A A A A A

Chọọ
MATIU 1:20
Mgbe Josef nwechara mkpebi a, mmụọ ozi Onyenwe anyị bịakwutere ya na nrọ sị ya, “Josef nwa Devidi, atụla egwu ịkpọrọ Meri ka ọ bụrụ nwụnye gị, nꞌihi na nwa ahụ ọ dị ime ya sitere nꞌaka Mmụọ Nsọ.


MATIU 9:8
Mgbe ọtụtụ mmadụ hụrụ ihe Jisọs mere, akpata oyi pụrụ ha nꞌahụ nꞌihi egwu. Ha toro Chineke onye na-enye ụmụ mmadụ ike dị otu a.


MATIU 9:22
Jisọs chigharịrị lee ya anya sị ya, “Ada m, atụla egwu, nꞌihi na e sitela nꞌokwukwe gị mee ka ahụ dị gị mma.” Ahụ dịkwara nwanyị ahụ mma site nꞌoge ahụ.


MATIU 10:26
“Unu atụla egwu ndị na-emenye unu ụjọ. Oge na-abịa mgbe a ga-ekpughe eziokwu nile. A ga-emekwa ka izuzu obi nile zoro ezo pụta ìhè.


MATIU 10:28
“Unu atụla egwu ndị pụrụ igbu nanị anụ ahụ unu, ma ha enweghị ike ịmetụ mkpụrụ obi unu aka. Kama onye unu ga-atụ egwu bụ Chineke nanị, onye nwere ike imebi anụ ahụ unu na mkpụrụ obi unu, tụbakwa ha nꞌọkụ ala mmụọ.


MATIU 11:16
“Gịnị ka m ga-eji tụnyere ndị bi nꞌọgbọ a? Gịnị ka ha yiri? Ha dị ka ụmụntakịrị na-egwuri egwu nꞌama, ndị na-asị ibe ha,


MATIU 11:17
‘Anyị na-afụrụ unu opi, ma unu ekweghị ite egwu. Anyị na-abụrụ unu abụ ili ozu, ma unu akwaghị akwa.’


MATIU 12:26
Otu a kwa, ọ bụrụ na ụfọdụ mmụọ ọjọọ nꞌime alaeze ekwensu na-alụso ibe ha ọgụ na-emegide ha, nke a na-egosi ha ọdịda alaeze ahụ adịghị anya, nꞌihi na nkewa dị egwu abatala nꞌime alaeze ahụ.


MATIU 14:5
Herọd chọrịrị igbu Jọn, ma ọ tụrụ egwu na obi agaghị atọ ndị Juu ụtọ, nꞌihi na mmadụ nile kweere na Jọn bụ onye amụma.


MATIU 14:6
Ma otu ụbọchị, mgbe a na-eme mmemme icheta ọmụmụ Herọd, ada Herọd, nke Herodias mụtara, tere egwu nꞌihu nna ya Herọd, na nꞌihu ndị ọbịa bịara nꞌụbọchị ahụ. Obi tọrọ Herọd ụtọ nke ukwuu.


MATIU 14:24
Mgbe ndị na-eso ụzọ Jisọs ruru nꞌetiti osimiri, ebili mmiri dị egwu malitere ịmali elu, na-ebugharị ụgbọ mmiri ahụ, nꞌihi na ifufe na-efesi ike.


MATIU 14:26
Mgbe ndị na-eso ụzọ ya hụrụ ya ka ọ na-abịa, oke egwu jidere ha. Ha tiri mkpu sị, “Ọ bụkwanụ mmụọ o!” Ha chere na Jisọs bụ mmụọ.


MATIU 14:27
Ma Jisọs sịrị ha, “Unu atụla egwu! Ọ bụ m.”


MATIU 17:6
Mgbe Pita na Jemes, na Jọn nụrụ olu a, ha dara nꞌala kpuchie ihu ha nꞌihi egwu.


MATIU 17:7
Ma Jisọs jekwuuru ha metụ ha aka sị ha, “Bilienụ, unu atụla egwu.”


MATIU 19:25
Okwu a Jisọs kwuru mere ka egwu tụọ ndị na-eso ụzọ ya. Ha sịrị, “Ọ bụrụ na o si otu a dịrị, onye kwanụ ka a ga-azọpụta?”


MATIU 20:22
Jisọs zara sị ya, “Unu amaghị ihe unu na-arịọ ka m meere unu.” O chigharịrị lee Jemes na Jọn anya, jụọ ha ajụjụ sị, “Ùnu pụrụ ịṅụ site nꞌiko a dị oke egwu nke m ga-aṅụ?” Ha zara sị, “Ee, anyị nwere ike ịṅụ ya.”


MATIU 21:20
Mgbe ndị na-eso ụzọ ya hụrụ ka osisi ahụ kpọnwụrụ, ha tụrụ egwu, jụọ Jisọs ajụjụ sị ya, “Gịnị mere osisi fiigi a ji kpọnwụọ ngwangwa otu a?”


MATIU 21:46
ha chọrọ ijide ya. Ma ha tụrụ oke egwu, nꞌihi na igwe mmadụ nọ nꞌebe ahụ kweere na Jisọs bụ onye amụma.


MATIU 24:6
Mgbe unu nụrụ ụzụ agha, na akụkọ agha dị iche iche, unu atụla egwu, nꞌihi na ihe ndị a aghaghị ime. Ma ha egosighị na oge nlọghachi m eruola.


MATIU 25:25
Atụrụ m egwu gị, nꞌihi na amaara m onye ị bụ. Ya mere eweere m ego gị liere gị nꞌala. Lee ya nꞌebe a!’


MATIU 27:54
Mgbe ọchịagha na-achị narị ndị agha, na ndị agha ya nọ nꞌebe ahụ na-eche Jisọs nche hụrụ ala ọma jijiji a, na ihe nile mere, ha tụrụ oke egwu. Ha kwuru sị, “Nꞌezie, nwoke a bụ Ọkpara Chineke!”


MATIU 28:4
Mgbe ndị na-eche ili ahụ nche hụrụ mmụọ ozi a ha tụrụ oke egwu. Ha makwara jijiji, daa nꞌala, nọọ dị ka ndị nwụrụ anwụ.


MATIU 28:5
Ma mmụọ ozi ahụ gwara ụmụ nwanyị ahụ okwu sị ha, “Unu atụla egwu, nꞌihi na amaara m na ọ bụ Jisọs onye a kpọgburu nꞌelu obe ka unu na-achọ.


MATIU 28:8
Ụmụ nwanyị ahụ jiri oke egwu na ọṅụ gbara ọsọ gaa izi ndị na-eso ụzọ Jisọs ozi a mmụọ ozi ahụ ziri ha.


MATIU 28:10
Mgbe ahụ Jisọs gwara ha sị, “Unu atụla egwu. Kama gwanụ ụmụnne m ka ha gaa Galili. Ha ga-ahụ m nꞌebe ahụ.”


MAK 4:38
Mgbe ihe ndị a nile na-eme, Jisọs nọrị nꞌime ụgbọ ahụ na-arahụ ụra. O jiri akwa a fụkọtara afụkọta hinye nꞌisi ya. Ndị na-eso ụzọ ya tụrụ oke egwu mgbe ihe ndị a na-eme, gbaara ọsọ tie mkpu kpọtee ya, na-asị, “Nna anyị ukwu! Ọ dịghị emetụ gị nꞌobi na anyị nile ga-anwụ ma ụgbọ anyị mikpuo?”


MAK 4:41
Ha nile tụrụ egwu, jụrịtaa onwe ha sị, “Onye ka nwoke a bụ? Nwoke a ifufe na ebili mmiri na-eme ihe o nyere ha nꞌiwu?”


MAK 5:36
Mgbe Jisọs nụrụ ozi ahụ, ọ gwara Jaịrọs okwu sị, “Atụla egwu. Nanị ihe ị ga-eme bụ inwe okwukwe.”


MAK 6:20
Nꞌihi na Herọd tụrụ egwu Jọn. Ọ maara na Jọn bụ ezi mmadụ, na onye dị nsọ. Nꞌihi nke a o tinyere ya nꞌụlọ mkpọrọ ichebe ndụ ya. Site nꞌoge ruo nꞌoge, Herọd na-akpọpụta Jọn ka ya na ya kparịa ụka. Ma ọ bụ ezie na Herọd adịghị enwe obi udo mgbe ọ bụla ya na Jọn kaparịtara ụka, ma ọ na-atọkwa Herọd ụtọ ịna anụ ihe Jọn na-ekwu.


MAK 6:22
Nꞌoge oriri ahụ, ada Herọd, nke Herodịas mụtara, pụtara tee egwu nꞌihu Herọd na nꞌihu ndị ọbịa ya. Obi tọrọ ndị nọ nꞌebe ahụ ụtọ nꞌihu egwu o tere.


MAK 6:50
Ọ bụkwa ha nile hụrụ ya. Ụjọ tụkwara ha nile. Ma ngwangwa, Jisọs gwara ha sị, “Nweenụ obi ike! Unu atụla egwu, ọ bụ m.”


MAK 8:11
Mgbe Jisọs ruru nꞌebe ahụ, ndị Farisii bịakwutere ya bido ịjụ ya ajụjụ. Ha gwara Jisọs okwu sị ya, “Ị bụrụ ihe ahụ ị sị na ị bụ, mee ka ihe dị egwu mee na mbara eluigwe. Mgbe ahụ anyị ga-ekwere na ị bụ onye ahụ.”


MAK 9:6
Pita amakwaghịnụ ihe ọ na-ekwu, nꞌihi na oke egwu tụrụ ha atọ.


MAK 9:32
Ma ndị na-eso ụzọ ya aghọtaghị ihe ọ na-agwa ha. Ha tụkwara egwu ịgwa ya ka ọ kọwaa ihe ọ na-ekwu.


MAK 10:32
Ha nọ nꞌụzọ na-aga Jerusalem mgbe ihe ndị a na-eme. Jisọs kpo ihu, ndị na-eso ụzọ ya egwu juru obi so ya nꞌazụ. Otu a kwa ndị mmadụ nile na-abịa ha nꞌazụ tụkwara ụjọ. Ọzọ kwa, Jisọs kpọọrọ ndị na-eso ụzọ ya pụọ nꞌebe ndị mmadụ nọ bido na-agwa ha ihe na-akwado ịdakwasị ya.


MAK 11:18
Mgbe ndị isi nchụaja na ndị ozizi iwu nụrụ ihe Jisọs kwuru, ha bidoro ịchọ ụzọ ha ga-esi gbuo ya. Ha tụrụ egwu na Jisọs pụrụ ime ka ọgba aghara bido, nꞌihi na ọtụtụ mmadụ na-anabata okwu ya nke ọma.


MAK 12:12
Mgbe ahụ ndị isi ndị Juu ahụ chọrọ ụzọ ijide ya, nꞌihi na ha maara na ọ bụ ha ka Jisọs ji atụnye ndị mmadụ ọjọọ ahụ na-elekọta ubi nꞌime akụkọ ahụ ọ kọrọ. Ma ha emetụghị ya aka nꞌihi na ha tụrụ egwu ihe ndị mmadụ ga-eme ha. Ya mere, ha hapụrụ ya pụọ.


MAK 12:14
Ndị a bịakwutere Jisọs sị ya, “Onye ozizi, anyị maara na ị bụ nwoke na-ekwu eziokwu na-atụghị egwu. Ị dịghị echegbu onwe gị banyere ihe ndị mmadụ na-ezu megide gị, nꞌihi na ị naghị ele mmadụ anya nꞌihu. Kama ị ji obi ọcha na-ezi otu mmadụ ga-esi mee ihe ga-atọ Chineke ụtọ. Ma ugbu a, anyị chọrọ ka ị gwa anyị, o ziri ezi ịtụ ụtụ nye Siza, ka o zighị ezi.


MAK 13:17
“Ụbọchị ahụ ga-adị nnọọ oke egwu nye ụmụ nwanyị ndị dị ime, na ụmụ nwanyị na-enye ụmụaka ara.


LUK 1:11
Mgbe Zakaraya nọ nꞌime ime ụlọ nsọ ahụ na-achụ aja ya, mmụọ ozi Chineke mere ka Zakaraya hụ ya anya. Mmụọ ozi a bịara guzo nꞌakụkụ aka nri ebe nchụaja ahụ Zakaraya nọ na-achụ aja nsure ọkụ ya. Mgbe Zakaraya hụrụ mmụọ ozi a, obi fepụrụ ya. Ọ tụkwara oke egwu.


LUK 1:13
Ma mmụọ ozi ahụ gwara ya okwu sị, “Zakaraya, atụla egwu! Nꞌihi na abịara m ịgwa gị na Chineke anụla ekpere gị. Ọ ga-emekwa ka Elizabet nwụnye gị tụrụ ime, mụtara gị nwa nwoke, onye ị ga-akpọ aha ya Jọn.


LUK 1:30
Ma mmụọ ozi ahụ sịrị ya, “Atụla egwu, nꞌihi na Chineke ekpebiela imere gị ihe ọma!


LUK 1:50
Nꞌezie, nꞌọgbọ nile, Chineke na-emere ndị nile na-atụ egwu ya ebere.


LUK 1:74
sị, na ya ga-adọpụta anyị site nꞌaka ndị iro anyị mee anyị ka anyị bụrụ ndị ga-efe ya ofufe na-atụghị egwu,


LUK 2:9
Na mberede, ndị ọzụzụ atụrụ a hụrụ mmụọ ozi Onyenwe anyị ka ọ bịara guzo nꞌihu ha. Ebube Chineke gbakwara ha gburugburu mee ka ìhè jupụta nꞌebe ahụ ha nọ dị ka a ga-asị na ọ bụkwaghị abalị. Oke egwu tụrụ ndị ọzụzụ atụrụ ahụ.


LUK 2:10
Ma mmụọ ozi ahụ gwara ha okwu sị ha, “Unu atụla egwu nìhi na ewtaara m unu ozi oma nke na-eweta oke ọṅụ, bụ ọṅụ ga-adịrị mmadụ nile.


LUK 2:15
Mgbe ndị mmụọ ozi a laghachiri nꞌeluigwe, ndị ọzụzụ atụrụ sịrịtara onwe ha, “Bịanụ ka anyị jeruo Betilehem, ka anyị jiri anya anyị hụ ihe ndị a dị egwu nke Onyenwe anyị gwara anyị site nꞌọnụ mmụọ ozi.”


LUK 5:10
Ee, ọ bụladị Jemes na Jọn ụmụ Zebedi ndị ha na Pita so, ka azụ a ha gbutere juru anya. Mgbe ahụ Jisọs gwara ha sị, “Unu atụla egwu, nꞌihi na site taa gaa nꞌihu, ọrụ unu ga-abụ ịkpọbata mmadụ nꞌalaeze Chineke.”


LUK 5:26
Ọrụ a tụrụ ndị nile nọ nꞌebe ahụ nꞌanya. Ha bidokwara na-eto Chineke. Oke egwu jupụtara ha nꞌobi, mee ka ha kwuo sị, “Anya anyị ahụla ihe ọ na-ahụbeghị mbụ, ọrụ ebube dị ukwuu!”


LUK 6:23
Nụrịanụ ọṅụ mgbe ihe ndị a na-adakwasị unu, teekwanụ egwu ọṅụ, nꞌihi na ụgwọ ọrụ unu ga-adị ukwuu nꞌeluigwe. Nꞌihi na ọ bụkwa otu a ka nna nna ha siri meso ndị amụma.


LUK 7:32
Ha dị ka ụmụntakịrị nọ nꞌama na-egwu egwu, ndị na-akpọ ibe ha na-asị, ‘Anyị na-afụrụ unu opi ma unu adịghị ete egwu, anyị na-abụrụ unu abụ ili ozu ma unu adịghị akwa akwa.’


LUK 8:25
Mgbe ahụ Jisos jụrụ ndị na-eso ụzọ ya si, “Ebeekwanụ ka okwukwe uni di?” Ma ha tụrụ nnọọ oke egwu sịritaa onwe ha, “Onye ka nwoke a bụ, onye ikuku na ebili mmiri na-eme ihe o nyere ha nꞌiwu.”


LUK 8:47
Mgbe nwanyị ahụ hụrụ na ọ dịkwaghị ihe o nwere ike ime izo onwe ya, o jiri egwu na ahụ ịma jijiji bịa daa nꞌala nꞌihu Jisọs, kọọrọ ya ihe nile mere nꞌihu mmadụ nile. Ọ gwakwara Jisọs ihe mere o ji metụ ya aka.


LUK 8:48
Jisọs gwara ya sị, “Ada m nwanyị, atụla egwu, okwukwe i nwere nꞌime m agwọọla gị.”


LUK 8:50
Ma mgbe Jisọs nụrụ ihe onye ahụ kwuru, ọ gwara Jairọs sị, “Atụla egwu, kama kwere na m, a ga-emekwa ka ahụ dị ya mma.”


LUK 9:34
Mgbe Pita kpụ okwu ahụ nꞌọnụ, igwe ojii kpuchigidere ha. Egwu tụrụ Pita na Jọn na Jemes mgbe igwe ojii ahụ kpuchigidere ha.


LUK 12:4
“Ndị enyi m, unu atụla egwu ndị chọrọ igbu unu. Nꞌihi na ọ bụ nanị anụ ahụ ka ha nwere ike igbu. Ha enweghị ike ịmetụ mkpụrụ obi unu aka.


LUK 12:5
Ma ka m gwa unu onye unu kwesịrị ịtụ egwu. Tụọnụ egwu Chineke, onye nwere ike igbu mmadụ tụnyekwa ya ala mmụọ.


LUK 12:7
Chineke makwaara ọ bụladị ọnụ ọgụgụ agịrị isi dị nꞌisi unu. Unu atụla egwu. Unu dị mkpa karịa ọtụtụ ụmụ nza.


LUK 12:32
“Ya mere, unu atụla egwu ụmụ m, nꞌihi na Nna unu ahọpụtala unu inye unu alaeze ya.


LUK 13:34
“Ị dị nnọọ egwu gị obodo Jerusalem! Gị obodo na-egbu ndị amụma na nke na-eji nkume atụgbu ndị nile Chineke zitere inyere gị aka. Lee ka m si gbalịa ịchịkọta ụmụ gị ọnụ, dị ka nne ọkụkọ si achịkọta ụmụ ya nꞌokpuru nku ya, ichebe ha, ma ị chọghị.


LUK 15:25
“Ọ dịghị anya ọkpara nwoke a, onye jere ịrụ ọrụ nꞌubi bidoro ịlọta nꞌụlọ. Mgbe ọ na-abịa nso ọ nụrụ ụda egwu, nụkwa ụda aṅụrị na ite egwu.


LUK 15:26
Ọ kpọrọ otu nꞌime ndị na-eje ozi jụọ ya sị, ‘Gịnị mere egwu ji na-ada, ndị mmadụ na-etekwa egwu?’


LUK 18:2
Ọ sịrị ha, “O nwere otu ọkaikpe bi nꞌotu obodo, nke na-adịghị atụ egwu Chineke. Ọ naghị emetụ ya nꞌobi ihe ndị mmadụ na-ekwu banyere ya.


LUK 18:4
Ma oge nile nwanyị a na-abịakwute ọkaikpe a, ọkaikpe a ekweghị inyere ya aka. Nꞌikpeazụ, nꞌihi na nwanyị a nyegidere ọkaikpe ahụ nsogbu, ọkaikpe a kwuru sị, ‘Ọ bụ ezie na m adịghị atụ egwu Chineke, ọ nakwaghị emetụ m nꞌobi ihe ndị mmadụ na-ekwu megide m. Ma nwanyị a enyekarịala m nsogbu. Aga m enyere ya aka. Nꞌihi na ọ bụrụ na m ajụ inyere ya aka, ọ ga-aga nꞌihu na-abịakwute m, ọ gaghị enye m ohere izu ike.’ ”


LUK 19:21
nꞌihi na atụrụ m egwu. Ị bụ onye afọ tara mmiri bụrụkwa onye na-ewe ihe na-abụghị nke gị, na onye na-ewe ihe ubi nꞌubi nke ị na-akụghị mkpụrụ.’


LUK 20:19
Nꞌoge ahụ, ndị ozizi iwu na ndị isi nchụaja ghọtara na ọ bụ ha ka Jisọs bu nꞌobi mgbe ọ kọrọ akụkọ ahụ. Ha gbalịrị ijide ya, ma ha ejidekwaghị ya nꞌihi na ha tụrụ egwu ihe ndị mmadụ ga-eme ha.


LUK 21:11
A ga-enwe ala ọma jijiji dị ukwuu. Ụnwụ na ọrịa ọjọọ dị iche iche ga-adịkwa nꞌebe dị iche iche. A ga-ahụ ihe ga-eweta egwu na mbara eluigwe na ihe ngosi dị egwu.


LUK 21:27
Nꞌoge ahụ ndị mmadụ ga-ahụ Nwa nke mmadụ ka m ji ike na ebube dị egwu na-abịa nꞌigwe ojii nke mbara eluigwe.


LUK 22:2
Ndị isi nchụaja na ndị ozizi iwu nọkwa na-achọ ụzọ ha ga-esi gbuo Jisọs, ma ha tụrụ egwu ndị mmadụ.


LUK 23:40
Ma onye nke ọzọ ahụ na-emebikwa iwu baara ya mba sị ya, “Ị̀ dịghị atụ egwu Chineke? Ọ̀ bụghị otu ụdị ahụhụ ahụ ka anyị nile nọ nꞌime ya?


LUK 24:19
Jisọs jụrụ ha sị, “Gịnị bụ ihe ndị a unu sị na o mere?” Ha zara ya sị, “Ihe dakwasịrị Jisọs onye Nazaret! Ọ bụ onye amụma rụrụ ọrụ ebube dị iche iche, onye kwukwara okwu na-atụghị egwu. Onye, ọ bụladị Chineke na mmadụ na-asọpụrụ.


JỌN 6:19
Mgbe ha nyaara ụgbọ mmiri ahụ na-aga, nꞌihe dị ka kilomita anọ ma ọ bụ ise site nꞌọnụ mmiri, ha lepụrụ anya hụ Jisọs ka ọ na-aga ije nꞌelu mmiri na-abịakwute ụgbọ ahụ ha nọ nꞌime ya. Oke egwu tụrụ ha!


JỌN 6:20
Ma Jisọs kpọrọ ha sị, “Unu atụla egwu. Ọ bụ m!”


JỌN 7:13
Ma o nweghị onye ọ bụla kwupụtara okwu banyere ya. Nꞌihi na ha tụrụ egwu ndị isi ndị Juu.


JỌN 9:22
Ihe a ka ndị mụrụ ya kwuru nꞌihi na ha na-atụ egwu ndị Juu. Ndị Juu ekpebiela na ọ bụrụ na onye ọ bụla ekwuo na Jisọs bụ Onye nzọpụta ahụ, ha ga-achụpụ onye ahụ site nꞌụlọ ekpere ha.


JỌN 11:8
Ma ndị na-eso ụzọ ya egwu juru obi gwara ya sị, “Nꞌoge gara aga ka ndị Juu nwara ọnwụnwa ịtụ gị nkume. Ị na-agakwa ebe ahụ ọzọ?”


JỌN 11:10
Ọ bụ nanị nꞌabalị ka egwu ịzọhie ụkwụ dị. Nꞌihi na ọchịchịrị dị.”


JỌN 12:15
“Atụla egwu ada Zayọn! Lee eze gị ka ọ na-abịakwute gị. Ọ na-anọkwasị nꞌelu nwa inyinya ibu!”


JỌN 12:42
Ma ụfọdụ nꞌime ndị isi nchụaja kweere na ya. Ma ha ekwupụtaghị nke a. Nꞌihi na ha tụrụ egwu ndị Farisii. Ha achọkwaghị ka achụpụ ha site nꞌụlọ ekpere ndị Juu.


JỌN 19:8
Mgbe Pailet nụrụ nke a ọ tụrụ egwu nke ukwuu.


JỌN 20:19
Nꞌanyasị ụbọchị ahụ ndị na-eso ụzọ Jisọs zukọtara nọdụ nꞌime otu ụlọ. Ha mechiri ụzọ nile e si abata nꞌụlọ ahụ nꞌihi na ha na-atụ egwu ihe ndị isi ndị Juu ga-eme ha. Ma na mberede, mgbe ha na-atụghị anya ya, Jisọs batara guzo nꞌetiti ha sị ha, “Udo dịrị unu!”


ỌLU OZI 2:43
Ha nile jupụtara nꞌegwu nꞌihi na Chineke mere ka ha mata na ọ nọ nꞌetiti ha. Nꞌihi na ndị ozi Kraịst rụrụ ọrụ ebube dị iche iche.


ỌLU OZI 5:5
Mgbe Ananayas nụrụ okwu ndị a, ọ dara nꞌala nwụọ. Ndị nile nụrụ ihe mere tụrụ egwu.


ỌLU OZI 5:11
Oke egwu tụrụ nzukọ Kraịst nile. Oke egwu tụkwara ndị nile nụrụ akụkọ ndị a.


ỌLU OZI 5:13
Ndị ọzọ tụrụ egwu ịdịnyere ha. Ma ọtụtụ mmadụ kwuru okwu dị mma banyere ha.


ỌLU OZI 5:26
Otu mgbe ahụ, onyeisi agha na ndị agha ya gara nꞌụlọ nsọ ahụ. Ha jidere ndị ozi ahụ kpụta ha nꞌihu nzukọ ndị na-achị achị ahụ. Ma ha ejighị ike mee nke a. Nꞌihi na ha tụrụ egwu na ndị mmadụ ga-atụ ha nkume, ma ọ bụrụ na ha emesie ndị ozi ahụ ike.


ỌLU OZI 8:2
Ma ndị Juu ụfọdụ, ndị na-atụ egwu Chineke, bịara buru ozu Stivin, gaa lie ya. Ha kwara akwa nke ukwuu nꞌihi ya.


ỌLU OZI 9:26
Site nꞌebe ahụ, Sọl gbapụrụ gaa Jerusalem. Mgbe o ruru Jerusalem, ọ gbalịri ịdịnyere ndị kwere ekwe nọ nꞌebe ahụ. Ma ha tụrụ egwu. Ha ekwenyeghị na ọ bụrụla onye kwere ekwe dị ka ha onwe ha.


ỌLU OZI 9:27
Ma Banabas duuru ya gaa nꞌebe ndị ozi nọ. Ọ kọọrọ ha akụkọ otu Sọl siri zute Onyenwe anyị nꞌụzọ Damaskọs. Ọ kọkwara ha akụkọ otu Sọl siri kwusaa ozi ọma Kraịst na Damaskọs na-atụghị egwu.


ỌLU OZI 9:29
O kwusara okwu nꞌaha Onyenwe anyị na-atụghị egwu. Ya na ndị Juu na-asụ asụsụ Griik rụrịtara ụka. Nꞌihi ya ndị a gbara izu igbu ya.


ỌLU OZI 10:7
Mgbe mmụọ ozi ahụ lara, Kọniliọs kpọrọ mmadụ abụọ nꞌime ndị na-ejere ya ozi nꞌụlọ ya. Ọ kpọkwara otu nꞌime ndị agha na-eche ya nche. Onye agha a bụkwa onye na-atụ egwu Chineke.


ỌLU OZI 10:20
Jekwuru ha ngwangwa, sorokwa ha gaa ebe ọ bụla ha na-aga. Atụkwala egwu. Ọ bụ m zitere ha.”


ỌLU OZI 10:22
Ha zara sị ya, “Ọ bụ Kọniliọs onyeisi agha anyị zitere anyị. Nwoke a bụ ezi mmadụ, bụrụkwa onye na-atụ egwu Chineke. Ọ bụkwa onye ndị Juu nile na-asọpụrụ. Otu ụbọchị, mmụọ ozi bịakwutere ya, gwa ya ka o zie ozi kpọọ Pita ka ọ bịakwute ya. Na Pita bụ onye ga-eme ka Kọniliọs mata ihe nile Chineke chọrọ ka o mee.”


ỌLU OZI 12:23
Nꞌotu oge ahụ, mmụọ ozi Onyenwe anyị tiri Herọd ihe otiti dị egwu. Ikpuru jupụtakwara ya nꞌahụ, nke mere ka ọ nwụọ. Ma ihe ndị a nile dakwasịrị ya nꞌihi na Herọd naara ofufe ahụ e kwesịrị inye nanị Chineke, dị ka a ga-asị na ọ bụ Chineke nꞌonwe ya. O nyekwaghị Chineke otuto ma ọlị.


ỌLU OZI 13:16
Ya mere, Pọl guzoro ọtọ nꞌetiti ha feere ha aka ya abụọ. Mgbe o kelesịri ha, ọ gwara ha okwu sị, “Unu ndị Izirel, na unu ụmụnna m ndị mba ọzọ na-atụ egwu Chineke. Geenụ m ntị!


ỌLU OZI 13:43
Ma ọtụtụ ndị Juu na ndị mba ọzọ na-atụ egwu Chineke sitere nꞌụlọ nzukọ ahụ soro Pọl na Banabas. Ma mgbe ha na-aga nꞌụzọ, Pọl na Banabas riọsịrị ha arịrịọ ike sị ha nọgide nꞌamara Chineke.


ỌLU OZI 13:50
Mgbe ahụ ndị isi Juu ahụ kpalịrị obi ọtụtụ ụmụ nwanyị na-atụ egwu Chineke tinyere ndị isi obodo ahụ. Ha sitere nꞌọgbakọ ọjọọ ndị a megide Pọl na Banabas, chụpụ ha site nꞌobodo ahụ.


ỌLU OZI 16:29
Onyeisi nche ahụ tụrụ egwu nke ukwuu maakwa jijiji. Ọ kpọrọ ka e tinye ọkụ. Mgbe e tinyesịrị ọkụ, ọ gbaara ọsọ daa nꞌụkwụ Pọl na Saịlas.


ỌLU OZI 16:38
Ndị uwe ojii ahụ e ziri ozi gara gwa ndị ikpe ahụ ihe Pọl kwuru. Mgbe ha nụrụ na Pọl na Saịlas bụ diala na Rom, ha tụrụ egwu nke ukwuu.


ỌLU OZI 17:4
Ụfọdụ ndị Juu gere ntị nꞌokwu ahụ, ghọtara ihe ọ na-ekwu. Ha chegharịrị nabata Onyenwe anyị, ha na ndị Griik na-atụ egwu Chineke na ụmụ nwanyị ụfọdụ a maara aha ha.


ỌLU OZI 17:17
Nꞌihi ya, ọ banyere nꞌụlọ nzukọ ndị Juu soro ha kwuritaa okwu. Ụfọdụ ndị nọ nꞌime nzukọ a bụ ndị mba ọzọ na-atụ egwu Chineke. Ụbọchị nile Pọl na-ekwusara ndị nile na-abịakwute ya nꞌọgbọ ọha, ozi ọma.


ỌLU OZI 18:9
Onyenwe anyị gwara Pọl okwu nꞌọhụ nꞌotu abalị sị ya, “Atụla egwu Pọl! Kwusie okwu ike, emechila ọnụ gị ma ọlị.


ỌLU OZI 19:17
Akụkọ banyere ihe ndị a jezuru obodo Efesọs nile. Mgbe ahụ ndị Juu na ndị Griik ụfọdụ nụkwara ihe ndị a. Oke egwu jidere ndị obodo ahụ. Nꞌihi nke a, e mekwara ka aha Onyenwe anyị Jisọs daa ụda nꞌebe nile.


ỌLU OZI 22:29
Ndị agha ahụ chọrọ ịpịa ya ihe mere ngwangwa gbapụ mgbe ha nụrụ na Pọl bụ nwa diala Rom. Egwu tụkwara ọchịagha nꞌonwe ya nꞌihi na ọ bụ ya nyere iwu ka e kee ya eriri.


ỌLU OZI 23:10
Esemokwu ha bara ụba nke ukwuu. Nꞌihi ya ha bidoro ịdọkpụgharị Pọl nꞌakụkụ nile. Nꞌikpeazụ, ọchịagha tụru egwu na ha ga-emerụ Pọl ahụ ma ọ bụ gbuo ya. Ya mere o nyere iwu ka ndị agha ya jiri ike wepụta Pọl, ka ha kpọlaa ya nꞌụlọ ebe a na-edebe ngwa agha.


ỌLU OZI 23:11
Nꞌabalị ahụ, Onyenwe anyị bịakwutere Pọl gwa ya sị, “Atụla egwu Pọl, nꞌihi na dị ka i si gwa ha okwu nꞌebe a otu a ka ị ga-emekwa na Rom.”


ỌLU OZI 24:25
Ma mgbe Pọl gara nꞌihu na-ekwu ihe banyere ezi omume na mkpa ọ dịrị mmadụ ijide onwe ya aka nꞌihe ọ bụla ọ na-eme, ya na ihe banyere ụbọchị ikpe nke na-abịa nꞌoge ikpeazụ, egwu jidere Feliks. Ọ gwara Pọl okwu sị ya, “Ị nwere ike ịpụ ugbu a, Aga m akpọkwa gị nꞌoge ọzọ mgbe m nwetara ohere.”


ỌLU OZI 27:17
Emesịa anyị jiri ụdọ kee ụgbọ mmiri ahụ ime ka o sie ike karịa. Ndị na-anya ụgbọ ahụ tụrụ egwu na ikuku ga-eburu ụgbọ anyị gaa nꞌọnụ mmiri na-achị ọkụ nke dị nꞌAfrika. Ha wedatara akwa e kobere nꞌelu, nke na-enyere ikuku aka ibu ụgbọ mmiri. Emesịa, ha sooro ikuku mmiri ahụ na-aga.


ỌLU OZI 27:24
gwa m sị, ‘Atụla egwu Pọl, nꞌihi na ị ghaghị iguzo nꞌihu Siza. Nke ọzọ kwa Chineke anụla arịrịọ gị, ọ ga-anapụta ndụ ndị a nile gị na ha so site nꞌaka ọnwụ mberede.’


ỌLU OZI 27:29
Ha matara nꞌoge a na ebili mmiri ahụ ga-eburu anyị gaa nꞌọnụ mmiri. Ma egwu juru ha obi nꞌihi na ha amaghị ma ha ga-ezute nkume nꞌakụkụ ọnụ mmiri ahụ. Ha tụpụtara ụdọ igwe anọ e ji ejide ụgbọ ma na-arịọ chi ha maka chi ọbụbọ.


ỌLU OZI 28:31
na-akọrọ ha, na-atụghị egwu, ihe banyere alaeze Chineke na banyere Onyenwe anyị Jisọs Kraịst. Ọ dịkwaghị onye ọ bụla gbalịrị igbochi ya.


ROM 2:5
Ma ọ naghị emetụ gị nꞌobi ikwere na Chineke, nꞌihi mkpọchị nke obi gị kpọchịrị! Ma ihe ị na-eme bụ nanị ijikere onwe gị nye ụbọchị ahụ Chineke ga-esite nꞌiwe ya kpee gị ikpe dị egwu. Mgbe Chineke ga-ekpughe na ọ bụ onye na-ekpe ikpe ziri ezi.


ROM 3:18
“Ha amụtabeghị ihe ịtụ Chineke egwu bụ.”


ROM 5:5
Mgbe ahụ, nꞌọnọdụ ọ bụla, anyị pụrụ ịbụ ndị guzo chịm, na-atụghị egwu, nꞌihi na anyị maara na Chineke hụrụ anyị nꞌanya, na o gosikwara ịhụnanya ya mgbe o nyere Ọkpara ya, onye sitere na Mmụọ Nsọ mejupụta obi anyị nꞌịhụnanya Chineke.


ROM 8:35
Ọ̀ dị onye nwere ike ikewapụ anyị site nꞌịhụnanya Kraịst nwere nꞌebe anyị nọ? Ọ bụrụ na anyị anọọ nꞌọnọdụ nsogbu, ma ọ bụ na mkpagbu, ma ọ bụ nꞌahụhụ, ihe ndị a ha na-egosi na Kraịst ahụkwaghị anyị nꞌanya? Mba! A sịkwa na anyị anọọ nꞌọnọdụ agụụ, ma ọ bụ nꞌụkpa, ma ọ bụ nꞌọnọdụ ihe egwu, ma ọ bụkwanụ nꞌọnwụ, ọ na-egosi na Chineke agbaketala anyị azụ? Mba!


ROM 9:28
Nꞌihi na Onyenwe anyị na-aga ikpe ụwa a ikpe. Ikpe ahụ ga-adịkwa egwu. Ọ gaekpe ya ọsịịsọ.”


ROM 11:20
Nke ahụ bụ eziokwu. Ma cheta na a nyakapụrụ ha nꞌihi na ha enweghị okwukwe. Ma ị nọ nꞌebe ahụ nꞌihi na i kweere. Ya mere anyala isi banyere ọnọdụ gị, kama tụọ egwu.


1 KỌRINT 10:7
Ka anyị hapụkwa ịbụ ndị na-ekpere arụsị dị ka ụfọdụ ha mere. Akwụkwọ nsọ kwuru sị, “Ụmụ Izirel nọdụrụ ala na-eri na-aṅụ, ha bilikwara ọtọ ite egwu nꞌihu ehi ahụ e ji ọlaedo kpụọ.”


1 KỌRINT 11:29
Nꞌihi na ọ bụrụ na onye ahụ ataa beredi ahụ ma ọ bụ ṅụọ site nꞌiko ahụ nꞌụzọ na-ekwesịghị ekwesị, na-echeghị echiche banyere anụ ahụ Kraịst na ihe ọ pụtara, ọ na-eri, na-aṅụtara onwe ya ikpe ọmụma Chineke, nꞌihi na ọ bụ ọnwụ Kraịst ka o ji egwuri egwu.


2 KỌRINT 3:12
Ya mere, ebe anyị nwere olileanya na ebube ụzọ ọhụrụ a agaghị agwụ agwụ, anyị nwere ike ugbu a ikwusa ozi ọma na-atụghị egwu.


2 KỌRINT 5:11
Ọ bụ nꞌihi na anyị maara nnọọ ihe ịtụ egwu Onyenwe anyị pụtara, ka anyị ji na-arụsị ọrụ ike ikwusara ndị ọzọ ozi ọma Kraịst. Chineke makwaara obi anyị na ha dị ọcha. Enwekwara m olileanya na unu maara m nke ọma nꞌime obi unu.


2 KỌRINT 7:1
Nkwa ndị a nile ka Chineke kwere anyị, ndị enyi m. Ya mere, ka anyị debe onwe anyị ọcha nꞌime ihe nile, ka ihe ọ bụla ghara imerụ ahụ anyị na mmụọ anyị. Kama ka anyị bie ndụ ịdị nsọ na ịtụ egwu Chineke.


2 KỌRINT 7:5
Nꞌihi na mgbe anyị bịaruru ala Masidonia, anyị enweghị izuike ma ọlị. Kama mkpagbu si nꞌaka nri na aka ekpe bịakwute anyị. Egwu jupụtakwara anyị obi.


2 KỌRINT 7:15
Ugbu a, ịhụnanya o nwere nꞌebe unu nọ na-aba ụba nke ukwuu, nꞌihi ncheta ọ na-echeta otu unu nile si jiri ọṅụ gee ya ntị na otu unu si jiri ịtụ egwu na ahụ ịma jijiji nabata ya.


2 KỌRINT 11:3
Ma ana m atụ egwu, nꞌihi na ọ na-adị m ka unu gaekwe ka ụfọdụ mmadụ duhie unu, mee ka unu ghara iwere obi unu nile hụ Onyenwe anyị nꞌanya, dị ka agwọ ahụ si jiri aghụghọ ghọgbuo Iiv.


2 KỌRINT 12:20
Nꞌihi na ihe na-atụ m egwu bụ na mgbe m bịara nꞌetiti unu, ihe m gaahụ agaghị atọ m ụtọ. Mgbe ahụ mmeso m ga-emo unu agakwaghị atọ unu ụtọ. Nꞌihi na ana m atụ egwu na mgbe m bịakwutere unu ọzọ aga m ahụ ọtụtụ nꞌime unu ka unu na-ese okwu, aga m ahụ ka unu na-ekwosa ibe unu ekworo, aga m ahụ unu ka unu na-akpasu ibe unu iwe. Aga m ahụ ọtụtụ ndị na-afụli onwe ha elu, ndị na-ekwu ọtụtụ ihe ọjọọ dị iche iche megide ndị ọzọ; aga m ahụ ọtụtụ ndị jupụtara nꞌaghụghọ na ịkpa iche iche.


2 KỌRINT 12:21
Ana m atụ egwu na mgbe m gaabịakwute unu ọzọ Chineke m ga-eme ka m weda onwe m ala nꞌihu unu, mee ka m kwaa akwa nꞌihi ụfọdụ nꞌime unu ndị mere ajọ ihe, ma ha achọghị ichegharị site nꞌihe ọjọọ ha mere, na nꞌihi ọtụtụ nꞌime unu na-adị ndụ rere ure, ndụ na-adịghị ọcha, ndụ ịkwa iko, na ndụ ọjọọ.


GALETIA 2:12
Nꞌihi na mgbe o buru ụzọ bịa Antiọk, Pita na ụmụnna anyị ndị a na-ebighị ugwu, na-erikọta nri. Ma mgbe ndị Juu, ndị Jemes zitere, bịaruru Antiọk, Pita ekwekwaghị iso ndị mba ọzọ ahụ rikọọ nri, nꞌihi na ọ na-atụ egwu ihe ndị Juu a bu iwu nꞌisi, ndị sị na ọ dị mkpa ibi mmadụ ugwu tupuu a zọpụta ya, ga-ekwu.


GALETIA 4:11
Unu na-emenye m egwu! Ọ̀ pụtara na ọrụ nile m rụrụ nꞌetiti unu abụrụla ihe efu?


EFESỌS 3:12
Ya mere, mgbe anyị bịakwutere Kraịst tukwasị obi anyị nꞌime ya, anyị nwere ike ịbịa nꞌihu Chineke na-atụghị egwu nꞌihi na anyị maara na ọ ga-anabata anyị.


EFESỌS 6:19
Kpeekwaranụ m ekpere, ka Chineke tinye nꞌọnụ m okwu ahụ bara uru ọ chọrọ ka m kwuo. Ka m nweekwa ike ịgwa ndị ọzọ banyere Onyenwe anyị na-atụghị egwu. Ịgwa ha ihe omimi ahụ dị nꞌozi ọma.


EFESỌS 6:20
Ọ bụ nꞌihi ozi ọma a m na-ekwusa, ka m ji nọọ nꞌụlọ mkpọrọ. Ma kpeerenụ m ekpere ka m nwee ike ikwusa ozi ọma na-atụghị egwu, ọ bụladị nꞌụlọ mkpọrọ a, dị ka o si kwesị ekwesị.


FILIPAI 1:20
Nꞌihi na olileanya m na ntụkwasị obi m bụ na Chineke agaghị ekwe ka m mee ihe ọ bụla ga-eme ka ihere mee m nꞌụzọ ọ bụla. Enwekwara m olileanya na m ga-aga nꞌihu nọdụ na njikere ikwupụta okwu na-atụghị egwu nꞌihi Kraịst, ọ bụladị ugbu a m nọ nꞌahụhụ ndị a. Aga m ekwupụta okwu ahụ dị ka m si ekwu ya nꞌoge gara aga. Aga m agakwa nꞌihu ịhụ na ndụ m bụ ihe ga-ewetara Kraịst otuto nꞌọnọdụ ọ bụla, ma ọ bụ na ndụ ma ọ bụ nꞌọnwụ.


FILIPAI 2:12
Nꞌihi ihe ndị a, ndị enyi m, mgbe mụ na unu nọ, unu na-erube isi nꞌihe ọ bụla m gwara unu. Ugbu a kwa m na-anọghị unu nso, gbalịanụ ime ihe ndị ahụ ya na nzọpụta a zọpụtara unu so. Jirinụ ịtụ egwu na-eme ihe Chineke chọrọ, ma na-alanụ azụ nꞌihe ọ bụla pụrụ ime ka obi jọọ ya njọ nꞌebe unu nọ.


1 TESALỌNAIKA 1:10
Ha na-akọkwa otu unu si na-ele anya nlọghachi Okpara Chineke site nꞌeluigwe, Jisọs ahụ Chineke mere ka o si nꞌọnwụ bilie, onye bụ Onye nzọpụta anyị site nꞌiwe Chineke dị egwu megide mmehie.


1 TESALỌNAIKA 5:3
Mgbe ọtụtụ mmadụ ga-asị, “Udo dị, ihe nile na-aga nke ọma,” mgbe ahụ, na mberede, ka oke ịla nꞌiyi dị egwu ga-adakwasị ha, ọ dịkwaghị otu onye ga-agbanarị ihe ọjọọ ahụ. Ihe mgbu ahụ ga-adị ka ihe mgbu na-adakwasị nwanyị ime na-eme.


1 TESALỌNAIKA 5:9
Nꞌihi na Chineke akwadebeghị ikpe ọmụma na egwu nye anyị. Kama ọ bụ nzube ya ka ọ zọpụta anyị site nꞌokwukwe anyị nwere nꞌOnyenwe anyị Jisọs Kraịst.


1 TIMỌTI 4:8
Igwuri egwu nke anụ ahụ dị mma, kama iji oge gị mee ihe ahụ na-ewuli mmụọ elu bara uru karịa nꞌụzọ nile. Ya mere, gbalịa ịzụ mmụọ gị, na-agbalịkwa ime onwe gị ezi onye nke Kraịst nꞌihi na nke a bụ ihe ga-enyere gị aka ugbu a nꞌime ndụ a, ma nꞌime ndụ nke na-abịa nꞌihu.


2 TIMỌTI 4:17
Ma Onyenwe anyị nọnyeere m, nyekwa m ohere iguzosi ike na-atụghị egwu ikwusa ozi ọma ka ụwa nile nụrụ. Ọ zọpụtara m, mee ka a hapụ ịtụnye m nꞌolulu ọdụm.


TAITỌS 2:7
Nꞌebe a ka gị onwe gị ga-abụrụ ha ihe ịma atụ na ihe ilere anya nꞌịrụ ọrụ ọma. Mee ka ihe nile ị na-eme gosi na ị hụrụ eziokwu ahụ nꞌanya, na ị bụkwa onye na-adịghị eji ya egwuri egwu.


TAITỌS 2:12
Ọ bụkwa amara a na-akụziri anyị na Chineke achọghị ka anyị na-ebi ndụ ọjọọ na ndụ ịgbaso ọchịchọ ọjọọ dị nꞌụwa a, kama na ọ chọrọ ka anyị bie ndụ dị mma, ndụ ịtụ egwu Chineke ụbọchị nile.


HIBRU 3:18
Mgbe Chineke ṅụrụ iyi sị, “Ha agaghị aba nꞌebe izuike m ma ọlị.” Ọ bụ olee ndị ka ọ na-ekwu ihe banyere ha? Ọ bụ ndị ahụ nwere nnupụ isi dị egwu, nꞌime ha.


HIBRU 4:16
Ya mere, ka anyị bịaruo oche amara Chineke nso na-atụghị egwu, ka anyị si otu a nata ebere, ma chọtakwa amara nke ga-enyere anyị aka nꞌoge mkpa.


HIBRU 10:23
Ya mere, ka anyị were obi nke egwu na-adịghị jidesie nkwupụta olileanya anyị ike. Ka anyị kwupụta nke a na-enweghị obi abụọ. Nꞌihi na Chineke aghaghị imezu nkwa ya. Ọ bụ onye kwesịrị ntụkwasị obi. Ọ ga-emezu okwu ya nile.


HIBRU 10:29
Ọ bụrụ na o si otu a dịrị nꞌoge Mosisi, gịnị ga-abụ ọnọdụ onye lelịrị Ọkpara Chineke? Gịnị ga-abụ ikpe dịrị ndị na-eme ọbara ọgbụgba ndụ ahụ ka ọ bụrụ ihe ọchị na ihe na-adịghị ọcha? Gịnị ga-abụ ikpe dịrị ndị na-eme Mmụọ nke amara ihe ihere? Ọ bụ ihe doro anya na ndị na-eme ihe dị otu a ga-enwe ịta ahụhụ dị egwu nꞌoge na-abịa abịa.


HIBRU 10:31
Ọ bụ ihe dị egwu na ihe dị njọ mmadụ ahụ mere ihe ndị a ịdaba nꞌaka Chineke dị ndụ.


HIBRU 11:23
Nne na nna Mosisi zipụtara okwukwe mgbe ha mụrụ Mosisi. Ha zoro ya ọnwa atọ nꞌihi na ọ bụ nwa mara mma. Ha atụkwaghị egwu iwu nke eze ala Ijipti bụ Fero nyere.


HIBRU 11:27
Okwukwe ka Mosisi ji hapu Ijipti. Ọ tụghị egwu iwe eze nꞌihi na ọ dị ka ọ na-ahụ Chineke anya, na Chineke nọnyere ya mgbe nile.


HIBRU 12:16
Ka onye ọ bụla hapụ ịdaba na mmehie ịkwa iko. Ka onye ọ bụla hapụ iji Chineke gwurie egwu dị ka Ịsọ mere. Ịsọ bụ onye rere ọnọdụ ọkpara ya nꞌezinụlọ nna ya nꞌihi otu efere nri.


HIBRU 12:18
O nwebeghị oge unu gozoro ọtụ nꞌihu ihe na-eyi egwu, na ọkụ na-enwusi ike, na ọchịchịrị na oke ifufe. Ụmụ Izirel hụrụ ihe ndị a nile nꞌugwu Sainai oge Chineke nyere ha iwu ya.


HIBRU 12:21
Mosisi nꞌonwe ya tụrụ egwu, maakwa jijiji. Nꞌihi na ihe ọ hụrụ karịrị ya ukwuu.


HIBRU 12:28
Chineke kwadoro inye anyị alaeze nke ihe ọ bụla na-apụghị ịgbanwe. Ka anyị na-ele anya mgbe nke a ga-emezu. Ka anyị jiri obi ekele na-ejere Chineke ozi. Ka anyị fee ya ofufe nꞌụzọ ọ ga-anabata. Ka anyị jiri egwu na nsọpụrụ fee ya ofufe.


HIBRU 13:6
Ya mere anyị pụrụ iji nganga na-atụghị egwu kwuo sị, “Chineke bụ onye inye aka m. Agaghị m atụ egwu. Gịnị ka mmadụ pụrụ ime m?”


JEMES 2:19
Amaara m na i kweere na ọ bụ nanị otu Chineke dị. Nke a bụ ezi ihe. Chetakwa na ọ bụladị ndị mmụọ ọjọọ kweere na ọ bụ nanị otu Chineke dịkwa. Ọ bụ nke a na-eme ha ji atụ egwu, na-amakwa jijiji.


JUD 1:4
Nꞌihi na ụfọdụ ndị afọ tara mmiri, ndị na-amaghị Chineke, abatala nꞌetiti anyị. Ndị na-ezi na onye Kraịst ọ bụla pụrụ ibi ụdị ndụ ọ bụla ọ chọrọ na-atụghị egwu ịta ahụhụ nke Chineke na-enye. Ha ajụla Jisọs Kraịst, Nna anyị ukwu na Onyenwe anyị. Ndị a bụkwa ndị ahụ akwụkwọ nsọ gbararị ama banyere ọmụma ikpe dị na-eche ha.


NKPUGHE 1:17
Mgbe m hụrụ ya, adara m nꞌala nꞌụkwụ ya dị ka onye nwụrụ anwụ. Ma o weere aka nri ya metụ m nꞌahụ gwa m okwu sị, “Atụla egwu. Abụ m Mmalite na Ọgwụgwụ ihe nile.


NKPUGHE 1:18
Abụ m onye ahụ nwụrụ anwụ, ma na-adị ndụ. Ugbu a ana m adị ndụ ruo mgbe nile ebighị ebi. Ọ bụ m ji igodo ọkụ ala mmụọ na ọnwụ. Atụla egwu!


NKPUGHE 2:10
Atụkwala egwu nꞌihi ihe ahụ gaje ịbịakwasị gị. Nꞌihi na ekwensu nꞌonwe ya gaje ime ka a tụba ụfọdụ nꞌime ndị gị nꞌụlọ mkpọrọ ka o jiri ya nwaa gị. A ga-akpagbu gị abalị iri. Ma guzosie ike, ọ bụladị mgbe ọnwụ ga-abịakwasị gị. Emesịa, aga m enye gị okpu nke ndụ ahụ.


NKPUGHE 4:3
Ìhè dị ukwuu, nke na-egbu nweghenweghe dị ka mkpụrụ mmiri si nꞌahụ onye ahụ nọkwasịrị nꞌocheeze ahụ na-achapụta. Eke na egwurugwu, nke na-egbukwa amụma, gbara ocheeze ahụ gburugburu.


NKPUGHE 8:5
Mgbe ahụ kwa mmụọ ozi ahụ weere ọkụ sitere nꞌebe ịchụ aja ahụ tinye ya nꞌime ite igwe ntakịrị ahụ o ji chụọ aja, tụda ya, ka ọ danye nꞌime ụwa. Mgbe o mere nke a, ụzụ egbe eluigwe dara, amụma gbukwara nꞌụzọ dị oke egwu. Ala ọma jijiji dakwasịkwara ebe nile nꞌụwa.


NKPUGHE 10:1
Emesịa, ahụrụ m mmụọ ozi ọzọ dị oke egwu ka o si nꞌeluigwe rịdata. Igwe ojii gbara ya gburugburu. Eke na egwurugwu dịkwa ya nꞌisi. Ihu ya na-egbukwa maramara dị ka anyanwụ. Ụkwụ ya na-enwukwa dị ka ọkpụrụkpụ ọkụ.


NKPUGHE 11:11
Ma mgbe ụbọchị atọ na ọkara gafesịrị, Chineke ga-eme ka Mmụọ ya na-enye ndụ banyekwa nꞌime mmadụ abụọ ndị a mee ka ha bilitekwa ọzọ. Mgbe ndị bi nꞌụwa ga-ahụ nke a, ha nile ga-amalitekwa ịtụ oke egwu.


NKPUGHE 11:13
Ma nꞌotu oge ahụ, nꞌotu awa ahụ, ala ọma jijiji dịkarịsịrị oke egwu ga-adị, nke ga-eme ka otu akụkụ nꞌime akụkụ iri nke obodo ahụ nile daa. Ndị ga-anwụ nꞌoge ala ọma jijiji a ga-adịkwa puku mmadụ asaa. Ma ndị nile fọdụrụ ga-esite nꞌoke egwu ga-atụ ha nye Chineke nke eluigwe otuto.


NKPUGHE 11:18
Ụwa nile were oke iwe megide gị, ma ugbu a bụ oge gị iweso ha iwe dị ọkụ. Ugbu a bụ oge ikpe ndị nwụrụ anwụ ikpe, na ịkwụghachi ndị na-ejere gị ozi ụgwọ ọrụ ha, bụ ndị nile na-ezisa ozi ọma gị na ndị gị nile, bụ ndị na-atụ egwu gị. Ndị dị nta na ndị dị ukwuu. Oge eruokwala mgbe ịla nꞌiyi ga-abịakwasịkwa ndị nile e siri nꞌaka ha webata mmebi nꞌebe ihe Chineke kere dị.”


NKPUGHE 11:19
Mgbe ahụ kwa e meghere ụlọ nsọ Chineke nke dị nꞌeluigwe. Ahụkwara m igbe ọgbụgba ndụ Chineke nꞌime ya. Nꞌotu oge ahụ kwa, egbe eluigwe malitere ịgba, amụma gbukwara. Oke ifufe nke na-ala ihe nꞌiyi bidokwara ife. Oke ala ọma jijiji dị egwu bidoro nꞌebe dị iche iche, mee ka ụwa nile mee mkpọtụ nke ukwuu.


NKPUGHE 12:7
Mgbe ihe ndị a gasịrị, agha dị oke egwu dapụtara nꞌeluigwe. Ma onyeisi ndị mmụọ ozi a na-akpọ Maikel na ụsụ ndị mmụọ ozi ya malitere ibuso agwọ ochie ahụ na ndị mmụọ ozi ya a chụdara achụda agha.


NKPUGHE 14:7
Mmụọ ozi a were oke olu kwuo okwu sị, “Tụọnụ egwu Chineke, nyekwanụ ya otuto. Nꞌihi na oge ahụ eruola mgbe ọ ga-anọdụ dị ka onye ikpe. Kpọọkwanụ isi ala nye ya, bụ onye kere eluigwe na ala, na oke osimiri na isi iyi mmiri nile.”


NKPUGHE 15:1
Ahụkwara m ihe ịrịba ama ọzọ nke mere nꞌeluigwe. Ọ dị ebube dịkwa oke egwu. Ọ na-ezipụta ihe gaje ịbịa. Ọ bụ ndị mmụọ ozi asaa ka a họpụtara iburu ihe otiti asaa nke ikpeazụ na-abịakwasị ụwa. Mgbe a wụkwasịrị ụwa ihe otiti asaa ndị a, mgbe ahụ ka iwe Chineke ga-ajụrụ.


NKPUGHE 15:4
Onye ga-aghara ịtụ gị egwu, Onyenwe anyị,Onye ga-agharakwa ito aha gị?Nꞌihi na ọ bụ nanị gị dị nsọMba nile ga-abịakwa ịkpọ isi ala nꞌihu gị,nꞌihi na e meela ka ọrụ ezi omume gị pụta ìhè.


NKPUGHE 17:6
Ejikwa m anya m hụ na nwanyị ahụ aṅụjuola ọbara ndị nsọ afọ, ya na ọbara ndị àma Jisọs o gburu. Elere m ya anya nꞌoke egwu.


NKPUGHE 18:15
Ya mere, ndị ahia ahụ ghọrọ ọgaranya site nꞌiresi ndị obodo Babilọn ahia ga-eguzo nꞌebe dị anya na-atụ egwu ihe ga-eme ha onwe ha, ma na-akwa akwa na-etikwa mkpu na-asị,


NKPUGHE 18:22
Ọ dịghị mgbe ọzọ ụzụ egwu ga-adị nꞌebe ahụ. A gaghị anụkwa olu oja, na une, na ụbọ akwara na ndị na-akpọ ha. A gaghị ahụkwa ndị nka ọ bụla nꞌime ya. A gaghị ahụkwa ndị na-akwọ ọka ma ọ bụ igwe e ji akwọ ọka nꞌime ya.


NKPUGHE 19:5
Otu olu sitekwara nꞌocheeze ahụ kwuo okwu sị, “Toonụ Chineke unu ndị ohu ya, ndị ukwu na ndị nta, unu ndị na-atụ egwu ya.”


Igbo Bible 1988
No Data