A A A A A


Chọọ

MATIU 4:1
Emesịa, Mmụọ Nsọ duuru Jisos baa nꞌọzara ka ekwensu nwaa ya ọnwụnwa.


MATIU 4:3
Mgbe ahụ ekwensu bịara nwaa ya ọnwụnwa sị ya, “Ọ bụrụ nꞌezie na ị bụ Ọkpara Chineke meenụ ka nkume ndị a ghọọrọ gị nri.”


MATIU 4:7
Ma Jisọs zara sị ya, “E deela ya nꞌakwụkwọ nsọ sị, ‘Ị gaghị anwa Onyenwe gị na Chineke gị ọnwụnwa nzuzu.’ ”


MATIU 4:16
ndị nọ nꞌọchịchịrị ahụla ìhè dị ukwuu. Ndị nọ nꞌala ọnwụ ka ìhè ahụ nwukwasịrị.”


MATIU 4:24
Akụkọ banyere ihe ịrịba ndị a fesara jezuo akụkụ Siria nile. Mgbe ahụ ọtụtụ ndị mmadụ kpọtaara ya ndị nile ahụ na-esighị ike, ndị na-arịa ụdị ọrịa dị iche iche, ndị nwere ahụ mgbu, na ndị mmụọ ọjọọ na-esogbu, na ndị akwụkwụ, na ndị akụkụ ahụ ha kpọnwụrụ akpọnwụ. Ọ gwọkwara ha nile.


MATIU 6:13
Edubala anyị nꞌime ọnwụnwa, kama zọpụta anyị site nꞌọnwụnwa nke onye iro. Amin.


MATIU 6:30
Ya mere, ọ bụrụ na Chineke sitere nꞌebere ya mee ka okoko osisi ndị a maa mma ile anya, bụ okoko osisi dị ndụ taa, nke pụkwara ịkpọnwụ mgbe chi echi bọrọ, gịnị mere unu jiri chee na ọ gaghị emere unu karịa nke a, unu ndị okwukwe nta?


MATIU 8:5
Mgbe Jisọs chọrọ ịbanye na Kapanọm, otu ọchịagha bịakwutere ya rịọọ ya ka ọ bịa gwọọ ohu ya nwoke, onye akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ, onye nọkwa nꞌoge ahụ nꞌoke ihe mgbu.


MATIU 9:2
Ọ dịghị anya ụfọdụ ndị ikom ji ute butere ya otu nwoke akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ. Mgbe Jisọs hụrụ okwukwe dị nꞌime ndị buteere ya nwoke a, ọ gwara onye ọrịa ahụ okwu sị ya, “Nwee obi ike nꞌihi na agbagharala m gị mmehie gị nile.”


MATIU 9:27
Mgbe Jisọs hapụrụ ụlọ ebe o mere ka nwanta nwanyị ahụ site nꞌọnwụ bilie, ụmụ nwoke abụọ ndị kpuru isi sooro ya. Ha tikuru ya na-asị, “Nwa Devidi, meere anyị ebere!”


MATIU 12:10
Nꞌebe a ka ọ hụrụ otu nwoke aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ. Ndị nọ nꞌebe ahụ jụrụ ya ajụjụ sị ya, “O ziri ezi nꞌiwu ịgwọ mmadụ nꞌụbọchị izuike?”


MATIU 12:13
Ọ kpọrọ nwoke ahụ aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ sị ya, “Setipụ aka gị!” Nwoke ahụ setipụrụ aka ya. Aka ahụ dịkwara ya mma dị ka aka nke ọzọ.


MATIU 13:6
Ma mgbe anwụ mụkwasịrị ha, ha chanwụrụ, kpọnwụọ, nꞌihi na mgbọrọgwụ ha emikpughị emikpu nꞌime ala.


MATIU 14:2
Ọ gwara ndị na-ejere ya ozi okwu sị ha, “Onye a bụkwanụ Jọn omee baptizim. Ọ ga-abụ na o sitela nꞌọnwụ bilie dịkwa ndụ ọzọ. Ọ bụ ya mere o ji na-arụ ọrụ ebube ndị a.”


MATIU 16:1
Otu ụbọchị, ndị Farisii na ndị Sadusii bịakwutere Jisọs ịnwa ya ọnwụnwa. Ha gwara Jisọs sị ya, “Gosi anyị ihe ịrịba ama si nꞌelu, nke ga-ezi anyị na ị bụ onye ị sị na ị bụ.”


MATIU 16:21
Site nꞌoge ahụ Jisọs malitere ịkọwara ndị na-eso ụzọ ya ihe banyere Jerusalem. O mere ka ha mata na ọ ga-ahụ ahụhụ dị iche iche site nꞌaka ndị isi ndị Juu. Ọ gwara ha sị, “Ndị isi ndị Juu ga-egbu m. Ma mgbe ụbọchị atọ gasịrị, aga m esite nꞌọnwụ bilie.”


MATIU 17:9
Ma mgbe ha si nꞌelu ugwu ahụ na-arịdata, Jisọs nyere ha iwu ka ha ghara ịkọrọ onye ọ bụla ihe ha hụrụ tutuu ruo mgbe o siri nꞌọnwụ bilie.


MATIU 17:23
Ha ga-egbukwa m, ma nꞌụbọchị nke atọ aga m esite nꞌọnwụ bilie.” Okwu a wutere ndị na-eso ụzọ ya nke ukwuu.


MATIU 18:7
“Ahụhụ dịrị ụwa nꞌihi mmehie nile dị nꞌime ya. Ọnwụnwa na-eduba mmadụ ime ihe ọjọọ na-adị oge nile. Ma ahụhụ ga-adịrị nwoke ahụ na-ewetara ibe ya ihe ọnwụnwa.


MATIU 20:18
kọọrọ ha ihe nile ga-adakwasị ya mgbe ha ruru Jerusalem. Ọ sịrị ha, “A ga-arara m nye nꞌaka ndị isi nchụaja na ndị ozizi iwu ha ga-amakwa m ikpe ọnwụ.


MATIU 20:19
Ha ga-arara m nye nꞌaka ndị mba ọzọ ndị ga-eji m mee ihe ọchị, ndị ga-apịakwa m ihe, kpọgide m nꞌobe. Ma aga m esite nꞌọnwụ bilie mgbe ụbọchị atọ gafere.”


MATIU 21:19
Ma o lepụrụ anya hụ otu osisi a na-akpọ fiigi ka ọ dị nꞌakụkụ ụzọ. Mgbe o rutere ebe osisi ahụ dị, o jeruru nso nꞌukwu ya ịchọpụta ma ọ mịrị mkpụrụ. Ma ihe ọ hụrụ bụ nanị ahihia ndụ. Mkpụrụ ọ bụla adịghị nꞌelu ya. Ya mere, Jisọs bụrụ osisi ahụ ọnụ sị, “Malite taa gaa nꞌihu, ị gaghị amịkwa mkpụrụ ọzọ!” Otu mgbe ahụ kwa, osisi ahụ kpọnwụrụ.


MATIU 21:20
Mgbe ndị na-eso ụzọ ya hụrụ ka osisi ahụ kpọnwụrụ, ha tụrụ egwu, jụọ Jisọs ajụjụ sị ya, “Gịnị mere osisi fiigi a ji kpọnwụọ ngwangwa otu a?”


MATIU 22:18
Ebe Jisọs maara ihe ọjọọ ha bu nꞌobi, ọ zara sị ha, “Ndị ihu abụọ! Gịnị mere unu ji anwa m ọnwụnwa?


MATIU 22:23
Nꞌụbọchị ahụ kwa, ụfọdụ ndị Sadusii, ndị na-asị na mbilite nꞌọnwụ adịghị, bịakwutere Jisọs ịghụ ya ọnụ. Ha gwara ya sị, “Onye ozizi, Mosisi kwuru sị, ọ bụrụ na nwoke ọ bụla anwụọ na-amụtaghị nwa, nwanne nwoke ahụ ga-alụrụ nwanyị ahụ di ya nwụrụ. Ụmụ ọ bụla nwanyị a mụtara site na di ọhụrụ ya ga-erite ihe nile nwoke ahụ nwụrụ anwụ nwere.


MATIU 22:28
Ugbu a, ajụjụ anyị bụ nke a, nꞌoge ahụ dị nꞌihu, mgbe a ga-eme ka ndị nwụrụ anwụ si nꞌọnwụ bilite dịrị ndụ ọzọ, nwụnye onye ka nwanyị a ga-abụ, ebe ọ bụ na ụmụnne nwoke asaa ndị a buzuru di ya mgbe ọ nọ nꞌụwa?”


MATIU 22:30
Nꞌihi na mgbe e mere ka ndị mmadụ site nꞌọnwụ bilie, ịlụ di na nwụnye agaghị adịkwa. Nꞌihi na mmadụ nile ndị a ga-adị ka ndị mmụọ ozi nꞌeluigwe.


MATIU 22:31
Ugbu a ka m nye unu ọsịsa banyere ajụjụ unu ma mbilite nꞌọnwụ ọ ga-adị. Ọ bụ na unu adịghị agụ ihe e dere nꞌakwụkwọ nsọ? Ùnu echetaghị na Chineke gwara unu okwu nꞌime ya sị,


MATIU 24:9
“Mgbe ahụ ndị mmadụ ga-ejide unu nyefee unu nꞌaka ndị ga-ata unu ahụhụ. Ha ga-egbu ụfọdụ nꞌime unu, meekwa ndị ọzọ ka ha bụrụ ọdịndụ ọnwụkamma. Elu ụwa nile ga-akpọ unu asị nꞌihi na unu bụ ndị nke m.


MATIU 26:38
Mgbe ahụ ọ gwara ha sị, “Ọ na-ewute mkpụrụ obi ruo nꞌọnụ ọnwụ. Nọgidenụ nꞌebe a soro m na-eche nche.”


MATIU 26:41
Nọọnụ na nche, na-ekpekwanụ ekpere, ka ọnwụnwa ghara imeri unu. Nꞌihi na site nꞌime mmụọ m ọ na-agụ m agụụ imezu uche Chineke, ma anụ ahụ m adịghị ike ịnagide ya.”


MATIU 27:1
Nꞌisi ụtụtụ echi ya, ndị isi nchụaja na ndị okenye ndị Juu zukọtara. Ha chepụtara ụzọ kachasị mma ha nwere ike isi kwagide Pailet ka ọ maa Jisọs ikpe ọnwụ.


MATIU 27:3
Mgbe Judas, onye ahụ rara Jisọs nye, nụrụ na a mara Jisọs ikpe ọnwụ, o chigharịrị weghachikwara ndị isi nchụaja na ndị okenye ego ahụ ha kwụrụ ya.


MATIU 27:4
Ọ gwara ha sị, “Emehiela m, nꞌihi na araara m nwoke na-emeghị ihe ọjọ ọ bụla nye nꞌaka ọnwụ.” Ma ha zara ya sị, “Nke ahụ agbasaghị anyị, ọ bụ ihe dịrị gị.”


MATIU 27:52
Ọtụtụ ili meghere. Ọtụtụ ụmụ Chineke, ndị nwụrụ anwụ, ka e mere ka ha si nꞌọnwụ bile.


MATIU 27:53
Mgbe Jisọs sitere nꞌọnwụ bile, ndị ahụ sitere nꞌọnwụ bilie hapụrụ ili ha bata Jerusalem. Ọtụtụ ndị mmadụ hụkwara ha.


MATIU 27:63
Ha gwara Pailet sị, “Nna anyị ukwu, anyị na-echeta na mgbe onye ụgha ahụ dị ndụ, ọ sịrị na ya ga-esi nꞌọnwụ bile mgbe ụbọchị atọ gasịrị.


MATIU 27:64
Ya mere, nye iwu ka ndị agha gị chee ili ya nche, ruo mgbe ụbọchị atọ gasịrị. Nke a ga-egbochi ndị na-eso ụzọ ya ịga zuru ahụ ya. Ka ha ghara ịsịkwa na o sitela nꞌọnwụ bilie. Ọ bụrụ na ha agha ụgha dị otu a, ọ ga-ajọrọ anyị njọ mgbe ahụ karịa na mbụ.”


MATIU 28:6
Ọ nọkwaghị nꞌebe a. O sitela nꞌọnwụ bilie, dị ka ọ gwara unu. Bịanụ lee ebe ha nyibere ahụ ya mgbe ha bubatara ya na mbụ.


MAK 1:13
Ebe ahụ ka ọ ga-anọ iri ụbọchị anọ ka ekwensu nwaa ya ọnwụnwa. Nanị ya nọ nꞌebe ahụ, mmadụ ọ bụla anọkwaghị ya, kariakwa ụmụ anụ ọhịa. Ma ndị mmụọ ozi bịakwara nyere ya aka.


MAK 2:3
Ọ dịghị anya mmadụ anọ bịarutere nꞌebe igwe mmadụ ndị a gbakọrọ. Ha bu enyi ha nꞌute, bụ onye akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ.


MAK 2:9
Olee nke dị mfe ikwu? Ọ̀ bụ ịgwa nwoke a akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ na a gbagharala ya mmehie ya, ka ọ bụ ịgwa ya ka o bilie chịrị ute ya laa?


MAK 3:1
Ọzọ kwa, Jisọs banyere nꞌụlọ ekpere ndị Juu. Nꞌime ya ọ hụrụ otu nwoke aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ.


MAK 3:3
Ma Jisọs gwara nwoke ahụ aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ okwu sị, “Bilie, bịa guzo nꞌetiti ụlọ ekpere a.”


MAK 3:5
Jisọs lere ha anya nꞌiwe. Enweghị ọmiko ha were ya iwe nke ukwuu. Mgbe ahụ ọ gwara nwoke ahụ aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ okwu sị, “Setipụ aka gị!” Nꞌotu mgbe ahụ nwoke ahụ setipụrụ aka ya. Mgbe ọ na-eme nke a aka ya dizikwara nke ọma.


MAK 5:23
Ọ rịọsịrị Jisọs arịrịọ ike sị ya, “Biko, ada m nwanyị nọ ugbu a nꞌọnụ ọnwụ bịa ngwangwa ka i metụ ya aka ka ọ dịkwa ndụ.”


MAK 6:14
Ọ dịghị anya eze Herọd nụrụ akụkọ banyere Jisọs, nꞌihi na nꞌoge a ndị mmadụ nọ ebe nile na-ekwu okwu banyere ọrụ ebube ọ na-arụ. Ụfọdụ mmadụ sịrị, “Jisọs bụ Jọn omee baptizim. O sitela nꞌọnwụ dịrị ndụ ọzọ. Ọ bụ nke a mere o ji arụ ọrụ ịtụnanya ndị a nile ọ na-arụ.”


MAK 6:16
Ma mgbe Herọd nụrụ ihe banyere Jisọs, ọ sịrị, “Nwoke a ga-abụkwanụ Jọn omee baptizim, onye m bipụrụ isi. O sitela nꞌọnwụ bilie!”


MAK 8:31
Emesịa, Jisọs bidoro ịgwa ndị na-eso ụzọ ya ihe banyere otu ọ ga-esi hụọ ahụhụ, na otu ndị okenye, na ndị isi nchụaja na ndị ozizi iwu ga-esi jụ ya. Ọ gwara ha ihe banyere otu ha ga-esi gbuo ya, na otu ọ ga-esi site nꞌọnwụ bilie nꞌụbọchị nke atọ.


MAK 9:9
Mgbe ha si nꞌelu ugwu ahụ na-arịdata, Jisọs gwara ha sị, “Ka ntị ọ bụla hapụ ịnụ ihe banyere ihe a anya unu hụrụ taa, tutuu ruo mgbe m sitere nꞌọnwụ bilie.”


MAK 9:10
Mmadụ atọ ahụ, Pita, na Jemes na Jọn agwaghị onye ọ bụla ihe ha hụrụ. Ma ha kwurịtara okwu nꞌetiti onwe ha itule ihe Jisọs bu nꞌuche mgbe ọ sị na ọ ga-esi nꞌọnwụ bilie.


MAK 9:31
nꞌihi na o ji oge ahụ na-ezi ndị na-eso ụzọ ya ihe. Ọ gwara ha sị, “A ga-arara Nwa nke mmadụ nye nꞌaka ndị ga-egbu ya, ha ga-egbukwa ya. Ma mgbe ụbọchị atọ gasịrị, ọ ga-esite nꞌọnwụ bilie.”


MAK 10:33
Ọ gwara ha sị, “Ugbu a anyị na-aga Jerusalem. Nꞌebe ahụ ka a ga-arara mụ, bụ Nwa nke mmadụ, nye nꞌaka ndị isi nchụaja na ndị ozizi iwu. Ha ga-ama m ikpe ọnwụ, nyefee m nꞌaka ndị mba ọzọ ka ha gbuo m.


MAK 10:34
Ndị a ga-enyefe m nꞌaka ha, ga-eji m mee ihe ọchị. Ha ga-agbụ m asụ, pịakwa m ihe. Emesịa ha ga-egbukwa m. Ma mgbe ụbọchị atọ gasịrị, aga m esite nꞌọnwụ bilie.”


MAK 11:20
Nꞌisi ụtụtụ echi ya, mgbe ha sitere nꞌakụkụ osisi fiigi ahụ Jisọs bụrụ ọnụ na-agafe, ha hụrụ na osisi a esitela na mgbọrọgwụ ya kpọnwụọ ruo nꞌalaka ya.


MAK 11:21
Pita chetara okwu ahụ Jisọs kwuru ụnyaahụ, gwa Jisọs okwu sị, “Onye ozizi, lee anya! Osisi fiigi ahụ ị bụrụ ọnụ akpọnwụọla!”


MAK 12:18
Emesịa, ndị Sadusii pụtara ịjụ ya ajụjụ. Ndị Sadusii bụ ndị na-ekwenyeghị na mbilite nꞌọnwụ dị. Nke a bụ ajụjụ ha jụrụ Jisọs.


MAK 12:23
“Ugbu a, nꞌụbọchị mbilite nꞌọnwụ ònye nꞌime mmadụ asaa ahụ ka nwanyị a ga-alakwuru ka ọ bụrụ di ya?”


MAK 12:25
Nꞌihi na mgbe ụmụnne asaa ahụ ga-esi nꞌọnwụ bilie, ha agaghị alụkwa di na nwụnye, nꞌihi na ha ga-adị ka ndị mmụọ ozi nọ nꞌeluigwe.


MAK 12:26
“Ma banyere ndị nwụrụ anwụ isite nꞌọnwụ bilile, ọ̀ bụ na unu agụtabeghị nꞌakwụkwọ Ọpụpụ ihe Chineke gwara Mosisi mgbe o gosiri Mosisi onwe ya nꞌọkụ ahụ na-enwụ nꞌosisi? Chineke gwara ya sị, ‘Abụ m Chineke Eberaham, Chineke Aizik, na Chineke Jekọb.’


MAK 14:28
Ma mgbe m si nꞌọnwụ bilie, aga m aga Galili izute unu nꞌebe ahụ.”


MAK 14:31
Pita kwusiri ike sị, “Ọ dịghị! Ọ bụrụkwa na ihe ọnwụ adapụta aga m eso gị nwụọ. Agaghị m agọnarị gị!” Ndị ọzọ bụ ndị na-eso ụzọ Jisọs kwukwara otu okwu ahụ.


MAK 14:34
Ọ gwara mmadụ atọ ahụ sị, “Obi m na-achọ itiwa ruo nꞌọnwụ nꞌihi ihe mgbu dị nꞌime ya. Nọdụnụ nꞌebe a soro m chee nche.”


MAK 14:38
Nọọnụ na nche, na-ekpekwanụ ekpere ka unu hapụ ịdaba nꞌọnwụnwa. Ọ na-agụ mmụọ m agụụ ime ihe Chineke chọrọ, ma anụ ahụ adịghị ike.”


MAK 14:64
Unu anụla okwu arụ si ya nꞌọnụ pụta! Gịnị bụ mkpebi unu?” Ha nile tiri mkpu sị, “O kwesịrị ọnwụ!”


MAK 16:6
Ma nwokorọbịa ahụ gwara ha sị, “Unu atụla ụjọ, amaara m na ọ bụ Jisọs onye Nazaret a kpọgidere nꞌobe ka unu na-achọ. Ọ nọkwaghị nꞌebe a, o sitela nꞌọnwụ bilie! Lee ebe e nyibere ya na mbụ.


MAK 16:9
Nꞌụbọchị mbụ nꞌizu ụka, mgbe Jisọs si nꞌọnwụ bilie, onye mbụ o gosiri onwe ya bụ Meri Magdalin, nwanyị ahụ o sitere nꞌahụ ya chụpụ mmụọ ọjọọ asaa.


MAK 16:10
Meri lara gaa chọpụta ndị na-eso ụzọ Jisọs ka ha nọ nꞌọnọdụ iru uju na ịkwa akwa, gwa ha na Jisọs esitela nꞌọnwụ bilie.


MAK 16:14
Emesịa, Jisọs gosiri ndị na-eso ụzọ ya iri na otu ahụ onwe ha, mgbe ha nile nọkọrọ na-eri nri. Ọ baara ha mba nꞌihi enweghị okwukwe ha, na nꞌihi na ha jụrụ ikwenye nꞌihe Meri na ndị ọzọ hụrụ ya gwara ha banyere mbilite nꞌọnwụ ya.


LUK 1:79
Ụbọchị ọhụrụ nke ga-ewetara ndị nọ nꞌọchịchịrị, na ndị nọ na ndagwurugwu nke ọnwụ ìhè. Ụbọchị ọhụrụ nke ga-edu anyị nꞌụzọ ga-eweta udo.”


LUK 4:2
Ebe ahụ ka ọ nọ iri ụbọchị anọ ka ekwensu nwaa ya ọnwụnwa. Iri ụbọchị anọ ndị a nile o righị nri ọ bụla. Nꞌikpeazụ, agụụ gụrụ ya.


LUK 4:12
Jisọs zara sị ya, “Akwụkwọ nsọ kwuru sị, ‘I kwesịghị ịnwa Onyenwe gị Chineke gị ọnwụnwa nzuzu.’ ”


LUK 4:13
Mgbe ike gwụrụ ekwensu ịnwa Jisọs ọnwụnwa, ọ hapụrụ ya laa tutuu ruo mgbe ọ ga-enweta ohere ọzọ.


LUK 5:18
Nꞌoge ahụ, ụfọdụ mmadụ ndị bu otu nwoke akụkụ ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ nꞌihe ndina ya, bịara gbalịa isite nꞌọnụ ụzọ ụlọ ahụ Jisọs nọ ịbubata enyi ha ahụ nso ebe Jisọs nọ.


LUK 6:6
Nꞌụbọchị Satọde ọzọ, Jisọs banyere nꞌụlọ ekpere ndị Juu bido na-ezi okwu Chineke. Nꞌụlọ ahụ, otu nwoke nọ ya, onye aka nri ya kpọnwụrụ akpọnwụ.


LUK 6:8
Ma ebe Jisọs maara ihe ha na-ezube nꞌobi ha, ọ kpọrọ nwoke ahụ nke aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ sị ya, “Pụta bịa guzoro nꞌetiti ụlọ ekpere a.” Nwoke ahụ pụtara bịa guzoro ebe Jisọs sị ya guzo.


LUK 6:10
Mgbe ahụ Jisọs lere anya gburugburu nꞌiwe sị nwoke ahụ aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ, “Setịpụ aka gị.” Mgbe nwoke ahụ setịpụrụ aka ya, ọ dịkwara ya mma ọzọ.


LUK 7:2
Na Kapanọm, ọ dị otu ọchịagha ndị Rom nwere otu ohu nwoke ọ hụrụ nꞌanya. Ohu a nọ nꞌọrịa, nꞌọnụ ọnwụ.


LUK 7:14
Mgbe ahụ Jisọs gara nso metụ igbe ozu ahụ aka. Ndị bu ya kwụsịrị. Jisọs gwara nwoke ahụ nwụrụ anwụ okwu nꞌoke olu sị, “Nwokorọbịa, asị m gị si nꞌọnwụ bilie!”


LUK 7:22
Emesịa Jisọs gwara ha sị, “Laghachinụ azụ kọọrọ Jọn ihe unu ji anya unu hụrụ na ihe unu ji ntị unu nụrụ. Kọọrọnụ ya na a na-eme ka ndị kpuru isi hụ ụzọ, na ndị ngwụrọ na-agakwa ije, na a na-emekwa ka ndị ekpenta dị ọcha, na ndị ntị chiri na-anụkwa ihe, na a na-eme ka ndị nwụrụ anwụ si nꞌọnwụ bilie, na a na-ekwusakwara ndị ogbenye ozi ọma.


LUK 8:6
Ụfọdụ nꞌime mkpụrụ ndị a dakwasịrị nꞌelu nkume. Mgbe ha toro ha kpọnwụrụ nꞌihi na aja dị nꞌelu nkume ahụ enweghị ike ịmịta mmiri nke mkpụrụ ahụ ji adị ndụ.


LUK 8:13
Mkpụrụ ndị ahụ dara nꞌelu nkume nọchiri anya ndị ahụ nụrụ okwu Chineke jiri ọṅụ nabata ya. Ma okwu ahụ ha nụrụ abanyeghị nꞌime obi ha gbaa mgbọrọgwụ. Ha na-ekwere nanị nwa oge nta, ma mgbe ọnwụnwa bịara nꞌihi ihe ha kweere nꞌime ya, ha adịghị agakwa nꞌihu. Ha na-ada nꞌokwukwe ha.


LUK 8:42
Jairọs mụtara nanị otu nwanta nwanyị, onye gbara afọ iri na abụọ nꞌoge ahụ. Nwanta nwanyị a nọkwa nꞌọnụ ọnwụ. Mgbe Jisọs so Jairọs na-aga nꞌụlọ ya, ọtụtụ ndị so Jisọs na-enu ibe ha aka, na-achọ ịbịaru Jisọs nso.


LUK 8:52
Nꞌime ụlọ ahụ, Jisọs hụrụ ọtụtụ ndị nọ na-akwa akwa na-etikwa aka nꞌobi na mwute, nꞌihi ọnwụ nwanta nwanyị ahụ. Jisọs gwara ha sị, “Unu ebekwala akwa, nꞌihi na nwanta nwanyị a anwụghị anwụ, ọ bụ ụra ka ọ na-arahụ.”


LUK 9:7
Mgbe Herọd onye na-achị Galili nụrụ akụkọ banyere ihe Jisọs na-eme, ihe ọ nụrụ gbagwojuru ya anya, nꞌihi na ụfọdụ mmadụ gwara ya na Jisọs bụ Jọn omee baptizim, na o sitela nꞌọnwụ bilie.


LUK 9:8
Ndị ọzọ gwara ya na Jisọs bụ Ịlaịja onye bịaghachiri azụ. Ma ọ dịkwa ndị ọzọ gwara ya na Jisọs bụ otu nꞌime ndị amụma ochie ahụ sitere nꞌọnwụ bilie.


LUK 9:19
Ndị na-eso ụzọ ya zara ya sị, “Ụfọdụ na-asị na ị bụ Jọn omee baptizim, ndị ọzọ sị na ị bụ Ịlaija, ndị ọzọ sị na ị bụ otu nꞌime ndị amụma ochie ahụ si nꞌọnwụ bilie.”


LUK 9:22
Ọ gwakwara ha sị, “Nwa nke mmadụ ga-ahụ ahụhụ dị ukwuu. Nꞌihi na ndị okenye anyị, na ndị isi nchụaja na ndị ozizi iwu ga-ajụ ya. Ha ga-egbu ya, ma ụbọchị atọ gafee, ọ ga-esite nꞌọnwụ bilie ọzọ.”


LUK 9:31
Ha pụtara nnọọ nꞌebube nke eluigwe soro Jisọs na-ekwu okwu banyere otu ọ ga-esi mezuo uche Chineke, site nꞌọnwụ nke ọ ga-anwụ na Jerusalem.


LUK 10:25
Otu ụbọchị otu onye ozizi iwu bịakwutere Jisọs ịnwa ya ọnwụnwa. Ọ jụrụ ya ajụjụ sị ya: “Onye ozizi, gịnị ka mmadụ ga-eme ma ọ bụrụ na ọ chọọ iketa eluigwe?”


LUK 10:30
Jisọs zara sị, “Ọ dị otu nwoke sitere nꞌobodo Jerusalem na-aga nꞌobodo Jeriko. Mgbe ọ na-aga nꞌụzọ, o zutere ndị ohi na-apụnarị mmadụ ihe nꞌike, ndị napụrụ ya ihe nile o nwere, tie ya ihe, hapụ ya nꞌọnọdụ ọdịndụ ọnwụkamma laa.


LUK 11:4
Gbaghara anyị mmehie anyị, nꞌihi na anyị na-agbaghara onye ọ bụla mejọrọ anyị. Edubakwala anyị nꞌọnwụnwa.”


LUK 11:16
Ndị ọzọ nwakwara ya ọnwụnwa sị ya gosi ha ihe ịrịba ama na mbara eluigwe iji gosi na ọ bụ Onye nzọpụta.


LUK 12:28
Ọ bụ Chineke na-eme ka ahịhịa maa mma ile anya, ee, ahịhịa nke na-eto taa, nke e nwekwara ike igbutu echi, nke a na-akpọkwa ọkụ ma ọ kpọnwụọ. Ọ bụrụ na Chineke na-eme ka ahịhịa efu maa mma, unu na-eche na ọ gaghị egboro unu mkpa uwe, unu ndị obi abụọ?


LUK 14:14
Ebe ọ bụ na ndị a enweghị ike ịkwụghachi gị, Chineke ga-agọzi gị, kwụghachikwa gị, dị ka ọ ga-esi kwụghachi gị mgbe ndị nwụrụ anwụ ga-esi nꞌọnwụ bilie.”


LUK 16:31
“Ma Eberaham zara ya sị, ‘Ọ bụrụ na ha agaghị eme ihe ha ga-agụta nꞌakwụkwọ Mosisi na ndị amụma dere, echeghị m na ha ga-echegharị ma mmadụ site nꞌọnwụ bilie bịa gwa ha okwu.’ ”


LUK 17:1
Otu ụbọchị, Jisọs gwara ndị na-eso ụzọ ya okwu sị, “Ọnwụnwa nke na-eduba mmadụ nꞌime mmehie ga na-adị, ma oke ahụhụ dị na-eche nwoke ahụ onye ọnwụnwa ga-esi nꞌaka ya bịara mmadụ.


LUK 18:33
Ha ga-eti m ihe, gbuokwa m. Ma nꞌụbọchị nke atọ, aga m esite nꞌọnwụ bilie ọzọ.”


LUK 20:27
Mgbe oge nta gasịrị, ụfọdụ ndị si nꞌotu ndị Sadusii bịakwutere Jisọs. Ndị a bụ ndị ahụ na-asị na ndị nwụrụ anwụ agaghị ebilitekwa nꞌọnwụ ọzọ.


LUK 20:33
Mgbe ndị nwụrụ anwụ ga-esi nꞌọnwụ bilie, onye ka nwanyị a ga-alakwuru dị ka di ya ebe ọ bụ na ụmụnne nwoke asaa ahụ lụrụ ya nꞌụwa a?”


LUK 20:35
Ma ndị ahụ Chineke gụrụ dị ka ndị tozuru etozu inwe ndụ ebighị ebi agaghị alụ di na nwụnye mgbe ndị nwụrụ anwụ ga-esi nꞌọnwụ bilie,


LUK 20:36
nꞌihi na ha agaghị anwụkwa ọzọ, kama ha ga-adị ka ndị mmụọ ozi. Ha bụ ụmụ Chineke nꞌihi na Chineke emeela ka ha si nꞌọnwụ dị ndụ ọzọ.


LUK 22:28
Mụ na unu anọọla nꞌoge ọnwụnwa m nile.


LUK 22:31
“Saimọn, Saimọn, ekwensu arịọla ka e nye ya ohere ịnwa unu ọnwụnwa na ịyọcha unu dị ka nwanyị si ayọcha ọka,


LUK 22:40
Nꞌebe ahụ ọ gwara okwu sị, “Kpeenụ ekpere rịọọ Chineke, ka unu hapụ ịdaba nꞌọnwụnwa.”


LUK 22:46
Jisọs kpọtere ha sị, “Gịnị mere unu ji na-arahụ ụra? Bilienụ kpee ekpere ka unu hapụ ịdaba nꞌọnwụnwa.”


LUK 23:15
Herọd nꞌonwe ya kwa achọpụtaghị ihe ọjọọ ọ bụla nwoke a mere. Ọ bụ nꞌihi nke a ka o jiri zighachiri m ya. Ahụghị m ihe ọjọọ ọ bụla o mere nke pụrụ iwetara ya amamikpe ọnwụ.


LUK 23:22
Pailet gwakwara ha okwu nke ugbo atọ sị, “Gịnị mere unu ji chọọ ka nwoke a nwụọ? Gịnị bụ ihe ọjọọ o mere? Achọpụtaghị m ihe ọjọọ o mere nke ga-ewetara ya ọnwụ. Aga m apịa ya ihe hapụ ya ka ọ laa.”


LUK 23:24
Ọ mara Jisọs ikpe ọnwụ dị ka ha chọrọ.


LUK 24:7
Ọ gwara unu na a ga-arara ya nye nꞌaka ndị mmehie ndị ga-akpọgide ya nꞌobe, na ya ga-esikwa nꞌọnwụ bilie ọzọ nꞌụbọchị nke atọ ya.”


LUK 24:20
Ma ndị isi nchụaja anyị na ndị ọchịchị anyị nyefere ya nꞌaka ndị Rom, ka ha maa ya ikpe ọnwụ, kpọgbuokwa ya nꞌobe.


LUK 24:34
ndị gwara ha okwu sị, “Onyenwe anyị esitela nꞌọnwụ bilie nꞌezie, o gosila Saimọn onwe ya!”


JỌN 2:13
Ma mgbe ụbọchị ncheta oriri Ngabiga na-abịaru nso, (mmemme a bụ nke ndị Juu na-eji echeta ụbọchị Chineke napụtara ha nꞌaka ọnwụ nꞌala Ijipti), Jisọs gara Jerusalem.


JỌN 4:47
nụrụ na Jisọs esila Judia laghachi Galili. Nwoke a mere ngwangwa gaa Kena. Nꞌebe ahụ ka ọ hụrụ Jisọs rịọ ya ka ọ bịaruo Kapanọm gwọọ nwa ya nwoke nke nọ nꞌọnụ ọnwụ.


JỌN 5:3
Igwe ndị ọrịa dina nꞌakụkụ ọdọ mmiri a. Ụfọdụ nꞌime ha bụ ndị ngwụrọ. Ụfọdụ bụ ndị isi. Ndị ọzọ bụ ndị akụkụ ahụ ha kpọnwụrụ akpọnwụ. Ha nile nọ na-eche ka mmiri ahụ mee mkpọtụ.


JỌN 5:21
Dị ka Nna pụrụ ime ka mmadụ si nꞌọnwụ bilie, otu a ka Ọkpara Nna pụrụ ịkpọlitekwa onye ọ bụla nwụrụ anwụ ọ chọrọ site nꞌọnwụ.


JỌN 5:24
“Ka m gwa unu eziokwu, mmadụ ọ bụla nụrụ okwu m ma kwerekwa na Chineke onye zitere m, nwere ndụ ebighị ebi. Ọmụma ikpe adịkwaghị nye onye ahụ. Kama o sitela nꞌọnwụ banye na ndụ.


JỌN 6:39
Nke a bụ uche Chineke, ọ dịghị onye ọ bụla o nyere m ga-efu efu. Kama aga m eme ka onye ahụ si nꞌọnwụ bilite nꞌụbọchị ikpeazụ ahụ.


JỌN 6:40
Nꞌihi na nke a bụ uche Chineke. Onye ọ bụla hụrụ Ọkpara ya, kwerekwa na ya, ga-enwe ndụ ebighị ebi. Aga m eme ka o site nꞌọnwụ bilite nꞌụbọchị ikpeazụ ahụ!”


JỌN 6:43
Jisọs sịrị ha, “Unu atamụla nꞌime onwe unu. Nꞌihi na mmadụ ọ bụla enweghị ike ịbịakwute m karịakwa ma Nna m onye zitere m, mere ka ọ bịakwute m. Nꞌụbọchị ikpeazụ ahụ, aga m emekwa ka ndị ọ bụla bịakwutere m si nꞌọnwụ bilie.


JỌN 6:54
Onye ọ bụla riri anụ ahụ m, ṅụọkwa ọbara m nwere ndụ ebighị ebi. Aga m emekwa ka o si nꞌọnwụ bilie nꞌụbọchị ikpeazụ ahụ.


JỌN 8:20
Okwu ndị a nile ka Jisọs kwuru nꞌụlọ nsọ ukwu ha, na mpaghara ụlọ ahụ a na-akpọ Ụlọ Akụ. Ma ọ dịghị onye ọ bụla nwere obi ike ijide ya nꞌihi na oge ọnwụ ya erubeghị.


JỌN 11:3
Ụmụ nwanne nwanyị abụọ ndị a zipụrụ ozi ngwangwa zigara Jisọs sị ya, “Onyenwe anyị, enyi ọma gị nọ nꞌọnụ ọnwụ.”


JỌN 11:4
Mgbe Jisọs nụrụ ya, ọ sịrị, “Ọrịa na-arịa ya abụghị nke ma-eweta ọnwụ, kama ọ bụ ọrịa a ga-esi na ya nye Chineke otuto. A ga-esitekwa nꞌime ya nye mụ onwe m bụ Ọkpara Chineke otuto.”


JỌN 11:8
Ma ndị na-eso ụzọ ya egwu juru obi gwara ya sị, “Nꞌoge gara aga ka ndị Juu nwara ọnwụnwa ịtụ gị nkume. Ị na-agakwa ebe ahụ ọzọ?”


JỌN 11:24
Mata sịrị ya, “Amaara m na a ga-eme ka o bilie ọzọ mgbe a ga-emekwa ka ndị ọzọ bilie nꞌụbọchị mbilite nꞌọnwụ ikpeazụ ahụ.”


JỌN 12:1
Ụbọchị isii tupuu e mee mmemme Ngabiga, Jisọs gara Betani. Betani bụ obodo Lazarọs, nwoke ahụ Jisọs mere ka o site nꞌọnwụ bilie.


JỌN 12:9
Ọtụtụ ndị Juu nụrụ na Jisọs nọ nꞌebe ahụ. Ha bịara ịhụ ya. Ha bịakwara ịhụ Lazarọs, onye Jisọs mere ka o si nꞌọnwụ bilie.


JỌN 12:17
Ndị nọ mgbe Jisọs mere ka Lazarọs si nꞌọnwụ bilie, gwakwara ndị ọzọ banyere ya.


JỌN 12:33
Jisọs kwuru nke a igosi ụdị ọnwụ nke ọ ga-anwụ.


JỌN 15:6
Onye ọ bụla na-adịghị anọgide nꞌime m abaghị uru ọ bụla nye m. A na-atụpụkwa ya nꞌezi ka ọ kpọnwụọ, dị ka alaka osisi e gbuturu egbutu. Ọ bakwaghị uru ọzọ ma ọ bụghị ka e tinye ya nꞌọkụ, ka o ree ọkụ.


JỌN 16:33
Agwala m unu ihe ndị a nile ka unu nwee udo nꞌobi unu. Nꞌime ụwa a, unu ga-enwe nsogbu na ọnwụnwa. Ma ka obi hapụ ịlọ unu mmiri, emeriela m ụwa.”


JỌN 20:8
Jọn nꞌonwe ya banyekwara hụ ihe ndị a nile, kwerekwa na Jisọs esitela nꞌọnwụ bilie nꞌezie.


JỌN 20:9
Tutuu ruo mgbe ahụ, Jọn aghọtaghị na akwụkwọ nsọ kwuru na Jisọs ga-esi nꞌọnwụ bilie ọzọ. Ọ bụ ugbu a ka ha matara.


JỌN 20:25
Mgbe ndị ọzọ gwara ya na ha ahụla Jisọs, o kweghị. Ọ sịrị, “Ọ bụ nanị mgbe m jiri anya m hụ ebe ntu kpọpuru ya aka. Ọ bụ nanị mgbe m tinyere aka m nꞌapa ntu ndị a, ọ bụkwa nanị mgbe m tinyere aka m nꞌakụkụ ya ebe a mara ya ùbe, ka m ga-ekwere na o sitela nꞌọnwụ bilie.”


JỌN 21:14
Nke a bụ ugboro atọ Jisọs gosiri ndị na-eso ụzọ ya onwe ya malite nꞌoge o si nꞌọnwụ bilie.


JỌN 21:19
Jisọs kwuru nke a igosi ụdị ọnwụ Pita gaanwụ nꞌihi inye Chineke otuto. Mgbe ahụ, Jisọs sịrị Pita, “Soro m.”


ỌLU OZI 1:3
O gosiri ha onwe ya mgbe o si nꞌọnwụ bilie. Ihe ruru iri ụbọchị anọ site na mgbe a kpọgburu ya, ha hụrụ ya na ndụ site nꞌoge ruo nꞌoge. Nꞌụzọ doro anya, o gosiri ha na ọ bụ ya onwe ya ka ha na-ahụ. Nꞌoge a ọ gwara ha okwu banyere alaeze Chineke.


ỌLU OZI 1:21
“Nꞌihi ya, anyị ga-ahọpụta onye ọzọ nꞌọnọdụ ya. Ka ọ bụrụ otu nꞌime anyị. Ka o soro anyị gbakọọ ama banyere mbilite nꞌọnwụ Jisọs. Ka anyị site nꞌetiti anyị họpụta onye naara eso anyị na-ejegharị site na mbụ, site nꞌoge Jọn mere baptizim ya tutuu ruo nꞌụbọchị ahụ Jisọs laghachiri nꞌeluigwe.”


ỌLU OZI 2:24
Ma Chineke emeela ka ọ dịkwa ndụ ọzọ! Chineke tọpụrụ ya site nꞌagbụ nke ọnwụ, nꞌihi na ọ bụ ihe rara ahụ na ọnwụ ga-emeri ya.


ỌLU OZI 2:31
Ya mere Chineke jiri mee ka Devidi mata ihe ga-eme nꞌoge dị nꞌihu. Devidi hụrụ, kwuokwa okwu banyere mbilite nꞌọnwụ nke Kraịst. Ọ hụrụ na a hapụghị mkpụrụ obi Kraịst nꞌala mmụọ. Ọ hụkwara na anụ ahụ ya erekwaghị ure.


ỌLU OZI 2:32
Ọ bụ Jisọs a, nke Devidi buru amụma banyere ya, ka Chineke kpọlitere site nꞌọnwụ! Anyị nile bụkwa ndị akaebe mbilite nꞌọnwụ ya.


ỌLU OZI 3:15
Ma unu gburu Jisọs bụ Onyenwe anyị na Onye na-enye ndụ. Ma Chineke akpọlitela ya site nꞌọnwụ. Anyị na-gbakwa ama na o biliri nꞌọnwụ nꞌezie!


ỌLU OZI 3:26
Ọ bụ unu ka Chineke buru ụzọ zitere Okpara ya Jisọs ka ọ gọzie, mgbe o sitere nꞌọnwụ kpọlite ya. Ka o mee ka onye ọ bụla site na mmehie ya tụgharịa.”


ỌLU OZI 4:2
Ha were iwe nꞌihi na Pita na Jọn na-ezi ndị mmadụ ihe. Ha na-ezi ha na ndị nwụrụ anwụ ga-ebilie ọzọ. Ha ji mbilite nꞌọnwụ Jisọs na-ama atụ.


ỌLU OZI 4:10
aga m agwa unu. Ka ụmụ Izirel nile matakwa! A gwọrọ nwoke a guzo nꞌebe a site nꞌike Jisọs Kraịst onye Nazaret. Ọ bụkwa Jisọs ahụ unu kpọgidere nꞌobe, onye Chineke kpọlitere site nꞌọnwụ. Ọ bụ site nꞌike Jisọs Kraịst ka nwoke a ji guzo nꞌihu unu, dị ka onye ahụ zuru oke.


ỌLU OZI 4:33
Ndị ozi Kraịst gara nꞌihu na-agba ama banyere mbilite nꞌọnwụ Onyenwe anyị Jisọs site nꞌike nile. Ngọzị Chineke dịnyeere ha.


ỌLU OZI 5:28
“Ọ bụ na m adọghị unu aka na ntị sị unu kwụsị izi onye ọ bụla ihe ọ bụla banyere aha a? Lee ihe unu mere ugbu a! Ozizi unu ejula Jerusalem! Unu chọkwara ka ndị mmadụ taa anyị ụta nꞌihi ọnwụ nwoke a!”


ỌLU OZI 8:7
Nꞌihi na site nꞌọrụ ebube ndị a, mmụọ ọjọọ pụrụ site na ndụ ndị ụfọdụ. Mmụọ ọjọọ a pụtara na-eti mkpu. Ọtụtụ ndị ahụ ha kpọnwụrụ akpọnwụ ka Filip gwọkwara. Ụfọdụ ndị ngwụrọ ka ọ gwọkwara.


ỌLU OZI 9:33
Nꞌebe ahụ ọ hụrụ otu nwoke aha ya bụ Ainias. Nwoke a anọọla nꞌute ọrịa afọ asatọ. Ọ bụ onye ahụ ya kpọnwụrụ akpọnwụ.


ỌLU OZI 10:40
Ma Chineke mere ka o si nꞌọnwụ bilite mgbe ụbọchị atọ gasịrị. E mekwara ka ọtụtụ mmadụ hụ ya anya.


ỌLU OZI 10:41
Kama ọ bụghị mmadụ nile hụrụ ya. Ọ bụ anyị ndị Chineke họpụtara hụrụ ya. Anyị sokwa ya rikọọ nri, sorokwa ya ṅụkọọkwa ihe ọṅụṅụ mgbe o si nꞌọnwụ bilie.


ỌLU OZI 13:27
Ndị Juu bi na Jerusalem na ndị isi ha amataghị na Jisọs bụ Onye nzọpụta ahụ. Ha aghọtakwaghị okwu nile ndị amụma dere, okwu nke a na-agụpụta na ntị ha kwa izu. Ma ha mere ka okwu ahụ ndị amụma kwuru mezuo, mgbe ha mara Jisọs ikpe ọnwụ.


ỌLU OZI 13:28
Ọ bụ ezie na ha achọtaghị ihe kwesịrị ọnwụ nꞌime ya. Ma ha rịọrọ Pailet ka o nye ike ka e gbuo ya.


ỌLU OZI 13:29
Ma mgbe ha mezusịrị ihe nile ndị amụma kwuru banyere ọnwụ ya, ha budatara ya site nꞌelu obe lie ya.


ỌLU OZI 13:30
Ma Chineke mere ka o si nꞌọnwụ bilie ọzọ!


ỌLU OZI 13:32
“Ugbu a mụ onwe m na Banabas bịara nꞌetiti unu iwetara unu ozi ọma a. Nꞌihi na Chineke emezuola nkwa ahụ o kwere nna nna anyị ha nꞌọgbọ a. Nꞌihi na Chineke mere ka Jisọs si nꞌọnwụ bilie.


ỌLU OZI 13:34
“Chineke kwererị nkwa ime ka Jisọs site nꞌọnwụ bilie. Ọ gaghị anwụkwa ọzọ. Nke a bụ ihe akwụkwọ nsọ na-agwa anyị mgbe e kwuru nꞌime ya sị, ‘Aga m emezuru gị nkwa ahụ nile m kwere Devidi.’


ỌLU OZI 13:37
Kama ihe nile ndị a na-ekwu ihe banyere onye ahụ Chineke mere ka o site nꞌọnwụ bilite. Onye anụ ahụ ya na-erekwaghị ure.


ỌLU OZI 14:19
Ma mgbe ụbọchị ole na ole gasịrị, ndị Juu ụfọdụ bịara site nꞌAntiọk na Aikoniọm. Ha kwaliri obi igwe mmadụ ahụ ka ha gbuo Pọl. Nꞌihi ya, ha tụrụ Pọl nkume, dọkpụrụ ya gaa nꞌazụ obodo ahụ, hapụ ya nꞌọnọdụ ọdịndụọnwụkamma.


ỌLU OZI 17:3
Ọ na-akọwakwa ihe ndị amụma kwuru banyere ahụhụ nile Onye nzọpụta ga-ahụ na mbilite nꞌọnwụ ya. Site nꞌokwu ndị a o mekwara ka ha mata na Jisọs bụ Onye nzọpụta ahụ.


ỌLU OZI 17:18
O sokwaara ndị ọkachamara obodo ahụ, ndị a na-akpọ ndị Epikuri na ndị Stoik kwurita okwu. Kama ha enweghị afọ ojuju mgbe Pọl gwara ha ihe banyere Jisọs na mbilite nꞌọnwụ ya. Mgbe ha nụrụ ya ụfọdụ sịrị, “Nwoke a na-arọ nrọ.” Ndị ọzọ sịkwa, “Ọ na-ewebata ozizi ọhụrụ dị iche.”


ỌLU OZI 17:31
Nꞌihi na o debela otu ụbọchị mgbe ọ ga-ekpe ụwa nile ikpe nꞌụzọ ezi omume. Nke a bụ site nꞌaka Onye ahụ ọ họpụtara. O mekwara ka okwu a guzosie ike, mgbe o mere ka Onye ahụ si nꞌọnwụ bilie.”


ỌLU OZI 17:32
Mgbe ha nụrụ ozizi Pọl banyere mbilite nꞌọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ, ha chịrị ya ọchị. Ma ụfọdụ nꞌime ha sịrị, “Nꞌoge ọzọ anyị ga-achọ ịnụ okwu ndị a.”


ỌLU OZI 19:31
Otu aka ahụ kwa, ụfọdụ ndị enyi ya nꞌetiti ndị na-achị achị nꞌobodo ahụ zigakwara ya ozi na-arịọ ya, ka ọ hapụ iji aka ya kpatara onwe ya ọnwụ site nꞌịbanye.


ỌLU OZI 22:4
Akpagburu m ndị nile na-eso ụzọ ọhụrụ a, na-etinye ha nꞌaka ọnwụ. Ejidere m ndị ikom na ndị inyom ha tụbakwa ha nụlọ mkpọrọ.


ỌLU OZI 23:6
Mgbe Pọl ghọtara na ndị bịara nzukọ ahụ dị ụzọ mmadụ abụọ, ndị Sadusii nꞌotu ụzọ, ndị Farisii nꞌụzọ nke ọzọ, o tiri mkpu sị, “Ụmụnna m, abụ m onye Farisii. Nna m bụkwa onye Farisii. A na-ekpe m ikpe taa nꞌihi okwukwe m nwere na mbilite nꞌọnwụ dị.”


ỌLU OZI 23:8
Nꞌihi na ndị Sadusii ekweghị na mbilite nꞌọnwụ ọ bụla dị. Ha ekwekwaghị na mmụọ ozi dị, ma ọ bụ na mmụọ ọ bụla dị nꞌime anyị. Ma ndị Farisii kweere nꞌihe ndị a.


ỌLU OZI 24:15
Ma enwere m olileanya dị ka ha onwe ha nwekwara na mbilite nꞌọnwụ nke ndị ezi omume na nke ndị ajọ omume ga-adị.


ỌLU OZI 25:11
Ọ bụrụ na ọ dị ihe m mere kwesịrị ọnwụ, akwadoro m ịnwụ. Ma ọ bụrụ na aka m dị ọcha, gị, ma ọ bụ onye ọ bụla ọzọ enweghị ike ịrara m nye nꞌaka ndị Juu ka ha gbuo m. Ana m akpọku Siza ka o lenye anya nꞌikpe m.”


ỌLU OZI 25:24
Mgbe ahụ ka Festọs kwuru okwu sị, “Eze Agripa na ndị nile soro ya nọkọọ. Nke a bụ nwoke ahụ ndị Juu bi nꞌobodo a na ndị Juu bi na Jerusalem na-achọsi ọnwụ ya ike.


ỌLU OZI 26:8
“Gịnị mere unu, ndị Juu, jiri na-eche na ọ rara Chineke ahụ ime ka mmadụ site nꞌọnwụ bilie ọzọ?


ỌLU OZI 26:10
Etinyere m ọtụtụ ndị na-eso ụzọ a bi na Jerusalem nꞌụlọ mkpọrọ, site nꞌike m natara nꞌaka ndị isi nchụaja. Mgbe a mara ndị ha ikpe ọnwụ, ana m akwagide ka e gbuo ha.


ỌLU OZI 26:23
Na Onye nzọpụta ahụ ga-ahụ ahụhụ bụrụkwa onye ga-esi nꞌọnwụ bilie iwetara ndị Juu na ndị mba ọzọ nzọpụta!”


ỌLU OZI 26:31
Mgbe ha gbarịtara izu banyere Pọl nꞌetiti onwe ha, ha kwekọrịtara sị, “Nwoke a ekwesịghị ọnwụ ma ọ bụ mkpọro.”


ỌLU OZI 27:10
“Ndị nwe m, ahụrụ m na anyị ga-enwe nsogbu ma ọ bụrụ na anyị agaa nꞌihu. Eleghị anya ụgbọ mmiri anyị ga-ekpu, ma ọ bụ ibu nile ga-efu, ma ọ bụ na anyị ga-enwe mmerụ ahụ, ma ọ bụ na ọnwụ ga-adị.”


ỌLU OZI 27:24
gwa m sị, ‘Atụla egwu Pọl, nꞌihi na ị ghaghị iguzo nꞌihu Siza. Nke ọzọ kwa Chineke anụla arịrịọ gị, ọ ga-anapụta ndụ ndị a nile gị na ha so site nꞌaka ọnwụ mberede.’


ỌLU OZI 28:18
Ndị ọchịchị Rom lenyere anya nꞌikpe m chọọ ịhapụ m ka m laa. Nꞌihi na ha achọtaghị ihe kwesịrị ịma m ikpe ọnwụ dị ka ndị anyị chọrọ.


ROM 1:4
Chineke gosiri na Jisọs bụ Ọkpara ya, onye ike nile dị nꞌaka ya, na onye nwekwara Mmụọ nke dị nsọ, mgbe o mere ka o si nꞌọnwụ bilie.


ROM 1:32
Ọ bụ eziokwu na ha maara nke ọma na Chineke ga-ekpe ha ikpe nꞌihi ihe ọjọọ ha na-eme, matakwa na Chineke ga-ama ndị nile na-eme ihe dị otu a ikpe ọnwụ, ma ha gara nꞌihu na-eme ihe ndị a, ma na-akwalikwa mmụọ ndị ọzọ ka ha soro na-eme ha.


ROM 3:24
Ma ugbu a, Chineke na-agụ anyị na ndị ezi omume site nꞌamara ya, nke ọ na-enye nꞌefu, site na Kraịst Jisọs, onye sitere nꞌọnwụ nke ọ nwụrụ gbapụta anyị, mee ka anyị nwere onwe anyị.


ROM 4:25
E gburu Jisọs nihi mmehie anyị, ma o si nọnwụ bilie ọzọ ịzọpụta anyị site na mmehie anyị, ime ka anyị na Chineke dị na mma, na imejupụta anyị nịdị mma nke Chineke nonwe ya.


ROM 5:6
Leenụ nụ ka obi ebere Chineke siri dị ukwuu. Mgbe ahụ anyị na-enweghị ike ọ bụla, mgbe oge ahụ ruru nnọọ, Jisọs bịara nwụọ ọnwụ nꞌihi anyị ndị mmehie.


ROM 5:7
A sịkwarị na anyị bụ ndị ezi omume ọ gaara abụ ihe siri ike mmadụ ịbịa nwụọ ọnwụ nꞌihi anyị. Ma eleghị anya, a ga-ahụkwa onye nwere ike nwụọ nꞌihi ezi mmadụ.


ROM 5:12
Dị ka o si dị, ọ bụ site nꞌaka otu nwoke ka mmehie si bata nꞌụwa. Ọ bụkwa mmehie ya wetara ọnwụ. Ugbu a ọnwụ erutela onye ọ bụla aka nꞌihi na mmadụ nile emehiela.


ROM 5:14
Ma e mere ka ọnwụ rute onye ọ bụla site nꞌoge Adam ruo nꞌoge Mosisi. Ma ha anwụghị nꞌihi mmehie nke aka ha, ebe ọ bụ na ọ bụghị ha onwe ha nupụrụ isi nꞌiwu ahụ Chineke nyere Adam. Adam nꞌonwe ya nọkwa ọnọdụ dị ka ihe ịma atụ nke na-egosi Onye ahụ nke gaje ịbịa.


ROM 5:15
Leekwa ihe dị iche nꞌetiti mmehie mmadụ mere na mgbaghara mmehie Chineke! Nꞌihi na ọ bụ site na mmehie otu onye ka ọnwụ ji zuo ọha ọnụ. Ugbu a ọ bụkwa site nꞌaka otu onye, Jisọs Kraịst, ka mgbaghara mmehie ji rute mmadụ nile aka site nꞌobi ebere Chineke.


ROM 5:16
Mmehie Adam buteere mmadụ nile ọmụma ikpe ọnwụ, ma Kraịst bịara wepụ ọtụtụ mmehie, site nꞌụzọ dị otu a wetara anyị onyinye Chineke, nke bụ ndụ na-ejubiga oke.


ROM 5:17
Ọ bụ ezie na ọnwụ malitere ịchị ụwa nꞌihi mmehie otu nwoke, ma ndị nile ga-anabatara onwe ha onyinye mgbaghara Chineke, na onyinye nke ịbụ ndị ezi omume nke ọ na-enyekwa, ga-esite nꞌihe Kraịst meere ha bụrụ ndị nwere ndụ nke ọnwụ na-agaghị eemri.


ROM 5:21
Na mbụ ọ bụ mmehie na-achị ụwa. Ọ bụkwa mmehie wetara ọnwụ. Ma ugbu a, obi ebere Chineke na-achị ụwa, obi ebere ya nke kpọbatara anyị nꞌihu ya, ebe anyị guzo ugbu a, obi ebere Chineke, nke ga-eduba anyị na ndụ ebighị ebi site na Jisọs Kraịst Onyenwe anyị.


ROM 6:3
Nꞌihi na unu kwesịrị ịmata, na mgbe ahụ e jikọtara anyị na Kraịst Jisọs na baptizim ka e jikọtara anyị na ya nꞌọnwụ ya.


ROM 6:4
Ya mere, e likọtara anyị na ya na baptizim ka anyị si otu a keta oke nꞌọnwụ ya. Ka anyị sikwa otu a keta oke na ndụ ọhụrụ, mgbe e sitere nꞌike dị ebube nke Nna mee ka Kraịst si nꞌọnwụ bilie.


ROM 6:5
Ọ bụrụkwa na e jikọtaala anyị na ya nꞌọnwụ, e jikọtakwala anyị na ya na mbilite nꞌọnwụ.


ROM 6:8
Ọ bụrụkwa nꞌeziokwu na anyị na Kraịst nwụkọrọ ọnwụ, anyị makwaara na anyị na ya ga-adịkọkwa ndụ ọzọ.


ROM 6:9
Nꞌihi na anyị maara na ebe Chineke mere ka Kraịst site nꞌọnwụ bilie, Kraịst agaghị anwụkwa ọzọ. Ọnwụ enwekwaghị ike ọ bụla nꞌebe ọ nọ ọzọ.


ROM 6:13
Ekwekwala ka akụkụ ọ bụla nke ahụ gị bụrụ ngwa ọrụ mmehie. Kama nyefee onwe gị kpamkpam nꞌaka Chineke, akụkụ ahụ gị nile, ka ị bụrụkwa ezi ngwa ọrụ nꞌaka ya. Nꞌihi na ọ bụ nzọpụta ka a zọpụtara gị site nꞌaka ọnwụ. Ka Chineke jiri gị rụpụta nzube ọma ya nile.


ROM 6:16
Ọ bụ na unu amataghị na onye ọ bụla unu na-ejere ozi, na onye unu na-erubekwara isi bụ Onyenwe unu? Unu ka ọ dịrị ịhọrọ ịbụ ohu mmehie nke na-eduba nꞌọnwụ, ma ọ bụkwanụ irubere Chineke isi onye na-enye ndụ ebighị ebi.


ROM 6:21
Ma gịnị bụ uru unu nwetara nꞌọrụ ahụ nile unu rụrụ? Amaara m na ọ dịghị uru ọ bụla unu ritere. Nꞌihi na leenụ otu ihere si eme unu, mgbe ọ bụla unu chetara ndụ ochie unu ahụ. Unu makwaara na ọgwụgwụ ihe ndị ahụ nile bụ ọnwụ.


ROM 6:23
Nꞌihi na ụgwọ ọrụ mmehie bụ ọnwụ, ma onyinye amara Chineke na-enye nꞌefu, bụ ndụ ebighị ebi, site na Jisọs Kraịst Onyenwe anyị.


ROM 7:4
Nꞌụzọ dị otu a, unu onwe unu dị ka nwanyị lụrụ di. Na mbụ, di unu bụ iwu ndị Juu. Ma mgbe Kraịst nwụru, unu soro ya nwụọ. Nꞌihi nke a, ebe a gụrụ unu na ndị nwụrụ anwụ, ihe ọ bụla ejikọtakwaghị unu na iwu ndị Juu. O nwekwaghị ike ọ bụla nꞌebe unu nọ. Mgbe Kraịst biliri nꞌọnwụ, unu sokwara ya bilie bụrụ ndị dị ọhụrụ. Ugbu a, onye na-alụ unu bụ onye ahụ si nꞌọnwụ bilie. Ọ na-alụ unu ime ka unu nwee ike ịmị ezi mkpụrụ, nke bụ ezi omume nye Chineke.


ROM 7:9
Mgbe m na-amaghị ihe iwu chọrọ ka m mee, ana m eche na m nọ na-ebi ezi ndụ, ma mgbe m mụtara eziokwu dị nꞌime iwu e dere ede, amatara m na m bụ onye gba aka, onye ikpe ọnwụ dị na-eche, nꞌihi na ọ dịghị iwu ọ bụla m debere.


ROM 7:10
Iwu ahụ kwesịrị izi m ụzọ m ga-esi nweta ndụ juru afọ, ka m chọpụtara na ọ bụ ikpe ọnwụ ebighị ebi ka ọ na-eduba m.


Ρωμαίους 7:11
Ma ọ bụ mmehie ghọgburu m! Nꞌihi na mmehie ji ezi iwu ahụ Chineke nyere gbaara m ọnya, ime ka m bụrụ onye ikpe ọnwụ mara.


Ρωμαίους 7:13
Olee otu iwu siri bụrụ ihe dị mma? Ọ̀ bụghị iwu wetara ikpe ọmụma? Ò si aṅaa bụrụkwanụ ihe dị mma? Ka m kọwaa. Ọ̀ bụghị iwu bụ ihe dị njọ, kama ọ bụ mmehie bụ ihe jọgburu onwe ya na njọ. Nꞌihi na ọ bụ mmehie weere iwu dị mma, mee ka e site na ya wetara m ikpe ọmụma. Ị hụla ka mmehie si bụrụ nnọọ ihe arụrụ ala na ihe aghụghọ na ihe na-eweta ọnwụ? O ji iwu ọma Chineke mere ngwa ọrụ ihe ọjọọ ya.


Ρωμαίους 7:24
Ewoo! Onye nwụrụ anwụ ka m bụ! Onye pụrụ ịzọpụta m site nꞌanụ ahụ ochie m nke na-eduba m nꞌọnwụ?


Ρωμαίους 8:2
Nꞌihi na ike ahụ Mmụọ na-enye ndụ na-enye abụrụla nke m, site nꞌịdị nꞌotu nke mụ na Kraịst. Ike a emekwaala ka m nwere onwe m nꞌebe ike nile nke mmehie na ọnwụ dị.


Ρωμαίους 8:11
Ọ bụrụ na Mmụọ Chineke, onye mere ka Jisọs si nꞌọnwụ bilie, bi nꞌime gị, ọ ga-emekwa ka anụ ahụ gị dị ndụ ọzọ, mgbe ị nwụchara, site nꞌike Mmụọ Nsọ ahụ, onye bi nꞌime gị.


Ρωμαίους 8:19
Nꞌihi na ụwa na ihe nile e kere eke dị nꞌime ya ji ndidi na olileanya na-echesi ike ịhụ ụbọchị ahụ mgbe Chineke ga-esite nꞌọnwụ kpọlite ụmụ ya.


Ρωμαίους 8:34
Mgbe ahụ, olee onye ọzọ nwere ike ịma anyị ikpe ọnwụ? Ọ̀ bụ Kraịst? Mba! Nꞌihi na Kraịst bụ onye ahụ nwụrụ nꞌihi anyị, ọ bụkwa onye ahụ e mere ka o si nꞌọnwụ bilie, mee ka ọ nọọ nꞌaka nri Chineke, ebe ọ nọ na-arịọrọ anyị arịrịọ.


Ρωμαίους 8:35
Ọ̀ dị onye nwere ike ikewapụ anyị site nꞌịhụnanya Kraịst nwere nꞌebe anyị nọ? Ọ bụrụ na anyị anọọ nꞌọnọdụ nsogbu, ma ọ bụ na mkpagbu, ma ọ bụ nꞌahụhụ, ihe ndị a ha na-egosi na Kraịst ahụkwaghị anyị nꞌanya? Mba! A sịkwa na anyị anọọ nꞌọnọdụ agụụ, ma ọ bụ nꞌụkpa, ma ọ bụ nꞌọnọdụ ihe egwu, ma ọ bụkwanụ nꞌọnwụ, ọ na-egosi na Chineke agbaketala anyị azụ? Mba!


Ρωμαίους 8:36
Nꞌihi na akwụwkọ nsọ na-agwa anyị sị, “Ọ bụ nꞌihi gị, Chineke, ka anyị na ọnwụ ji na-agba mgba ụbọchị nile. A na-ele anyị anya dị ka atụrụ a gaje igbu egbu.”


Ρωμαίους 8:38
Nꞌihi na nke a bụ ihe m maara nke ọma, bụrụkwa ihe doro m anya, na ọ dịghị ihe pụrụ ikewapụ anyị site nꞌịhụnanya Chineke. Ọnwụ, ma ọ bụ ndụ enweghị ike ya, ndị mmụọ ozi ma ọ bụ ike nile dị nꞌeluigwe enweghị ike igbochi Chineke ịhụ anyị nꞌanya. Ọ bụladị ihe ọjọọ nile na-eme nꞌụwa taa, na nchegbu banyere ihe ga-eme echi, apụghị igbochi ịhụnanya Chineke.


Ρωμαίους 10:7
Nzọpụta ahụ adịghị ajụkwa sị, “Ònye kwa pụrụ ịrịdata nꞌime ili, ime ka Kraịst si nꞌọnwụ bilie dịrị ndụ ọzọ?”


Ρωμαίους 10:9
Ọ na-ekwu sị, ọ bụrụ na ị ga-eji ọnụ gị kwupụta mmehie gị, ọ bụrụkwa na ị ga-ekwere nꞌobi gị na Chineke mere ka Jisọs Kraịst si nꞌọnwụ bile, a ga-azọpụta gị.


Ρωμαίους 11:15
Ọ bụrụ na ọ bụ site nꞌọjụjụ a jụrụ ndị Juu ka e si mee ka ụwa na Chineke dịrị na mma, gịnị ga-eme mgbe a nabatara ha? Ọ gaghị adị ka ebe ndị nwụrụ anwụ si nꞌọnwụ bilie ọzọ?


Ρωμαίους 14:9
Ọ bụ nꞌihi nke a ka Kraịst ji nwụọ, biliekwa, ka ọ bụrụ Onyenwe anyị nꞌọnọdụ ọ bụla anyị nọ, ma ọ bụ na ndụ, ma ọ bụ nꞌọnwụ.


Ρωμαίους 15:4
Ihe ndị a nile e dere nꞌakwụkwọ nsọ nꞌoge gara aga bụ maka izi anyị ntachi obi, na ịgba anyị ume. Ka anyị site na ha na-ele anya ọbịbịa nke ụbọchị ahụ Chineke ga-ala ike mmehie na ọnwụ nꞌiyi.


2 KỌRINT 1:9
Ee, ọ dị nnọọ nꞌoge ahụ, dị ka a ga-asị na a mara anyị ikpe ọnwụ. Ma anyị maara na o si otu a mee ka anyị nwee ike ịmụta na o kwesịghị ka anyị tụkwasị obi nꞌike nke aka anyị, kama ka anyị nwee olileanya nꞌime Chineke, onye pụrụ ime ka ndị nwụrụ anwụ si nꞌọnwụ bilie.


2 KỌRINT 1:10
Ọ bụ Chineke bụ onye dọpụtara anyị site nꞌime oke ọnwụ dị otu a. Ọ bụ Chineke ga-adọpụtakwa anyị nꞌoge dị nꞌihu. Anyị nwekwara ntụkwasị obi na ọ ga-aga nꞌihu na-adọpụtakwa anyị.


2 KỌRINT 2:16
Nꞌetiti ndị ahụ na-ala nꞌiyi, isisi ụtọ a bụ ihe na-ewetara ha ọnwụ, ma nꞌetiti ndị ahụ a na-azọpụta, ọ bụ isisi ụtọ a na-ewetara ha ndụ. Ma ọ dịghị mgbe ọ bụla anyị hụrụ onwe anyị dị ka ndị zuru oke ịrụ ọrụ dị otu a.


2 KỌRINT 3:6
Ọ bụ nanị Chineke mere ka anyị zuo oke ịbụ ndị ozi ya, na-akọwara ndị mmadụ ihe banyere ọgbụgba ndụ ọhụrụ nke Chineke chọrọ iji zọpụta ha. Anyị anaghị agwa ha na ọ dị mkpa ka ha debe iwu nile Chineke nyere, kama anyị na-agwa ha na ndụ dịrị ha site na Mmụọ Nsọ. Nꞌihi na ụzọ ochie ahụ nke inwe nzọpụta site nꞌidebe iwu na-eweta ọnwụ, ma nꞌime ụzọ ọhụrụ a, Mmụọ Nsọ na-enye ha ndụ.


2 KỌRINT 3:7
Ma iwu ahụ na-eweta ọnwụ ji ebube dị ukwuu bịa. Ebube ahụ dị nnọọ ukwuu mee ka ụmụ Izirel hapụ inwe ike ilegide Mosisi anya nꞌihu mgbe o si nꞌelu ugwu Sainai rịdata. Ma nꞌezie, ebube ahụ mesịrị bido ịgabiga.


2 KỌRINT 3:9
Ọ bụrụ na ụzọ ahụ na-eweta ọnwụ ji ebube bịa, ebube nke ụzọ ọhụrụ ahụ na-eweta udo nꞌetiti Chineke na mmadụ ga-adịkwa ukwuu.


2 KỌRINT 4:10
Ọtụtụ mgbe anyị na-ahụ ọnwụ anya, dị ka Jisọs hụrụ ya. Ka e si otu a mee ka ọ pụta ìhè, na ọ bụ Kraịst onye bi nꞌime anyị na-echebe anyị na-eme ka anyị dịrị ndụ na-aga nꞌihu.


2 KỌRINT 4:11
Nꞌezie, mgbe nile a na-arara anyị bụ ndị di ndụ na-enye nꞌaka ọnwụ, nꞌihi na anyị na-ejere Jisọs ozi. Ma nke a na-enye anyị ohere igosi ike Jisọs nke na-arụsi ọrụ ike nꞌime ndụ anyị.


2 KỌRINT 4:12
Nꞌihi ozi ọma anyị na-ekwusa, anyị na-anọ nso nꞌọnụ ọnwụ, ma nkwusa ozi ọma anyị ewetarala unu ndụ ebighị ebi.


2 KỌRINT 4:14
Anyị maara na Chineke, onye mere ka Onyenwe anyị Jisọs si nꞌọnwụ bilie, ga-emekwa ka anyị soro Jisọs si nꞌọnwụ bilie. Anyị makwaara na ọ gaechebe anyị na unu, tutuu ruo mgbe ọ kpọbatara anyị nꞌihu ya.


2 KỌRINT 5:15
Kraịst nwụrụ nꞌihi mmadụ nile, ka ndị dị ndụ gharakwa ịdịrị onwe ha ndụ ọzọ, kama ka ha dịrị ndụ ga-atọ Jisọs, onye ahụ nwụrụ nꞌọnọdụ ha ụtọ. Ee, Kraịst ahụ e mekwara ka o si nꞌọnwụ bilie ọzọ.


2 KỌRINT 6:9
Ụwa amaghị anyị, ma Chineke maara anyị. Ọ bụ ezie na anyị na ọnwụ na-anọ nso mgbe nile, ma lee anyị ka anyị dịkwa ndụ. A na-ata anyị ahụhụ, ma lee Chineke na-echebe anyị ka a hapụ igbu anyị.


2 KỌRINT 7:10
Nꞌihi na Chineke na-eji ihe naewute anyị enyere aka ime ka anyị site na mmehie anyị chegharịa. Ka ọ zọpụta anyị. Ya mere, anyị kwesịrị ịnabata ihe mwute dị otu a mgbe ọ bụla ha dakwasịrị anyị. Ma ihe naewute onye na-amaghị Kraịst abụghị ihe ga-eme ka o chegharịa, kama ọ bụ ihe na-ewetara ya ọnwụ.


2 KỌRINT 11:23
Ha na-ekwu na ha bụ ndị na-ejere Kraịst ozi. Ma mụ onwe m ejerrela Kraịst ozi karịa ha nile (amaara m na ụdị okwu a m na-ekwu bụ ụdị okwu onye isi na-adịghị mma na-ekwu). Ma adọgbuola m onwe m nꞌọrụ karịa ha nile. Etinyela m nꞌụlọ mkpọrọ ọtụtụ mgbe nꞌihi ikwusa ozi ọma. Etiela m ihe otiti ọtụtụ mgbe. Mgbe mgbe kwa anọọla m nꞌọnụ ọnwụ.


GALETIA 2:21
Ugbu a abụkwaghị m otu nꞌime ndị na-akpọ ọnwụ Kraịst ihe na-enweghị isi. Nꞌihi na a sị na a pụrụ ịzọpụta anyị site nꞌidebe iwu ọ garaghị adị mkpa na Kraịst ga-abịa nwụọ.


GALETIA 3:1
Ndị nzuzu a kpọrọ onwe ha ndị Galetia! Ònye bụ dibia ahụ tara ose gbụọ unu nꞌanya, ime ka unu gharakwa ịghọta ihe ọnwụ Kraịst pụtara, dị ka unu si ghọta ya mgbe m kọwaara unu ya na mbụ?


GALETIA 4:14
Ma ọ bụ ezie na m nọ nꞌọrịa nꞌoge ahụ, unu eledaghị m anya, ma ọ bụ jụ ige m ntị, nꞌihi ahụ ọjọọ m nke gaara abụrụ unu ihe ọnwụnwa iji jụ m. Kama unu nabatara m, dị ka a ga-asị na m bụ mmụọ ozi Chineke zitere, ma ọ bụ dị ka a ga-asị na m bụ Jisọs Kraịst nꞌonwe ya.


GALETIA 5:5
Ma anyị onwe anyị na-esite nꞌinyeaka nke Mmụọ Nsọ na-enwe olileanya na ọnwụ Kraịst nwụrụ asachapụla mmehie anyị, ime ka anyị na Chineke dịrị na mma.


GALETIA 6:8
Onye ọ bụla na-agha mkpụrụ nke imejupụta ọchịchọ anụ ahụ ya, ga-esitekwa nꞌanụ ahụ ahụ webata ọnwụ dị ka ihe ubi, ma onye ọ bụla na-agha mkpụrụ nke imejupụta ọchịchọ Mmụọ Nsọ, ga-esite na Mmụọ Nsọ weta ndụ ebighị ebi dị ka ihe ubi.


EFESỌS 1:7
Lee otu obi ọma Chineke siri dị ukwuu nꞌebe anyị nọ! Nꞌihi na site nꞌọnwụ Kraịst, o mere ka anyị nwere onwe anyị. Ọ bụkwa site nꞌọnwụ Kraịst ka ọ gbaghaara anyị mmehie anyị.


EFESỌS 1:20
Chineke jiri kpọlite Kraịst site nꞌọnwụ, mee ya ka ọ nọdụ nꞌakụkụ aka nri ya nꞌeluigwe.


EFESỌS 2:5
Nꞌihi na mgbe mmụọ anyị nwụrụ anwụ nꞌime mmehie, Chineke nyekwara anyị ndụ ọzọ mgbe o mere ka Kraịst site nꞌọnwụ dịrị ndụ. Nꞌihi na ọ bụ site nꞌamara Chineke ka e jiri zọpụta anyị.


EFESỌS 2:6
Dị ka o siri kpọlite Kraịst site nꞌọnwụ, otu a ka Chineke siri kpọlitekwa anyị site na ndụ ochie anyị, mee ka anyị soro Kraịst nọkọọ nꞌeluigwe.


EFESỌS 2:16
Site nꞌọnwụ ya nꞌelu obe, o mere ka ekworo dị nꞌetiti ndị Juu na ndị mba ọzọ gwụsịa. Sitekwa nꞌọnwụ ya nꞌobe, o mekwara ha abụọ ka ha bụrụ otu. O sitekwara nꞌụzọ dị otu a mee ka ha bịaghachikwute Chineke.


EFESỌS 5:14
Nꞌihi na ìhè na-eme ka a hụzie ihe ọ bụla anya nke ọma. Ọ bụ nꞌihi nke a ka akwụkwọ nsọ jiri kwuo sị, “Bilie gị onye na-arahụ ụra. Site nꞌọnwụ bilie! Kraịst ga-emekwa ka ìhè ya mụkwasị gị.”


EFESỌS 5:26
Jisọs Kraịst sitere nꞌọnwụ ya mee ka nzukọ ya dịrị nsọ, site na nsacha nke baptizim na nke okwu Chineke.


FILIPAI 1:20
Nꞌihi na olileanya m na ntụkwasị obi m bụ na Chineke agaghị ekwe ka m mee ihe ọ bụla ga-eme ka ihere mee m nꞌụzọ ọ bụla. Enwekwara m olileanya na m ga-aga nꞌihu nọdụ na njikere ikwupụta okwu na-atụghị egwu nꞌihi Kraịst, ọ bụladị ugbu a m nọ nꞌahụhụ ndị a. Aga m ekwupụta okwu ahụ dị ka m si ekwu ya nꞌoge gara aga. Aga m agakwa nꞌihu ịhụ na ndụ m bụ ihe ga-ewetara Kraịst otuto nꞌọnọdụ ọ bụla, ma ọ bụ na ndụ ma ọ bụ nꞌọnwụ.


FILIPAI 1:21
Nꞌihi na nꞌebe m nọ, ịdị ndụ bụ ịnọ nꞌime Kraịst, ịnwụ ọnwụ bụkwa uru nye m.


FILIPAI 2:8
Ebe ọ bịara nꞌụwa dị ka mmadụ, o wedakwara onwe ya ala, rube isi họrọ ịnwụ ọnwụ jọkarịsịrị njọ, ọnwụ ihere, nke ịbụ onye a kpọgidere nꞌelu obe.


FILIPAI 2:9
Ọ bụ nꞌihi nke a ka Chineke ji site nꞌọnwụ kpọlite ya, welie ya elu, mee ka ọ nọdụ ugbu a nꞌebe kachasị elu, nyekwa ya aha nke karịrị aha nile ọ bụla elu.


FILIPAI 2:27
Nꞌezie, ọ fọdụrụ nnọọ ntakịrị ka o site nꞌọrịa ahụ daa nꞌụra ọnwụ. Ma Chineke meere ya ebere. Ọ bụghị ya nanị ka Chineke meere ebere, kama o mekwaara m ebere, nꞌihi na o kweghị ka a tụkwasịrị m mwute gaara abụ nke m, ma a sị na Epafroditọs nwụrụ.


FILIPAI 3:10
Ugbu a ewezugala m ihe ndị ahụ nile, nꞌihi na achọpụtara m na nke a bụ nanị ụzọ mmadụ si amara Kraịst na ike ahụ e ji kpọlite ya site nꞌọnwụ. Ọ bụkwa nanị site nꞌụzọ a ka e si achọpụta ihe iso Kraịst hụọ ahụhụ, na iso ya nwụkọọ ọnwụ pụtara.


FILIPAI 3:11
Ya mere, na-ajụghị ihe ọ bụla ọ ga-efu m, aga m abụ otu nꞌime ndị na-ebi ndụ ọhụrụ ahụ nke dịrị ndị e mere ka ha site nꞌọnwụ dịrị ndụ.


FILIPAI 3:21
Mgbe ọ lọghachiri, ọ ga-eji anụ ahụ dị ebube, nke yiri nke ya, gbanwee anụ ahụ anyị ndị a nke na-anwụ ọnwụ. Ọ bụkwa ike ya ahụ dị ukwuu, nke ọ ga-eji lụgbuo ihe nile dị nꞌụwa, ka ọ ga-eji nye anyị ahụ ọhụrụ ahụ.


KỌLỌSI 1:18
Ọ bụ ya bụ isi nke anụ ahụ ahụ bụ chọọchị, nzukọ Kraịst ahụ o bidoro. O sitere nꞌọnwụ bilie bụrụ onyeisi mbụ nꞌetiti ndị nile ga-esi nꞌọnwụ bilie. Nke a mere ka ọ bụrụ onyeisi mbụ nꞌime ihe nile.


KỌLỌSI 1:20
Ọ bụ site nꞌihe Ọkpara ya mere ka Chineke ji kpebie ka ụwa nile bịaghachikwute ya. Nꞌihi na site nꞌọnwụ nke Kraịst nwụrụ nꞌelu obe, na ọbara ọ wụsịrị, e meela ka udo dịrị nꞌetiti Chineke na mmadụ nile. Ihe nile dị nꞌụwa na nꞌeluigwe nwekwara ike ịbịakwute Chineke ugbu a.


KỌLỌSI 1:22
Chineke mere nke a site nꞌọnwụ nke Ọkpara ya nwụrụ nꞌelu obe, nke mere ka unu bụrụ ndị enyi ya, ndị a kpọbatara nꞌihu ya, ndị guzokwa nꞌihu ya dị ka ndị dị nsọ na ndị dị ọcha, ndị na-enweghị ntụpọ ọ bụla.


KỌLỌSI 2:12
Nꞌihi na mgbe e mere unu baptizim, o gosiri na unu na ya nwụkọrọ, na e likọtakwara unu na ya. Mgbe ahụ kwa ka unu sooro Kraịst si nꞌọnwụ bilie banye na ndụ ọhụrụ, nꞌihi na unu kweere nꞌokwu Chineke dị ukwuu ahụ, onye mere ka Kraịst si nꞌọnwụ bilie.


KỌLỌSI 3:1
Ebe e mere ka unu bụrụ ndị so Kraịst bilie nꞌọnwụ, tụkwasịnụ obi unu nꞌakụ na ọṅụ dị nꞌeluigwe ebe Kraịst nọ nꞌocheeze ya nꞌakụkụ Chineke.


1 TESALỌNAIKA 1:6
Nke a mere unu ji bụrụ ndị na-eso ụzọ anyị na ndị na-eso ụzọ Onyenwe anyị. Nꞌihi na unu jiri ọṅụ Mmụọ Nsọ na-enye nabata ozi ọma anyị, na-ajụghị ajụjụ banyere ọnwụnwa na obi ọjọọ o wetaara unu.


1 TESALỌNAIKA 1:10
Ha na-akọkwa otu unu si na-ele anya nlọghachi Okpara Chineke site nꞌeluigwe, Jisọs ahụ Chineke mere ka o si nꞌọnwụ bilie, onye bụ Onye nzọpụta anyị site nꞌiwe Chineke dị egwu megide mmehie.


1 TESALỌNAIKA 3:5
Dị ka m na-ekwu na mbụ, mgbe m hụrụ na m apụghị ịnagide ihe ndị ahụ, ezipụrụ m Timoti, ka ọ bịa chọpụta ma okwukwe unu ọ dịkwa chịm. Nꞌihi na ihe tụrụ m ụjọ bụ na ma eleghị anya onye ọnwụnwa ọjọọ ahụ bụ ekwensu ga-emeri unu nꞌoge ọnwụnwa ndị a, mee ka ọrụ nile anyị rụrụ nꞌetiti unu bụrụ ihe lara nꞌiyi.


1 TESALỌNAIKA 4:13
Otu ọ di ụmụnna anyị, achọrọ m ka unu mata ihe bụ ọnọdụ ụmụ Chineke, mgbe ha dara nꞌụra ọnwụ. Mgbe unu maara nke a unu agaghị abụ ndị na-anọ na mwute, ma ọ bụ unu adịrị dị ka ndị na-enweghị olileanya mgbe mmadụ nwụrụ nꞌetiti unu.


1 TESALỌNAIKA 4:14
Nꞌihi na ebe ọ bụ na anyị kweere na Jisọs nwụrụ ma sitekwa nꞌọnwụ bilie ọzọ, anyị nwekwara ike inwe okwukwe na mgbe Jisọs ga-abịa ọzọ, Chineke ga-eme ka ndị Kraịst nile nwụrụ anwụ soro Jisọs lọghachi na ndụ.


1 TESALỌNAIKA 4:15
Nꞌihi na, ihe m na-agwa unu ugbu a si nꞌọnụ Onyenwe anyị nꞌonwe ya. Anyị bụ ndị dị ndụ mgbe Onyenwe anyị ga-alọta, agaghị eburu ndị dara nꞌụra ọnwụ ụzọ bilite.


1 TESALỌNAIKA 4:16
Nꞌihi na Onyenwe anyị nꞌonwe ya ga-esi nꞌeluigwe rịdata. Mgbe ọ na-arịdata ọ ga-eji olu dị ike kpọọ oku. Ee, ọ ga-eji ube akwa nke ndị isi mmụọ ozi tie mkpu, ọ ga-afụkwa opi ike Chineke. Mgbe ahụ ndị Kraịst nile dara nꞌụra ọnwụ ga-eburu ụzọ si nꞌọnwụ bilite.


1 TESALỌNAIKA 5:10
Ọ nwụrụ ọnwụ nꞌihi anyị, ka anyị nwee ike isoro ya dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. Nke a ga-emezukwa mgbe ọ lọghachiri, ma anyị nwụrụ anwụ, ma anyị dị ndụ.


1 TIMỌTI 4:9
Nke a bụ eziokwu ahụ nke onye ọ bụla kwesịrị ịnabatara onwe ya. Anyị na-adọgbu onwe anyị nꞌọrụ na-ahụjukwa anya ime ka ndị mmadụ kwere ya, nꞌihi na olileanya anyị dị nꞌime Chineke dị ndụ, onye nwụrụ ọnwụ nꞌihi mmadụ nile, nke ka nke nꞌihi ndị ahụ kweere na ya.


2 TIMỌTI 1:10
Ugbu a o meela ka ihe nile o zubere ime nꞌobi ya pụta ìhè site nꞌọbịbịa nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, onye lara ike nke ọnwụ nꞌiyi zi anyị ụzọ anyị gaesi nwee ndụ ebighị ebi site nꞌịtụkwasị ya obi.


2 TIMỌTI 2:8
Echefula na Jisọs Kraịst bụ mmadụ. Na a mụrụ ya nꞌezinụlọ eze Devidi. Na ọ bụkwa Chineke nꞌihi na o sitere nꞌọnwụ bilie ọzọ.


2 TIMỌTI 2:18
Ha ahapụla ịgbaso ụzọ eziokwu ahụ bido na-ekwusa okwu ụgha, naasị na oge mbilite nꞌọnwụ mmadụ nile agafeela. Site nꞌokwu a, ha naemekwa ka ụfọdụ ndị na-ekwere okwu ha bụrụ ndị na-ada mba nꞌokwukwe ha.


HIBRU 2:9
Ma anyị na-ahụ Jisọs, onye e mere ka ọ dị ala nanị otu mgbe. Onye e mere ka ndị mmụọ ozi dị elu karịa ya, ka ọ hụọ ahụhụ nwụọkwa nꞌihi mmadụ nile. Nꞌihi ọnwụ ọ nwụrụ, Chineke ewerela nsọpụrụ kpube ya nꞌisi dị ka okpueze.


HIBRU 2:10
E mere ka ọ bụrụ ihe ziri ezi nꞌanya Chineke, onye kere ihe nile, na Jisọs ga-ahụ ahụhụ. Nꞌihi na Chineke sitere nꞌọnwụ ya mee ka ọtụtụ mmadụ bịaruo nso nzọpụta. Ma ahụhụ Jisọs hụrụ mere ya ka ọ bụrụ onyeisi zuru oke nke nwere ike iduba ndị ya na mmeri nke nzọpụta.


HIBRU 2:14
Anyị bụ ụmụ Chineke ka e jiri ọbara na anụ ahụ mee. Jisọs gbokwasịrị onwe ya ụdị dị otu a. A mụrụ ya dị ka mmadụ efu. Nꞌihi na ọ bụ nanị dị ka mmadụ ka ọnwụ ya pụrụ ịdị ire. Site nꞌọnwụ ọ nwụrụ, ọ lara ike ajọ onye ahụ bụ ekwensu nꞌiyi. Ekwensu ahụ nwere ike ọnwụ.


HIBRU 2:15
Jisọs mere nke a, ka ọ dị mfe ịtọpụ ụmụnna ya site nꞌagbụ. Ha nọ nꞌagbụ nke ụjọ ọnwụ.


HIBRU 2:18
Nꞌihi na ebe ya onwe ya hụrụ ahụhụ, ọ pụrụ inyere ndị na-ahụ ahụhụ aka. Ihe banyere ọnwụnwa doro ya anya. Nꞌihi nke a ọ maara ihe bụ nsogbu anyị mgbe anyị dabara nꞌọnwụnwa. Ọ pụkwara inyere anyị aka.


HIBRU 3:8
unu ekwela ka obi unu sie ike dị ka nkume, dị ka unu mere mgbe unu nupụrụ isi megide Chineke, dị ka unu mere nꞌụbọchị ahụ nꞌime ọzara mgbe unu nwara ya ọnwụnwa.


HIBRU 3:9
Nꞌebe ahụ ka nna nna unu ha nọ nwaa m ọnwụnwa, lee m ule, ka Chineke kwuru. Ọ bụ ezie na ha hụrụ ihe m meere ha nꞌime iri afọ anọ.


HIBRU 3:17
Ọ bụkwa olee ndị ka Chineke wesoro iwe iri afọ anọ? Ọ bụ ndị ahụ mehiere megide ya. Ndị ahụ nwụrụ ọnwụ nꞌọzara ebe ozu ha tọgbọkwara.


HIBRU 4:15
Nꞌihi na anyị nwere onyeisi nchụaja nke nwere ike ịghọta adịghị ike anyị. A nwara Jisọs ọnwụnwa nꞌụzọ nile dị ka a na-anwa anyị taa. Ma o meghị mmehie nꞌụzọ ọ bụla mgbe a nwara ya.


HIBRU 5:7
Mgbe Jisọs nọ nꞌụwa, o kpere ekpere nye Chineke. Mgbe ụfọdụ nꞌọnọdụ ekpere ahụ, ọ na-akwa akwa. Mgbe ọzọ kwa, anya mmiri na-ejupụta ya nꞌanya. O kpere ekpere ya nye Chineke nꞌihi na ọ maara na Chineke pụrụ ịzọpụta ya site nꞌọnwụ. Chineke nụkwara ekpere ya, nꞌihi na Jisọs bụ onye nchụaja na-erube isi.


HIBRU 6:1
Ya mere ka anyị hapụtụ ozizi ndị ahụ a na-ezi ndị kweere na Kraịst ọhụrụ, ma ka anyị lenye anya nꞌokwu ndị ọzọ gbara ọkpụrụkpụ. Ọ kwesịghị ka anyị malitekwa tọwa ntọ ala gbasara inwe okwukwe na Chineke, na inwe nchegharị site na ndụ ọjọọ ndị ahụ na-eweta ọnwụ.


HIBRU 6:2
Ọ dịghị mkpa na a ga-akụziri unu ihe banyere ime baptizim, onyinye nke Mmụọ Nsọ, mbilite nꞌọnwụ na ikpe ebighị ebi.


HIBRU 7:8
Ndị nchụaja na-anata otu ụzọ nꞌụzọ iri ga-anwụ, mgbe oge ọnwụ ha ruru. Ma akwụkwọ nsọ kwuru na Melikizedeki na-adị ndụ na-aga nꞌihu.


HIBRU 9:14
ọbara Kraịst ọ̀ pụghị ime ka anyị dị ọcha karịa? Nꞌezie ọbara ya zubigara oke ịsachpụ mmehie anyị nile, nꞌihi na Kraịst sitere na Mmụọ nke na-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi were onwe ya nye na-enweghị ntụpọ. Ọbara ya zubigara oke ịsacha obi anyị na ime anyị ka anyị dị ọcha site nꞌajọ ọrụ nile, bụ ọrụ nke na-eweta ọnwụ. Aja o jiri onwe ya chụọ, mere ka anyị nwere onwe anyị, ka anyị nwee ike ife Chineke onye dị ndụ.


HIBRU 9:28
otu a kwa, Kraịst nwụrụ nanị otu ugboro, dị ka aja a chụrụ nꞌihi mmehie mmadụ nile. Ọ nwụrụ ma Chineke mere ka o site nꞌọnwụ bilie. Ọ ga-abịa ọzọ! Ma ọ bụghị maka ịchụ aja ọzọ nꞌihi mmehie anyị, kama ọ ga-abịa iwetara ndị nile ji okwukwe na olileanya na-eche ọbịbịa ya nzọpụta.


HIBRU 10:28
Nꞌoge Mosisi, a na-ama onye ọ bụla mebiri iwu ikpe ọnwụ. Ikpe ọnwụ a na-esite nꞌakaebe mmadụ abụọ ma ọ bụ atọ ndị ga-ekwupụta na ha hụrụ onye mibiri iwu ahụ oge ọ dara iwu ahụ.


HIBRU 11:17
Ọ bụ okwukwe Eberaham nwere nꞌime Chineke mere o ji kwere iwere nwa ya Aizik chụọ aja mgbe Chineke nwara ya ọnwụnwa. Eberaham bụ onye Chineke kwere nkwa ma o kwadoro iji nwa ahụ ọ mụrụ nanị ya chụọra Chineke aja.


HIBRU 11:34
Ọ bụkwa okwukwe ka ha jiri nọọ nꞌime ọkụ na-enweghị mmerụ ahụ. Okwukwe ka ọtụtụ jiri gbanarị ọnwụ. Okwukwe ka ndị dara mba jiri dịrị ike, meekwa ka ụmụ ndị iro dị ike gbalaga.


HIBRU 11:35
Site nꞌokwukwe ụmụ nwanyị ụfọdụ ka e nyeghachiri ụmụ ha site nꞌọnwụ. Ndị ọzọ naara ntaramahụhụ nꞌihi na ha sitere nꞌokwukwe jụ ịgọnarị Chineke. Ha kweere na Chineke ga-enye ha mbilite nꞌọnwụ kachasị mma ma ọ bụrụ na ha nọgide bụrụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi.


HIBRU 13:20
Ugbu a ka Chineke ahụ na-enye udo, Chineke ahụ sitere nꞌọbara ọgbụgba ndụ ebighị ebi ahụ kpọghachite Onyenwe anyị Jisọs Onye ọzụzụ atụrụ ukwuu ahụ ndụ site nꞌọnwụ


JEMES 1:2
Ụmụnna m, ka obi unu jupụta nꞌọṅụ mgbe ọ bụla ọnwụnwa dị iche iche gbara unu gburugburu.


JEMES 1:3
Nꞌihi na mgbe a na-anwa okwukwe unu ọnwụnwa, ntachi obi unu na-enwe ohere ito eto.


JEMES 1:5
Ọ bụrụ na ọ dị onye na-enweghị ụdị amamihe ahụ dị mkpa nꞌoge ọnwụnwa, ya rịọ Chineke ka o nye ya. Nꞌihi na Chineke na-enye onye ọ bụla rịọrọ ya amamihe nꞌefu. Ọ dịghị atakwa onye ọ bụla ụta.


JEMES 1:10
Ka onye bụ ọgaranya nꞌakụ na ụba nke ụwa ṅụrịakwa ọṅụ nꞌihi na e meela ka ọ mata, na akụ na ụba ya abaghị uru nꞌihu Onyenwe anyị. E meela ka ọ ghọtakwa na ya onwe ya ga-anwụkwa, dị ka okoko osisi si ada nꞌala kpọnwụọ.


JEMES 1:11
Nꞌihi na mgbe ọ bụla anwụ waliri chasie ike, wepụta okpomọkụ, ọ na-eme ka ahihia kpọnwụọ, ka okoko osisi daa nꞌala, ka mma ya gwụsịakwa.


JEMES 1:12
Ọṅụ dịrị nwoke ahụ nke naanọgide na-adịghị ada mba nꞌoge ọnwụnwa. Nꞌihi na mgbe oge ọnwụnwa ahụ gasịrị, ọ ga-anata ụgwọ ọrụ, nke bụ okpueze ndụ, nke Chineke kwere nkwa inye ndị nile hụrụ ya nꞌanya.


JEMES 1:13
Ka onye ọ bụla hapụ ịsị mgbe a na-anwa ya, “Ọ bụ Chineke wetaara m ọnwụnwa a.” Nke a abụghị eziokwu. Nꞌihi na ọ dịghị mgbe a pụrụ ịnwa Chineke ka o mee ihe ọjọọ. Ọ dịkwaghị anwa mmadụ ọ bụla ka o mee ihe ọjọọ.


JEMES 1:14
Kama ọnwụnwa na-abịara mmadụ site nꞌọchịchọ nke obi ya. Ọ bụkwa ọchịchọ ọjọọ nke mmadụ na-arafu ya, dọkpụfuo ya.


JEMES 1:15
Ọ bụ ọchịchọ ọjọọ a, mgbe ha bara ụba nꞌime obi, na-eduba mmadụ na mmehie. Mgbe anyị mehiekwara, ọ bụ mmehie na-eduba nꞌọnwụ.


JEMES 5:20
onye ahụ kpọghachiri onye njehie ahụ nꞌebe Chineke nọ azọpụtala mkpụrụ obi kpafuru akpafu site nꞌọnwụ. Ọ bụ ihe pụrụ ime na mkpụrụ obi ahụ ga-anata mgbaghara nꞌihi ọtụtụ mmehie ya.


1 PITA 1:3
Ka otuto na nsọpụrụ nile dịrị Chineke, Nna Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, nꞌihi na ọ bụ site nꞌobi ebere ya nke o nwere nꞌebe anyị nọ ka o ji nye anyị ndụ ọhụrụ ahụ mere ka a kpọbata anyị nꞌezinụlọ ya. Ugbu a anyị nwere olileanya iketa ndụ ebighị ebi nꞌihi na Kraịst esitela nꞌọnwụ bilie.


1 PITA 1:6
Ya mere, na-aṅụrịnụ ọṅụ, nꞌihi na ụbọchị ga-ewetara unu oke ọṅụ na-abịa. Ọ bụ ezie na unu nọ nꞌọnọdụ mwute ugbu a nꞌihi ọtụtụ mkpagbu na ọnwụnwa na-abịakwasị unu, ma ihe ndị a nile na-adị nanị nwa oge.


1 PITA 1:7
Ọnwụnwa na mkpagbu ndị a na-enyere unu aka ịnwapụta ma okwukwe unu nwere o sikwara ike. A na-anwa okwukwe unu dị ka a ga-asị na ọ bụ ọlaedo e ji ọkụ na-anwapụta. Ọ bụ ezie na ọlaedo bụ ihe pụrụ imebi emebi, ma a ga-eji ọkụ nwaa ya, ịmata nke bụ ezi ọlaedo, na nke na-abụghị ya. Ya mere, ebe ọ bụ na okwukwe unu dị oke ọnụ ahia karịa ọlaedo, a ga-anwakwa unu ịhụ ma ọ ga-eguzosikwa ike. Ọ bụrụ na okwukwe unu eguzo chịm nꞌọnọdụ ọnwụnwa ndị a nile, iguzosi ike unu ga-ewetara unu otuto, ebube na nsọpụrụ nꞌụbọchị ahụ Jisọs ga-alọghachi.


1 PITA 1:21
Ọ bụkwa site nꞌaka ya ka unu ji tụkwasị Chineke obi, onye mere ka Kraịst si nꞌọnwụ bilie, na onye nyekwara ya ebube. Ya mere, tụkwasịnụ okwukwe unu na olileanya unu na Chineke.


1 PITA 1:24
Nꞌihi na okwu Chineke gwara anyị sị, Ndụ mmadụ nile na-agabiga dị ka ahihia nke na-emesi kpọnwụọ, daa. Ịma mma nile nke mmadụ na ebube ya dịkwa ka okoko osisi nke na-ama mma, ma emesịa, ọ daa nꞌala laa nꞌiyi.


1 PITA 3:18
Nꞌihi na Kraịst nꞌonwe ya hụrụ ahụhụ nwụọ nꞌihi unu. Ọ nwụrụ ọnwụ nanị otu ugboro nꞌihi anyị nile bụ ndị mmehie. Ezi mmadụ na-emeghị ihe ọjọọ ọ bụla nwụrụ nꞌihi ndị ajọ omume, nꞌihi ime ka anyị bịa nꞌihu Chineke. Ọ bụ ezie na e gburu ya nꞌanụ ahụ ma e mere ka ọ dịrị ndụ nꞌime mmụọ ya.


1 PITA 3:21
Nke a bụ ihe ịma atụ na-ezi anyị ihe baptizim pụtara. Mgbe e mere anyị baptizim, anyị na-egosi na a zọpụtala anyị site nꞌọnwụ na mbibi nꞌihi mbilite nꞌọnwụ Kraịst. O gosighị na e meela ka anụ ahụ anyị dịrị ọcha nꞌihi baptizim e mere anyị, kama ọ na-egosi na anyị, ndị e mere baptizim na-alọghachikwute Chineke na-arịọ ya ka ọ sachaa mmehie dị nꞌobi anyị.


1 PITA 4:12
Ụmụnna m, ka ọ hapụ iju unu anya mgbe ọnwụnwa dị iche iche ga-abịara unu nꞌihi na ihe dị otu a abụghị ihe ọhụrụ nꞌebe unu nọ.


1 PITA 4:13
Kama ṅụrịanụ ọnụ nꞌihi na ọnwụnwa ndị a na-enyere unu aka iketa oke nꞌahụhụ Kraịst. Mgbe ọnwụnwa ndị a gabigasịrị, obi unu ga-ejupụta nꞌọṅụ mgbe a ga-eme ka unu soro ya keta oke nꞌebube ya nꞌụbọchị ahụ a ga-eme ka ọ pụta ìhè.


2 PITA 2:1
Ma na mgbe ochie ahụ kwa e nwere ọtụtụ ndị amụma ụgha nꞌetiti ha, dị ka a ga-esi nwee ndị ozizi ụgha nꞌetiti unu, ndị na-eweta ozizi ọjọọ nke na-eweta ịla nꞌiyi, ndị ga-agọnarị Onyenwe anyị, onye ji ọbara ya gbapụta ha. Ma ọnwụ ha ga-abụ nnọọ na mberede, ha ga-anwụchakwa ọnwụ.


2 PITA 2:7
Ma nꞌoge ọ na-emebi Sodọm na Gomora, ọ napụtara Lọt site nꞌaka ọnwụ. Lọt bụ onye ezi omume, onye ndụ ọjọọ ndị obodo ahụ na-ebi wutere nke ukwuu.


2 PITA 2:9
Nke a na-egosi na Chineke maara otu o si adọpụta mụ na gị site nꞌọnwụnwa gbara anyị gburugburu. Ọ makwaara otu o si ata ndị ọjọọ ahụhụ, tutuu ruo ụbọchị ikpe ahụ.


1 JỌN 3:16
Jisọs egosila anyị ihe bụ ịhụ mmadụ nꞌanya, nꞌihi ọnwụ ọ nwụrụ. Ya mere anyị kwesịkwara ịtọgbọ ndụ anyị nꞌihi ụmụnna anyị nꞌime Kraịst.


1 JỌN 4:9
Nꞌihi na Chineke gosiri anyị ịdị ukwuu nke ịhụnanya ya site nꞌizite Ọkpara ya ka o wetara anyị ndụ ebighị ebi site nꞌọnwụ ọ nwụrụ.


1 JỌN 5:6
Onye matakwara na Jisọs bụ Okpara Chineke nꞌihi na Chineke si nꞌeluigwe kwuo na Jisọs bụ Ọkpara ya mgbe e mere Jisọs baptizim. Chineke kwukwara okwu dị otu a nꞌoge ọnwụ Jisọs. Ee, olu esiteghị nꞌeluigwe kwuo okwu nanị nꞌoge e mere Jisọs baptizim, kama o kwuru okwu nꞌoge ọnwụ ya.


1 JỌN 5:7
Mmụọ Nsọ, onye okwu ya nile bụ eziokwu, kwukwara otu ihe ahụ. Ya mere, anyị nwere ndị akaebe atọ: Olu Mmụọ Nsọ na-ekwu okwu nꞌobi anyị, na olu ahụ si nꞌelu kwuo okwu nꞌoge e mere Jisọs baptizim, na nꞌoge ọnwụ ya. Olu ndị a nile na-ekwukwa otu ihe ahụ, na Jisọs bụ Ọkpara Chineke.


1 JỌN 5:16
Ọ bụrụ na ị hụ nwanna nꞌime Kraịst ka ọ na-eme mmehie na-adịghị edube onye na-eme ya nꞌọnwụ, kpee ekpere nꞌihi ya rịọ Chineke ka ọ gbaghara ya. Chineke ga-enyekwa ya ndụ. Ọ bụ nanị mgbe ị maara na mmehie ya bụ nke na-eduba onye mere ya nꞌọnkụ ka ị ga-ahapụ ikpere ya ekpere.


1 JỌN 5:17
Ihe ọ bụla na-ezighị ezi mmadụ mere bụ mmehie nꞌihu Chineke. Ma ihe m na-ekwu nꞌebe abụghị ihe banyere ụmụ mmehie ndị mmadụ na-eme. Ana m ekwu ihe banyere mmehie ahụ na-eduba ndị mere ya nꞌọnwụ.


NKPUGHE 1:18
Abụ m onye ahụ nwụrụ anwụ, ma na-adị ndụ. Ugbu a ana m adị ndụ ruo mgbe nile ebighị ebi. Ọ bụ m ji igodo ọkụ ala mmụọ na ọnwụ. Atụla egwu!


NKPUGHE 2:10
Atụkwala egwu nꞌihi ihe ahụ gaje ịbịakwasị gị. Nꞌihi na ekwensu nꞌonwe ya gaje ime ka a tụba ụfọdụ nꞌime ndị gị nꞌụlọ mkpọrọ ka o jiri ya nwaa gị. A ga-akpagbu gị abalị iri. Ma guzosie ike, ọ bụladị mgbe ọnwụ ga-abịakwasị gị. Emesịa, aga m enye gị okpu nke ndụ ahụ.


NKPUGHE 2:11
Ka onye ọ bụla chọrọ ịnụ ihe nụrụ ihe Mmụọ Nsọ na-agwa nzukọ nke Onyenwe anyị. Ọnwụ nke ugbo abụọ agaghị emekpa onye ọ bụla na-emeri emeri ahụ.


NKPUGHE 3:10
“Nꞌime nsogbu ndị a ha na-enye gị nꞌihi aha m, i sitela na ntachi obi sọpụrụ okwu m nile. Nꞌihi nke a, aga m ekpuchi gị site nꞌoke mkpagbu ahụ, ya na oke ọnwụnwa ahụ ga-abịakwasị ụwa. Ihe ndị a bụ ihe ga-anwapụta okwukwe ndị ga-adị ndụ.


NKPUGHE 5:9
Ha bụkuru Nwa atụrụ ahụ abụ ọhụrụ na-asị, “Nanị gị kwesịrị ịnara akwụkwọ ahụ na ịnyakapụ akara dị ya nꞌahụ. Nꞌihi na e gburu gị, ma i sitere nꞌọnwụ gị kpọtara Chineke ndị mmadụ, ndị si nꞌagbụrụ nile, na asụsụ nile, na ndị dị iche iche, na mba nile.


NKPUGHE 6:8
Ahụrụ m inyinya na-adịghị ezi ọcha. Aha onye na-anọkwasị ya nꞌelu bụ ọnwụ, Inyinya ọzọ nke onye ọzọ a na-akpọ ọkụ ala mmụọ nọkwasịrị na-esokwa ya nꞌazụ. E kere ụwa ụzọ anọ, nyefee ha otu ụzọ nꞌaka, ka ha jiri ọnwụ na ọrịa na anụ ọhia gbuchapụ ndị nile bi nꞌime ha.


NKPUGHE 9:6
Nꞌime ụbọchị ndị ahụ ọtụtụ mmadụ ga-achọ iji aka ha gbuo onwe ha ma ha agaghị enwe ike mee ya. Agụụ ịnwụ ọnwụ ga-agụ ha, ma ọnwụ ga-esi nꞌebe ha nọ wezụga onwe ya.


NKPUGHE 9:19
Ike e nyere ha iji gbuo ndị mmadụ adịghị nanị nꞌọnụ ha, kama ọ dịkwa nꞌọdụdụ ha. Nꞌihi na ọdụdụ ha dị ka agwọ. O nwere isi nke ha ji ata ndị mmadụ, wetara ha ọnwụ.


NKPUGHE 9:20
Ma ndị mmadụ ahụ nile e mere ka ha dịrị ndụ, ndị ọnwụ a na ihuju anya ndị a na-adakwasịghị, mechiri obi ha, jụ ịkpọ isi ala nye Chineke. Ha jụrụ ịkwụsị ife mmụọ ọjọọ ofufe. Ha jụkwara ịkwụsị ife arụsị ha nile nke ha ji ọlaedo na ọlaọcha na igwe na nkume na osisi kpụọ. Chi ndị a nwere anya ma ha adịghị ahụ ụzọ, nke nwere ụkwụ, ma ha adịghị eje ije.


NKPUGHE 12:11
Ha lụgburu ya nꞌagha site nꞌọbara Nwa atụrụ ahụ na site nꞌama ha, nꞌihi na ha ahụghị ndụ ha nꞌanya karịa, kama ha tọgbọrọ ndụ ha kwere ịnwụ ọnwụ nꞌihi ya.


NKPUGHE 13:14
Ọ na-arụ ọrụ ịtụnanya a mgbe ọ bụla anụ ọhia nke mbụ nọ na-ele ya anya. Ọ na-arụkwa ọrụ ndị a iji ya iduhie mmadụ nile nọ nꞌebe nile. O nyekwara iwu ka ndị nile bi nꞌụwa kpụọ ihe yiri anụ ọhia nke mbụ ahụ nwere ọnya gaara ewetara ya ọnwụ nꞌotu isi ya, bụ anụ ọhia e mekwara ka ọnya ya laa.


NKPUGHE 14:12
Ka nke a bụrụ ihe ịgba ume nye ndị Chineke, ime ha ka ha nwee ntachi obi nꞌọnwụnwa na nsogbu nile, nꞌihi na ha bụ ndị nsọ ya, ndị na-eguzosi ike bụrụ ndị na-erube isi nꞌiwu ya, na nꞌokwukwe ha nꞌime Jisọs ruo ọgwụgwụ ihe nile.”


NKPUGHE 18:3
Nꞌihi na mba nile esorola ya ṅụọ site na mmanya ọnụma ahụ na-eweta ọnwụ, nke e mere ka ọ bịakwasị ya nꞌihi ịkwa iko ya. Ndị ọchịchị nile nke ụwa esorola nwanyị a nwekọọ obi ụtọ. Ndị na-azụ ahịa nꞌụwa aghọọkwala ndị ọgaranya site nꞌịba ụba nke nwanyị a.”


NKPUGHE 18:8
Ebe okwu dị otu a si ya nꞌọnụ pụta, iru uju nke ọnwụ na-eweta, ya na obi ọjọọ, na ọnwụ ga-abịakwasị ya nꞌotu ụbọchị. A ga-eji ọkụ rechapụ ya, nꞌihi na Onyenwe anyị, onye na-ekpe ya ikpe, bụ onye pụrụ ime ihe nile.”


NKPUGHE 20:2
Mmụọ ozi a jidere agwọ ochie ahụ, bụ agwọ ochie ahụ aha ya bụkwa Onye ọnwụnwa na Ekwensu. O ji mkpọrọ igwe kee ya agbụ. Ọ ga-anọkwa nꞌọnọdụ a otu puku afọ.


NKPUGHE 20:4
Mgbe ahụ ahụkwara m ocheeze, hụkwa ndị nọ nꞌelu ya. Ha bụ ndị e nyere ike ikpe ikpe. Ahụkwara m mkpụrụ obi ndị ahụ e bipụrụ isi nꞌihi ịgba ama banyere Jisọs na nꞌihi ikwusa okwu Chineke, na ndị ahụ e bipụrụ isi nꞌihi na ha akpọghị isi ala nye anụ ọhịa ahụ na oyiyi ya a tụrụ atụ, ma ọ bụ kwere ka a kaa ha akara ya nꞌegedege ihu ha, ma ọ bụ nꞌaka ha. Ha esitela nꞌọnwụ ghọọ ndị dị ndụ ọzọ, sorokwa Kraịst ugbu a na-achị isi otu puku afọ.


NKPUGHE 20:5
Nke a bụ mbilite nꞌọnwụ nke mbụ. Ndị fọdụrụ nꞌetiti ndị nwụrụ anwụ esoghị bilite nꞌọnwụ nꞌoge a, kama ha ga-anọ nꞌọnọdụ ọnwụ ha tutuu ruo mgbe puku afọ gafesịrị.


NKPUGHE 20:6
Ndị a gọziri agọzi na ndị dị nsọ bụ ndị ahụ ketara oke na mbilite nꞌọnwụ nke mbụ ahụ, nꞌihi na ụjọ ọnwụ nke ugboro abụọ adịghị atụ ha, nꞌihi na ha ga-abụ ndị nchụaja Chineke na nke Kraịst, sorokwa ya chịa achịa puku afọ.


NKPUGHE 20:13
Oke osimiri nile nyeghachiri ndị nile nwụrụ anwụ nọ nꞌime ha. Otu a kwa ọnwụ na ala mmụọ nyeghachikwara ndị nwụrụ anwụ dị nime ha. E kpekwara onye ọ bụla ikpe dị ka ọrụ ya si dị.


NKPUGHE 20:14
Emesịa, a tụnyere ọnwụ na ọkụ ala mmụọ nꞌime ọdọ ọkụ ahụ. Nke a bụ ọnwụ nke ugboro abụọ.


NKPUGHE 21:4
Ọ ga-ehichapụ anya mmiri nile dị nꞌanya ha. Ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ. Ọ bụladị iru uju na ịkwa akwa na ahụhụ agaghị adịkwa. Ihe ndị a nile agabigala ruo mgbe ebighị ebi.”


Igbo Bible 1988
No Data