1 |
Ka ihu-n'anya-unu n'ebe umu-nna-unu nọ nādigide. |
2 |
Unu echezọla ile ndi-ọbìa nke-ọma: n'ihi na ufọdu esitewo na nka le ndi-mọ-ozi ọbìa nāmaghi ama. |
3 |
Nēchetanu ndi nọ n'ab͕u, dika ndi ekekọworo unu na ha n'ab͕u; nēchetanu ndi anēmejọ, dika ndi unu onwe-unu nọ kwa n'aru. |
4 |
Ka ilu-di-na-nwunye buru ihe anāsọpuru n'etiti unu nile, ka ihe-ndina-unu buru kwa ihe adighi-emeru emeru: n'ihi na Chineke gēkpe ndi nākwa iko ikpé, ha na ndi nākwa iko, bú ndikom nwere nwunye na ndinyom nwere di. |
5 |
Ka ọchichọ-obi-unu ghara idi n'ihu-n'anya ego; ka afọ ju unu n'ihe unu nwere ub͕u a: n'ihi na Ya onwe-ya ekwuwo, si, M'gaghi-ara gi aka ma-ọli, M'gaghi-arapu kwa gi ma-ọli. |
6 |
Ya mere ayi were obi-ike si, Onye-nwe-ayi bu onye nēyerem aka; Gini ka madu gēmem? |
7 |
Nēchetanu ndi-isi-unu, bú madu ndi gwara unu okwu Chineke; nēkiri-kwa-nu ọpupu nke ibi-obi-ha, nēṅomi-kwa-nu okwukwe-ha. |
8 |
Jisus Kraist di otù aka ahu nnyahu na ta, ma rukwa mb͕e nile ebighi-ebi. |
9 |
Unu ekwela ka ewere ozizí di iche iche nke si kwa n'ebe ọzọ puta duhie unu: n'ihi na ọ di nma ka ewere amara me ka obi-unu guzosie ike; ka aghara iwere ihe-oriri, nke ọ dighi mb͕e ha bara ndi jeghariri nime ha urù. |
10 |
Ayi nwere ebe-ichu-àjà, nke ndi nēkpe ekpere n'ulo-ikwū Chineke nēnweghi ike iri ihe si nime ya puta. |
11 |
N'ihi na ozu anu nile nke anēwebata ọbara-ha n'ebe nsọ site n'aka onye-isi-nchu-àjà dika àjà achuru bayere nmehie, anērechapu ozu ahu ọku n'azu ọmuma-ulo-ikwū. |
12 |
N'ihi nka Jisus, ka O we site n'ọbara nke Ya onwe-ya do ndi nke Ya nsọ, Ọ hu-kwa-ra ahuhu n'azu ọnu-uzọ-ama nke obodo. |
13 |
Ya mere, ka ayi pukuru Ya n'azu ọmuma-ulo-ikwū, nēbu ita-uta-Ya. |
14 |
N'ihi na ayi enweghi obodo n'ebe a nke nādigide, kama ayi nāchọ obodo ahu nke gaje ibia. |
15 |
Ya mere, ka ayi site n'aka-Ya nāchu àjà, bú otuto, nye Chineke mb͕e nile, nke ahu bu, nkpuru eb͕ub͕ere-ọnu nke nēkwuputa nye aha-Ya. |
16 |
Ma unu echezọla ime ihe di nma na ime ka unu na ndi ọzọ nwekọ ihe-unu: n'ihi na àjà di otú a nātọ Chineke ezi utọ. |
17 |
Nēkweyenu ndi-isi-unu, nēdo-kwa-nu onwe-unu n'okpuru ha: n'ihi na ndi ahu nāmu anya n'ihi nkpuru-obi-unu, dika ndi gāza ajuju bayere unu: ka ha we were ọṅù me nka, ghara isu udè: n'ihi na nka gābu ihe nābaghi unu urù. |
18 |
Nēkpenu ekpere bayere ayi: n'ihi na emere ka ayi kweye na ayi nwere akọ-na-uche ọma, ebe ayi nāchọ ibi obi nke-ọma n'ihe nile. |
19 |
Ma anamariọbiga unu ókè kari ime nka, ka ewe werem nyeghachi unu ọsọsọ kari. |
20 |
Ma Chineke nke udo, Onye were ọbara nke ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi ahu si na ndi nwuru anwu kughachi oké Onye-ọzùzù-aturu nke aturu-Ya, bú Onye- nwe-ayi Jisus, |
21 |
Ya me ka unu zue okè n'ezi ihe nile ọ bula ime ihe Ọ nāchọ, nēme nime ayi ihe nātọ ezi utọ n'iru Ya, site n'aka Jisus Kraist; Onye otuto nile diri rue mb͕e nile ebighi-ebi. Amen. |
22 |
Ma ariọm unu, umu-nnam, nānagidenu okwu aririọ a: n'ihi na anamewere okwu ole-na-ole degara unu akwukwọ-ozi. |
23 |
Maranu na arapuwo nwa-nna-ayi Timọti ka ọ la; ọ buru kwa na ọ gābia na mb͕e ntà, mu na Ya gāhu unu anya. |
24 |
Kelenu ndi-isi-unu nile na ndi nsọ nile. Ndi Itali nēkele unu. |
25 |
Ka amara diyere unu nile. Amen.
|
Igbo Bible 2006 |
© Bible Society of Nigeria © 1906, 2006 |
|
|
|
|
|
|
|
|
|
|
HIBRU 13:1 |
HIBRU 13:2 |
HIBRU 13:3 |
HIBRU 13:4 |
HIBRU 13:5 |
HIBRU 13:6 |
HIBRU 13:7 |
HIBRU 13:8 |
HIBRU 13:9 |
HIBRU 13:10 |
HIBRU 13:11 |
HIBRU 13:12 |
HIBRU 13:13 |
HIBRU 13:14 |
HIBRU 13:15 |
HIBRU 13:16 |
HIBRU 13:17 |
HIBRU 13:18 |
HIBRU 13:19 |
HIBRU 13:20 |
HIBRU 13:21 |
HIBRU 13:22 |
HIBRU 13:23 |
HIBRU 13:24 |
HIBRU 13:25 |
|
|
|
|
|
|
HIBRU 1 / HI 1 |
HIBRU 2 / HI 2 |
HIBRU 3 / HI 3 |
HIBRU 4 / HI 4 |
HIBRU 5 / HI 5 |
HIBRU 6 / HI 6 |
HIBRU 7 / HI 7 |
HIBRU 8 / HI 8 |
HIBRU 9 / HI 9 |
HIBRU 10 / HI 10 |
HIBRU 11 / HI 11 |
HIBRU 12 / HI 12 |
HIBRU 13 / HI 13 |