A A A A A

Chọọ
MATIU 2:9
Mgbe Herọd gwasịrị ha okwu ndị a, ndị amamihe ahụ pụrụ. Nꞌezi, ha hụrụ kpakpando ahụ ọzọ, nke ha buru ụzọ hụ, ka o guzo na mbara eluigwe obodo Betilehem.


MATIU 3:2
“Chegharịanụ, bịakwutenụ Chineke, nꞌihi na alaeze eluigwe dị nso.”


MATIU 3:16
Mgbe Jisọs sitere na mmiri ahụ pụta, lee, eluigwe meghere, Jọn hụrụ Mmụọ Chineke ka o si nꞌelu fedata dị ka nduru bekwasị Jisọs nꞌisi.


MATIU 3:17
Nꞌotu oge ahụ kwa, olu sitere nꞌeluigwe kwuo okwu sị, “Onye a bụ Ọkpara m, nke m hụrụ nꞌanya. Ihe ya dị m ezi mma.”


MATIU 4:17
Site nꞌoge ahụ gaa nꞌihu Jisọs bidoro na-ekwusa na-asị, “Chegharịanụ, sitenụ na mmehie unu bịakwute Chineke, nꞌihi na alaeze eluigwe na-abịa nso.”


MATIU 4:23
Jisọs jegharịrị nꞌobodo Galili nile na-ezi ihe nꞌọgbakọ ndị Juu nile. Ọ na-ekwusa ozi ọma nke alaeze eluigwe nꞌebe ọ bụla ọ gara. Ọ gwọkwara ọrịa dị iche iche.


MATIU 5:3
“Ndị ogbenye nꞌime mmụọ ha bụ ndị a gọziri agọzi, nꞌihi na alaeze eluigwe bụ nke ha.


MATIU 5:10
Ndị a na-akpagbu nꞌihi ezi omume ha bụ ndị a gọziri agọzi, nꞌihi na alaeze eluigwe bụ nke ha.


MATIU 5:12
Ṅụrịanụ ọṅụ nꞌihi ya. Ka obi tọọkwa unu ụtọ. Nꞌihi na ụgwụ ọrụ unu ga-adị ukwuu nꞌeluigwe. Chetanụ na e si nꞌụzọ dị otu a sogbuo ndị amụma bu unu ụzọ.


MATIU 5:16
Ya mere, unu ezokwala ìhè unu. Kwerenụ ka ìhè unu nwuore mmadụ nile, ka ndị mmadụ hụ ọrụ ọma unu, tookwa Nna unu bi nꞌeluigwe.


MATIU 5:18
Ana m ekwusi nke a ike na tutuu eluigwe na ụwa agabiga, ọ dịghị iwu ọ bụla ga-agafe ma o mezughị.


MATIU 5:19
Nꞌihi ya, ọ bụrụ na onye ọ bụla emebie iwu dịkarịsịrị nta, ma zikwa ndị ọzọ imebi ya, a ga-agụ onye ahụ nꞌọnye dịkarịsịrị nta nꞌalaeze eluigwe. Ma onye na-ezi mmadụ ka ha debe iwu ahụ, ma na-emekwa okwu Chineke nꞌonwe ya, a ga-akpọ ya onye dị ukwuu nꞌalaeze eluigwe.


MATIU 5:20
“Ka m dọọ unu aka na ntị. Ọ bụrụ na ezi omume unu apụtaghị ìhè karịa ezi omume ndị Farisii na ndị ozizi iwu, unu apụghị iketa alaeze eluigwe ma ọlị.


MATIU 5:29
Nꞌihi nke a, ọ bụrụ na anya gị achọọ iduba gị na mmehie, ghụpụ ya tufuo. Ọ kaara gị mma na i ji otu anya baa nꞌalaeze eluigwe karịa na i ji anya abụọ baa nꞌọkụ ala mmụọ.


MATIU 5:30
Ọ bụrụ na aka nri gị achọọ ime ka i mehie, gbupu ya tufuo. Ọ kaara gị mma na i ji otu aka baa nꞌalaeze eluigwe karịa na i ji aka abụọ baa nꞌọkụ.


MATIU 5:34
Ma asị m unu aṅụla iyi ọ bụla. Ejikwala eluigwe aṅụ iyi nꞌihi na eluigwe bụ ebe ocheeze Chineke dị.


MATIU 5:45
Nke a ga-eme ka unu bụrụ ụmụ nke nna unu bi nꞌeluigwe, onye na-eme ka anwụ mụọra ndị ọma na ndị ọjọọ, na-emekwa ka mmiri zooro ndị ezi omume na ndị ajọ omume.


MATIU 5:48
Unu kwesịrị izu oke nꞌịrụ ọrụ ọma, dị ka Nna unu bi nꞌeluigwe si zuokwa oke.


MATIU 6:1
“Unu arụla ọrụ ọma unu nꞌebe ndị mmadụ ga-ahụ unu malite ito unu. Nꞌihi na unu mee nke a, unu agaghị enweta ụgwọ ọrụ ọ bụla site nꞌaka Nna unu bi nꞌeluigwe.


MATIU 6:7
“Mgbe unu na-ekpe ekpere, unu ekwula okwu nkwkwasị efu dị ka ndị na-amaghị Chineke na-eme. Ha chere na Chineke ga-anụ ekpere ha nꞌihi ọtụtụ okwu ha na-ekwu. Chetanụ na tupu unu arịọ arịrịọ ọ bụla, Nna unu bi nꞌeluigwe mmara ihe na-akpa unu.


MATIU 6:9
“Sinụ otu a kpee ekpere: Nna anyị nke bi nꞌeluigwe, ka e doo aha gị nsọ.


MATIU 6:10
Ka alaeze gị bịa, ka e mee uche gị nꞌụwa, dị ka e si eme ya nꞌeluigwe.


MATIU 6:14
Nna unu bi nꞌeluigwe ga-agbaghara unu mmehie unu ma ọ bụrụ na unu agbagharakwa ndị na-emehie megide unu. Ọ bụrụkwanụ na unu ajụ ịgbaghara ndị na-emehie megide unu, ọ gaghị agbaghara unu.


MATIU 6:20
Kama cheenụ akụ unu nꞌeluigwe, ebe ha na-agaghị ata ajarị, ebe nla na-agaghị eri ha, ebe ọ na-adịkwaghị onye ga-ezu ha. Nꞌihi na ebe ọ bụla akụ unu dị ka obi unu ga-adịkwa.


MATIU 6:26
Werenụ ụmụ nnụnụ dị ka ihe ịma atụ. Ha adịghị echegbu onwe ha banyere ihe oriri. Ọ dịghị mgbe ha na-akụ mkpụrụ nꞌubi ọ dịkwaghị mgbe ha na-ewe mkpụrụ nꞌubi. Ma Nna unu bi nꞌeluigwe na-azụ ha. Ọ̀ bụ na unu adịghị oke ọnụ ahịa karịa ha?


MATIU 7:11
Ebe unu ndị mmehie pụrụ inye ụmụ unu ezi onyinye, Nna unu bi nꞌeluigwe ga-enyekwa unu karịa, ma ọ bụrụ na unu arịọọ ya.


MATIU 7:13
“Ụzọ dị warara na-eduba nꞌeluigwe. Site na ya baa. Ụzọ dị obosara na-eduba nꞌọkụ. Ọtụtụ mmadụ na-esoro ya nꞌihi na ọ dị mfe.


MATIU 7:21
“Ọ bụghị ndị nile na-akpọ m aha na-asị m ‘Onyenwe anyị, Onyenwe anyị’ ga-abanye nꞌalaeze eluigwe, kama ọ bụ nanị ndị ahụ na-eme ihe Nna m nọ nꞌeluigwe chọrọ ka ha mee.


MATIU 8:11
Nꞌezie kwa, ọtụtụ ndị mmadụ ga-esite nꞌakụkụ nile nke ụwa bịa soro Eberaham na Aịzik na Jekọb nọkọọ nꞌalaeze eluigwe,


MATIU 10:7
Kwusaara ha na alaeze eluigwe dị nso.


MATIU 10:29
Ọ bụ otu kobo ka a na-ere ụmụ nza abụọ, ma otu nꞌime ha agaghị ada nꞌala ma ọ bụrụ na nna unu bi nꞌeluigwe amaghị.


MATIU 10:32
“Onye ọ bụla nabatara m nꞌihu mmadụ nile dị ka enyi ya, ka mụ onwe m ga-anabatakwa dị ka enyi m nꞌihu Nna m bi nꞌeluigwe.


MATIU 10:33
Ma onye ọ bụla jụrụ m nꞌihu mmadụ nile, mụ onwe m ga-ajụkwa ya nꞌihu Nna m bi nꞌeluigwe.


MATIU 11:11
“Nꞌezie, ọ dịghị nwoke ọ bụla nwanyị mụrụ dị ukwuu karịa Jọn omee baptizim. Ma onye dịkarịsịrị nta nꞌalaeze eluigwe dị ukwuu karịa Jọn.


MATIU 11:12
Site nꞌoge Jọn omee baptizim malitere izisa ozi ọma ruo ugbu a, ndị ụwa ji ike na-egbochi ọganihu alaeze eluigwe. Ma ọ bụkwa nanị ndị ọ na-anụ ọkụ nꞌobi na-eji ike abanye nꞌime ya.


MATIU 12:50
Nꞌihi na onye ọ bụla na-eme ihe Nna m bi nꞌeluigwe chọrọ, bụ nwanne m nwoke, na nwanne m nwanyị, na nne m.”


MATIU 13:24
Jisọs tụrụ ilu ọzọ sị, “Alaeze eluigwe dị ka onye ọrụ ubi nke kụrụ ezi mkpụrụ ọka nꞌubi ya.


MATIU 13:31
Jisọs tukwara ilu ọzọ sị ha, “Alaeze eluigwe dị ka mkpụrụ mọsụtadị nke onye ọrụ ubi kụrụ nꞌubi ya. Ọ bụ ezie ha ọ bụ mkpụrụ dịkarịsịrị nta karịa mkpụrụ ubi nile, ọ dị nta dị ka mkpụrụ aṅara


MATIU 13:33
Ọzọ kwa, Jisọs ji alaeze eluigwe tụnyere ihe na-eko achịcha nke nwanyị na-ewere gwakọtaa nꞌụtụ ọka e ji eme beredi, tutuu ruo mgbe ihe iko achịcha ahụ mere ka ụtụ ọka ahụ koo.


MATIU 13:44
“Ala eze eluigwe dị ka akụ e zoro nꞌotu ibiribe ala, nke otu nwoke chọpụtara. Nwoke a jiri ọṅụ ree ihe nile o nwere, ma gaa zụọ ibiribe ala ahụ.


MATIU 13:45
“Ọzọ, alaeze eluigwe yiri nkume dị oke ọnụ ahịa nke onye na-azụ ahịa chọtara.


MATIU 13:47
“Ọzọ kwa, alaeze eluigwe dị ka ụgbụ e ji egbu azụ, nke onye ọkụ azụ wụnyere nꞌime mmiri, jiri ya jide azụ dị iche iche, ndị a na-eri eri na ndị a na-adịghị eri eri.


MATIU 13:52
Jisọs sịrị ha, “Ya mere, onye ozizi iwu Mosisi ọ bụla soro bụrụ onye na-eso ụzọ nke alaeze eluigwe, ga-adị ka onyenwe ụlọ nke na-esite nꞌọba ya na-ewepụta ihe ọhụrụ na ihe ochie.”


MATIU 16:2
Jisọs zara sị ha, “Ihe unu maara nke ọma bụ nanị ịkọwa ihu eluigwe. Nꞌanyasị unu na-sị, ‘Mmiri agaghị ezo nꞌihi na ihu eluigwe na-acha uhie uhie.’


MATIU 16:3
Nꞌụtụtụ unu na-asị, ‘Anyị ga-enwe mmiri ozuzo taa nꞌihi na ihu eluigwe na-acha uhie uhie na oji oji.’ Lee na unu pụrụ ịkọwa ihu eluigwe, ma unu apụghị isite nꞌihe ịrịba ama ndị a unu na-ahụ anya kọwaa ihe oge a anyị nọ nꞌime ya pụtara.


MATIU 16:4
Ajọ ọgbọ nke jupụtara nꞌekweghị ekwe, nke na-arịọkwa ka e mee ihe ịrịba ama na mbara eluigwe. Ọ dịghị ihe ịrịba ama ọzọ a ga-egosi unu karịa ihe ịrịba ama Jona.” Mgbe ahụ Jisọs sitere nꞌebe ahụ ha nọ pụọ.


MATIU 16:17
Jisọs gwara Pita okwu sị ya, “Saịmọn Pita, ị bụ onye Chineke gọzịrị agọzi, nꞌihi na eziokwu a i kwuru ugbu a esiteghị nꞌaka mmadụ efu rute gị. Kama ọ bụ Nna m bi nꞌeluigwe mere ka ị mata ya.


MATIU 16:19
Aga m enye gị mkpịsị igodo alaeze eluigwe. Ihe ọ bụla dị nꞌụwa ị jụrụ na ọ gaghị abata nꞌeluigwe agaghị abata nꞌebe ahụ. Ihe ọ bụla kwa ị nabatara nꞌụwa, ya ka a ga-anabatakwa nꞌeluigwe.”


MATIU 17:2
Mgbe ha nọ nꞌebe ahụ na-ele Jisọs anya nꞌelu ugwu ahụ, mmadụ atọ ndị a hụrụ ka anụ ahụ Jisọs gbanwere. Ihu ya nwupụrụ ọcha dị ka akpụkpọ eluigwe. Uwe ya chakwara ọcha dị ka ogho.


MATIU 18:1
Nꞌoge ahụ kwa, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya jụọ ya ajụjụ sị, “Ọ bụ onye nꞌetiti anyị ga-enwe ọnọdụ dị ukwuu karịa ndị ọzọ nꞌalaeze eluigwe?”


MATIU 18:3
Mgbe ahụ Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya okwu sị, “Ọ bụrụ na unu esiteghị na mmehie unu chegharịa bịakwute Chineke dị ka ụmụntakịrị, unu agaghị abata nꞌime alaeze eluigwe.


MATIU 18:4
Onye ọ bụla wedara onwe ya ala dị ka nwantakịrị bụ onye dịkarịsịrị ukwuu nꞌalaeze eluigwe.


MATIU 18:8
Nꞌihi nke a, ọ bụrụ na aka gị ma ọ bụ ụkwụ gị ga-eme ka i mehie, gbupụ ya tufuokwa ya. Ọ kaara gị mma na ị ga-abanye nꞌalaeze eluigwe na-enweghị ụkwụ na aka, karịa na ị ga-enwe aka na ụkwụ ma banye nꞌọkụ ala mmụọ.


MATIU 18:9
Ọzọ, ọ bụrụ na anya gị ga-eme ka ị mehie, ghụpụta ya tufuokwa ya. Ọ kaara gị mma na ị ga-eji otu anya banye alaeze eluigwe karịa na ị ga-enwe anya abụọ, banye nꞌọkụ ala mmụọ.


MATIU 18:10
“Lezienụ anya ka unu ghara ileda otu nꞌime ụmụntakịrị a anya. Nꞌihi na nꞌeluigwe, ndị mmụọ ozi ha na-anọ nꞌihu Nna m mgbe nile.


MATIU 18:18
Nꞌezie, asị m unu, na ihe ọ bụla unu kere agbụ nꞌụwa, e keela ya rị agbụ nꞌeluigwe. Ihe ọ bụla kwa unu tọpụrụ, a tọpụkwala ya rị nꞌeluigwe.


MATIU 18:19
“Ana m agwa unu nke a sị, ọ bụrụ na mmadụ abụọ nꞌetiti unu ekwekọọ nꞌụwa banyere ihe ọ bụla unu na-arịọ nꞌekpere, Nna m bi nꞌeluigwe ga-emezuru unu ihe ahụ.


MATIU 18:23
“A ga-eji alaeze eluigwe tụnyere eze ahụ kpebiri ka ya na ndị na-ejere ya ozi gụzie ego ya ha ji.


MATIU 18:35
Otu a ka Nna m bi nꞌeluigwe ga-emekwa unu, ma ọ bụrụ na unu agbagharaghị ụmụnne unu.”


MATIU 19:12
Ụfọdụ ka a mụrụ dị ka ndị na-enweghị ike ịmụta nwa site nꞌafọ nne ha. Ndị ọzọ dịkwa, ndị jiri aka ha họrọ na ha agaghị amụta ụmụ nꞌihi alaeze eluigwe. Onye ọ bụla pụrụ ịnagide okwu a, ya nagide ya.”


MATIU 19:14
Ma Jisọs sịrị ha, “Kweenụ ka ụmụntakịrị bịakwute m, unu egbochikwala ha. Nꞌihi na alaeze eluigwe bụ nke ndị dị otu a.”


MATIU 19:17
Jisọs zara sị ya, “Gịnị mere i ji na-ajụ m ajụjụ banyere ihe ziri ezi? Ọ bụ nanị Chineke bụ ezi onye. Ọ bụrụ na ị chọrọ iketa alaeze eluigwe gaa debe iwu nile Chineke nyere.”


MATIU 19:21
Jisọs zara sị ya, “Ọ bụrụ na ị chọrọ ịbụ onye zuru oke nꞌezie, laa nꞌụlọ gị ree ihe nile i nwere. Nyekwa ndị ogbenye ego i retara. Ị ga-enwe akụ na ụba nꞌeluigwe. Bịakwa soro m.”


MATIU 20:1
“Ihe ọzọ a ga-eji tụnyere alaeze eluigwe bụ nwoke nwere ala ubi, onye pụrụ nꞌisi ụtụtụ ịkpọta ndị ọrụ ga-arụ ọrụ nꞌubi ya.


MATIU 22:1
Jisọs tụrụ ilu dị iche iche iji kọwaa ihe alaeze eluigwe yiri.


MATIU 22:2
Nke a bụkwa ilu ọzọ: “Alaeze eluigwe dị ka otu nwoke bụ eze, nke kpọrọ oriri ọlụlụ nwụnye, nꞌihi ọkpara ya.


MATIU 22:30
Nꞌihi na mgbe e mere ka ndị mmadụ site nꞌọnwụ bilie, ịlụ di na nwụnye agaghị adịkwa. Nꞌihi na mmadụ nile ndị a ga-adị ka ndị mmụọ ozi nꞌeluigwe.


MATIU 23:9
Unu akpọkwala onye ọ bụla nꞌụwa a Nna, nꞌihi na ọ bụ nanị Chineke dị nꞌeluigwe ka unu nwere dị ka Nna unu.


MATIU 23:13
“Ahụhụ dịrụ unu ndị Farisii na ndị ozizi iwu, ndị ihu abụọ! Nꞌihi na unu na-emechibido ndị ọzọ ụzọ ha gasi bata nꞌalaeze eluigwe, ma unu onwe unu adịghị abata, unu adịkwaghị enye ndị ọzọ ohere ịbata. Ahụhụ dịrị unu ndị ozizi iwu na ndị Farisii, ndị ihu abụọ! Nꞌihi na unu na-eme dị ka ndị dị nsọ site nꞌikpe ogologo ekpere nꞌakụkụ ụzọ nile ka mmadụ hụ unu. Ma unu na-eripịa akụ dị nꞌụlọ ndị inyom di ha nwụrụ. Unu ga-anata ikpe ọmụma.


MATIU 23:22
Mgbe mmadụ jikwa eluigwe ṅụọ iyi, ọ bụ ocheeze Chineke na onye nọdụrụ nꞌelu ocheeze ahụ ka o ji ṅụọ iyi.


MATIU 24:27
Nꞌihi na mụ, bụ Nwa nke mmadụ, ga-abịa dị ka amụma eluigwe, nke a na-ahụ anya site nꞌọwụwa anyanwụ ruo nꞌọdịda anyanwụ.


MATIU 24:29
“Ngwangwa, mgbe mkpagbu nke ụbọchị ahụ nile gabigasịrị, anyanwụ ga-agba ọchịchịrị. Ọnwa agaghị enyekwa ìhè na mbara eluigwe. Ndị nile nọ nꞌụwa ga-eru uju nꞌụbọchị ahụ, mgbe mba dị iche iche ga-ahụ m, ka m na-abịa nꞌike na ebube, site nꞌime igwe ojii nke eluigwe.


MATIU 24:31
Aga m ewerekwa olu opi ike zipụ ndị mmụọ ozi ka ha gaa kpọkọtaa ndị nile a họpụtara site nꞌakụkụ nile nke eluigwe na ụwa.


MATIU 24:35
“Eluigwe na ụwa ga-agabiga ma okwu m nile ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.


MATIU 25:1
“A ga-eji alaeze eluigwe tụnyere akụkọ ụmụ agbọghọ iri ndị weere iheọkụ ha pụta izute onye na-alụ nwụnye ọhụrụ.


MATIU 25:14
“A ga-ewerekwa alaeze eluigwe tụnyere akụkọ otu nwoke chọrọ ịga obodo ọzọ. Ọ kpọkọtara ndị ohu ya nile nye ha ego nꞌotu nꞌotu, ka ha jiri ya malite ịzụ ahịa tutuu ruo mgbe ọ ga-alọta.


MATIU 26:64
Jisọs zara ya sị, “Ee, abụ m ya. Nꞌezie asị m unu, na mgbe na-adịghị anya, unu ga-ahụ m, bụ Onye nzọpụta ahụ, ka m na-anọdụ nꞌaka nri Chineke. Unu ga-ahụkwa m mgbe m ga-abịa nꞌigwe ojii nke eluigwe.”


MATIU 28:2
Na mberede, oke ala ọma jijiji malitere. Mmụọ ozi Onyenwe anyị sitere nꞌeluigwe rịdata, kpụgharịa nkume ahụ e ji mechie ọnụ ili ahụ e nyibere Jisọs, nọkwasịkwa nꞌelu ya.


MATIU 28:18
Jisọs bịara ha nso, gwa ha okwu sị, “E werela ike nile dị nꞌeluigwe na nꞌelu ụwa nye m.


MAK 1:10
Mgbe Jisọs si nꞌime mmiri ahụ na-apụta, oge Jọn mechara ya baptizim, ọ hụrụ ka eluigwe meghere, hụkwa ka Mmụọ Nsọ si nꞌeluigwe rịdata dị ka nduru, bekwasị Jisọs nꞌisi.


MAK 1:11
Nꞌotu oge ahụ kwa, olu dị ukwuu sitere nꞌeluigwe daa sị, “Ị bụ Ọkpara m, onye m hụrụ nꞌanya. Ihe nile banyere gị na-enye m obi ụtọ.”


MAK 3:17
Jemes na Jọn ụmụ Zebedi. Jisọs nyere ha aha ọzọ, nke bụ, Ụmụ egbe eluigwe.


MAK 7:34
Mgbe ọ na-eme ihe ndị a o leliri anya nꞌeluigwe sụọ ude nꞌime onwe ya gwa nwoke ahụ okwu sị ya, “Ef fata,” nke pụtara “Meghee!”


MAK 8:11
Mgbe Jisọs ruru nꞌebe ahụ, ndị Farisii bịakwutere ya bido ịjụ ya ajụjụ. Ha gwara Jisọs okwu sị ya, “Ị bụrụ ihe ahụ ị sị na ị bụ, mee ka ihe dị egwu mee na mbara eluigwe. Mgbe ahụ anyị ga-ekwere na ị bụ onye ahụ.”


MAK 10:21
Jisọs lere nwoke ahụ anya, hụ ya nꞌanya. Mgbe ahụ ọ gwara nwoke ahụ sị, “Ọ fọdụrụ nanị otu ihe ị ga-eme. Laa ugbu a, ree ihe nile i nwere, nyekwa ndị ogbenye ego i retara. I mesịa nke a, ị ga-enwe akụ nꞌeluigwe. Mgbe ahụ bịaghachi soro m.”


MAK 11:10
“Ngọzi dịrị alaeze ahụ na-abịa, alaeze nna anyị Devidi! Ka Chineke site nꞌeluigwe gọzie ya!”


MAK 11:25
Kama, mgbe unu na-ekpe ekpere, unu ebula iro nꞌobi unu megide onye ọ bụla. Burunụ ụzọ gbaghara onye ahụ, ka Nna unu bi nꞌeluigwe gbaghara unu mmehie unu.


MAK 11:26
“Ma ọ bụrụ na unu ajụ ịgbaghara, Nna unu bi nꞌeluigwe agaghị agbaghara unu mmehie unu.”


MAK 12:25
Nꞌihi na mgbe ụmụnne asaa ahụ ga-esi nꞌọnwụ bilie, ha agaghị alụkwa di na nwụnye, nꞌihi na ha ga-adị ka ndị mmụọ ozi nọ nꞌeluigwe.


MAK 13:25
Kpakpando ga-esi na mbara eluigwe daa. Mbara eluigwe ga-amakwa jijiji.


MAK 13:26
“Nꞌoge ahụ, mmadụ nile, nꞌebe nile, ga-ahụ m, Nwa nke mmadụ, ka m ji ike dị ukwuu na ebube na-abịa nꞌime igwe ojii nke eluigwe.


MAK 13:31
Eluigwe na ụwa ga-agabiga ma okwu m ga-adịgide tutuu ihe nile m kwuru emezuo.


MAK 14:62
Jisọs zara sị ya, “Ee, abụ m ya. Ọ bụkwa eziokwu ka m na-agwa unu mgbe m na-asị, na unu ga-ahụ m, bụ Nwa nke mmadụ, ka m sooro Chineke nọdụ nꞌaka nri ocheeze ya nꞌeluigwe. Unu ga-ahụkwa m ka m na-abịaghachi nꞌigwe ojii nke mbara eluigwe.”


MAK 16:19
Mgbe Onyenwe anyị Jisọs gwasịrị ha okwu ndị a, e weliri ya elu, baa nꞌeluigwe, ebe ọ nọdụrụ nꞌakụkụ aka nri Chineke.


LUK 1:78
Nꞌihi na site nꞌoke obiọma Chineke, anyị ga-abanye na mgbe na-adịghị anya, nꞌụbọchị ọhụrụ nke na-eweta nzọpụta si nꞌeluigwe bịa.


LUK 2:13
Mgbe mmụọ ozi a kpụ okwu ndị a nꞌọnụ na-ekwu, na mberede, igwe mmụọ ozi pụtara soro mmụọ ozi a, ee, ọtụtụ igwe mmụọ ozi nke eluigwe pụtara, soro mmụọ ozi a bido ịbụ abụ na ito Chineke na-asị,


LUK 2:14
“Otuto dịrị Chineke nꞌebe kachasị elu nke eluigwe, udo nꞌelu ụwa nye ndị nile ihe ha dị Chineke mma.”


LUK 2:15
Mgbe ndị mmụọ ozi a laghachiri nꞌeluigwe, ndị ọzụzụ atụrụ sịrịtara onwe ha, “Bịanụ ka anyị jeruo Betilehem, ka anyị jiri anya anyị hụ ihe ndị a dị egwu nke Onyenwe anyị gwara anyị site nꞌọnụ mmụọ ozi.”


LUK 3:21
Otu ụbọchị Jisọs sooro igwe mmadụ bịa ka Jọn mee ya baptizim. Mgbe Jọn mesịrị ndị mmadụ baptizim, o mekwara Jisọs baptizim. Ma mgbe Jisọs nọ na-ekpe ekpere, oge e mesịrị ya baptizim, eluigwe meghere.


LUK 6:20
Mgbe ihe ndị a na-eme, Jisọs tụgharịrị lee ndị na-eso ụzọ ya anya gwa ha okwu sị, “Lee obi ụtọ dịrị unu, ndị ogbenye, nꞌihi na alaeze eluigwe bụ nke unu.


LUK 6:23
Nụrịanụ ọṅụ mgbe ihe ndị a na-adakwasị unu, teekwanụ egwu ọṅụ, nꞌihi na ụgwọ ọrụ unu ga-adị ukwuu nꞌeluigwe. Nꞌihi na ọ bụkwa otu a ka nna nna ha siri meso ndị amụma.


LUK 6:36
“Ya mere, nweenụ obi ebere dị ka nna unu bi nꞌeluigwe si enwe obi ebere.


LUK 9:16
Emesia, Jisọs weere ogbe beredi ise na azụ abụọ ndị ahụ lelie anya nꞌeluigwe. O kelere Chineke ekele nꞌihi ha, nyawaa ha, nye ndị na-eso ụzọ ya ka ha kee ndị mmadụ ahu.


LUK 9:31
Ha pụtara nnọọ nꞌebube nke eluigwe soro Jisọs na-ekwu okwu banyere otu ọ ga-esi mezuo uche Chineke, site nꞌọnwụ nke ọ ga-anwụ na Jerusalem.


LUK 9:35
Mgbe ahụ, ha nụrụ olu si nꞌeluigwe kwuo okwu sị, “Onye a bụ Ọkpara m onye m họpụtara.”


LUK 9:51
Mgbe oge Jisọs ji alaghachi nꞌeluigwe na-abịa nnọọ nso, o kpebiri nꞌobi ya ịga Jerusalem.


LUK 9:54
Mgbe Jemes na Jọn hụrụ na ndị Sameria jụrụ ịnabata Jisọs, ha gwara Jisọs sị, “Onyenwe anyị, ị chọrọ ka anyị nye iwu ka ọkụ site nꞌeluigwe bịa laa ha nꞌiyi?”


LUK 10:15
Ma gị obodo Kapanọm! Ị̀ na-eche na a ga-ebuli gị elu ruo eluigwe? Mba! Ị ga-arịdaru ala mmụọ!”


LUK 10:18
Mgbe ahụ Jisọs kwuru okwu sị, “Ahụrụ m ekwensu ka o si nꞌeluigwe daa dị ka mgbe amụma na-egbu na mbara eluigwe.


LUK 10:20
Otu ọ dị, unu aṅụrịla ọṅụ nꞌihi na mmụọ ọjọọ rubere isi mee ihe unu nyere ha nꞌiwu, kama ṅụrịanụ ọṅụ nꞌihi na e deela aha unu nꞌeluigwe.”


LUK 10:21
Mgbe ahụ, Jisọs, onye jupụtara nꞌọṅụ nke Mmụọ Nsọ kwuru okwu sị, “Nna, Onyenwe eluigwe na ụwa, ekelee m gị nꞌihi na i zonarịrị ihe ndị a nꞌebe ndị ọkachamara na ndị ukwu nwere amamihe nọ, ma ị kpughere ihe ndị a nile nye ndị na-amaghị ihe ọ bụla. Ee, Nna, ọ bụ gị siri otu a mee ya, nꞌihi na otu ahụ bụ ụzọ i siri chọọ ya.


LUK 10:25
Otu ụbọchị otu onye ozizi iwu bịakwutere Jisọs ịnwa ya ọnwụnwa. Ọ jụrụ ya ajụjụ sị ya: “Onye ozizi, gịnị ka mmadụ ga-eme ma ọ bụrụ na ọ chọọ iketa eluigwe?”


LUK 11:13
“Ọ bụrụ na unu ndị ajọ omume pụrụ inye ụmụ unu ezi ihe, unu echeghị na nna unu bi nꞌeluigwe ga-esitekwa otu a were Mmụọ Nsọ ya nye ndị rịọrọ ya?”


LUK 11:16
Ndị ọzọ nwakwara ya ọnwụnwa sị ya gosi ha ihe ịrịba ama na mbara eluigwe iji gosi na ọ bụ Onye nzọpụta.


LUK 12:30
Nꞌihi na ọ bụ nanị ndị na-amaghị Chineke na-echegbu onwe ha banyere ihe ndị a. Nna unu bi nꞌeluigwe maara na ihe ndị a dị unu mkpa.


LUK 12:33
Reenụ ihe nile unu nwere nye ndị ogbenye. Nke a ga-eme ka akpa unu, nke dị nꞌelu, ju eju. Akpa ahụ dị nꞌelu epughị epu. Akụ unu dị nꞌeluigwe enwekwaghị ike ifu efu. Onye ohi ọ bụla enwekwaghị ike ịga nꞌebe ahụ zuo ha, nla apụkwaghị iricha ha


LUK 12:56
Ndị ihu abụọ! Unu nwere ike isite nanị nꞌile anya na mbara eluigwe mata ma mmiri ọ ga-ezo, ma ọ bụ na ọkọchị ga-akọ. Ma unu enweghị ike isite nꞌihe ndị a nile na-eme nꞌanya unu ugbu a mata ihe oge a anyị nọ nꞌime ya bụ.


LUK 13:24
Jisọs zara ya sị, “Ọnụ ụzọ e si abanye nꞌeluigwe dị warara. Ya mere, gbalịsie ike ịbanye. Nꞌihi na ọtụtụ ga-achọ ịbata ma ha agaghị enwe ike ịbanye.


LUK 15:7
“Nꞌụzọ dị otu a, ọṅụ na-adị nꞌeluigwe nꞌihi otu onye mmehie nke chegharịrị, karịa ndị ezi omume iri toolu na toolu ndị mkpa nzọpụta na-adịghị akpa.


LUK 15:10
Nꞌụzọ dị otu a kwa, ndị mmụọ ozi na-ejere Chineke ozi nꞌeluigwe na-aṅụrị ọṅụ mgbe otu onye mmehie chegharịrị.”


LUK 16:11
Ọ bụrụ na mmadụ enweghị ike tụkwasị gị obi ilekọtazi akụ na ụba nke ụwa a, onye kwanụ ga-atụkwasị gị obi nye gị ezi akụ nke eluigwe?


LUK 16:17
Ma nke a egosighị na ihe Mosisi dere abakwaghị uru. Nꞌezie, ọ dị mfe eluigwe na ụwa ịhapụ ịdịkwa karịa na akwụkwọ iwu ahụ ga-abụ ihe na-abaghị uru.


LUK 17:20
Ụfọdụ ndị Farisii jụrụ Jisọs ajụjụ sị ya, “Olee mgbe alaeze Chineke ga-abịa?” Jisọs zara ha sị, “Alaeze eluigwe adịghị abịa nꞌụzọ ndị mmadụ ga-eji anya ha hụ ya.


LUK 17:24
Nꞌihi na dị ka mmadụ si ahụ ìhè mgbe ọ bụla amụma eluigwe gburu na mbara eluigwe site nꞌotu ebe ruo nꞌebe ọzọ, otu a ka ndị mmadụ ga-ahụ m mgbe m ga-alọghachi.


LUK 17:29
Ma nꞌụbọchị ahụ Lọt si nꞌobodo Sodọm pụọ, Chineke sitere nꞌeluigwe wụkwasị ndị obodo ahụ ọkụ na nkume na-enwu enwu nke rechapụrụ ndị nile bi nꞌobodo ahụ, laa obodo ahụ nile nꞌiyi.


LUK 18:13
“Ma onye ọnaụtụ guzo nꞌebe dị anya enweghị ike iweli isi ya elu lee anya nꞌeluigwe. Kama ọ nọ ebe ahụ tie aka nꞌobi na mwute gwa Chineke okwu sị, ‘Chineke m, biko meere m ebere nꞌihi na abụ m onye mmehie!’


LUK 18:18
Otu onyendu ndị Juu bịakwutere Jisọs jụọ ya ajụjụ sị, “Ezi onye ozizi, gịnị ka m kwesịrị ime ma ọ bụrụ na m achọọ iketa alaeze eluigwe?”


LUK 18:22
Mgbe Jisọs nụrụ ihe nwoke ahụ kwuru, ọ gara nwoke ahụ sị, “Ọ fọdụrụ nanị otu ihe i kwesịrị ime. Laa nꞌụlọ gị, ree ihe nile i nwere. Kesaa ego i retara nye ndị ogbenye. I mechaa nke a ị ga-enwe akụ nꞌeluigwe, bịa soro m.”


LUK 19:38
Ha na-eti mkpu na-asị, “Chineke gọzie eze ahụ na-abịa nꞌaha Onyenwe anyị! Ka udo dị nꞌeluigwe! Ka otuto dịkwa nꞌebe kachasị elu nke eluigwe!”


LUK 21:11
A ga-enwe ala ọma jijiji dị ukwuu. Ụnwụ na ọrịa ọjọọ dị iche iche ga-adịkwa nꞌebe dị iche iche. A ga-ahụ ihe ga-eweta egwu na mbara eluigwe na ihe ngosi dị egwu.


LUK 21:26
Ndị mmadụ ga-ada mba nꞌihi ụjọ nke ga-atụ ha maka ihe na-abịakwasị ụwa. Nꞌihi na a ga-eme ka ike nile jikọtara eluigwe maa jijiji.


LUK 21:27
Nꞌoge ahụ ndị mmadụ ga-ahụ Nwa nke mmadụ ka m ji ike na ebube dị egwu na-abịa nꞌigwe ojii nke mbara eluigwe.


LUK 21:33
Eluigwe na ụwa pụrụ ịgabiga, bụrụ ihe na-agaghị adịkwa, ma okwu m ndị a agaghị agabiga.


LUK 22:43
Nꞌoge ahụ Chineke sitere nꞌeluigwe zite ndị mmụọ ozi bịara gbaa ya ume.


JỌN 1:14
Okwu ahụ ghọrọ mmadụ, gbokwasị onwe ya ọdịdị mmadụ, sorokwa mmadụ bikọọ nꞌụwa a. O jupụtara nꞌamara na eziokwu. Anyị hụkwara ebube ya, ebube ahụ a pụrụ ịhụ nanị na ndụ onye bụ Ọkpara Chineke Nna nke eluigwe.


JỌN 1:16
Anyị sitere nꞌaka ya nata amara pụrụ iche, nꞌokpukpu nꞌokpukpu, amara sitere nꞌeluigwe bịa.


JỌN 1:32
Nke a bụ ama Jọn gbara: “Ahụrụ m ka eluigwe meghere, hụkwa Mmụọ Nsọ ka ọ rịdatara dị ka nduru bekwasị nwoke a nꞌisi.


JỌN 1:51
Ị ga-ahụ ka eluigwe meghere, hụkwa ndị mmụọ ozi Chineke ka ha na-arigo naarịdatakwa ịbịakwute m bụ Onye nzọpụta.”


JỌN 3:12
Ọ bụrụ na unu ekwereghị nꞌihe ndị a na-eme nꞌetiti mmadụ nꞌime ụwa, unu ga-esi aṅaa kwere ma ọ bụrụ na m agwa unu ihe banyere ihe dị nꞌeluigwe?


JỌN 3:13
Ọ gwụchaala Onye nzọpụta ahụ si nꞌeluigwe rịdata. Ọ bụkwa mụ onwe m bụ ya. Ọ bụkwa m ga-alaghachi azụ nꞌeluigwe.


JỌN 3:19
E mere ka ikpe Chineke ma ha, nꞌihi na ha hụrụ ọchịchịrị nꞌanya karịa ìhè nke si nꞌeluigwe bịa. Nꞌihi na ha bụkwa ndị na-eme ihe ọjọọ dị iche iche.


JỌN 3:27
Ma Jọn kọwaara ha sị, “Nanị Chineke na-esi nꞌeluigwe kenye onye ọ bụla ọrụ nke ọ na-aghaghị ịrụ.


JỌN 3:31
“Onye ahụ si nꞌelu bịa dị ukwuu karịa onye ọ bụla. Onye a mụrụ nꞌụwa bụ mmadụ efu, okwu ya nile bụkwa okwu gbasara ihe dị nꞌụwa. Ma Onye ahụ si nꞌeluigwe bịa dị elu nke ukwuu karịa onye ọ bụla.


JỌN 4:36
Ndị ga-aghọ ha ga-enwe ụgwọ ọrụ dị mma. Ha ga-aghọtakwa mkpụrụ obi ndị ga-abanye nꞌime ọba nke eluigwe. Lee! ọṅụ dị ukwuu dị na-eche ndị na-akụ mkpụrụ na ndị na-ewe ihe ubi a.


JỌN 5:45
“Agaghị m ebo unu ihe ọ bụla nꞌebe Nna nọ. Mosisi bụ onye ga-ebo unu ebubo nile. Ee, Mosisi ahụ unu na-atụkwasị obi na ọ ga-eduba unu nꞌeluigwe.


JỌN 6:31
Nna anyị ha riri mana mgbe ha jegharịrị nꞌọzara. Nꞌihi na akwụkwọ nsọ kwuru sị, ‘O si nꞌeluigwe nye ha achịcha ha riri.’ ”


JỌN 6:62
Ọ gwakwara ha sị, “Gịnị ka unu ga-ekwu mgbe unu ga-ahụ Nwa nke mmadụ ka ọ na-alaghachi nꞌeluigwe?


JỌN 7:39
(Jisọs na-ekwu okwu banyere Mmụọ Nsọ nke ndị kweere na ya ga-anata. Nꞌoge ahụ Mmụọ Nsọ abịabeghị nꞌihi na Jisọs alaghachibeghị nꞌebube ya nꞌeluigwe).


JỌN 8:23
Jisọs sịrị ha, “Unu si nꞌụwa ma esi m nꞌelu bịa. Unu bụkwa ndị ụwa, ma abụkwaghị m nke ụwa. Kama esitere m nꞌeluigwe bịa.


JỌN 12:16
Nꞌoge ahụ, ndị na-eso ụzọ ya aghọtaghị na Jisọs na-emezu ihe e dere nꞌakwụkwọ nsọ. Ọ bụ nanị mgbe Jisọs laghachiri nꞌeluigwe, ka ha chọpụtara na ọtụtụ ihe ndị amụma dere banyere ya mezuru.


JỌN 12:28
Nna m biko wetara aha gị ugwu na otuto.” Olu siri nꞌeluigwe kwuo okwu sị, “Enyela m aha m otuto. Aga m enyekwasịkwa aha m otuto ọzọ.”


JỌN 12:29
Igwe ndị mmadụ guzo nꞌebe ahụ, ndị nụrụ olu ahụ kwuru sị, “Ọ bụ egbe eluigwe.” Ụfọdụ sịrị, “Ọ bụ mmụọ ozi na-agwa ya okwu.”


JỌN 17:1
Mgbe Jisọs kwusịrị okwu ndị a, o legidere anya nꞌeluigwe sị, “Nna, oge ahụ a kara aka eruola. Biko, nye Ọkpara gị otuto, ka Ọkpara gị nyekwa gị otuto.


JỌN 20:17
Jisọs sịrị ya, “Emetụla m aka nꞌihi na alakwurubeghị m Nna m nꞌeluigwe. Kama gaa chọta ụmụnna m gwa ha na m na-alakwuru Nna m na Nna unu. Ana m alakwuru Chineke m na Chineke unu kwa.”


ỌLU OZI 1:2
Agwakwara m gị otu o siri laghachi nꞌeluigwe mgbe o nyesịrị ndị na-eso ụzọ ya ndụmọdụ site nꞌike Mmụọ Nsọ. Ndị ahụ bụ ndị na-eso ụzọ ya ọ họpụtara.


ỌLU OZI 1:11
Mmadụ abụọ ndị a jụrụ ha sị, “Ndị Galili, gịnị mere unu ji guzo nꞌebe a na-ele anya nꞌeluigwe? Jisọs alaala nꞌeluigwe. Otu ụbọchị unu ga-ahụkwa ya anya ọzọ, ka ọ na-alọta dị ka unu hụrụ ya taa, ka ọ na-ala nꞌeluigwe!”


ỌLU OZI 1:21
“Nꞌihi ya, anyị ga-ahọpụta onye ọzọ nꞌọnọdụ ya. Ka ọ bụrụ otu nꞌime anyị. Ka o soro anyị gbakọọ ama banyere mbilite nꞌọnwụ Jisọs. Ka anyị site nꞌetiti anyị họpụta onye naara eso anyị na-ejegharị site na mbụ, site nꞌoge Jọn mere baptizim ya tutuu ruo nꞌụbọchị ahụ Jisọs laghachiri nꞌeluigwe.”


ỌLU OZI 2:2
Na mberede, ha nụrụ ụzụ si nꞌeluigwe. Ụzụ a dị nꞌụdị ifufe dị ike. Ụzụ ahụ jupụtara nꞌụlọ ahụ ha nọ.


ỌLU OZI 2:19
A ga-eme ka ihe ịtụnanya dị iche nke anya unu ga-ahụ mee na mbara eluigwe. Aga m arụkwa ọrụ ebube nꞌụwa. Unu ga-ahụ ọbara na ọkụ, na anwụrụ ọkụ bara ụba, dị ka igwe ojii.


ỌLU OZI 2:33
“Ugbu a, e buliela Jisọs elu. Ọ nọdụrụ nꞌakụkụ Chineke nꞌocheeze ya nꞌeluigwe. Ọ natala nkwa nke Mmụọ Nsọ, site nꞌaka Chineke. Ugbu a ọ na-awụsịkwa ike Mmụọ Nsọ ahụ. Unu onwe unu bụkwa ndị akaebe na nke a bụ eziokwu.


ỌLU OZI 2:34
“Ọ dịghị oge Devidi jiri rigoro gaa nꞌeluigwe. Ma ya onwe ya sịrị, ‘Chineke gwara Onyenwe m, nọdụ nꞌebe a nꞌaka nri m,


ỌLU OZI 3:21
Onye nọ nꞌeluigwe ugbu a. Ebe ahụ ka ọ ga-anọgide tutuu e dozie ihe nile. Nꞌihi na otu a ka Chineke kwuru site nꞌọnụ ndị amụma ya na mgbe ochie.


ỌLU OZI 4:24
Mgbe ha nụrụ akụkọ a, ha nile jiri otu obi kpọkuo Chineke sị, “Onyenwe anyị, onye kere eluigwe na ụwa, na osimiri, na ihe nile dị nꞌime ha.


ỌLU OZI 7:49
Chineke kwuru sị, ‘Eluigwe bụ ebe ocheeze m dị. Ụwa bụkwa ebe izuike nye ụkwụ m. Ụdị ụlọ dị aṅaa ka unu ga-ewu? M ga-ebi nꞌime ya? Ana m achọ ebe m ga-anọ zuo ike?


ỌLU OZI 7:50
Ọ bụghị m mere eluigwe na ụwa?’


ỌLU OZI 7:55
Ma Stivin, nꞌihi na o jupụtara na Mmụọ Nsọ, lere anya nꞌeluigwe hụ ebube Chineke. Ọ hụkwara Jisọs ka o guzoro nꞌaka nri Chineke.


ỌLU OZI 7:56
Ọ gwara ndị Juu ahụ okwu sị, “Lee! Ahụrụ m ka eluigwe meghere, hụkwa Jisọs Onye nzọpụta ka o guzo nꞌaka nri Chineke!”


ỌLU OZI 10:11
Ọ hụrụ ka eluigwe meghere, hụkwa efere buru ibu ka o sitere nꞌeluigwe na-arịdata nꞌebe ọ nọ.


ỌLU OZI 10:16
E mere ka Pita hụ ọhụ ahụ ugboro atọ. Ma mgbe nke a gasịrị, a napụrụ efere ahụ site nꞌebe ọ nọ, weghachikwa ya nꞌeluigwe.


ỌLU OZI 11:5
Ọ gwara ha sị, “Otu ụbọchị, mgbe m nọ nꞌobodo Jopa, ahụrụ m ọhụ nꞌoge m na-ekpe ekpere. Nꞌime ọhụ a, ahụrụ m ihe yiri efere buru ibu. E budatara ya nꞌihu m. Efere a nwekwara ụkwụ igwe anọ. E sitekwara nꞌeluigwe zidata ya.


ỌLU OZI 11:10
“Ihe ndị a nile mere ugboro atọ. Emesịa, e wepụrụ efere ahụ ya na ihe nile dị ya nꞌime, weghachi ya nꞌeluigwe.


ỌLU OZI 14:15
“Ndị ikom obodo a! gịnị ka unu na-achọ ime? Lee, anyị bụkwa mmadụ dị ka unu. Ọ bụ ozi ọma ka anyị wetaara unu. Anyị chọrọ ka unu site nꞌịsọpụrụ ihe ndị a na-abaghị uru, bụ nke unu na-efe site na-amaghị ama bịakwute Chineke dị ndụ. Ọ bụ Chineke kere eluigwe na ụwa, na oke osimiri na ihe nile dị nꞌime ha.


ỌLU OZI 17:24
“Chineke bụ onye kere ụwa na ihe nile dị nꞌime ya. Ebe ọ bụ onye nwe eluigwe na ụwa, ọ dịghị ebikwa nꞌụlọ e jiri aka wuo.


ỌLU OZI 19:35
Nꞌikpeazụ, onye na-elekọta obodo, kwụsịrị ha nꞌụzụ a. Ọ gwara ha okwu sị, “Ndị ikom Efesọs, onye ọ bụla maara na obodo Efesọs bụ obodo a maara aha ya nꞌihi chi anyị a na-akpọ Daịana onye oyiyi ya si nꞌeluigwe daara anyị.


ỌLU OZI 22:6
“Ma mgbe m na-aga nꞌụzọ, nꞌebe dị Damaskọs nso, ìhè si nꞌeluigwe, nke na-enwụ karịa ìhè anyanwụ kpuchigidere m.


ỌLU OZI 26:13
Otu ụbọchị nꞌoge ehihie, mgbe mụ na ndị otu m na-aga nꞌụzọ Damaskọs, ìhè dị ka amụma egbe eluigwe sitere nꞌeluigwe chaa anyị gburugburu.


ỌLU OZI 26:19
“Ya mere, eze Agripa, enupụghị m isi nꞌọhụ nke eluigwe ahụ.


ỌLU OZI 27:9
Ebe a ka anyị nọrọ ọtụtụ ụbọchị. Ma ihu eluigwe adịghị mma inye mmadụ nkasịobi ịnyalị ụgbọ ije ebe dị anya nꞌihi na ugbu a oge ịchụ aja ngabiga agafeela. Pọl gwara ndị isi ụgbọ ahụ okwu sị,


ỌLU OZI 27:14
Ma ọ dịghị anya ihu eluigwe gbanwere, oke ifufe bidoro na-efe. O buuru ụgbọ mmiri anyị buba ya nꞌosimiri.


ỌLU OZI 27:20
Oke ifufe ọjọọ ahụ magharịrị ọtụtụ ụbọchị na-enweghị nkwụsị. Eluigwe hujiri ehuji, anyị ahụkwaghị anwụ ma ọ bụ kpakpando ọ bụla anya tutuu ruo nꞌikpeazụ olileanya anyị nile gwụsịrị.


ROM 1:18
Nꞌihi na e sitela nꞌeluigwe mee ka iwe Chineke pụta ìhè megide mmehie na ajọ omumue nile nke ndị na-emebi iwu, ndị na-esite nꞌajọ omume ha na-eguzogide eziokwu ahụ.


ROM 1:20
Site nꞌoge Chineke kere ụwa na ihe nile dị nꞌime ya, ụmụ mmadụ ahụla ụwa na eluigwe, na ihe nile Chineke kere eke. Ha sitekwara nꞌihe ndị a mata ụdị ike ebighị Chineke nwere. Ya mere, ebe ọ bụ na ha maara ihe ndị a nile, ha enwekwaghị ngọpụ ọ bụla nꞌụbọchị ikpe ahụ ha gaeguzo nꞌihu Chineke.


ROM 8:38
Nꞌihi na nke a bụ ihe m maara nke ọma, bụrụkwa ihe doro m anya, na ọ dịghị ihe pụrụ ikewapụ anyị site nꞌịhụnanya Chineke. Ọnwụ, ma ọ bụ ndụ enweghị ike ya, ndị mmụọ ozi ma ọ bụ ike nile dị nꞌeluigwe enweghị ike igbochi Chineke ịhụ anyị nꞌanya. Ọ bụladị ihe ọjọọ nile na-eme nꞌụwa taa, na nchegbu banyere ihe ga-eme echi, apụghị igbochi ịhụnanya Chineke.


ROM 8:39
Ịhụnanya Chineke ga-erute anyị ebe ọ bụla anyị nọ, nꞌelu mbara eluigwe, ma ọ bụ nꞌokpuru osimiri nke ụwa. Nꞌezie, ọ dịghị ihe ọ bụla Chineke kere eke pụrụ ikewapụ anyị site nꞌịhụnanya Chineke.


ROM 10:6
Ma nzọpụta ahụ si nꞌokwukwe rute mmadụ aka adịghị ajụ ajụjụ sị, “Ònye pụrụ irigo nꞌeluigwe ịchọta Kraịst kudata ya nꞌụwa ka o nyere anyị aka?”


1 KỌRINT 1:22
Ozi ọma a bụ ihe nzuzu nye ndị Juu nꞌihi na ha chọrọ ịhụ ihe ịrịba ama na mbara eluigwe nke ga-egosi ha na ozi ọma a bụ eziokwu tupuu ha ekwere. Ọ bụ ihe nzuzu nye ndị mba ọzọ, nꞌihi na ihe ha na-anabata bụ nanị ozizi nke ya na usoro oke mmụta ha na-adakọta.


1 KỌRINT 2:7
Kama okwu anyị na-ekwusa bụ okwu amamihe, nꞌihi na o si nꞌebe Chineke nọ bịa. Ọ bụ okwu nke na-akọwa nzube zoro ezo nke Chineke, nzube ahụ Chineke zubere tupuu o kee ụwa, iwebata anyị nꞌotuto ya nꞌeluigwe.


1 KỌRINT 6:3
Ọ̀ bụ na unu amatakwaghị na ọ bụ anyị ga-ekpe ndị mmụọ ozi nọ nꞌeluigwe ikpe? Gịnị ga-emekwa ka anyị ghara idozi nsogbu nile dapụtara nꞌetiti anyị nꞌụwa a?


1 KỌRINT 8:5
A sịkwa na arụsị a na-akpọ chi dị, ma ha nọ nꞌeluigwe ma ọ bụ nꞌụwa nꞌezie, ọtụtụ chi na ndị nwe mmadụ dị otu a dị.


1 KỌRINT 9:25
Mgbe ọgba ọsọ na-ejikere ịgba ọsọ ya, ọ na-enwe ntachi obi nꞌọtụtụ ahụhụ nke ya na ọzụzụ so. Ma ọgba ọsọ a na-azụ onwe ya nanị ka o nweta okpu mmeri okoko osisi na-emebi emebi, ma ọ bụ iko ọlaọcha. Ma ọsọ anyị na-agba bụ ka anyị nweta okpu mmeri nke eluigwe nke na-adịghị emebi emebi.


1 KỌRINT 15:40
Ndị nọ nꞌeluigwe nwekwara anụ ahụ nke ha, nke dịkwa iche site na nke anyị ndị bi nꞌụwa. Ịma mma ha na ebube nke ndị nọ nꞌeluigwe dịkwa iche na nke ndị bi nꞌụwa.


1 KỌRINT 15:47
E si nꞌịta kee Adam nwoke mbụ, ma Kraịst, Adam nke ikpeazụ, si nꞌeluigwe bịa.


1 KỌRINT 15:48
Mmadụ nile nwere anụ ahụ dị ka Adam, nke e si nꞌịta kpụọ. Ma ndị nile bụ nke Kraịst ga-enwe ụdị anụ ahụ ahụ Kraịst nwere, anụ ahụ nke si nꞌeluigwe.


2 KỌRINT 5:1
Nꞌihi na anyị matara na mgbe anyị nwụrụ, pụọ site nꞌanụ ahụ anyị ndị a pụrụ ire ure, Chineke ga-enye anyị anụ ahụ ọzọ nke na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi nꞌeluigwe. Anụ ahụ ọ ga-enye anyị abụghị nke e ji aka mee, kama ọ bụ nke Chineke nꞌonwe ya kpụrụ.


2 KỌRINT 5:2
Nꞌezie, anyị nọ ugbu a naasụ ude nꞌime anụ ahụ a anyị nwere. Ọ na-agụsikwa anyị agụụ ike ka e yikwasị anyị anụ ahụ eluigwe ahụ, nke anyị ga-eyikwasị dị ka uwe.


2 KỌRINT 5:3
Nꞌihi na mgbe e yikwasịrị anyị ụdị anụ ahụ nke eluigwe, anyị agaghị abụkwa nanị mmadụ efu.


2 KỌRINT 5:4
Mgbe ahụ nile anyị nọ nꞌime anụ ahụ nke ụwa a, anyị naanọgide nꞌịsụ ude. Ọ bụghị nꞌihi na anyị chọrọ ịnwụ anwụ bụrụ ndị naenweghị anụ ahụ, kama ọ bụ nꞌihi na anyị chọrọ ka e yikwasị anyị anụ ahụ nke eluigwe ahụ, ka anụ ahụ ahụ pụrụ ịnwụ anwụ yikwasị ndụ ebighị ebi.


2 KỌRINT 5:6
Nꞌihi nke a anyị nwere obi ike na ntụkwasị obi mgbe nile, nꞌihi na anyị maara na mgbe anyị na-aga nꞌihu naadị ndụ nꞌụwa a, anyị anọghị nꞌụlọ anyị dị nꞌeluigwe.


2 KỌRINT 5:8
Ya mere, anyị nwere obi ike, ụjọ adịghị atụ anyị. Ọ dị anyị nnọọ ezi mma ịnwụ anwụ anwụ, nꞌihi na site nꞌụzọ dị otu a, anyị ga-alakwuru Onyenwe anyị nꞌụlọ anyị dị nꞌeluigwe.


2 KỌRINT 5:9
Ya mere, ma anyị nọ nꞌeluigwe, anyị na Onyenwe anyị, ma anyị nọ nꞌebe a, nꞌụwa a, uche anyị mgbe nile bụ ime ihe ga-adị ya ezi ụtọ.


2 KỌRINT 12:2
Afọ iri na anọ gara aga Chineke kpọọrọ m gaa nꞌeluigwe. Amaghị m ihe bụ ọnọdụ m ji gaa nꞌebe ahụ, ma ọ bụ nꞌanụ ahụ, ma ọ bụ nꞌime mmụọ. Ọ bụ nanị Chineke maara ihe mere nꞌụbọchị ahụ. Kama ihe doro m anya bụ na agara m nꞌeluigwe.


GALETIA 1:8
Ka ikpe ọmụma Chineke dị nꞌisi onye ọ bụla, ma mụ onwe m kwa, nke ga-ekwusara unu ozi ọma ọzọ dị iche, karịa ozi ọma ahụ anyị kwusaara unu. Ee, ka ikpe ọmụma dịkwa, ọ bụladị nꞌisi mmụọ ozi ọ bụla si nꞌeluigwe bịa kwusaara unu ozi ọma ọzọ dị iche. Ka m kwuokwa ya ọzọ, “Ikpe ọmụma Chineke ga-adakwasị onye ọ bụla kwusaara unu ozi ọma dị iche, karịa ozi ọma ahụ anyị buru ụzọ kwusaara unu.”


GALETIA 4:26
Ma obodo anyị, ebe isi oche okpukpe anyị dị bụ Jerusalem dị nꞌeluigwe. Ọ bụ obodo na-anọghị nꞌohu nye iwu ndị Juu.


EFESỌS 1:3
Ka otuto dịrị Chineke, Onye bụ Nna Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, nꞌihi na ọ gọziri anyị site nꞌinye anyị ngọzi nile nke eluigwe nꞌihi na anyị bụ nke Kraịst.


EFESỌS 1:10
Nke a bụkwa ihe o zubere: Na mgbe oge ahụ ruru, ọ ga-akpọkọta ụmụ ya nile na ihe nile o kere nꞌeluigwe na nꞌụwa, ka Kraịst bụrụ isi ihe nile.


EFESỌS 1:20
Chineke jiri kpọlite Kraịst site nꞌọnwụ, mee ya ka ọ nọdụ nꞌakụkụ aka nri ya nꞌeluigwe.


EFESỌS 1:21
Nꞌebe ahụ ka Kraịst na-achị ndị ọchịchị nile nọ nꞌeluigwe, na ndị isi nile, na ndị nwere ike nile, na ndị nwe mmadụ nile. Ọkwa eze ya dị elu karịa ọkwa eze ndị dị ike nile nọ nꞌụwa a, na nꞌụwa ọzọ.


EFESỌS 2:6
Dị ka o siri kpọlite Kraịst site nꞌọnwụ, otu a ka Chineke siri kpọlitekwa anyị site na ndụ ochie anyị, mee ka anyị soro Kraịst nọkọọ nꞌeluigwe.


EFESỌS 3:10
Gịnị mere Chineke jiri zube ime ihe ndị a? Ọ bụ nꞌihi na ọ chọrọ ka ndị mmụọ ozi nọ nꞌeluigwe mata ịba ụba nke amamihe ya nꞌụzọ dị iche iche dị ka o si na-arụpụta nzube ya nꞌime nzukọ Kraịst bụ chọọchị.


EFESỌS 3:15
Onye ezinụlọ nile dị nꞌụwa a na nke dị nꞌeluigwe na-esite nꞌaka ya enwe aha.


EFESỌS 4:9
Lee na akwụkwọ nsọ kwuru na ọ rigoro nꞌeluigwe! Nke a na-egosi na o buru ụzọ site nꞌeluigwe rịdata jeruo na nsọtụ ala.


EFESỌS 6:9
Ndị a na-ejere ozi, mesonụ ndị na-ejere unu ozi mmeso nꞌụzọ dị otu a. Abarala ha mba. Chetakwanụ na unu na ndị na-ejere unu ozi bụ ohu Kraịst onye nọ nꞌeluigwe. Ọ dịghị ele mmadụ anya nꞌihu mgbe ọ na-eme ihe ọ chọrọ ime.


EFESỌS 6:12
Nꞌihi na ndị na-alụso anyị ọgụ abụghị ndị mmadụ efu. Kama ha bụ ndị na-enweghị anụ ahụ na ọbara, ha bụ ụsụ mmụọ ọjọọ nọ nꞌebe nile dị elu nke eluigwe, ndị na-achị achị, ndị isi ha nile, na ụsụ mmụọ ọjọọ dị ike nke ụwa ọchịchịrị a.


FILIPAI 1:2
Ka Chineke gọzie unu nile. Ọ bụkwa ekpere m ka Chineke nna anyị, onye bi nꞌeluigwe, na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst gọzie unu nile. Ka o nyekwa unu udo zuru oke nꞌime obi unu.


FILIPAI 2:10
Ka e site nꞌịkwanyere ya ugwu, mee ka ndị nile bi nꞌụwa, na ndị bi nꞌeluigwe, na ndị bi nꞌokpuru ụwa, gbuo ikpere ha nꞌala, ịsọpụrụ Jisọs mgbe ọ bụla a kpọrọ aha ya.


FILIPAI 3:14
Ana m agbasi ọsọ ike ịga nꞌihu, iru na njedebe ebe ahụ a ga-agbaru ọsọ, ka m nwee ike inweta ihe ahụ a na-agbata nꞌọsọ, nke Chineke kwadebere inye ndị ya nꞌeluigwe, nꞌihi ọrụ zuru oke ahụ Onyenwe anyị Jisọs Kraịst rụrụ nꞌihi anyị.


FILIPAI 3:20
Ma anyị onwe anyị ụmụnna m, eluigwe bụ ụlọ anyị, ebe Onyenwe anyị Jisọs nọ. Anyị na-elekwa anya mgbe ọ ga-esi nꞌeluigwe lọghachi.


FILIPAI 4:19
Ọ bụ Chineke m ga-egboro unu mkpa unu nile, site nꞌụlọ akụ ebube ya nke eluigwe, nꞌihi ihe Kraịst Jisọs meere anyị.


KỌLỌSI 1:5
Mgbe eziokwu ahu bụ ozi ọma rutere unu, unu nụrụ banyere olileanya dịrị ndị nabatara ya. Nꞌihi ya okwukwe unu na ịhụnaya unu na-ele anya ya, bụ ihe e chebere nke ọma nꞌihi unu nꞌeluigwe.


KỌLỌSI 1:16
Nꞌezie, ọ bụ site nꞌaka Kraịst ka e ji kee ihe nile dị nꞌụwa na nke dị nꞌeluigwe, ndị anyị pụrụ ịhụ anya na ndị anyị na-apụghị ịhụ anya. Ike nile dị iche iche, ma ike nile nke mmụọ dị iche iche, ya na ndị isi ha nile, na alaeze ha, ma ndị na-achị achị nꞌetiti ha, ma ndị na-atụ ihe ga-eme eme. Kraịst kere ihe nile. O kere ha iji ha ịrụ ọrụ dị ka o si dị ya mma, na isite na ha wetara onwe ya otuto.


KỌLỌSI 1:20
Ọ bụ site nꞌihe Ọkpara ya mere ka Chineke ji kpebie ka ụwa nile bịaghachikwute ya. Nꞌihi na site nꞌọnwụ nke Kraịst nwụrụ nꞌelu obe, na ọbara ọ wụsịrị, e meela ka udo dịrị nꞌetiti Chineke na mmadụ nile. Ihe nile dị nꞌụwa na nꞌeluigwe nwekwara ike ịbịakwute Chineke ugbu a.


KỌLỌSI 3:1
Ebe e mere ka unu bụrụ ndị so Kraịst bilie nꞌọnwụ, tụkwasịnụ obi unu nꞌakụ na ọṅụ dị nꞌeluigwe ebe Kraịst nọ nꞌocheeze ya nꞌakụkụ Chineke.


KỌLỌSI 3:2
Ka echiche gbasara eluigwe ju unu obi. Unu atụfukwala oge ichegbu onwe unu banyere ihe dị nꞌụwa.


KỌLỌSI 4:1
Unu ndị nwe odibo, werenụ ezi obi na obi dị umeala na-emeso odibo unu mmeso. Chetakwanụ na ọ dị onye ka unu ukwu, Onyenwe unu, nke bi nꞌeluigwe, onye nọkwa na-ele unu anya.


1 TESALỌNAIKA 1:10
Ha na-akọkwa otu unu si na-ele anya nlọghachi Okpara Chineke site nꞌeluigwe, Jisọs ahụ Chineke mere ka o si nꞌọnwụ bilie, onye bụ Onye nzọpụta anyị site nꞌiwe Chineke dị egwu megide mmehie.


1 TESALỌNAIKA 2:19
Nꞌihi na olee ihe bụ olileanya anyị, ma ọ bụ okpu eze anyị, nke anyị ga-eji nyaa isi? Ọ bụ unu onwe unu. Ee, unu onwe unu ga-abụ ọṅụ anyị mgbe a ga-eme ka anyị nile guzo nꞌihu Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, mgbe ọ ga-esi nꞌeluigwe bịa ọzọ.


1 TESALỌNAIKA 4:16
Nꞌihi na Onyenwe anyị nꞌonwe ya ga-esi nꞌeluigwe rịdata. Mgbe ọ na-arịdata ọ ga-eji olu dị ike kpọọ oku. Ee, ọ ga-eji ube akwa nke ndị isi mmụọ ozi tie mkpu, ọ ga-afụkwa opi ike Chineke. Mgbe ahụ ndị Kraịst nile dara nꞌụra ọnwụ ga-eburu ụzọ si nꞌọnwụ bilite.


1 TESALỌNAIKA 4:17
Mgbe ahụ, anyị onwe anyị, ndị dị ndụ, ndị fọdụrụ nꞌụwa, ka a ga-eweli elu nꞌime igwe ojii, ịga izute Onyenwe anyị na mbara eluigwe, ebe anyị na ya ga-anọ ruo mgbe ebighị ebi.


2 TESALỌNAIKA 1:7
Ya mere, anyị na-agwa unu, ndị so anyị na-ahụ ahụhụ, na Chineke ga-anapụta unu, nye unu izuike, mgbe Onyenwe anyị Jisọs ga-apụta ìhè na mbara eluigwe, ya na ndị mmụọ ozi ya.


1 TIMỌTI 3:16
Ọ bụ eziokwu na ọ dịghị mfe mmadụ ibi ndụ dị nsọ. Ma ụzọ e si ebi ndụ dị nsọ ahụ bụ site na Kraịst, onye ahụ bịara nꞌụwa dị ka mmadụ, onye e gosiri na o nweghị mmehie ọ bụla, na o nwere Mmụọ zuru oke, onye ndị mmụọ ozi hụkwara ma jeere ozi, onye e kwusara ihe banyere ya nꞌetiti mba nile. Onye ndị mmadụ kweere na ya, nabatakwa nꞌebe nile, na onye a nabanyere nꞌeluigwe ebe ọ nọ ugbu a nꞌebube ya.


1 TIMỌTI 6:15
Nꞌihi na mgbe oge ahụ ruru, Chineke onye a gọziri agọzi na onye nanị ya bụ Chineke dị ike, eze kachasị eze nile na onye kachasị ndị nwe mmadụ nile ga-eme ka Kraịst pụta ìhè site nꞌeluigwe.


1 TIMỌTI 6:19
Mgbe ha na-eme ihe ndị a ha na-akpata akụ nke ha naedebe nꞌụlọ akụ nke eluigwe. Nke a bụkwa nanị akụ anyị nwere ike ịkpado nke ga-adị ruo mgbe ebighị ebi. Ha ga-abụkwara anyị ihe ga-eme ka anyị na-ebi ndụ juru afọ nꞌụwa a.


2 TIMỌTI 2:11
Ihe na-enye m nkasịobi bụ eziokwu a, na ọ bụrụ na anyị ahụọ ahụhụ nwụọ nꞌihi Kraịst, nke a na-egosi na anyị amalitelarị isoro Kraịst na-adị ndụ nꞌeluigwe.


2 TIMỌTI 4:6
Ana m ekwu okwu ndị a nꞌihi na site na mgbe na-adịghị anya ugbu a agaghị m anọkwa gị nso inyere gị aka. Oge ụla m eruola. Na mgbe na-adịghị anya site nꞌugbu a, aga m anọ nꞌụzọ ịla nꞌeluigwe.


2 TIMỌTI 4:8
Nꞌeluigwe, okpueze nke ezi omume dị na-eche m, nke Onyenwe anyị, onye naekpe ikpe ziri ezi ga-enye m nꞌụbọchị ahụ, ọ ga-alọghachi. Kama ọ bụghị nanị mụ onwe m ka ọ ga-enye okpueze ahụ, ọ ga-enyekwa ya ndị nile ga-eji ịhụnanya na-eche ọbịbịa ya.


2 TIMỌTI 4:18
Nꞌezie, Onyenwe anyị ga-agakwa nꞌihu ịnapụta m site nꞌihe ọjọọ nile. Ọ gaakpọbatakwa m nꞌime alaeze ya nke eluigwe. Ka otuto dịrị Chineke ruo mgbe nile ebighị ebi. Amin.


HIBRU 1:3
Jisọs Ọkpara Chineke na-enwụpụta ebube Chineke. Ihe Jisọs bụ na ihe nile o mere gosiri na ọ bụ Chineke nꞌonwe ya. Jisọs na-esite nꞌike aka ya na-achị eluigwe na ụwa nile. Jisọs bụkwa onye ahụ nwụrụ ka ọ sachapụ ma hichapụkwa mmehie anyị nile. Mgbe o mechara nke a, ọ nọdụrụ nꞌebe nsọpụrụ dị elu, nꞌakụkụ Chineke onye dị ukwuu, nꞌeluigwe.


HIBRU 1:10
Chineke kpọkwara Jisọs “Onyenwe anyị,” mgbe o kwuru sị “Onyenwe anyị, na mbụ ọ bụ gị kere ụwa. Eluigwe bụkwa ọrụ aka gị.


HIBRU 1:11
Ha ga-ala nꞌiyi bụrụ ihe efu. Ma gị onwe gị ga-anọgide ruo mgbe nile ebighị ebi. Eluigwe na ụwa ga-akacha nka dịrị ka akwa ochie,


HIBRU 3:4
Nꞌihi na ụlọ ọ bụla nwere onye tọrọ ntọ ala ya. Chineke bụ onyeisi ntọ ala ihe nile nꞌime eluigwe na nꞌelu ụwa. Ọ bụkwa Chineke kere ha nile.


HIBRU 4:11
Ya mere, ka anyị mee ka ike anyị ha, ka anyị banye nꞌebe izuike nke eluigwe, ka ọ hapụ ịdịkwa onye ọ bụla nꞌime anyị nke na-agaghị aba nꞌihi ekweghị ekwe dị ka ụmụ Izirel.


HIBRU 4:14
Ma anyị nwere Jisọs Ọkpara Chineke dị ka onyeisi nchụaja ukwu nke ndụ anyị. Ọ nọ ugbu a nꞌeluigwe nꞌihu Chineke. Nꞌihi nke a ka anyị jidesie okwukwe ahụ anyị kwupụtara aka ike.


HIBRU 6:20
Jisọs eburula anyị ụzọ laa nꞌeluigwe. Ebe ahụ ka ọ na-arịrịọ anyị arịrịọ dị ka onyeisi nchụaja anyị ruo mgbe ebighị ebi. Ọnọdụ ya dịkwa dị ka nke Melikizedeki.


HIBRU 8:1
Ihe anyị na-ekwu bụ nke a, anyị nwere onyeisi nchụaja dị otu a. Ọ na-anọdụkwa nꞌebe nsọpụrụ dị elu nꞌakụkụ aka nri Chineke onye dị ukwuu, nꞌeluigwe.


HIBRU 8:2
Jisọs na-arụkwa ọrụ ya dị ka onyeisi nchụaja nꞌebe kachasị nsọ nke eluigwe. Ọ bụkwaghị nꞌụlọ nsọ nke mmadụ jiri aka wuo, kama nꞌụlọ nsọ ahụ Chineke nꞌonwe ya wuru.


HIBRU 8:5
Ma ọrụ nile ndị nchụaja na-arụ bụ nanị onyinyo banyere ihe nke dị nꞌeluigwe. Ọ bụkwa nꞌihi nke a ka Chineke jiri gosi Mosisi mgbe ọ na-akwado iwuru ya ebe a ga-anọ fee ya ofufe nꞌọzara, otu ọ ga-esi wuo ụlọ ahụ. Chineke gwara ya okwu sị, “Lezie anya hụ na i mere ihe nile nꞌusoro dị ka m si gosi gị nꞌelu ugwu.”


HIBRU 9:11
Ma Kraịst abịalarị. Ya onwe ya bụ ezi onyeisi nchụaja nke ọnọdụ ọhụrụ ahụ anyị nwere ugbu a. Ebe ọ na-arụ ọrụ nchụaja ya abụghị nꞌụlọ mmadụ jiri aka wuo. Kama ọ bụ nꞌụlọ nchụaja zuru oke dị nꞌeluigwe.


HIBRU 9:23
Nke a na-ezipụta na ụlọ ikwu ahụ na ihe nile dị nꞌime ya bụ ụdị ihe nile dị nꞌeluigwe. Nꞌihi nke a, ọ dị mkpa na ihe nile dị nꞌime ụlọ ikwu a na ụlọ ikwu nꞌonwe ya kwesịrị ka e were ọbara mee ka ha dị ọcha. Otu aka ahụ, ihe nile dị nꞌeluigwe, bụ ihe ahụ ụlọ a dị nꞌụwa yiri, ka e mere ka ha dịkarịa ọcha site nꞌịta dị oke ọnụ ahịa bụ obara Kraịst.


HIBRU 9:24
Nꞌihi na Kraịst abanyeghị nꞌụlọ nsọ dị nꞌụwa, nke mmadụ wuru. Kama o rigooro nꞌeluigwe ebe ọ nọ ugbu a na-ekwuchitere anyị ọnụ anyị nꞌihu Chineke nꞌonwe ya.


HIBRU 11:5
Enọọk tụkwasịkwara Chineke obi nꞌụzọ dị otu a. Nꞌihi nke a, Chineke kuuru ya laa nꞌeluigwe na-anwụghị anwụ. Otu mgbe ahụ o furu mgbe Chineke wezụgara ya. Akwụkwọ nsọ gwara anyị na Enọọk mere ihe tọrọ Chineke ụtọ.


HIBRU 11:7
Noa bụ otu onye nꞌime ndị nwere okwukwe na Chineke. Chineke dọrọ Noa aka na ntị banyere ihe gaje ime. Noa kweere. Ọ bụ ezie na otu mkpụrụ igwe ojii adịghị nꞌeluigwe, ma na-atụfughị mgbe, Noa wuru ụgbọ mmiri o ji zọpụta onwe ya na ndị ezinụlọ ya. Okwukwe Noa adịghị ka nke ndị ọzọ nọ nꞌụwa nꞌoge ahụ. Ya mere, Noa sitere nꞌokwukwe bụrụ onye nketa alaeze Chineke.


HIBRU 11:10
Eberaham mere nke a nꞌihi na ọ na-ele anya ala eluigwe ahụ. Ọ tụkwasịrị Chineke onye wuru obodo ahụ obi na ọ ga-akpọbata ya nꞌala ahụ.


HIBRU 11:12
Site nꞌotu nwa a Eberaham ghọrọ nna mba dị ukwuu. Ndị mmadụ chere na Eberaham na Sera emeela agadi ịmụta nwa. Ma taa, site nꞌotu nwoke a bụ Eberaham e nwere ụmụ ụmụ ya dị ukwuu dị ka kpakpando eluigwe. Ha dị ukwuu dị ka aja dị nꞌakụkụ osimiri.


HIBRU 11:14
Nꞌezie, ndị a nile gụrụ onwe ha dị ka ndị ọbịa nꞌụwa lere anya ala ọzọ. Ha na-ejikere maka ụlọ ha dị nꞌeluigwe.


HIBRU 11:15
Nꞌihi nke a, ha achọghị ile anya nꞌazụ nꞌihe ụwa ha hapụrụ. Ha gaara alaghachi azụ ịchọ ọganihu ụwa. Ma ha dabeere na-ele anya ngọzi sị nꞌeluigwe nke Chineke na-enye.


HIBRU 11:16
Nke a bụ nꞌihi na ha chọrọ ibi nꞌụlọ ha dị nꞌeluigwe. Nꞌihi nke a Chineke naara ha dị ka ụmụ ya. Ihere ha emeghị ya. Nꞌihi na o dozielara ha ebe obibi nꞌeluigwe.


HIBRU 12:23
Unu abịala nꞌụlọ nzukọ Kraịst ebe ndị nile e dere aha ha nꞌeluigwe na-anọkọ. Unu abịakwutela Chineke onye ga-ekpe mmadụ nile ikpe. Unu abịakwutekwala ndị nile a gbapụtara, bụ ndị nọ nꞌeluigwe. Ndị ahụ e mere ka ha bụrụ ndị zuru oke.


HIBRU 12:26
Mgbe Chineke si nꞌugwu Sainai kwuo okwu, olu ya mere ka ụwa maa jijiji. Ma ugbu a Chineke na-asị, “Mgbe ọzọ ọ bụghị nanị ụwa ka m ga-eme ka ọ maa jijiji kama aga m emekwa ka eluigwe maa jijiji.”


HIBRU 13:14
Nꞌihi na ụwa abụghị ụlọ anyị, anyị na-ele anya ụlọ ebighị ebi anyị dị nꞌeluigwe.


JEMES 1:17
Onyinye ọ bụla dị mma, na nke zuru oke na-esite nꞌeluigwe abịa. Ọ na-esite nꞌebe Chineke dị ukwuu nke eluigwe, onye kere ihe nile na-abịa. Chineke enweghị oge ọ na-agbanwe, nꞌihi na ọ dịghị ka onyinyo mmadụ nke na-agbanwe agbanwe.


JEMES 5:12
Karịsịa ụmụnna m, unu aṅụla iyi. Unu aṅụkwala iyi mgbe ọ bụla, ọ bụladị iji eluigwe ma ọ bụ ụwa ṅụọ iyi. Kama ka “ee” unu bụrụ “ee”. Ka “é, è” unu bụrụkwa “é, è”. Ka unu hapụ isite nꞌụzọ dị otu a mehie wetakwara onwe unu ịbụ ọnụ Chineke.


1 PITA 1:4
Chineke akwadobela onyinye ndụ ebighị ebi ọ ga-enye ụmụ ya nile. Onyinye a dị nꞌeluigwe ebe Chineke na-echebe ya. Nꞌebe ahụ ọ gaghị emebi emebi, ọ gakwaghị agbanwe ọdịdị ya ma ọ bụkwanụ ree ure.


1 PITA 1:12
Ma Chineke mere ka ndị amụma mata na ọrụ ha rụrụ abụghị maka ọdịmma nke aka ha, kama ọ bụ nꞌihi ọdịmma nke ndị ga-ebi nꞌoge dị nꞌihu, bụ unu onwe unu. Ugbu a kwa a na-ekwusara mmadụ nile ozi ọma a. A na-ekwusakwa ya site nꞌike Mmụọ Nsọ ahụ kwuru ha. Ee, a na-ekwusa ozi ọma a nke na-agụ ndị mmụọ ozi nọ nꞌeluigwe agụụ ịnụ ihe banyere ya.


1 PITA 3:22
Ugbu a Kraịst nọ nꞌeluigwe. Ọ nọkwa nꞌakụkụ aka nrị Chineke. Ọ bụ ya na-achị ndị mmụọ ozi nile, ndị ọchịchị nile, na ike nile nke eluigwe.


2 PITA 1:17
Eso m nọdụ nꞌelu ugwu ahụ dị nsọ mgbe Chineke mere ka otuto ya na nsọpụrụ ya pụta ìhè. Eji m ntị m nụrụ mgbe olu ahụ dị ebube si nꞌeluigwe kwuo okwu sị, “Onye a bụ Ọkpara m m hụrụ nꞌanya nke ukwuu, onye ihe ya dịkwa m ezi mma.”


2 PITA 2:11
Lee, ọ bụ ezie na ndị mmụọ ozi nọ nꞌeluigwe ndị na-eguzo nꞌihu Onyenwe anyị, dị ike karịa mmadụ ndị a, ma ha adịghị eji ọnụ ha ekwulu mmụọ ndị a dị ike, na ndị dị ebube, nke ndị ozizi ụgha ndị a na-emeghe ọnụ ha ha ekwutọ.


2 PITA 3:5
Ma ndị na-ekwu ụdị okwu a kpachaara anya chefuo na Chineke onye sitere nꞌokwu ọnụ ya kee eluigwe na ụwa, bụkwa onye mere ka e jiri mmiri dị ukwuu laa ụwa mbụ ahụ nꞌiyi nꞌoge gara aga. Ọ bụ otu Chineke ahụ mere ka e sitekwa na mmiri kpụpụta ala akọrọ na ihe nile gbara ya gburugburu.


2 PITA 3:7
Ọ bụkwa otu okwu ọnụ Chineke ahụ ka e ji nye iwu ka e chebe eluigwe na ụwa tutuu ruo ụbọchị ikpe ahụ, mgbe a ga-eji ọkụ laa ha nꞌiyi nꞌụbọchị ahụ a ga-ekpe ndị nile na-amaghị Chineke ikpe, laakwa ha nꞌiyi.


2 Petrus 3:10
Ma ụbọchị ahụ Onyenwe anyị kwadobere ga-abịa mgbe anyị na-eleghị anya ya. Nꞌụbọchị ahụ, eluigwe ga-eji oke ụzụ gafee. Ihe nile dị nꞌeluigwe ga-agba ọkụ, laa nꞌiyi. Ụwa na ihe nile dị nꞌime ya ka ọkụ ga-erepịakwa nꞌotu ntabi anya.


2 Petrus 3:12
mgbe anyị nọ na-ele anya ọbịbịa nke oke ụbọchị ahụ? Gbalịsiekwanụ ike isite na ndụ unu mee ka ụbọchị ahụ bịa ngwangwa, ụbọchị ahụ Chineke ga-eji ọkụ repịa eluigwe, mee ka ihe nile dị nꞌeluigwe gbazee bụrụ ihe na-agaghị adịkwa.


JUD 1:9
Ndị a na-eme ihe Maikel, onyeisi ndị mmụọ ozi nọ nꞌeluigwe na-emeghị. Nꞌihi na mgbe mmụọ ozi Maikel chọrọ iburu ozu Mosisi, ya na ekwensu sere okwu. Ma mgbe ha naazọ ozu ahụ, Maikel ekwulughị ekwensu, kama ọ sịrị ya, “Onyenwe anyị baara gị mba”.


NKPUGHE 1:1
Ihe dị nꞌakwụkwọ a bụ mkpughe banyere ihe na-aga ime nꞌoge dị nꞌihu na ndụ Jisọs Kraịst. Ọ bụ Chineke nyere ya ike ka o site nꞌọhụ kpughee ya nye Jọn ohu ya. E sitere nꞌeluigwe zite mmụọ ozi bịara kọwaara Jọn ihe ọhụ ndị a ọ hụrụ pụtara.


NKPUGHE 2:9
“Amaara m ụzọ nile i si taa ahụhụ nꞌihi Onyenwe anyị. Ọzọ kwa, amaara m ihe banyere ndọgbu i na-adọgbu onwe gị nꞌọrụ, na ọnọdụ ogbenye gị. Ma nꞌezie, i nwere akụ dị ukwuu nꞌeluigwe. Amaara m ihe banyere nkwutọ nile ndị na-emegide gị na-ekwutọ gị, nkwutọ nke ndị ahụ kpọrọ onwe ha ndị Juu, na ụmụ Chineke, ndị na-abụghị ụmụ Chineke, kama ha bụ ndị na-akwagide ọrụ ekwensu.


NKPUGHE 3:12
“Ma onye ọ bụla na-emeri emeri ka m ga-eme ka ọ bụrụ onyeisi nꞌime ụlọ nsọ Chineke m. A ga-ekpuchi ya nke ọma nꞌụzọ zuru oke. Ọ gaghị apụkwa apụ. Aga m edekwasịkwa aha Chineke m nꞌahụ ya. Ọ ga-ebikwa nꞌime obodo nsọ Chineke m, nke bụ obodo Jerusalem ọhụrụ ahụ si nꞌeluigwe rịdata. Aha ọhụrụ m ka a ga-edekwasịkwa nꞌihu ya.


NKPUGHE 4:1
Mgbe ihe ndị a gasịrị, eleliri m anya m elu hụ ọnụ ụzọ eluigwe ka e meghere ya. Ụda olu ahụ m nụrụ na mmalite dara ụda ọzọ, dị ka ụda opi ike sị m, “Bịa nꞌebe a ka m gosi gị ihe gaje ime nꞌoge dị nꞌihu.”


NKPUGHE 4:2
Mgbe ahụ, e mere ka m baa nꞌeluigwe nꞌime mmụọ m. Nꞌeluigwe, ahụrụ m ebube na ịma mma ya, hụkwa otu ocheeze na onye na-anọkwasị nꞌelu ya.


NKPUGHE 4:5
Mgbe ahụ ụda yiri ụda egbe eluigwe, ya na amụma na-egbuke egbuke sitere nꞌocheeze ukwu ahụ na-ada ma na-achapụtakwa. Nꞌihu ocheeze ukwu ahụ e nwere oriọna asaa na-enwụ ọkụ. Oriọna ndị a nọchiri ọnọdụ mmụọ asaa Chineke.


NKPUGHE 5:3
Ma ọ dịghị onye ọ bụla e nyere ike imeghepụ akwụkwọ ahụ nꞌime eluigwe ma ọ bụ nꞌime ụwa, ma ọ bụ site nꞌokpuru ụwa. O nweghị onye e nyere ike ịgụpụta ihe e dere nꞌime akwụkwọ ahụ.


NKPUGHE 5:13
Mgbe ahụ anụrụ m ka ndị nile nọ nꞌeluigwe na ndị nọ nꞌụwa na ndị nọ nꞌokpuru ụwa, na ndị nọ nꞌokpuru oke osimiri na-eti mkpu na-asị, “Ka ngọzi nile, na nsọpụrụ nile, na otuto nile, na ike nile dịrị Onye ahụ na-anọkwasị nꞌocheeze ahụ, ha dịkwara Nwa atụrụ ahụ ruo mgbe ebighị ebi!”


NKPUGHE 6:1
Mgbe m nọ na-elegide ya anya, Nwa atụrụ ahụ nyakapụrụ akara nke mbụ dị nꞌakwụkwọ ahụ. Otu nꞌime ihe e kere eke anọ ahụ tiri mkpu dị ka a ga-asị na ọ bụ olu egbe eluigwe dara, gwa m okwu sị m, “Bịa”.


NKPUGHE 6:13
Mgbe ahụ, kpakpando dị na mbara eluigwe malitere ịdapụ nꞌala dị ka mkpụrụ osisi na-achaghị acha si adapụ mgbe oke ifufe na-efe.


NKPUGHE 6:14
Otu a, mbara eluigwe ahụ nke kpakpando jupụtara adịkwaghị, dị ka a ga-asị na a pịakọtara ya dị ka ute, wepụ ya. Ugwu nta nile na ugwu ukwu nile, na agwa etiti nile makwara jijiji, site nꞌọnọdụ ha wezuga onwe ha.


NKPUGHE 8:1
Mgbe Nwa atụrụ ahụ nyakapụrụ akara nke asaa ahụ, akụkụ nile nke eluigwe dara jụụ ruo ihe dị ka iri nkeji atọ. Ọ dịkwaghị mkpọtụ ọ bụla dị site nꞌihe ọ bụla Chineke kere.


NKPUGHE 8:5
Mgbe ahụ kwa mmụọ ozi ahụ weere ọkụ sitere nꞌebe ịchụ aja ahụ tinye ya nꞌime ite igwe ntakịrị ahụ o ji chụọ aja, tụda ya, ka ọ danye nꞌime ụwa. Mgbe o mere nke a, ụzụ egbe eluigwe dara, amụma gbukwara nꞌụzọ dị oke egwu. Ala ọma jijiji dakwasịkwara ebe nile nꞌụwa.


NKPUGHE 8:10
Mgbe mmụọ ozi nke atọ fụrụ opi ike ya, otu kpakpando dịkarịsịrị ukwuu sitere na mbara eluigwe danye nꞌime otu ụzọ nꞌime ụzọ atọ e kere iyi nile na isi iyi nile, ebe ndị mmadụ si ekute mmiri ha na-aṅụ.


NKPUGHE 8:13
Mgbe m nọ na-ele ihe ndị a anya, ahụrụ m otu ugo buru ibu ka ọ na-efegharị na mbara eluigwe na-eti mkpu na-asị, “Ahụhụ! Ahụhụ dịrị mmadụ nile bi nꞌụwa nꞌihi ihe ọjọọ dị iche iche gaje ịbịakwasị ha mgbe ndị mmụọ ozi atọ fọdụrụ fụrụ opi ike ha.”


NKPUGHE 9:1
Mgbe mmụọ ozi nke ise ahụ fụrụ opi ike ya, ahụrụ m otu onye si nꞌeluigwe daa nꞌala. E nyere ya ihe ntụghe ụzọ nke e ji atụghe olulu ahụ na-enweghị nsọtụ.


NKPUGHE 9:17
Nꞌime ọhụ m, ahụrụ m inyinya ha, hụkwa ndị nọkwasịrị ha nꞌelu. Ndị nọ nꞌelu inyinya ndị a yi uwe igwe e ji ekpuchi obi, nke ụfọdụ nꞌime ha na-acha ọbara ọbara. Ụfọdụ na-acha dị ka akpụkpọ eluigwe, ụfọdụ na-acha odo odo. Ụfọdụ na-acha dị ka anwụrụ ọkụ. Isi inyinya ha dị ka isi ọdụm, anwụrụ ọkụ na ọkụ na nkume ọkụ si ha nꞌọnụ na-apụta.


NKPUGHE 10:1
Emesịa, ahụrụ m mmụọ ozi ọzọ dị oke egwu ka o si nꞌeluigwe rịdata. Igwe ojii gbara ya gburugburu. Eke na egwurugwu dịkwa ya nꞌisi. Ihu ya na-egbukwa maramara dị ka anyanwụ. Ụkwụ ya na-enwukwa dị ka ọkpụrụkpụ ọkụ.


NKPUGHE 10:3
Mgbe mmụọ ozi ahụ ji oke olu, nke dara ụda dị ka ịgbọ ụja nke ọdụm, tie mkpu, egbe eluigwe asaa gbara otu mgbe ahụ zaghachi ya.


NKPUGHE 10:4
Mgbe m chọrọ idetu ihe egbe eluigwe ndị a kwuru, anụrụ m otu olu si nꞌeluigwe kpọọ m sị m, “Edela ihe ahụ nꞌakwụkwọ, nꞌihi na achọghị ka ndị ọzọ mata okwu ahụ egbe eluigwe ndị ahụ kwuru.”


NKPUGHE 10:6
were onye ahụ na-anọkwasị nꞌocheeze ahụ ṅụọ iyi. Ya bụ onye ahụ kere eluigwe na ụwa, na ihe nile dị nꞌime ha, na oke osimiri, na ndị nile bi nꞌime ha, sị na oge ezuola. Na o kwesịkwaghị ka a tụfuo oge ọ bụla.


NKPUGHE 10:8
Mgbe ahụ otu olu sitere nꞌeluigwe gwa m okwu ọzọ sị, “Gaa napụta mmụọ ozi dị ike ahụ guzo nꞌelu oke osimiri na ala akọrọ akwụkwọ nta ahụ o ji nꞌaka ya.”


NKPUGHE 11:6
A ga-enyekwa ndị àma abụọ ahụ ike imechi eluigwe ime ka mmiri ozuzu ọ bụla ghara izo nꞌụwa nꞌime afọ atọ na ọkara ahụ ha ga-ebu amụma ha. A ga-enyekwa ha ike ime ka osimiri na mmiri nta nile ghọọ ọbara. Ha ga-enwekwa ike ime ka ụdị ọrịa dị iche iche bịakwasị ụwa nile nꞌoge ọ bụla ha chepụtara nꞌobi ha.


NKPUGHE 11:12
Mgbe ahụ otu olu dị ukwuu ga-esi nꞌeluigwe tie mkpu gwa mmadụ abụọ ahụ okwu sị, “Bilienụ, rigota nꞌelu.” A ga-ewelite ha elu na mbara eluigwe baa nꞌime igwe ojii. Ma ndị iro ha ga-anọ na-ele ha anya ka ha na-arigo nꞌeluigwe.


NKPUGHE 11:13
Ma nꞌotu oge ahụ, nꞌotu awa ahụ, ala ọma jijiji dịkarịsịrị oke egwu ga-adị, nke ga-eme ka otu akụkụ nꞌime akụkụ iri nke obodo ahụ nile daa. Ndị ga-anwụ nꞌoge ala ọma jijiji a ga-adịkwa puku mmadụ asaa. Ma ndị nile fọdụrụ ga-esite nꞌoke egwu ga-atụ ha nye Chineke nke eluigwe otuto.


NKPUGHE 11:15
Nꞌihi na mgbe ahụ kwa ka mmụọ ozi nke asaa fụrụ opi ike ya. Mgbe ọ fụrụ opi ya oke olu dị iche iche sitere nꞌeluigwe na-ada nꞌike nꞌike na-asị, “Alaeze nile nke ụwa abụrụla alaeze Onyenwe anyị, ya na Kraịst ya. Ya onwe ya ga-achịkwa achị nꞌebe ihe nile e kere eke dị ruo mgbe nile ebighị ebi.”


NKPUGHE 11:19
Mgbe ahụ kwa e meghere ụlọ nsọ Chineke nke dị nꞌeluigwe. Ahụkwara m igbe ọgbụgba ndụ Chineke nꞌime ya. Nꞌotu oge ahụ kwa, egbe eluigwe malitere ịgba, amụma gbukwara. Oke ifufe nke na-ala ihe nꞌiyi bidokwara ife. Oke ala ọma jijiji dị egwu bidoro nꞌebe dị iche iche, mee ka ụwa nile mee mkpọtụ nke ukwuu.


NKPUGHE 12:1
Mgbe ihe ndị a gasịrị, oke ihe ịrịba ama pụtara ìhè nꞌeluigwe nke na-egosi ihe gaje ime. Ahụrụ m otu nwanyị e yikwasịrị anyanwụ dị ka uwe. Ọnwa dịkwa nꞌokpuru ụkwụ ya abụọ. Okpu eze nke kpakpando iri na abụọ dị gburugburu ya, dịkwa ya nꞌisi.


NKPUGHE 12:4
Nꞌazụ ya, o nwere ọdụdụ nke o ji dọkpụrụ otu ụzọ nꞌime ụzọ atọ nke kpakpando nile dị nꞌeluigwe, tụda ha nꞌala. Ọ bịara guzo nꞌihu nwanyị ahụ mgbe ọ na-achọ ịmụpụta nwa ahụ ọ dị ime ya, nọọ na njikere iri nwantakịrị ahụ nwanyị ahụ ga-amụpụta.


NKPUGHE 12:5
Emesịa, nwanyị ahụ mụpụtara nwantakịrị ahụ, onye gaje ịchị achị nꞌelu ụwa dum. Onye ga-ejikwa aka dị ike chịa ọchịchị ya. Mgbe ahụ a mụpụtara ya, nꞌotu oge ahụ kwa, e si nꞌebe ahụ wepụ nwanta ahụ were ya gaa nꞌebe Chineke nọ nꞌeluigwe nꞌocheeze ya.


NKPUGHE 12:7
Mgbe ihe ndị a gasịrị, agha dị oke egwu dapụtara nꞌeluigwe. Ma onyeisi ndị mmụọ ozi a na-akpọ Maikel na ụsụ ndị mmụọ ozi ya malitere ibuso agwọ ochie ahụ na ndị mmụọ ozi ya a chụdara achụda agha.


NKPUGHE 12:8
Mgbe a lụchara ọgụ a, e meriri agwọ ochie ahụ nꞌagha, chụpụ ya site nꞌeluigwe.


NKPUGHE 12:10
Mgbe ahụ anụrụ m oke olu si nꞌeluigwe na-ada sị, “O mezuola nꞌikpeazụ, nzọpụta Chineke na ike na ọchịchị na ịchị isi Kraịst, ha abụrụla ihe dị ire nꞌihi na e sitela nꞌeluigwe chụtuo onye ahụ na-ebo ụmụnna anyị ebubo. Ọ na-ebo ha ebubo ehihie na abalị nꞌihu Chineke anyị.


NKPUGHE 12:12
Ṅụrịanụ ọṅụ ndị nile bi nꞌeluigwe. Unu ụmụ nke eluigwe ṅụrịanụ. Ka obi tọọkwa unu ụtọ. Ma ahụhụ dịrị unu ndị bi nꞌụwa, nꞌihi na ekwensu ejirila oke ọnụma bịakwute unu. Ọ makwaara na oge o nwere ehighị nne.”


NKPUGHE 13:6
Nꞌime afọ atọ na ọnwa isii ndị a anụ ọhia ahụ kwuluru aha Chineke na ụlọ nsọ ya na ndị nile bi nꞌeluigwe.


NKPUGHE 13:13
Anụ ọhia a si nꞌime ala pụta rụrụ ọtụtụ ọrụ ịtụ nꞌanya dị iche iche. O mere ka ọkụ si na mbara eluigwe daa nꞌụwa nꞌihu mmadụ nile.


NKPUGHE 14:2
Anụkwara m olu si nꞌeluigwe na-ada. Olu a na-ada ụda dị ka ụda mmiri si nꞌime nkume na-asọpụta, ma ọ bụ dị ka ụda nke oke egbe eluigwe. Olu a bụ olu ndị na-abụ abụ, ndị ji ụbọ akwara na-abụ abụ.


NKPUGHE 14:6
Ahụkwara m mmụọ ozi ọzọ ka ọ na-efegharị nꞌime eluigwe. O bu ozi ọma nke ebighị ebi ahụ nꞌaka, nke ọ na-aga ikwusara mba nile, na ebo nile na asụsụ nile na mmadụ nile nọ nꞌụwa.


Openbaring 14:7
Mmụọ ozi a were oke olu kwuo okwu sị, “Tụọnụ egwu Chineke, nyekwanụ ya otuto. Nꞌihi na oge ahụ eruola mgbe ọ ga-anọdụ dị ka onye ikpe. Kpọọkwanụ isi ala nye ya, bụ onye kere eluigwe na ala, na oke osimiri na isi iyi mmiri nile.”


Openbaring 14:13
Anụkwara m olu nke si nꞌeluigwe daa gwa m okwu sị, dee ihe a nꞌakwụkwọ, “Oge eruola mgbe ndị nile e gburu nꞌihi okwu Chineke ga-anatazu ụgwọ ọrụ ha zuru oke. Nꞌezie, Mmụọ Nsọ na-ekwu na ha bụ ndị a gọziri agọzi, nꞌihi na ugbu a ha ga-ezu ike site nꞌọrụ ha nile na ahụhụ ha nile, nꞌihi na ezi ọrụ ha rụrụ ga-eso ha baa nꞌeluigwe.”


Openbaring 14:17
Mgbe nke a gasịrị, mmụọ ozi ọzọ sitekwara nꞌụlọ nsọ dị nꞌeluigwe pụta. Ya onwe ya jikwa mma owuwe ihe ubi dị nkọ.


Openbaring 15:1
Ahụkwara m ihe ịrịba ama ọzọ nke mere nꞌeluigwe. Ọ dị ebube dịkwa oke egwu. Ọ na-ezipụta ihe gaje ịbịa. Ọ bụ ndị mmụọ ozi asaa ka a họpụtara iburu ihe otiti asaa nke ikpeazụ na-abịakwasị ụwa. Mgbe a wụkwasịrị ụwa ihe otiti asaa ndị a, mgbe ahụ ka iwe Chineke ga-ajụrụ.


Openbaring 15:5
Mgbe m lere anya ahụrụ m na e megheela ebe nsọ kachasị ebe nsọ nke ụlọ nsọ ukwu ahụ dị nꞌeluigwe.


Openbaring 16:11
Ha kọchara Chineke nke eluigwe nꞌihi ihe ụfụ na ọnya bịakwasịrị ha. Ma ha jụrụ ichegharị site nꞌajọ ọrụ ha nile.


Openbaring 16:18
Mgbe ahụ egbe eluigwe bidoro na-agba na-eme mkpọtụ, amụma bidokwara na-egbu, oke ala ọma jijiji dịkwara nꞌụwa, ụdị nke na-adịbeghị site na mgbe e kere ụwa. Ọ bụ ala ọma jijiji kachasị ala ọma jijiji ndị ọzọ njọ.


Openbaring 16:21
Mkpụrụ mmiri nke ịdị arọ otu nꞌime ha ruru iri kilogram ise, sitere nꞌeluigwe na-adakwasị ndị mmadụ. Nke a mekwara ka ha kọchaa Chineke nꞌihi ihe otiti mkpụrụ mmiri ahụ, nꞌihi na ihe otiti ahụ dị nnọọ njọ nke ukwuu.


Openbaring 18:1
Mgbe ihe ndị a nile gasịrị, ahụrụ m mmụọ ozi ọzọ nke si nꞌeluigwe bịa nꞌụwa. E nyere mmụọ ozi a ike dị ukwuu. Ebube ya mekwara ka ìhè jupụta nꞌụwa.


Openbaring 18:4
Mgbe ahụ anụkwara m olu ọzọ si nꞌeluigwe na-akpọ oku na-asị, “Ndị m, sitenụ nꞌobodo ahụ pụta, unu esola ya keta oke na mmehie ya, nꞌihi na a ghaghị ịta unu ahụhụ ma unu soro ya mehie.


Openbaring 18:5
Nꞌihi na mmehie ya amụbaala ruo eluigwe. Chineke ejikerekwala ikpe ya ikpe nꞌihi ajọ omume ya.


Openbaring 18:20
“Ma gị eluigwe ṅụrịa ọṅụ nꞌihi ihe a dakwasịrị obodo a, unu ụmụ Chineke, na unu ndị amụma ya na ndị ozi, ṅụrịakwanụ ọṅụ. Nꞌihi na Chineke ekpeela obodo a ikpe nꞌoge ikpeazụ a.”


Openbaring 19:1
Mgbe ihe ndị a gasịrị, anụrụ m ụzụ nke ọtụtụ igwe mmadụ nꞌeluigwe. Ha nile na-eti mkpu na-asị, “Haleluya, keleenụ Onyenwe anyị. Ọ bụ nꞌaka Chineke anyị ka nzọpụta si bịa, ọ bụkwa nanị ya ka nsọpụrụ na ike nile dịrị.


Openbaring 19:6
Mgbe ahụ, anụkwara m ihe yiri ụzụ nke ọtụtụ ndị mmadụ. Nꞌezie, ụzụ a dara dị ka ụzụ nke mmadụ na-anụ mgbe ebili mmiri na-amagharị nꞌoke osimiri. Ọ dakwara dị ka ụzụ nke egbe eluigwe. Ma ihe ndị na-eme ụzụ a na-eti mkpu na-ekwu bụ, “Toonụ Onyenwe anyị. Nꞌihi na Onyenwe anyị Chineke anyị na-achị achị ugbu a.


Openbaring 19:11
Mgbe ahụ kwa elere m anya hụ ka eluigwe meghere. Ahụkwara m otu inyinya dị ọcha guzo nꞌebe ahụ. Onye nọkwasịrị nꞌelu ya bụ onye a kpọrọ aha ya Onye kwesịrị ntụkwasị obi na Onye eziokwu. Ọ bụ onye na-ebu agha na onye na-enye ahụhụ nꞌụzọ ziri ezi.


Openbaring 19:14
Ụsụ ndị agha nke eluigwe, ndị yi uwe dị nnọọ ezi ọcha, nke na-enwụkwa enwụ, na-esokwa ya nꞌazụ. Ha nọkwasịrị nꞌelu inyinya na-acha ọcha.


Openbaring 19:17
Mgbe ahụ ahụrụ m otu mmụọ ozi ka o guzo nꞌime anyanwụ na-eti mkpu nꞌoke olu na-akpọku ụmụ nnụnụ nile na-efe na mbara eluigwe na-asị ha, “Bịanụ! Zukọọnụ! Nꞌihi na Chineke dị ukwuu na-akpọ unu oriri anyasị.


Openbaring 19:21
Ndị agha ha nile ka e jikwa mma agha dị nkọ, nke dị nꞌọnụ onye ahụ nọ nꞌelu inyinya ọcha ahụ gbuo. Ụmụ anụ ufe nile nke eluigwe rikwara ozu ha dị ka ha nwere ike iri.


Openbaring 20:1
Mgbe ahụ kwa ahụrụ m otu mmụọ ozi ka o si nꞌeluigwe rịda. O ji mkpịsị igodo e ji atụghe olulu ahụ na-enweghị nsọtụ. O jikwa mkpọrọ igwe dị arọ nꞌaka ya.


Openbaring 20:9
Ha nile ga-esi nꞌakụkụ nile nke ụwa zukọọ, gbaa obodo ndị Chineke gburugburu, ya bụ obodo Jerusalem ahụ Chineke hụrụ nꞌanya. Ma Chineke ga-eme ka ọkụ si nꞌeluigwe daa dakwasị ha, repịa ndị agha ahụ nile.


Openbaring 20:11
Ahụkwara m otu ocheeze ọcha buru ibu, nke otu onye nọkwasịrị nꞌelu ya. Mgbe ụwa na mbara eluigwe nile hụrụ onye a nọ nꞌelu ocheeze ahụ ha gbara barịị fuo. Ma ha achọtaghị ebe ha ga-ezo onwe ha.


Openbaring 21:1
Mgbe ahụ elere m anya hụ elu ụwa ọhụrụ nke osimiri na-adịghị nꞌime ya, na mbara eluigwe ọhụrụ, nꞌihi na elu ụwa mbụ na mbara eluigwe mbụ ahụ, bụ ndị dị ugbu a, adịkwaghị.


Openbaring 21:2
Mụ onwe m bụ Jọn hụkwara obodo nsọ ahụ bụ Jerusalem ọhụrụ ka o si nꞌeluigwe ebe Chineke nọ na-arịdata. Ọ bụ ihe dị ebube ma e lee ya anya. Ọ mara mma dị ka nwagbọghọ e jikwara nke ọma maka ịgba akwụkwọ ya.


Openbaring 21:10
O buuru m nꞌime mmụọ buga m nꞌotu ugwu buru ibu nke ịdị elu ya dịkwa ukwuu. Site nꞌebe ahụ o gosiri m obodo nsọ ahụ bụ Jerusalem ka o si na mbara eluigwe ebe Chineke nọ na-arịdata.


Dutch Bible 2007
Copyright © 1979, 1988, 2007 by Biblica, Inc.®