1 |
Ya mere, ọ buru na unu soro Kraist-ayi bilikọ, nāchọnu ihe di n'elu, ebe Kraist-ayi nọ, nānọdu n'aka-nri Chineke. |
2 |
Tukwasinu uche n'ihe di n'elu, ọ bughi n'ihe di n'elu uwa. |
3 |
N'ihi na unu nwuru anwu, ezowo kwa ndu-unu n'ebe Kraist-ayi nọ nime Chineke. |
4 |
Mb͕e ọ bula agēme ka Kraist-ayi puta ìhè, Onye bu ndu-ayi, mb͕e ahu ka agēme kwa ka unu onwe-unu so Ya puta ìhè n'ebube. |
5 |
Ya mere, menu ka ihe nile di unu n'aru nke di n'elu uwa nwua; ikwa-iko, adighi-ọcha, ọchichọ ọjọ, agu ihe ọjọ, na anya-uku ahu, n'ihi na nka bu ikpere arusi; |
6 |
ọ bu kwa n'ihi ihe ndia ka iwe Chineke nābiakwasi umu nke ekweyeghi-ekweye; |
7 |
nke unu onwe-unu jeghariri nime ha n'oge gara aga, mb͕e unu nādi ndu nime ihe ndia. |
8 |
Ma ub͕u a unu onwe-unu, tupu-kwa-nu ihe ndia nile; bú iwe, ọnuma, obi ọjọ, nkwulu, ikwu okwu ihere nēsi n'ọnu-unu puta |
9 |
unu ekwula okwu-ugha gwarita ibe-unu; ebe unu yipuchasiworo madu ochie ahu, ya na omume-ya nile, |
10 |
yikwasi kwa madu ọhu ahu, nke anēme ya ka ọ di ọhu rue na nmazu dika onyinyo nke Onye kère ya si di: |
11 |
ebe onye-Grik na onye-Ju, obibì-úgwù na ebìghi-úgwù, onye nāsu asusu ọzọ, onye Sitia, orù, onye nwere onwe-ya, nāpughi idi: ma Kraist bu ihe nile, di kwa nime madu nile. |
12 |
Ya mere dika ndi Chineke rọputara, ndi di nsọ ndi ahuwo-kwa-ra n'anya, yikwasinu obi ebere, obi-ọma, obi di ume-ala, idi-nwayọ, ogologo-ntachi-obi; |
13 |
nānagideritanu ibe-unu, were-kwa-nu amara b͕aghara onwe-unu, asi na onye ọ bula nwere ihe ita onye ọ bula uta; ọbuná dika Onye-nwe-ayi were amara b͕aghara unu, unu onwe-unu me kwa otú a: |
14 |
ma n'elu ihe ndia nile yikwasinu ihu-n'anya, nke bu ihe-nkekọ nke izu-okè. |
15 |
Ka udo nke Kraist nēkpezi kwa okwu n'obi-unu, nke akpọbata-kwa-ra unu nime ya n'otù aru; buru-kwa-nu ndi nēkele ekele. |
16 |
Kwenu ka okwu Kraist were àkù-ya nile biri nime unu n'amam-ihe nile; werenu abù ọma na ukwe na abù nke Mọ Nsọ nēzírita onwe-unu ihe, nādurita kwa onwe-unu ọdu, nime amara enyere unu nābùnu abù nime obi-unu nye Chineke. |
17 |
Ihe nile ọ bula unu nēme kwa, n'okwu ma-ọbu n'ọlu, nēmenu ha nile n'aha Onye-nwe-ayi Jisus, nēkele Chineke, bú Nna-ayi, site n'aka-Ya. |
18 |
Ndi bu nwunye, nēdonu onwe-unu n'okpuru di-unu, dika ọ nēkwesi unu nime Onye-nwe-ayi. |
19 |
Ndi bu di, hunu nwunye-unu n'anya, unu enwe-kwa-la obi ilu n'ebe ha nọ. |
20 |
Umu, nāṅanu nti okwu ndi muru unu n'ihe nile, n'ihi na nka bu ihe nātọ ezi utọ nime Onye-nwe-ayi. |
21 |
Ndi bu nna, akpasula umu-unu iwe, ka obi ghara ifù ha. |
22 |
Ndi-orù, nāṅanu nti okwu ndi bu ndi-nwe-unu n'uzọ anu-aru n'ihe nile; ghara iwere ibu-orù-n'anya nāṅa, dika ndi nēme otú ọ gātọ madu utọ, kama n'afọ-ofufo, nātu egwu Onye-nwe-ayi: |
23 |
ihe ọ bula unu nēme, nālunu ọlu site na nkpuru-obi-unu, dika unu nāluru Onye-nwe-ayi ọlu, ọ bughi kwa madu; |
24 |
ebe unu matara na ọ bu n'aka Onye-nwe-ayi ka unu gānata ihe-nnyeghachi-unu, bú ihe-nketa ahu: unu bu orù nke Onye-nwe-ayi Kraist. |
25 |
N'ihi na onye nēme ajọ omume gānaghachi ajọ omume ahu o mere: ile-madu-anya-n'iru adighi kwa.
|
Igbo Bible 2006 |
© Bible Society of Nigeria © 1906, 2006 |
|
|
|
|
|
|
|
|
|
|
KỌLỌSI 3:1 |
KỌLỌSI 3:2 |
KỌLỌSI 3:3 |
KỌLỌSI 3:4 |
KỌLỌSI 3:5 |
KỌLỌSI 3:6 |
KỌLỌSI 3:7 |
KỌLỌSI 3:8 |
KỌLỌSI 3:9 |
KỌLỌSI 3:10 |
KỌLỌSI 3:11 |
KỌLỌSI 3:12 |
KỌLỌSI 3:13 |
KỌLỌSI 3:14 |
KỌLỌSI 3:15 |
KỌLỌSI 3:16 |
KỌLỌSI 3:17 |
KỌLỌSI 3:18 |
KỌLỌSI 3:19 |
KỌLỌSI 3:20 |
KỌLỌSI 3:21 |
KỌLỌSI 3:22 |
KỌLỌSI 3:23 |
KỌLỌSI 3:24 |
KỌLỌSI 3:25 |
|
|
|
|
|
|
KỌLỌSI 1 / KỌL 1 |
KỌLỌSI 2 / KỌL 2 |
KỌLỌSI 3 / KỌL 3 |
KỌLỌSI 4 / KỌL 4 |