A A A A A


Chọọ

MATIU 5:44
Ma asị m unu, hụnụ ndị iro unu nꞌanya, kpeekwaranụ ndị na-esogbu unu ekpere.


MATIU 6:5
“Mgbe ọ bụla unu chọrọ ikpe ekpere, unu emela dị ka ndị ịhụ abụọ, ndị na-ekpe ekpere nꞌakụkụ ụzọ na nꞌime ụlọ ekpere, ebe ndị mmadụ ga-ahụ ha nụkwa ekpere ha, kwuo na ha bụ ndị dị nsọ. Nꞌezie, otuto a bụ nanị ụgwọ ọrụ ha ga-anata.


MATIU 6:6
Kama, mgbe unu chọrọ ikpe ekpere, baanụ nꞌime ime ụlọ unu, Mechiekwanụ ụzọ unu, kpeere Chineke Nna unu ekpere na nzuzo. Ọ maara ihe nzuzo nke obi unu nile. Ọ ga-azakwa ekpere unu, nyekwa unu ụgwọ ọrụ ruuru unu.


MATIU 6:7
“Mgbe unu na-ekpe ekpere, unu ekwula okwu nkwkwasị efu dị ka ndị na-amaghị Chineke na-eme. Ha chere na Chineke ga-anụ ekpere ha nꞌihi ọtụtụ okwu ha na-ekwu. Chetanụ na tupu unu arịọ arịrịọ ọ bụla, Nna unu bi nꞌeluigwe mmara ihe na-akpa unu.


MATIU 6:9
“Sinụ otu a kpee ekpere: Nna anyị nke bi nꞌeluigwe, ka e doo aha gị nsọ.


MATIU 9:35
Jisọs jegharịrị nꞌobodo nile dị nꞌebe ahụ, ndị ukwu na ndị nta, na-ezi ihe nꞌụlọ ekpere ndị Juu. Ọ na-ekwusakwa ozi ọma nke alaeze ahụ. Ebe ọ bụla ọ gara, ọ gwọrọ ụdị ọrịa dị iche iche ndị mmadụ na-arịa.


MATIU 9:38
Ya mere, kpeerenụ Chineke ekpere ka o zite ndị ọrụ ga-abịa nꞌubi a irite mkpụrụ obi ndị mmadụ nꞌuru.”


MATIU 10:17
Kpachapụnụ anya! Nꞌihi na ndị mmadụ pụrụ ijide unu kpọrọ unu gaa nꞌụlọ ikpe, ma tiekwa unu ihe nꞌụlọ ekpere ha.


MATIU 11:25
Nꞌoge ahụ, Jisọs kpere ekpere sị, “Nna, Onyenwe igwe na ala, ekelee m gị, nꞌihi na i zonarịrị ndị ọkachamara eziokwu ahụ, ma kpughee ya nye ụmụntakịrị.


MATIU 12:9
Jisọs sitere nꞌebe ahụ pụọ banye nꞌụlọ ekpere ndị Juu.


MATIU 12:15
Ma Jisọs maara ihe ha na-ezube ime. Nꞌihi ya o sitere nꞌụlọ ekpere ahụ pụọ. Ma ọtụtụ ndị mmadụ sooro ya. Ọ gwọkwara ha nrịrịa ha nile.


MATIU 13:53
Mgbe Jisọs kwusịrị okwu ndị a, ọ laghachiri nꞌobodo Nazaret, gaa izi ndị mmadụ ihe nꞌime ụlọ ekpere. Amamihe ya na ọrụ ebube ọ rụrụ juru onye ọ bụla anya. Ha jụrịtara onwe ha ajụjụ na-asị, “Ebee ka o si nweta amamihe a? Ebee ka o si nweta ike ịrụ ọrụ ebube ndị a nile?


MATIU 14:23
Mgbe ndị a lara, Jisọs rigooro nꞌugwu ikpe ekpere, nanị ya. Mgbe oge anyasị ruru, Jisọs nọkwa nꞌugwu ahụ na-ekpe ekpere, nanị ya.


MATIU 17:21
Ma mmụọ ọjọọ dị otu a agaghị apụ, ma ọ bụghị nanị site nꞌikpe ekpere na ibu ọnụ.”


MATIU 18:19
“Ana m agwa unu nke a sị, ọ bụrụ na mmadụ abụọ nꞌetiti unu ekwekọọ nꞌụwa banyere ihe ọ bụla unu na-arịọ nꞌekpere, Nna m bi nꞌeluigwe ga-emezuru unu ihe ahụ.


MATIU 19:13
Mgbe ahụ e kuteere Jisọs ụmụntakịrị ka o bikwasị ha aka, kpeekwara ha ekpere. Ma ndị na-eso ụzọ ya baara ndị kutere ha mba sị, “Unu esogbula Onyenwe anyị.”


MATIU 21:13
Ọ gwara ha okwu sị ha, “E dere ya nꞌakwụkwọ nsọ sị, ‘Ụlọ Nna m ga-abụ ụlọ ekpere’, ma unu na-eme ya ka ọ bụrụ ogige ndị ohi!”


MATIU 21:22
Ihe ọ bụla kwa unu sitere nꞌokwukwe rịọọ Chineke nꞌekpere, unu ga-anatakwa ya.”


MATIU 23:13
“Ahụhụ dịrụ unu ndị Farisii na ndị ozizi iwu, ndị ihu abụọ! Nꞌihi na unu na-emechibido ndị ọzọ ụzọ ha gasi bata nꞌalaeze eluigwe, ma unu onwe unu adịghị abata, unu adịkwaghị enye ndị ọzọ ohere ịbata. Ahụhụ dịrị unu ndị ozizi iwu na ndị Farisii, ndị ihu abụọ! Nꞌihi na unu na-eme dị ka ndị dị nsọ site nꞌikpe ogologo ekpere nꞌakụkụ ụzọ nile ka mmadụ hụ unu. Ma unu na-eripịa akụ dị nꞌụlọ ndị inyom di ha nwụrụ. Unu ga-anata ikpe ọmụma.


MATIU 23:34
“Ya mere, ana m agwa unu sị, aga m ezitere unu ndị amamihe nd ndị ozizi. Ụfọdụ nꞌime ha ka unu ga-egbu, ụfọdụ ka unu ga-akpọgide nꞌobe. Ndị ọzọ kwa ka unu ga-eyipụ uwe ha, tie ha ihe otiti nꞌazụ, nꞌime ụlọ ekpere unu. Unu ga-achụkwa ha ọsọ site nꞌotu obodo gaa nꞌobodo ọzọ.


MATIU 24:20
Kpeerenụ Chineke ekpere ka unu ghara ịgba ọsọ a nꞌoge oke oyi, ma ọ bụ nꞌụbọchị izuike.


MATIU 26:36
Mgbe Jisọs bịara nꞌogige ahụ a na-akpọ Getsamane, ọ gwara ndị na-eso ụzọ okwu sị ha, “Nꞌọdụnụ nꞌebe a ka m gaa nꞌihu nke nta kpee ekpere.”


MATIU 26:39
Ọ gara nꞌihu nke nta daa nꞌala, kpuo ihu ya nꞌala, kpee ekpere sị, “Nna m, ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee, napụ m iko a. Ma ọ bụghị uche m ka m chọrọ ka o mee, kama ka e mee ihe ị na-achọ.”


MATIU 26:41
Nọọnụ na nche, na-ekpekwanụ ekpere, ka ọnwụnwa ghara imeri unu. Nꞌihi na site nꞌime mmụọ m ọ na-agụ m agụụ imezu uche Chineke, ma anụ ahụ m adịghị ike ịnagide ya.”


MATIU 26:42
Ọ laghachiri azụ nke ugboro abụọ kpeekwa ekpere sị, “Nna, ọ bụrụ na iko a agaghị agabiga ma ọ bụghị na m ṅụrụ ya ka e mee uche gị.”


MATIU 26:44
Jisọs hapụrụ ha ọzọ gaa kpee ekpere nke ugboro atọ, na-ekwukwa otu okwu ahụ.


MAK 1:21
Mgbe oge nta gasịrị, Jisọs na ndị so ya bịaruru Kapanọm. Nꞌụbọchị izuike ndị Juu, nke bụ ụbọchị Satọde, bụrụkwa ụbọchị ịga nꞌụlọ ekpere, Jisọs na ndị na-eso ya jere nꞌụlọ ekpere dị nꞌebe ahụ. Nꞌebe ahụ, Jisọs ziri ndị bịara okwu Chineke.


MAK 1:22
O juru ndị nọ nꞌụlọ ekpere ahụ anya otu Jisọs si kwuo okwu Chineke. Nꞌihi na o zighị ha dị ka ndị ozizi ndị Juu si ezi. Kama o ziri ha dị ka onye maara ihe nile.


MAK 1:23
Ma nꞌụlọ ekpere ahụ e nwere otu nwoke nọ nꞌime ya nke mmụọ ọjọọ na-esogbu. Mgbe nwoke a nụrụ ihe Jisọs na-ezi, o tiri mkpu akwa sị,


MAK 1:27
O juru ndị nọ nꞌụlọ ekpere ahụ anya nke ukwuu. Nꞌihi ya ha bidoro na-ajụrịta onwe ha ajụjụ na-asị, “Anyị ga-esi aṅaa kọwaa ihe anya anyị hụrụ taa? Nꞌezie, nke a bụ nnọọ ozizi ọhụrụ! Lee, okwu ọnụ efu ka o ji nye iwu ka mmụọ ọjọọ site nꞌahụ mmadụ pụọ, ha pụkwara!”


MAK 1:29
Mgbe ha si nꞌụlọ ekpere ahụ pụta, Jisọs gara nꞌụlọ Saịmọn na Anduru. Jemes na Jọn sokwa ya gaa.


MAK 1:35
Nꞌisi ụtụtụ ụbọchị nke ọzọ ya, mgbe mmadụ nile nọ na-arahụ ụra, mgbe ìhè ọ bụla na-adịghị, Jisọs sitere nꞌụra teta. O sitere nꞌụlọ ahụ ọ nọ pụta, pụọ, gaa ebe ọ ga-anọrọ onwe ya, nanị ya. Nꞌebe ahụ kwa ka ọ nọ kpee ekpere.


MAK 1:39
Ya mere, ha pụrụ jegharịa nꞌebe dị iche iche na Galili. Ebe ọ bụla ha jeruru, Jisọs kwusara ozi ọma nꞌụlọ ekpere ndị Juu. Ọ chụpụkwara mmụọ ọjọọ.


MAK 3:1
Ọzọ kwa, Jisọs banyere nꞌụlọ ekpere ndị Juu. Nꞌime ya ọ hụrụ otu nwoke aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ.


MAK 3:3
Ma Jisọs gwara nwoke ahụ aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ okwu sị, “Bilie, bịa guzo nꞌetiti ụlọ ekpere a.”


MAK 5:22
Otu onyeisi ụlọ ekpere ndị Juu aha ya bụ Jairọs bịara daa nꞌala nꞌihu ya.


MAK 6:2
Nꞌụbọchị izuike, ọ banyere nꞌụlọ ekpere ndị Juu dị nꞌebe ahụ, bido ikwu okwu Chineke. Ọtụtụ ndị gere ya ntị ka o juru anya bụ okwu si ya nꞌọnụ na-apụta. Ha jụrụ sị, “Ebee ka nwoke a nọrọ mụọ ihe ndị a nile? Ònye nyere ya amamihe a? Ebee ka o siri nweta ike ịrụ ọrụ ịrịba ama ndị a nile?


MAK 6:41
Jisọs naara ogbe beredi ise na azụ abụọ ndị a welie anya ya elu kpee ekpere gọzie ha. Ọ nyawara beredi ahụ nye ya ndị na-eso ụzọ ya ka ha kee ndị mmadụ ahụ. Otu a kwa ọ nyawakwara azụ abụọ ahụ nyekwa ha nile.


MAK 6:46
Mgbe ndị a nile lara, Jisọs hapụrụ ebe ahụ gaa nꞌelu ugwu ikpe ekpere.


MAK 8:6
Jisọs nyere iwu ka igwe mmadụ ahụ nọdụ ala. O weere ogbe beredi ahụ kpee ekpere nye Chineke ekele. Ọ nyawara beredi ahụ ntakịrị ntakịrị, nye ya ndị na-eso ụzọ ya ka ha kee ndị mmadụ ahụ nile. Ndị na-eso ụzọ ya kekwara ya.


MAK 8:7
Ha nwekwara azụ ntakịrị. Jisọs weere ya kpee ekpere, nyekwa Chineke ekele. Emesịa ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya ka ha kee ya.


MAK 9:29
Jisọs zara sị ha, “Ọ bụ nanị site nꞌike ekpere ka a pụrụ ịchụpụ ụdị mmụọ ọjọọ ahụ.”


MAK 11:17
Ọ gwara ndị nọ nꞌebe ahụ sị, “E dere ya nꞌakwụkwọ nsọ sị, ‘Ụlọ nsọ m ga-abụ ụlọ ekpere nye mba nile,’ ma unu emeela ya ka ọ ghọọ ọgba ndị na-apụnarị mmadụ ihe nꞌike.”


MAK 11:24
“Ya mere, ka m gwa unu, ihe ọ bụla unu rịọrọ mgbe unu kpere ekpere, nweenụ okwukwe na unu anatala ya, ọ ga-emezukwara unu dị ka unu siri kpee ya.


MAK 11:25
Kama, mgbe unu na-ekpe ekpere, unu ebula iro nꞌobi unu megide onye ọ bụla. Burunụ ụzọ gbaghara onye ahụ, ka Nna unu bi nꞌeluigwe gbaghara unu mmehie unu.


MAK 12:39
Ọ na-atọ ha ụtọ ka e kelee ha ekele pụrụ iche nꞌahịa. Ọ na-atọkwa ha ụtọ ka e nye ha oche dị mkpa nꞌụlọ ekpere unu na nꞌoge mmemme ọ bụla.


MAK 12:40
Ma ha bụ ndị na-abanye nꞌụlọ ụmụ nwanyị di ha nwụrụ pụnarị ha ihe ha nwere. Ha na-ezo ihe ha bụ, ma na-ekpe ogologo ekpere nꞌọha. Nꞌihi ihe ndị a nile ha na-eme, ahụhụ ha ga-adị ukwuu!”


MAK 13:9
Ma mgbe ihe ndị a na-eme, lezienụ anya! A ga-akpụrụ unu gaa nꞌụlọ ikpe, tiekwa unu ihe nꞌụlọ ekpere dị iche iche. Nꞌihi m kwa, a ga-agbara unu akwụkwọ nꞌihu ndị eze na nꞌihu ndị na-achị achị. Oge a bụkwa oge unu ga-eji gwa ha ozi ọma ahụ.


MAK 13:18
Kpeenụ ekpere ka ihe ndị a hapụ ime nꞌoge oyi.


MAK 14:32
Emesịa, ha gara ije rute ebe a na-akpọ Getsemanị. Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya sị, “Nọdụnụ nꞌebe a ka m gaa nꞌihu nke nta ikpe ekpere.”


MAK 14:35
Ọ hapụrụ ha gaa nꞌihu nke nta, daa nꞌala. O kpere ekpere rịọ ma ọ ga-ekwe mee ka ihe ọjọọ na-akwado ịdakwasị ya gabiga, hapụ ịbịakwasị ya.


MAK 14:36
O kpere ekpere sị, “Nna, o nweghị ihe nyịrị gị ime. Ekwela ka ihe ọjọọ a bịakwasị m. Ma ọ bụghị uche m ka m chọrọ ka o mezuo, kama ka uche gị mezuo.”


MAK 14:38
Nọọnụ na nche, na-ekpekwanụ ekpere ka unu hapụ ịdaba nꞌọnwụnwa. Ọ na-agụ mmụọ m agụụ ime ihe Chineke chọrọ, ma anụ ahụ adịghị ike.”


MAK 14:39
Ọ hapụkwara ha ọzọ gaakwa nꞌihu, kpeekwa otu ụdị ekpere ahụ.


MAK 14:41
Ọ hapụkwara ha gaa kpeekwa ekpere ọzọ. Mgbe ọ lọghachiri nke ugboro atọ, ọ gwara ha sị, “Ùnu nọrịrị na-arahụ ụra ma na-ezukwa ike? O zuola! Bilienụ! Oge ịrahụ ụra agafeela! Lee! A rarala mụ bụ Nwa nke mmadụ nye nꞌaka ndị mmadụ ọjọọ.


LUK 1:10
Mgbe Zakaraya banyere ịchụ aja ahụ, igwe ndị mmadụ bịara ife Chineke nꞌụbọchị ahụ nọ nꞌezi na-ekpe ekpere, nꞌihi na ọ bụ omenala na mgbe ọ bụla onye nchụaja banyere ịchụ ụdị aja a, ndị mmadụ ga-anọ nꞌezi na-ekpe ekpere.


LUK 1:13
Ma mmụọ ozi ahụ gwara ya okwu sị, “Zakaraya, atụla egwu! Nꞌihi na abịara m ịgwa gị na Chineke anụla ekpere gị. Ọ ga-emekwa ka Elizabet nwụnye gị tụrụ ime, mụtara gị nwa nwoke, onye ị ga-akpọ aha ya Jọn.


LUK 1:21
Mgbe ihe ndị a nile na-eme, ndị mmadụ ahụ gbakọrọ nꞌezi na-ekpe ekpere, nọkwa na-eche Zakaraya ka ọ pụta. O juru ha anya na ọ nọọla ọdụ nꞌime ime ụlọ nsọ ukwu ahụ.


LUK 2:36
O nwekwara otu agadi nwanyị ọzọ nọ nꞌụlọ nsọ ukwu ahụ nꞌụbọchị ahụ. Aha ya bụ Ana. Ọ bụ onye amụma, bụrụkwa nwa Fanuel nke si nꞌebo Asha. Ana enweghị di, nꞌihi na di ya nwụrụ mgbe ha biri nanị afọ asaa. Site na mgbe di ya nwụrụ ruo ụbọchị ahụ ọ bịara ụlọ nsọ ukwu Chineke, iri afọ asatọ na anọ agafeela. Oge ndị a nile, Ana jiri ụlọ nsọ ukwu ahụ mere ebe obibi ya. Ebe a ka ọ nọ na-efe Chineke ehihie na abalị, ọ nọkwa na-ekpe ekpere na-ebukwa ọnụ.


LUK 3:21
Otu ụbọchị Jisọs sooro igwe mmadụ bịa ka Jọn mee ya baptizim. Mgbe Jọn mesịrị ndị mmadụ baptizim, o mekwara Jisọs baptizim. Ma mgbe Jisọs nọ na-ekpe ekpere, oge e mesịrị ya baptizim, eluigwe meghere.


LUK 4:15
Ọ banyere nꞌụlọ ekpere ndị Juu na-ezi ndị mmadụ ihe. Mmadụ nile tokwara ya.


LUK 4:16
Mgbe ahụ Jisọs gara ije rute Nazaret, obodo nke aka ya, ebe ọ nọ too. Nꞌụbọchị izuike, ọ gara nꞌụlọ ekpere dị nꞌebe ahụ, dị ka ọ dị mbụ eme. Nꞌebe ahụ, o guzoro ọtọ ịgụ akwụkwọ nsọ.


LUK 4:17
Ndị isi ụlọ ekpere ahụ nyere ya akwụkwọ nsọ nke Aịzaya onye amụma dere. Jisọs meghere ya, bido ịgụ ebe Aịzaya dere ihe ndị a,


LUK 4:20
Jisọs mechiri akwụkwọ ahụ nyekwa ya onyeisi ụlọ ekpere ahụ, nọdụ ala. Ndị mmadụ nile nọ nꞌụlọ ekpere ahụ legidere ya nnọọ anya.


LUK 4:22
Ndị ahụ nile bịara nꞌụlọ ekpere ahụ kwuru okwu ọma banyere ya. O juru ha anya na okwu ọma dị otu a si ya nꞌọnụ pụta. Ha sịrị, “Onye a ò bụghị nwa Josef?”


LUK 4:31
O sitere nꞌebe ahụ gaa Kapanọm, obodo dịkwa na Galili. Nꞌụbọchị izuike ndị Juu, ọ banyekwara nꞌụlọ ekpere ha bido izi ndị mmadụ ihe.


LUK 4:33
Otu ụbọchị mgbe ọ nọ na-ezi ihe nꞌụlọ ekpere ndị Juu, otu nwoke nke mmụọ ọjọọ bi nꞌime ya bịara nso ebe ọ nọ bido na-eti mkpu nꞌoke olu na-asị,


LUK 4:38
Mgbe Jisọs si nꞌụlọ ekpere ahụ pụta, ọ gara nꞌụlọ Saimọn. Nꞌebe ahụ ọ chọpụtara na nne nwụnye Saimọn nwere ahụ ọkụ.


LUK 5:16
Ma site nꞌoge ruo nꞌoge, Jisọs na-ahapụ igwe mmadụ ndị a gaa nꞌebe ọ ga-anọ nanị ya ikpe ekpere.


LUK 5:33
Mgbe ahụ ha jụrụ ya sị, “Gịnị mere ndị na-eso ụzọ Jọn na ndị na-eso ụzọ ndị Farisii ji na-ebu ọnụ, na-ekpekwa ekpere oge nile, ma ndị na-eso ụzọ gị nọ nnọọ nꞌoriri na ọṅụṅụ?”


LUK 6:6
Nꞌụbọchị Satọde ọzọ, Jisọs banyere nꞌụlọ ekpere ndị Juu bido na-ezi okwu Chineke. Nꞌụlọ ahụ, otu nwoke nọ ya, onye aka nri ya kpọnwụrụ akpọnwụ.


LUK 6:8
Ma ebe Jisọs maara ihe ha na-ezube nꞌobi ha, ọ kpọrọ nwoke ahụ nke aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ sị ya, “Pụta bịa guzoro nꞌetiti ụlọ ekpere a.” Nwoke ahụ pụtara bịa guzoro ebe Jisọs sị ya guzo.


LUK 6:12
Mgbe ọzọ kwa, Jisọs gara rigoro nꞌelu ugwu ikpe ekpere. Ọ nọgidere nꞌebe ahụ abalị nile.


LUK 6:28
Gọzienụ ndị na-abụ unu ọnụ, ma kpeekwaranụ ndị ahụ na-akọcha unu ekpere.


LUK 7:5
nꞌihi na ọ hụrụ ndị Juu nile nꞌanya. O wukwaara anyị ụlọ ekpere.”


LUK 8:41
Mgbe ahụ otu onyeisi ụlọ ekpere ndị Juu a na-akpọ Jairọs, bịara daa nꞌala nꞌụkwụ Jisọs, rịọ ya ka ọ bịa nꞌụlọ ya.


LUK 9:18
Otu ụbọchị mgbe Jisọs nọ nanị ya na-ekpe ekpere, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya. Ọ jụrụ ha sị, “Onye ka ndị mmadụ sị na m bụ?”


LUK 9:28
Mgbe abalị asatọ gafere, Jisọs kpọọrọ Pita na Jọn na Jemes gaa nꞌelu ugwu ikpe ekpere.


LUK 9:29
Mgbe ọ nọ na-ekpe ekpere, ọdịdị ihu ya gbanwere. Uwe ya nwupụrụ ọcha, ọ chara nnọọ vaaa, chakarịa ihe ọcha ọ bụla anya mmadụ hụrụla.


LUK 10:2
Ọ gwara ha sị, “Mkpụrụ a ga-aghọ dị ukwuu ma ndị ọrụ dị nanị ole na ole. Kpeenụ ekpere rịọ Chineke onye nwe mkpụrụ ndị a ka o zite ndị ọrụ nꞌubi a.


LUK 11:1
Otu ụbọchị Jisọs nọ na-ekpe ekpere. Ndị na-eso ụzọ ya nọkwa nꞌebe ahụ ọ nọ na-ekpe ekpere. Mgbe o kpesịrị, otu nꞌime ndị na-eso ụzọ ya sịrị ya, “Onyenwe anyị, zi anyị otu anyị kwesịrị isi kpee ekpere, dị ka Jọn siri zi ndị na-eso ụzọ ya.”


LUK 11:2
Jisọs zara ha sị, “Mgbe unu chọrọ ikpe ekpere, unu si otu a kpee ya, Nna anyị, ka e doo aha gị nsọ, ka alaeze gị bịa.


LUK 11:43
“Ahụhụ dịrị unu ndị Farisii! Nꞌihi na unu hụrụ ịnọdụ ala nꞌisi oche nꞌụlọ ekpere unu nꞌanya, hụkwa ekele pụrụ iche a na-ekele unu nꞌahia nꞌanya.


LUK 12:11
“Mgbe ha kpọtara unu nꞌụlọ ekpere ndị Juu, ma ọ bụ nꞌihu ndị na-achị achị, ikpe unu ikpe, unu echegbula onwe unu banyere ihe unu ga-ekwu iji gọrọ onwe unu.


LUK 13:10
Nꞌotu ụbọchị izuike ndị Juu, Jisọs banyere nꞌime otu ụlọ ekpere ndị Juu bido izi ihe.


LUK 13:14
Ma onyendu ụlọ ekpere ahụ were iwe nke ukwuu nꞌihi na Jisọs gwọrọ nwanyị a nꞌụbọchị izuike. O biliri gwa ndị mmadụ ahụ okwu sị, “E nwere ụbọchị isii nꞌime izu ụka mgbe mmadụ kwesịrị ịrụ ọrụ. Ọ bụrụ na ahụ esighị gị ike, ọ bụrụkwa na ị chọrọ ka a gwọọ gị, bịa nꞌime ụbọchị isii ndị a. Abịakwala nꞌụbọchị izuike ka a gwọọ gị!”


LUK 13:17
Okwu a Jisọs kwuru mere ka ihere mee ndị iro ya. Ma ndị nile nọ nꞌụlọ ekpere ahụ ṅụrịrị ọṅụ nꞌihi ọrụ ebube nile ọ rụrụ.


LUK 18:1
Otu ụbọchị Jisọs kọọrọ ndị na-eso ụzọ ya akụkọ iji gosi ha mkpa ọ dị ikpegide ekpere na-esepụghị aka tutuu Chineke aza ekpere ha.


LUK 18:10
Ọ gwara ha okwu sị, “Mmadụ abụọ gara nꞌụlọ nsọ ukwu Chineke dị na Jerusalem ikpe ekpere. Otu onye nꞌime ha bụ onye Farisii, onye nke ọzọ bụ onye ọnaụtụ.


LUK 18:11
Onye Farisii guzoro ọtọ si otu a kpee ekpere ya nye Chineke sị, ‘Chineke, biko ekelee m gị, nꞌihi na adịghị m ka ndị ọzọ. Adịghị m ka onye ọnaụtụ ahụ. Anaghị m aghọgbu mmadụ, anaghị m akwa iko, abughị m onye mmadụ na-enweghi ike ịtụkwasị obi.


LUK 19:46
Ọ gwara ha sị, “E dere ya nꞌakwụkwọ nsọ na ụlọ m ga-abụ ụlọ ekpere, ma ugbu a unu emeela ya ka ọ bụrụ ebe obibi ndị na-apụnarị mmadụ ihe.”


LUK 20:46
“Jienụ onwe unu aka site nꞌebe ndị ozizi iwu nọ. Nꞌihi na ihe ha hụrụ nꞌanya bụ iyi uwe ogologo na-ejegharị ebe nile. Ihe na-atọkwa ha ụtọ bụ ka a na-ekele ha ekele dị iche nꞌime ahịa. Ha hụkwara ịnọdụ nꞌoche dị mkpa nꞌụlọ ekpere na nꞌoge mmemme ọ bụla nꞌanya.


LUK 20:47
Ma ha bụ ndị na-abakwuru ụmụ nwanyị di ha nwụrụ anwụ, pụnarị ha ihe ha nwere. Ha na-ekpe ogologo ekpere ka ndị mmadụ too ha. Ha ga-anata ikpe ọmụma dị ukwuu site nꞌaka Chineke.”


LUK 21:12
“Ma tupuu ihe ndị a nile emezuo, ndị mmadụ ga-ejide unu, kpagbuokwa unu. Ha ga-akpọrọ unu gaa nꞌụlọ ekpere ikpe unu ikpe. Ha ga-atụkwa unu mkpọrọ. Ha ga-ebo unu ebubo nꞌihu ndị eze na nꞌihu ndị na-achị achị nꞌihi na unu na-eso ụzọ m.


LUK 21:36
Ma nọọnụ na nche oge nile. Kpeerenụ Chineke ekpere ka o nye unu ike ịgbanarị ihe ndị a nile nke na-aga ime. Ka o nyekwa unu ike iguzo nꞌihu m mgbe m ga-alọghachi.”


LUK 22:32
ma ekpeelara m gị ekpere, rịọ Chineke, ka o mee ka okwukwe gị sie ike, ka ị hapụ ịda. Mgbe ị tụgharịrị bụrụ onye na-eso m nꞌezie, gbaakwa ụmụnna gị ndị a ume.”


LUK 22:40
Nꞌebe ahụ ọ gwara okwu sị, “Kpeenụ ekpere rịọọ Chineke, ka unu hapụ ịdaba nꞌọnwụnwa.”


LUK 22:41
Ọ hapụrụ ha gaa nꞌihu nke nta, ebe dị anya ntakịrị site nꞌebe ha nọ, gbuo ikpere nꞌala kpeere Chineke ekpere.


LUK 22:42
Nꞌekpere ya, ọ rịọrọ Chineke sị, “Nna, ọ bụrụ na ị chọrọ, napụ m iko a. Otu ọ dị, ọ bụghị ihe m chọrọ ka a ga-eme, kama ka ihe ọ bụla ị chọrọ mezuo.”


LUK 22:44
Nꞌime obi nke jupụtara nꞌihe mgbu, Jisọs kpere ekpere kpesie ike, nke mere na ọsụsọ si ya nꞌahụ na-adapụ nꞌala dị ka ọkpụrụkpụ ọbara.


LUK 22:45
Mgbe o kpechara ekpere, o biliri ọtọ, bịakwute ndị na-eso ụzọ ya, hụ na ha na-arahụ ụra, nꞌihi na obi adịghị ha mma.


LUK 22:46
Jisọs kpọtere ha sị, “Gịnị mere unu ji na-arahụ ụra? Bilienụ kpee ekpere ka unu hapụ ịdaba nꞌọnwụnwa.”


JỌN 2:6
Nꞌụlọ ahụ ha nọ, a dọbara ite mmiri isii buru ibu. Otu nꞌime ite ndị a na-eri ihe dị ka iri lita mmiri ạnọ. Nꞌime ite a ka ndị Juu na-agbanye mmiri ha ji asa ụkwụ ha, na aka ha, na ihu ha, tupuu ha ekpee ekpere.


JỌN 6:59
Na Kapanọm ka Jisọs nọ kwuo ihe ndị a. Ebe ahụ ka ọ nọkwa kuziere ndị mmadụ okwu Chineke nꞌime ụlọ ekpere ndị Juu.


JỌN 9:22
Ihe a ka ndị mụrụ ya kwuru nꞌihi na ha na-atụ egwu ndị Juu. Ndị Juu ekpebiela na ọ bụrụ na onye ọ bụla ekwuo na Jisọs bụ Onye nzọpụta ahụ, ha ga-achụpụ onye ahụ site nꞌụlọ ekpere ha.


JỌN 9:31
Chineke adịghị anụ ekpere onye mmehie. Kama ọ bụrụ na onye ọ bụla na-arụ ọrụ ya, na-eme ihe ọ na-achọ, ọ bụ onye ahụ ka Chineke na-anụ olu ya.


JỌN 12:42
Ma ụfọdụ nꞌime ndị isi nchụaja kweere na ya. Ma ha ekwupụtaghị nke a. Nꞌihi na ha tụrụ egwu ndị Farisii. Ha achọkwaghị ka achụpụ ha site nꞌụlọ ekpere ndị Juu.


JỌN 16:2
Ha ga-esite nꞌụlọ ekpere ha chụpụ unu. Nꞌezie, oge na-abịa mgbe ha ga-egbu unu. Ha gaechekwa na ha na-efe Chineke mgbe ha na-eme nke a.


JỌN 17:9
“Ugbu a ana m ekpe ekpere nꞌihi ndị a nile i nyere m. Ekpeghị m ekpere nꞌihi ndị nọ nꞌụwa. Kama ana m ekpe ekpere nꞌihi ndị a i nyere m, nꞌihi na ha bụkwa ndị nke gị.


JỌN 17:15
Ekpeghị m ekpere ka i wepụ ha nꞌụwa, kama ana m achọ ka i debe ha nke ọma. Ka ha ghara ịdaba nꞌaka onye ụrụala ahụ bụ ekwensu.


JỌN 17:20
“Ekpeghị m ekpere nꞌihi ndị a nanị. Kama ana m ekpekwa ekpere a nꞌihi ndị nile ga-ekwere na mụ, nꞌoge dị nꞌihu, site nꞌama ndị a ga-agba banyere m.


JỌN 17:21
Isi ekpere m nꞌihi ha bụ ka ha nile nwee otu obi na otu mkpebi banyere ihe nile ha ga-eme, dị ka mụ na gị si nwekọọ. Nna, ee, dị ka gị onwe gị dị nꞌime m, dị ka mụ onwe m dịkwa nꞌime gị, achọrọ m ka ndị nile kweere na m nọgide nꞌime anyị. Mgbe ahụ ndị nile nọ nꞌụwa ga-esite nꞌomume dị otu a mata na gị onwe gị zitere m.


JỌN 18:9
O kwuru nke a iji imezu okwu ahụ o kwuru mgbe o kpere ekpere sị, “Etufughị m onye ọ bụla nꞌime ndị ahụ i nyere m.”


JỌN 18:20
Jisọs zara ya sị, “Nꞌihu ọha mmadụ ka m kwuru okwu nile m kwuru. Ekwuru m okwu Chineke nꞌime ụlọ ekpere na nꞌime ụlọ nsọ ukwu Chineke ebe ndị Juu na-ezukọ. Ekwukwaghị m ihe ọ bụla na nzuzo.


ỌLU OZI 1:14
Ha nile jikọtara onwe ha ọnụ na-ekpe ekpere site nꞌoge ruo nꞌoge. Ndị sonyere ha bụ ụfọdụ ndị inyom na Meri nne Jisọs, na ụmụnna Jisọs.


ỌLU OZI 1:24
Ha kpere ekpere rịọ Chineke ka o gosi ha onye ha ga-ahọrọ nꞌime mmadụ abụọ ahụ. Otu a ka ha si kpee ekpere ahụ: “Onyenwe anyị, ị maara obi mmadụ nile. Gosi anyị onye ị họpụtara nꞌime mmadụ abụọ ndị a ka ọ bụrụ onyeozi ga-anọchi anya Judas Iskariọt, onye gara ebe o kwesịrị ka ọ gaa.”


ỌLU OZI 1:26
Mgbe ha kpesịrị ekpere, ha fere nza. Nza ahụ makwara Matayas. Ọ bụ ya ka ha họpụtara, gụnye ya ka ọ bụrụ otu nꞌime ndị ozi iri na abụọ ahụ.


ỌLU OZI 2:46
Ụbọchị nile, ha na-ezukọ nꞌụlọ nsọ ukwu Chineke ikpe ekpere. Ha na-ezukọkwa nꞌụlọ ndị kwere ekwe dị iche iche, mmadụ ole na ole, iri oriri nsọ. Ha jiri ọṅụ na-eri nri ha, site nꞌobi ekele.


ỌLU OZI 3:1
Nꞌotu ụbọchị, Pita na Jọn gara nꞌụlọ nsọ ukwu Chineke ikpe ekpere. Ihe a mere nꞌelekere atọ nke ehihie.


ỌLU OZI 4:31
Mgbe ha kpesịrị ekpere, ụlọ ahụ ha zukọrọ nꞌime ya mara jijiji. Ha nile jupụtakwara na Mmụọ Nsọ. Ha gakwara nꞌihu ikwusa ozi ọma Chineke na-atụghị ụjọ.


ỌLU OZI 6:4
Ma anyị ga-ewerekwanụ ọrụ ikpe ekpere, na ọrụ nile metụtara izisa ozi ọma.”


ỌLU OZI 7:59
Mgbe ha na-atụ Stivin nkume ahụ, o kpere ekpere sị, “Onyenwe anyị Jisọs, nara mmụọ m.”


ỌLU OZI 8:15
Mgbe ha bịaruru, ha bidoro ikpe ekpere ka ndị a kwere ekwe nata Mmụọ Nsọ.


ỌLU OZI 8:22
Si nꞌajọ omume gị tụgharịa, kpeekwa ekpere. Ma eleghị anya Chineke ga-agbaghara gị echiche ọjọọ gị nile.


ỌLU OZI 8:24
Saimọn rịọrọ Pita sị ya, “Biko, kpee ekpere rịọrọ m Chineke, ka ihe ndị a nile i kwuru, hapụ ịbịakwasị m.”


ỌLU OZI 9:11
Onyenwe anyị gwara ya okwu sị, “Bilie, gaa nꞌụzọ ahụ a na-akpọ Ama E Guzoziri, chọọ ụlọ nwoke a na-akpọ Judas. Nꞌụlọ nwoke a jụọ ajụjụ banyere nwoke a na-akpọ Sọl onye Tasọs. Ọ nọ nꞌebe ahụ na-ekpe ekpere.


ỌLU OZI 9:40
Pita gwara mmadụ nile ka ha pụọ nꞌụlọ ahụ. O gburu ikpere nꞌala kpee ekpere. Mgbe o kpesịrị, o chere ihu ya nꞌebe ozu nwanyị ahụ dina kwuo okwu sị, “Dọkas, bilie!” Nwanyị ahụ nwụrụ anwụ meghere anya ya. Mgbe ọ hụrụ Pita, o biliri ọtọ, nọdụ ala.


ỌLU OZI 10:2
Nwoke a ji obi ya nile na-efe Chineke, ya na ezinụlọ ya. Ọ na-enyekwara ụfọdụ ndị Juu mkpa na-akpa aka. Ọ bụkwa mmadụ na-ekpe ekpere.


ỌLU OZI 10:4
Ụjọ tụrụ Kọniliọs. O legidere mmụọ ozi ahụ anya jụọ ya sị, “Onyenwe anyị, ọ̀ bụ gịnị ka ị na-achọ?” Mmụọ ozi ahụ zara sị, “Chineke anụla ekpere gị. Ọ hụkwala, ma cheta ọrụ ọma gị nile.


ỌLU OZI 10:9
Nꞌụbọchị nke abụọ ya, mgbe ndị ozi Kọniliọs nọ nso nꞌebe na-adịghị anya site na Jopa, ebe ha na-aga, Pita rigooro nꞌelu ụlọ ahụ ikpe ekpere. Oge ahụ bụ ihe dị ka elekere iri na abụọ nke ehihie.


ỌLU OZI 10:10
Mgbe Pita nọ na-ekpe ekpere, agụụ bidoro ịgụ ya. Ọ chọrọ ihe ọ ga-eri. Ma nꞌụlọ ahụ, a na-akwado ihe oriri nꞌoge ahụ. Nꞌoge Pita nọ na-eche ka e sichaa nri, ọ hụrụ ọhụ.


ỌLU OZI 10:30
Kọniliọs sịrị ya, “Nꞌụbọchị anọ gara aga, mgbe m nọ na-ekpe ekpere nꞌoge ehihie, nꞌihe dị ka elekere atọ, na mberede, ahụrụ m otu nwoke ka o guzoro nꞌihu m. O yikwasịrị onwe ya uwe dị ọcha, nke na-egbukwa amụma.


ỌLU OZI 10:31
“Nwoke a gwara m okwu sị, ‘Kọniliọs, Chineke anụla ekpere gị. Ọ hụkwala ọrụ ọma gị nile.


ỌLU OZI 11:5
Ọ gwara ha sị, “Otu ụbọchị, mgbe m nọ nꞌobodo Jopa, ahụrụ m ọhụ nꞌoge m na-ekpe ekpere. Nꞌime ọhụ a, ahụrụ m ihe yiri efere buru ibu. E budatara ya nꞌihu m. Efere a nwekwara ụkwụ igwe anọ. E sitekwara nꞌeluigwe zidata ya.


ỌLU OZI 12:5
Ma nzukọ Kraịst ezughị ike site nꞌikpe ekpere nye Chineke. Ha rịọsịrị Chineke arịrịọ ike ka o debe Pita nke ọma nꞌime ụlọ mkpọrọ ahụ.


ỌLU OZI 12:12
Mgbe Pita tụgharịsịrị ihe nile ndị a nꞌobi ya, ọ malitere ịga nꞌụlọ Meri nne Jọn Mak. Ọtụtụ ndị kwere ekwe zukọtara nꞌebe ahụ na-ekpe ekpere banyere Pita.


ỌLU OZI 13:2
Otu mgbe, ndị a zukọrọ ibu ọnụ na ikpe ekpere. Mmụọ Nsọ gwara ha okwu sị, “Kewapụnụ Banabas na Sọl ka ha nọdụ iche. Nꞌihi na enwere m ọrụ dị ukwuu ha ga-arụ nꞌaha m.”


ỌLU OZI 13:3
Ya mere, mgbe ha busịrị ọnụ nꞌime ekpere ha, e bikwasịrị Sọl na Banabas aka nꞌisi, zipụ ha ijere Chineke ozi.


ỌLU OZI 14:23
Pọl na Banabas họpụtakwara ndị okenye nꞌime nzụkọ Kraịst dị nꞌebe ahụ. Ha sitere nꞌobubu ọnụ na ekpere tinye ha na nlekọta Onyenwe anyị, onye ha tụkwasịrị obi.


ỌLU OZI 15:40
Ma Pọl họọrọ Saịlas. Emesịa, mgbe ụmụnna kpeere ha ekpere tinye ha nꞌaka amara Onyenwe anyị,


ỌLU OZI 16:13
Nꞌụbọchị izuike, anyị sitere nꞌobodo ahụ gaa nꞌakụkụ osimiri ebe anyị chọpụtara na ụfọdụ mmadụ na-ezukọ ikpe ekpere. Nꞌebe a ka anyị nọ kụziere ọtụtụ ụmụ nwanyị bịara ikpe ekpere okwu Chineke.


ỌLU OZI 16:16
Otu ụbọchị, mgbe anyị na-aga ikpe ekpere nꞌakụkụ ọnụ mmiri, anyị zutere otu nwagbọghọ onye mmụọ ọjọọ bi nꞌime ya. Ọ bụkwa ohu, na onye na-agba aja. Site nꞌụzọ dị otu a ọ na-ewetara ndị nwe ya ego dị ukwuu.


ỌLU OZI 16:25
Nꞌetiti abalị, mgbe Pọl na Saịlas na-ekpe ekpere na-abụkwa abụ ito Chineke, ndị nile nọ nꞌụlọ mkpọrọ ahụ na-anụkwa olu ha.


ỌLU OZI 20:36
Mgbe Pọl kwusịrị okwu ndị a, o soro ha nile gbuo ikpere nꞌala kpeekwa ekpere.


ỌLU OZI 21:5
Ma mgbe otu izu ụka ahụ gasịrị, anyị lọghachiri nꞌụgbọ ahụ, ma ọ bụ ndị inyom na ụmụntakịrị dupụtara anyị nꞌọnụ mmiri ahụ. Anyị kpere ekpere kelee onwe anyị ekele ikpeazụ.


ỌLU OZI 22:17
“Alọghachikwara m na Jerusalem. Ma mgbe m nọ na-ekpe ekpere nꞌụlọ nsọ ukwu ahụ otu ụbọchị ahụrụ Onyenwe anyị nꞌime ọhụ. Ọ gwara m sị,


ỌLU OZI 28:8
Nꞌoge ahụ nna Pọbiliọs nwere ahụ ọkụ na afọ ọsisa. Pọl banyere nꞌime obodo gaa leta ya kpeere ya ekpere bikwasịkwa ya aka. Ahụ dịrị ya mma ọsịịsọ.


ROM 1:7
Nꞌihi ya, ana m edere unu nile bi na Rom akwụkwọ a, unu ndị Chineke hụrụ nꞌanya, ndị a kpọkwara ka ha dị nsọ. Ekpere m bụ ka Chineke nna anyị na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, nye unu amara ya na udo ya.


ROM 1:9
Chineke nꞌonwe ya, onye m na-ejere ozi, site nꞌikwusa ozi ọma nke Ọkpara ya, ga-agbara m akaebe na m na-echeta unu mgbe nile nꞌekpere m ehihie na abalị.


ROM 1:10
Mgbe ọ bụla m na-ekpe ekpere, ana m arịọ ka ọ bụrụ ihe ga-ekwe mee na site nꞌike Chineke, aga m enwe ohere ịbịa leta unu.


ROM 2:22
Ị na-agwa ndị mmadụ ka ha ghara ịkwa iko, i leziela anya hụ na gị onwe gị adịghị akwa iko? Ị chọghị iji anya hụ ka mmadụ na-ekpere arụsị a kpụrụ akpụ, ma ọ naghị ezukpọ ego dị nꞌụlọ nsọ ukwu Chineke?


ROM 8:26
Mgbe ọ bụla kwa anyị ji ndidi na-eche ihe anyị nwere olileanya na anyị ga-enweta, Mmụọ Nsọ na-enyere anyị aka nꞌọnọdụ adịghị ike anyị nile. Nꞌihi na nꞌọnọdụ ụfọdụ, anyị adịghị ama ihe anyị kwesịrị ịrịọ Chineke ka o meere anyị, ma ọ bụ otu anyị ga-esi doo ọnụ anyị kpee ekpere ahụ, ma Mmụọ Nsọ na-eji ịsụ ude nke mmadụ na-enweghị ike ịkọwa na-arịọrọ anyị arịrịọ.


ROM 10:1
Ụmụnna m, ọ na-agụ nnọọ obi m agụụ nke ukwuu ịhụ na a zọpụtara ndị Juu. Nke a mere m ji ekpe ekpere banyere ha mgbe nile.


ROM 12:12
Nweenụ obi aṅụrị nꞌihi ihe nile Chineke na-akwado imere unu. Nweenụ ntachi obi nꞌime nsogbu, na-ekpesikwanụ ekpere ike.


ROM 12:14
Ọ bụrụ na onye ọ bụla emejọọ gị, abụla ya ọnụ, kama kpeere ya ekpere.


ROM 15:13
Ya mere, ekpere m na-ekpe bụ ka Chineke onye na-enye anyị olileanya, were ọṅụ na udo na-adịgide mejupụta unu, mgbe unu na-atụkwasị ya obi, site nꞌike Mmụọ Nsọ ahụ bi nꞌime unu.


ROM 15:30
Esi m nꞌaka Onyenwe anyị Jisọs Kraịst na ịhụnanya anyị nwere nꞌime Mmụọ Nsọ na-arịọ unu, ụmụnna m, ka unu soro m kpee ekpere, na-echeta m nꞌekpere unu nꞌihu Chineke.


ROM 15:31
Biko, rịọnụ Chineke ka ọ zọpụta m nꞌaka ndị na-amaghị ya nọ na Jerusalem. Kpeekwanụ ekpere ka Chineke mee ka ndị Kraịst ahụ anyị na-ewegara onyinye a jiri obi ọma nata ya.


1 KỌRINT 1:4
Mgbe ọ bụla m na-ekpe ekpere, ana m ekele Chineke ekele nꞌihi onyinye amara nile o nyere unu site na Kraịst Jisọs.


1 KỌRINT 4:12
Aka anyị ka anyị ji arụpụtara onwe anyị ihe anyị na-eri. Mgbe ndị mmadụ na-abụ anyị ọnụ, anyị na-ekpere ha ekpere. Mgbe ha na-ata anyị ahụhụ, anyị nọ na-enwe ndidi.


1 KỌRINT 7:5
Ka di na nwụnye hapụ igbochi ibe ha mmekọrịta nke anụ ahụ ruuru ha. Karịakwa ma ọ bụ na mkpebi ha nwere nꞌetiti onwe ha ịnọrọ iche nwoge nta nꞌihi inyefe onwe ha ikpe ekpere nye Chineke. Mgbe oge a gasịrị, ha ga-agakwa nꞌihu na mmekọrịta ha, ka e site otu a hapụ inye ekwensu ohere ịnwa ha ọnwụnwa nꞌihi enweghị ike ha ijide onwe ha aka.


1 KỌRINT 10:7
Ka anyị hapụkwa ịbụ ndị na-ekpere arụsị dị ka ụfọdụ ha mere. Akwụkwọ nsọ kwuru sị, “Ụmụ Izirel nọdụrụ ala na-eri na-aṅụ, ha bilikwara ọtọ ite egwu nꞌihu ehi ahụ e ji ọlaedo kpụọ.”


1 KỌRINT 10:19
Gịnị ka okwu ndị a m na-ekwu pụtara? Ọ̀ bụ na arụsị ahụ ndị na-ekpere arụsị na-achụrụ aja bụ Chineke nꞌezie? Ka m na-ekwu na aja ha chụrụ bara uru ọ bụla? Tụfịakwa, nke a abụghị ihe m na-ekwu.


1 KỌRINT 11:4
Nwoke ọ bụla kpuchiri isi ya mgbe ọ na-ekpe ekpere ma ọ bụ na-ezi ihe na-eme Kraịst onye bụ isi ya ihe ihere.


1 KỌRINT 11:5
Ma nwanyị ọ bụla na-ekpe ekpere ma ọ bụ na-ezi okwu Chineke, ma o kpuchighị isi ya, na-eme di ya ihe ihere, nꞌihi na ọ dịghị ihe dị iche nꞌebe nwanyị a na nwanyị kpụchara isi ya nọ.


1 KỌRINT 11:7
Ma nwoke ekwesịghị ikpuchi isi ya mgbe ọ na-ekpe ekpere nꞌihi na Chineke kere nwoke nꞌoyiyi ya izipụta otuto ya. Ma nwanyị kwesịrị ikpuchi isi ya nꞌihi na nwanyị na-ezipụta otuto nwoke.


1 KỌRINT 11:13
Achọrọ m ka unu tulee ihe a nꞌonwe unu, ọ̀ dị mma ka nwanyị ghebe isi ya oghe mgbe ọ na-ekpe ekpere nꞌihu ọha mmadụ?


1 KỌRINT 11:16
Ọ bụrụ na ọ dị onye jụrụ ịnabata ozizi a, ọ bụrụkwa na onye ahụ achọọ ịrụ ụka, nanị ihe m maara bụ na anyị, na chọọchị nile, adịghị ezi ihe ọ bụla karịa na nwanyị ọ bụla na-ekpe ekpere ma ọ bụ nke na-ekwusa ozi ọma nꞌebe ndị mmadụ nọ kwesịrị ikechi isi ya.


1 KỌRINT 14:14
Ọ bụrụ na m ji asụsụ dị iche na-ekpe ekpere, mmụọ m ga-eso m na-ekpe ekpere ahụ, ma uche m agaghị aghọta ekpere m na-ekpe.


1 KỌRINT 14:15
Ọ bụrụ na ọ dị otu a, olee ihe m ga-eme? Aga m eji mmụọ m kpee ekpere nꞌasụsụ ahụ m na-aghọtaghị jirikwa uche kpee ekpere nꞌasụsụ ahụ m ghọtara. Aga m ejikwa mmụọ m bụọ abụ nꞌasụsụ ahụ m na-aghọtaghị, jirikwa uche m bụọ abụ nꞌasụsụ ahụ m ghọtara, ka m nwee ike ịmata ihe m na-ekwu na ihe m na-abụ nꞌabụ.


1 KỌRINT 14:16
Nꞌihi na mgbe i ji asụsụ nke ndị ọzọ na-amaghị na-ekpere Chineke ekpere, olee otu ndị nile nọ nꞌụlọ nzukọ ahụ na-aghọtaghị ihe ị na-ekwu ga-esi zaa Amin?


1 KỌRINT 14:17
Ọ bụ ezie na ekpere gị ga-ama mma, ma o nyereghị onye ahụ na-anụghị ya aka.


2 KỌRINT 1:11
Ma unu onwe unu nwere ike inyere anyị aka site nꞌikpere anyị ekpere. Nꞌihi na ọ bụrụ na ọtụtụ mmadụ anọgide na-ekpere anyị ekpere, ọtụtụ mmadụ ga-ekelekwa Chineke ekele nꞌihi ngọzi ọ na-agọzi anyị na nꞌihi nchebe ọ na-echebe ndụ anyị.


2 KỌRINT 9:14
Nke a ga-emekwa ka ha nile jiri obi jupụtara nꞌekele kpeere unu ekpere, nꞌihi ịdị ukwu nke amara ahụ Chineke gosiri nꞌebe unu nọ.


2 KỌRINT 12:8
Ekpeela m ekpere ugboro atọ rịọọ Chineke ka o wepụrụ m ahụ mgbu a.


2 KỌRINT 13:7
Ana m ekpekwa ekpere na Chineke ga-enyere unu aka ibi ezi ndu. Ọ bụghị nꞌihi na anyị chọrọ ka mmadụ site na ndụ unu hụ na anyị ziri unu ihe bụ ezi okwu, kama ọ bụ nꞌihi na anyị chọrọ ka unu na-eme ezi ihe ọ bụladị mgbe a na-ekwujọ anyị.


2 KỌRINT 13:9
Anyị na-aṅụrị ọnụ mgbe ndị mmadụ na-eleda anyị anya dị ka ndị na-adịghị ike, ma ọ bụrụ na unu onwe unu abụrụ ndị dị ike. Nꞌihi na ekpere anyị bụ ka unu tuozuo oke nꞌime Kraịst.


GALETIA 4:6
Ebe ọ bụ na anyị bụ ụmụ ya, Chineke zitere Mmụọ Nsọ ya, ka ọ bịa biri nꞌobi anyị, inyere anyị aka, ikpere Chineke Nna anyị ekpere nꞌụzọ ziri ezi.


EFESỌS 1:16
esepụghị m aka ikele Chineke ekele nꞌihi unu. Nꞌihi na mgbe nile ka m na-echeta unu nꞌekpere m nile,


EFESỌS 3:1
Ọ bụ nꞌihi nke a ka mụ onwe m bụ Pọl, onye e tinyere nꞌụlọ mkpọrọ nꞌihi ikwusa ozi ọma Kraịst nye unu bụ ndị mba ọzọ, jiri na-ekpere Chineke ekpere.


EFESỌS 6:18
Kpeenụ ekpere mgbe nile. Rịọnụ Chineke ihe ọ bụla mgbe ọ bụla Mmụọ Nsọ kwaliri unu ikpe ekpere. Rosiekwanụya arịrịọ ike, na-echetara ya mkpa unu, na-ekpekwa ekpere nꞌihi ndị kwere ekwe nọ nꞌebe nile.


EFESỌS 6:19
Kpeekwaranụ m ekpere, ka Chineke tinye nꞌọnụ m okwu ahụ bara uru ọ chọrọ ka m kwuo. Ka m nweekwa ike ịgwa ndị ọzọ banyere Onyenwe anyị na-atụghị egwu. Ịgwa ha ihe omimi ahụ dị nꞌozi ọma.


EFESỌS 6:20
Ọ bụ nꞌihi ozi ọma a m na-ekwusa, ka m ji nọọ nꞌụlọ mkpọrọ. Ma kpeerenụ m ekpere ka m nwee ike ikwusa ozi ọma na-atụghị egwu, ọ bụladị nꞌụlọ mkpọrọ a, dị ka o si kwesị ekwesị.


FILIPAI 1:2
Ka Chineke gọzie unu nile. Ọ bụkwa ekpere m ka Chineke nna anyị, onye bi nꞌeluigwe, na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst gọzie unu nile. Ka o nyekwa unu udo zuru oke nꞌime obi unu.


FILIPAI 1:4
Nꞌime arịrịọ nile m na-arịọ ya nꞌekpere m nꞌihi unu, obi m na-ejupụta nꞌọṅụ.


FILIPAI 1:9
Ọ bụkwa nꞌihi nke a ka m ji na-ekpesi ekpere ike, ka ịhụnanya unu na-ahụrịta onwe unu na-aba ụba. Ka unu nwee ike ito eto, ruo nꞌinwe mmazu na nghọta nke eziokwu ahụ.


FILIPAI 1:19
Nꞌihi nke a, amaara m na site nꞌekpere unu, ya na ịgba ume nke Mmụọ Nsọ, ihe ndị a nile dakwasịrị m ga-emesị ghọọrọ m ihe ọma.


FILIPAI 4:6
Unu echegbula onwe unu banyere ihe ọ bụla. Kama nꞌihe nile, sitenụ nꞌekpere na arịrịọ, ya na ekele, chee ihe nile na-akpa unu nꞌihu Chineke.


KỌLỌSI 1:3
Mgbe ọ bụla anyị na-ekpere unu ekpere, anyị na-ekele Chineke onye bụ Nna Onyenwe anyị Jisọs Kraịst ekele.


KỌLỌSI 1:9
Nꞌihi nke a site nꞌụbọchị anyị nụrụ ihe banyere unu, anyị esepụghị aka ikpere unu ekpere. Anyị na-ekpe ekpere na-arịọ Chineke ka o nyere unu aka ịghọta ihe ọ chọrọ ka unu mee. Anyị na-arịọkwa ya ka o nye unu amamihe nke ga-enyere unu aka ịmata ihe nke mmụọ.


KỌLỌSI 2:1
Ọ gaara atọ m ụtọ ma a sị na unu ga-ghọta otu m si gbasie mgba ike nꞌekpere m nꞌihi unu, na nꞌihi ndị nọ nꞌobodo Laodisia, na ndị nile na-enwebeghị ike ịhụ m ihu na ihu.


KỌLỌSI 4:2
Na-anọgidenụ nꞌekpere. Nọọkwanụ na nche mgbe unu na-ekpe ekpere, ma na-ekelekwanụ Chineke ekele.


KỌLỌSI 4:3
Na-echetakwanụ anyị nꞌekpere, ka Chineke meghere anyị ụzọ ikwusa ozi ọma, nke bụ ikwusa ihe omimi Kraịst. Ọ bụkwa nꞌihi ikwusa ozi ọma a ka m ji nọrọ nꞌụlọ mkpọrọ taa.


KỌLỌSI 4:4
Na-ekperenụ m ekpere ka m nwee ike ịkọwa ozi ọma a nꞌụzọ ọ ga-esi kwe mmadụ nile ịghọta ya.


KỌLỌSI 4:12
Epafras, odibo Kraịst Jisọs na onye bụkwa otu onye nꞌime ọgbakọ unu na-ekele unu. Oge nile ka ọ na-ekpe ekpere nꞌihi unu, na-arịọ ka unu guzosie ike nꞌokwukwe dị ka ndị tozuru oke, ndị maara ihe ha na-eme, ndị weere onwe ha nyefee nꞌaka ọchịchọ Chineke.


KỌLỌSI 4:13
Ana m agba akaebe na ọ na-adọgbu onwe ya nꞌọrụ ikpe ekpere nꞌihi unu na nꞌihi ndị Laodisia na ndị Hierapolis.


1 TESALỌNAIKA 1:2
Anyị na-ekele Chineke ekele mgbe nile, na-echetakwa unu nꞌekpere anyị.


1 TESALỌNAIKA 1:3
Mgbe nile ka anyị na-echeta nꞌekpere nye Chineke bụ Nna, ihe gbasara ọrụ unu nke sitere nꞌokwukwe, ya na ịrụsị ọrụ ike unu nke sitere nꞌịhụnanya, na iguzosị ike unu nke sitere nꞌolileanya unu nwere nꞌOnyenwe anyị Jisos Kraịst.


1 TESALỌNAIKA 5:17
Na-ekpenụ ekpere oge nile na-esepụghị aka.


1 TESALỌNAIKA 5:25
Biko ụmụnna anyị, na-ekperenụ anyị ekpere.


2 TESALỌNAIKA 2:4
Onye mmebi iwu ahụ ga-ebuli onwe ya elu imegide ndị nile na-asọpụrụ chi dị iche iche, na ofufe nile dị iche iche, na ndị na-ekpere Chineke nꞌeziokwu. Ọ ga-abanye nꞌụlọ nsọ ukwu Chineke nodụ nꞌebe ahụ kpọọ onwe ya Chineke.


2 TESALỌNAIKA 3:1
Na mmechi okwu anyị, ụmụnna anyị, kpeerenụ anyị ekpere. Rịọnụ arịrịọ ka Chineke mee ka ozi ọma Onyenwe anyị na-aga nꞌihu. Ka ike dị nꞌozi ọma ahụ weta nchegharị nꞌime ndị nile ga-anụ ya dị ka o wetara nꞌime ndụ unu, mgbe anyị bịakwutere unu na mbụ.


2 TESALỌNAIKA 3:2
Ọzọ kwa, kpesiekwaranụ anyị ekpere ike, ka anyị ghara ịdaba nꞌaka ndị mmadụ ọjọọ nꞌihi na ọ bụghị mmadụ nile hụrụ Onyenwe anyị nꞌanya.


1 TIMỌTI 2:1
Ihe mbụ m na-adụsị gị ọdụ ike ka i mee bụ nke a. Na-ekpesịrị ndị ọzọ ekpere ike. Rịọ arịrịọ ka Chineke meere ha ebere. Nꞌime ekpere gị nile na-enyekwa Chineke ekele nꞌihi ihe ọ ga-emere ha.


1 TIMỌTI 2:2
Kpeekwara ndị eze ekpere, ha na ndị nile nọ nꞌọnọdụ dị elu, ma ọ bụ ndị na-achị anyị. Ka anyị nwee ike ibi ndụ udo na nke ịdị nwanyọọ, jiri oge anyị nile na-ebi ndụ ịsọpụrụ Chineke, na nke ime ezi omume.


1 TIMỌTI 2:8
Nꞌihi nke a, achọrọ m ka ndị ikom nile nọ nꞌebe nile, ndị aka ha dị ọcha, na ndị aka ha na-ejupụtaghị na mmehie, ndị naebughị iro nꞌobi na ndị na-adịghị arụ ụka, ka ha chilie aka ha elu kpọkuo Chineke nꞌekpere.


1 TIMỌTI 4:5
rịọ Chineke ka ọ gọzie ya, nꞌihi na a na-eme ka nri ahụ bụrụ ihe dị mma site nꞌokwu Chineke na ekpere.


1 TIMỌTI 5:5
Nwanyị di ya nwụrụ, nke nọ nanị ya nꞌụwa, na-enweghị onye inyeaka, nwere olileanya na Chineke ga-enyere ya aka. Ọ na-anọgidekwa nꞌekpere ehihie na abalị na-arịọ enyemaka Chineke.


1 TIMỌTI 5:8
Ọ bụrụ na onye ọ bụla ajụ inyere ikwu na ibe ya ka, nke ka nke, onye ọ bụla jụrụ inyere ndị ezinụlọ nke aka ya aka, ekwesịghị ịkpọ onwe ya onye nke Kraịst. Nꞌihi na onye dị otu a dị njọ karịa onye na-ekpere arụsị.


2 TIMỌTI 1:3
Ana m ekele Chineke ekele nꞌihi gị Timoti. Ana m ekpere gị ekpere kwa ụbọchị. Ọtụtụ mgbe kwa, ma ọ bụ nꞌime abalị, ka m na-ebili na-arịọ Chineke arịrịọ ka ọ gọzie gị. Chineke, onye bụ Chineke nke nna nna m ha, na Chineke nke m kwa. Ọ bụkwa nanị otu ihe ka m na-ezube nꞌime ndụ a, ọ bụ ime ihe ga-atọ ya ụtọ.


2 TIMỌTI 1:18
Ekpere m bụ ka Onyenwe anyị nye ya ezi ngọzi pụrụ iche nꞌụbọchị ahụ Kraịst ga-alọghachi. Ị makwaara nke ọma karịa ka m nwere ike ịgwa gị, otu o si nyere m aka nꞌEfesọs.


2 TIMỌTI 4:16
Na mbụ mgbe a kpọtara m nꞌihu onye ikpe, ọ dịghị onye ọ bụla bịara nyere m aka, mmadụ nile gbara ọsọ hapụ m. Ekpere m bụ ka Chineke hapụ ịgụnyere ha omume a dị ka mmehie.


FAILIMON 1:4
Nwanna m Faịlimọn, ana m ekele Chineke ekele mgbe ọ bụ m na-echeta gị nꞌekpere nile m na-ekpe.


FAILIMON 1:6
Ekpere m na-ekpe nꞌihi gị bụ ka Chineke mee ka ndị ahụ nile naesite na ndụ gị na nꞌọnụ gị na-anụ ozi ọma ahụ bụrụ ndị ga-ekpebi iso Kraịst nꞌihi ihe ọma ha na-ahụ nꞌime gị nke na-esi nꞌebe Kraịst nọ abịa.


FAILIMON 1:22
Were okwukwe kwadooro m ebe m ga-anọ nꞌihi na enwere m olileanya na Chineke ga-aza ekpere unu ime ka m si nꞌebe a pụta bịakwute unu.


HIBRU 5:7
Mgbe Jisọs nọ nꞌụwa, o kpere ekpere nye Chineke. Mgbe ụfọdụ nꞌọnọdụ ekpere ahụ, ọ na-akwa akwa. Mgbe ọzọ kwa, anya mmiri na-ejupụta ya nꞌanya. O kpere ekpere ya nye Chineke nꞌihi na ọ maara na Chineke pụrụ ịzọpụta ya site nꞌọnwụ. Chineke nụkwara ekpere ya, nꞌihi na Jisọs bụ onye nchụaja na-erube isi.


HIBRU 13:18
Kpeerenụ anyị ekpere nꞌihi na akọnuche anyị amaghị anyị ikpe. Anyị chọkwara ibi ndụ anyị nꞌime nkwanye ugwu nꞌihe nile.


HIBRU 13:19
Eji m nwayọọ na-arịọ unu ka unu kpeere m ekpere, ka m nwee ike ịlọghachikwute unu ọsịịsọ.


JEMES 1:26
Ọ bụrụ na mmadụ ọ bụla echee na ya bụ onye na-ekpere Chineke ma hapụ ijide ire ya aka ma ọ bụ ịkwa ire ya nga, onye dị otu a na-arafu onwe ya, okpukpe Chineke ya bụkwa ihe na-abaghị uru.


JEMES 5:13
Ọ̀ dị onye ọ bụla nꞌetiti unu nọ na nsogbu? Ka onye dị otu ahụ kpee ekpere. Ọ̀ dị onye na-aṅụrị ọṅụ? Ya bụọ abụ ito Chineke.


JEMES 5:14
Ọ̀ dị onye nọ nꞌetiti unu ahụ naesighị ike? Ya kpọọ ndị okenye chọọchị ka ha kpeere ya ekpere, ka ha wụkwasịkwa ya mmanụ otite nꞌisi kpọkuokwa aha Onyenwe anyị.


JEMES 5:15
Ọ bụrụkwa na ha sitere nꞌokwukwe kpeere Chineke ekpere ha, a ga-eme ka ahụ dị onye ọrịa ahụ mma. Onyenwe anyị ga-emekwa ka o site nꞌute ọrịa bilie. Ọ bụrụkwa na o mehiere, ọ ga-agbaghara ya mmehie ya.


JEMES 5:16
Ya mere, kwupụtaranụ ibe unu mmehie unu, kpeekwara ibe unu ekpere ka Chineke gwọọ unu. Chineke na-anụ ekpere onye ezi omume, na-azakwa ya.


JEMES 5:17
Ịlaịja onye amụma, bụrị mmadụ efu dị ka anyị, ma o kpere ekpere rịọ ka mmiri hapụ izo, mmiri ezokwaghị ruo afọ atọ na mkpirisi.


JEMES 5:18
Emesịa, o kpekwara ekpere ọzọ, nke mere ka mmiri zoo, meekwa ka ala pupụta ihe oriri.


1 PITA 1:17
Matanụ nke ọma na Chineke, onye ahụ unu na-akpọku nꞌekpere, adịghị ele mmadụ anya nꞌihu mgbe ọ na-ekpe mmadụ ikpe. Ọ na-ekpe onye ọ bụla ikpe dị ka ọrụ ya si dị, nꞌihi ya, jiri itu egwu Chineke bie ndụ gị nꞌụwa.


1 PITA 3:7
Unu bụ di na-alụ nwụnye lezienụ nwụnye unu anya nke ọma. Cheenụ echiche banyere ihe na-akpa ha mkpa nꞌihi adịghị ike ha. Nye ha ugwu ruuru ha nꞌihi na ọ bụ unu na nwụnye unu ga-abụ otu ịnata ndụ ahụ Chineke ga-enye. Ọ bụrụ na unu emesoghị ha mmeso dị ka o si kwesị Chineke agaghị aza ekpere unu.


1 PITA 3:9
Unu ejila ihe ọjọọ akwụghachi ihe ọjọọ e mere unu, ma ọ bụ gwa mmadụ okwu ọjọọ mgbe ha gwara unu okwu ọjọọ. Kama kpeenụ ekpere ka Chineke gọzie ha, nꞌihi na anyị kwesịrị ịbụ ndị na-emere ndị ọzọ ebere. Chineke ga-agọzikwa unu nꞌihi ya.


1 PITA 3:12
Nꞌihi na Chineke si nꞌelu na-ele ndị ezi omume anya mgbe nile, ọ na-egekwa ntị nꞌekpere ha, ma ọ na-ele ndị ajọ omume anya ọjọọ.”


1 PITA 4:7
Ọgwụgwụ ihe nile adịla nso. Bụrụnụ ndị nwere akọnuche zuru oke, ndị nọ na njikere, na ndị na-ekpekwa ekpere.


1 JỌN 5:14
Anyị nwekwara ntụkwasị obi na Chineke ga-anụ ekpere anyị mgbe ọ bụla anyị nịọrọ ya ihe ọ bụla dị ka ọchịchọ ya si dị.


1 JỌN 5:15
Ọ bụrụ na anyị maara na ọ na-ege anyị ntị mgbe ọ bụla anyị kpọkuru ya chee mkpa anyị nꞌihu ya, anyị nwere ntụkwasị obi na ọ ga-aza ekpere anyị.


1 JỌN 5:16
Ọ bụrụ na ị hụ nwanna nꞌime Kraịst ka ọ na-eme mmehie na-adịghị edube onye na-eme ya nꞌọnwụ, kpee ekpere nꞌihi ya rịọ Chineke ka ọ gbaghara ya. Chineke ga-enyekwa ya ndụ. Ọ bụ nanị mgbe ị maara na mmehie ya bụ nke na-eduba onye mere ya nꞌọnkụ ka ị ga-ahapụ ikpere ya ekpere.


3 JỌN 1:2
Enyi m, ana m ekpere gị ekpere mgbe nile na-arịọ Chineke ka o mee ka ihe na-agara gị nke ọma, ka ahụ sie gị ike, dị ka ihe si agara mkpụrụ obi gị nke ọma.


JUD 1:20
Ma unu ụmụnna m, nọgidenụ naewuli onwe unu elu nꞌime mmụọ unu, nꞌelu ntọ ala ahụ anyị kweere nꞌime ya. Na-ekpenụ ekpere site nꞌike Mmụọ Nsọ.


NKPUGHE 1:10
Nꞌụbọchị Onyenwe anyị, nke bụ ụbọchị Sọnde, mgbe m nọ na-ekpe ekpere, na mberede, anụrụ m oke olu tiri mkpu nꞌakụkụ m. Olu a dara ụda dị ka opi ike.


NKPUGHE 5:8
Mgbe Nwa atụrụ ahụ naara akwụkwọ ahụ, iri ndị okenye abụọ na anọ ahụ, ndị gbara ocheeze ukwu ahụ gburugburu dara nꞌala nꞌihu Nwa atụrụ ahụ. Ha nile nꞌotu nꞌotu jikwa opi na efere e ji ọlaedo mee, nke ihe na-esi isi ụtọ jupụtara nꞌime ha. Ihe na-esi isi ụtọ a bụkwa ekpere ndị nsọ.


NKPUGHE 8:3
Mmụọ ozi ọzọ nke ji ite igwe ntakịrị e ji ọlaedo kpụọ bịara guzo nꞌakụkụ ebe ịchụ aja. E nyere ya ihe ịchụ aja na-esi isi ụtọ nke ọ ga-eji gwakọta ya na ekpere ụmụ Chineke, were ya chụọ aja nꞌihu Chineke nꞌebe ịchụ aja e jiri ọlaedo wuo nke dị nꞌihu ocheeze Chineke.


NKPUGHE 8:4
Mgbe ahụ, isisi ụtọ nke ihe ahụ a chụrụ nꞌebe ịchụ aja ahụ, ya na ekpere ahụ ụmụ Chineke kpere, sitere nꞌebe ịchụ aja ahụ mmụọ ozi ahụ jiri ya chụọ aja rigoro elu ruo nꞌebe Chineke nọ.


NKPUGHE 17:5
Aha gbagwojuru mmadụ anya ka e dekwasịrị ya nꞌegedege ihu. Nke a bụkwa ihe ahụ e dere: “Obodo ukwu ahụ bụ Babilọn nne ndị na-akwa iko na nne ndị nọ nꞌebe nile nꞌụwa na-ekpere arụsị.”


NKPUGHE 21:8
Ma ndị na-atụ ụjọ, ndị na-alaghachi azụ site nꞌiso m, ha na ndị na-adịghị atụkwasị m obi, na ndị na-emetọ onwe ha, na ndị ogbu mmadụ, na ndị na-akwa iko, na ndị ha na mmụọ ọjọọ na-akparịta ụka, na ndị na-ekpere arụsị, na ndị ụgha nile, ihe ha ga-eketa bụ ikpe ọmụma nke ịbanye nꞌime olulu ahụ e ji nkume na-enwụ ọkụ kwanye ọkụ.”


NKPUGHE 22:15
Nꞌazụ obodo ka ndị ahụ bụ nkịta nọ, ha na ndị nile na-agba aja, na ndị nile na-akwa iko, na ndị nile na-egbu mmadụ, na ndị nile na-ekpere arụsị, na ndị nile hụrụ ụgha nꞌanya ma na-emekwa ya.


Igbo Bible 1988
No Data