1 |
Aghaghi m inya isi, ọ bu ezie na ọ baghi urù; ma m'gēche iru n'ọhù na ihe-nkpughe nke Onye-nwe-ayi. |
2 |
Amataram otù madu nime Kraist, arọ iri na anọ gara aga (ma ọ bu nime aru, amataghi m; ma-ọbu na ọ bughi nime aru, amataghm; Chineke matara), na eweliri madu di otú a na mberede rue elu-igwe nke-atọ. |
3 |
Amata-kwa-ram madu di otú a (ma ọ bu nime aru, ma-ọbu na aru anọghi ya, amataghi m; Chineke matara), |
4 |
na eweliri ya rigo na Paradais na mberede, o we nu okwu nke anāpughi ikwu, nke o nēzighi ezi n'iwu ka madu kwue ha. |
5 |
M'ganānya isi bayere onye di otú a: ma m'gaghi-anya isi bayere mu onwem, ma-ọbughi n'adighi-ikem nile. |
6 |
N'ihi na asi na agamachọ inya isi, m'gaghi-abu onye nēnweghi uche; n'ihi na m'gēkwu ezi-okwu: ma esepurum aka, ka onye ọ bula we ghara igu ihe bayerem kari ihe ọ huru na abum, ma-ọbu nke ọ nuru n'ọnum. |
7 |
N'ihi ọkika nke nkpughe ndia-n'ihi ya, ka ewe ghara iwelibigam ókè, enyerem ogwu n'anu-arum, bú mọ-ozi nke Setan, ka o we tiem aka, ka ewe ghara iwelibigam ókè. |
8 |
Ub͕ò atọ ka m'riọrọ Onye-nwe-ayi aririọ bayere ihe a, ka ọ pua n'arum. |
9 |
Ọ siwokwam, Amaram ezuworo gi: n'ihi na emewo ka ikem zu oké n'adighi-ike. Ya mere kama ihe ọzọ m'gēwere obi-utọ nile nya isi n'adighi-ikem nile, ka ike nke Kraist we ridakwasim, biri kwa nimem. |
10 |
N'ihi nka adighi-ike nile na imem ihe-ihere nile na nkpà nile na nsob͕u nile na oké nkpà nile n'ihi Kraist dim ezi nma: n'ihi na mb͕e ọ bula m'nādighi ike, mb͕e ahu ka m'nādi ike. |
11 |
Aghọwom onye nēnweghi uche: unu onwe-unu rugiderem; n'ihi na ugwọ unu ji mu onwem bu ime ka amaram: n'ihi na ọ dighi uzọ ọ bula m'nērughi ndi kachasi elu n'etiti ndi-ozi, asi na ọ bu ezie na abughi m ihe ọ bula. |
12 |
Ewere ihe-iriba-ama di iche iche na ọlu-ebube na ọlu di ike di iche iche luputa ihe-iriba-ama nile nke onye-ozi n'etiti unu ezie na ntachi-obi nile. |
13 |
N'ìhi na gini bu ihe ahu nke emere ka unu la ala nime ya kari nzukọ Kraist fọduru, ma-ọbughi na mu onwem abughi unu ibu arọ́? b͕agharanum ajọ omume a. |
14 |
Le, nka bu ub͕ò nke-atọ m'nọ dika onye edoziworo ibiakute unu; m'gaghi-abu kwa ibu arọ́: n'ihi na achọghi m ihe-unu, kama ọ bu unu onwe-unu: n'ihi na ọ bughi ọlu umu ikpadoro ndi muru ha ihe, kama ọ bu ọlu ndi muru umu ikpadoro umu-ha. |
15 |
Ma mu onwem gēwere obi-utọ nile mefu ihe m'nwere kwe kwa ka emefusia mu onwem n'ihi nkpuru-obi-unu. Ọ buru na anamahubiga unu n'anya ókè kari, ànāhum n'anya nke-ntà kari? |
16 |
Ma ka ọ di otú a, mu onwem eboghi unu ibu arọ́; kama, ebe m'bu onye-aghughọ, ejim itu-ntu nwude unu. |
17 |
Ọ̀ gābu na esim n'aka onye ọ bula n'etiti ndi m'ziteworo unu rib͕u unu? |
18 |
Ariọrọm Taitọs, ziga kwa nwa-nna-ayi ahu ka o so ya. Ọ̀ gābu na Taitọs rib͕uru unu n'uzọ ọ bula? àyi eweghi otù Mọ ahu jeghari? àyi esoghi n'otù ije-ukwu ahu? |
19 |
Unu nēchè oge nile a na ayi nāgọpu onwe-ayi nye unu. Ọ bu n'iru Chineke nime Kraist ka ayi nēkwu. Ma ihe nile bu n'ihi iwuli unu elu dika ulo, ndi m'huru n'anya. |
20 |
N'ihi na anamatu egwu, ma o nwere uzọ ọ bula, mb͕e m'gābia, m'gāhu unu ka unu nābughi aha madu ahu m'nāchọ, unu ahú kwa mu onwem ka m'nābu aha madu unu ṅachọghi; ma o nwere uzọ ọ bula esem-okwu, ekworo, ọnuma, ikpa-iche-iche, nkwutọ, ntakwu, nfuli-elu, aghara, gādi; |
21 |
ma o nwere uzọ ọ bula, mb͕e m'gābia ọzọ, Chinekem gēwedam n'ala n'iru unu, m'ru-kwa-ra ọtutu madu újú n'etiti ndi mehieworo n'oge gara aga, ha echègharighi kwa n'adighi-ọcha na ikwa-iko na agu ikwa-iko nke ha mere.
|
Igbo Bible 2006 |
© Bible Society of Nigeria © 1906, 2006 |
|
|
|
|
|
|
|
|
|
|
2 KỌRINT 12:1 |
2 KỌRINT 12:2 |
2 KỌRINT 12:3 |
2 KỌRINT 12:4 |
2 KỌRINT 12:5 |
2 KỌRINT 12:6 |
2 KỌRINT 12:7 |
2 KỌRINT 12:8 |
2 KỌRINT 12:9 |
2 KỌRINT 12:10 |
2 KỌRINT 12:11 |
2 KỌRINT 12:12 |
2 KỌRINT 12:13 |
2 KỌRINT 12:14 |
2 KỌRINT 12:15 |
2 KỌRINT 12:16 |
2 KỌRINT 12:17 |
2 KỌRINT 12:18 |
2 KỌRINT 12:19 |
2 KỌRINT 12:20 |
2 KỌRINT 12:21 |
|
|
|
|
|
|
2 KỌRINT 1 / 2KỌR 1 |
2 KỌRINT 2 / 2KỌR 2 |
2 KỌRINT 3 / 2KỌR 3 |
2 KỌRINT 4 / 2KỌR 4 |
2 KỌRINT 5 / 2KỌR 5 |
2 KỌRINT 6 / 2KỌR 6 |
2 KỌRINT 7 / 2KỌR 7 |
2 KỌRINT 8 / 2KỌR 8 |
2 KỌRINT 9 / 2KỌR 9 |
2 KỌRINT 10 / 2KỌR 10 |
2 KỌRINT 11 / 2KỌR 11 |
2 KỌRINT 12 / 2KỌR 12 |
2 KỌRINT 13 / 2KỌR 13 |