nꞌebe m nọ pụọ, nꞌihi na abụ m onye mmehie.”


LUK 5:20
Mgbe Jisọs hụrụ na ndị a nwere okwukwe na ya nwere ike ịgwọ enyi ha nwoke, ọ gwara onye ọrịa ahụ okwu sị, “Enyi m, a gbagharala gị mmehie gị.”


LUK 5:21
Ndị Farisii na ndị ozizi iwu nọ nꞌebe ahụ leritara onwe ha anya jụọ sị, “Ònye bụ nwoke a na-adịghị asọpụrụ Chineke? Ònye pụrụ igbaghara mmadụ mmehie ma ọ bụghị nanị Chineke?”


LUK 5:23
Olee nke karịrị mfe ikwu? Ọ̀ bụ ịgwa nwoke a sị, ‘Agbagharala m gị mmehie gị ka ọ bụ ịgwa ya sị, bilie gaa ije?’


LUK 5:24
Ugbu a aga m egosi unu na Nwa nke mmadụ nwere ike nꞌụwa ịgbaghara mmehie site nꞌigosi unu ike m nwere ịgwọ ọria.” Jisos chigharịrị gwa onye ọrịa ahu okwu sị “Nwoke, bilie, chịrị ute gị laa nꞌụlọ gi!”


LUK 5:30
Mgbe ndị Farisii na ndị ozizi iwu hụrụ ka Jisọs so Livayị na ndị enyi ya na-eri nri, ha bidoro na-ajụ ndị na-eso ụzụ ya ajụjụ sị, “Gịnị mere unu na nna unu ukwu ji na-eso ndị ọnaụtụ na ndị mmehie na-erikọ nri?”


LUK 5:32
Abịaghị m ịkpọ ndị ezi omume, kama abịara m ịkpọ ndị mmehie ka ha chegharịa.”


LUK 6:32
“Ọ bụrụ nanị ndị na-ahụ unu nꞌanya ka unu na-ahụ nꞌanya, unu atụkwala anya na Chineke ga-asị na unu mere nke ọma, nꞌihi na ndị mmehie na-ahụkwa ndị hụrụ ha nꞌanya nꞌanya.


LUK 6:33
Ọ bụrụkwa nanị ndị na-enyere unu aka ka unu na-enyere aka, obi ò ga-atọ Chineke ụtọ nꞌebe unu nọ? É, è. Nꞌihi na ndị mmehie na-enyekwara ndị na-enyere ha aka aka.


LUK 6:34
Ọ bụrụkwa nanị onye nwere ike ịkwụghachi unu ka unu na-agbazinye ihe, ụdị ihe ọma a abụghị nke e kwesịrị ikele unu ekele nꞌihi ya, nꞌihi na ndị mmehie na-agbazinyekwa ndị mmadụ ego, ka onye ha gbazinyere kwụghachikwa ha.


LUK 7:34
Ma ugbu a Nwa nke mmadụ abịala soro unu na-eri ma na-aṅụkwa, ma gịnị ka unu na-ekwu banyere m? ‘Lee onye oke nri na onye aṅụrụma mmanya abịala, enyị ndị ọnaụtụ na ndị mmehie!’


LUK 7:47
Nꞌihi ihe ndị a nwanyị a mere, ana m agwa gị sị, a gbagharala ya mmehie ya nile o mehiere, nꞌihi na ọ hụrụ m nꞌanya nke ukwuu. Ma nwoke ahụ hụrụ m nꞌanya nke nta, ka a ga-agbaghara nanị nke nta.”


LUK 7:48
Mgbe ahụ Jisọs gwara nwanyị ahụ okwu sị, “A gbagharala gị mmehie gị nile.”


LUK 7:49
Ndị ọzọ soro Jisọs nọdụ na-eri nri ahụ bidoro na-ajụrịta onwe ha ajụjụ na-asị, “Gịnị ka nwoke a na-eche na ọ bụ? Ịgbaghara mmadụ mmehie ha!”


LUK 10:13
Ahụhụ dị ukwuu na-eche gị, gị obodo Korazin. Ahụhụ dị ukwuu dịkwa na-eche gị, gị obodo Betsaida. Nꞌihi na a sị na m rụrụ ọrụ nile m rụrụ nꞌime unu nꞌobodo Taịa na Saidọn, ha gaara echegharị kemgbe. Ha gaara eyi uwe nkịkara, wụkwasị onwe ha ntụ nꞌisi igosi na ha esitela na mmehie ha chegharịa.


LUK 11:4
Gbaghara anyị mmehie anyị, nꞌihi na anyị na-agbaghara onye ọ bụla mejọrọ anyị. Edubakwala anyị nꞌọnwụnwa.”


LUK 13:2
Jisọs jụrụ ha sị, “Unu chere na ndị ahụ Pailet gburu bụ ndị mmehie karịa ndị Juu ọzọ bi na Galili! Ọ̀ bụ ya mere ha ji hụọ ahụhụ dị otu a? Mbaa!


LUK 13:3
Ka m gwa unu eziokwu, ọ bụrụ na unu onwe unu esiteghị na mmehie unu chegharịa bịakwute Chineke, unu ga-esikwa otu a laa nꞌiyi.


LUK 13:4
“Ka m jụọkwka unu ọzọ, gịnị ka unu na-eche banyere mmadụ iri na asatọ ahụ mgbidi Silom dagburu? Unu na-eche na ndị ahụ bụ ndị mmehie karịa ndị nile bi na Jerusalem?


LUK 13:5
Baa! Otu a ka unu onwe unu ga-esikwa laa nꞌiyi ma ọ bụrụ na unu esiteghị na mmehie unu chegharịa bịakwute Chineke.”


LUK 15:1
Otu ụbọchị ndị ọnaụtụ na ndị mmehie bịakwutere Jisọs ịnụrụ ihe ọ na-ekwu.


LUK 15:2
Mgbe ndị Farisii na ndị na-ezi iwu hụrụ ha, ha tamụrụ ntamụ megide Jisọs sị, “Nwoke a na-anabata ndị mmehie. Ọ na-esokwa ha eri nri.”


LUK 15:7
“Nꞌụzọ dị otu a, ọṅụ na-adị nꞌeluigwe nꞌihi otu onye mmehie nke chegharịrị, karịa ndị ezi omume iri toolu na toolu ndị mkpa nzọpụta na-adịghị akpa.


LUK 15:10
Nꞌụzọ dị otu a kwa, ndị mmụọ ozi na-ejere Chineke ozi nꞌeluigwe na-aṅụrị ọṅụ mgbe otu onye mmehie chegharịrị.”


LUK 16:18
“Onye ọ bụla gbara nwụnye ya achọghị m mesịa lụrụ nwanyị ọzọ na-eme mmehie ịkwa iko. Onye ọ bụla kwa lụrụ nwanyị ahụ di ya jụrụ na-emekwa mmehie ịkwa iko.


LUK 17:1
Otu ụbọchị, Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya okwu sị, “Ọnwụnwa nke na-eduba mmadụ nꞌime mmehie ga na-adị, ma oke ahụhụ dị na-eche nwoke ahụ onye ọnwụnwa ga-esi nꞌaka ya bịara mmadụ.


LUK 18:13
“Ma onye ọnaụtụ guzo nꞌebe dị anya enweghị ike iweli isi ya elu lee anya nꞌeluigwe. Kama ọ nọ ebe ahụ tie aka nꞌobi na mwute gwa Chineke okwu sị, ‘Chineke m, biko meere m ebere nꞌihi na abụ m onye mmehie!’


LUK 18:14
O doro m anya nke ọma na ọ bụ onye ọnaụtụ ahụ karịa onye Farisii ahụ ka Chineke gbaghaara mmehie ya mgbe o biliri ịla nꞌụlọ ya. Nꞌihi na onye ọ bụla na-ebuli onwe ya elu ka a ga-eweda nꞌala, ma onye ọ bụla wedara onwe ya ala, ka a ga-ebuli elu.”


LUK 19:7
Mgbe ọtụtụ ndị mmadụ ahụ so Jisọs hụrụ ka Jisọs na-eso Zakịọs, ha bidoro ịtamụ ntamụ na-asị, “Lee na nwoke a esorola onye mmehie na-aga nꞌụlọ ya iri ihe.”


LUK 22:37
Nꞌihi na ọ bụ eziokwu ka m na-ekwu mgbe m na-asị na ihe ahụ akwụkwọ nsọ kwuru banyere m sị, ‘A gụkọrọ ya na ndị mmehie’, ga-emezu.”


LUK 24:7
Ọ gwara unu na a ga-arara ya nye nꞌaka ndị mmehie ndị ga-akpọgide ya nꞌobe, na ya ga-esikwa nꞌọnwụ bilie ọzọ nꞌụbọchị nke atọ ya.”


JỌN 1:29
Nꞌechi ya, mgbe Jọn hụrụ Jisọs ka ọ na-abịa nꞌakụkụ ebe ọ nọ, o tiri mkpu sị, “Lee Nwa atụrụ Chineke, onye naebupụ mmehie ụwa!


JỌN 3:20
Ndị mmehie nile na-agba ọsọ site nꞌìhè ahụ. Ha achọghị ịbịakwute ìhè ahụ nꞌihi na mmehie ha ga-apụta ìhè.


JỌN 5:27
Ọ na-enye Ọkpara ike nile, ikpe mmadụ nile ikpe nꞌihi mmehie ha, nꞌihi na ọ bụ Nwa nke mmadụ, Onyenwe abube nile.


JỌN 7:7
Ndị ụwa enweghị ike ịkpọ unu asị, dị ka ha si kpọọ m asị. Ndị ụwa na-akpọ m asị nꞌihi na m na-atụ ha mmehie ha nꞌanya.


JỌN 8:7
Mgbe ha nọgidere na-esogbu ya ka okwu si ya nꞌọnụ pụta, Jisọs lelitere anya ya elu gwa ha sị, “Unu nwere ike tụọ nwanyị a nkume ugbu a. Ma achọrọ m ka onye ga-ebu ụzọ tụọ ya nkume bụrụ onye nke na-emebeghị mmehie nꞌoge ọ bụla.”


JỌN 8:21
Mgbe oge ntakịrị gasịrị, Jisọs gwara ha okwu ọzọ sị, “Nꞌoge na-adịghị anya, aga m ahapụ unu, unu gaachọ m ma unu agaghị ahụ m anya. Nꞌihi nke a unu ga-anwụ nꞌime mmehie unu. Ma unu apụghị ịbịa nꞌebe m nọ.”


JỌN 8:24
Ọ bụ nꞌihi nke a ka m ji gwa unu na unu ga-anwụ nꞌime mmehie unu. Nꞌihi na ọ bụrụ na unu ekweghị na abụ m Onye nzọpụta ahụ, Ọkpara Chineke, unu ga-anwụ nꞌime mmehie unu.”


JỌN 8:34
Jisọs zara ha sị, “Nꞌezie, asị m unu, onye ọ bụla na-eme mmehie bụ ohu mmehie.


JỌN 8:46
“Onye nꞌime unu nile pụrụ ibo m ebubo mmehie ọ bụla? Ọ bụrụ na unu apụghị ịkwagide na m bụ onye mmehie, gịnị mere unu jiri jụ ikwere nꞌokwu m nile? Ihe nile m na-ekwu bụ eziokwu.


JỌN 9:16
Mgbe ahụ ndị Farisii sịrị, “Ọ bụghị Chineke zitere nwoke a a na-akpọ Jisọs. A sị na ọ bụ onye Chineke zitere, ọ garaghị arụ ọrụ nꞌụbọchị izuike.” Ndị ọzọ nọ nꞌebe ahụ sịrị, “Olee otu onye mmehie ga-esi rụọ ọrụ dị otu a?” Nkewa batara nꞌetiti ha.


JỌN 9:24
Ndị Juu kpọrọ nwoke a ọzọ sị ya, “Nye Chineke otuto nꞌihi ihe o meere gị chefuo nwoke a bụ Jisọs nꞌihi na anyị maara na ọ bụ onye mmehie.”


JỌN 9:25
Ma nwoke ahụ zara sị ha, “Amaghị m ma Jisọs ọ bụ onye mmehie, ma ọ bụ onye ezi omume. Ma ọ dị otu ihe m maara, na mbụ abụ m onye kpuru ìsì, ugbu a ana m ahụ ụzọ.”


JỌN 9:31
Chineke adịghị anụ ekpere onye mmehie. Kama ọ bụrụ na onye ọ bụla na-arụ ọrụ ya, na-eme ihe ọ na-achọ, ọ bụ onye ahụ ka Chineke na-anụ olu ya.


JỌN 9:34
Ha zara ya sị, “Gị onye a mụrụ nꞌime mmehie, ọ̀ bụ izi anyị ihe ka ị na-eme nke a?” Ha chụpụrụ ya site nꞌetiti ha.


JỌN 9:41
Jisọs zara sị ha, “A sị na unu kpuru ìsì, unu agaraghị enwe mmehie. Ma ugbu a unu na-asị, ‘Anyị na-ahụ ụzọ.’ Nꞌihi ya, mmehie unu naadịgide.”


JỌN 15:24
A sị na ọrụ nile m rụrụ nꞌetiti ha akarịghị ọrụ nke onye ọ bụla ọzọ rụrụ, ha agaraghị abụ ndị ikpe mmehie mara. Ma ugbu ha ahụzuola ọrụ ịrịba ama ndị a nile, ma ha nọgidekwara naakpọ mụ na Nna m asị.


JỌN 16:8
“Mgbe ọ bịara ọ ga-ama ụwa ikpe mmehie. Ọ ga-akọwara ha ezi omume nke Chineke. Ọ ga-agwakwa ha ihe banyere ikpe nke Chineke.


JỌN 16:9
Ọ ga-ama ha ikpe mmehie nꞌihi na ha ekwenyeghị na m.


JỌN 19:11
Jisọs zara ya sị, “Ị garaghị enwe ike ọ bụla nꞌebe m nọ, ma ọ bụrụ na o siteghị nꞌelu rute gị aka. Ọ bụ ndị dutere m nꞌebe ị nọ nwere mmehie karịa.”


JỌN 20:23
Ọ bụrụ na unu agbaghara onye ọ bụla mmehie ya, a gbagharala onye ahụ. Ọ bụrụkwa na unu ajụ ịgbaghara onye ahụ mmehie ya, a gaghị agbaghara onye ahụ.”


ỌLU OZI 2:38
Ma Pita sịrị ha, “Chegharịanụ! Sitekwanụ na mmehie unu tụgharịa bịakwute Chineke! Ka e mee unu baptizim baa nꞌaha Jisọs, nꞌihi mgbaghara mmehie unu. Unu mee nke a, unu ga-anata onyinye a, bụ Mmụọ Nsọ.


ỌLU OZI 3:19
“Chegharịanụ ugbu a, lọghachikwutenụ Chineke! Ọ ga-ehichapụ mmehie unu.


ỌLU OZI 3:26
Ọ bụ unu ka Chineke buru ụzọ zitere Okpara ya Jisọs ka ọ gọzie, mgbe o sitere nꞌọnwụ kpọlite ya. Ka o mee ka onye ọ bụla site na mmehie ya tụgharịa.”


ỌLU OZI 5:31
Chineke ebuliela ya elu mee ya ka ọ nọdụ nꞌaka nri ya, ka ọ bụrụ Onyendu na Onye nzọpụta, iwetara Izirel nchegharị, na mgbaghara mmehie.


Πράξεις 7:60
O gburu ikpere nꞌala kwuo sị, “Onyenwe anyị, biko, agụnyekwarala ha mmehie nke a!” Mgbe o kwusịrị okwu a, ọ dara nꞌala nwụọ.


Πράξεις 8:23
Nꞌihi na ahụrụ m na ekworo na mmehie jupụtara gị nꞌobi.”


Πράξεις 10:43
Ndị amụma nile Chineke zitere nꞌoge gara aga kwuru ihe banyere ya na-asị na onye ọ bụla kweere na ya nwere mgbaghara mmehie site nꞌaha ya.”


Πράξεις 13:24
“Ma tupuu Jisọs abịa, e mere ka Jọn omee baptizim buru ụzọ bịa, idoziri ya ụzọ. Jọn kọwaara ụmụ Izirel nile mkpa ọ dị na ha ga-esite na mmehie ha chegharịa bụrụ ndị e mere baptizim.


Πράξεις 13:38
“Ụmụnna m, biko geenụ ntị. Mgbaghara mmehie nile dịkwa nꞌime onye a a na-akpọ Jisọs.


Πράξεις 13:39
Onye ọ bụla tụkwasịrị ya obi ga-enweta mgbaghara mmehie ya nile. A ga-agụkwa onye ahụ nꞌonye ezi omume. Nke a bụ ihe iwu ndị Juu na-apụkwaghị imezuru onye ọ bụla.


Πράξεις 15:20
Kama o kwesịrị ka anyị degara ha akwụkwọ gwa ha sị ha hapụ iri anụ ọ bụla e ji chụọra arụsị aja. Ka ha wezụgakwa onwe ha site na mmehie ịkwa iko, ya na iri anụ a nyagburu anyagbu, ma ọ bụ ọbara.


Πράξεις 16:17
Ma o sogidere anyị ebe ọ bụla anyị na-aga, na-eti mkpu na-sị, “Ndị a bụ ndị ozi Chineke kachasị ihe nile elu. Ha abịala nꞌebe a ikwusara unu ihe banyere ụzọ mgbaghara mmehie.”


Πράξεις 19:4
Mgbe ahụ Pọl kọwaara ha na baptizim Jọn bụ ihe gosiri na ndị e mere ya chọrọ inwe mkpebi ichegharị site na mmehie ha bịakwute Chineke. O gosikwara na ndị e mere baptizim ahụ, jikeere ịga nꞌihu ikwere na Jisọs Onye ahụ Jọn kwuru na ọ ga-abịa.


Πράξεις 20:21
Ọ bụ nanị otu ozizi ahụ ka m nyere ndị Juu na ndị mba ọzọ, ozizi mkpa ọ dịrị mmadụ nile ịhapụ mmehie ha ma lọghachikwute Chineke site nꞌokwukwe nꞌime Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.


Πράξεις 22:16
Site ugbu a, atụfukwala mgbe. Gaa ka e mee gị baptizim ka a sachaakwa gị site na mmehie ka ị kpọkuokwa aha Onyenwe anyị.’


Πράξεις 23:28
Achọrọ m ịmata ebubo ha ga-ebo ya, nꞌihi ya eduuru m ya gaa nꞌọgbakọ ha ka ha tụọ ya mmehie ya nꞌihu.


Πράξεις 26:18
Imeghe anya ha ka ha hụ ọnọdụ ha. Ka ha chegharịa biekwa ndụ nꞌime ìhè nke Chineke, kama ịwagharị nꞌọchịchịrị bụ ụzọ nke ekwensu. Ka ha soro ndị ọzọ nꞌebe nile nata mgbaghara mmehie na nketa nke Chineke na-enye ndị nile a sachapụrụ mmehie na ndị e sitere nꞌokwukwe ha mee ka ha bụrụ ndị Chineke doro iche.’


1 KỌRINT 1:23
Ma anyị na-ekwusa na-asị na Kraịst nwụrụ nꞌelu obe ịzọpụta ha site na mmehie ha, okwu a na-ewe ndị Juu iwe, ma na ntị ndị mba ọzọ ọ dị ka okwu nzuzu.


1 KỌRINT 5:6
Olee uru ọ bara na unu nọ na-anya isi mgbe ihe ọjọọ dị otu a na-eme nꞌetiti unu? Ọ̀ bụ na unu amaghị na ọ bụrụ na unu agbaa nkịtị, hapụ nwoke a, ka ọ na-eme mmehie ya gaa nꞌihu, na ihe ọjọọ a ga-emekụta ndị ọzọ nọ nꞌụlọ chọọchị unu?


1 KỌRINT 5:12
Ọ bụghị ọrụ anyị ikpe ndị na-esoghị anyị bụrụ ndị Kraịst ikpe. Ma ọ bụ ọrụ anyị ikpe ndị nọ nꞌọgbakọ anyị na-eme mmehie ikpe.


1 KỌRINT 6:11
Na mbụ, ụfọdụ nꞌime unu na-ebi ndụ dị otu a. Ma ugbu a, a sachapụla mmehie unu, doo unu nsọ nye Chineke. Ọ bụkwa site nꞌaha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst na Mmụọ Nsọ Chineke anyị ka e ji gụọ unu dị ka ndị ezi omume.


1 KỌRINT 6:13
Ka anyị jiri ihe dị ka nri maa atụ. Ọ bụ Chineke nyere anyị nri. Ọ bụ ya nyekwara afọ anyị ga-erinye nri ahụ. Ma otu ụbọchị Chineke ga-eme ka ihe oriri na afọ anyị ghara ịdịkwa. Ma e meghị ahụ mmadụ maka mmehie ịkwa iko, kama e mere ahụ mmadụ maka Onyenwe anyị, meekwa Onyenwe anyị maka ahụ mmadụ.


1 KỌRINT 6:18
Ọ bụ nꞌihi nke a ka m ji na-agwa unu sị, gbaaranụ mmehie ịkwa iko ọsọ. Ọ dịghị mmehie ọzọ na-emekụta anụ ahụ mmadụ dị ka mmehie ịkwa iko. Ọ bụ mmehie mmadụ na-eme megide anụ ahụ ya.


1 KỌRINT 7:2
Ma ọ ka mma ka onye ọ bụla lụọ nwanyị, nwoke ọ bụla nwụnye nke aka ya, nwanyị ọ bụla di nke aka ya. Nke a ga-eme ka ha ghara ime mmehie.


1 KỌRINT 7:22
Nꞌihi na ọ bụrụ na Chineke kpọrọ gị mgbe ị bụ ohu, cheta na Kraịst emeela ka ị bụrụ onye nweere onwe ya site nꞌike mmehie. Ọ bụrụ na Chineke kpọrọ gị mgbe i nweere onwe gị, cheta na ị bụ ohu Kraịst ugbu a.


1 KỌRINT 7:28
Ma ọ bụrụ na i kpebie nꞌobi gị ịlụ nwụnye, i meghị mmehie ọ bụla; ọ bụrụkwa na nwagbọghọ ekpebie na ọ ga-alụ di, o meghị mmehie. Ma chezie echiche ma ị ga-ebulitekwa nsogbu nke ya na mkpebi gị so nꞌoge a.


1 KỌRINT 7:36
Ọ bụrụkwa na nwoke ọ bụla ekpebie ịlụ nwụnye nꞌihi na o siiri ya ike ijide onwe ya nꞌihi agụụ mmekọrịta nke nwoke na nwanyị na-agụ ya, o meghị mmehie ọ bụla ma ọ lụọ nwụnye.


1 KỌRINT 8:9
Ọ bụ eziokwu na anyị pụrụ iri ihe ọ bụla, ma jie onwe gị aka ka ị ghara iri ihe ga-eme ka nwanna gị nꞌime Kraịst, nke okwukwe ya na-esighị ike daba nꞌime mmehie.


1 KỌRINT 8:11
Site nꞌụzọ dị otu a, nwoke a mmụọ ya na-esighị ike, onye bụ nwanne gị, onye Kraịst nwụrụ nꞌihi ya, ga-ala nꞌiyi nꞌihi na o sooro gị, onye maara ihe nile, mee ihe ahụ akọnuche ya gwara ya na ọ bụ mmehie.


1 KỌRINT 8:12
Cheta na ọ bụ mmehie i mere megide Kraịst, ma ọ bụrụ na ị kwagide nwanne gị nꞌime Kraịst, ka o mee ihe ahụ o chere na ọ bụ ihe ọjọọ.


1 KỌRINT 8:13
Nꞌihi nke a, ọ bụrụ na iri anụ e ji chụọra arụsị aja ga-eme ka nwanne m mee mmehie, agaghị m eso rie ya mgbe ọ bụla, ka m ghara ime ka nwanne m mee mmehie.


1 KỌRINT 10:8
Ihe mmụta ọzọ dịrị anyị bụ ihe dakwasịrị ha mgbe ụfọdụ nꞌime ha mere mmehie ịkwa iko. Ọ bụ iri puku mmadụ abụọ na atọ nꞌime ha nwụrụ nꞌotu ụbọchị ahụ.


1 KỌRINT 10:12
Ọ bụrụ na ị na-eche nꞌobi gị na ị nweghị ike ime ihe ndị a, leziekwa onwe gị anya, nꞌihi na ị pụrụ ịdabakwa na mmehie.


1 KỌRINT 14:24
Ma ọ bụrụ na unu nile nọ na-ebu amụma na-ezisa ozi ọma Chineke, mgbe onye na-ekweghị ekwe ma ọ bụ onye bụ onye Kraịst ọhụrụ batara nꞌụlọ chọọchị unu, okwu nile ọ ga-anụ ga-emetụ ya nꞌobi, maakwa ya ikpe mmehie. Akọnuche ya agaghị enwekwa ozuzu ike nꞌihi ihe nile ọ nụrụ.


1 KỌRINT 15:3
Ihe m nyefere unu nꞌaka bụ ihe a gwara m, na Kraịst nwụrụ ọnwụ nꞌihi mmehie anyị, dị ka akwụkwọ nsọ kwuru na ọ ga-anwụ.


1 KỌRINT 15:17
Ma ọ bụrụ na Kraịst esighị nꞌọnwụ nilie, unu bụ nnọọ ndị nzuzu inọgide na-atụkwasị obi na Chineke ga-azọpụta unu. Karịsịa, unu nọkwa ugbu a nꞌime mmehie unu.


1 KỌRINT 15:34
Sitenụ na ndụ mmehie pụta! Unu emehiekwala ọzọ. Ùnu makwaara na ụfọdụ nꞌime unu amaghị Chineke? Ana m ekwu nke a ka ihere mee unu.


1 KỌRINT 15:56
Nꞌihi na ihe ahụ ọnwụ ji agbatu mmadụ bụ mmehie, ma iwu ahụ na-egosi mmehie agaghị abụkwa onye ikpe anyị.


2 KỌRINT 3:16
Ma mgbe onye ọ bụla si na mmehie ya chegharịa, lọghachikwute Onyenwe anyị, mgbe ahụ a na-eme ka ihe mkpudo ahụ gharakwa ịdị.


2 KỌRINT 5:19
Ozi ọma Chineke ziri anyị ikwusa bụ na ọ chọrọ ka ya na mmadụ nile dị nꞌudo site na Kraịst. Chineke agụkwaghị mmehie nile mmadụ mere megide ya, kama o jirila ọbara Kraịst sachapụ ha.


2 KỌRINT 5:21
Kraịst emehieghị mgbe ọ bụla, kama, nꞌihi anyị, Chineke mere ka o kere oke nꞌime mmehie anyị, ka o si otu a mee ka e jikọtaa anyị na ya, ka anyị nwee oke nꞌime ezi omume Chineke na-enye.


2 KỌRINT 7:10
Nꞌihi na Chineke na-eji ihe naewute anyị enyere aka ime ka anyị site na mmehie anyị chegharịa. Ka ọ zọpụta anyị. Ya mere, anyị kwesịrị ịnabata ihe mwute dị otu a mgbe ọ bụla ha dakwasịrị anyị. Ma ihe naewute onye na-amaghị Kraịst abụghị ihe ga-eme ka o chegharịa, kama ọ bụ ihe na-ewetara ya ọnwụ.


2 KỌRINT 7:11
Leenụ ihe Chineke rụpụtara site nꞌihe mwute dakwaịrị unu. Ugbu a unu abụrụla ndị ọ na-anụ ọkụ nꞌobi na ndị jikeere izi anyị na aka unu abụọ dị ọcha. Lee otu unu si zi iwe unu, otu unu si zikwa na ihe ahụ wutere unu. Lee otu unu si tụọ ụjọ ihe mmehie ahụ nwere ike iwetara unu. Leekwa otu unu si mee ihe nile igosi na unu kwagidere m. Leekwanụ otu unu si nye onye ahụ mere mmehie ahụ ntaramahụhụ ngwangwa. Unu egosila na aka unu dị ọcha nꞌokwu ndị a nile.


2 KỌRINT 10:3
Ọ bụ ezie na anyị bi nꞌụwa, ma ọ bụghị ike anụ ahụ ka anyị ji alụso mmehie ọgụ.


2 KỌRINT 13:2
Eburula m rị ụzọ dọọ ndị na-eme mmehie aka na ntị nꞌoge gara aga m bịakwutere unu. Ugbu a ana m adọkwa ha aka na ntị ọzọ, ha na ndị ọzọ nile, dị ka m mere mgbe ahụ m bịara, nꞌihi na mgbe m bịara ugbu a aga m ejikere ịta onye ọ bụla mehiere ahụhụ, o nweghị onye ga-ala nꞌefu.


GALETIA 1:4
Ọ bụ Kraịst nwụrụ nꞌihi mmehie anyị dị ka Chineke Nna zubere na ọ ga-anwụ, ịgbapụta anyị site nꞌụwa ọjọọ a, nke anyị bi nꞌime ya.


GALETIA 2:15
Ọ bụ ezie na anyị bụ ndị Juu site nꞌọmụmụ a mụrụ anyị, ọ bụ ezie na anyị abụkwaghị ndị mba ọzọ na-ebi ndụ mmehie,


GALETIA 2:16
ma anyị bụ ndị Juu maara na mmadụ ọ bụla na Chineke enweghị ike ịdị nꞌudo, site nꞌidebe iwu ndị Juu, kama, na udo na-adị nꞌetiti Chineke na mmadụ nanị site nꞌokwukwe anyị nwere na Jisọs ịsachapụ mmehie anyị. Ọ bụ nke a mere anyị ji kwere na Jisọs Kraịst, ka e mee ka Chineke nabata anyị, site nꞌokwukwe anyị, ọ bụghị nꞌihi na anyị debere iwu ndị Juu. Nꞌihi na o nweghị onye ọ bụla a ga-azọpụta nꞌihi na o debere iwu ndị Juu.


GALETIA 3:13
Ma Kraịst agbapụtala anyị site nꞌọbụbụ ọnụ ahụ nke idebe iwu gaara ewetara anyị. O bokwasịrị onwe ya ịbụ ọnụ gaara abụ nke anyị nꞌihi mmehie anyị. Nꞌihi na e deela ya nꞌakwụkwọ nsọ sị, “Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke a na-akwụba nꞌelu osisi.”


GALETIA 3:19
Gịnị mere Chineke ji nye mmadụ iwu? Chineke nyere iwu ndị a igosi na mmehie dị, na mmehie bara ụba. Ma e mere ka iwu ndị a dịgide nanị tutuu ruo mgbe Mkpụrụ ahụ bịara, onye bụ nwa Eberaham ahụ nkwa Chineke dịịrị. Mgbe Chineke nyere iwu ya o sitere nꞌaka mmụọ ozi ya nye iwu ahụ. Ọ bụkwa mmadụ natara iwu ahụ nyeruo ya ụmụ Izirel.


GALETIA 3:21
Nke a ọ̀ na-egosi na iwu Chineke na nkwa ya na-emegide onwe ha? Mba! Chineke ekwela! Nꞌihi na a sị na a pụrụ ịzọpụta anyị site nꞌidebe iwu ọ garaghị adị mkpa Chineke inye anyị ụzọ ọzọ a pụrụ isi gbapụta anyị site nꞌagbụ mmehie.


GALETIA 3:22
Nꞌihi na e deela ya nꞌakwụkwọ nsọ sị na anyị bụ ndị mmehie kere agbụ. Ụzọ mgbapụ dịịrị anyị bụ inwe okwukwe nꞌime Jisọs Kraịst.


Γαλάτες 5:5
Ma anyị onwe anyị na-esite nꞌinyeaka nke Mmụọ Nsọ na-enwe olileanya na ọnwụ Kraịst nwụrụ asachapụla mmehie anyị, ime ka anyị na Chineke dịrị na mma.


Γαλάτες 6:1
Ụmụnna m, asị na nwa Chineke ọ bụla adaba na mmehie, unu onwe unu bụ ndị Mmụọ Nsọ na-achị kwesịrị iji mmụọ nke ịdị nwayọọ na obi dị umeala nyere onye ahụ aka, ime ka ọ gazie nꞌezi ụzọ. Nꞌihi na ònye ma ihe ga-eme echi? Ònye ma onye ọ bụ nꞌetiti unu nke ga-adaba na mmehie echi?


KỌLỌSI 1:6
Ozi ọma ahụ e kwusaara unu bụkwa otu ozi ọma ahụ a na-agbasa nꞌụwa nile, nke na-eweta mgbanwe na ndụ ndị nụrụ ya, dị ka o si wetara unu mgbanwe mgbe unu nụrụ ya, ghọtakwa ụdị obi ebere Chineke nwere nꞌebe ndị mmehie nọ.


KỌLỌSI 1:14
Onye e sitere nꞌaka ya mee ka anyị nwere onwe anyị; onye gbaghakwaara anyị mmehie anyị nile.


KỌLỌSI 1:21
Nke a metụtakwara unu, ọ bụ ezie na unu bụ ndị na-anọghị Chineke nso na mbụ. Mgbe ahụ unu bụ ndị iro ya, ndị mmehie ha na echiche ọjọọ ha, na omume ọjọọ ha, mere ka Chineke dị anya nꞌebe unu nọ. Ma ugbu a, ọ kpọbatala unu dị ka ndị enyi ya.


KỌLỌSI 2:11
Mgbe unu bịakwutere Kraịst o mere ka unu nwere onwe unu site nꞌike ọchịchọ ọjọọ nke anụ ahụ jupụtara na mmehie. O meghị ka unu nwere onwe unu site nꞌibi unu ugwu nke elu ahụ, kama o mere ya site nꞌobibi ugwu nke ime mmụọ, ime mkpụrụ obi unu baptizim.


KỌLỌSI 2:13
Mgbe ahụ, unu bụ ndị nwụrụ anwụ nꞌime mmụọ unu nꞌihi mmehie, mgbe ahụ kwa, unu bụ ndị mba ọzọ, ndị na-enweghị iwu na-achị ndụ ha, ma Chineke mere ka unu soro Kraịst keta ndụ ọhụrụ, nꞌihi na ọ gbaghaara unu mmehie unu nile.


KỌLỌSI 2:14
O hichapụrụ ụgwọ mmehie nile unu ji, ụgwọ iwu ahụ nile unu na-edebeghị. O weere mmehie ndị a nile laa ha nꞌiyi, site nꞌịkpọgide ya nꞌelu obe Kraịst.


KỌLỌSI 2:15
Nꞌelu obe ahụ, Chineke napụrụ ekwensu ike o ji ebo unu ebubo mmehie. O mekwara ka mmeri Kraịst meriri ekwensu nꞌelu obe ahụ e si wezuga mmehie unu, pụta ìhè nye mmadụ nile.


KỌLỌSI 3:5
Wezuganụ mmehie na ihe ụwa nile na-arụ arụ nꞌime unu. Meenụ ka ọchịchọ ọjọọ nile dị nꞌime unu bụrụ ihe nwụrụ anwụ. Unu etinyekwala aka nꞌịkwa iko, adịghị ọcha, ọchịchọ ọjọọ, agụụ ime ihe ọjọọ, na anya ukwu (nꞌihi na anya ukwu bụkwa ikpere arụsị).


1 TESALỌNAIKA 1:10
Ha na-akọkwa otu unu si na-ele anya nlọghachi Okpara Chineke site nꞌeluigwe, Jisọs ahụ Chineke mere ka o si nꞌọnwụ bilie, onye bụ Onye nzọpụta anyị site nꞌiwe Chineke dị egwu megide mmehie.


1 TESALỌNAIKA 2:16
Ha na-agbalị igbochi anyị izisara ndị mba ọzọ ozi ọma ka ha ghara ichegharị. Ha na-esite nꞌụzọ dị otu a na-eme ka iko mmehie ha na-eju. Ma ikpe Chineke adakwasịla ha rị ịla ha nꞌiyi.


1 TESALỌNAIKA 4:3
Nꞌihi na ọ bụ ọchịchọ Chineke ka unu bụrụ ndị e debere iche, ndị dị ọcha na ndị dị nsọ. Ọ bụkwa ọchịchọ ya ka unu wezuga onwe unu site na mmehie ịkwa iko, na ka unu lụọkwa di na nwụnye unu nꞌime nkwanye ugwu na ịdị nsọ.


1 TIMỌTI 1:9
Ma emeghị iwu ahụ nꞌihi anyị ndị a zọpụtara. Kama e mere ya nꞌihi ndị ahụ na-emebi iwu, ndị na-akpọ Chineke asị, ndị ahụ naenupụ isi nꞌobi ha megide Chineke, ndị mmehie, na ndị obi ha na-adịghị ọcha, ndị ahụ na-egbu nne na nna ha, na ndị na-egbu mmadụ ibe ha.


1 TIMỌTI 1:10
Ee, Chineke nyere iwu a ime ka ndị naakwa iko pụta ìhè dị ka ndị mmehie. Ha na ndị na-eche uche na-adịghị ọcha, na ndị ikom na-emerụ onwe ha nꞌebe ndị ikom ibe ha nọ, ndị na-eme ihe ọjọọ dị iche iche megide ezi ozizi na-eweta ndụ.


1 TIMỌTI 1:15
Okwu a bụ okwu e kwesịrị ịtụkwasị obi. Ọ na-agụkwa m ka onye ọ bụla mata ya nke ọma, ma kwerekwa ya, na Kraịst Jisọs bịara nꞌụwa ịzọpụta ndị mmehie, nke mụ onwe m bụ onyeisi ha.


1 TIMỌTI 2:8
Nꞌihi nke a, achọrọ m ka ndị ikom nile nọ nꞌebe nile, ndị aka ha dị ọcha, na ndị aka ha na-ejupụtaghị na mmehie, ndị naebughị iro nꞌobi na ndị na-adịghị arụ ụka, ka ha chilie aka ha elu kpọkuo Chineke nꞌekpere.


1 TIMỌTI 3:16
Ọ bụ eziokwu na ọ dịghị mfe mmadụ ibi ndụ dị nsọ. Ma ụzọ e si ebi ndụ dị nsọ ahụ bụ site na Kraịst, onye ahụ bịara nꞌụwa dị ka mmadụ, onye e gosiri na o nweghị mmehie ọ bụla, na o nwere Mmụọ zuru oke, onye ndị mmụọ ozi hụkwara ma jeere ozi, onye e kwusara ihe banyere ya nꞌetiti mba nile. Onye ndị mmadụ kweere na ya, nabatakwa nꞌebe nile, na onye a nabanyere nꞌeluigwe ebe ọ nọ ugbu a nꞌebube ya.


1 TIMỌTI 5:21
Ana m enye gị iwu a nꞌihu Chineke na nꞌihu Onyenwe anyị Jisọs Kraịst na nꞌihu ndị mmụọ ozi dị nsọ ka i nye okenye ọ bụla mehiere ntaramahụhụ kwesịrị mmehie ya, ma okenye ahụ ọ bụ enyị gị ma ọ bụghị, elekwala onye ọ bụla anya nꞌihu.


1 TIMỌTI 5:22
Ebikwasịkwala onye ọ bụla aka nꞌisi ọsịịsọ ime ya okenye ma ọ bụ onye na-eje ozi. Nꞌihi na ị pụrụ ilefu mmehie ya anya. Nke a pụkwara ime ka ọ dị ka ị naakwagide mmehie ha. Hụ na gị onwe gị wezugara onwe gị nꞌebe mmehie nile dị.


1 TIMỌTI 5:24
Cheta na ụfọdụ mmadụ, ọ bụladị ụfọdụ ndị ụkọchukwu, na-ebi ndụ mmehie nke onye ọ bụla maara ihe banyere ya. Nꞌụdị mmehie dị otu a, i nwere ike ikwu okwu banyere ya. Ma e nwere mmehie ndị ọzọ nke anya naadịghị ahụ. Ha ga-apụta ìhè nꞌụbọchị ikpe.


1 TIMỌTI 6:5
Ndị a hụrụ irụ ụka nꞌanya, ndị mmehie kpuchiri obi, amaghị otu e si ekwu eziokwu. Nꞌebe ndị dị otu a nọ, ozi ọma a bụ ụzọ dị mfe ha si akpata ego. Si nꞌebe ha nọ wezuga onwe gị.


2 TIMỌTI 2:16
Wezuga onwe gị nꞌokwu nzuzu na nke rụrụ arụ nile, ụdị okwu nke na-eduba mmadụ nꞌime mmehie, ma na-eweta iwe nꞌetiti mmadụ na ibe ya.


2 TIMỌTI 2:21
Ọ bụrụ na onye ọ bụla edozie onwe ya ọcha hapụ ime mmehie, ọ ga-adị ka efere ndị e ji ọlaedo kpụọ, nke a na-enye nsọpụrụ nꞌụlọ ahụ. Ọ ga-abụkwa onye e doro iche, onye Kraịst doziri iji rụọ ọrụ ọma nile.


2 TIMỌTI 3:6
Ụfọdụ nꞌime ha bụ ndị na-abanye nꞌime ụlọ ndị mmadụ na-eduhiekwa ụmụ nwanyị na-enweghị uche, ndị ibu mmehie ha na-anyịgbu, na ndị a pụrụ iduhie nꞌihi ọtụtụ ihe ọjọọ na-agụ mkpụrụ obi ha agụụ. Ọ bụ ụdị ụmụ nwanyị a ka ha na-ezi ozizi ọhụrụ ha.


2 TIMỌTI 3:9
Ma ha agaghị aga nꞌihu na-eme ihe ndị a ruo mgbe ebighị ebi. Otu ụbọchị mmadụ nile ga-amata aghụghọ ha, dị ka ndị mmadụ si mata mmehie Jenas na Jambaras mgbe ọ pụtara ìhè.


2 TIMỌTI 4:16
Na mbụ mgbe a kpọtara m nꞌihu onye ikpe, ọ dịghị onye ọ bụla bịara nyere m aka, mmadụ nile gbara ọsọ hapụ m. Ekpere m bụ ka Chineke hapụ ịgụnyere ha omume a dị ka mmehie.


TAITỌS 1:13
Nꞌezie, ọ bụ eziokwu ka o kwuru. Nꞌihi nke a gwasie ha okwu ike banyere mmehie ha na-atụghị ụjọ. Ọ bụ nanị nke a ga-enyere ha aka ibi ezi ndụ nꞌime okwukwe anyị.


TAITỌS 2:15
Na-akụzi ihe ndị a. Werekwa ha na-adụ ndị gị ọdụ. Werekwa ha na-atụ ha mmehie ha nꞌihu. Ma ekwekwala ka ha lelịa gị anya.


TAITỌS 3:5
ọ zọpụtara anyị. Ma ọ zọpụtaghị anyị nꞌihi ọrụ ọma anyị rụrụ, kama ọ zọpụtara anyị nanị site nꞌobi ebere ya na ọmiko ya. Ọ sachapụrụ mmehie anyị, nyekwa anyị ọṅụ ọhụrụ nke ya na Mmụọ Nsọ bi nꞌime anyị so.


TAITỌS 3:11
Nꞌihi na ọgụgụ isi onye dị otu a bụ ọgụgụ isi ime ihe ọjọọ. Ọ bụ onye na-eme mmehie, ọ matakwara na ọ na-eme ya.


HIBRU 1:3
Jisọs Ọkpara Chineke na-enwụpụta ebube Chineke. Ihe Jisọs bụ na ihe nile o mere gosiri na ọ bụ Chineke nꞌonwe ya. Jisọs na-esite nꞌike aka ya na-achị eluigwe na ụwa nile. Jisọs bụkwa onye ahụ nwụrụ ka ọ sachapụ ma hichapụkwa mmehie anyị nile. Mgbe o mechara nke a, ọ nọdụrụ nꞌebe nsọpụrụ dị elu, nꞌakụkụ Chineke onye dị ukwuu, nꞌeluigwe.


HIBRU 2:11
Jisọs na-eme ụmụ mmadụ ka ha dị ọcha site na mmehie ha. Nꞌezie, onye na-eme ụmụ mmadụ ka ha dị nsọ, na ndị a e mere ka ha dị nsọ nwere Chineke dị ka Nna ha. Nke a mere ihere adịghị eme Jisọs ịkpọ ha ụmụnna ya.


HIBRU 2:17
Ọ dị mkpa na Jisọs bịara nꞌụdị anyị bụ ụmụnna ya. Nꞌihi na ọ bụ nanị site nꞌụzọ dị otu a, ka ọ pụrụ ịbụ onyeisi nchụaja nwere obi ebere nꞌebe anyị nọ, na onyeisi nchụaja kwesịrị ntụkwasị obi nꞌihu Chineke, ikwuchitere anyị ọnụ anyị nꞌihi mgbaghara mmehie anyị.


HIBRU 3:13
Kama na-agbanụ onwe unu ume kwa ụbọchị, ogologo ụbọchị ahụ nile ihe banyere ụbọchị ahụ bụ Taa metụtara unu. Ka a hapụ inwekwa onye ọ bụla a ga-esite nꞌaghụghọ nke mmehie mee ka obi ya sie ike.


HIBRU 4:15
Nꞌihi na anyị nwere onyeisi nchụaja nke nwere ike ịghọta adịghị ike anyị. A nwara Jisọs ọnwụnwa nꞌụzọ nile dị ka a na-anwa anyị taa. Ma o meghị mmehie nꞌụzọ ọ bụla mgbe a nwara ya.


HIBRU 5:1
Nꞌihi na a na-esite nꞌetiti ndị mmadụ họpụta onyeisi nchụaja. A na-ahọpụta onye ahụ ka ọ bụrụ onye na-anọchite anya mmadụ ibe ya nꞌihu Chineke. Ọ na-achụkwa aja, na-enye Chineke onyinye nꞌihi mmehie ndị ya.


HIBRU 7:25
Ọ na-azọpụta ruo ọgwụgwụ oge. Ọ ga-azọpụtakwa ndị nile ga-esite nꞌaka ya bịakwute Chineke. O nwere ike ime nke a nꞌihi na ọ na-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. Ọ na-adị ndụ ka o chetara Chineke na ọ kwụchaala ụgwọ mmehie anyị nile. Ọ na-adịkwa ndụ mgbe nile, na-arịọrọ anyị arịrịọ nꞌihu Chineke.


HIBRU 7:27
Jisọs adịghị ka ndị nchụaja ọzọ. Ọ dịghị mkpa na ọ ga-achụ aja nke ụmụ anụmanụ ụbọchị nile nꞌihi mmehie ya. Ọ dịkwaghị mkpa na ọ ga-achụrụ ndị mmadụ aja nꞌihi mmehie ha. Nanị otu aja karịrị ukwuu ka Jisọs chụrụ. O weere onwe ya chụọ aja nꞌelu obe nꞌihi anyị, ka ọ bụrụ ọgwụgwụ ọchụchụ aja nile, nꞌihi na aja ahụ ọ chụrụ zuru oke ruo mgbe nile.


HIBRU 8:12
Mgbe ahụ, aga m enwe obi ebere banyere amaghị ihe ha. Aga m agbaghara ha mmehie ha nile. Agaghị m echetakwa mmehie ha nile ọzọ.”


HIBRU 9:7
Ma ọ bụ nanị onyeisi nchụaja na-aba nꞌebe ahụ a na-akpọ Ebe Nsọ Kachasị ebe Nsọ. Ọ na-aba nꞌebe ahụ nanị otu mgbe nꞌafọ. Ọ na-ejikwa ọbara na-aba nꞌebe ahụ. Ọbara ọ ga-eji buru ụzọ chụọ aja nꞌihi mmehie nke onwe ya. Mgbe ọ chụchara aja nꞌihi onwe ya, ọ na-achụkwa aja nꞌihi ndị ya nile.


HIBRU 9:13
Na mgbe ochie, ọ bụrụ na ọbara ewu na nke ehi, ya na ntụ e wetara site nꞌebe a kpọrọ anụ ndị a ọkụ, nke e fekwasịrị ndị rụrụ arụ, pụrụ ihicha mmehie, meekwa ka ha dị ọcha,


HIBRU 9:14
ọbara Kraịst ọ̀ pụghị ime ka anyị dị ọcha karịa? Nꞌezie ọbara ya zubigara oke ịsachpụ mmehie anyị nile, nꞌihi na Kraịst sitere na Mmụọ nke na-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi were onwe ya nye na-enweghị ntụpọ. Ọbara ya zubigara oke ịsacha obi anyị na ime anyị ka anyị dị ọcha site nꞌajọ ọrụ nile, bụ ọrụ nke na-eweta ọnwụ. Aja o jiri onwe ya chụọ, mere ka anyị nwere onwe anyị, ka anyị nwee ike ife Chineke onye dị ndụ.


HIBRU 9:15
Kraịst wetara ọgbụgba ndụ ọhụrụ a ka ndị nile Chineke kpọrọ bịaruo nso iketa nkwa ebighị ebi Chineke kwere ha. Ugbu a ndị nile Chineke kpọrọ nwere ike ịbịaru ya nso, nꞌihi na Kraịst nwụrụ gbapụtakwa ha site nꞌikpe ọmụma dịrị ha nꞌihi mmehie nile ha mehiere nꞌọnọdụ ọgbụgba ndụ ochie ahụ.


HIBRU 9:22
Nke a na-ezipụta otu ihe: na nꞌọnọdụ ochie ahụ, a na-eji ọbara mee ka ihe nile dịrị ọcha. Nke a na-ezikwa anyị na a sị rịị na a wụsịghị ọbara mgbaghara mmehie agaraghị adị.


HIBRU 9:26
A sịkwarị na ọ bụ ihe dị mkpa na Kraịst kwesịrị iji onwe ya chụọ aja ọtụtụ mgbe ọ gaara na-anwụ site nꞌoge ruo nꞌoge kemgbe ụwa bidoro. Ma o sighị otu a dị! Kama Kraịst bịara nanị otu ugboro mgbe ọgwụgwụ ihe nile dị nso, iwepụ mmehie site nꞌiji onwe ya chụọ aja.


HIBRU 9:28
otu a kwa, Kraịst nwụrụ nanị otu ugboro, dị ka aja a chụrụ nꞌihi mmehie mmadụ nile. Ọ nwụrụ ma Chineke mere ka o site nꞌọnwụ bilie. Ọ ga-abịa ọzọ! Ma ọ bụghị maka ịchụ aja ọzọ nꞌihi mmehie anyị, kama ọ ga-abịa iwetara ndị nile ji okwukwe na olileanya na-eche ọbịbịa ya nzọpụta.


HIBRU 10:2
Ọ bụrụ na iwu pụrụ ime ihe dị otu a otu ugboro ka a gaara achụ aja. Otu aja ahụ gaara ewepụkwa echiche mmehie ọ bụla nꞌime ndị chụrụ ya.


HIBRU 10:3
Ma aja nile ahụ ha na-achụ kwa afọ ehichapụghị mmehie ha. Nanị ihe aja ndị a mere bụ ichetara ha na mmehie ha dị.


HIBRU 10:4
Nꞌezie, ọ pụghị ime! Ọbara ewu na ehi apụghị ihichapụ mmehie mmadụ!


HIBRU 10:6
Gị bụ Chineke adịghị aṅụrị ọṅụ nꞌịta nsure ọkụ ma ọ bụ nꞌịta na-esi isi ụtọ ọ bụla maka ịsachapụ mmehie.


HIBRU 10:8
Mgbe Jisọs kwuchara okwu a o kwukwara okwu ọzọ sị, “Ị dịghị aṅụrị ọṅụ nꞌịta ọ bụla a chụrụ nꞌihi mgbaghara mmehie.” Jisọs kwuru okwu ndị a ọ bụladị na a chụrụ aja ndị a nꞌusoro iwu!


HIBRU 10:9
Ma mgbe ihe ndị a gasịrị, Jisọs kwuru sị, “Lee abịala m Chineke, ime ihe ị chọrọ ka m mee.” Nꞌihi aja Jisọs jiri onwe ya chụọ, Chineke ewepụla ụzọ ịchụ aja ochie ahụ e ji agbaghara mmehie, were ụzọ ọhụrụ nke ọchụchụ aja Kraịst dochie nꞌọnọdụ ya.


HIBRU 10:10
Ebe ọ bụ na Jisọs mere ihe Chineke chọrọ, anyị abụrụla ndị a sachapụrụ mmehie ha site nꞌịta Jisọs ji onwe ya chụọ nanị otu ugboro.


HIBRU 10:11
Nꞌọnọdụ usoro ochie ahụ, ndị nchụaja na-eje ozi ha ụbọchị nile. A na-ahụ ha ka ha ji otu ụdị aja ahụ, aja na-apụghị iwepụ mmehie.


HIBRU 10:14
Site nꞌotu aja ahụ Kraịst jiri onwe ya chụọ o mere ka ndị ahụ zuo oke ruo mgbe ebighị ebi bụ ndị ahụ a sachapụrụ mmehie ha.


HIBRU 10:17
Agaghị m echetakwa mmehie ha nile, ya na nnupụ isi ha nile ọzọ.”


HIBRU 10:18
Ya mere, mgbe Chineke gbaghaara mmehie ndị a nile, ọ dịkwaghị mkpa na a ga-achụ aja ọzọ nꞌihi mgbaghara mmehie.


HIBRU 10:26
Ka anyị kwụsị ibi ndụ nꞌime mmehie. Nꞌihi na anyị amatala ihe bụ eziokwu na ezi ndụ. Chineke adịghị agbaghara onye maara eziokwu ahụ ma nọgidesie ike nꞌime mmehie. Aja ọzọ adịkwaghị nke ga-ewepụ mmehie anyị ma ọ bụrụ na anyị elezie anya mee mmehie.


HIBRU 11:25
Ọ họọrọ isoro ụmụ Chineke takọọ ahụhụ karịa inwe anụrị nke mmehie. Ọ jụrụ ibi na mmehie jụkwa akụ na ụba nke Ijipti. Ọ matara na ihe ndị a agaghị adịgide ruo ebighị ebi. Nꞌihi nke a ọ họọrọ isoro ụmụ Izirel ịhụ ahụhụ.


HIBRU 12:1
Ugbu a, igwe ndị okwukwe a nile nọ na-ele anyị anya. Ha gbara anyị gburugburu. Ka anyị wezuga ihe nile ga-egbochi anyị. Ka anyị tụpụ mmehie nile tụhịkọtara onwe ya nꞌahụ anyị. Ka anyị jiri ike anyị nile, na-eleghị anya nꞌazụ gbaa ọsọ ahụ dị anyị nꞌihu.


HIBRU 12:3
Na-atụgharịnụ uche nꞌihe banyere Jisọs oge nile. Tụgharịanụ uche banyere mmeso o mesoro ndị mmehie ahụ megidere ya. Nke a ga-eme ka unu hapụ ịda mba nꞌọsọ unu na-agba.


HIBRU 12:4
Chetanụ na mmadụ ọ bụla anwụbeghị nꞌetiti unu nꞌihi ọgụ nke unu na-alụso mmehie.


HIBRU 12:16
Ka onye ọ bụla hapụ ịdaba na mmehie ịkwa iko. Ka onye ọ bụla hapụ iji Chineke gwurie egwu dị ka Ịsọ mere. Ịsọ bụ onye rere ọnọdụ ọkpara ya nꞌezinụlọ nna ya nꞌihi otu efere nri.


HIBRU 12:24
Unu abịakwutela Jisọs onye e sitere nꞌaka ya mee ka ọgbụgba ndụ ọhụrụ dịrị nꞌetiti Chineke na mmadụ. Unu abịakwala nꞌọbara e fesara, nke na-ekwu okwu mgbaghara mmehie. Ọbara a dị mma karịa ọbara Ebel, nꞌihi na ọbara Ebel lere anya ịbọ ọbọ.


HIBRU 13:11
Dị ka iwu ndị Juu si dị, onyeisi nchụaja na-eji ọbara anụ e gburu egbu baa nꞌime ime ụlọ ikwu ahụ ịchụ aja nꞌihi mmehie. Emechaa, a na-esite nꞌime obodo wepụ ahụ anụ ndị a e gburu kpọọ ha ọkụ nꞌezi.


HIBRU 13:12
Ọ bụ nke a mere Jisọs ji nwụọkwa, ma ọ bụghị nꞌime obodo. Ebe ahụ ka ọbara ya sachapụrụ mmehie anyị.


JEMES 1:15
Ọ bụ ọchịchọ ọjọọ a, mgbe ha bara ụba nꞌime obi, na-eduba mmadụ na mmehie. Mgbe anyị mehiekwara, ọ bụ mmehie na-eduba nꞌọnwụ.


JEMES 2:9
Ma ọ bụrụ na unu anabata otu onye jụkwa onye nke ọzọ, unu na-eme mmehie. Nꞌebe iwu dịkwa unu bụ ndị na-emebi iwu.


JEMES 4:8
Bịakwụtenụ Chineke nso, ya onwe ya ga-abịakwutekwa unu nso. Kwọọnụ aka unu, ndị mmehie, ma meekwanụ ka obi unu dị ọcha. Unu abụla ndị obi abụọ.


JEMES 5:15
Ọ bụrụkwa na ha sitere nꞌokwukwe kpeere Chineke ekpere ha, a ga-eme ka ahụ dị onye ọrịa ahụ mma. Onyenwe anyị ga-emekwa ka o site nꞌute ọrịa bilie. Ọ bụrụkwa na o mehiere, ọ ga-agbaghara ya mmehie ya.


JEMES 5:16
Ya mere, kwupụtaranụ ibe unu mmehie unu, kpeekwara ibe unu ekpere ka Chineke gwọọ unu. Chineke na-anụ ekpere onye ezi omume, na-azakwa ya.


JEMES 5:20
onye ahụ kpọghachiri onye njehie ahụ nꞌebe Chineke nọ azọpụtala mkpụrụ obi kpafuru akpafu site nꞌọnwụ. Ọ bụ ihe pụrụ ime na mkpụrụ obi ahụ ga-anata mgbaghara nꞌihi ọtụtụ mmehie ya.


1 PITA 1:19
Ọ bụ ọbara dị oke ọnụ ahia nke Kraịst wụsịrị ka e ji gbapụta unu; ọbara Kraịst ahụ, onye na-emeghị mmehie, na onye dị ka nwa atụrụ na-enweghị ntụpọ ọ bụla.


1 PITA 2:24
Nꞌelu obe ahụ, Kraịst buuru mmehie anyị nile bokwasị onwe ya mgbe ọ nwụrụ, ime ka anyị nwee ike ịbụ ndị nwụrụ anwụ nꞌebe mmehie dị, ma dịrị ndụ nꞌebe ezi omume dị. Ọ bụkwa site na mpa ọnya dị ya nꞌahụ ka o ji gwọọ anyị.


1 PITA 3:18
Nꞌihi na Kraịst nꞌonwe ya hụrụ ahụhụ nwụọ nꞌihi unu. Ọ nwụrụ ọnwụ nanị otu ugboro nꞌihi anyị nile bụ ndị mmehie. Ezi mmadụ na-emeghị ihe ọjọọ ọ bụla nwụrụ nꞌihi ndị ajọ omume, nꞌihi ime ka anyị bịa nꞌihu Chineke. Ọ bụ ezie na e gburu ya nꞌanụ ahụ ma e mere ka ọ dịrị ndụ nꞌime mmụọ ya.


1 PITA 3:21
Nke a bụ ihe ịma atụ na-ezi anyị ihe baptizim pụtara. Mgbe e mere anyị baptizim, anyị na-egosi na a zọpụtala anyị site nꞌọnwụ na mbibi nꞌihi mbilite nꞌọnwụ Kraịst. O gosighị na e meela ka anụ ahụ anyị dịrị ọcha nꞌihi baptizim e mere anyị, kama ọ na-egosi na anyị, ndị e mere baptizim na-alọghachikwute Chineke na-arịọ ya ka ọ sachaa mmehie dị nꞌobi anyị.


1 PITA 4:1
Ebe ọ bụ na Kraịst hụrụ ahụhụ nꞌanụ ahụ, unu kwesịkwara inwe ụdị obi ahụ o nwere. Unu kwesịrị ijikere ịhụ ahụhụ. Nꞌihi na mgbe anụ ahụ unu na-ahụ ahụhụ ime mmehie anaghị atọkwa ya ụtọ.


1 PITA 4:3
Nꞌoge gara aga unu tụfuru ọtụtụ oge ime ihe ndị ahụ na-atọ ndị na-amaghị Chineke ụtọ. Ndụ unu jupụtara nꞌagụụ ịkwa iko, na agụụ ime ọjọọ, na ịṅụbiga mmanya oke, na ịkpọ oriri, na ife arụsị, nke na-eduba na mmehie ọjọọ dị iche iche.


1 PITA 4:8
Nke kachasị nke, na-ahụrịtanụ onwe unu nꞌanya nꞌihi na ịhụnanya na-ekpuchi ọtụtụ mmehie.


1 PITA 4:18
Ọ̀ bụrụ na ọ ga-esi ike ịzọpụta ndị ezi omume, oleekwanụ olileanya dịrị ndị na-amaghị Chineke na ndị mmehie?


2 PITA 1:9
Ma onye ọ bụla na-atụkwasịghị ihe ndị a nꞌokwukwe ya nọ nꞌọchịchịrị. Ọ naghị ahụ ụzọ. Ọ bụkwa onye na-echefu na Chineke sachapụrụ mmehie ya nile ime ka o bie ndụ dị mma nꞌihu Onyenwe anyị.


2 PITA 2:13
Nke a ga-abụ ahụhụ dịrị ndị ozizi ụgha ahụ nꞌihi mmehie ha. Nꞌihi na ihe na-atọ ha ụtọ bụ nanị ibi ndụ nke imejupụta ihe ọjọọ ahụ nile na-agụ anụ ahụ ha agụụ. Ha bụ ndị na-ewetara unu ihe ihere mgbe ọ bụla ha so unu na-eri oriri ịhụnanya unu, nꞌihi na nꞌotu akụkụ, ha na-ebi ndụ ajọ omume. Ma ha na-eso unu ezukọ dị ka a ga-asị nꞌezie, na ha bụ ndị dị ọcha nꞌobi ha.


2 PITA 2:14
O nweghị nwanyị si nꞌebe ha nọ gafee nke ha na-adịghị ele anya ọjọọ; mmehie ịkwa iko anaghị ejukwa ha afọ, nꞌihi na agụụ ime mmehie dị nꞌime ha adịghị akwụsị akwụsị. Ha maara otu ha si arafu ụmụ nwanyị ndị okwukwe ha na-esighị ike, mee ka ha soro ha mee mmehie. Ha na-azụ obi ha inwe anya ukwu. Nꞌezie, Chineke bụrụ ha ọnụ.


2 PITA 2:18
Ha na-agwa ndị a ha na-eduhie okwu sị, “A zọpụtaghị unu nꞌihi ọrụ ọma unu rụrụ, ya mere ọ bụghị ihe ọjọọ ma unu gaa nꞌihu ime mmehie. Nꞌihi nzọpụta a zọpụtara unu, unu enwerela onwe unu, meenụ ihe ọ bụla dị unu mma nꞌanya.” Ma ndị ozizi a na-ezi ndị ọzọ ụzọ ha ga-esi nwere onwe ha site nꞌiwu, bụ ohu mmehie na ịla nꞌiyi nꞌonwe ha. Nꞌihi na mmadụ bụ ohu nye ihe ọ bụla na-achị ya.


2 PITA 2:20
Mgbe mmadụ sitere nꞌụzọ ọjọọ nke ụwa gbapụ, nꞌihi na ọ mụtala ihe banyere Onyenwe anyị na Onye nzọpụta anyị Jisọs Kraịst, ọ ga-abụ onye ọnọdụ ya ga-ajọ njọ karịa ka ọ dị na mbụ, ma ọ bụrụ na onye ahụ emesịa bido ime mmehie, nke ga-eme ka ọ ghọọ ohu mmehie.


2 PITA 3:9
Onyenwe anyị anaghị etufu oge imezu nkwa ya, dị ka ndị mmadụ na-ekwu, kama o sitere ogologo ntachi obi na-eche ndị mmehie ka ha chegharịa, nꞌihi na ọ chọghị ka onye ọ bụla laa nꞌiyi, kama ọ chọrọ ka onye ọ bụla si na mmehie ya chegharịa.


1 JỌN 1:7
Ma ọ bụrụ na anyị na-ebi ndụ anyị nꞌihè, dị ka ya onwe ya si nọọ nꞌihè na-ebi ndụ ya, mgbe ahụ anyị na ibe anyị ga-enwe ezi nnwekọ. Jisọs Ọkpara Chineke ga-asachapụkwa anyị site na mmehie anyị nile.


1 JỌN 1:8
Ma ọ bụrụ na anyị asị na anyị adịghị eme mmehie, anyị na-eme onwe anyị ndị nzuzu. Anyị na-ajụkwa ịnabata eziokwu ahụ Chineke na-ekwu banyere ndụ anyị.


1 JỌN 1:9
Ma ọ bụrụ na anyị ekwupụta mmehie anyị nile nꞌihu Chineke, ọ bụ onye anyị pụrụ ịtụkwasị obi na onye na-eme ihe ziri ezi, ọ ga-agbaghara anyị mmehie anyị, sachapụkwa anyị site nꞌomume ọjọọ nile anyị mere.


1 JỌN 1:10
Ọ bụrụ na anyị asị na anyị emeghị mmehie ọ bụla, anyị na-akpọ Chineke onye na-ekwu okwu ụgha, okwu ya enwekwaghị ọnọdụ nꞌime anyị.


1 JỌN 2:1
Ụmụ m, ana m edere unu ihe ndị a nile ka unu si nꞌime mmehie pụta. Ọ bụrụkwanụ na onye ọ bụla nꞌime unu emee mmehie, anyị nwere Jisọs Kraịst, onye na-eguzo nꞌihu Chineke, bụ Nna anyị, arịọrọ anyị arịrịọ. Jisọs Kraịst pụrụ ime nke a nꞌihi na ọ dị ọcha bụrụkwa onye na-eme ihe na-atọ Chineke ụtọ nꞌụzọ nile.


1 JỌN 2:2
Jisọs bụ onye ahụ hụrụ ahụhụ nꞌihi mmehie anyị si otu a mee ka anyị bụrụ ndị nwere ike ịbịakwute Chineke. Ọ bụ Kraịst mere ka Chineke gbaghara anyị mmehie anyị nile, na mmehie ụwa nile.


1 JỌN 2:12
Ana m edere unu ihe ndị a ụmụntakịrị m nꞌihi na a gbagharala unu mmehie nile site nꞌaha Jisọs Onye nzọpụta anyị.


1 JỌN 3:4
Ma ndị ahụ na-anọgide nꞌime mmehie na-emehie megide Chineke. Nꞌihi na mmehie ọ bụla mmadụ mere bụ mmehie megide ihe Chineke naachọ.


1 JỌN 3:5
Unu maara nke ọma na e mere ka Kraịst pụta ìhè iwepụ mmehie anyị nile. O dịkwaghị mmehie ọ bụla dị nꞌime ya, ọ dịghị mgbe ọ bụla o mere ihe Chineke na-achọghị.


1 JỌN 3:6
Ya mere, ọ bụrụ na anyị anọọ Kraịst nso na-eme ihe ọ chọrọ, anyị agaghị ebi ndụ mmehie. Ma ndị ahụ na-ebi ndụ mmehie na-ebi ndụ ahụ nꞌihi na ha amaghị onye Chineke bụ. Ha abụkwaghị ndị a zọpụtara azọpụta.


1 JỌN 3:8
Ma ọ bụrụ na ị na-anọgide na-ebi ndụ ime mmehie oge nile, o gosiri na ị bụ nke ekwensu. Nꞌihi na ekwensu bụ onye na-emehie site na mmalite ihe dum. Mmehie bụkwa aka ọrụ ya. Ma Jisọs Ọkpara Chineke bịara nꞌụwa ịla ike na ọrụ nile nke ekwensu nꞌiyi.


1 JỌN 3:9
Onye a mụrụ ọzọ, nke a mụbatara nꞌezinụlọ Chineke adịghị anọgide na-eme mmehie. Nꞌihi na ndụ Chineke dị nꞌime ya. Ọ pụghị ịnọgide nꞌime mmehie nꞌihi na ndụ ọhụrụ dị nꞌime ya na-achị ya.


1 JỌN 3:10
Ya mere, anyị pụrụ ịkọwa onye bụ nwa Chineke na nwa ekwensu. Onye ọ bụla na-ebi ndụ ime mmehie na nke na-ahụghị nwanna ya nꞌanya esiteghị nꞌezinụlọ Chineke.


1 JỌN 4:10
Site nꞌihe a Chineke meere anyị, anyị na-ahụ ihe a na-akpọ ịhụ mmadụ nꞌanya nꞌezie. Ọ bụghị na anyị buru ụzọ hụ Chineke nꞌanya kama ọ bụ na Chineke nꞌonwe ya hụrụ anyị nꞌanya zite Ọkpara ya ka ọ bụrụ ihe ịjụrụ ya obi nꞌihi mmehie anyị.


1 JỌN 5:16
Ọ bụrụ na ị hụ nwanna nꞌime Kraịst ka ọ na-eme mmehie na-adịghị edube onye na-eme ya nꞌọnwụ, kpee ekpere nꞌihi ya rịọ Chineke ka ọ gbaghara ya. Chineke ga-enyekwa ya ndụ. Ọ bụ nanị mgbe ị maara na mmehie ya bụ nke na-eduba onye mere ya nꞌọnkụ ka ị ga-ahapụ ikpere ya ekpere.


1 JỌN 5:17
Ihe ọ bụla na-ezighị ezi mmadụ mere bụ mmehie nꞌihu Chineke. Ma ihe m na-ekwu nꞌebe abụghị ihe banyere ụmụ mmehie ndị mmadụ na-eme. Ana m ekwu ihe banyere mmehie ahụ na-eduba ndị mere ya nꞌọnwụ.


1 JỌN 5:18
O nweghị onye ọ bụla a gbapụtara kpọbata nꞌezinụlọ Chineke ga-anọgide na-eme mmehie, nꞌihi na Kraịst Ọkpara Chineke na-echebe ya ka onye iro ahụ bụ ekwensu hapụ imetụ ya aka.


2 JỌN 1:11
Nꞌihi na ọ bụrụ na unu ekwenyere ya, unu ga-aghọ ndị enyi ya, soro ya nꞌomume mmehie ha nile.


3 JỌN 1:11
Ezi enyi m m hụrụ nꞌanya, ekwela ka ụdị omume ọjọọ dị otu a bata nꞌime gị. Bụrụ onye na-agbaso ihe ziri ezi na eziokwu mgbe nile. Cheta na ndị nile na-eme ezi ihe na-egosi na ha bụ ụmụ Chineke. Ma ndị ahụ na-anọgide na-adị ndụ nꞌime mmehie na-ezipụta na ha bụ ndị dị anya site nꞌebe Chineke nọ.


JUD 1:6
Chetakwanụ ihe mere ndị mmụọ ozi nupụrụ isi, ndị ahụ hapụrụ ebe obibi ha, họrọ ibi ndụ mmehie. Ugbu a Chineke ekeela ha eriri igwe tụnye ha nꞌolulu ọchịchịrị, ebe ọ hapụrụ ha tutuu ruo ụbọchị ahụ a ga-ama ha ikpe.


JUD 1:7
Chetakwanụ Sodọm na Gomora na obodo nile dị ha gburugburu. Obodo ndị ahụ jupụtara nꞌajọ omume dị iche iche, na ịkwa iko. Chineke mere ka ọkụ si nꞌelu bịa laa ha nꞌiyi, ime ka ha bụụrụ anyị ihe ịdọ aka na ntị, na ahụhụ nke ọkụ ebighị ebi, ebe a na-ata ndị mmehie ahụhụ, dị na-eche ndị na-eme ihe ọjọọ dị otu a.


JUD 1:15
Ọ na-abịa ikpe mmadụ nile ikpe. Ọ ga-enye ndị mmehie ezi ikpe ọmụma ruuru ha, nꞌihi mmehie ha na okwu ọjọọ nile ha kwuru megide Chineke.”


JUD 1:23
Gbalịanụ ịzọpụta ụfọdụ dị ka a ga-asị na ọ bụ site nꞌọkụ ka unu si azọpụta ha. Ma nyekwaranụ ndị ọzọ aka ịchọta nzọpụta site nꞌigosi ha obi ebere. Kama kpachapụnụ anya ịhụ na mgbe unu na-enyere ha aka na ha adọkpụrụghị unu banye nꞌime mmehie ha. Mgbe unu na-enyere ha aka kpọọnụ ajọ omume ha nile asị.


NKPUGHE 1:5
Ka amara sitekwara nꞌebe Jisọs Kraịst nọ, onye sitere nꞌikwesị ntụkwasị obi ya kpughee eziokwu a nye anyị dịrị unu. Ya onwe ya bụ onye mbụ sitere na ndị nwụrụ anwụ bilite. Ọ gaghị anwụkwa ọzọ. Ọ dị elu karịa ndị eze nile nke ụwa. Ka otuto dịrị ya nꞌihi na ọ hụrụ anyị nꞌanya, na nꞌihi na o sitere nꞌọbara ọ wụsịrị dọpụta anyị site na mmehie anyị nile.


NKPUGHE 2:2
Amaara m ihe nile banyere ọrụ ọma gị nile. Ahụkwala m ịrụsị ọrụ ike gị na ntachi obi gị. Amaara m na ị dịghị anabata ma na-anagịde mmehie nꞌetiti ndị gị. Ị nwapụtakwala okwu nke ndị nile na-akpọ onwe ha ndị ozi, ma ha abụghị ndị ozi nꞌezie, na-ekwu. Ị chọpụtala ekwesịghị ntụkwasị obi ha.


NKPUGHE 2:14
“Ma e wezụga ezi ama ndị a, enwere m ihe ụfọdụ megide gị. Ị na-akwagide ụfọdụ nꞌetiti ndị m bụ ndị na-eme omume dị ka Belam, onye ziri Balak otu ọ ga-esi merụọ ụmụ Izirel site nꞌiduba ha na mmehie ịkwa iko na oriri mmemme dị iche iche a na-emere arụsị.


NKPUGHE 2:20
“Ma enwere m ihe ndị a megide gị. Ị na-anabata nwanyị ahụ a na-akpọ Jezibel, onye na-ekwupụta na ya bụ onye amụma nwanyị, onye na-akụziri ndị m na mmehie ịkwa iko bụ ihe ziri ezi. Ọ na-akwagide ha ka ha na-akwa iko, na-akụzikwara ha ka ha na-eri ihe a chụrụ nꞌịta nye arụsị.


NKPUGHE 14:8
Mgbe ahụ mmụọ ozi ọzọ bịara soro ya, na-efegharị na-asị, “Obodo ukwu ahụ bụ Babilọn adaala, lee, ọ daala, nꞌihi na o meela ka mba nile soro ya ṅụrụ mmanya nke ọnụma na ịkwa iko ya na mmehie ya.”


NKPUGHE 18:4
Mgbe ahụ anụkwara m olu ọzọ si nꞌeluigwe na-akpọ oku na-asị, “Ndị m, sitenụ nꞌobodo ahụ pụta, unu esola ya keta oke na mmehie ya, nꞌihi na a ghaghị ịta unu ahụhụ ma unu soro ya mehie.


NKPUGHE 18:5
Nꞌihi na mmehie ya amụbaala ruo eluigwe. Chineke ejikerekwala ikpe ya ikpe nꞌihi ajọ omume ya.


NKPUGHE 18:9
Ndị eze nke ụwa, ndị sooro ya mee mmehie ịkwa iko, ndị ṅụrịkwara ọṅụ nꞌihi ihe ọma nke mmekọta ha na ya na-eweta ga-eru uju nꞌihi ya, mgbe ha ga-ahụ anwụrụ ọkụ nke na-apụta mgbe a na-akpọ ya ọkụ.


NKPUGHE 19:2
Nꞌihi na ikpe ikpe ya nile ziri ezi, bụrụkwa eziokwu. Ọ taala nwanyị ahụ na-akwa iko, na onye jiri mmehie ya merụọ ụwa ahụhụ. Ọ bọọlara ndị ohu ya e gburu egbu ọbọ.”


Igbo Bible 1988
No Data