1 |
Ya mere burunu ndi nēṅomi Chineke. dika umu ahuru n'anya; |
2 |
nējeghari-kwa-nu n'ihu-n'anya, dika Kraist-ayi hu-kwa-ra unu n'anya, rara kwa Onwe-ya nye n'ihi ayi, dika ihe echere n'iru Chineke na àjà achuru nye Ya ka ọ buru isisì nke ihe ísì utọ. |
3 |
Ma ikwa-iko, na adighi-ọcha nile, ma-ọbu anya-uku, ka aghara ikpọ ọbuná aha-ya n'etiti unu, dika o kwesiri ndi nsọ; |
4 |
ma-ọbu ihe-ihere, ma-ọbu ikwu-okwu-nzuzu, ma-ọbu okwu nābaghi n'ihe, nke nēkwesigh: ma kama nke ahu ikele-ekele. |
5 |
N'ihi na nka ka unu matara nke-ọma, na ọ dighi onye ọ bula nke bu onye nākwa iko, ma ọbu onye n-adighi ọcha, ma-ọbu onye-anya-ukwu, nke isi-ya bu onye nēkpere arusi, nwere ihe-nketa n'ala-eze nke Kraist na Chineke. |
6 |
Unu ekwela ka onye ọ bula were okwu efu rafue unu: n'ihi na ọ bu n'ihi ihe ndia ka iwe Chineke nābiakwasi umu nke ekwenyeghi-ekwenye. |
7 |
Ya mere, unu esola ha kekọ ihe; |
8 |
n'ihi na unu buri ọchichiri n'oge gara aga, ma unu bu ìhè ub͕u a nime Onye-nwe-ayi: nējegharinu dika umu nke ìhè |
9 |
(n'ihi na nkpuru nke ìhè ahu di n'idi-nma na ezi omume na eziokwu nile), |
10 |
nānwaputa ihe di Onye-nwe-ayi ezi mma; |
11 |
unu esola ọlu nke ọchichiri nke nāmighi nkpuru nēnwekọ ihe, ma kama nke ahu nātu-kwa-nu ha nmehie-ha n'anya; |
12 |
n'ihi na ọ bu ihe-ihere ọbuná ikwu okwu bayere ihe nile ha nēme na nzuzo. |
13 |
Ma ìhè nēme ka ihe nile puta ìhè mb͕e anātu ha nmehie-ha n'anya: n'ihi na ihe ọ bula anēme ka ọ puta ìhè bu ìhè. |
14 |
N'ihi nka Ọ si, Teta, gi onye nāraru ura, Si kwa na ndi nwuru anwu bilie, Kraist ahu gāmukwasi kwa gi. |
15 |
Ya mere lezienu anya nke-ọma otú unu nējeghari, ọ dighi ka ndi nāmaghi ihe, kama dika ndi mara ihe; |
16 |
nāzuchapuru onwe-unu oge a nile, n'ihi na ubọchi ndia jọrọ njọ. |
17 |
N'ihi nka unu aghọla ndi nēnweghi uche, kama ghọtanu ihe bu ihe Onye-nwe-ayi nāchọ. |
18 |
Unu aṅubiga-kwa-la manya ókè, nke ndu ila-n'iyì di nime ya, kama juputanu na Mọ Nsọ; |
19 |
nēwere abù ọma na ukwe na abù nke Mọ Nsọ gwarita onwe-unu okwu, nēwere obi-unu bù abù kpọ kwa ubọ nye Onye-nwe-ayi; |
20 |
nēkele kwa Chineke, bú Nna, ekele mb͕e nile n'ihi ihe nile n'aha Onye-nwe-ayi Jisus Kraist; |
21 |
nēdorita onwe-unu n'okpuru ibe-unu nime egwu Kraist. |
22 |
Ndi bu nwunye, nēdonu onwe-unu n'okpuru di nke aka unu, dika n'okpuru Onye-nwe-ayi. |
23 |
N'ihi na di bu isi nke nwunye, dika Kraist-ayi bu kwa isi nzukọ-Ya, ebe Ya onwe-ya bu Onye-nzọputa nke aru. |
24 |
Ma dika anēdo nzukọ ahu n'okpuru Kraist-ayi, otú a ka ndi bu nwunye do kwa onwe-ha n'okpuru di-ha n'ihe nile ọ bula. |
25 |
Ndi bu di, hunu nwunye-unu n'anya, dika Kraist-ayi hu-kwa-ra nzukọ-Ya n'anya, rara kwa Onwe-ya nye n'ihi ya; |
26 |
ka O we do ya nsọ, mb͕e O mesiri ka ọ di ọcha site n'ọsisa miri n'okwu Chineke, |
27 |
ka Ya onwe-ya we che nzukọ ahu n'iru Onwe-ya dika ihe di ebube, nēnweghi ntupọ ma-ọbu iru-ndọli ma-ọbu ihe ọ bula n'ihe di otú a; kama ka o we di nsọ buru kwa ihe anāpughi ita uta. |
28 |
Otú a ndi bu di ji kwa ugwọ ihu nwunye nke aka ha n'anya dika ha huru aru nke onwe-ha n'anya. Onye nāhu nwunye nke aka ya n'anya nāhu onwe-ya n'anya: |
29 |
n'ihi na ọ dighi onye ọ bula kpọrọ aru onwe-ya asì mb͕e ọ bula; kama ọ nāzù ya nēlezi kwa ya anya nke-ọma, dika Kraist nēme kwa nzukọ-Ya; |
30 |
n'ihi na ayi bu ihe di n'aru-Ya. |
31 |
N'ihi nka ka nwoke gārapu nna-ya na nne-ya, rapara n'aru nwunye-ya; ha abua ewe ghọ otù anu-aru. |
32 |
Ihe-omimi a di uku: ma mu onwem nēkwu okwu bayere Kraist baye-kwa-ra nzukọ-Ya. |
33 |
Otú ọ di, unu onwe-unu n'otù n'otù hu kwa nwunye-unu n'anya, onye ọ bula ya hu nwunye nke aka ya n'anya, dika ọ nāhu onwe-ya n'anya; ka nwunye lezi kwa anya ka ọ nātu egwu di ya.
|
Igbo Bible 2006 |
© Bible Society of Nigeria © 1906, 2006 |
|
|
|
|
|
|
|
|
|
|
EFESỌS 5:1 |
EFESỌS 5:2 |
EFESỌS 5:3 |
EFESỌS 5:4 |
EFESỌS 5:5 |
EFESỌS 5:6 |
EFESỌS 5:7 |
EFESỌS 5:8 |
EFESỌS 5:9 |
EFESỌS 5:10 |
EFESỌS 5:11 |
EFESỌS 5:12 |
EFESỌS 5:13 |
EFESỌS 5:14 |
EFESỌS 5:15 |
EFESỌS 5:16 |
EFESỌS 5:17 |
EFESỌS 5:18 |
EFESỌS 5:19 |
EFESỌS 5:20 |
EFESỌS 5:21 |
EFESỌS 5:22 |
EFESỌS 5:23 |
EFESỌS 5:24 |
EFESỌS 5:25 |
EFESỌS 5:26 |
EFESỌS 5:27 |
EFESỌS 5:28 |
EFESỌS 5:29 |
EFESỌS 5:30 |
EFESỌS 5:31 |
EFESỌS 5:32 |
EFESỌS 5:33 |
|
|
|
|
|
|
EFESỌS 1 / EFE 1 |
EFESỌS 2 / EFE 2 |
EFESỌS 3 / EFE 3 |
EFESỌS 4 / EFE 4 |
EFESỌS 5 / EFE 5 |
EFESỌS 6 / EFE 6 |