A A A A A


Chọọ

MATIU 1:18
Banyere ọmụmụ Jisos onye nzọpụta, Chineke mere ka Meri nne ya bụ nwagbọghọ na-amaghị nwoke dịrị ime site nꞌike Mmụọ Nsọ, mgbe otu nwoke a na-akpọ Josef na-achọ ịlụ ya.


MATIU 1:20
Mgbe Josef nwechara mkpebi a, mmụọ ozi Onyenwe anyị bịakwutere ya na nrọ sị ya, “Josef nwa Devidi, atụla egwu ịkpọrọ Meri ka ọ bụrụ nwụnye gị, nꞌihi na nwa ahụ ọ dị ime ya sitere nꞌaka Mmụọ Nsọ.


MATIU 1:24
Mgbe Josef si nꞌụra teta, o mere dị ka mmụọ ozi ahụ nyere ya nꞌiwu. Ọ kpọọrọ Meri ka ọ bụrụ nwụnye ya.


MATIU 2:13
Mgbe ndị amamihe ahụ lasịrị, mmụọ ozi Chineke mere ka Josef hụ ya na nrọ. O nyere Josef iwu sị, “Bilie ọsịịsọ kpọrọ nwantakịrị a na nne ya gbalaa Ijipti. Alọghachila tutuu ruo mgbe m ga-agwa gị, nꞌihi na Herọd na-achọ igbu nwantakịrị a.”


MATIU 2:19
Mgbe Herọd nwụrụ, mmụọ ozi Onyenwe anyị bịakwutere Josef na nrọ nꞌobodo Ijipti sị ya,


MATIU 3:11
Ana m eme nanị ndị chegharịrị site na mmehie ha baptizim, ma onye ka m ukwuu na-abịa. Ọ dị nnọọ ukwuu na etorughị m ibu akpụkpọ ụkwụ ya. Ọ ga-eji Mmụọ Nsọ na ọkụ mee unu baptizim.


MATIU 3:16
Mgbe Jisọs sitere na mmiri ahụ pụta, lee, eluigwe meghere, Jọn hụrụ Mmụọ Chineke ka o si nꞌelu fedata dị ka nduru bekwasị Jisọs nꞌisi.


MATIU 4:1
Emesịa, Mmụọ Nsọ duuru Jisos baa nꞌọzara ka ekwensu nwaa ya ọnwụnwa.


MATIU 4:6
“Site nꞌebe a tụda onwe gị igosi na ị bụ Ọkpara Chineke. Nꞌihi na e dere ya nꞌakwụkwọ nsọ sị, ‘Chineke ga-ezite ndị mmụọ ozi ya ka ha ghọta gị. Ha ga-echebe gị, ka ị ghara ịmerụ ahụ.’ ”


MATIU 4:11
Mgbe ahụ ekwensu hapụrụ ya laa. Ndị mmụọ ozi bịakwutere Jisọs inyere ya aka.


MATIU 4:24
Akụkọ banyere ihe ịrịba ndị a fesara jezuo akụkụ Siria nile. Mgbe ahụ ọtụtụ ndị mmadụ kpọtaara ya ndị nile ahụ na-esighị ike, ndị na-arịa ụdị ọrịa dị iche iche, ndị nwere ahụ mgbu, na ndị mmụọ ọjọọ na-esogbu, na ndị akwụkwụ, na ndị akụkụ ahụ ha kpọnwụrụ akpọnwụ. Ọ gwọkwara ha nile.


MATIU 5:3
“Ndị ogbenye nꞌime mmụọ ha bụ ndị a gọziri agọzi, nꞌihi na alaeze eluigwe bụ nke ha.


MATIU 5:22
Ma ana m asị unu, ọ bụrụ na iwe ewee gị megide nwanne gị, ị na-edo onwe nꞌọnọdụ onye a ga-ekpe ikpe. Ọ bụrụkwa na ị kpọọ nwanne gị onye iberibe, ma ọ bụ onye nzuzu, ị na-enye onwe gị nꞌaka ịba nꞌọkụ ala mmụọ.


MATIU 5:29
Nꞌihi nke a, ọ bụrụ na anya gị achọọ iduba gị na mmehie, ghụpụ ya tufuo. Ọ kaara gị mma na i ji otu anya baa nꞌalaeze eluigwe karịa na i ji anya abụọ baa nꞌọkụ ala mmụọ.


MATIU 7:22
Nꞌụbọchị ikpe ahụ, ọtụtụ ndị mmadụ ga-asị m, ‘Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, anyị kwusara ozi ọma nꞌaha gị. Ọ bụkwa aha gị ka anyị ji chụpụ mmụọ ọjọọ, meekwa ọtụtụ ihe ịrịba ama.’


MATIU 8:16
Nꞌoge anyasị, ha kpọtaara ya ndị mmụọ ọjọọ na-esogbu. Ọ chụpụrụ mmụọ ọjọọ ahụ nile, gwọọkwa ọtụtụ ndị ọzọ ahụ na-esogbu.


MATIU 8:22
Ma Jisọs zara sị ya, “Soro m ugbu a, hapụ ndị nwụrụ anwụ nꞌime mmụọ ha ka ha lie ndị nwụrụ anwụ ibe ha.”


MATIU 8:31
Mmụọ ọjọọ ndị a rịọrọ Jisọs arịrịọ sị ya, “Ọ bụrụ na ị chụpụ anyị, biko, hapụ anyị ka anyị banye nꞌime ezi ndị a.”


MATIU 9:32
Mgbe ndị a sitere nꞌebe ahụ pụọ, ndị ọzọ buteere Jisọs nwoke dara ogbi, onye mmụọ ọjọọ bikwa nꞌime ya.


MATIU 9:33
Mgbe Jisọs chụpụrụ mmụọ ọjọọ ahụ, onye ogbi ahụ bidoro ikwu okwu. Ibubo nwụrụ igwe mmadụ nọ nꞌebe ahụ nꞌahụ. Ha sịrị, “Anyị ahụbeghị ihe dị otu a na ndụ anyị nile.”


MATIU 9:34
Ma ndị Farisii sịrị, “Ọ bụ ekwensu, eze ndị mmụọ ọjọọ na-enye ya ike ime ihe ndị a nile.”


MATIU 10:1
Jisọs kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya iri na abụọ nye ha ike ịchụpụ mmụọ ọjọọ. O nyekwara ha ike ịgwọ ọrịa dị iche iche.


MATIU 10:8
Gwọọnụ ndị ọrịa, kpọteenụ ndị nwụrụ anwụ, meenụ ka ahụ ndị ekpenta dị ọcha, chụpụkwanụ mmụọ ọjọọ. O fughị unu ihe ọ bụla ịnata ike ime ihe ndị a. Otu a kwa, meenụ ka ndị ọzọ nata nꞌaka unu nꞌefu.


MATIU 10:20
Nꞌihi na ọ bụghị unu ga-ekwu nꞌonwe unu. Kama Mmụọ nke Nna unu bi nꞌigwe ga-esite nꞌọnụ unu kwuo okwu.


MATIU 10:28
“Unu atụla egwu ndị pụrụ igbu nanị anụ ahụ unu, ma ha enweghị ike ịmetụ mkpụrụ obi unu aka. Kama onye unu ga-atụ egwu bụ Chineke nanị, onye nwere ike imebi anụ ahụ unu na mkpụrụ obi unu, tụbakwa ha nꞌọkụ ala mmụọ.


MATIU 11:18
Jọn bịara nọọ nꞌetiti unu, o soghị unu rie nri, o sokwaghị unu ṅụọ ihe ọṅụṅụ. Nꞌihi nke a unu sịrị na Jọn bụ onye mmụọ ọjọọ na-achị.


MATIU 11:23
Ọ bụ ezie na gị Kapanọm bụ obodo a na-asọpụrụ, ma ị ga-arịdaru ọkụ ala mmụọ. Nꞌihi na a sị na m rụrụ ọrụ ebube m rụrụ nꞌime gị nꞌobodo Sodọm, agaraghị ala ya nꞌiyi. Ọ gaara adịrị ruo taa.


MATIU 12:18
“Onye a bụ ohu m, onye m họpụtara. Onye m hụkwara nꞌanya. Ọ bụkwa onye ihe ya na-atọ m ụtọ. Aga m etinye mmụọ m nꞌime ya. Ọ ga-eme ka ikpe ziri ezi rute mba nile aka.


MATIU 12:22
Emesịa, ha kpọtaara Jisọs otu nwoke kpuru ìsì ma daakwa ogbi. Ọ bụkwa onye mmụọ ọjọọ na-enye nsogbu. Jisọs gwọrọ ya, mee ka nwoke ahụ hụ ụzọ. O mekwara ka o bido ikwu okwu.


MATIU 12:24
Mgbe ndị Farisii nụrụ ihe ha kwuru, ha sịrị, “Nwoke a chụpụrụ mmụọ ọjọọ a nꞌihi na ekwensu, eze ndị mmụọ ọjọọ, nyere ya ike ịchụpụ ya.”


MATIU 12:26
Otu a kwa, ọ bụrụ na ụfọdụ mmụọ ọjọọ nꞌime alaeze ekwensu na-alụso ibe ha ọgụ na-emegide ha, nke a na-egosi ha ọdịda alaeze ahụ adịghị anya, nꞌihi na nkewa dị egwu abatala nꞌime alaeze ahụ.


MATIU 12:27
Dị ka unu kwuru, ọ bụrụ na m na-achụpụ mmụọ ọjọọ site nꞌike ekwensu, ọ̀ bụ nꞌike onye ka ụmụ unu ndị ikom na-achụpụ ha? Ya mere, ọ bụ ụmụ unu ga-ekpe unu ikpe nꞌihi okwu a unu kwuru.


MATIU 12:28
Kama ọ bụrụ na m na-esite nꞌike Mmụọ Nsọ na-achụpụ mmụọ ọjọọ, matakwanụ na alaeze Chineke abịala nꞌetiti unu.


MATIU 12:31
“Ya mere, ana m agwa unu sị, na a ga-agbaghara mmadụ mmehie ya nile, ma ọ bụ nkwulu ya nile. Ma onye ọ bụla na-ekwulu Mmụọ Nsọ agaghị enweta mgbaghara.


MATIU 12:32
Onye ọ bụla kwuluru Nwa nke mmadụ ga-anata mgbaghara, ma onye ọ bụla kwuluru Mmụọ Nsọ agaghị anata mgbaghara nꞌọgbọ a, ma ọ bụ nꞌọgbọ nke na-abịa.


MATIU 12:43
“Mba ọjọọ nke a! Unu yiri nwoke mmụọ ọjọọ na-achị! Nꞌihi na mgbe mmụọ ọjọọ ahụ si nꞌime nwoke ahụ pụọ, mmụọ ọjọọ ahụ na-aga nꞌọzara ebe mmiri na-adịghị ịchọ ebe ọ ga-ezuru ike mgbe ọ na-achọtaghị ebe izuike,


MATIU 12:44
ọ na-asị nꞌobi ya, ‘Aga m alọghachikwuru nwoke ahụ m si nꞌime ya pụta.’ Mmụọ ọjọọ ahụ na-alọghachikwa jekwuru nwoke ahụ. Mgbe o ruru nꞌebe nwoke ahụ nọ, ọ ga-ahụ na e meela ka obi nwoke ahụ dị ọcha, ma ọ tọgbọrọ nꞌefu, nꞌihi na ọ dịghị ihe ọzọ e tinyere nꞌime ya, mgbe mmụọ ọjọọ ahụ si nꞌime ya pụọ na mbụ.


MATIU 12:45
Mgbe mmụọ ọjọọ ahụ hụrụ na o si otu a dịrị, ọ na-apụ gaa chọtakwa mmụọ ọjọọ asaa ọzọ, ndị dị njọ karịa ya onwe ya. Ha nile na-abata bịa biri nꞌime nwoke ahụ, mee ka ọnọdụ ya dị njọ karịa ka ọ dị na mbụ. Otu a ka ọ ga-adịrị unu ndị bi nꞌọgbọ a jọrọ njọ.”


MATIU 13:39
Onye iro ahụ gara kụọ mkpụrụ puru ahịhịa bụ ekwensu. Owuwe ihe ubi nọchiri anya ọgwụgwụ oge. Ndị owuwe ihe ubi bụkwa ndị mmụọ ozi.


MATIU 13:41
Aga m ezipụ ndị mmụọ ozi m ka ha gaa chịkọtaa ndị nile na-eme ka ndị mmadụ mee mmehie, na ndị nile na-arụ ọrụ ọjọọ.


MATIU 13:49
Otu a ka ọ ga-adị mgbe ụwa ga-agwụ. Ndị mmụọ ozi ga-abịa kewapụ ndị ọjọọ site nꞌetiti ụmụ Chineke.


MATIU 14:26
Mgbe ndị na-eso ụzọ ya hụrụ ya ka ọ na-abịa, oke egwu jidere ha. Ha tiri mkpu sị, “Ọ bụkwanụ mmụọ o!” Ha chere na Jisọs bụ mmụọ.


MATIU 15:22
Nꞌebe ahụ, otu nwanyị onye Kena bi nꞌobodo ahụ bịakwutere Jisọs rịọọ ya sị, “Onyenwe m, nwa Devidi, biko meere m ebere. Ada m nwanyị nwere ajọ mmụọ nꞌime ya nke na-esogbu ya oge nile.”


MATIU 16:18
Ma ka m gwa gị eziokwu, aha gị bụ Pita, nke pụtara ma a sụgharịa ya, Nkume. Ọ bụkwa nꞌelu nkume a ka m ga-ewu ụlọ chọọchị m. Ike nile nke ọkụ ala mmụọ apụkwaghị iguzo megide ya.


MATIU 16:27
Nꞌihi na mụ bụ Nwa nke mmadụ ga-abịa nꞌebube nke Nna m, mụ na ndị mmụọ ozi m. Mgbe ahụ ka m ga-ekpe onye ọ bụla ikpe dị ka ọrụ ya si dị.


MATIU 17:18
Mgbe ha kutere ya, Jisọs baara mmụọ ọjọọ ahụ mba, mee ka o si nꞌime nwanta ahụ pụta. Otu mgbe ahụ, mmụọ ọjọọ ahụ pụtara, ahụ dịrị nwanta ahụ mma.


MATIU 17:19
Mgbe e mesịrị, ndị na-eso ụzọ Jisọs bịakwutere ya na nzuzo jụọ ya sị, “Gịnị mere o ji siere anyị ike ịchụpụ mmụọ ọjọọ ahụ?”


MATIU 17:21
Ma mmụọ ọjọọ dị otu a agaghị apụ, ma ọ bụghị nanị site nꞌikpe ekpere na ibu ọnụ.”


MATIU 18:8
Nꞌihi nke a, ọ bụrụ na aka gị ma ọ bụ ụkwụ gị ga-eme ka i mehie, gbupụ ya tufuokwa ya. Ọ kaara gị mma na ị ga-abanye nꞌalaeze eluigwe na-enweghị ụkwụ na aka, karịa na ị ga-enwe aka na ụkwụ ma banye nꞌọkụ ala mmụọ.


MATIU 18:9
Ọzọ, ọ bụrụ na anya gị ga-eme ka ị mehie, ghụpụta ya tufuokwa ya. Ọ kaara gị mma na ị ga-eji otu anya banye alaeze eluigwe karịa na ị ga-enwe anya abụọ, banye nꞌọkụ ala mmụọ.


MATIU 18:10
“Lezienụ anya ka unu ghara ileda otu nꞌime ụmụntakịrị a anya. Nꞌihi na nꞌeluigwe, ndị mmụọ ozi ha na-anọ nꞌihu Nna m mgbe nile.


MATIU 22:30
Nꞌihi na mgbe e mere ka ndị mmadụ site nꞌọnwụ bilie, ịlụ di na nwụnye agaghị adịkwa. Nꞌihi na mmadụ nile ndị a ga-adị ka ndị mmụọ ozi nꞌeluigwe.


MATIU 22:43
Jisọs jụrụ ha sị, “Gịnị mekwaranụ Devidi jiri kpọọ ya Onyenwe m, nꞌihi na Devidi sitere na ntụzi Mmụọ Nsọ kwuo sị,


MATIU 23:33
Ụmụ agwọ! Ụmụ ajụala! Unu si aṅaa chee na unu ga-agbanarị ikpe ịba nꞌọkụ ala mmụọ?


MATIU 24:31
Aga m ewerekwa olu opi ike zipụ ndị mmụọ ozi ka ha gaa kpọkọtaa ndị nile a họpụtara site nꞌakụkụ nile nke eluigwe na ụwa.


MATIU 24:36
“Ma o nweghị onye ọ bụla maara ụbọchị ahụ, ma ọ bụ oge mgbe ọgwụgwụ ihe nile ga-abụ. Ọ bụladị ndị mmụọ ozi amaghị ya. Ọkpara Chineke amakwaghị. Ọ bụ nanị Nna ya maara.


MATIU 25:31
“Mgbe mụ bụ Nwa nke mmadụ ga-abịa nꞌebube m, mụ na ndị mmụọ ozi nile dị nsọ, mgbe ahụ ka m ga-anọ nꞌelu ocheeze ebube m.


MATIU 25:41
“Mgbe ahụ aga m asịkwa ndị nọ nꞌaka ekpe m, pụọnụ nꞌihu m unu ndị a bụrụ ọnụ. Baanụ nꞌime ogbu ọkụ ebighị ahụ a kwadobeere ekwensu na ndị mmụọ ozi ya.


MATIU 26:41
Nọọnụ na nche, na-ekpekwanụ ekpere, ka ọnwụnwa ghara imeri unu. Nꞌihi na site nꞌime mmụọ m ọ na-agụ m agụụ imezu uche Chineke, ma anụ ahụ m adịghị ike ịnagide ya.”


MATIU 26:53
I cheghị na m pụrụ ịkpọ Nna m oku ka o zitere m igwe ndị mmụọ ozi, ka ha bịa napụta m?


MATIU 28:2
Na mberede, oke ala ọma jijiji malitere. Mmụọ ozi Onyenwe anyị sitere nꞌeluigwe rịdata, kpụgharịa nkume ahụ e ji mechie ọnụ ili ahụ e nyibere Jisọs, nọkwasịkwa nꞌelu ya.


MATIU 28:3
Ihu mmụọ ozi ahụ na-enwu dị ka amụma. Uwe ya na-achakwa ọcha dị ka ogho.


MATIU 28:4
Mgbe ndị na-eche ili ahụ nche hụrụ mmụọ ozi a ha tụrụ oke egwu. Ha makwara jijiji, daa nꞌala, nọọ dị ka ndị nwụrụ anwụ.


MATIU 28:5
Ma mmụọ ozi ahụ gwara ụmụ nwanyị ahụ okwu sị ha, “Unu atụla egwu, nꞌihi na amaara m na ọ bụ Jisọs onye a kpọgburu nꞌelu obe ka unu na-achọ.


MATIU 28:8
Ụmụ nwanyị ahụ jiri oke egwu na ọṅụ gbara ọsọ gaa izi ndị na-eso ụzọ Jisọs ozi a mmụọ ozi ahụ ziri ha.


MATIU 28:19
Ya mere, gaanụ mee ka mba nile bụrụ ndị na-eso ụzọ m. Meenụ ha baptizim baa nꞌaha Nna, na nke Ọkpara, na nke Mmụọ Nsọ.


MAK 1:8
Ugbu a ana m eji mmiri efu na-eme unu baptizim, ma mgbe nwoke ahụ dị ukwuu bịara, ọ ga-eji Mmụọ Nsọ mee unu baptizim.”


MAK 1:10
Mgbe Jisọs si nꞌime mmiri ahụ na-apụta, oge Jọn mechara ya baptizim, ọ hụrụ ka eluigwe meghere, hụkwa ka Mmụọ Nsọ si nꞌeluigwe rịdata dị ka nduru, bekwasị Jisọs nꞌisi.


MAK 1:12
Ọ dịghị anya mgbe ihe ndị a mesịrị, Mmụọ Nsọ kwaliri Jisọs ka ọ gaa nꞌime ọzara.


MAK 1:13
Ebe ahụ ka ọ ga-anọ iri ụbọchị anọ ka ekwensu nwaa ya ọnwụnwa. Nanị ya nọ nꞌebe ahụ, mmadụ ọ bụla anọkwaghị ya, kariakwa ụmụ anụ ọhịa. Ma ndị mmụọ ozi bịakwara nyere ya aka.


MAK 1:23
Ma nꞌụlọ ekpere ahụ e nwere otu nwoke nọ nꞌime ya nke mmụọ ọjọọ na-esogbu. Mgbe nwoke a nụrụ ihe Jisọs na-ezi, o tiri mkpu akwa sị,


MAK 1:25
Jisọs baara mmụọ ọjọọ ahụ mba sị ya, “Mechie ọnụ si nꞌime nwoke a pụta!”


MAK 1:26
Nꞌotu oge ahụ mmụọ ọjọọ ahụ mere ka akwụkwụ dọọ nwoke ahụ. Emesịa ọ kwara akwa nꞌoke olu hapụ nwoke ahụ.


MAK 1:27
O juru ndị nọ nꞌụlọ ekpere ahụ anya nke ukwuu. Nꞌihi ya ha bidoro na-ajụrịta onwe ha ajụjụ na-asị, “Anyị ga-esi aṅaa kọwaa ihe anya anyị hụrụ taa? Nꞌezie, nke a bụ nnọọ ozizi ọhụrụ! Lee, okwu ọnụ efu ka o ji nye iwu ka mmụọ ọjọọ site nꞌahụ mmadụ pụọ, ha pụkwara!”


MAK 1:32
Nꞌoge anyasị, mgbe anwụ dara, ndị mmadụ butere ndị ha ahụ na-esighị ike, dote ha nꞌihu ụlọ ebe ahụ Jisọs nọ. Ha butekwara ndị mmụọ ọjọọ na-esogbu.


MAK 1:34
Jisọs pụtara nꞌezi gwọọ ndị nile ọrịa dị iche iche na-arịa. Ọ chụpụkwara mmụọ ọjọọ site nꞌahụ ndị ọ na-enye nsogbu. Ebe ọ bụ na mmụọ ọjọọ ndị a maara onye Jisọs bụ, o kweghị ka ha kwuo okwu ọ bụla mgbe ọ na-achụpụ ha.


MAK 1:39
Ya mere, ha pụrụ jegharịa nꞌebe dị iche iche na Galili. Ebe ọ bụla ha jeruru, Jisọs kwusara ozi ọma nꞌụlọ ekpere ndị Juu. Ọ chụpụkwara mmụọ ọjọọ.


MAK 3:11
Mgbe ọ bụla kwa ndị mmụọ ọjọọ na-achị hụrụ Jisọs ha na-ada nꞌala nꞌihu ya na-eti mkpu akwa na-asị, “Ị bụ Okpara Chineke!”


MAK 3:15
Ndị a ka ọ ga-enyekwa ike ịgwọ ọrịa, na ịchụpụ mmụọ ọjọọ.


MAK 3:22
Ma ndị ozizi iwu si Jerusalem bịa sịrị, “O bu ekwensu nꞌisi. Ọ bụkwa ekwensu a na-enye ya ike o ji achụpụ mmụọ ọjọọ.”


MAK 3:29
Ma onye ọ bụla kwuluru Mmụọ Nsọ agaghị anata mgbaghara. A gaghị agbaghara ya mmehie nkwulu a nꞌụwa a ma ọ bụ nꞌụwa ọzọ.”


MAK 5:2
Otu mgbe ahụ ha si nꞌime ụgbọ ha wụdata, onye buru ụzọ zute ha bụ nwoke mmụọ ọjọọ na-achị. O sitere nꞌebe a na-eli ozu pụta.


MAK 5:8
Mmụọ ọjọọ ahụ siri otu a kwuo okwu nꞌihi na Jisọs nyere ya iwu ka o site nꞌime nwoke ahụ pụta.


MAK 5:9
Jisọs jụrụ mmụọ ọjọọ ahụ ajụjụ sị, “Gịnị bụ aha gị?” Mmụọ ọjọọ ahụ zara sị, “Aha m bụ igwe, nꞌihi na anyị dị ọtụtụ.”


MAK 5:10
Mmụọ ọjọọ ndị a rịọsiri Jisọs arịrịọ ike ka ọ hapụ iziga ha nꞌebe dị anya.


MAK 5:12
Mmụọ ọjọọ ndị a rịọrọ Jisọs sị, “Biko, ziga anyị nꞌime igwe ezi a.”


MAK 5:13
Jisọs kwenyere ka ha banye nꞌime igwe ezi ahụ. Otu mgbe ahụ mmụọ ọjọọ ndị a bara nꞌime ezi ndị ahụ, igwe ezi ahụ nile ọnụ ọgụgụ ha ruru puku abụọ, gbaara ọsọ site na mkputamkpu ala ọnụ mmiri dakpuo nꞌime osimiri, ebe mmiri riri ha nile.


MAK 5:15
Mgbe ha pụtara, ha hụrụ Jisọs. Ha hụkwara nwoke ahụ Jisọs sitere nꞌime ya chụpụ mmụọ ọjọọ ahụ. O yi uwe, nọdụ ala dị ka onye isi zuru oke.


MAK 5:16
Ndị ahụ nọ mgbe Jisọs chụpụrụ mmụọ ọjọọ ahụ kọọrọ mmadụ nile ihe mere nwoke ahụ. Ha kọkwaara ha akụkọ banyere mmụọ ọjọọ ndị ahụ a chụpụrụ, na ihe mere igwe ezi ndị ahụ.


MAK 5:18
Nꞌihi ya, Jisọs banyekwara nꞌime ụgbọ mmiri. Ma nwoke ahụ Jisọs si nꞌime ya chụpụ mmụọ ọjọọ ahụ rịọrọ Jisọs ka o soro ha.


MAK 6:7
Jisọs kpọrọ mmadụ iri na abụọ ahụ na-eso ya zipụ ha, abụọ abụọ. O nyere ha ike ịchụpụ mmụọ ọjọọ.


MAK 6:13
Ha chụpụrụ ọtụtụ mmụọ ọjọọ, wụkwasịkwa ndị ahụ na-esighị ike mmanụ olivu, gwọọ ha.


MAK 6:49
Ma mgbe ndị na-eso ụzọ ya hụrụ ya ka ọ na-aga ije nꞌelu osimiri, ha chere na ọ bụ mmụọ ka ha hụrụ. Nꞌihi ya ha bidoro iti mkpu akwa.


MAK 7:25
Ọ dịghị anya otu nwanyị bịakwutere ya. Nwanyị a nwere otu nwa nwanyị ntakịrị onye mmụọ ọjọọ na-esogbu. Ọ nụla akụkọ banyere ọrụ Jisọs na-arụ, ya mere, ọ bịakwutere ya daa nꞌala nꞌụkwụ ya.


MAK 7:26
Ọ rịọrọ Jisọs ka ọ chụpụrụ ya mmụọ ọjọọ bị nꞌime nwa ya nwanyị. (Nwanyị a bụ onye obodo Siria Fonisia. Ọ bụkwa onye mba ọzọ e ledara anya.)


MAK 7:30
Nwanyị ahụ laghachiri nꞌụlọ ya. Mgbe o ruru ọ hụrụ nwa ya nwanyị ahụ ka o dina nꞌelu ihe ndina. Mmụọ ọjọọ ahụ esitekwala nꞌebe ọ nọ pụọ.


MAK 8:38
Ọ bụrụ na ihere na-eme onye ọ bụla nꞌihi m, na nꞌihi okwu m nꞌụwa ọjọọ a, na nꞌụwa mmehie a, ọ ga-abụkwara mụ bụ Nwa nke mmadụ ihe ihere mụ na onye ahụ inwekọ ihe ọ bụla, mgbe m ga-abịaghachi nꞌebube nke Nna m, mụ na ndị mmụọ ozi dị nsọ.”


MAK 9:17
Otu onye nꞌime igwe mmadụ ahụ zara ya sị, “Onye ozizi, akpọtaara m gị nwa m nwoke a ka ị gwọọ ya. Mmụọ ọjọọ na-esogbu ya. O mekwara ka ọ daa ogbi.


MAK 9:18
Mgbe ọ bụla mmụọ ọjọọ ahụ malitere isogbu ya, ọ na-atụda ya nꞌala. Mgbe ahụ ọ na-agbọ ụfụfụ nꞌọnụ ya, na-ata ikikiri eze. Anụ ahụ ya na-adị sisiriri dị ka onye nwụrụ anwụ. Arịọrọ m ndị na-eso ụzọ gị ka ha chụpụ mmụọ ọjọọ a, ma ha enweghị ike.”


MAK 9:20
Ha kpọtaara ya nwanta ahụ. Mgbe mmụọ ọjọọ ahụ hụrụ Jisọs, o nugharịrị nwanta ahụ nke ukwuu. Nwanta ahụ dara nꞌala na-atụrụ onwe ya nꞌala, na-agbọkwa ụfụfụ nꞌọnụ ya.


MAK 9:22
Mmụọ ọjọọ a na-eme ya ka ọ daba nꞌọkụ, ma ọ bụ na mmiri, ime ka ọ nwụọ. Ọ bụrụ na ọ dị ihe i nwere ike ime, biko meere anyị ebere, nyere anyị aka.”


MAK 9:25
Mgbe Jisọs hụrụ na igwe mmadụ ahụ na-agba ọsọ na-abịa nꞌebe ọ nọ, ọ baara mmụọ ọjọọ ahụ mba sị ya, “Gị mmụọ ọjọọ ntị ike na ịda ogbi, ana m enye gị iwu, site nꞌime nwanta a pụta! Abanyekwala nꞌime ya ọzọ!”


MAK 9:26
Mmụọ ọjọọ ahụ tiri mkpu akwa, nugharịa nwanta ahụ ọzọ, site nꞌime ya pụta. Nwanta ahụ dara tọgbọrọ nꞌala dị ka onye nwụrụ anwụ. Ndị nile nọ nꞌebe ahụ sịrị, “Ọ nwụọla!”


MAK 9:28
Emesịa, Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya siri nꞌebe ahụ pụọ. Mgbe ha batara nꞌụlọ ebe ha na-anọ, ndị na-eso ụzọ ya jụrụ ya na nzuzo sị ya, “Gịnị mere o jiri siere anyị ike ịchụpụ mmụọ ọjọọ ahụ?”


MAK 9:29
Jisọs zara sị ha, “Ọ bụ nanị site nꞌike ekpere ka a pụrụ ịchụpụ ụdị mmụọ ọjọọ ahụ.”


MAK 9:38
Jọn, otu nꞌime ndị na-eso ụzọ ya gwara Jisọs sị ya, “Onye ozizi, anyị hụrụ otu onye ji aha gị na-achụpụ mmụọ ọjọọ ma anyị kwụsịrị ya, nꞌihi na ọ bụghị otu nꞌime ndị na-eso anyị.”


MAK 9:43
“Ọ bụrụ na aka gị emee ka i mehie, gbupụ ya. Ọ dịrị gị mma iji otu aka dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi, karịa na ị ga-eji aka abụọ banye nꞌọkụ ala mmụọ, ebe ọkụ na-adịghị anyụ anyụ.


MAK 9:45
“Ọ bụrụ na ụkwụ gị emee ka i mehie gbupụ ya tụfuo, nꞌihi na ọ kara gị mma ịbụ onye ụkwụ rụrụ karịa na ị ga-abụ onye nwezuru ụkwụ ya abụọ e tinyekọtaa gị na ha nꞌọkụ ala mmụọ.


MAK 9:47
“Ọ bụrụkwa na anya gị emee ka i mehie, ghụpụ ya tụfuo ya. Ọ dịrị gị mma na i ji otu anya dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi nꞌalaeze Chineke, karịa na i ga-enwe anya abụọ a tụba gị nꞌọkụ ala mmụọ, ebe a na-adịghị emenyụ ọkụ ahụ emenyụ.


MAK 10:14
Ma mgbe Jisọs hụrụ ihe a ndị na-eso ụzọ ya mere, o wutere mmụọ ya. Ọ baara ha mba sị, “Hapụnụ ụmụntakịrị ka ha bịakwute m. Unu egbochikwala ha. Nꞌihi na alaeze Chineke dịịrị ndị dị otu a.


MAK 12:25
Nꞌihi na mgbe ụmụnne asaa ahụ ga-esi nꞌọnwụ bilie, ha agaghị alụkwa di na nwụnye, nꞌihi na ha ga-adị ka ndị mmụọ ozi nọ nꞌeluigwe.


MAK 12:36
Devidi nꞌonwe ya sitere nꞌike Mmụọ Nsọ kwuo sị, ‘Chineke gwara Onyenwe m okwu sị ya, nọdụ nꞌakụkụ m tutuu ruo mgbe m mere ka ndị iro gị bụụrụ gị ihe ịtụkwasị ụkwụ.’


MAK 13:11
Ma mgbe ha jidere unu kpụta unu nꞌụlọ ikpe, unu echegbula onwe unu banyere ihe unu ga-ekwu iji sara ọnụ unu. Kama gwanụ ha ihe ọ bụla Chineke tinyere nꞌọnụ unu ikwu nꞌoge ahụ. Nꞌihi na ọ bụghị unu ga-ekwu okwu, kama ọ bụ Mmụọ Nsọ ga-esite nꞌọnụ unu kwuo okwu.


MAK 13:27
Mgbe ahụ ka m ga-ezipụ ndị mmụọ ozi m ka ha gaa kpọkọtaa ndị nile a họpụtara site nꞌakụkụ nile nke ụwa, site nꞌotu nsọtụ ruo na nsọtụ nke ọzọ.


MAK 13:32
“O nweghị onye ọ bụla maara ụbọchị ihe ndị a ga-eme, ma ọ bụ oge ha ga-emezu. Ndị mmụọ ozi amaghị, Nwa nke mmadụ amakwaghị. Ọ bụ nanị Nna m maara.


MAK 14:38
Nọọnụ na nche, na-ekpekwanụ ekpere ka unu hapụ ịdaba nꞌọnwụnwa. Ọ na-agụ mmụọ m agụụ ime ihe Chineke chọrọ, ma anụ ahụ adịghị ike.”


MAK 16:9
Nꞌụbọchị mbụ nꞌizu ụka, mgbe Jisọs si nꞌọnwụ bilie, onye mbụ o gosiri onwe ya bụ Meri Magdalin, nwanyị ahụ o sitere nꞌahụ ya chụpụ mmụọ ọjọọ asaa.


MAK 16:17
“Ndị kweere ga-enwekwa ihe iriba ama a ga-egosi okwukwe ha. Ha ga-esite nꞌaha m chụpụ mmụọ ọjọọ. Ha ga-ekwukwa okwu nꞌasụsụ ọhụrụ dị iche iche.


LUK 1:11
Mgbe Zakaraya nọ nꞌime ime ụlọ nsọ ahụ na-achụ aja ya, mmụọ ozi Chineke mere ka Zakaraya hụ ya anya. Mmụọ ozi a bịara guzo nꞌakụkụ aka nri ebe nchụaja ahụ Zakaraya nọ na-achụ aja nsure ọkụ ya. Mgbe Zakaraya hụrụ mmụọ ozi a, obi fepụrụ ya. Ọ tụkwara oke egwu.


LUK 1:13
Ma mmụọ ozi ahụ gwara ya okwu sị, “Zakaraya, atụla egwu! Nꞌihi na abịara m ịgwa gị na Chineke anụla ekpere gị. Ọ ga-emekwa ka Elizabet nwụnye gị tụrụ ime, mụtara gị nwa nwoke, onye ị ga-akpọ aha ya Jọn.


LUK 1:15
Nꞌihi na nwanta ahụ ga-abụ onye dị ukwuu nꞌanya Chineke. Ọ gaghị emetụ mmanya ọ bụla aka, ọ gaghị aṅụkwa mmanya na-egbu egbu, nꞌihi na site nꞌafọ nne ya, Chineke ga-emejupụta ya na Mmụọ Nsọ.


LUK 1:17
Dị ka Ịlaija siri bụrụ nwoke dị ike, na onye jupụtara na Mmụọ Nsọ, otu a ka Jọn ga-adị. Ọ bụ ya ga-aga nꞌihu Onye nzọpụta ahụ na-abịa, kwadoo ndị mmadụ ịnabata Onyenwe anyị. Jọn ga-emekwa ka udo dịrị nꞌetiti ndị nna na ụmụ ha, ọ ga-akpọghachitekwa ndị na-enupụ isi mee ka ha bụrụ ndị ga-eche uche dị ka ndị ezi omume.”


LUK 1:18
Zakaraya jụrụ mmụọ ozi ahụ ajụjụ sị ya, “Olee otu m ga-esi mata na ihe ị gwara m bụ eziokwu? Ị hụlanụ na abụrụla m agadi nwụnye m bụkwa agadi.”


LUK 1:19
Mgbe ahụ mmụọ ozi ahụ zara ya sị, “Aha m bụ Geburel. Ọ bụ nꞌihu Chineke, onye zitere m iwetara gị akụkọ ọma a ka m na-anọ ụbọchị nile.


LUK 1:26
Mgbe ime Elizabet ruru ọnwa isii, Chineke zikwara mmụọ ozi ya Geburel, ka ọ gaa nꞌobodo Nazaret nke dị nꞌime Galili.


LUK 1:28
Mmụọ ozi ahụ bịakwutere nwagbọghọ ahụ sị ya, “Nwagbọghọ, ekele! Gị onye ihuọma Onyenwe anyị dịkwasịrị. Chineke nọnyekwaara gị!”


LUK 1:29
Meri enweghị udo nꞌobi ya mgbe ọ nụrụ okwu a mmụọ ozi kwuru. O bidokwara ịtụgharị nꞌuche ya ihe ekele a pụtara.


LUK 1:30
Ma mmụọ ozi ahụ sịrị ya, “Atụla egwu, nꞌihi na Chineke ekpebiela imere gị ihe ọma!


LUK 1:34
Meri jụrụ mmụọ ozi ahụ ajụjụ sị, “Ebe m na-enweghị di, aga m esikwanụ aṅaa mụta nwa?”


LUK 1:35
Mmụọ ozi ahụ zara ya sị, “Mmụọ Nsọ Chineke ga-abịakwasị gị, ike Chineke ga-ekpuchikwa gị. Mgbe ahụ nwa ahụ ị ga-amụ ga-abụ onye dị nsọ. A ga-akpọkwa ya Ọkpara Chineke.


LUK 1:41
Mgbe Elizabet nụrụ ekele Meri, nwa ahụ ọ dị ime ya megharịrị ahụ. Mgbe ahụ kwa e mere ka Elizabet jupụta na Mmụọ Nsọ.


LUK 1:67
Mgbe ahụ kwa e mere ka Zakaraya jupụta na Mmụọ Nsọ. O buru amụma kwuo sị,


LUK 1:80
Nwanta ahụ toro bụrụ onye dị ike nꞌime mmụọ. O biri nanị ya nꞌime ọzara tutuu oge ahụ eruo mgbe ọ ga-ebido ọrụ ya nꞌetiti ụmụ Izirel.


LUK 2:9
Na mberede, ndị ọzụzụ atụrụ a hụrụ mmụọ ozi Onyenwe anyị ka ọ bịara guzo nꞌihu ha. Ebube Chineke gbakwara ha gburugburu mee ka ìhè jupụta nꞌebe ahụ ha nọ dị ka a ga-asị na ọ bụkwaghị abalị. Oke egwu tụrụ ndị ọzụzụ atụrụ ahụ.


LUK 2:10
Ma mmụọ ozi ahụ gwara ha okwu sị ha, “Unu atụla egwu nìhi na ewtaara m unu ozi oma nke na-eweta oke ọṅụ, bụ ọṅụ ga-adịrị mmadụ nile.


LUK 2:13
Mgbe mmụọ ozi a kpụ okwu ndị a nꞌọnụ na-ekwu, na mberede, igwe mmụọ ozi pụtara soro mmụọ ozi a, ee, ọtụtụ igwe mmụọ ozi nke eluigwe pụtara, soro mmụọ ozi a bido ịbụ abụ na ito Chineke na-asị,


LUK 2:15
Mgbe ndị mmụọ ozi a laghachiri nꞌeluigwe, ndị ọzụzụ atụrụ sịrịtara onwe ha, “Bịanụ ka anyị jeruo Betilehem, ka anyị jiri anya anyị hụ ihe ndị a dị egwu nke Onyenwe anyị gwara anyị site nꞌọnụ mmụọ ozi.”


LUK 2:17
Mgbe ha kelesịrị ya, ha pụrụ kọọrọ onye ọ bụla ha hụrụ ihe mmụọ ozi ahụ gwara ha banyere nwanta a.


LUK 2:20
Nꞌikpeazụ, ndị ọzụzụ atụrụ ahụ laghachiri azụ nꞌebe igwe atụrụ ha nọ. Mgbe ha na-aga, ha na-eto Chineke nꞌihi ihe ha nụrụ, na nꞌihi ihe ha hụkwara. Nꞌihi na ihe nile ha hụrụ dị, dị ka mmụọ ozi ahụ gwara ha.


LUK 2:21
Nꞌụbọchị nke asatọ ya, mgbe oge ruru ibi nwanta ahụ ugwu, ha gụkwara ya aha. Aha ha nyere ya bụ Jisọs, aha ahụ mmụọ ozi sị na a ga-akpọ ya tupuu Meri adịrị ime.


LUK 2:25
Nꞌoge ahụ kwa, e nwere otu nwoke bi na Jerusalem aha ya bụ Simiọn, onye jupụtara na Mmụọ Nsọ. Simiọn bụ ezi mmadụ, bụrụkwa onye ji obi ya nile na-efe Chineke. Ọ bụkwa onye na-ele anya ịhụ mgbe Chineke ga-azọpụta ndị Izirel.


LUK 2:26
Ma Mmụọ Nsọ Chineke mere ka Simiọn mata na ọ gaghị anwụ tutuu ruo mgbe ọ hụrụ Onye nzọpụta ahụ Chineke kwere nkwa izite.


LUK 2:27
Nꞌụbọchị ahụ Meri na Josef kuuru Jisọs bịa nꞌụlọ nsọ ukwu ahụ, imere ya ihe iwu kwuru, Mmụọ Nsọ kwalikwara Simiọn, mee ya ka ọ bịa nꞌụlọ nsọ ukwu ahụ.


LUK 3:16
Nꞌihi nke a, Jọn gwara ha sị, “Eji m mmiri efu na-eme unu baptizim, ma ọ dị otu onye dị ukwuu karịa m, onye ga-abịa na mgbe na-adịghị anya. Ọ dị nnọọ ukwuu karịa m, nꞌihi na etozughị m ịtọpụ eriri akpụkpọ ụkwụ ya. Ọ ga-eji Mmụọ Nzọ na ọkụ mee unu baptizim.


LUK 3:22
Mmụọ Nsọ sikwa nꞌelu rịdata dị ka nduru, bekwasị Jisọs nꞌisi. Nꞌotu oge ahụ olu sitere nꞌelu daa sị, “Ị bụ Ọkpara m, onye m hụrụ nꞌanya. Ihe nile banyere gị na-atọ m ụtọ.”


LUK 4:1
Mgbe ahụ Jisọs onye jupụtara nꞌike Mmụọ nsọ si nꞌosimiri Jọdan obe a nọ mee ya baptizim pụọ. Mmụọ Nsọ duuru ya baa nꞌime ọzara.


LUK 4:10
Nꞌihi na e dere ya nꞌakwụkwọ nsọ sị, ‘Chineke ga-ezite ndị mmụọ ozi ya ka ha chebe gị.


LUK 4:14
Mgbe ahụ Jisọs lọghachiri na Galili. Nꞌoge a, o jupụtara nꞌike Mmụọ Nsọ. Akụkọ banyere ya gbasara ruo akụkụ Galili nile.


LUK 4:18
“Mmụọ nke Onyenwe anyị dị nꞌahụ m, nꞌihi na ọ họpụtala m ikwusa ozi ọma nye ndị ogbenye, Ọ họpụtala m ikwusa na ndị e kere agbụ ga-enwere onwe ha, na ndị kpuru ìsì ga-ahụkwa ụzọ ọzọ, na ndị a na-emegbu ga-esite nꞌaka ndị na-emegbu ha nwere onwe ha,


LUK 4:33
Otu ụbọchị mgbe ọ nọ na-ezi ihe nꞌụlọ ekpere ndị Juu, otu nwoke nke mmụọ ọjọọ bi nꞌime ya bịara nso ebe ọ nọ bido na-eti mkpu nꞌoke olu na-asị,


LUK 4:35
Ma Jisọs baara mmụọ ọjọọ ahụ mba sị ya, “Mechie ọnụ gị si nꞌime ya pụta!” Mmụọ ọjọọ ahụ tụrụ nwoke a nꞌala nꞌihu ndị nọ nꞌebe ahụ, site nꞌime nwoke ahụ pụta, ma o merụghị ya ahụ.


LUK 4:36
Nke a juru mmadụ nile anya mee ka ha sịrịta onwe ha, “Gịnị dị nꞌokwu ọnụ nwoke a, lee na o ji ike na-enye mmụọ ọjọọ ndị a iwu, ha na-apụkwa!”


LUK 4:41
Mmụọ ọjọọ dị iche iche si nꞌime ọtụtụ mmadụ pụta na-eti mkpu na-asị, “Ị bụ Ọkpara Chineke!” Ma Jisọs baara ha mba, kwụsị ha ikwu okwu, nꞌihi na ha maara na ọ bụ Onye nzọpụta ahụ.


LUK 6:18
Jisọs chụpụkwara ọtụtụ mmụọ ọjọọ site nꞌime ndị ha na-esogbu.


LUK 7:21
Mgbe ahụ, ndị ozi ahụ Jọn zitere nọ nꞌebe ahụ Jisọs nọ hụ ka Jisọs siri gwọọ ọtụtụ ndị ọrịa, hụkwa ka o si chụpụ ọtụtụ mmụọ ọjọọ. Ha hụkwara ka o si mee ka ndị kpuru ìsì hụ ụzọ ọzọ.


LUK 8:2
Ụmụ nwanyị ụfọdụ ndị a Jisọs gwọrọ ọrịa na-enye ha nsogbu, onye dị ka Meri Magdalin onye o sitere nꞌime ya chụpụ mmụọ ọjọọ asaa,


LUK 8:15
“Ma mkpụrụ ndị ahụ dara nꞌezi ala nọchiri anya ndị mmadụ jiri obi ghere oghe na mmụọ ziri ezi nabata okwu ahụ ma gaakwa nꞌihu ime ihe okwu ahụ kwuru. Ndị a na-apụ jiri ntachi obi gbasaa ozi ọma ahụ, rite ndị ọzọ nꞌuru.


LUK 8:27
Mgbe Jisọs si nꞌugbọ mmiri na-arịpụta onye zutere ya bụ otu nwoke obodo ahụ mmụọ ọjọọ bi nꞌime ya. Ọ gba ọtọ. O bighị nꞌụlọ ọ bụla, kama ebe o jiri mere ụlọ ya bụ ebe a na-eli ozu.


LUK 8:29
Nwoke a si otu a kwuo okwu nꞌihi na Jisọs enyela mmụọ ọjọọ ahụ bi nꞌime ya iwu ka o site nꞌime ya pụta. Ọ dị mgbe mmụọ ọjọọ a na-ejidesi ya ike. Nꞌoge a, ọ bụrụ na e jiri ụdọ igwe kee ya aka na ụkwụ, tinye ya nꞌụlọ mkpọrọ, mmụọ ọjọọ a na-enyere ya akạ ịdọbisi ụdọ igwe ahụ. Ọ na-enyekwara ya aka isi nꞌụlọ mkpọrọ ahụ tikapụta. Ọ pụtakwa, ọ na-eduru ya gaa nꞌọzara.


LUK 8:30
Jisọs jụrụ nwoke ahụ ajụjụ sị ya, “Gịnị bụ aha gị?” Mmụọ ọjọọ ahụ nọ nꞌime nwoke ahụ zara sị ya, “Aha m bụ ìgwe, nꞌihi na anyị dị ọtụtụ.”


LUK 8:31
Mgbe ahụ mmụọ ọjọọ ndị ahụ rịọrọ Jisọs ka ọ ghara inye ha iwu ka ha banye nꞌolulu dị omimi ahụ nke na-enweghị njedebe.


LUK 8:32
Nꞌoge ahụ, ọ dị igwe ezi nọ nꞌakụkụ ugwu dị ebe ahụ nso na-akpa nri. Mmụọ ọjọọ ndị a rịọrọ Jisọs ka o nye ha ike ka ha banye nꞌime ezi ndị ahụ. Jisọs nyere ha ike.


LUK 8:33
Mmụọ ọjọọ ndị ahụ sitere nꞌime nwoke ahụ pụọ, banye nꞌime ezi ndị ahụ. Otu mgbe ahụ ha banyere, igwe ezi ahụ nile sitere na mkputamkpu ala ọnụ mmiri ahụ gbara ọsọ dabanyechaa nꞌime mmiri ahụ, ebe osimiri riri ha.


LUK 8:35
Ọtụtụ mmadụ sitere nꞌobodo ndị a pụta, ka ha jiri anya ha hụ ihe mere. Mgbe ha bịara nꞌebe Jisọs nọ, ha hụrụ nwoke ahụ e si nꞌime ya chụpụ mmụọ ọjọọ ahụ. Ọ nọ ala nꞌakụkụ ebe ụkwụ Jisọs dị. O yi uwe, nọdụkwa nꞌanya udo. Ụjọ tụrụ ndị mmadụ ahụ nile.


LUK 8:36
Ndị nọ nꞌebe ahụ mgbe Jisọs chụpụrụ mmụọ ọjọ ndị ahụ, kọọrọ ndị si nꞌime obodo pụta otu Jisọs siri gwọọ nwoke ahụ.


LUK 8:38
Mgbe Jisọs na-abanye nꞌụgbọ, nwoke ahụ o sitere nꞌime ya chụpụ mmụọ ọjọọ ahụ, bịara rịọ ya sị, “Biko kwerenụ ka m soro gị.” Ma Jisọs ekweghi. Kama ọ gwara ya sị,


LUK 8:55
Mmụọ ya lọghachiri ọzọ. O bilitekwara. Jisọs gwara ndị mụrụ ya ka ha chọọrọ ya nri ka o rie.


LUK 9:1
Mgbe ahụ Jisọs kpọrọ mmadụ iri na abụọ ahụ na-eso ụzọ ya nye ya ike ịchụpụ mmụọ ọjọọ, na ike ịgwọ ọrịa nile.


LUK 9:26
“Nꞌihi na onye ọ bụla ihere m ma ọ bụ ihere okwu m na-eme, ka ihere ya ga-emekwa m mgbe m ga-abịaghachi nꞌebube nke Nna m, na nꞌebube ndị mmụọ ozi.


LUK 9:39
Mmụọ ọjọọ na-abịa jide ya na-eme ka ọ na-eti mkpu. Ọ na-enugharịkwa ya na-eme ka ọ na-agbọ ụfụfụ nꞌọnụ. Mgbe mmụọ ọjọọ a mesịrị nke a laa, ike afụ anaghị adịkwa nwanta a.


LUK 9:40
Abịakwutere m ndị na-eso ụzọ gị rịọ ha ka ha chụpụ mmụọ ọjọọ ahụ, ma ha enweghị ike.”


LUK 9:42
Mgbe nna nwanta ahụ du nwanta ahụ na-abịa, mmụọ ọjọọ ahụ kwaturu ya nꞌala nugharịa ya. Ma Jisọs nyere mmụọ ọjọọ ahụ iwu ka o si nꞌime nwanta ahụ pụta. Ọ gwọrọ nwanta ahụ kpọnyekwa ya nna ya.


LUK 9:49
Mgbe ahụ Jọn gwara ya sị, “Nna anyị ukwu, anyụ hụrụ otu nwoke ka o ji aha gị na-achụpụ mmụọ ọjọọ. Ebe ọ na-esoghị nꞌotu anyị, anyị kwụsịrị ya.”


LUK 9:60
Ma Jisọs zara ya sị, “Hapụ ndị nwụrụ anwụ nꞌime mmụọ ha ka ha lie ndị dị ka ha. Ọrụ gị bụ ịga gbasaa ozi ọma nke alaeze Chineke.”


LUK 10:15
Ma gị obodo Kapanọm! Ị̀ na-eche na a ga-ebuli gị elu ruo eluigwe? Mba! Ị ga-arịdaru ala mmụọ!”


LUK 10:17
Emesịa, iri mmadụ asaa ahụ Jisọs zipụrụ jiri ọṅụ lọta gwa Jisọs sị, “Onyenwe anyị, ọ bụladị mmụọ ọjọọ rubeere anyị isi mgbe anyị sitere nꞌaha gị nye ha iwu ka ha pụta.”


LUK 10:20
Otu ọ dị, unu aṅụrịla ọṅụ nꞌihi na mmụọ ọjọọ rubere isi mee ihe unu nyere ha nꞌiwu, kama ṅụrịanụ ọṅụ nꞌihi na e deela aha unu nꞌeluigwe.”


LUK 10:21
Mgbe ahụ, Jisọs, onye jupụtara nꞌọṅụ nke Mmụọ Nsọ kwuru okwu sị, “Nna, Onyenwe eluigwe na ụwa, ekelee m gị nꞌihi na i zonarịrị ihe ndị a nꞌebe ndị ọkachamara na ndị ukwu nwere amamihe nọ, ma ị kpughere ihe ndị a nile nye ndị na-amaghị ihe ọ bụla. Ee, Nna, ọ bụ gị siri otu a mee ya, nꞌihi na otu ahụ bụ ụzọ i siri chọọ ya.


LUK 10:27
Nwoke ahụ zara ya sị, “Iwu ahụ sịrị, Ì kwesịrị iji obi gị nile, na mkpụrụ obi gị nile, na ike gị nile, na mmụọ gị nile, hụ Onyenwe anyị bụ Chineke gị nꞌanya. I kwesịkwara ịhụ onye agbata obi gị nꞌanya dị ka ị hụrụ onwe gị.”


LUK 11:13
“Ọ bụrụ na unu ndị ajọ omume pụrụ inye ụmụ unu ezi ihe, unu echeghị na nna unu bi nꞌeluigwe ga-esitekwa otu a were Mmụọ Nsọ ya nye ndị rịọrọ ya?”


LUK 11:14
Otu ụbọchị mgbe Jisọs chụpụrụ mmụọ ọjọọ bi nꞌime otu nwoke dara ogbi, nwoke ahụ bidoro ikwu okwu. Ọrụ a jụrụ mmadụ nile anya.


LUK 11:15
Ma ụfọdụ mmadụ nꞌime ndị nọ ebe ahụ kwuru sị, “Ọ bụ site nꞌike ekwensu, eze ndị mmụọ ọjọọ ka o si achụpụ mmụọ ọjọọ ndị a.”


LUK 11:18
Ya mere, ọ bụrụ na ekwensu na-alụso onwe ya ọgụ site nꞌinye m ike ịchụpụ mmụọ ọjọọ, alaeze ya ọ̀ ga-esi aṅaa guzosie ike?


LUK 11:19
Ọ bụrụ na m sitere nꞌike ekwensu achụpụ mmụọ ọjọọ, ọ̀ bụ site nꞌike onye ka ụmụ unu ji achụpụ ndị ha na-achụpụ? Ya mere, ọ bụ ndị na-eso ụzọ unu ga-ezi unu na okwu unu erijughị afọ.


LUK 11:20
Ma ọ bụrụ na m na-esite nꞌike Chineke nyere m na-achụpụ mmụọ ọjọọ, ọ bụ nke a ga-egosi unu na alaeze Chineke abịarutela nꞌebe unu nọ.


LUK 11:24
“Mgbe ọ bụla mmụọ ọjọọ si nꞌime mmadụ pụọ, mmụọ ọjọọ ahụ na-ejegharị nꞌala akọrọ na-achọgharị ebe ọ ga-ezu ike. Ọ bụrụ na mmụọ ọjọọ ahụ achọtaghị ebe izuike, ọ na-asị nꞌobi ya, ‘Aga m alaghachikwuru nwoke ahụ m si nꞌime ya pụta.’


LUK 11:25
Mgbe mmụọ ọjọọ ahụ lọghachiri, ọ ga-achọpụta na a zachaala obi nwoke ahụ ma ọ tọgbọrọ nꞌefu.


LUK 11:26
Mgbe ahụ mmụọ ọjọọ ahụ na-apụ ga chọta mmụọ ọjọọ asaa ọzọ ndị dị njọ karịa ya. Ha nile ga-abata bịa biri nꞌime nwoke ahụ, mee ka ọnọdụ ya dị njọ karịa ka ọ dị na mbụ.”


LUK 12:5
Ma ka m gwa unu onye unu kwesịrị ịtụ egwu. Tụọnụ egwu Chineke, onye nwere ike igbu mmadụ tụnyekwa ya ala mmụọ.


LUK 12:8
“Ka m gwa unu eziokwu, onye ọ bụla kwuwapụtara nꞌihu ndị mmadụ na ya bụ onye na-eso m, ya ka m ga-ekwukwa okwu banyere nꞌihu ndị mmụọ ozi Chineke na ọ bụ onye dinyeere m.


LUK 12:9
Ọ bụrụkwa na mmadụ ọ bụla agọnarị m nꞌihu ndị mmadụ, mụ onwe m ga-agọnarịkwa ya nꞌihu ndị mmụọ ozi Chineke. Aga m asị, amaghị m onye ọ bụ.


LUK 12:10
Onye ọ bụla kwujọrọ mụ bụ Nwa nke mmadụ ga-enweta mgbaghara, ma onye ọ bụla kwujọrọ Mmụọ Nsọ Chineke agaghị anata mgbaghara.


LUK 12:12
Nꞌihi na ọ bụ Mmụọ Nsọ ga-etinye okwu unu ga-ekwu nꞌọnụ unu mgbe unu guzoro nꞌihu ha.”


LUK 13:11
Nꞌime ụlọ ahụ, o nwere otu nwanyị bịara, nke mmụọ ọjọọ bi nꞌime ya. Mmụọ ọjọọ a emeela ka nwanyị a nọọ nꞌọrịa afọ iri na asatọ. Kemgbe oge ahụ, nwanyị a na-ehu ehu mgbe ọ bụla ọ na-aga ije, o nweghị ike iguzo kwem.


LUK 13:32
Ma Jisọs zara ha sị, “Gaanụ gwa anụ ụrụ ahụ na m kwuru sị, na taa na echi, aga m anọgide na-arụ ọrụ m na-arụ ịchụpụ mmụọ ọjọọ na ịgwọ ndị ọrịa. Gwakwanụ ya na nwanne echi aga m arụcha ọrụ m.


LUK 15:10
Nꞌụzọ dị otu a kwa, ndị mmụọ ozi na-ejere Chineke ozi nꞌeluigwe na-aṅụrị ọṅụ mgbe otu onye mmehie chegharịrị.”


LUK 16:22
Otu ụbọchị Lazarọs nwụrụ. Ndị mmụọ ozi bịara buru ya gaa nꞌebe Eberaham nọ. Nꞌikpeazụ, onye ọgaranya ahụ nwụkwara, e lie ya.


LUK 16:23
Nꞌọkụ ala mmụọ ebe onye ọgaranya ahụ nọ nꞌoke mgbu, ọ hụrụ Eberaham ka ọ nọ nꞌebe dị anya. Ọ hụkwara Lazarọs ka ọ nọ nꞌakụkụ Eberaham.


LUK 20:36
nꞌihi na ha agaghị anwụkwa ọzọ, kama ha ga-adị ka ndị mmụọ ozi. Ha bụ ụmụ Chineke nꞌihi na Chineke emeela ka ha si nꞌọnwụ dị ndụ ọzọ.


LUK 22:43
Nꞌoge ahụ Chineke sitere nꞌeluigwe zite ndị mmụọ ozi bịara gbaa ya ume.


LUK 23:46
Jisọs tiri mkpu nꞌoke olu sị, “Nna, ọ bụ nꞌaka gị ka m na-etinye mmụọ m.” Mgbe o kwusịrị okwu a, o kubiri ume.


LUK 24:23
lọta kọọrọ anyị na ha ahụghị ozu ya. Ha gwakwara anyị na ha hụrụ ndị mmụọ ozi ndị gwara ha na Jisọs dị ndụ!


LUK 24:37
Mgbe ha hụrụ ya, ụjọ dị ukwuu tụrụ ha, nꞌihi na ha chere na ọ bụ mmụọ ka ha hụrụ.


LUK 24:39
Leenụ anya nꞌaka m! Leekwanụ anya nꞌụkwụ m! Ọ bụ mụ onwe m ka unu na-ahụ. Metụnụ m aka chọpụtanụ ihe m bụ nꞌonwe unu, nꞌihi na mmụọ adịghị enwe anụ ahụ dị ka m nwere.”


LUK 24:49
“Ma nọdụnụ nꞌobodo Jerusalem a tutuu Mmụọ Nsọ abịa mejupụta unu nꞌike. Nꞌihi na aga m ezite ya ka ọ bịakwasị unu dị ka Nna m kwere nkwa ime.”


JỌN 1:32
Nke a bụ ama Jọn gbara: “Ahụrụ m ka eluigwe meghere, hụkwa Mmụọ Nsọ ka ọ rịdatara dị ka nduru bekwasị nwoke a nꞌisi.


JỌN 1:33
“Ma amaghị m onye nwoke a bụ. Kama Chineke, onye zitere m ime ndị mmadụ baptizim ebe a, gwara m sị, ‘Onye ahụ Mmụọ Nsọ ga-ebekwasị nꞌisi, bụ onye ahụ unu na-ele anya ya. Ọ bụkwa onye ndị mmadụ ga-esite nꞌaka ya nata Mmụọ Nsọ.’


JỌN 1:51
Ị ga-ahụ ka eluigwe meghere, hụkwa ndị mmụọ ozi Chineke ka ha na-arigo naarịdatakwa ịbịakwute m bụ Onye nzọpụta.”


JỌN 3:5
Ma Jisọs sịrị ya, “Lee anya ka m gwa gị, ọ bụrụ na amụghị mmadụ site na mmiri na Mmụọ Nsọ, onye ahụ enweghị ike ịba nꞌalaeze Chineke.


JỌN 3:6
Dị ka mmadụ nwere ike mụọ mmadụ ibe ya, otu a kwa, ọ bụ nanị Mmụọ Nsọ pụrụ ịmụ mmadụ nꞌime Mmụọ Nsọ.


JỌN 3:8
Dị ka ifufe si efegharị nꞌebe ọ bụla ọ chọrọ, ị na-anụkwa ka ọ na-eme mkpọtụ, ma ị mataghị ebe o si bịa ma ọ bụ ebe ọ na-aga, nꞌụzọ dị otu a, i nweghị ike ịmata otu Mmụọ Nsọ si amụ mmadụ ọzọ.”


JỌN 3:34
Nꞌihi na onye ọ bụla Chineke zitere na-ekwu okwu nke Chineke. Nꞌihi na onye ahụ naejupụta na Mmụọ nsọ Chineke.


JỌN 4:22
Ihe dị mkpa abụghị ebe anyị nọ kpọọ isi ala nye Chineke. Kama ọ bụ otu anyị siri kpọọ isi ala. Anyị na-esite nꞌime obi anyị kpọọ isi ala? Anyị na-akpọ isi ala site nꞌinyeaka nke Mmụọ Nsọ? Chineke bụ mmụọ. Anyị apụkwaghị ịkpọ isi ala nye ya nꞌụzọ ziri ezi ma ọ bụghị site nꞌinyeaka ya. Nke a bụ ụdị ịkpọ isi ala Chineke chọrọ site nꞌaka anyị. Unu bụ ndị Sameria maara ntakịrị banyere nke a. Unu na-akpọ isi ala nꞌisi. Anyị ndị Juu maara ihe nile banyere ya nꞌihi na nzọpụta rutere ụwa site nꞌaka ndị Juu!”


JỌN 5:4
Nꞌihi na mmụọ ozi Onyenwe anyị na-abịa na mmiri ahụ gbarụọ ya. Mgbe mmiri a gbarụrụ, onye ọrịa ọ bụla buru ụzọ baa nꞌime ya ka a na-eme ka ahụ dị mma.


JỌN 6:63
Ọ bụ nanị Mmụọ Nsọ na-enye ndụ, ike mmadụ abaghị uru ọ bụla. Okwu ndị a nile m gwara unu bụ Mmụọ na ndụ.


JỌN 7:39
(Jisọs na-ekwu okwu banyere Mmụọ Nsọ nke ndị kweere na ya ga-anata. Nꞌoge ahụ Mmụọ Nsọ abịabeghị nꞌihi na Jisọs alaghachibeghị nꞌebube ya nꞌeluigwe).


JỌN 8:48
Ndị isi ndị Juu sịrị ya, “Nke a bụ nnọọ ihe anyị kwuru na ị bụ onye obodo ọzọ. Ọ pụtara ìhè ugbu a na mmụọ ọjọọ bi nꞌime gị na-achịkwa gị.”


JỌN 8:49
Jisọs zara sị ha, “Mmụọ ọjọọ ọ bụla adịghị nꞌime m, kama unu amaghị onye m bụ. Ọ bụ Nna m ka m na-enye otuto.


JỌN 10:20
Ọtụtụ nꞌime ọgbakọ ahụ sịrị, “Mmụọ ọjọọ na-achị achị nꞌobi ya. Ọ bụ onye isi mebiri. Ọ baghị uru ige ya ntị?”


JỌN 10:21
Ma ndị ọzọ kwuru sị, “Ọ dịghị ekwu okwu dị ka onye mmụọ ọjọọ na-achị. Mmụọ ọjọọ enweghị ike ime ka anya onye kpuru ìsì meghee.”


JỌN 12:29
Igwe ndị mmadụ guzo nꞌebe ahụ, ndị nụrụ olu ahụ kwuru sị, “Ọ bụ egbe eluigwe.” Ụfọdụ sịrị, “Ọ bụ mmụọ ozi na-agwa ya okwu.”


JỌN 13:21
Mgbe Jisọs kwusịrị okwu a, o nweghị udo nꞌime mmụọ ya. Ọ gwara ha sị, “Nꞌezie, otu onye nꞌime unu ga-arara m nye.”


JỌN 14:16
Aga m arịọ Nna m ka o zitere unu Onye nkasịobi, onye ga-anọnyere unu ruo mgbe ebighị ebi. Onye a ga-abụ Mmụọ nke eziokwu.


JỌN 14:26
Ma Onye nkasịobị ahụ bụ Mmụọ Nsọ, onye Nna m ga-ezite nꞌaha m, ga-ezi unu ihe nile. Ọ gaechetara unu ihe nile m gwara unu.


JỌN 15:26
“Ma Onye ndụmọdụ ahụ ga-abịa, Onye ahụ bụ Mmụọ eziokwu ahụ, Onye ga-esite nꞌebe Nna m nọ bịa. Mgbe ọ bịara, ọ ga-akọwara unu ihe nile banyere m.


JỌN 16:13
Ma Mmụọ nke eziokwu ahụ na-abịa. Mgbe ọ bịara, ọ ga-eduba unu nꞌeziokwu nile. Ọ gaghị ekwu ihe banyere onwe ya. Kama ọ bụ ihe nile ọ nụrụ nꞌọnụ m ka ọ ga-ekwu. Ọ ga-ezikwa unu ihe nile nke na-aghaghị ime.


JỌN 17:12
Mgbe mụ na ha nọ nꞌụwa echebere m ha site nꞌaha gị nke i nyere m. O nwekwaghị onye ọ bụla nꞌime ha lara nꞌiyi, karịakwa onye ahụ bụ nwa ọkụ ala mmụọ, dị ka akwụkwọ nsọ siri gbaa ama banyere ya.


JỌN 20:12
Ọ hụrụ ndị mmụọ ozi abụọ yi uwe ọcha. Otu nọdụrụ ala nꞌebe ụkwụ Jisọs dị mgbe ọ tọgbọ nꞌili ahụ. Nke ọzọ nọdụkwara ebe isi ya dị.


JỌN 20:13
Ndị mmụọ ozi ahụ jụrụ Meri ajụjụ sị ya, “Gịnị mere i ji akwa akwa?” Meri zara ha sị, “Ọ bụ nꞌihi na ha ebupụla Onyenwe m, amaghị m ebe ha bujere ya.”


JỌN 20:22
Mgbe ahụ o kusara ha ume sị ha, “Natanụ Mmụọ Nsọ.


ỌLU OZI 1:2
Agwakwara m gị otu o siri laghachi nꞌeluigwe mgbe o nyesịrị ndị na-eso ụzọ ya ndụmọdụ site nꞌike Mmụọ Nsọ. Ndị ahụ bụ ndị na-eso ụzọ ya ọ họpụtara.


ỌLU OZI 1:5
Jisọs gwakwara ha sị, “Ọ bụ ezie na Jọn ji mmiri mee unu baptizim, ma tupuu abali ole na ole agafee, a ga-eji Mmụọ Nsọ mee unu baptizim.”


ỌLU OZI 1:8
Ma mgbe Mmụọ Nsọ bịakwasịrị unu, unu ga-anata ike. Mgbe ahụ unu ga-agwa ndị mmadụ nọ na Jerusalem, na Judia, na Sameria, na mmadụ nile nọ na nsọtụ ụwa nile, ihe banyere m.”


ỌLU OZI 1:16
“Ụmụnna m, ọ dị mkpa ka ihe e dere nꞌakwụkwọ nsọ mezuo banyere Judas onye duuru ndị jidere Jisọs bịa. Mmụọ Nsọ kwuru na nke a ga-eme mgbe o sitere nꞌọnụ Devidi kwuo okwu nꞌoge gara aga.


ỌLU OZI 2:4
E mekwara ka ha jupụta na Mmụọ Nsọ, malite ịsụ asụsụ dị iche iche. Onye ọ bụla sụrụ asụsụ ọ bụla Mmụọ Nsọ nyere ya ike ịsụ.


ỌLU OZI 2:17
Nꞌihi na Joel buru amụma sị, ‘Nꞌoge ikpeazụ, nke a bụ ihe na-aghaghị ime, dị ka Onyenwe anyị kwuru. Aga m awụkwasị mmadụ nile Mmụọ m. Nꞌoge ahụ ụmụ unu ndị ikom na ụmụ unu ndị inyom ga-ebu amụma. Ndị okorọbịa unu ga-ahụ ọhụ. Ndị okenye nꞌetiti unu ga-arọkwa nrọ.


ỌLU OZI 2:18
Ndị bụ ohu nꞌetiti unu, nwoke ha na nwanyị nꞌime ha, ka m ga-awụkwasị Mmụọ m. Ha ga-ebukwa amụma.


ỌLU OZI 2:27
Ị gaghị ahapụ mkpụrụ obi m nꞌala mmụọ. Ị gakwaghị ahapụ anụ ahụ nke onye gị dị nsọ ka o ree ure.


ỌLU OZI 2:31
Ya mere Chineke jiri mee ka Devidi mata ihe ga-eme nꞌoge dị nꞌihu. Devidi hụrụ, kwuokwa okwu banyere mbilite nꞌọnwụ nke Kraịst. Ọ hụrụ na a hapụghị mkpụrụ obi Kraịst nꞌala mmụọ. Ọ hụkwara na anụ ahụ ya erekwaghị ure.


ỌLU OZI 2:33
“Ugbu a, e buliela Jisọs elu. Ọ nọdụrụ nꞌakụkụ Chineke nꞌocheeze ya nꞌeluigwe. Ọ natala nkwa nke Mmụọ Nsọ, site nꞌaka Chineke. Ugbu a ọ na-awụsịkwa ike Mmụọ Nsọ ahụ. Unu onwe unu bụkwa ndị akaebe na nke a bụ eziokwu.


ỌLU OZI 2:38
Ma Pita sịrị ha, “Chegharịanụ! Sitekwanụ na mmehie unu tụgharịa bịakwute Chineke! Ka e mee unu baptizim baa nꞌaha Jisọs, nꞌihi mgbaghara mmehie unu. Unu mee nke a, unu ga-anata onyinye a, bụ Mmụọ Nsọ.


ỌLU OZI 3:20
Onyenwe anyị ga-emekwa ka agbamume nke ime mmụọ rute unu aka. Ọ ga-ezitekwara unu Jisọs Onye nzọpụta ahụ unu na-ele anya ya.


ỌLU OZI 4:8
Nꞌoge ahụ, Pita jupụtara na Mmụọ Nsọ. Ọ gwara ha sị, “Unu ndị na-achị achị, na ndị okenye ala anyị.


ỌLU OZI 4:25
Ọ bụ gị mere ka Mmụọ Nsọ kwuo okwu site nꞌọnụ Devidi sị, ‘Gịnị mere mba nile ji na-agbọ ụfụfụ? Gịnị mere ha ji ezube nzube nzuzu imegide gị, Chineke?


ỌLU OZI 4:31
Mgbe ha kpesịrị ekpere, ụlọ ahụ ha zukọrọ nꞌime ya mara jijiji. Ha nile jupụtakwara na Mmụọ Nsọ. Ha gakwara nꞌihu ikwusa ozi ọma Chineke na-atụghị ụjọ.


ỌLU OZI 5:3
Ma Pita maara ihe Ananayas mere. Ọ sịrị ya, “Gịnị mere i ji kwenye ka ekwensu na-achị nꞌobi gị ime ka ị ghọgbuo Mmụọ Nsọ? Gịnị mere ekwensu ji mee ka i kwere izo ụfọdụ nꞌime ego i retara?


ỌLU OZI 5:9
Pita sịrị ya, “Gịnị mere gị na di gị ji gbakọọ izu ịkpasu Mmụọ Nsọ iwe? Gee ntị! Nzọ ụkwụ ị na-anụ bụ nzọ ụkwụ ụmụ okorọbịa liri di gị. Ha ga-ebupụkwa gị!”


ỌLU OZI 5:16
Igwe mmadụ zukọrọ site nꞌobodo dị Jerusalem gburugburu. Ha butekwara ndị na-arịa ọrịa, na ndị mmụọ ọjọọ na-enye nsogbu. Ndị ozi mekwara ka ahụ dị ha mma.


ỌLU OZI 5:19
Ma nꞌabalị ahụ, Onyenwe anyị zitere mmụọ ozi ya. Mmụọ ozi ahụ meghere ụzọ ụlọ mkpọrọ ahụ, dupụta ndị ozi ahụ, gwa ha okwu sị,


ỌLU OZI 5:21
Ndị ozi ahụ pụrụ dị ka mmụọ ozi gwara ha. Nꞌisi ụtụtụ ha banyere nꞌụlọ nso ukwu Chineke bido izi ihe. Mgbe e mesịrị, onyeisi nchụaja na ndị enyi ya, batara nꞌụlọ nzukọ ha. Onyeisi nchụaja kpọrọ nzukọ ndị na-achị achị. Ndị bịara nzukọ a bụ ndị okenye ndị Juu, ndị na-anọchite anya ụmụ Izirel nile. Mgbe ha zukọrọ, onyeisi nchụaja ziri ndị uwe ojii ka ha gaa kpụta ndị ozi site nꞌụlọ mkpọrọ.


ỌLU OZI 5:32
Anyị na-agbakwa ama na ihe ndị a bụ eziokwu. Otu a kwa, Mmụọ Nsọ, onye Chineke nyere ndị na-erubere ya isi, na-agbakwa ama.”


ỌLU OZI 6:3
Nꞌihi nke a ụmụnna anyị, sitenụ nꞌetiti unu họpụta ụmụ nwoke asaa unu tụkwasịrị obi nke ọma. Ha ga-abụ ndị jupụtara na Mmụọ Nsọ, bụrụkwa ndị maara ihe. Anyị ga-enyefe ha ọrụ a nꞌaka.


ỌLU OZI 6:5
Mmadụ nile nabatara atụmatụ a nke ọma. Ha họpụtara Stivin, nwoke tozuru oke nꞌokwukwe, bụrụkwa onye jupụtara na Mmụọ Nsọ. Ha họpụtakwara Filip, na Prokorọs, na Nikanọ, na Timọn, na Pamenas, na Nikolas, onye Antiọk. Na mbụ Nikolas bụrị onye Griik na-efe Chineke nꞌụzọ ndị Juu si efe ya.


ỌLU OZI 6:10
Ma Stivin maara ihe nke ukwuu, bụrụkwa onye jupụtara na Mmụọ Nsọ. Ya mere, ndị Juu a enweghị ike imegide ya.


ỌLU OZI 6:15
Ndị nile nọ nꞌụlọ ikpe ahụ legidere Stivin anya. Ha hụrụ ihu ya ka ọ na-enwụ dị ka ihu mmụọ ozi.


ỌLU OZI 7:30
“Mgbe iri afọ anọ ọzọ gafere, mmụọ ozi Onyenwe anyị gosiri Mosisi onwe ya nꞌọzara dị ugwu Saịnaị gburugburu. Mmụọ ozi a bịakwutere Mosisi nꞌime ire ọkụ na-ere nꞌotu osisi.


ỌLU OZI 7:35
Mosisi a m na-ekwu ihe banyere ya bụ otu Mosisi ahụ ụmụnna ya jụrụ nꞌala Ijipti. Ee, ọ bụ otu Mosisi ahụ ha jụrụ ajụjụ sị, ‘Ònye mere gị onyeisi na onye ikpe nꞌebe anyị nọ?’ Ọ bụkwa Mosisi a ka Chineke zigara ịzọpụta na ịchị ndị ya. Chineke nyekwara Mosisi ike ime nke a site nꞌọnụ mmụọ ozi ahụ gwara ya okwu nꞌime ọkụ ahụ na-enwụ nꞌosisi ahụ dị nꞌọzara.


ỌLU OZI 7:38
Ọ bụkwa otu Mosisi a bụ onye kwuchitere ọnụ nna nna anyị ha nꞌihu mmụọ ozi ahụ, nꞌugwu Saịnaị, mgbe mmụọ ozi ahụ nyere ha iwu Chineke.


ỌLU OZI 7:51
“Unu ndị isi ike! Lee ka obi unu si sie ike dị ka nkume. Lee ka ntị unu si kpọchie ịnụkwa eziokwu! Ruo ole mgbe ka unu ga-anọgide na-enupụ isi megide Mmụọ Nsọ? Nna nna unu nupụrụ isi megide ya! Unu onwe unu na-emekwa otu ihe ahụ taa!


ỌLU OZI 7:53
Karịsịa, ọ dịbeghị oge unu ji rube isi nꞌiwu Chineke, iwu ahụ mmụọ ozi ya wetaara unu!”


ỌLU OZI 7:54
Mgbe ndị isi Juu nụrụ ihe ndị a, o wutere mmụọ ha. Ha tara ikikere eze nꞌiwe na nꞌọnụ ma.


ỌLU OZI 7:55
Ma Stivin, nꞌihi na o jupụtara na Mmụọ Nsọ, lere anya nꞌeluigwe hụ ebube Chineke. Ọ hụkwara Jisọs ka o guzoro nꞌaka nri Chineke.


ỌLU OZI 7:59
Mgbe ha na-atụ Stivin nkume ahụ, o kpere ekpere sị, “Onyenwe anyị Jisọs, nara mmụọ m.”


ỌLU OZI 8:7
Nꞌihi na site nꞌọrụ ebube ndị a, mmụọ ọjọọ pụrụ site na ndụ ndị ụfọdụ. Mmụọ ọjọọ a pụtara na-eti mkpu. Ọtụtụ ndị ahụ ha kpọnwụrụ akpọnwụ ka Filip gwọkwara. Ụfọdụ ndị ngwụrọ ka ọ gwọkwara.


ỌLU OZI 8:15
Mgbe ha bịaruru, ha bidoro ikpe ekpere ka ndị a kwere ekwe nata Mmụọ Nsọ.


ỌLU OZI 8:16
Nꞌihi na tutuu ruo ugbu a, ha anatabeghị Mmụọ Nsọ. Ọ bụ nanị baptizim ka e mere ha baa nꞌaha Onyenwe anyị Jisọs.


ỌLU OZI 8:17
Mgbe Pita na Jọn bikwasịrị ndị a kwere ekwe aka nꞌisi, ha natara Mmụọ Nsọ.


ỌLU OZI 8:18
Mgbe Saimọn hụrụ na ndị a natara Mmụọ Nsọ nanị site nꞌaka ndị ozi bikwasịrị ha nꞌisi, o chere ha ego nꞌihu, rịọ ha sị,


ỌLU OZI 8:19
“Werenụ ego a, nyekwanụ m ike a. Ka onye ọ bụla m bikwasịrị aka nꞌisi nata Mmụọ Nsọ.”


ỌLU OZI 8:26
Mgbe ahụ mmụọ ozi Onyenwe anyị gwara Filip okwu sị, “Bilie, gaa nꞌụzọ ahụ sitere Jerusalem na-aga Gaza, ya bụ, ụzọ ọzara.”


ỌLU OZI 8:29
Mmụọ Nsọ gwara Filip okwu sị, “Gaa nso, nọọkwa ụgbọ ahụ nso.”


ỌLU OZI 9:17
Ananayas gara hụ Sọl dị ka Chineke nyere ya iwu. Ọ chọtakwara Sọl, bikwasị ya aka, gwa ya okwu sị ya, “Nwanna m Sọl, Onyenwe anyị Jisọs onye gosiri gị onwe ya nꞌụzọ, zitere m ka ị hụkwa ụzọ ọzọ, ma jupụtakwa na Mmụọ Nsọ.”


ỌLU OZI 9:31
Nꞌihi na Sọl ghọrọ onye kwere ekwe mere ka a kwụsị ịkpagbu ndị kwere ekwe. Nzukọ Kraịst nile, ndị dị na Judia, Galili na Sameria, nọọrọ nꞌudo, guzosiekwa ike nꞌokwukwe ha. Ndị kwere ekwe biri ndụ ịsọpụrụ Chineke site nꞌinyeaka nke Mmụọ Nsọ. Ha gakwara nꞌihu na-amụba.


ỌLU OZI 10:3
Otụ ụbọchị, nꞌihe dị ka elekere atọ nke ehihie, ọ hụrụ ọhụ. Nꞌime ọhụ ahụ, ọ hụrụ mmụọ ozi Chineke ka ọ bịakwutere ya, kpọọ ya sị, “Kọniliọs!”


ỌLU OZI 10:4
Ụjọ tụrụ Kọniliọs. O legidere mmụọ ozi ahụ anya jụọ ya sị, “Onyenwe anyị, ọ̀ bụ gịnị ka ị na-achọ?” Mmụọ ozi ahụ zara sị, “Chineke anụla ekpere gị. Ọ hụkwala, ma cheta ọrụ ọma gị nile.


ỌLU OZI 10:7
Mgbe mmụọ ozi ahụ lara, Kọniliọs kpọrọ mmadụ abụọ nꞌime ndị na-ejere ya ozi nꞌụlọ ya. Ọ kpọkwara otu nꞌime ndị agha na-eche ya nche. Onye agha a bụkwa onye na-atụ egwu Chineke.


ỌLU OZI 10:8
Kọniliọs kọọrọ ha ihe nile mmụọ ozi ahụ kwuru. Emesịa o zigara ha Jopa.


ỌLU OZI 10:19
Ma Pita nọ rị na-atụgharị uche nꞌihe ọhụ ahụ ọ hụrụ ga-abụ. Nꞌoge a, Mmụọ Nsọ gwara Pita okwu sị, “Lee, mmadụ atọ guzo nꞌọnụ ụzọ ugbu a. Ha chọkwara ịhụ gị.


ỌLU OZI 10:22
Ha zara sị ya, “Ọ bụ Kọniliọs onyeisi agha anyị zitere anyị. Nwoke a bụ ezi mmadụ, bụrụkwa onye na-atụ egwu Chineke. Ọ bụkwa onye ndị Juu nile na-asọpụrụ. Otu ụbọchị, mmụọ ozi bịakwutere ya, gwa ya ka o zie ozi kpọọ Pita ka ọ bịakwute ya. Na Pita bụ onye ga-eme ka Kọniliọs mata ihe nile Chineke chọrọ ka o mee.”


ỌLU OZI 10:38
Ana m echekwa na unu nile maara ihe banyere Jisọs onye Nazaret, Onye Chineke mejupụtara nꞌike Mmụọ Nsọ. O jegharịrị nꞌebe nile dị iche iche na-arụ ọrụ ebere, chụpụkwa mmụọ ọjọọ, nꞌihi na Chineke nọnyeere ya.


ỌLU OZI 10:44
Mgbe Saimọn Pita nọ na-ekwu okwu ndị a, Mmụọ Nsọ bịakwasịrị ndị nile na-ege ntị nꞌokwu ya.


ỌLU OZI 10:45
Nke a juru ndị Juu ahụ sooro Pita bịa anya. Ọ gbakwara ha gharịị nke ukwuu otu Chineke si mee ka ndị mba ọzọ nata onyinye Mmụọ Nsọ ahụ.


ỌLU OZI 10:47
“Gịnị ọzọ dị nke ga-egbochi anyị ime ndị a baptizim? Ugbu a ha anatala Mmụọ Nsọ dị ka anyị onwe anyị bụ ndị Juu kwere ekwe si nata ya.”


ỌLU OZI 11:12
Mmụọ Nsọ gwara m okwu sị, ‘Soro ha gaa!’ Ma o mekwara ka m mata nke ọma na o kwesịghị ka o wute m na ha bụ ndị mba ọzọ. Mgbe na-adịghị anya, mụ onwe m na ụmụnna isii ndị a, ndị so m gaa Sizarịa, bịarutere nso nꞌụlọ Kọniliọs onye zipụrụ ndị ozi ahụ.


ỌLU OZI 11:13
Kọniliọs mere ka anyị mata otu mmụọ ozi siri bịakwute ya gwa ya ka o ziga ndị ozi ya ka ha gaa Jopa. Na ha ga-ahụkwa otu nwoke a na-akpọ Saimọn Pita.


ỌLU OZI 11:14
Mmụọ ozi ahụ gwakwara ya sị, ‘Pita ga-akọwara gị ihe nile banyere nzọpụta nke gị na nke ndị ezinụlọ gị nile.’


ỌLU OZI 11:15
“Nꞌihi ihe ndị a nile, mụ onwe m gwara ha ozi ọma Chineke. Mgbe m nọ na-ekwu okwu ahụ, Mmụọ Nsọ bịakwasịrị ha dị ka o siri bịakwasị anyị na mbụ.


ỌLU OZI 11:16
Mgbe ahụ echetara m okwu ahụ Onyenwe anyị kwuru sị, ‘Nꞌezie Jọn ga-eji mmiri mee unu baptizim, ma mụ onwe m ga-eji Mmụọ Nsọ mee unu baptizim.’


ỌLU OZI 11:17
Ebe anyị matara na Chineke nꞌonwe ya emeela ka ndị mba ọzọ nata onyinye Mmụọ Nsọ dị ka anyị si nata ya mgbe anyị kweere nꞌOnyenwe anyị Jisọs Kraịst, onye ka m bụ ịrụsị Chineke ụka?”


ỌLU OZI 11:18
Mgbe mmadụ nile nụrụ nkọwa dị otu a, ha mechiri ọnụ ha nye Chineke otuto sị, “Nꞌezie, Chineke enyela ndị mba ọzọ kweere nꞌOnyenwe anyị Jisọs Kraịst onyinye Mmụọ Nsọ.”


ỌLU OZI 11:24
Banabas bụ nwoke jupụtara nꞌọrụ ebere na nꞌike Mmụọ Nsọ. O nwekwara okwukwe dị ebube, nꞌihi ya ọtụtụ mmadụ chegharịkwara bịakwute Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.


ỌLU OZI 11:28
Otu nwoke nꞌime ha a na-akpọ Agabus biliri ọtọ nꞌetiti nzukọ ahụ buo amụma site nꞌike Mmụọ Nsọ banyere oke ụnwụ ahụ ga-abịakwasị ụwa nile. Amụma a mezukwara nꞌoge Kladiọs chịrị dị ka eze ndị Rom nile.


ỌLU OZI 12:7
Na mberede, ìhè dị ukwuu nwụrụ nꞌime ụlọ mkpọrọ ahụ. Mmụọ ozi batara guzo nꞌakụkụ Pita metụ ya aka. Pita tetara nꞌụra. Ọ nụrụ ka mmụọ ozi ahụ sịrị ya, “Pita! Bilie ngwangwa!” Nꞌotu oge ahụ, eriri igwe ahụ dapụrụ nꞌala.


ỌLU OZI 12:8
Mmụọ ozi ahụ gwara Pita okwu sị, “Kee ihe okike nꞌukwu gi, yirikwa akpụkpọ ụkwụ gị.” Pita mere otu ahụ. Mmụọ ozi ahụ sịkwa ya, “Yirikwa uwe ukwu gi, sokwa m nꞌazu.”


ỌLU OZI 12:9
Pita sooro mmụọ ozi ahụ nꞌazụ site nꞌụlọ mkpọrọ ahụ pụta. Ma Pita chere na ihe ndị a na-eme na nrọ, ma ọ bụ na ọ bụ ọhụ ka ọ na-ahụ. O kwenyeghị na ihe ndị a nile pụrụ imezu. O jukwara ya anya nke ukwuu.


ỌLU OZI 12:10
Ha pụtara site nꞌime ụlọ mkpọrọ ahụ. Ọ dịghị anya, ha bịaruru nꞌogige e ji igwe wuo. Ụzọ dị nꞌebe ahụ meghekwara nꞌonwe ya. Mmụọ ozi ahụ jidekwara Pita nꞌaka tutuu ruo mgbe ha gafesịrị ọnụ ụzọ nile nke ụlọ mkpọrọ ahụ. Mgbe ha pụtara nꞌezi, mmụọ ozi ahụ hapụrụ Pita aka. Pita ahụkwaghị ya anya ọzọ.


ỌLU OZI 12:11
Mgbe ahụ kwa ka Pita ghọtara ihe nile mere. O kwuru sị, “Nꞌezie, Onyenwe anyị ezitela mmụọ ozi ya ka ọ bịa napụta m site nꞌaka eze Herọd. Ugbu a ọ napụtakwala m site nꞌọchịchọ ọjọọ nile nke ndị Juu.”


ỌLU OZI 12:15
Ma ọ dịghị onye ọ bụla kwenyere nꞌihe o kwuru. Kama ha sịrị ya na ọ na-ekwu okwu dị ka onye anya na-adịghị mma. Mgbe Roda nọgidesịrị ike kwuo na ọ bụ Pita, ha zara sị ya, “Eleghị anya ọ ga-abụ mmụọ ozi Pita ka ị hụrụ, nꞌihi na ndị Juu egbuola ya.”


ỌLU OZI 12:17
Ma Pita feere ha aka ka ha jiri nwayọọ kwuo okwu. Ọ kọọrọ ha ihe nile Onyenwe anyị mere site nꞌaka mmụọ ozi ya. Nꞌikpeazụ, Pita gwara ha sị, “Meenụ ka Jemes na ụmụnna anyị nile mata ihe ndị a.” Ọ hapụrụ ha gaa nꞌebe ọzọ.


ỌLU OZI 12:23
Nꞌotu oge ahụ, mmụọ ozi Onyenwe anyị tiri Herọd ihe otiti dị egwu. Ikpuru jupụtakwara ya nꞌahụ, nke mere ka ọ nwụọ. Ma ihe ndị a nile dakwasịrị ya nꞌihi na Herọd naara ofufe ahụ e kwesịrị inye nanị Chineke, dị ka a ga-asị na ọ bụ Chineke nꞌonwe ya. O nyekwaghị Chineke otuto ma ọlị.


ỌLU OZI 13:2
Otu mgbe, ndị a zukọrọ ibu ọnụ na ikpe ekpere. Mmụọ Nsọ gwara ha okwu sị, “Kewapụnụ Banabas na Sọl ka ha nọdụ iche. Nꞌihi na enwere m ọrụ dị ukwuu ha ga-arụ nꞌaha m.”


ỌLU OZI 13:4
Mmụọ Nsọ duuru ha gaa obodo Selusia. Emesịa, ha sitere nꞌebe ahụ jeruo Saiprọs.


ỌLU OZI 13:7
Bajisọs bụkwa enyi ọchịagha obodo ahụ, onye a na-akpọ Sajiọs Pọlọs. Ha abụọ na-anọkọ oge nile. Ọchịagha ahụ nwere amamihe na mmụọ nke ịṅomi ihe. O ziri ozi ka a kpọọ Banabas na Sọl, nꞌihi na ọ chọrọ ịnụ okwu Chineke site nꞌọnụ ha.


ỌLU OZI 13:9
Ma Sọl, ebe o jupụtara nꞌike Mmụọ Nsọ, legidere onye mgbaasị ahụ anya nꞌoke iwe,


ỌLU OZI 13:52
Ndị kwere ekwe nile jupụtakwara nꞌọṅụ nꞌebe ahụ. Ha jupụtakwara nꞌike Mmụọ Nsọ.


ỌLU OZI 14:1
Nꞌobodo Aikoniọm, Pọl na Banabas banyekwara nꞌụlọ nzukọ ndị Juu, kwuo okwu Onyenwe anyị site nꞌike Mmụọ Nsọ. Ọtụtụ ndị Juu na ndị mba ọzọ chegharịkwara.


ỌLU OZI 15:8
Chineke a, onye maara obi mmadụ nile, anabatala ndị mba ọzọ. O gosiri na ọ nabatala ha site nꞌinye ha onyinye Mmụọ Nsọ dị ka anyị si nata ya na mbụ.


ỌLU OZI 15:28
“Nꞌihi na ọ bụ ihe ziri ezi nꞌanya Mmụọ Nsọ, na nꞌanya anyị kwa, na o kwesịghị ka anyị bokwasị unu ibu arọ banyere omenala ndị Juu.


ỌLU OZI 16:6
Mgbe ha si nꞌebe ahụ pụọ, ha gara nꞌobodo Frigia na Galetia. Ma Mmụọ Nsọ ekweghị ka ha kwusaa ozi ọma nꞌakụkụ Esia nꞌoge ahụ.


ỌLU OZI 16:7
Mgbe ha ruru nꞌakụkụ obodo Misia, ha chere ihu ịbanye nꞌakụkụ obodo Bitinia. Ma Mmụọ Nsọ Onyenwe anyị akwagideghị ka ha gaa.


ỌLU OZI 16:16
Otu ụbọchị, mgbe anyị na-aga ikpe ekpere nꞌakụkụ ọnụ mmiri, anyị zutere otu nwagbọghọ onye mmụọ ọjọọ bi nꞌime ya. Ọ bụkwa ohu, na onye na-agba aja. Site nꞌụzọ dị otu a ọ na-ewetara ndị nwe ya ego dị ukwuu.


ỌLU OZI 16:18
Nwagbọghọ ahụ mere nke a ọtụtụ ụbọchị. Ma site nꞌoke iwe, Pọl baara mmụọ ọjọọ ahụ bi nꞌime ya mba sị, “Eji m aha Jisọs Kraịst na-enye gị iwu sị gị site nꞌime nwagbọghọ a pụta!” Otu mgbe ahụ mmụọ ọjọọ ahụ si nꞌime ya pụta.


ỌLU OZI 17:22
Nꞌihi nke a Pọl guzoro nꞌelu ugwu ahụ gwa ha okwu sị, “Unu ndị nile bi nꞌAtens. Amatara m na ọ na-anụ unu ọkụ nꞌobi ịsọpụrụ mmụọ nke unu na-efe ofufe.


ỌLU OZI 19:2
Ọ jụrụ ndị a ajụjụ sị ha, “Unu natakwara Mmụọ Nsọ mgbe unu kweere?” Ha zara sị ya, “Ọ dịghị! Anyị aghọtaghị ihe ị na-ekwu. Gịnị bụ Mmụọ Nsọ?”


ỌLU OZI 19:6
Mgbe Pọl bikwasịrị ha aka ya abụọ nꞌisi, ha natara Mmụọ Nsọ. Ha kwukwara okwu nꞌasụsụ dị iche iche, buokwa amụma.


ỌLU OZI 19:12
Ihe ịrịba ama o mere dị ukwuu. Nke ka nke, a na-ewere ụfọdụ nꞌime akịsị ma ọ bụ ịchafo ọ na-eji ehicha ihu na-atụkwasị nꞌahụ ndị ọrịa, ka ahụ dịkwa ha ike. E sitekwara na ya chụpụ mmụọ ọjọọ.


ỌLU OZI 19:13
Ụfọdụ ndị Juu dịkwa ndị na-ejegharị nꞌobodo dị iche iche na-achụpụ mmụọ ọjọọ nꞌime mmadụ. Ha chọkwara ime nke a nꞌaha Jisọs. Ihe ha na-agwa mmụọ ọjọọ bụ nke a, “E ji m aha Jisọs onye Pọl na-ekwusa nye gị iwu ka i site nꞌime ya pụta.”


ỌLU OZI 19:15
Mgbe ha mere ihe dị otu a nꞌebe otu nwoke mmụọ ọjọọ bi nꞌime ya, mmụọ ọjọọ ahụ sịrị ha, “Amaara m Onye Jisọs bụ. Amakwaara m Pọl, ma onye ka unu bụ?”


ỌLU OZI 19:16
Nwoke ahụ mmụọ ọjọọ na-achị jidere mmadụ abụọ nꞌime ha tie ha ihe nke ukwuu, mee ka ha gbaa ọsọ. Ha gbaara ọtọ gbapụ nꞌụlọ ahụ. Ha merụkwara ahụ nke ukwuu nꞌakụkụ ahụ ha nile.


ỌLU OZI 19:21
Mgbe ihe ndị a gasịrị, Mmụọ Nsọ kwagidere Pọl ka o jeruo Griis tupu ọ bịaruo Jerusalem. Pọl kpebiri na ọ ghaghị ijeru Rom, nꞌọgwụgwu ije ya nile.


ỌLU OZI 20:22
“Ma otu ọ dị, ana m aga Jerusalem dị ka iwu Mmụọ Nsọ nyere m si dị, ma amaghị m ihe ọnọdụ m ga-abụ nꞌebe ahụ.


ỌLU OZI 20:23
Karịakwa na Mmụọ Nsọ na-ekpughere m nꞌebe ọ bụla na mkpọrọ na ntaramahụhụ na-eche m nꞌebe ahụ.


ỌLU OZI 20:28
“Ma ugbu a kpacharanụ anya! Leziekwanụ anya ịzụzi igwe atụru Chineke bụ chọọchị ya, nke Mmụọ Nsọ tinyere nꞌaka unu. Chineke emeela igwe atụrụ ndị a ihe nke aka ya, nꞌihi na o ji ọbara Ọkpara ọ mụrụ nanị ya zụọ ha.


ỌLU OZI 21:4
Anyị banyere nꞌime obodo Taịa, hụ ndị kwere ekwe, nọnyere ha otu izu ụka. Ma ụmụ Chineke a dọrọ Pọl aka na ntị dị ka Mmụọ Nsọ Chineke kpugheere ha ka ọ ghara ịga Jerusalem.


ỌLU OZI 21:11
Ọ bịara ileta anyị. Ma ọ chịlitere belịtị Pọl na-eke nꞌukwu kee onwe ya nꞌụkwụ na aka sị, “Dị ka Mmụọ Nsọ kwuru, otu a ka ndị Juu ga-eke onye nwe ihe a agbụ na Jerusalem. Ha ga-ararakwa ya nye nꞌaka ndị Rom.”


ỌLU OZI 23:8
Nꞌihi na ndị Sadusii ekweghị na mbilite nꞌọnwụ ọ bụla dị. Ha ekwekwaghị na mmụọ ozi dị, ma ọ bụ na mmụọ ọ bụla dị nꞌime anyị. Ma ndị Farisii kweere nꞌihe ndị a.


ỌLU OZI 23:9
Mkpọtụ malitere na-ada ike ike. Ụfọdụ ndị ozizi iwu so nꞌotu ndị Farisii biliri ọtọ malite ịrụ ụka nꞌoke olu sị, “O nweghị ihe ọjọọ anyị chọpụtara nwoke a mere. Ma eleghị anya ọ ga-abụ na mmụọ ma ọ bụ mmụọ ozi gwara ya okwu nꞌụzọ Damaskọs ahụ.”


ỌLU OZI 27:23
“Nꞌihi na nꞌabalị gara aga mmụọ ozi Chineke Onyenwe m, na onye m na-efekwa bịakwutere m,


ỌLU OZI 28:26
“Eziokwu ka Mmụọ Nsọ Chineke kwuru mgbe o sitere nꞌọnụ Aịzaya onye amụma kwuo okwu sị, ‘Jekwuru ndị a gwa ha okwu sị, Unu ga-anụ ma unu agaghị aghọta, unu ga-ele anya, ma o nweghị ihe unu ga-ahụ.


ROM 1:4
Chineke gosiri na Jisọs bụ Ọkpara ya, onye ike nile dị nꞌaka ya, na onye nwekwara Mmụọ nke dị nsọ, mgbe o mere ka o si nꞌọnwụ bilie.


ROM 1:11
Ọ na-agụ m agụụ nke ukwuu ịbịa hụ unu anya, nꞌihi na achọrọ m ka unu keta oke nꞌonyinye Mmụọ Nsọ nke Chineke nyere m, nke ga-enyere unu aka iguzsi ike nꞌokwukwe.


ROM 1:32
Ọ bụ eziokwu na ha maara nke ọma na Chineke ga-ekpe ha ikpe nꞌihi ihe ọjọọ ha na-eme, matakwa na Chineke ga-ama ndị nile na-eme ihe dị otu a ikpe ọnwụ, ma ha gara nꞌihu na-eme ihe ndị a, ma na-akwalikwa mmụọ ndị ọzọ ka ha soro na-eme ha.


ROM 2:29
É, è, onye bụ onye Juu nꞌezie bụ onye ahụ bụ onye Juu nꞌime mmụọ ya, onye e biri obi ya ugwu. Obibi ugwu a bụkwa ọrụ Mmụọ Chineke ọ bụghị ọrụ nke iwu e dere ede na-arụ. Otuto onye dị otu a na-enweta na-esitekwa nꞌebe Chineke nọ bịa, ọ bụghị site nꞌaka mmadụ.


ROM 5:4
Ntachi obi na-arụpụta nꞌime anyị mmụọ nke iguzosi ike, nke na-enyere anyị aka ịtụkwasị Chineke obi nꞌọnọdụ ntachi obi ọ bụla, tutuu ruo mgbe olileanya anyị na okwukwe anyị guzosiri ike.


ROM 5:5
Mgbe ahụ, nꞌọnọdụ ọ bụla, anyị pụrụ ịbụ ndị guzo chịm, na-atụghị egwu, nꞌihi na anyị maara na Chineke hụrụ anyị nꞌanya, na o gosikwara ịhụnanya ya mgbe o nyere Ọkpara ya, onye sitere na Mmụọ Nsọ mejupụta obi anyị nꞌịhụnanya Chineke.


ROM 7:6
Ma ugbu a, ebe anyị bụ ndị nwụrụ anwụ nꞌebe iwu kere anyị agbụ dị, a napụtakwala anyị site nꞌaka ya, ime ka anyị bụrụ ndị sitere nꞌụzọ ọhụrụ nke Mmụọ na-ejere Chineke ozi. Ọ bụkwaghị nꞌụzọ ochie nke iwu e dere ede si chọọ.


ROM 7:25
Ma ekele dịrị Chineke site na Kraịst Jisọs Onyenwe anyị! Ana m eji mmụọ m nile na-ejere iwu Chineke ozi, ma nꞌanụ ahụ m, abụ m ohu mmehie.


ROM 8:2
Nꞌihi na ike ahụ Mmụọ na-enye ndụ na-enye abụrụla nke m, site nꞌịdị nꞌotu nke mụ na Kraịst. Ike a emekwaala ka m nwere onwe m nꞌebe ike nile nke mmehie na ọnwụ dị.


ROM 8:4
Ya mere, anyị pụrụ idebezu ihe nile iwu chọrọ ugbu a, site nꞌike Mmụọ Nsọ. Ọ bụkwaghị ọrụ anyị ime ihe anụ ahụ anyị chọrọ.


ROM 8:5
Ndị nile na-ebi ndụ ha dị ka anụ ahụ si chọọ, na-ebi ya nanị imezu agụụ nile na-agụ anụ ahụ ha. Ma ndị nile na-agbaso ụzọ nke Mmụọ Nsọ na-achọpụta na ha na-eme ihe Chineke na-achọ.


ROM 8:6
Mkpụrụ obi ọ bụla na-agbaso ọchịchọ nke ọdịdị ochie ya ga-anwụ. Ma mkpụrụ obi na-agbaso Mmụọ Nsọ Chineke ga-ebi ndụ nꞌudo.


ROM 8:9
Ma lee! Ọ bụrụ na Mmụọ Chineke bi nꞌime unu na-achị ndụ ọhụrụ unu, unu agaghị emekwa uche ọdịdị ochie unu. Chetakwa na ọ bụrụ na Mmụọ Kraịst ebighị nꞌime gị, ị bụghị onye nke Kraịst.


ROM 8:10
Ọ bụrụkwa na Kraịst bi nꞌime gị, anụ ahụ gị ga-abụ ihe nwụrụ anwụ nꞌebe mmehie dị, ma Mmụọ Nsọ bi nꞌime gị ga-enye gị ndụ, nꞌihi na o burularị ụzọ mee ka ị bụrụ onye ezi omume.


ROM 8:11
Ọ bụrụ na Mmụọ Chineke, onye mere ka Jisọs si nꞌọnwụ bilie, bi nꞌime gị, ọ ga-emekwa ka anụ ahụ gị dị ndụ ọzọ, mgbe ị nwụchara, site nꞌike Mmụọ Nsọ ahụ, onye bi nꞌime gị.


ROM 8:13
Nꞌihi na ọ bụrụ na anyị anọgide na-eme ihe ọdịdị ochie anyị chọrọ, anyị ga-ala nꞌiyi. Kama ọ bụrụ na anyị esite nꞌike Mmụọ Chineke gwepịa, ma wezuga ọrụ ọjọọ nke anụ ahụ, anyị ga-adịkwa ndụ.


ROM 8:14
Nꞌihi na ndị nile Mmụọ Chineke na-achị bụ ụmụ Chineke.


ROM 8:16
Mmụọ Nsọ na-agwakwa anyị okwu nꞌime mmụọ anyị, na-agbara anyị ama na anyị bụ ụmụ Chineke nꞌezie.


ROM 8:23
Ọ bụghị nanị nke a, ma anyị onwe anyị bụ ndị Kraịst, ndị nwere Mmụọ Chineke, nọkwa na-asụ ude nꞌime obi anyị, na-eche ọbịbịa nke ụbọchị ahụ, mgbe a ga-ewezugara anyị ihe mgbu na ọrịa nile. Anyị nọkwa na-ele anya ọbịbịa nke ụbọchị ahụ mgbe Chineke ga-enye anyị ihe nile kwesịrị anyị dị ka ụmụ Chineke, ya na ahụ ọhụrụ ahụ o kwere anyị na nkwa, ahụ nke na-agaghị arịakwa ọrịa ọzọ, nke na-agaghị anwụkwa ọzọ.


ROM 8:26
Mgbe ọ bụla kwa anyị ji ndidi na-eche ihe anyị nwere olileanya na anyị ga-enweta, Mmụọ Nsọ na-enyere anyị aka nꞌọnọdụ adịghị ike anyị nile. Nꞌihi na nꞌọnọdụ ụfọdụ, anyị adịghị ama ihe anyị kwesịrị ịrịọ Chineke ka o meere anyị, ma ọ bụ otu anyị ga-esi doo ọnụ anyị kpee ekpere ahụ, ma Mmụọ Nsọ na-eji ịsụ ude nke mmadụ na-enweghị ike ịkọwa na-arịọrọ anyị arịrịọ.


ROM 8:27
Chineke Nna anyị, onye na-enyocha obi mmadụ nile makwaara ihe Mmụọ Nsọ ahụ na-eche, mgbe ọ na-arịọ arịrịọ ahụ nꞌusoro, dị ka Chineke si chọọ.


ROM 8:38
Nꞌihi na nke a bụ ihe m maara nke ọma, bụrụkwa ihe doro m anya, na ọ dịghị ihe pụrụ ikewapụ anyị site nꞌịhụnanya Chineke. Ọnwụ, ma ọ bụ ndụ enweghị ike ya, ndị mmụọ ozi ma ọ bụ ike nile dị nꞌeluigwe enweghị ike igbochi Chineke ịhụ anyị nꞌanya. Ọ bụladị ihe ọjọọ nile na-eme nꞌụwa taa, na nchegbu banyere ihe ga-eme echi, apụghị igbochi ịhụnanya Chineke.


ROM 9:1
Ihe m na-agwa unu bụ eziokwu dị ka onye Kraịst nke m bụ. Ekwughị m okwu ụgha. Mmụọ m, nke Mmụọ Nsọ na-achị, na-agbakwara m ama, na ọ bụ eziokwu ka m na-ekwu.


ROM 11:11
Nke a ò gosiri na Chineke ajụla ndị Juu ruo mgbe ebighị? Mbaa! Kama nzube Chineke bụ na ọ ga-esite nꞌọdịda ndị Juu mee ka nzọpụta ruo ndị mba ọzọ aka. Ọ chọkwara ka nnabata a ga-anabata ndị mba ọzọ kpalie mmụọ ekworo ndị Juu ịchọrọ onwe ha nzọpụta ahụ.


ROM 11:12
Nꞌezie, ọ bụrụ na e mere ka ngọzi pụrụ iche rute ụwa nile aka nꞌihi na ndị Juu mehiere, ọ bụrụkwa na ịbụ ogbenye nꞌime mmụọ ha mere ka ndị mba ọzọ keta oke na ngọzi ahụ dị ukwuu, ngọzi babigara ụba oke ọ̀ gaghị adị mgbe a gụnyekọrọ ọnụ ọgụgụ ndị Juu ahụ nile a ga-azọpụta?


ROM 12:1
Ya mere ụmụnna m, ana m agbakwasị ụkwụ nꞌobi ebere Chineke gosiri unu na-arịọ unu arịrịọ na-asị unu, cheenụ onwe unu nꞌihu Chineke dị ka aja dị ndụ, nke ndị nsọ, na nke na-atọ ya ụtọ. Nꞌihi na nke a bụ ofufe nke ime mmụọ ọ chọrọ site nꞌaka unu.


ROM 12:2
Kwụsịnụ ibi ndụ nꞌụzọ na-atọ ụwa ụtọ, kama kwerenụ ka Chineke nwoghaa unu nꞌime mmụọ unu site nꞌịgbanwe obi unu. Mgbe ahụ unu ga-enwe ike ịmata ihe bụ uche Chineke, matakwa ihe dị mma, na ihe na-atọ ya ụtọ, na ihe zukwara oke.


ROM 14:17
Nꞌihi na ihe dị mkpa na ndụ onye Kraịst abụghị ihe anyị riri, ma ọ bụ ihe anyị ṅụrụ. Kama ọ bụ ime ka ezi omume, na udo, na ọnụ na-esi nꞌaka Mmụọ Nsọ abịa dịrị na-aga nꞌihu.


ROM 14:22
Ka okwukwe i nwere banyere ihe dị mma oriri dịrị nꞌetiti gị na Chineke. Egosila ya nꞌebe ọ ga-ewute ndị ọzọ, na mmụọ ha. Ngọzi na-adịrị onye na-adịghị emehie nꞌihi na ọ maara na ihe bụ ezi ihe.


ROM 15:5
Ka Chineke, onye na-enye ntachi obi, onye na-agbakwa ndị na-ada mba ume, nye unu mmụọ nke ịdị nꞌotu, ka unu nwee ike ibi nꞌudo, ka unu nweekwa ike mesoo ibe unu ụdị mmeso ahụ Kraịst mesoro anyị.


ROM 15:13
Ya mere, ekpere m na-ekpe bụ ka Chineke onye na-enye anyị olileanya, were ọṅụ na udo na-adịgide mejupụta unu, mgbe unu na-atụkwasị ya obi, site nꞌike Mmụọ Nsọ ahụ bi nꞌime unu.


ROM 15:16
abụ m onyeozi Kraịst; ọrụ pụrụ iche e nyere m bụ igbasara ndị mba ọzọ ozi ọma, na iche ha nꞌihu Chineke dị ka aja dị ụtọ nke Chineke ga-anabata. Nꞌihi na Mmụọ Nsọ emeela ka unu bụrụ ndị dị ọcha, ndị ihe ha na-atọ Chineke ụtọ.


ROM 15:19
Emeela m ka ndị mba ọzọ bịakwute Chineke site na nkwusa m, site nꞌụdị ndụ m biri nꞌetiti ha, na sitekwa nꞌọrụ ịrịba ama nile m rụrụ nke ha hụrụ, bụ ọrụ m rụrụ site nꞌike Mmụọ Nsọ Chineke. Nꞌụzọ dị otu a emezuola m ihe Chineke chọrọ ka m mee, site nꞌikwusa ozi ọma Kraịst site na Jerusalem ruo nꞌobodo Ilirikum.


ROM 15:27
Ha ji ọṅụ nye onyinye ndị a nꞌihi na o metụrụ ha nꞌobi na o kwesịrị ka ha nyere nzukọ Kraịst dị na Jerusalem aka. Nꞌihi na ọ bụrụ na ọ bụ site nꞌaka ndị Juu ka ha si nata ngọzi nile nke Mmụọ Nsọ, ha ji ụgwọ isite nꞌakụ na ụba ha nwere nyere ndị Juu aka na mkpa ha.


ROM 15:30
Esi m nꞌaka Onyenwe anyị Jisọs Kraịst na ịhụnanya anyị nwere nꞌime Mmụọ Nsọ na-arịọ unu, ụmụnna m, ka unu soro m kpee ekpere, na-echeta m nꞌekpere unu nꞌihu Chineke.


1 KỌRINT 1:7
Nꞌihi na ugbu a, Chineke enyela unu amara ya na ngọzi ya nile. O nyekwala unu onyinye Mmụọ Nsọ nile na ike dum unu chọrọ iji mee ihe na-atọ ya ụtọ. Chineke nyere unu ihe ndị a nile ugbu a unu nọ na-ele anya ọbịbịa Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.


1 KỌRINT 2:4
Ihe nile m ziri unu na ihe nile m kwusara, bụ ihe dịrị onye ọ bụla nꞌime unu mfe ịghọta. Ejighị m oke okwu na-ezipụta mmụta m, ma ọ bụ amamihe m gwa unu okwu, kama ọ bụ Mmụọ Nsọ Chineke gbara okwu ndị ahụ nile m gwara unu ume, mee ka ọ pụta ìhè nye ndị nụrụ okwu ahụ, na ihe m kwuru bụ okwu Chineke.


1 KỌRINT 2:10
Ọ bụ nanị anyị ka Chineke kpugheere ihe omimi a; o sitere na Mmụọ Nsọ ya mee ka anyị mata ya. Mmụọ Nsọ Chineke bụ onye na-enyochapụta ihe omimi na ihe nzuzo nile dị Chineke nꞌobi, ọ bụ ya na-egosikwa anyị ihe ha bụ.


1 KỌRINT 2:11
Ọ dịghị onye ọ bụla pụrụ ịma ihe onye ọzọ na-eche nꞌobi ya. Ọ bụ nanị mmụọ nọ nꞌime onye ahụ bụ onye maara ihe nile banyere ya. Ọ dịkwaghị onye pụrụ ịmata ihe Chineke na-eche nꞌobi ya, ma ọ bụghị nanị Mmụọ Chineke nꞌonwe ya.


1 KỌRINT 2:12
Ma mmụọ nke anyị nwere abụghị mmụọ nke ụwa, kama ọ bụ Mmụọ Chineke nyere anyị inyere anyị aka, ịmata onyinye amara nile Chineke nyere anyị.


1 KỌRINT 2:13
Mgbe anyị gwara unu okwu banyere onyinye ndị a, anyị ji okwu ahụ Mmụọ Nsọ tinyere anyị nꞌọnụ kwuo ya, ọ bụghị okwu nke anyị ji aka anyị họrọ site na mmụta anyị. Ya mere, ọ bụ okwu nke Mmụọ Nsọ tinyere anyị nꞌọnụ ka anyị ji kọwaa ihe gbasara Mmụọ Nsọ.


1 KỌRINT 2:14
Ma mmadụ ahụ mkpụrụ obi nke onwe ya na-achị enweghị ike ịnabatara onwe ya onyinye si nꞌaka Mmụọ Nsọ Chineke, nꞌihi na onye dị otu a adighị aghọta ihe ha bụ. Nꞌebe ọ nọ, ha bụ ihe nzuzu. Kama ọ bụ nanị ndị Mmụọ Nsọ bi nꞌime ha na-aghọta ihe ọ bụla banyere Mmụọ Nsọ.


1 KỌRINT 2:15
Onye ahụ Mmụọ Nsọ na-achị achị na ndụ ya, nwere ike ịghọta ihe ọ bụla. Ụdị nghọta ọ na-enwe banyere ihe ọ bụla na-agba onye ụwa gharịị, na-agbagwoju ya anya, nꞌihi na onye ụwa enweghị ike ịghọta ụdị mmadụ ọ bụ.


1 KỌRINT 2:16
Ma onye ụwa ọ̀ ga-esi aṅaa ghọtakwanụ? Ò nweela oge ọ bụla o ji mata ihe Chineke na-eche nꞌobi ya? Ò nweela mgbe o ji nwee ike ịdụ Chineke ọdụ ịgwa ya ihe ọ ga-eme? Ma dị ka o si dị, anyị bụ ndị nke Kraịst, nwere nꞌime anyị Mmụọ Kraịst.


1 KỌRINT 3:1
Ụmụnna m, o siiri m ike ịgwa unu okwu dị ka a ga-asị na unu bụ ndị tozuru etozu nꞌime Mmụọ, kama agwara m unu okwu dị ka ndị na-etozughị etozu nꞌime mmụọ, ndị bụ ụmụntakịrị nꞌime Kraịst.


1 KỌRINT 3:16
Ọ bụ na unu aghọtaghị na unu bụ ụlọ nsọ Chineke. Ọ̀ bụ na unu aghọtakwaghị na Mmụọ Nsọ Chineke bi nꞌime unu?


1 KỌRINT 4:8
Ndụ unu na-ebi na-egosi na echiche unu bụ na unu enwezuola ihe nile dị unu mkpa. Ee, unu na-ebi ndụ dị ka ndị afọ juru nꞌihe nke Mmụọ. Unu na-ebi ndụ dị ka ndị eze, ndị nọkwasịrịla nꞌocheeze ha, ma anyị onwe anyị nọ nꞌezi. Nꞌezie, ọ gaara atọ ma a sị na unu anọrọla nꞌocheeze unu, nꞌihi na mgbe oge ịnọ nꞌocheeze ruru, ghọtanụ na anyị onwe anyị ga-anọkwa nꞌebe ahụ, iso unu ịchị achị.


1 KỌRINT 4:9
Mgbe ụfọdụ ọ na-adị m nnọọ ka Chineke na-eme ka anyị bụ ndị ozi bụrụ ndị dịkarịsịrị ala, ndị a na-echeta nanị mgbe ihe nile na-agwụsị agwụsị. Anyị dị ka ndị a mara ikpe ọnwụ, ndị a na-akpọpụta nꞌihu ọha mmadụ mee anyị ihe nlere anya nye ụmụ mmadụ na ndị mmụọ ozi.


1 KỌRINT 4:21
Ya mere, unu ka ọ dịrị ịhọrọ nke unu chọrọ. Unu chọrọ ka m jiri ụtarị bịakwute unu, ka ọ bụ ka m jiri obi dị umeala na mmụọ nke ịhụnanya bịa?


1 KỌRINT 5:3
Ọ bụ ezie na mụ na unu anọghị ugbu a, ma mụ na unu nọkwa nꞌime mmụọ. Ikwuru unu eziokwu, amaala m rị onye ahụ ikpe site nꞌaha Onyenwe anyị Jisọs, dị ka a ga-asị na mụ na unu nọ.


1 KỌRINT 5:4
Ya mere, mgbe ọ bụla unu zukọrọ nꞌaha Onyenwe anyị Jisọs, aga m esoro unu nọdụ nꞌime mmụọ m, ike Onyenwe anyị Jisọs ga-adịnyekwara unu.


1 KỌRINT 5:5
Mgbe ahụ sitenụ nꞌụlọ chọọchị Chineke wepụ nwoke a, werenụ ya nyefee nꞌaka ekwensu, ka ọ taa anụ ahụ ya ahụhụ, ka e nwee ike ịzọpụta mmụọ ya, mgbe Onyenwe anyị Jisọs lọghachiri.


1 KỌRINT 6:3
Ọ̀ bụ na unu amatakwaghị na ọ bụ anyị ga-ekpe ndị mmụọ ozi nọ nꞌeluigwe ikpe? Gịnị ga-emekwa ka anyị ghara idozi nsogbu nile dapụtara nꞌetiti anyị nꞌụwa a?


1 KỌRINT 6:11
Na mbụ, ụfọdụ nꞌime unu na-ebi ndụ dị otu a. Ma ugbu a, a sachapụla mmehie unu, doo unu nsọ nye Chineke. Ọ bụkwa site nꞌaha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst na Mmụọ Nsọ Chineke anyị ka e ji gụọ unu dị ka ndị ezi omume.


1 KỌRINT 6:17
Ma ọ bụrụ na e jikọtaa mmadụ ọ bụla na Onyenwe anyị, ya na onye ahụ ga-abụ otu nꞌime mmụọ.


1 KỌRINT 6:19
Ọ bụ na unu amataghị na ahụ unu bụ ụlọ obibi nke Mmụọ Nsọ ahụ Chineke nyere unu, Onye bi nꞌime unu? Anụ ahụ unu abụkwaghị nke unu onwe unu, kama unu bụ nke Chineke.


1 KỌRINT 7:40
Nꞌuche m, ọ ga-enwe ọṅụ nꞌobi ya karịa ma ọ bụrụ na ọ lụghị di ọzọ. Ana m echekwa na ndụmọdụ ndị a m nyere unu si na Mmụọ Chineke bịa.


1 KỌRINT 8:7
Ma otu ọ dị, ọ bụghị ndị Kraịst nile maara eziokwu a. Nꞌime ndụ ha nile, ha na-ele arụsị anya dị ka chi dị ndụ. Ha na-echekwa na ihe ọ bụla e ji chụọra arụsị aja, na ọ bụ chi dị ndụ ka e ji ya chụọra aja. Nꞌihi nke a, mgbe ọ bụla ha riri ihe e ji chụọ aja nye arụsị, ọ na-ewute mmụọ ha nke ukwuu nꞌihi na ha na-eche na ihe ha riri emerụọla ha.


1 KỌRINT 8:11
Site nꞌụzọ dị otu a, nwoke a mmụọ ya na-esighị ike, onye bụ nwanne gị, onye Kraịst nwụrụ nꞌihi ya, ga-ala nꞌiyi nꞌihi na o sooro gị, onye maara ihe nile, mee ihe ahụ akọnuche ya gwara ya na ọ bụ mmehie.


1 KỌRINT 9:11
Mkpụrụ anyị kụrụ nꞌime obi unu bụ mkpụrụ nke mmụọ. Ọ̀ ga-abụ ihe ọjọọ ma anyị sị unu nyetụ anyị ihe oriri na akwa oyiyi unu?


1 KỌRINT 10:3
Ha nile rikwara ihe oriri nke mmụọ ahụ Chineke zitere.


1 KỌRINT 10:4
Ha ṅụkwara mmiri nke mmụọ ahụ, mmiri sitere nꞌoke nkume nke mmụọ ahụ, nke na-eso ha. Oke nkume ahụ bụ Kraịst nꞌonwe ya.


1 KỌRINT 10:9
Ka anyị hapụ ịnwa Chineke ọnwụnwa dị ka ụfọdụ nꞌime ha si nwaa Chineke. E mere ka agwọ tagbusie ha. Ka anyị hapụkwa ịtamụ dị ka ụfọdụ ha tamụrụ megide Chineke. Chineke zitere mmụọ ozi ya ka o gbuo ha.


1 KỌRINT 10:25
Nke a bụ ihe i kwesịrị ime. Ọ bụrụ na ị gaa ahịa, zụrụ ụdị anụ ọ bụla ị chọrọ nke a na-ere nꞌahịa, ajụla ajụjụ ọ bụla ịmata ma e ji ya chụọra arụsị aja ma ọ dịghị, nꞌihi na ọsịsa ị ga-anata pụrụ iwute mmụọ gị.


1 KỌRINT 10:27
Ọ bụrụ na onye na-ekweghị ekwe akpọọ gị, sị gị bịa nꞌụlọ ya, gaa, riekwa nri ọ bụla e nyere gị na-ajụghị ajụjụ. Nꞌihi na ọsịsa ya pụrụ imerụ mmụọ gị.


1 KỌRINT 10:28
Ma ọ bụrụ na e nwee onye gwara gị sị, “E jikwa anụ a chụọra arụsị aja” erila ya, nꞌihi nwoke ahụ gwara gị na e ji ya chụọ aja, na nꞌihi na ọ ga-ewute mmụọ ya ma i rie ya.


1 KỌRINT 10:29
Nꞌoge a ihe dị mkpa abụghị ihe i chere banyere anụ ahụ, kama ihe dị mkpa bụ ime ka mmụọ nwoke ahụ gwara gị na e ji ya chụọra arụsị aja hapụ ịda mba. I nwere ike ịjụ ajụjụ sị, “Gịnị mere m ga-eji hapụ ime ihe ọ bụla nꞌihi na ọ ga-ewute mmụọ onye ọzọ?


1 KỌRINT 11:10
Nꞌihi nke a, nwanyị kwesịrị ikpuchi isi ya igosi na ọ nọ nꞌokpuru di ya, ime ka ndị mmụọ ozi hụ ụdị omume a, site nꞌihi ya ṅụrịa ọṅụ.


1 KỌRINT 12:1
Ugbu a ụmụnna m, ka anyị gafee nꞌokwu gbasara onyinye dị iche iche Mmụọ Nsọ na-enye. Aga m akọwa ya nꞌụzọ ọ ga-esi doo unu nile anya.


1 KỌRINT 12:3
Ugbu a e nwere ọtụtụ ndị na-asị na Mmụọ Nsọ Chineke si nꞌọnụ ha na-ekwu okwu. Ùnu ga-esi aṅaa mata na ọ bụ Chineke si nꞌọnụ ha ekwu okwu nꞌezie? O nweghị onye ọ bụla pụrụ ịkpọku aha Jisọs sị, “Jisọs bụ Onyenwe m” ma ọ bụghị site nꞌike Mmụọ Nsọ. Ọ dịkwaghị onye ọ bụla Mmụọ Chineke na-achị nke pụrụ ịsị, “Jisọs bụ onye a bụrụ ọnụ.”


1 KỌRINT 12:4
Ọ bụ ezie na onyinye Mmụọ Nsọ Chineke dị ọtụtụ, ma ọ bụ otu Mmụọ Nsọ ahụ na-enye ha.


1 KỌRINT 12:7
Mmụọ Nsọ na-arụpụta ọrụ ya nꞌime onye ọ bụla nꞌụzọ ọ ga-esi bara chọọchị nile uru.


1 KỌRINT 12:8
Mmụọ Nsọ na-enye otu onye onyinye ikwu okwu amamihe, na-enyekwa onye ọzọ onyinye ịma ihe ọmụma, dị ka o si chọọ.


1 KỌRINT 12:9
Otu Mmụọ Nsọ a na-enye onye ọzọ onyinye inwe okwukwe pụrụ iche, na-enyekwa onye ọzọ onyinye inwe ike ịgwọ ọrịa.


1 KỌRINT 12:10
Ụfọdụ ka ọ na-enye onyinye ịrụ ọrụ ịtụnanya, ndị ọzọ ike ibu amụma. Onye ọzọ ka ọ na-enye ike ịkọwa ụdị mmụọ dị iche iche, ma onye ọzọ kwa ka ọ na-enye ike ịsụ asụsụ dị iche iche. Ma ọ na-enyekwa onye ọzọ ike ịkọwa ihe onye na-asụ asụsụ ndị a na-ekwu.


1 KỌRINT 12:11
Ọ bụ otu Mmụọ ahụ na-enye onyinye ndị a nile. Ọ na-enye onye ọ bula onyinye dị iche iche dị ka o si kpebie na dị ka o si dị ya mma.


1 KỌRINT 12:13
Onye ọ bụla nꞌime anyị bụ otu akụkụ anụ ahụ Jisọs Kraịst. Ụfọdụ nꞌime anyị bụ ndị Juu, ụfọdụ abụghị ndị Juu, ụfọdụ bụ ndị nwe onwe ha, ndị ọzọ bụ ndị ohu. Ma ọ bụ otu Mmụọ ahụ mere anyị nile baptizim baa nꞌime otu ahụ Kraịst ahụ. Chineke enyekwala anyị nile nꞌotu nꞌotu Mmụọ Nsọ ahụ.


1 KỌRINT 13:1
A sị na m nwere onyinye ịsụ asụsụ dị iche iche, na asụsụ ndị mmụọ ozi, ma ahụghị mmadụ ibe m nꞌanya, ọ bụ nanị ụzụ ka m na-eme.


1 KỌRINT 14:1
Ka ịhụ mmadụ ibe unu nꞌanya bụrụ ihe na-agụsi unu agụụ ike. Rịọkwanụ Chineke ka o nye unu onyinye nke Mmụọ Nsọ ya na-enye, nke ka nke, onyinye ibu amụma, ka unu nwee ike ikwusa ozi ọma Chineke.


1 KỌRINT 14:2
Ọ bụrụ na onyinye i nwere bụ onyinye ịsụ asụsụ nke i na-amụghị amụ, cheta na ọ bụ nanị Chineke ka ị na-agwa okwu, nꞌihi na ọ dịghị onye na-aghọta ihe ị na-ekwu. Okwu ị na-ekwu ga-abụ site nꞌike Mmụọ Nsọ, ma ha nile bụ ihe mmadụ na-aghọtaghị.


1 KỌRINT 14:3
Ma onye ahụ na-ebu amụma na-ezisa ozi ọma, na-agwa ndị mmadụ okwu na-enyere ha aka ito eto nꞌime Onyenwe anyị. Ọ na-agwakwa ha okwu nkasiobi na okwu na-ebuli mmụọ ha elu.


1 KỌRINT 14:4
Ya mere, nwoke ahụ na-ezisa ozi ọma na-enyere chọọchị nile aka ito eto nꞌime mmụọ, ma nwoke ahụ na-asụ asụsụ ọzọ, na-enyere nanị onwe ya aka.


1 KỌRINT 14:12
Ebe unu na-achọsi ike inwe onyinye nke Mmụọ Nsọ, chọọnụ onyinye ndị ahụ ga-enyere unu aka iwuli nzukọ Chineke elu.


1 KỌRINT 14:14
Ọ bụrụ na m ji asụsụ dị iche na-ekpe ekpere, mmụọ m ga-eso m na-ekpe ekpere ahụ, ma uche m agaghị aghọta ekpere m na-ekpe.


1 KỌRINT 14:15
Ọ bụrụ na ọ dị otu a, olee ihe m ga-eme? Aga m eji mmụọ m kpee ekpere nꞌasụsụ ahụ m na-aghọtaghị jirikwa uche kpee ekpere nꞌasụsụ ahụ m ghọtara. Aga m ejikwa mmụọ m bụọ abụ nꞌasụsụ ahụ m na-aghọtaghị, jirikwa uche m bụọ abụ nꞌasụsụ ahụ m ghọtara, ka m nwee ike ịmata ihe m na-ekwu na ihe m na-abụ nꞌabụ.


1 KỌRINT 14:37
Ọ bụrụ na ọ dị onye na-eche na ya bụ onye amụma, ma ọ bụ na ya nwere onyinye nke Mmụọ Nsọ, nanị ihe m na-achọ ka ọ ghọta bụ na ihe m na-edere unu bụ iwu Onyenwe anyị nꞌonwe ya nyere m.


1 KỌRINT 15:44
Ọ bụ nanị anụ ahụ mmadụ ka ha bụ mgbe e liri ya, ma mgbe e si nꞌọnwụ kpọlite ha, ha ga-abụ anụ ahụ nke mmụọ na-achị. Dị ka e nwere anụ ahụ nke mkpụrụ obi mmadụ na-achị, otu a kwa ka e nwere anụ ahụ nke mmụọ na-achị.


1 KỌRINT 15:45
Akwụkwọ nsọ kwuru sị, “E kere Adam nwoke mbụ ka ọ bụrụ mmadụ dị ndụ, ma Kraịst, Adam ikpeazụ, bụ mmụọ na-enye ndụ.”


1 KỌRINT 15:46
Na mbụ anyị na-enwe anụ ahụ mmadụ, ma nꞌikpeazụ Chineke ga-enye anyị anụ ahụ nke mmụọ na-achị.


2 KỌRINT 1:22
Chineke akakwasịla anyị akara ya igosi na anyị bụ ndị nke ya. O nyekwala anyị Mmụọ Nsọ ya nꞌime obi anyị dị ka ihe akaebe na anyị ga-anata ihe nile o zubere inye anyị.


2 KỌRINT 2:4
Nꞌezie, akwụkwọ ahụ m detaara unu wutere mmụọ m nke ukwuu. Nꞌihi na ọ bụ nꞌọnọdụ oke mkpagbu na ihe mgbu, ya na anya mmiri, ka m ji dee ya. Edeghị m ya ime ka unu nọọ nꞌihe mgbu, kama edere m ya ka unu mara otu m si hụ unu nꞌanya, na otu o si na-emetụ m nꞌobi bụ ihe na-eme nꞌetiti unu.


2 KỌRINT 2:7
Ugbu a, bikonụ ụmụnna m, o kwesịrị ka unu gbaghara ya, ma kasie ya obi, ka ọ hapụ inwe obi ilu ma ọ bụ daa mba na mmụọ ya, nke ga-eme ka o kpebie ịhapụ iso Kraịst ọzọ.


2 KỌRINT 3:3
Ọ pụtara ìhè na unu bụ akwụkwọ ozi si nꞌebe Kraịst nọ bịa, nke anyị dere. Ọ bụghị ihe e ji mkpịsị akwụkwọ dee na mbadamba nkume, kama e dere ya nꞌobi mmadụ site na mmụọ Chineke na-adị ndụ.


2 KỌRINT 3:6
Ọ bụ nanị Chineke mere ka anyị zuo oke ịbụ ndị ozi ya, na-akọwara ndị mmadụ ihe banyere ọgbụgba ndụ ọhụrụ nke Chineke chọrọ iji zọpụta ha. Anyị anaghị agwa ha na ọ dị mkpa ka ha debe iwu nile Chineke nyere, kama anyị na-agwa ha na ndụ dịrị ha site na Mmụọ Nsọ. Nꞌihi na ụzọ ochie ahụ nke inwe nzọpụta site nꞌidebe iwu na-eweta ọnwụ, ma nꞌime ụzọ ọhụrụ a, Mmụọ Nsọ na-enye ha ndụ.


2 KỌRINT 3:8
Ọ bụrụ na iwu ahụ ji ebube bịa, anyị kwesịrị ile anya na ụzọ a Mmụọ Nsọ si enye ndụ ga-eji ebube dịkarịrị ukwuu bịa.


2 KỌRINT 3:17
Nꞌihi na Onyenwe anyị bụ Mmụọ ahụ anyị na-ekwu ihe banyere ya. Ebe ọ bụla kwa Mmụọ Onyenwe anyị nọ, nꞌebe ahụ ka mmadụ pụrụ inwere onwe ya.


2 KỌRINT 3:18
Ma anyị nile ndị bụ ụmụ Chineke enweghị ihe mkpudo ọ bụla nꞌihu anyị. Anyị dị ka enyo na-egosi ndị mmadụ ebube Chineke. Mgbe Mmụọ Onyenwe anyị na-arụ ọrụ ya nꞌime anyị, ọ na-agbanwe anyị, ime ka anyị dịrị ka ya.


2 KỌRINT 4:16
Ọ bụ nke a mere ike adịghị agwụ anyị nꞌobi. Ọ bụ ezie na anụ ahụ anyị na-anwụ anwụ, ma Chineke na-agba mmụọ anyị ume kwa ụbọchị.


2 KỌRINT 5:5
Nke a bụ ihe Chineke kwadebeere anyị. O nyekwara anyị Mmụọ Nsọ ya ka ọ bụrụ ihe ga-egosi anyị na ọ ga-emezuru anyị nkwa ahụ.


2 KỌRINT 6:6
Anyị emeekwala ka unu mata na anyị bụ ndị sitere na ndụ dị ọcha anyị na-ebi, na ezi nghọta anyị ghọtara ozi ọma ahụ, na ogologo ntachi obi na-ejere Chineke ozi. Anyị egosikwala unu na anyị bụ ndị nwere obi ọma, ndị hụrụ unu nꞌanya, na ndị jupụtara na Mmụọ Nsọ Chineke.


2 KỌRINT 7:1
Nkwa ndị a nile ka Chineke kwere anyị, ndị enyi m. Ya mere, ka anyị debe onwe anyị ọcha nꞌime ihe nile, ka ihe ọ bụla ghara imerụ ahụ anyị na mmụọ anyị. Kama ka anyị bie ndụ ịdị nsọ na ịtụ egwu Chineke.


2 KỌRINT 7:13
Ewezugakwa ụzọ unu si gbaa anyị ume site nꞌịhụnanya unu nwere nꞌebe anyị nọ, a gbara anyị ume karịa site na nnabata unu nabatara Taitọs, na otu unu si mee ka mmụọ ya zuru ike mgbe ọ bịakwutere unu.


2 KỌRINT 11:4
Ọ pụtara ìhè na ọ gaghị abụ ihe siri ike ụfọdụ mmadụ ịbịakwute unu duhie unu, nꞌihi na ọ bụ ihe e jiri mara unu bụ ịnabata onye ọ bụla bịakwutere unu kwusaara unu Jisọs ọzọ nke naabụghị nke anyị na-ekwusa. Ma ọ bụ kwusaara unu ihe banyere mmụọ ozi dị iche, ma ọ bụ zi unu ụzọ ọzọ dị iche a ga-esi zọpụta unu. Unu ga-anabata ozizi ahụ nile.


2 KỌRINT 11:14
Ma omume ha adịghị eju m anya, nꞌihi na ekwensu nꞌonwe ya nwere ike ịgbanwe onwe ya dịrị ka mmụọ ozi na-enye ìhè.


2 KỌRINT 12:2
Afọ iri na anọ gara aga Chineke kpọọrọ m gaa nꞌeluigwe. Amaghị m ihe bụ ọnọdụ m ji gaa nꞌebe ahụ, ma ọ bụ nꞌanụ ahụ, ma ọ bụ nꞌime mmụọ. Ọ bụ nanị Chineke maara ihe mere nꞌụbọchị ahụ. Kama ihe doro m anya bụ na agara m nꞌeluigwe.


2 KỌRINT 12:15
Nꞌezie, ọ na-atọ m ụtọ iwere onwe m na ihe nile m nwere nye unu, maka ọdịmma ndụ mmụọ unu, nꞌihi na ahụrụ m unu nꞌanya. Ma ọ na-adị m ka mgbe ịhụnanya m nꞌebe unu nọ na-adị ukwuu, mgbe ahụ ka ịhụnanya unu nꞌebe m nọ na-adị nta.


2 KỌRINT 12:18
Mgbe m rịọrọ Taịtọs ka ọ bịakwute unu, ya na nwanna anyị nwoke ọzọ, ọ dị uru ọ bụla ha ritere site nꞌọbịbịa ha bịara nꞌebe unu nọ? É,è! Nꞌihi na ọ bụ otu Mmụọ Nsọ ahụ na-achị ndụ anyị. Anyị na-agbasokwa nzọ ụkwụ ibe anyị na-arụ otu ọrụ ahụ.


2 KỌRINT 12:19
Ma eleghị anya unu ga-anọ naeche na okwu ndị a nile m na-ekwu bụ nꞌihi na m chọrọ ka unu nabatakwa anyị. É,è! Kama ana m ekwu nke a nꞌihu Chineke, onye na-anụ okwu m na-ekwu, na ọ bụ nꞌihi na anyị chọrọ inyere unu aka ka anyị ji na-ede ihe ndị a. Ee, inyere unu aka iwuli mmụọ unu elu, ọ bụghị nꞌihi ọdịmma nke anyị.


2 KỌRINT 13:14
Ka mara naesite nꞌebe Onyenwe anyị Jisọs Kraịst nọ abịa, na mmekọ nke Mmụọ Nsọ naeweta, dịnyere unu nile. Amin.


GALETIA 1:8
Ka ikpe ọmụma Chineke dị nꞌisi onye ọ bụla, ma mụ onwe m kwa, nke ga-ekwusara unu ozi ọma ọzọ dị iche, karịa ozi ọma ahụ anyị kwusaara unu. Ee, ka ikpe ọmụma dịkwa, ọ bụladị nꞌisi mmụọ ozi ọ bụla si nꞌeluigwe bịa kwusaara unu ozi ọma ọzọ dị iche. Ka m kwuokwa ya ọzọ, “Ikpe ọmụma Chineke ga-adakwasị onye ọ bụla kwusaara unu ozi ọma dị iche, karịa ozi ọma ahụ anyị buru ụzọ kwusaara unu.”


GALETIA 3:2
Zaanụ m otu ajụjụ a m chọrọ ịjụ unu. Olee otu unu si nata Mmụọ Nsọ? Ọ̀ bụ site nꞌidebe ihe iwu kwuru, ka ọ bụ site nꞌozi ọma unu nụrụ, na nkwere unu kweere?


GALETIA 3:3
Ọ̀ ga-abụ na unu aghọọla ndị na-enweghị uche? Ebe unu na-esiteghị nꞌidebe iwu nata Mmụọ Nsọ na mbụ, ùnu si aṅaa chee na idebe iwu ga-eme ka unu bụrụ ndị Kraịst tozuru oke ugbu a.


GALETIA 3:5
Ka m jụọkwa unu ajụjụ ọzọ, Mmụọ Nsọ ahụ Chineke nyere unu, na ọrụ ebube ọ rụrụ nꞌetiti unu, ò mere ha nꞌihi iwu unu debere? Ka ọ bụ nꞌihi na unu nụrụ ma kwerekwa ozi ọma ahụ?


GALETIA 3:14
Ugbu a Chineke nwere ike iji ngọzi ahụ o kwere Eberaham na nkwa gọziekwa ndị mba ọzọ. Anyị nile kwa, dị ka ndị Kraịst, nwere ike isite nꞌokwukwe anyị nwere nꞌime ya nata Mmụọ Nsọ ahụ e kwere na nkwa.


GALETIA 3:19
Gịnị mere Chineke ji nye mmadụ iwu? Chineke nyere iwu ndị a igosi na mmehie dị, na mmehie bara ụba. Ma e mere ka iwu ndị a dịgide nanị tutuu ruo mgbe Mkpụrụ ahụ bịara, onye bụ nwa Eberaham ahụ nkwa Chineke dịịrị. Mgbe Chineke nyere iwu ya o sitere nꞌaka mmụọ ozi ya nye iwu ahụ. Ọ bụkwa mmadụ natara iwu ahụ nyeruo ya ụmụ Izirel.


GALETIA 3:20
Ebe ọ bụ na o nwere onye natara iwu a nyeruo ya ndị kwesịrị ịnata ya, o gosiri na nke a abụghị mmezu nkwa ahụ. Nꞌihi na ọ dịghị mkpa na a ga-enwe mmụọ ozi ma ọ bụ onye nnyeru ọzọ dị iche, ndị ga-agba ama banyere mmezu Chineke mezuru nkwa o kwere. Nꞌihi na mmezu nkwa ahụ dịịrị, ma daberekwa nanị na Chineke.


GALETIA 4:6
Ebe ọ bụ na anyị bụ ụmụ ya, Chineke zitere Mmụọ Nsọ ya, ka ọ bịa biri nꞌobi anyị, inyere anyị aka, ikpere Chineke Nna anyị ekpere nꞌụzọ ziri ezi.


GALETIA 4:14
Ma ọ bụ ezie na m nọ nꞌọrịa nꞌoge ahụ, unu eledaghị m anya, ma ọ bụ jụ ige m ntị, nꞌihi ahụ ọjọọ m nke gaara abụrụ unu ihe ọnwụnwa iji jụ m. Kama unu nabatara m, dị ka a ga-asị na m bụ mmụọ ozi Chineke zitere, ma ọ bụ dị ka a ga-asị na m bụ Jisọs Kraịst nꞌonwe ya.


GALETIA 4:15
Èbee ka mmụọ nke obi ụtọ ahụ unu nwere dị, nke anyị nile ji nọkọọ nꞌoge ahụ? Nꞌihi na unu maara nꞌoge ahụ, na a sị na ọ bụ ihe a pụrụ ime, unu gaara aghụpụta anya unu, tinye ya nꞌọnọdụ anya nke m, iji nyere m aka.


GALETIA 4:19
Ezi ụmụ m, lee ka omume unu si ewute mmụọ m. Lee ka m si nọdụkwa nꞌọnọdụ ihe mgbu, na-eche ụbọchị ahụ a ga-eme ka unu zuo oke nꞌime Kraịst, dị ka nwanyị nọ nꞌihe mgbu si eche ọmụmụ nwa ọhụrụ ya.


GALETIA 4:29
Nꞌihi nke a, anyị ndị e sitere na Mmụọ Nsọ mụọ ka ndị chọrọ ka anyị soro ha na-edebe iwu na-emegbu, na-esogbukwa, dị ka Ishmel nwa Hega, nwanyị ohu, si megbuo, ma sogbuokwa Aịzik.


GALETIA 5:5
Ma anyị onwe anyị na-esite nꞌinyeaka nke Mmụọ Nsọ na-enwe olileanya na ọnwụ Kraịst nwụrụ asachapụla mmehie anyị, ime ka anyị na Chineke dịrị na mma.


GALETIA 5:16
Nke a bụ ndụmọdụ m na-enye unu. Kweenụ ka Mmụọ Nsọ na-achị ndụ unu, ịgwa unu ihe unu ga-eme, ma ọ bụ ebe unu ga-aga. Nke a ga-eme ka unu hapụ imezu ihe ọjọọ ndị ahụ anụ ahụ ochie unu chọrọ ka unu mee.


GALETIA 5:17
Nꞌihi na ihe anụ ahụ ochie anyị chọrọ bụ ime nanị ihe ọjọọ ahụ megidere ihe Mmụọ Nsọ chọrọ ka anyị mee. Ihe ọma ọ bụla anyị na-eme mgbe Mmụọ Nsọ na-achị ndụ anyị abụghị ihe ndụ anyị chọrọ. Ọchịchọ nke ndụ anyị na ọchịchọ nke Mmụọ Nsọ anaghị adakọta. Nke a mere o ji bụrụ na ịgba mgba na-adị mgbe nile nꞌuche anyị, mgbe anyị chọrọ ime ihe ọ bụla, nꞌihi na ọchịchọ nke Mmụọ Nsọ na ọchịchọ nke anụ ahụ anyị na-agbalị ịchị mkpebi anyị banyere ihe ọ bụla anyị chọrọ ime.


GALETIA 5:18
Ma ọ bụrụ na Mmụọ Nsọ na-edu unu, unu anọkwaghị nꞌokpuru iwu.


GALETIA 5:22
Ma mgbe Mmụọ Nsọ na-achị achị na ndụ anyị, ụdị ndụ a ga-apụta ìhè nꞌime anyị: ndụ ịhụnanya, na ọṅụ, na udo, na ogologo ntachi obi, na obi ọma, na ịdị mma, na ikwesị ntụkwasị obi, na


GALETIA 5:25
Ọ bụrụkwa na anyị na-adị ndụ site nꞌike Mmụọ Nsọ, ka anyị soro nduzi na ntụzi Mmụọ Nsọ nꞌakụku nile nke ndụ anyị.


GALETIA 6:1
Ụmụnna m, asị na nwa Chineke ọ bụla adaba na mmehie, unu onwe unu bụ ndị Mmụọ Nsọ na-achị kwesịrị iji mmụọ nke ịdị nwayọọ na obi dị umeala nyere onye ahụ aka, ime ka ọ gazie nꞌezi ụzọ. Nꞌihi na ònye ma ihe ga-eme echi? Ònye ma onye ọ bụ nꞌetiti unu nke ga-adaba na mmehie echi?


GALETIA 6:8
Onye ọ bụla na-agha mkpụrụ nke imejupụta ọchịchọ anụ ahụ ya, ga-esitekwa nꞌanụ ahụ ahụ webata ọnwụ dị ka ihe ubi, ma onye ọ bụla na-agha mkpụrụ nke imejupụta ọchịchọ Mmụọ Nsọ, ga-esite na Mmụọ Nsọ weta ndụ ebighị ebi dị ka ihe ubi.


EFESỌS 1:13
Nꞌihi na otu a ka ọ dịkwa unu onwe unu. Unu kweere nꞌozi ọma ahụ na-eweta nzọpụta mgbe unu nụrụ ya. Mgbe unu kwekwara, Chineke nyere unu Mmụọ Nsọ ya ka o biri nꞌime unu dị ka akara a kakwasịrị unu igosi na unu bụ ndị nke ya.


EFESỌS 1:14
Mmụọ Nsọ nọkwa ọnọdụ dị ka ihe akaebe igosi na anyị ga-anata ihe nile Chineke kwere nkwa inye ndị ya. Mmụọ Nsọ a bụkwa ihe ga-eme ka anyị nwee obi siri ike na Chineke ga-arụzu ọrụ mgbapụta nke ndị ahụ nile bụ nke ya. Ya mere, ka anyị too ebube Chineke.


EFESỌS 1:17
na-arịọ Chineke nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst bụ Nna Onyenwe ebube nile, ka o nye unu mmụọ amamihe ka unu nwee ike ịhụ na ịghọtakwa nke ọma onye ọ bụ.


EFESỌS 2:1
Na mgbe ochie, unu bụ ndị nwụrụ anwụ nꞌime mmụọ unu nꞌihi na ndụ unu jupụtara na mmehie na nnupụ isi. Ma Chineke emeela ka mmụọ unu dịkwa ndụ ọzọ.


EFESỌS 2:2
Nꞌihi na unu bụ ndị biri na mmehie na mgbe ochie, na-agbaso ụzọ ọjọọ nile nke ụwa. Unu na-erubekwara ekwensu isi, onye na-achị mmụọ ọjọọ nile bi nꞌikuku, onye ya onwe ya bụ onye anya na-adịghị ahụ. Ọ bụkwa ekwensu na-achị ndị nile na-adịghị erubere Chineke isi.


EFESỌS 2:5
Nꞌihi na mgbe mmụọ anyị nwụrụ anwụ nꞌime mmehie, Chineke nyekwara anyị ndụ ọzọ mgbe o mere ka Kraịst site nꞌọnwụ dịrị ndụ. Nꞌihi na ọ bụ site nꞌamara Chineke ka e jiri zọpụta anyị.


EFESỌS 2:18
Nꞌihi na ọ bụ site na Kraịst ka anyị nile, ndị Juu na ndị mba ọzọ, nwere ike ịbịa nꞌihu Chineke site nꞌotu Mmụọ ahụ.


EFESỌS 2:22
Ọ bụkwa nꞌime Kraịst ka a na-ewusi unu ike dị ka e si ewusi ndị ọzọ ike, ka unu nile bụrụ ebe obibi nke Chineke site na Mmụọ Nsọ.


EFESỌS 3:5
Nꞌoge gara aga o nweghị onye ọ bụla a gwara banyere ihe omimi a. Ma ugbu a Chineke ekpugheela ya nye ndị ozi ya dị nsọ na ndị amụma ya site nꞌike nke Mmụọ Nsọ.


EFESỌS 3:10
Gịnị mere Chineke jiri zube ime ihe ndị a? Ọ bụ nꞌihi na ọ chọrọ ka ndị mmụọ ozi nọ nꞌeluigwe mata ịba ụba nke amamihe ya nꞌụzọ dị iche iche dị ka o si na-arụpụta nzube ya nꞌime nzukọ Kraịst bụ chọọchị.


EFESỌS 3:16
Ana m arịọkwa Chineke ka o site nꞌịba ụba nke ebube ya nye unu ike na-esite na Mmụọ Nsọ ya bịa, ka unu bụrụ ndị dị ike nꞌime mmụọ unu.


EFESỌS 4:3
Nọọnụ nꞌudo nꞌetiti onwe unu gbalịakwanụ ime ka ịdị nꞌotu unu dịgide nꞌime Mmụọ Nsọ.


EFESỌS 4:4
Ọ bụ nanị otu anụ ahụ Kraịst dị, otu Mmụọ Nsọ dịkwa. Anyị nwekwara nanị otu olileanya nke Chineke debere nꞌihu anyị.


EFESỌS 4:15
Kama ka anyị gbasoo eziokwu site na mmụọ ịhụnanya, ka anyị gwarịtaa ibe anyị eziokwu mesokwaa ha mmeso eziokwu, gbalịsiekwa ike ịghọ Kraịst onye bụ onyeisi nzukọ ya bụ chọọchị.


EFESỌS 4:30
Unu emela ka obi jọọ Mmụọ Nsọ bi nꞌime unu njọ. Nꞌihi na Mmụọ Nsọ bụ akara Chineke kwakwasịrị unu igosi na unu bụ nke ya. Ọ nọ dị ka ihe akaebe nke na-egosi na otu ụbọchị na-abịa mgbe Chineke ga-eme ka unu nwere onwe unu.


EFESỌS 5:18
Unu aṅụbigala mmanya oke nke ga-emerụ unu. Kama jupụtanụ na Mmụọ Nsọ.


EFESỌS 6:12
Nꞌihi na ndị na-alụso anyị ọgụ abụghị ndị mmadụ efu. Kama ha bụ ndị na-enweghị anụ ahụ na ọbara, ha bụ ụsụ mmụọ ọjọọ nọ nꞌebe nile dị elu nke eluigwe, ndị na-achị achị, ndị isi ha nile, na ụsụ mmụọ ọjọọ dị ike nke ụwa ọchịchịrị a.


EFESỌS 6:17
Nabatanụ nzọpụta dị ka okpu igwe, werekwanụ okwu Chineke dị ka mma agha nke Mmụọ Nsọ na-enye unu.


EFESỌS 6:18
Kpeenụ ekpere mgbe nile. Rịọnụ Chineke ihe ọ bụla mgbe ọ bụla Mmụọ Nsọ kwaliri unu ikpe ekpere. Rosiekwanụya arịrịọ ike, na-echetara ya mkpa unu, na-ekpekwa ekpere nꞌihi ndị kwere ekwe nọ nꞌebe nile.


FILIPAI 1:6
Ya mere, amaara m nꞌezie na Chineke ahụ wuliri mmụọ unu ime ka unu malite ọrụ ọma dị otu a, ga-aga nꞌihu inyere unu aka ito eto nꞌime amara ya, tutuu ruo mgbe ọ ga-arụzu ọrụ a ọ malitere ịrụ nꞌime unu, ruo ụbọchị ahụ Onyenwe anyị Jisọs Kraịst ga-alọghachi dị ka o kwere na nkwa.


FILIPAI 1:8
Chineke pụrụ ịgbara m ezi ama, otu m si hụ unu nꞌanya, na otu ihe gbasara unu si na-emetụ mmụọ m, site nꞌụdị obi ebere Jisọs dị nꞌime m.


FILIPAI 1:19
Nꞌihi nke a, amaara m na site nꞌekpere unu, ya na ịgba ume nke Mmụọ Nsọ, ihe ndị a nile dakwasịrị m ga-emesị ghọọrọ m ihe ọma.


FILIPAI 2:1
Ugbu a, ọ bụrụ na e nwere nkasiobi ọ bụla dịrị anyị nꞌihi njikọta e jikọtara anyị na Kraịst, ọ bụrụkwa na e nwere ihe dị ka inyeaka nke si nꞌịhụnanya na-abịa, ọ bụrụkwa na ọ dị nnwekọ ọ bụla anyị na-enwekọ nꞌime Mmụọ Nsọ, ọ bụrụ na unu nwere obi ebere, jikerekwa ime ebere,


FILIPAI 2:2
meenụ ka m ṅụrịa ọṅụ nke ukwuu, site nꞌibi obi nke ịhụrịta onwe unu nꞌanya, site nꞌinwe nkwekọta nꞌihe ọ bụla, sitekwa nꞌiji otu obi, otu nzube, na otu mmụọ na-arụkọta ọrụ unu.


FILIPAI 3:3
Nꞌihi na obibi ugwu nke elu ahụ abụghị ihe dị mkpa ime anyị ụmụ Chineke. Kama ọ bụ iji mmụọ anyị na-efe Chineke. Nke a bụkwa ihe bụ ezigbo obibi ugwu. Anyị bụ ndị Kraịst na-anya isi nꞌihe ahụ Kraịst Jisọs meere anyị, anyị ghọtakwara na anyị enweghị ike ọ bụla ịzọpụta onwe anyị.


FILIPAI 4:23
Ka amara Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịnyere mmụọ unu.


KỌLỌSI 1:8
Ọ bụ ya gwara anyị ihe banyere ịhụnanya Mmụọ Nsọ nyere unu.


KỌLỌSI 1:9
Nꞌihi nke a site nꞌụbọchị anyị nụrụ ihe banyere unu, anyị esepụghị aka ikpere unu ekpere. Anyị na-ekpe ekpere na-arịọ Chineke ka o nyere unu aka ịghọta ihe ọ chọrọ ka unu mee. Anyị na-arịọkwa ya ka o nye unu amamihe nke ga-enyere unu aka ịmata ihe nke mmụọ.


KỌLỌSI 1:16
Nꞌezie, ọ bụ site nꞌaka Kraịst ka e ji kee ihe nile dị nꞌụwa na nke dị nꞌeluigwe, ndị anyị pụrụ ịhụ anya na ndị anyị na-apụghị ịhụ anya. Ike nile dị iche iche, ma ike nile nke mmụọ dị iche iche, ya na ndị isi ha nile, na alaeze ha, ma ndị na-achị achị nꞌetiti ha, ma ndị na-atụ ihe ga-eme eme. Kraịst kere ihe nile. O kere ha iji ha ịrụ ọrụ dị ka o si dị ya mma, na isite na ha wetara onwe ya otuto.


KỌLỌSI 2:5
Nꞌihi na ọ bụ ezie na anọghị m unu nso, ma anọ m nꞌetiti unu nꞌime mmụọ oge nile. Ọ na-atọ m ụtọ nke ukwuu na unu guzosiri ike nꞌokwukwe unu nꞌime Kraịst.


KỌLỌSI 2:11
Mgbe unu bịakwutere Kraịst o mere ka unu nwere onwe unu site nꞌike ọchịchọ ọjọọ nke anụ ahụ jupụtara na mmehie. O meghị ka unu nwere onwe unu site nꞌibi unu ugwu nke elu ahụ, kama o mere ya site nꞌobibi ugwu nke ime mmụọ, ime mkpụrụ obi unu baptizim.


KỌLỌSI 2:13
Mgbe ahụ, unu bụ ndị nwụrụ anwụ nꞌime mmụọ unu nꞌihi mmehie, mgbe ahụ kwa, unu bụ ndị mba ọzọ, ndị na-enweghị iwu na-achị ndụ ha, ma Chineke mere ka unu soro Kraịst keta ndụ ọhụrụ, nꞌihi na ọ gbaghaara unu mmehie unu nile.


KỌLỌSI 2:18
Ekwela ka onye ọ bụla gụọ gị dị ka onye furu efu nꞌihi na i kweghị iso ya fee ndị mmụọ ozi, dị ka ha si kwuo. Ha pụrụ ikwu na ha hụrụ ọhụ, gwa unu na unu kwesịrị ịhụ ụdị ihe ha hụrụ. Ndị dị otu a na-afụli onwe ha elu nꞌefu, nꞌihi ụdị echiche mmadụ a ha na-eche.


KỌLỌSI 3:16
Kwerenụ ka okwu Kraịst nwee ọnọdụ nꞌime unu, ime unu ndị bara ụba nꞌamamihe. Zikwanụ ndị ọzọ okwu amamihe a. Na-abụnụ abụ ọma na abụ na-ebuli mmụọ elu. Na-abụkunụ Onyenwe anyị abụ ndị a site nꞌobi jupụtara nꞌekele.


1 TESALỌNAIKA 1:5
Nꞌihi na mgbe anyị wetaara unu ozi ọma, unu eweghị ya dị ka okwu na-erijughị afọ, kama unu gere nnọọ ntị nke ọma. Okwu nile anyị gwara unu metụkwara mmụọ unu, nꞌihi na Mmụọ Nsọ mere ka unu ghọta nꞌezie na ihe anyị kwuru bụ eziokwu. Unu matakwara otu ndụ anyị si bụrụ ihe ilere anya nye unu, igosi unu na okwu anyị ji bịa bụ eziokwu.


1 TESALỌNAIKA 1:6
Nke a mere unu ji bụrụ ndị na-eso ụzọ anyị na ndị na-eso ụzọ Onyenwe anyị. Nꞌihi na unu jiri ọṅụ Mmụọ Nsọ na-enye nabata ozi ọma anyị, na-ajụghị ajụjụ banyere ọnwụnwa na obi ọjọọ o wetaara unu.


1 TESALỌNAIKA 2:17
Otu ọ dị, ụmụnna anyị, mgbe anyị si nꞌetiti unu pụọ nọọ nwa oge nta, ọ bụ ezie na anyị na unu nọkwa nꞌime mmụọ,


1 TESALỌNAIKA 4:7
Nꞌihi na ọkpụkpọ Chineke kpọrọ anyị abụghị ka anyị na-ebi ndụ adịghị ọcha na ndụ ọchịchọ ọjọọ, kama ọ chọrọ ka anyị dịrị ọcha. Nꞌihi nke a, ọ bụrụ na onye ọ bụla ajụ ibi ndụ ya dị ka anyị kwuru, ọ bụghị iwu mmadụ ka ọ na-eleda anya, kama ọ bụ iwu Chineke onye nyere anyị Mmụọ Nsọ ya.


1 TESALỌNAIKA 4:16
Nꞌihi na Onyenwe anyị nꞌonwe ya ga-esi nꞌeluigwe rịdata. Mgbe ọ na-arịdata ọ ga-eji olu dị ike kpọọ oku. Ee, ọ ga-eji ube akwa nke ndị isi mmụọ ozi tie mkpu, ọ ga-afụkwa opi ike Chineke. Mgbe ahụ ndị Kraịst nile dara nꞌụra ọnwụ ga-eburu ụzọ si nꞌọnwụ bilite.


1 TESALỌNAIKA 5:19
Unu abịanyụla Mmụọ Nsọ dị nꞌime unu.


1 TESALỌNAIKA 5:23
Ka Chineke nꞌonwe ya, onye bụ isi udo, mee ka unu dị nsọ nꞌihe nile. Ka Onyenwe anyị debezuo mmụọ unu na mkpụrụ obi unu na anụ ahụ unu nsọ, na-enweghị ntụpọ ọ bụla ruo ụbọchị ọbịbịa Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.


2 TESALỌNAIKA 1:7
Ya mere, anyị na-agwa unu, ndị so anyị na-ahụ ahụhụ, na Chineke ga-anapụta unu, nye unu izuike, mgbe Onyenwe anyị Jisọs ga-apụta ìhè na mbara eluigwe, ya na ndị mmụọ ozi ya.


2 TESALỌNAIKA 1:8
Ọ ga-ata ndị ahụ na-amaghị Chineke ahụhụ ebighị ebi nꞌọkụ ala mmụọ. Ee, ọ ga-ata ndị ahụ ahụhụ, bụ ndị jụrụ ịnabata ụzọ nzọpụta ya nke o mere ka ọ pụta ìhè nꞌime Jisọs Kraịst.


2 TESALỌNAIKA 1:9
A ga-etinye ndị a nꞌime ọkụ ala mmụọ, ebe ha na-agaghị ahụ ihu Onyenwe anyị na ebube nke ike ya ruo mgbe ebighị ebi,


2 TESALỌNAIKA 2:10
Nꞌezie, ọ ga-eduhie ndị ahụ nile na-aga nꞌọkụ ala mmụọ, ndị ahụ jụrụ ikwenye eziokwu ahụ. Nꞌihi na ha jụrụ ịnabatara onwe ha eziokwu ahụ, jụ ikwere na ya, na ịhụ ya nꞌanya ka ọ zọpụta ha.


2 TESALỌNAIKA 2:13
Ma ụmụnna anyị, ndị Chineke anyị hụrụ nꞌanya, ọ bụ ọrụ anyị ikele Chineke ekele mgbe nile nꞌihi na o buru ụzọ họpụta anyị maka ịzọpụta anyị na ịsacha anyị site nꞌọrụ Mmụọ Nsọ rụrụ, na site nꞌokwukwe anyị nwere nꞌeziokwu ahụ.


1 TIMỌTI 1:2
Timoti ezi nwa m dị ka okwukwe anyị nwere nꞌime Onyenwe anyị si dị. Ka Chineke Nna na Kraịst Onyenwe anyị gosi gị obi ọma ya. Ya meekwara gị ebere, nyekwa gị udo nke obi na nke mmụọ.


1 TIMỌTI 3:16
Ọ bụ eziokwu na ọ dịghị mfe mmadụ ibi ndụ dị nsọ. Ma ụzọ e si ebi ndụ dị nsọ ahụ bụ site na Kraịst, onye ahụ bịara nꞌụwa dị ka mmadụ, onye e gosiri na o nweghị mmehie ọ bụla, na o nwere Mmụọ zuru oke, onye ndị mmụọ ozi hụkwara ma jeere ozi, onye e kwusara ihe banyere ya nꞌetiti mba nile. Onye ndị mmadụ kweere na ya, nabatakwa nꞌebe nile, na onye a nabanyere nꞌeluigwe ebe ọ nọ ugbu a nꞌebube ya.


1 TIMỌTI 4:1
Ma Mmụọ Nsọ agwagheela anyị ọnụ sị, na nꞌoge ikpeazụ ụfọdụ mmadụ nꞌime chọọchị ga-esite na Kraịst wezụga onwe ha, bụrụ ndị naagbaso ndị ozizi na-ezi ihe mmụọ ọjọọ na-etinye ha nꞌuche.


1 TIMỌTI 4:8
Igwuri egwu nke anụ ahụ dị mma, kama iji oge gị mee ihe ahụ na-ewuli mmụọ elu bara uru karịa nꞌụzọ nile. Ya mere, gbalịa ịzụ mmụọ gị, na-agbalịkwa ime onwe gị ezi onye nke Kraịst nꞌihi na nke a bụ ihe ga-enyere gị aka ugbu a nꞌime ndụ a, ma nꞌime ndụ nke na-abịa nꞌihu.


1 TIMỌTI 4:14
Elelịla onyinye ime mmụọ nke i nwere anya, bụ nke e nyere gị site nꞌibu amụma nke pụtara ìhè mgbe ndị okenye chọọchị bikwasịrị gị aka nꞌisi.


1 TIMỌTI 5:21
Ana m enye gị iwu a nꞌihu Chineke na nꞌihu Onyenwe anyị Jisọs Kraịst na nꞌihu ndị mmụọ ozi dị nsọ ka i nye okenye ọ bụla mehiere ntaramahụhụ kwesịrị mmehie ya, ma okenye ahụ ọ bụ enyị gị ma ọ bụghị, elekwala onye ọ bụla anya nꞌihu.


1 TIMỌTI 6:9
Ma ndị na-achọ inwebiga akụ nke ụwa oke ọsịịsọ, na-eme ihe ọjọọ dị iche iche, ka ha hụ na ha nwetara ego. Ha na-eme ihe na-ewetara ha nsogbu na ihe na-eme ka ha na-enwe uche ọjọọ, nke na-emesịa duba ha nꞌọkụ ala mmụọ.


2 TIMỌTI 1:7
Nꞌihi na Chineke enyeghị anyị mmụọ ịtụ ụjọ, kama o nyere anyị Mmụọ na-emejupụta anyị nꞌike, na ịhụnanya, na uche zuru oke.


2 TIMỌTI 1:8
Ọ bụrụ na ị na-akwali ike nke ime mmụọ ahụ i nwere, ụjọ agaghị atụ gị ịgwa ndị ọzọ okwu banyere Onyenwe anyị, ma ọ bụ ime ka ha mata na m bụ enyi gị. Ọ bụ ezie na m nọ nꞌụlọ mkpọrọ nꞌihi aha Kraịst. Ị ga-ejikerekwa isoro m hụọ ahụhụ nꞌihi Kraịst, nꞌihi na ọ ga-agba gị ume nꞌime ahụhụ.


2 TIMỌTI 1:14
Chezie onyinye ọma ahụ Chineke sitere nꞌaka Mmụọ Nsọ nke bi nꞌime gị nye gị idebe.


2 TIMỌTI 1:16
Ka Onyenwe anyị gọzie ezinụlọ Onisiferọs. Nꞌihi na ọ bịara leta m, gbaa m ume ọtụtụ mgbe. Ọbịbịa ya kpọtere mmụọ m. Ihere emekwaghị ya ịbịakwute m nꞌụlọ mkpọrọ.


2 TIMỌTI 4:22
Ka onyenwe anyị Jisọs Kraịst nọnyere mmụọ gị. Ka amara Chineke dinyere gị. Nọọ nke ọma.


TAITỌS 3:5
ọ zọpụtara anyị. Ma ọ zọpụtaghị anyị nꞌihi ọrụ ọma anyị rụrụ, kama ọ zọpụtara anyị nanị site nꞌobi ebere ya na ọmiko ya. Ọ sachapụrụ mmehie anyị, nyekwa anyị ọṅụ ọhụrụ nke ya na Mmụọ Nsọ bi nꞌime anyị so.


TAITỌS 3:6
O sitere nꞌịba ụba nke ebere ya wụkwasị anyị Mmụọ Nsọ ya nꞌihi ihe ahụ nile Jisọs Kraịst Onye nzọpụta anyị mere.


FAILIMON 1:25
Ka amara Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịnyere mmụọ unu.


HIBRU 1:4
Jisọs dị ukwuu karịa ndị mmụọ ozi. Aha ya bụ Ọkpara Chineke gosiri nke a. Ọ bụ Nna ya nyere ya aha a. Aha ahụ dịkwa ukwuu karịa aha ma ọ bụ ọkwa nile nke ndị mmụọ ozi.


HIBRU 1:5
O nweghị oge Chineke jiri gwa mmụọ ozi ọ bụla okwu sị “Ị bụ Ọkpara m, taa enyela m gị ugwu na nsọpụrụ nke ya na aha ahụ so.” Ma Chineke kwuru okwu dị otu a banyere Jisọs. Nꞌoge ọzọ kwa Chineke kwuru sị, “Abụ m Nna ya, Nwa m ka Jisọs bụkwa.”


HIBRU 1:6
Ọzọ kwa, mgbe Ọkpara ya bụ Jisọs, onye ọ mụrụ nanị ya bịara nꞌụwa, Chineke nyere iwu sị “Ka ndị mmụọ ozi nile fee ya ofufe.”


HIBRU 1:7
Mgbe Chineke kwuru okwu banyere ndị mmụọ ozi ya, ọ sịrị na ha bụ ndị na-eje ozi. Ha dị ka ikuku na-efesi ike. Ha na-agakwa ozi ha nile dị ka ọkụ na-enwusi ike.


HIBRU 1:13
Ò nweela oge Chineke gwara ndị mmụọ ozi okwu, dị ka o siri gwa Ọkpara ya sị “Nọdụ nꞌebe a nꞌakụkụ m, nꞌugwu na nsọpụrụ, tutuu ruo mgbe m ga-egwepịa ndị iro gị nile nꞌokpuru ụkwụ gị?”


HIBRU 1:14
E, è! O nweghị mmụọ ozi ọ bụla Chineke gwara okwu dị otu a! Nꞌihi na ndị mmụọ ozi ya bụ nanị mmụọ na-eje ozi. Ha bụ ndị a na-ezipụ ka ha nye aka. Ha na-elekọtakwa ndị ahụ ga-anata nzọpụta Chineke.


HIBRU 2:2
Iwu ahụ ndị mmụọ ozi nyere Mosisi bụ ezi iwu. Onye ọ bụla nupụrụ isi nꞌiwu ahụ, natara ahụhụ nꞌihi nnupụ isi ya. Egeghị ntị ọ bụla natakwara ntaramahụhụ dị ka o si kwesị.


HIBRU 2:4
Chineke nꞌonwe ya tụkwasịrị akaebe nke ya iji kwagide na okwu ndị a bụ ezie, site nꞌịrụ ọrụ ebube na ọrụ ịrịba ama, na ọrụ ịtụnanya dị iche iche. Chineke kesakwara ọtụtụ onyinye Mmụọ Nsọ, dị ka o siri dị ya mma.


HIBRU 2:5
Ọ dịghị mgbe Chineke nyere ndị mmụọ ozi ike ịchị elu ụwa a. Anyị na-ekwu karịsịa ihe banyere ụwa gaje ịbịa abịa.


HIBRU 2:7
Nꞌihi na ọ bụ ezie na nwa ntịntị oge i mere mmadụ ka ọ dị ala karịa ndị mmụọ ozi. Ma ugbu a i werela ịma mma kpube ya nꞌisi dị ka okpueze. I werekwala ihe nile mee ha ka ha bụrụ ebe mgbakwasị ụkwụ ya.”


HIBRU 2:9
Ma anyị na-ahụ Jisọs, onye e mere ka ọ dị ala nanị otu mgbe. Onye e mere ka ndị mmụọ ozi dị elu karịa ya, ka ọ hụọ ahụhụ nwụọkwa nꞌihi mmadụ nile. Nꞌihi ọnwụ ọ nwụrụ, Chineke ewerela nsọpụrụ kpube ya nꞌisi dị ka okpueze.


HIBRU 2:16
Jisọs abịaghị ịzọpụta ndị mmụọ ozi. Kama ọ bịara inyere ụmụ ụmụ Eberaham aka.


HIBRU 3:7
Mmụọ Nsọ Chineke enyela anyị okwu ndụmọdụ nke na-asị, “Ọ bụrụ na unu anụ olu Chineke taa,


HIBRU 4:12
Nꞌihi na okwu Chineke dị ndụ dịkwa nkọ. Ọ dị nkọ karịa mma ihu abụọ ọ bụla. Ọ na-adụba ruo nꞌebe mkpụrụ obi na mmụọ kewara onwe ha, na ruo nꞌebe nkwonkwo na ụmị kewakwara onwe ha. Ọ na-enyocha gbaa nꞌanwụ ọchịchọ na echiche obi ndị mmadụ.


HIBRU 5:11
Ọ dị ọtụtụ ihe ọzọ m nwere ikwu banyere Kraịst na otu o siri bụrụ onye nchụaja. Ma ọ rara ahụ ịkọwa ya nꞌụzọ unu ga-aghọta ya. Ọ dị ka ịghọta eziokwu nke ime mmụọ adịghị ekwe unu.


HIBRU 6:2
Ọ dịghị mkpa na a ga-akụziri unu ihe banyere ime baptizim, onyinye nke Mmụọ Nsọ, mbilite nꞌọnwụ na ikpe ebighị ebi.


HIBRU 6:4
Ọ bụ ihe rara ahụ ime, ka ụfọdụ laghachikwute Chineke, ma ọ bụrụ na ha aghọtala ozi ọma ahụ, detụkwa onyinye ahụ si nꞌigwe ire. Ọ bụrụ na ndị a eketakwala oke nꞌime Mmụọ Nsọ.


HIBRU 8:10
Ma otu a ka ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ ga-esi dịrị nꞌetiti mụ onwe m na ụmụ Izirel. Aga m etinye iwu m nile nꞌime mmụọ ha ka ha nwee ike ịmata ihe m chọrọ ka ha mee. Aga m edekwa iwu m nile nꞌime obi ha ka ha hapụ ichefu iwu m nile. Aga m akpọbata ha dị ka ụmụ nke m. Mụ onwe m ga-abụ Chineke ha.


HIBRU 9:5
Nꞌime ọnụ ụlọ nke abụọ ahụ, ọ bụrụ na e lee anya nꞌelu igbe ọgbụgba ndụ ahụ, a ga-ahụ ndị mmụọ ozi a kpụrụ akpụ. Ha nwere nku dị ka nnụnụ. Aha ha bụ Cherubim. Ha bụ ndị na-echekwa otuto Chineke. Ma anyị enweghị ike ịkọwacha ihe nile ndị a.


HIBRU 9:8
Mmụọ Nsọ jiri ihe ndị a nile na-ezi anyị na nꞌime ọnọdụ ọchụchụ aja ochie, mmadụ efu ọ bụla enweghị ike ịba nꞌebe nsọ kachasị ebe nsọ ahụ nꞌihi na ọnụ ụlọ nke mbụ ahụ a na-akpọ ebe nsọ dị ya.


HIBRU 9:14
ọbara Kraịst ọ̀ pụghị ime ka anyị dị ọcha karịa? Nꞌezie ọbara ya zubigara oke ịsachpụ mmehie anyị nile, nꞌihi na Kraịst sitere na Mmụọ nke na-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi were onwe ya nye na-enweghị ntụpọ. Ọbara ya zubigara oke ịsacha obi anyị na ime anyị ka anyị dị ọcha site nꞌajọ ọrụ nile, bụ ọrụ nke na-eweta ọnwụ. Aja o jiri onwe ya chụọ, mere ka anyị nwere onwe anyị, ka anyị nwee ike ife Chineke onye dị ndụ.


HIBRU 10:15
Mmụọ Nsọ na-agbakwara anyị ama na nke a bụ eziokwu nꞌihi na o kwuru sị,


HIBRU 10:16
“Nke a bụ ọgbụgba ndụ mụ na ụmụ Izirel ga-agba mgbe ụbọchị ndị ahụ gasịrị, ka Onyenwe anyị kwuru. Aga m eme ka ha mara iwu nꞌime obi ha. Aga m ede ha nꞌime mmụọ ha. Ha ga na-echeta ha nꞌechiche ha nile.


HIBRU 10:29
Ọ bụrụ na o si otu a dịrị nꞌoge Mosisi, gịnị ga-abụ ọnọdụ onye lelịrị Ọkpara Chineke? Gịnị ga-abụ ikpe dịrị ndị na-eme ọbara ọgbụgba ndụ ahụ ka ọ bụrụ ihe ọchị na ihe na-adịghị ọcha? Gịnị ga-abụ ikpe dịrị ndị na-eme Mmụọ nke amara ihe ihere? Ọ bụ ihe doro anya na ndị na-eme ihe dị otu a ga-enwe ịta ahụhụ dị egwu nꞌoge na-abịa abịa.


HIBRU 11:28
O sitekwara nꞌokwukwe debe mmemme ngabiga. O fesara ọbara ka mmụọ ozi ahụ Chineke zipụrụ igbu ụmụ ndị Ijipti nile e buru ụzọ mmụọ, hapụ imetụ ụmụ ndị Izirel aka.


HIBRU 12:9
Dị ka ịma atụ, ndị bụ nna anyị site nꞌanụ ahụ na-apịa anyị ụtarị mgbe ọ bụla anyị nupụrụ isi. Ma nke a adịghị egbochi anyị ịsọpụrụ ha. O kwesịkwaghị ka anyị rubere Chineke bụ Nna mmụọ anyị isi? Anyị mee nke a, ihe ga-agara anyị nke ọma.


HIBRU 12:22
Ma unu abịakwutela Kraịst! Ọ dị ka unu guzo na-ele ugwu Zayọn anya. Unu abịala nꞌobodo Chineke dị ndụ. Unu abịala nꞌobodo ahụ a na-akpọ Jerusalem ọhụrụ. Nꞌebe a igwe ndị mmụọ ozi a na-apụghị ịgụta agụta zukọrọ.


HIBRU 13:2
Unu echefula ịnabata ndị ọbịa, nꞌihi na ụfọdụ ndị mere nke a lekọtara ndị mmụọ ozi ma ha amataghị na ọ bụ ndị mmụọ ozi ka ha lekọtara.


JEMES 1:6
Ma mgbe ọ rịọrọ arịrịọ ahụ, ya site na mmụọ nke na-enweghị obi abụọ, mmụọ nke nwere ntụkwasị obi na Chineke ga-eme ihe ọ rịọrọ ya ka o mee. Nꞌihi na onye sitere nꞌobi abụọ rịọ Chineke ihe ọ bụla dị ka mpempe akwụkwọ nke ikuku naebugharị.


JEMES 2:19
Amaara m na i kweere na ọ bụ nanị otu Chineke dị. Nke a bụ ezi ihe. Chetakwa na ọ bụladị ndị mmụọ ọjọọ kweere na ọ bụ nanị otu Chineke dịkwa. Ọ bụ nke a na-eme ha ji atụ egwu, na-amakwa jijiji.


JEMES 2:26
Ya mere, dị ka o siri bụrụ ihe rara ahụ na a pụrụ ịhụ mmadụ dị ndụ nke na-enweghị mmụọ, otu a kwa, okwukwe nke na-adịghị egosi onwe ya site nꞌọrụ ọma, bụ ihe nwụrụ anwụ.


JEMES 3:6
Ire anyị dị ka ọkụ. A tulee ya na akụkụ ọzọ dị nꞌahụ anyị, ọ dị ka nsi. Ọ pụrụ ịmerụ na imebi ndụ anyị nile dị ka otu icheku ọkụ pụrụ isi repịa ụlọ. Ọ bụkwa ọkụ na-esite nꞌọkụ ala mmụọ abịa ka e ji amụnye ire anyị ọkụ ime ka okwu na-esite nꞌire anyị pụta bụrụ ihe na-ebute mmebi na ịla nꞌiyi nye ndụ anyị.


JEMES 3:15
Ụdị amamihe dị otu ahụ esiteghị nꞌebe Chineke nọ bịa. Ọ bụ amamihe nke ụwa, amamihe nke ekwensu, ọ bụghị amamihe nke Mmụọ Nsọ.


JEMES 4:5
Gịnị ka unu na-eche na akwụkwọ nsọ na-ekwu mgbe e dere nꞌime ya sị, “Mmụọ Nsọ Chineke bi nꞌime anyị na-eche anyị nche ka anyị hapụ ịbụ ndị na-ekwesịghị ntụkwasị obi nꞌebe Chineke nọ?”


1 PITA 1:2
Ndị enyi m, nꞌoge gara aga, Chineke onye bụ Nna họpụtara unu dị ka nzube ya si dị. Ọ makwaara na unu ga-emesị bụrụ ụmụ ya. Mmụọ Nsọ ya emeekwala ka unu bụrụ ndị dị nsọ, ndị a sachara nꞌọbara Jisọs Kraịst, na ndị na-erubere ya isi. Ka amara na udo dịrị unu.


1 PITA 1:11
Ha gbalịsịrị ike ịchọpụta ihe Mmụọ Kraịst ahụ bi nꞌime ha na-ekwu, mgbe ọ na-agwa ha okwu. Nꞌihi na okwu ahụ nile Mmụọ Kraịst gwara ha bụ ihe mezuru na ndụ Kraịst. O mezuru nꞌahụhụ ya nile na ebube nile ga-eso ahụhụ a. Ma nꞌoge ahụ ha aghọtaghị mgbe ihe ahụ ha na-ebu amụma banyere Kraịst ga-emezu. Ha amakwaghị nꞌoge ahụ onye ọ ga-emezu nꞌahụ ya.


1 PITA 1:12
Ma Chineke mere ka ndị amụma mata na ọrụ ha rụrụ abụghị maka ọdịmma nke aka ha, kama ọ bụ nꞌihi ọdịmma nke ndị ga-ebi nꞌoge dị nꞌihu, bụ unu onwe unu. Ugbu a kwa a na-ekwusara mmadụ nile ozi ọma a. A na-ekwusakwa ya site nꞌike Mmụọ Nsọ ahụ kwuru ha. Ee, a na-ekwusa ozi ọma a nke na-agụ ndị mmụọ ozi nọ nꞌeluigwe agụụ ịnụ ihe banyere ya.


1 PITA 3:4
Kama meenụ ka mma unu bụrụ mma si nꞌime ime unu pụta, mma ahụ na-adịghị eme agadi, mma nke mmụọ ịdị nwayọọ, ma mmụọ ịdị nsọ, mma dị oke ọnụ ahịa nꞌihu Chineke.


1 PITA 3:18
Nꞌihi na Kraịst nꞌonwe ya hụrụ ahụhụ nwụọ nꞌihi unu. Ọ nwụrụ ọnwụ nanị otu ugboro nꞌihi anyị nile bụ ndị mmehie. Ezi mmadụ na-emeghị ihe ọjọọ ọ bụla nwụrụ nꞌihi ndị ajọ omume, nꞌihi ime ka anyị bịa nꞌihu Chineke. Ọ bụ ezie na e gburu ya nꞌanụ ahụ ma e mere ka ọ dịrị ndụ nꞌime mmụọ ya.


1 PITA 3:19
Ọ bụkwa nꞌime mmụọ ya ka ọ gara kwusaa ozi ọma nye mmụọ ndị ahụ a kpọchiri nꞌụlọ mkpọrọ.


1 PITA 3:20
Nke a bụ mmụọ ndị ahụ jụrụ ime ihe Chineke chọrọ mgbe ahụ o ji ntachi obi chere ha nꞌoge ahụ Noa nọ na-ewu ụgbọ mmiri ya. Ọ bụ nanị mmadụ asatọ nꞌime ndị bi nꞌoge ahụ ka a zọpụtara site na mmiri ahụ riri ndị bi nꞌụwa.


1 PITA 3:22
Ugbu a Kraịst nọ nꞌeluigwe. Ọ nọkwa nꞌakụkụ aka nrị Chineke. Ọ bụ ya na-achị ndị mmụọ ozi nile, ndị ọchịchị nile, na ike nile nke eluigwe.


1 PITA 4:6
Ọ bụ nke a mere e ji kwusaa ozi ọma ọ bụladị nye ndị ahụ nwụrụ anwụ, ndị ahụ e kpere ikpe nꞌanụ ahụ mgbe Chineke ji mmiri bibie ụwa. E kwusaara ha ozi ọma a ime ka ọ bụrụ ihe ga-ekwe mee ka ha dịrị ndụ nꞌime mmụọ ha dị ka Chineke si na-adịkwa ndụ.


1 PITA 4:14
Na-aṅụrịnụ ọṅụ mgbe ọ bụla a na-abụ unu ọnụ, ma ọ bụ na-ekwutọ unu, nꞌihi na unu bụ ndị na-eso Kraịst. Nke a na-ezipụta na Mmụọ ahụ dị ebube, Mmụọ Chineke, bi nꞌime unu.


2 PITA 1:5
Ọ bụrụ na anyị achọọ ịnata onyinye ndị a nile, anyị kwesịrị ime ihe karịrị ịtụkwasị Chineke obi nanị; anyị kwesịrị ịgbalịsi ike ịbụ ndị dị mma. Ma ịdị mma abụghị nanị ọrụ dịrị anyị. Anyị kwesịkwara ịga nꞌihu ịmụta ihe nile banyere Chineke. Ihe ọzọ anyị ga-atụkwasị nꞌelu ihe ọmụma bụ mmụọ nke emebigaghị ihe ọ bụla oke,


2 PITA 1:13
Onyenwe anyị Jisọs Kraịst agwala m hoo haa na oge m nwere nꞌụwa adịkwaghị ukwuu, na m ga-anwụ nꞌoge na-adịghị anya. Ya mere, na nwa oge ahụ fọdụrụ, ana m agụ ya nꞌihe ziri ezi ịkpọtụ mmụọ unu na uche unu site nꞌichetara unu ihe ndị a ugbu a m dị ndụ nꞌụwa a.


2 PITA 1:21
Nꞌihi na o nweghị okwu amụma ọ bụla ndị amụma ochie sitere nꞌobi ha chepụta dee ma ọ bụ kwuo. Kama ọ bụ Mmụọ Nsọ bi nꞌime ha nyere ha ozi ahụ Chineke chọrọ ka ha kwuo.


2 PITA 2:4
Nꞌihi na Chineke ahapụghị ndị mmụọ ozi ahụ mgbe ha mehiere, kama, o weere ha kpọchie nꞌime ọkụ ala mmụọ, ebe e kere ha agbụ nꞌime ọchịchịrị na-eche ụbọchị ikpe ahụ.


2 PITA 2:10
Nke ka nke, Chineke maara otu o si emeso ndị ahụ na-agbaso ọchịchọ rere ure nke anụ ahụ mmeso, bụ ndị ahụ jupụtara na nganga na isi ike, ndị ahụ ụjọ na-adịghị atụ ikwutọ ọ bụladị mmụọ ndị ahụ dị ike na ndị jupụtara nꞌebube nke anya na-adịghị ahụ.


2 PITA 2:11
Lee, ọ bụ ezie na ndị mmụọ ozi nọ nꞌeluigwe ndị na-eguzo nꞌihu Onyenwe anyị, dị ike karịa mmadụ ndị a, ma ha adịghị eji ọnụ ha ekwulu mmụọ ndị a dị ike, na ndị dị ebube, nke ndị ozizi ụgha ndị a na-emeghe ọnụ ha ha ekwutọ.


2 PITA 2:12
Ma ana m eche na ndị ozizi ụgha a bụ ndị nzuzu. Ha na-eme ihe ọ bụla ha kpebiri nꞌobi ha. Ha dị ka ụmụ anụ ọhia ndị a na-amụ nanị nꞌihi ka ndị mmadụ gbuo ha rie. Lee ka ha si ekwulu ndị dị ike ha na-aghọtaghị ihe ọ bụla banyere. A ga-alakwa ha nꞌiyi, ha na mmụọ ọjọọ nile na ike nile nke ọkụ ala mmụọ.


2 PITA 3:18
Bụrụnụ ndị na-eto eto nꞌime mmụọ unu, bụrụkwanụ ndị na-aga nꞌihu ịmụta ihe banyere Onyenwe anyị na Onye nzọpụta anyị Jisọs Kraịst nke ọma. Ka otuto dịrị ya ugbu a na mgbe nile ebighị ebi. Amin.


1 JỌN 2:20
Ma unu adịghị ka ndị ahụ si nꞌọgbakọ anyị pụọ, nꞌihi na Mmụọ Nsọ Chineke nọ nꞌime unu. Unu amụtakwala eziokwu Chineke.


1 JỌN 2:27
Ma unu anatala Mmụọ Nsọ, onye bụ otite mmanụ ahụ Chineke tere unu. Mmụọ Nsọ ahụ na-ebigidekwa nꞌime unu mgbe nile izi unu ihe bụ eziokwu. Onye ozizi ọzọ adịghị unu mkpa. Nanị ya bụ onye ozizi na-ezi ihe bụ eziokwu oge nile. Mmụọ Nsọ na-agwakwa unu sị unu nọgide nꞌime Kraịst. Ya mere, unu esitekwala nꞌime ya pụta.


1 JỌN 3:14
Ọ bụrụ na anyị ahụ ndị Kraịst ibe anyị nꞌanya, ọ na-ezipụta na a gbapụtala anyị site nꞌọkụ ala mmụọ nye anyị ndụ ebighị ebi.


1 JỌN 3:24
Ndị nile na-eme ihe Chineke kwuru na-anọgidesikwa ike nꞌime ya. Chineke nꞌonwe ya na-anọgidesikwa ike nꞌime onye ahụ. Anyị maara na nke a bụ eziokwu nꞌihi na Mmụọ Nsọ bi nꞌime anyị na-agwa anyị otu ihe ahụ.


1 JỌN 4:2
Ụzọ unu ga-esi mata ma okwu unu nụrụ o si nꞌaka Mmụọ Chineke bụ nke a, ọ̀ na-ekwupụta na Jisọs Kraịst Ọkpara Chineke ghọrọ mmadụ jiri anụ ahụ mmadụ bịa nꞌụwa? Ọ bụrụ na okwu ahụ kwagidere na Jisọs bịara nꞌụdị mmadụ nꞌụwa mgbe ahụ okwu ahụ bụ nke si nꞌebe Chineke nọ bịa.


1 JỌN 4:13
O tinyekwala Mmụọ Nsọ ya nꞌime anyị igosi anyị na o bi nꞌime anyị, na anyị bikwa nꞌime ya.


1 JỌN 5:7
Mmụọ Nsọ, onye okwu ya nile bụ eziokwu, kwukwara otu ihe ahụ. Ya mere, anyị nwere ndị akaebe atọ: Olu Mmụọ Nsọ na-ekwu okwu nꞌobi anyị, na olu ahụ si nꞌelu kwuo okwu nꞌoge e mere Jisọs baptizim, na nꞌoge ọnwụ ya. Olu ndị a nile na-ekwukwa otu ihe ahụ, na Jisọs bụ Ọkpara Chineke.


JUD 1:6
Chetakwanụ ihe mere ndị mmụọ ozi nupụrụ isi, ndị ahụ hapụrụ ebe obibi ha, họrọ ibi ndụ mmehie. Ugbu a Chineke ekeela ha eriri igwe tụnye ha nꞌolulu ọchịchịrị, ebe ọ hapụrụ ha tutuu ruo ụbọchị ahụ a ga-ama ha ikpe.


JUD 1:8
Ma ndị ozizi ụgha a na-aga nꞌihu na-ebi ndụ ọjọọ na ndụ rụrụ arụ ha. Ha na-emerụ anụ ahụ ha, na-eji ndị nọ ha nꞌisi eme ihe ọchị. Ha na-akparịkwa mmụọ ndị ahụ dị ebube, bụ mmụọ ọjọọ ndị ahụ dị ike, ndị hapụrụ ebe obibi ha.


JUD 1:9
Ndị a na-eme ihe Maikel, onyeisi ndị mmụọ ozi nọ nꞌeluigwe na-emeghị. Nꞌihi na mgbe mmụọ ozi Maikel chọrọ iburu ozu Mosisi, ya na ekwensu sere okwu. Ma mgbe ha naazọ ozu ahụ, Maikel ekwulughị ekwensu, kama ọ sịrị ya, “Onyenwe anyị baara gị mba”.


JUD 1:14
Nke a bụ ihe Enọk onye bụ mmadụ nke asaa na-esota Adam buru nꞌamụma banyere ha sị, “Lee! Onyenwe anyị na-abịa, ya na nde nde ndị mmụọ ozi ya.


JUD 1:19
Ha bụ ndị na-eweta nkewa na ndị ọchịchọ anụ ahụ ha na-achị. Mmụọ Nsọ ebikwaghị nꞌime ha.”


JUD 1:20
Ma unu ụmụnna m, nọgidenụ naewuli onwe unu elu nꞌime mmụọ unu, nꞌelu ntọ ala ahụ anyị kweere nꞌime ya. Na-ekpenụ ekpere site nꞌike Mmụọ Nsọ.


NKPUGHE 1:1
Ihe dị nꞌakwụkwọ a bụ mkpughe banyere ihe na-aga ime nꞌoge dị nꞌihu na ndụ Jisọs Kraịst. Ọ bụ Chineke nyere ya ike ka o site nꞌọhụ kpughee ya nye Jọn ohu ya. E sitere nꞌeluigwe zite mmụọ ozi bịara kọwaara Jọn ihe ọhụ ndị a ọ hụrụ pụtara.


NKPUGHE 1:4
Ọ bụ m Jọn na-ede akwụkwọ a nye nzukọ asaa dị nꞌobodo Tọkị. Ka amara na udo Chineke, onye ahụ dị ndụ ugbu a, na onye ga-adịgide ndụ gaa nꞌihu dịrị unu. Ka amara na-esitekwa nꞌebe Mmụọ asaa ahụ na-eguzo nꞌihu ocheeze ya dịrị unu.


NKPUGHE 1:18
Abụ m onye ahụ nwụrụ anwụ, ma na-adị ndụ. Ugbu a ana m adị ndụ ruo mgbe nile ebighị ebi. Ọ bụ m ji igodo ọkụ ala mmụọ na ọnwụ. Atụla egwu!


NKPUGHE 1:20
Nke a bụ ihe kpakpando asaa ahụ ị hụrụ nꞌaka nri m, na oriọna asaa ndị ahụ pụtara. Kpakpando asaa ahụ bụ ndị mmụọ ozi ụlọ nzukọ asaa ahụ ị na-edegara akwụkwọ a. Osisi oriọna asaa ahụ bụ ụlọ nzukọ ndị ahụ nꞌonwe ha.


NKPUGHE 2:1
“Dee akwụkwọ nye mmụọ ozi ụlọ nzukọ dị nꞌEfesọs. Ihe ndị a ka ị ga-agwa ya, “Akwụkwọ a m na-edere gị bụ nke m ji ezi gị ozi onye ahụ na-ejegharị nꞌụlọ nzukọ ziri, onye ahụ ji ndị ndu ụlọ nzukọ ndị a nꞌaka ya. Leenụ ihe o kwuru.


NKPUGHE 2:7
“Onye ọ bụla chọrọ ịnụ ihe Mmụọ Nsọ na-agwa nzukọ Onyenwe anyị kwesịrị ime ka ozi a baa ya nꞌime ntị. Onye ahụ na-emeri emeri ka m ga-enye mkpụrụ mbụ sitere nꞌosisi ahụ na-enye ndụ, nke bụ ebe izuike nke Chineke.


NKPUGHE 2:8
“Degara mmụọ ozi ụlọ nzukọ dị na Smarna akwụkwọ a. Ozi dị nꞌakwụkwọ a sitere nꞌaka onye ahụ bụ Mmalite na Ọgwụgwụ ihe nile. Onye nwụrụ anwụ ma na-adịkwa ndụ ọzọ.


NKPUGHE 2:11
Ka onye ọ bụla chọrọ ịnụ ihe nụrụ ihe Mmụọ Nsọ na-agwa nzukọ nke Onyenwe anyị. Ọnwụ nke ugbo abụọ agaghị emekpa onye ọ bụla na-emeri emeri ahụ.


NKPUGHE 2:12
“Dee akwụkwọ a nye mmụọ ozi ụlọ nzukọ dị na Pegamọs sị ya, “Nke a bụ ozi si nꞌọnụ onye ahụ jidere mma agha ukwu ahụ nwere ihu abụọ ahụ nꞌaka ya.


NKPUGHE 2:17
“Ka onye ọ bụla chọrọ ịnụ ihe gee ntị nꞌihe Mmụọ Nsọ na-agwa nzukọ Kraịst. Ọ bụ nanị ndị na-emeri emeri ga-eri achịcha ahụ e zoro ezo, nke bụ ihe oriri ndị nọ nꞌeluige. Ha nile nꞌotu nꞌotu ka m ga-enye ezi nkume ọcha ahụ. A ga-edekwasị aha ọhụrụ nꞌelu nkume ahụ, nke onye ọ bụla ọzọ na-agaghị amata, karịa onye ahụ ga-anata ya.


NKPUGHE 2:18
“Dee akwụkwọ a nye mmụọ ozi ụlọ nzukọ dị na Tiatira. Nke a bụ ozi sitere nꞌaka Ọkpara Chineke onye anya ya na-enwụba nꞌebe nile dị ka ire ọkụ. Ụkwụ ya kwa na-egbu maramara dị ka akpụkpọ ụkwụ e hichara nke ọma.


NKPUGHE 2:29
“Ya mere, ka ndị nile chọrọ ịnụ ihe gee ntị nꞌihe Mmụọ Nsọ na-agwa nzukọ ya.


NKPUGHE 3:1
“Dee akwụkwọ a nye mmụọ ozi ụlọ nzukọ dị na Sardis. Ọ bụkwa ozi a ka a na-ezi gị site nꞌaka onye ahụ nwe mmụọ asaa ahụ na kpakpando asaa ahụ. Amaara m ihe banyere ama ahụ a na-agbara gị na ị bụ nzukọ dị ezi ndụ, na nzukọ dị ike nke ukwuu, ma nꞌeziokwu ị bụ nzukọ nwụrụ anwụ.


NKPUGHE 3:5
Onye ọ bụla na-emeri emeri ka a ga-eyikwasị uwe mwụda ọcha dị otu a. Agaghị m ehichapụ aha ha nꞌakwụkwọ ndụ ahụ. Aga m ekwupụtakwa na ha bụ ndị m nꞌihu Nna m na nꞌihu ndị mmụọ ozi nile.


NKPUGHE 3:6
“Nꞌihi nke a, ka onye ọ bụla chọrọ ịnụ ihe gee ntị nꞌihe Mmụọ Nsọ na-agwa nzukọ ya nile.


NKPUGHE 3:7
“Dee akwụkwọ a nye mmụọ ozi nzukọ dị na Filadelfia. Nke a bụ ozi e ziri gị site nꞌaka onye ahụ dị nsọ na onye eziokwu, onye ahụ ji igodi Devidi, nke o ji emeghepụ ihe onye ọ bụla na-apụghị imechi, na nke o ji emechi ihe onye ọ bụla na-apụghị imeghe.


NKPUGHE 3:13
“Ka onye ọ bụla chọrọ ịnụ ihe gee ntị nꞌihe Mmụọ Nsọ na-ekwuru ụlọ nzukọ ya.


NKPUGHE 3:14
“Dee akwụkwọ a nye mmụọ ozi nzukọ dị na Laodisia. Ọzi a sitere nꞌaka onye ahụ a na-apụghị iwezụga nꞌọnọdụ ya. Ọ bụkwa onye àma kwesịrị ntụkwasị obi banyere ihe nile dị ugbu a, na nke dịrị na mgbe ochie, na nke gaje ịdị ruo mgbe ebighị ebi. Ya onwe ya bụkwa onye kachasị ihe nile elu, bụrụkwa isi mmalite ihe nile Chineke kere.


NKPUGHE 3:17
“Nꞌihi na ị na-asị, ‘Abụ m ọgaranya, nwezuo ihe nile. Mkpa ihe ọ bụla akpakwaghị m.’ Ma ị ghọtaghị na onye gba aka ka ị bụ nꞌihe banyere ndụ ime mmụọ gị. Ị bụ onye e kwesịrị imere ebere. Ị bụkwa ogbenye na onye kpuru ìsì na onye gba ọtọ.


NKPUGHE 3:22
Ka ndị nile chọrọ ịnụ ihe gee nti nꞌihe Mmụọ Nsọ kwuru nye nzukọ Onyenwe anyị.”


NKPUGHE 4:2
Mgbe ahụ, e mere ka m baa nꞌeluigwe nꞌime mmụọ m. Nꞌeluigwe, ahụrụ m ebube na ịma mma ya, hụkwa otu ocheeze na onye na-anọkwasị nꞌelu ya.


NKPUGHE 4:5
Mgbe ahụ ụda yiri ụda egbe eluigwe, ya na amụma na-egbuke egbuke sitere nꞌocheeze ukwu ahụ na-ada ma na-achapụtakwa. Nꞌihu ocheeze ukwu ahụ e nwere oriọna asaa na-enwụ ọkụ. Oriọna ndị a nọchiri ọnọdụ mmụọ asaa Chineke.


NKPUGHE 5:2
Otu mmụọ ozi dị oke ebube pụtara tie mkpu, na-ajụ ajụjụ na-asị, “Ọ̀ bụ onye nwere ike ịnyakapụ akara e jiri kechie akwụkwọ a a pịakọtara apịakọta?”


NKPUGHE 5:6
Mgbe m lere anya, ahụrụ m otu Nwa atụrụ ka o guzo nꞌihu iri ndị okenye abụọ na anọ ahụ, nꞌihu ocheeze ukwu ahụ, na nꞌihu ihe e kere eke anọ ahụ. Nwa atụrụ ahụ nwekwara apa dị iche nꞌahụ ya, bụ nke mere ka ọ nwụọ nꞌoge ọ nwụrụ. O nwekwara mpi asaa na anya asaa nke nọ ọnọdụ mmụọ asaa nke Chineke, nke a na-ezipụ ịga nꞌebe dị iche iche nꞌime ụwa.


NKPUGHE 5:11
Nꞌime ọhụ m, anụrụ m olu nke ọtụtụ ndị mmụọ ozi a na-apụghị ịgụta ọnụ ndị gbara ocheeze ahụ na ndị okenye ahụ nile gburugburu, ka ha na-abụ abụ na-asị,


NKPUGHE 6:8
Ahụrụ m inyinya na-adịghị ezi ọcha. Aha onye na-anọkwasị ya nꞌelu bụ ọnwụ, Inyinya ọzọ nke onye ọzọ a na-akpọ ọkụ ala mmụọ nọkwasịrị na-esokwa ya nꞌazụ. E kere ụwa ụzọ anọ, nyefee ha otu ụzọ nꞌaka, ka ha jiri ọnwụ na ọrịa na anụ ọhia gbuchapụ ndị nile bi nꞌime ha.


NKPUGHE 7:1
Mgbe ihe ndị a gasịrị, ahụrụ m ndị mmụọ ozi anọ ka ha guzo nꞌakụkụ anọ nke ụwa. Ha na-egbochikwa ka ifufe ọ bụla ghara ife nꞌelu ala, na nꞌelu osimiri, na nꞌelu osisi.


NKPUGHE 7:2
Mgbe ahụ ahụkwara m mmụọ ozi ọzọ ka o si nꞌọwụwa anyanwụ na-apụta. Akara Chineke dị ndụ dịkwa nꞌaka ya. O tikuru ndị mmụọ ozi anọ ahụ mkpu, bụ ndị ahụ e nyere ike imekpa ụwa ahụ, ya na oke osimiri na ihe nile dị nꞌime ha, sị ha,


NKPUGHE 7:11
Mgbe ihe ndị a na-eme, ndị mmụọ ozi nile bịara nso ocheeze ahụ na-agba ya gburugburu, na-agbakwa ocheeze ndị okenye ahụ gburugburu na ihe e kere eke anọ ahụ dị ndụ. Ndị mmụọ ozi ndị a nile na-akpọkwa isi ala nꞌihu Onye ahụ nọ nꞌocheeze ahụ. Ha na-efekwa Chineke ofufe, na-asị,


NKPUGHE 8:2
Nꞌoge na-adịghị anya, ahụrụ m ndị mmụọ ozi asaa, ndị na-eguzo nꞌihu Chineke. E nyere ha opi ike nꞌotu nꞌotu.


NKPUGHE 8:3
Mmụọ ozi ọzọ nke ji ite igwe ntakịrị e ji ọlaedo kpụọ bịara guzo nꞌakụkụ ebe ịchụ aja. E nyere ya ihe ịchụ aja na-esi isi ụtọ nke ọ ga-eji gwakọta ya na ekpere ụmụ Chineke, were ya chụọ aja nꞌihu Chineke nꞌebe ịchụ aja e jiri ọlaedo wuo nke dị nꞌihu ocheeze Chineke.


NKPUGHE 8:4
Mgbe ahụ, isisi ụtọ nke ihe ahụ a chụrụ nꞌebe ịchụ aja ahụ, ya na ekpere ahụ ụmụ Chineke kpere, sitere nꞌebe ịchụ aja ahụ mmụọ ozi ahụ jiri ya chụọ aja rigoro elu ruo nꞌebe Chineke nọ.


NKPUGHE 8:5
Mgbe ahụ kwa mmụọ ozi ahụ weere ọkụ sitere nꞌebe ịchụ aja ahụ tinye ya nꞌime ite igwe ntakịrị ahụ o ji chụọ aja, tụda ya, ka ọ danye nꞌime ụwa. Mgbe o mere nke a, ụzụ egbe eluigwe dara, amụma gbukwara nꞌụzọ dị oke egwu. Ala ọma jijiji dakwasịkwara ebe nile nꞌụwa.


NKPUGHE 8:6
Mgbe ahụ mmụọ ozi asaa ahụ jikeere onwe ha ịfụ opi ike ahụ.


NKPUGHE 8:7
Mgbe mmụọ nke mbụ fụrụ opi ike ya, a tụdara nkume ọkụ na ọkụ a gwakọtara ya na ọbara nꞌime ụwa. Nke a mere ka otu ụzọ nꞌime ụzọ atọ e kere ụwa nwuru ọkụ. Ihe nile dị nꞌime ya rechapụrụ ọkụ. E mere ka osisi ọhịa na ahịhịa nile rechapụ ọkụ.


NKPUGHE 8:8
Mgbe mmụọ ozi nke abụọ fụkwara opi ike ya, a tụdara ihe yiri ugwu dị ukwuu na-enwụ ọkụ nꞌime osimiri. Nke a mere ka otu ụzọ nꞌime ụzọ atọ e kere osimiri nile chagharịa ghọọ ọbara.


NKPUGHE 8:10
Mgbe mmụọ ozi nke atọ fụrụ opi ike ya, otu kpakpando dịkarịsịrị ukwuu sitere na mbara eluigwe danye nꞌime otu ụzọ nꞌime ụzọ atọ e kere iyi nile na isi iyi nile, ebe ndị mmadụ si ekute mmiri ha na-aṅụ.


NKPUGHE 8:12
Mgbe mmụọ ozi nke anọ fụrụ opi ike ya, e mere ka otu akụkụ nꞌime akụkụ atọ e kere anyanwụ gbaa ọchịchịrị. Otu a kwa otu akụkụ nꞌime akụkụ atọ e kere ọnwa gbara ọchịchịrị. Ya na otu akụkụ nꞌime akụkụ atọ e kere kpakpando nile. Nke a mere ka anyanwụ hapụ inyekwa ìhè ya nꞌuju dị ka o si eme na mbụ. Otu ụzọ nꞌime ụzọ atọ e kere ehihie ghọkwara oke ọchịchịrị.


NKPUGHE 8:13
Mgbe m nọ na-ele ihe ndị a anya, ahụrụ m otu ugo buru ibu ka ọ na-efegharị na mbara eluigwe na-eti mkpu na-asị, “Ahụhụ! Ahụhụ dịrị mmadụ nile bi nꞌụwa nꞌihi ihe ọjọọ dị iche iche gaje ịbịakwasị ha mgbe ndị mmụọ ozi atọ fọdụrụ fụrụ opi ike ha.”


NKPUGHE 9:1
Mgbe mmụọ ozi nke ise ahụ fụrụ opi ike ya, ahụrụ m otu onye si nꞌeluigwe daa nꞌala. E nyere ya ihe ntụghe ụzọ nke e ji atụghe olulu ahụ na-enweghị nsọtụ.


NKPUGHE 9:13
Mgbe mmụọ ozi nke isii fụrụ opi ike ya, anụrụ m olu sitere na mpi anọ ahụ dị nꞌebe ịchụ aja ahụ e jiri ọlaedo wuo, nke dị nꞌihu ocheeze Chineke,


NKPUGHE 9:14
gwa mmụọ ozi nke isii ahụ okwu sị, “Tọpụ mmụọ ọjọọ anọ ndị ahụ e kere agbụ nꞌebe osimiri Yufretis dị.”


NKPUGHE 9:16
Mmụọ ọjọọ ndị ahụ du ndị agha ha ọnụ ọgụgụ ha bụ narị nde abụọ. Anụrụ m mgbe e kwuru ole ha dị.


NKPUGHE 9:20
Ma ndị mmadụ ahụ nile e mere ka ha dịrị ndụ, ndị ọnwụ a na ihuju anya ndị a na-adakwasịghị, mechiri obi ha, jụ ịkpọ isi ala nye Chineke. Ha jụrụ ịkwụsị ife mmụọ ọjọọ ofufe. Ha jụkwara ịkwụsị ife arụsị ha nile nke ha ji ọlaedo na ọlaọcha na igwe na nkume na osisi kpụọ. Chi ndị a nwere anya ma ha adịghị ahụ ụzọ, nke nwere ụkwụ, ma ha adịghị eje ije.


NKPUGHE 10:1
Emesịa, ahụrụ m mmụọ ozi ọzọ dị oke egwu ka o si nꞌeluigwe rịdata. Igwe ojii gbara ya gburugburu. Eke na egwurugwu dịkwa ya nꞌisi. Ihu ya na-egbukwa maramara dị ka anyanwụ. Ụkwụ ya na-enwukwa dị ka ọkpụrụkpụ ọkụ.


NKPUGHE 10:3
Mgbe mmụọ ozi ahụ ji oke olu, nke dara ụda dị ka ịgbọ ụja nke ọdụm, tie mkpu, egbe eluigwe asaa gbara otu mgbe ahụ zaghachi ya.


NKPUGHE 10:5
Mgbe ahụ, mmụọ ozi ahụ dị ike nke zọkwasịrị ụkwụ ya nꞌelu osimiri, na nꞌala akọrọ ahụ, chiliri aka ya abụọ elu,


NKPUGHE 10:7
Mmụọ ozi ahụ sịkwara na mgbe mmụọ ozi nke asaa ahụ fụrụ opi ike ya, a ga-eme ka ihe omimi nile zoro ezo, nke Chineke sitere nꞌọnụ ndị amụma kwuo nꞌọgbọ gara aga, bụrụ ihe e mezuru emezu.


NKPUGHE 10:8
Mgbe ahụ otu olu sitere nꞌeluigwe gwa m okwu ọzọ sị, “Gaa napụta mmụọ ozi dị ike ahụ guzo nꞌelu oke osimiri na ala akọrọ akwụkwọ nta ahụ o ji nꞌaka ya.”


NKPUGHE 10:9
Ejekwuru m mmụọ ozi ahụ dị ike, rịọ ya ka o nye m akwụkwọ nta ahụ. Ọ zara m sị, “Lee ya, were ya taa ya. Mgbe ị na-ata ya nꞌọnụ gị, ọ ga-atọ gị ụtọ dị ka mmanụ aṅụ. Ma mgbe i lodara ya nꞌime afọ gị, ọ ga-elu gị ilu nꞌafọ.”


NKPUGHE 10:11
Emesịa mmụọ ozi ahụ gwara m okwu sị, “Ị ga-aga buo amụma nye ọtụtụ mmadụ, nꞌọtụtụ mba dị iche iche, nꞌime agbụrụ dị iche iche, nꞌasụsụ dị iche iche na nꞌihu ndị eze nile.”


NKPUGHE 11:11
Ma mgbe ụbọchị atọ na ọkara gafesịrị, Chineke ga-eme ka Mmụọ ya na-enye ndụ banyekwa nꞌime mmadụ abụọ ndị a mee ka ha bilitekwa ọzọ. Mgbe ndị bi nꞌụwa ga-ahụ nke a, ha nile ga-amalitekwa ịtụ oke egwu.


NKPUGHE 11:15
Nꞌihi na mgbe ahụ kwa ka mmụọ ozi nke asaa fụrụ opi ike ya. Mgbe ọ fụrụ opi ya oke olu dị iche iche sitere nꞌeluigwe na-ada nꞌike nꞌike na-asị, “Alaeze nile nke ụwa abụrụla alaeze Onyenwe anyị, ya na Kraịst ya. Ya onwe ya ga-achịkwa achị nꞌebe ihe nile e kere eke dị ruo mgbe nile ebighị ebi.”


NKPUGHE 12:7
Mgbe ihe ndị a gasịrị, agha dị oke egwu dapụtara nꞌeluigwe. Ma onyeisi ndị mmụọ ozi a na-akpọ Maikel na ụsụ ndị mmụọ ozi ya malitere ibuso agwọ ochie ahụ na ndị mmụọ ozi ya a chụdara achụda agha.


NKPUGHE 14:4
Ndị a bụkwa ndị na-emerụghị onwe ha nꞌebe ụmụ nwanyị dị, ndị dị nsọ nꞌime mmụọ ha dị ka ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke. Ha na-eso Nwa atụrụ ahụ na-aga ebe ọ bụla ọ na-aga. Ha bụ ndị e si nꞌetiti ndị mmadụ bi nꞌụwa gbapụta, ka ha bụrụ onyinye e doro iche nye Chineke na Nwa atụrụ ahụ.


NKPUGHE 14:6
Ahụkwara m mmụọ ozi ọzọ ka ọ na-efegharị nꞌime eluigwe. O bu ozi ọma nke ebighị ebi ahụ nꞌaka, nke ọ na-aga ikwusara mba nile, na ebo nile na asụsụ nile na mmadụ nile nọ nꞌụwa.


NKPUGHE 14:7
Mmụọ ozi a were oke olu kwuo okwu sị, “Tụọnụ egwu Chineke, nyekwanụ ya otuto. Nꞌihi na oge ahụ eruola mgbe ọ ga-anọdụ dị ka onye ikpe. Kpọọkwanụ isi ala nye ya, bụ onye kere eluigwe na ala, na oke osimiri na isi iyi mmiri nile.”


NKPUGHE 14:8
Mgbe ahụ mmụọ ozi ọzọ bịara soro ya, na-efegharị na-asị, “Obodo ukwu ahụ bụ Babilọn adaala, lee, ọ daala, nꞌihi na o meela ka mba nile soro ya ṅụrụ mmanya nke ọnụma na ịkwa iko ya na mmehie ya.”


NKPUGHE 14:9
Mgbe ahụ mmụọ ozi nke atọ bịakwara soro ha na-eti mkpu na-asị, “Onye ọ bụla na-akpọ isi ala nye anụ ọhia ahụ si nꞌime mmiri rịpụta, na oyiyi ya ahụ a kpụrụ akpụ, na onye na-anarakwa akara ahụ nꞌegedege ihu ma ọ bụ nꞌaka ya,


NKPUGHE 14:10
aghaghị isoro ṅụọ ihe si nꞌiko iwe Chineke. Iwe Chineke ahụ ka a ga-awụnyekwa, na-agwaghị agwa, nꞌime iko ọnụma Chineke. A ga-ejikwa ọkụ na nkume ọkụ mekpaa ha ahụ nꞌihu ndị mmụọ ozi dị nsọ na nꞌihu Nwa atụrụ ahụ.


NKPUGHE 14:13
Anụkwara m olu nke si nꞌeluigwe daa gwa m okwu sị, dee ihe a nꞌakwụkwọ, “Oge eruola mgbe ndị nile e gburu nꞌihi okwu Chineke ga-anatazu ụgwọ ọrụ ha zuru oke. Nꞌezie, Mmụọ Nsọ na-ekwu na ha bụ ndị a gọziri agọzi, nꞌihi na ugbu a ha ga-ezu ike site nꞌọrụ ha nile na ahụhụ ha nile, nꞌihi na ezi ọrụ ha rụrụ ga-eso ha baa nꞌeluigwe.”


NKPUGHE 14:15
Mgbe ahụ otu mmụọ ozi sitere nꞌụlọ nsọ pụta, tikuo onye ahụ na-anọkwasị nꞌigwe ọcha sị ya, “Ngwa, bido iji mma iwe ihe ubi gị rụọ ọrụ, nꞌihi na oge owuwe ihe ubi eruola. Ihe a ga-aghọ aghọ nꞌụwa achaala.”


NKPUGHE 14:17
Mgbe nke a gasịrị, mmụọ ozi ọzọ sitekwara nꞌụlọ nsọ dị nꞌeluigwe pụta. Ya onwe ya jikwa mma owuwe ihe ubi dị nkọ.


NKPUGHE 14:18
Otu mgbe ahụ, mmụọ ozi ahụ e nyere ike iji ọkụ mebie ụwa tikuru mmụọ ozi ahụ ji mma owuwe ihe ubi dị nkọ sị ya, “Were mma owuwe ihe ubi gị bipụ ụyọkọ osisi oroma nile dị nꞌụwa, nꞌihi na ha nile achaala ikpe ikpe.”


NKPUGHE 14:19
Ya mere, mmụọ ozi ahụ rụnyere mma owuwe ihe ubi ya nꞌụwa, bipụsịa ụyọkọ oroma ahụ chịkọtaa ha, kpojupụta ha ebe Chineke ga-eji iwe zọchaa ha.


NKPUGHE 15:1
Ahụkwara m ihe ịrịba ama ọzọ nke mere nꞌeluigwe. Ọ dị ebube dịkwa oke egwu. Ọ na-ezipụta ihe gaje ịbịa. Ọ bụ ndị mmụọ ozi asaa ka a họpụtara iburu ihe otiti asaa nke ikpeazụ na-abịakwasị ụwa. Mgbe a wụkwasịrị ụwa ihe otiti asaa ndị a, mgbe ahụ ka iwe Chineke ga-ajụrụ.


NKPUGHE 15:6
Mmụọ ozi asaa ndị ahụ e nyere ike ịwụkwasị ụwa ihe otiti asaa ahụ sitere nꞌụlọ nsọ ahụ pụta. Ha yi uwe dị nnọọ ọcha, nke na-enweghị ntụpọ. Ha jikwa akpụkpọ dị warara e ji ọlaedo mee kee gburugburu obi ha.


NKPUGHE 15:7
Otu nꞌime ihe e kere eke anọ ndị ahụ dị ndụ bunyere mmụọ ozi asaa ndị ahụ efere ọlaedo asaa a gbajuru ọnụma Chineke, bụ onye ahụ na-adị ndụ mgbe nile ebighị ebi.


NKPUGHE 15:8
Mgbe ahụ ụlọ nsọ ahụ jupụtara nꞌanwụrụ ọkụ si nꞌebube na ike Chineke na-apụta. Mmadụ ọ bụla enwekwaghị ike banye nꞌime ụlọ nsọ ukwu ahụ tutuu ruo mgbe mmụọ ozi asaa ndị ahụ wụsara ihe otiti asaa ahụ.


NKPUGHE 16:1
Mgbe ahụ anụrụ m oke olu si nꞌụlọ nsọ ahụ na-ada na-agwa ndị mmụọ ozi asaa ahụ okwu sị, “Ngwanụ, gaanụ wụsa ihe dị nꞌefere ọnụma asaa Chineke ahụ nꞌelu ụwa.”


NKPUGHE 16:2
Mmụọ ozi nke mbụ hapụrụ ụlọ nsọ ahụ gaa wụsa ihe dị nꞌefere nke ya nꞌelu ụwa. Mgbe ọ wụsara ya, ọnya ọjọọ na-egbu oke mgbu bịakwasịrị ndị nile bi nꞌụwa, bụ ndị a kakwasịrị akara anụ ọhịa ahụ, na nꞌelu ndị na-akpọrọ oyiyi ya isi ala.


NKPUGHE 16:3
Mmụọ ozi nke abụọ pụrụ gaa wụsa ihe dị nꞌime efere nke ya nꞌelu osimiri nile. Otu mgbe ahụ osimiri nile chagharịrị na-acha dị ka ọbara onye nwụrụ anwụ. Nke a mere ka ihe nile dị nꞌime ha nwụọ.


NKPUGHE 16:4
Mmụọ ozi nke atọ pụrụ gaa wụsa ihe dị nꞌefere nke ya nꞌelu iyi na nꞌelu isi iyi nile. Nke a mere ka ha nile ghọọ ọbara.


NKPUGHE 16:5
Mgbe ahụ anụrụ m ka mmụọ ozi ahụ mmiri nile dị nꞌaka ya kwuru okwu sị, “I kpere ikpe ziri ezi, ebe i mere ka isi iyi ndị a ghọọ ọbara. Gị onye dị nsọ na onye na-adị site na mmalite, na onye na-adịkwa ugbu a.


NKPUGHE 16:7
Mgbe ahụ kwa, anụrụ m ka mmụọ ozi ahụ na-anọ nꞌebe ịchụ aja kwuru okwu sị, “Ee, Onyenwe anyị Chineke pụrụ ime ihe nile, ntaramahụhụ i nyere ha ziri ezi, bụrụkwa eziokwu.”


NKPUGHE 16:8
Mgbe ahụ mmụọ ozi nke anọ pụrụ wụsa ihe dị nꞌefere nke ya nꞌelu anwụ si otu a mee ka anwụ were okpomọkụ ya chagbuo mmadụ nile.


NKPUGHE 16:10
Mgbe ahụ kwa, mmụọ ozi nke ise pụrụ wụkwasị ihe dị nꞌiko nke ya nꞌelu ocheeze anụ ọhia ahụ si na mmiri pụta. Nke a mere ka ọchịchịrị jupụta nꞌalaeze ya. O mekwara ka ndị ọ na-achị tabie ire ha nꞌihi oke ahụ ụfụ.


NKPUGHE 16:12
Mmụọ ozi nke isii pụkwara wụkwasị ihe dị nꞌefere ya nꞌelu mmiri ukwu ahụ bụ Yufretis si otu a mee ka mmiri dị nꞌime ya taa. Nke a mere ka ọ dịrị eze ahụ si nꞌọwụwa anyanwụ mfe ịchịrị ndị agha ya jeruo nꞌakụkụ ọdịda anyanwụ na-enweghị mgbochi ọ ụla.


NKPUGHE 16:13
Mgbe ahụ kwa, ahụrụ mmụọ ọjọọ atọ ndị pụtara ìhè nꞌọdịdị awọ. Ha si nꞌọnụ agwọ ochie ahụ na nꞌọnụ anụ ọhịa ahụ nwere ike ịrụ ọrụ ịtụnanya pụta.


NKPUGHE 16:14
Ha bụ mmụọ nke ajọ mmụọ ndị ahụ na-arụ ọrụ ịrịba ama. Ọ bụ ha na-ejekwuru ndị eze ụwa nile ịchịkọta ha maka ibu agha nꞌụbọchị ukwu ahụ bụ ụbọchị Chineke Onye pụrụ ime ihe nile.


NKPUGHE 16:16
Mgbe ahụ mmụọ ọjọọ ndị ahụ chịkọtara ndị eze ahụ nile nꞌotu ebe a na-akpọ Amagidọn nꞌasụsụ Hiburu.


NKPUGHE 16:17
Mgbe ahụ kwa, mmụọ ozi nke asaa wụpụrụ ihe dị nꞌefere nke ya nꞌikuku. Mgbe ọ wụpụrụ ya, otu olu sitere nꞌocheeze dị nꞌụlọ nsọ ukwu ahụ daa ụda sị, “E mezuola ya!”


NKPUGHE 17:1
Emesịa, otu nꞌime mmụọ ozi asaa ndị ahụ wụsara ihe dị nꞌefere ha nꞌelu ụwa bịara nꞌebe m nọ bido ịgwa m okwu. Ọ gwara m okwu sị, “Soro m ka anyị gaa, aga m egosi gị ihe ga-abịakwasị nwanyị ahụ ụwa nile maara dị ka akwụla, nwanyị ahụ na-anọkwasị nꞌelu ọtụtụ mmiri nke ụwa.


NKPUGHE 17:3
Mgbe ahụ mmụọ ozi ahụ duuru m nꞌime mmụọ baa nꞌọzara. Nꞌebe ahụ ka m nọ hụ otu nwanyị nọkwasịrị nꞌelu otu anụ ọhịa na-acha ọbara ọbara. Anụ ọhịa ahụ nwere isi asaa na mpi iri. Ihe e dere anụ ọhịa ahụ nꞌahụ bụ nanị okwu ikwulu Chineke.


NKPUGHE 17:7
Ma mmụọ ozi ahụ jụrụ m ajụjụ sị, “Gịnị mere ihe ị hụrụ ji ju gị anya? Aga m agwa gị onye nwanyị a bụ, na ihe anụ a ọ na-anọkwasị nꞌelu ya nọchiri anya ya.


NKPUGHE 17:15
Mmụọ ozi ahụ gwakwara m okwu si, “Osimiri ndi a, na iyi ukwu na iyi nta ndị a nwanyị a na-anọkwasị nꞌelu ha nọchiri anya ndị mmadụ dị iche iche, ndị si nꞌebe nile dị iche iche ma mba dị iche iche nke ụwa.”


NKPUGHE 18:1
Mgbe ihe ndị a nile gasịrị, ahụrụ m mmụọ ozi ọzọ nke si nꞌeluigwe bịa nꞌụwa. E nyere mmụọ ozi a ike dị ukwuu. Ebube ya mekwara ka ìhè jupụta nꞌụwa.


NKPUGHE 18:2
Mmụọ ozi a jiri olu dị ukwuu tie mkpu sị, “Obodo ukwu ahụ bụ Babilọn adaala. Ọ ghọọkwala ọgba ndị mmụọ ọjọọ na ebe obibi ndị mmụọ ọjọọ, na ebe obibi ụmụ nnụnụ rụrụ arụ.


NKPUGHE 18:21
Mgbe ahụ otu mmụọ ozi tụtụlitere otu nkume nke dị ka nkume e ji akwọ ihe, tụba ya nꞌime oke osimiri, tie mkpu sị, “Otu a ka a ga-esi tụfuo Babilọn obodo ukwu ahụ, dị ka m si tụfuo nkume a. A gaghị ahụkwa ya anya ọzọ ruo mgbe ebighị ebi.


NKPUGHE 19:9
Mmụọ ozi ahụ kwa gwara m okwu sị m dee ihe ndị a nꞌakwụkwọ: “Ngọzi na-adịrị ndị ahụ a kpọrọ ka ha bịa soro nꞌoriri ọlụlụ nwụnye Nwa atụrụ ahụ.” Ọ gwakwara m sị, “Okwu a i deturu ugbu a bụ okwu Chineke nꞌonwe ya kwuru.”


NKPUGHE 19:17
Mgbe ahụ ahụrụ m otu mmụọ ozi ka o guzo nꞌime anyanwụ na-eti mkpu nꞌoke olu na-akpọku ụmụ nnụnụ nile na-efe na mbara eluigwe na-asị ha, “Bịanụ! Zukọọnụ! Nꞌihi na Chineke dị ukwuu na-akpọ unu oriri anyasị.


NKPUGHE 20:1
Mgbe ahụ kwa ahụrụ m otu mmụọ ozi ka o si nꞌeluigwe rịda. O ji mkpịsị igodo e ji atụghe olulu ahụ na-enweghị nsọtụ. O jikwa mkpọrọ igwe dị arọ nꞌaka ya.


NKPUGHE 20:2
Mmụọ ozi a jidere agwọ ochie ahụ, bụ agwọ ochie ahụ aha ya bụkwa Onye ọnwụnwa na Ekwensu. O ji mkpọrọ igwe kee ya agbụ. Ọ ga-anọkwa nꞌọnọdụ a otu puku afọ.


NKPUGHE 20:3
Emesịa, mmụọ ozi ahụ tụnyere agwọ ochie ahụ nꞌime olulu ahụ na-enweghị nsọtụ, tụchie ụzọ ya. Ọ kakwara akara nꞌelu ya ka agwọ ochie ahụ hapụ inwekwa ike iduhie mba nile dị nꞌụwa ọzọ tutuu ruo mgbe puku afọ gasịrị. Mgbe afọ ndị a zuru, a ga-atọghepụ ya hapụ ya ka ọ gagharịa nwa ntịntị oge.


NKPUGHE 20:13
Oke osimiri nile nyeghachiri ndị nile nwụrụ anwụ nọ nꞌime ha. Otu a kwa ọnwụ na ala mmụọ nyeghachikwara ndị nwụrụ anwụ dị nime ha. E kpekwara onye ọ bụla ikpe dị ka ọrụ ya si dị.


NKPUGHE 20:14
Emesịa, a tụnyere ọnwụ na ọkụ ala mmụọ nꞌime ọdọ ọkụ ahụ. Nke a bụ ọnwụ nke ugboro abụọ.


NKPUGHE 21:8
Ma ndị na-atụ ụjọ, ndị na-alaghachi azụ site nꞌiso m, ha na ndị na-adịghị atụkwasị m obi, na ndị na-emetọ onwe ha, na ndị ogbu mmadụ, na ndị na-akwa iko, na ndị ha na mmụọ ọjọọ na-akparịta ụka, na ndị na-ekpere arụsị, na ndị ụgha nile, ihe ha ga-eketa bụ ikpe ọmụma nke ịbanye nꞌime olulu ahụ e ji nkume na-enwụ ọkụ kwanye ọkụ.”


NKPUGHE 21:9
Otu nꞌime mmụọ ozi asaa ahụ wụsara ihe dị nꞌefere ha ji bịakwutere m sị m, “Soro m ka m gosi gị nwagbọghọ ahụ bụ nwụnye Nwa atụrụ ahụ.”


NKPUGHE 21:10
O buuru m nꞌime mmụọ buga m nꞌotu ugwu buru ibu nke ịdị elu ya dịkwa ukwuu. Site nꞌebe ahụ o gosiri m obodo nsọ ahụ bụ Jerusalem ka o si na mbara eluigwe ebe Chineke nọ na-arịdata.


NKPUGHE 21:12
Mgbidi ya nile dị obosara dịkwa elu. O nwekwara ọnụ ụzọ iri na abụọ e si abanye nꞌime ya. Ọ bụkwa ndị mmụọ ozi iri na abụọ na-eche ọnụ ụzọ ndị a nche. E dekwara aha ebo iri na abụọ nke ụmụ Izirel nꞌọnụ ụzọ ama ndị a nꞌotu nꞌotu.


NKPUGHE 21:15
Mmụọ ozi ahụ ji osisi e ji atụ ihe, nke e ji ọlaedo mee, nꞌaka ya. O ji ya tụọ obodo ahụ na ọnụ ụzọ ya, na mgbidi ya.


NKPUGHE 21:17
Mmụọ ozi ahụ tụkwara ịdị igbidi nke mgbidi ahụ chọpụta na ọ dị narị nzọ ụkwụ atọ. Mgbe mmụọ ozi a na-atụ ihe ndị a ọ na-agwa m ihe ọnụ ọgụgụ ha bụ dị ka m nwere ike ịghọta.


NKPUGHE 22:1
Emesịa, mmụọ ozi ahụ gosiri m iyi ahụ e si ekute mmiri na-enye ndụ. Mmiri a na-acha nnọọ vaaa dị ka enyo. O sikwa nꞌokpuru ocheeze Chineke na Nwa atụrụ ahụ na-asọpụta.


NKPUGHE 22:6
Mgbe ahụ mmụọ ozi ahụ gwara m okwu sị m, “Okwu ndị a kwesịrị ka a tụkwasị ha obi. Ha bụkwa eziokwu. Onyenwe anyị Chineke, onye na-enye ndị amụma Mmụọ ya ezitela mmụọ ozi ya ịgwa gị ihe ndị ahụ ga-emezu nꞌoge na-adịghị anya.


NKPUGHE 22:8
Mụ onwe m bụ Jọn hụrụ ihe ndị a nile, nụkwa ha na ntị m. Mgbe m dara nꞌala ịkpọ isi ala nye mmụọ ozi a ziri m ozi ndị a,


NKPUGHE 22:16
“Mụ onwe m bụ Jisọs ezitela mmụọ ozi m ka ọ gwa gị ihe ị ga-agwa nzukọ m nile. Ọ bụ m bụ Mgbọrọgwụ ji Devidi ndụ, na onye si nꞌagbụrụ ya pụta. Abụkwa m Kpakpando ụtụtụ ahụ, nke na-enwụ ezi onwụnwụ.”


NKPUGHE 22:17
Mmụọ Nsọ na nwanyị ahụ a na-alụ ọhụrụ na-asị, “Bịa!” Ka onye ọ bụla nụrụ ịkpọ oku ha kpọkuokwa ndị ọzọ sị ha, “Bịa!” Onye akpịrị na-akpọ nkụ ya bịa. Onye ọ bụla chọrọ ya bịa ṅụrụ mmiri na-enye ndụ nꞌefu, na-akwụghị ụgwọ ọ bụla.


Igbo Bible 1988
No Data