1 |
Gini kwa ka onye-Ju nwebigara ókè? ma-ọbu ùrù gini ka ibì-úgwù bara? |
2 |
Ọ bara urù ri nne n'uzọ nile: mbu, na ewere okwu si n'ọnu Chineke puta nye ha n'aka na ntukwasi-obi. |
3 |
N'ihi na asi na ufọdu ekweghi, gini kwa? èkweghi-ekwe-ha gēme ka ikwesi-ntukwasi-obi nke Chineke ghara idi irè? |
4 |
Chineke ekwela: kama ka ọ puta ihè na Chineke bu Onye ezi-okwu, ma madu nile n'otù n'otù bu ndi-ugha; dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, Ka ewe gua Gi n'onye ezi omume n'okwu-Gi nile, Ka I we kpeb͕u kwa mb͕e anēkpe Gi ikpé. |
5 |
Ma ọ buru na ajọ omume-ayi eme ka ezi omume Chineke puta ìhè, gini ka ayi gēkwu? Chineke, Onye nēme ka iwe-Ya dakwasi ayi, Ọ̀ bu onye ajọ omume? (Anamekwu dika madu.) |
6 |
Chineke ekwela: n'ihi na Chineke gēsi kwa aṅa kpe uwa ikpé? |
7 |
Ma ọ buru na ezi-okwu nke Chineke babigara uba ókè n'iwetara Ya ebube site n'okwu-ugha nkem, gini mere anēkpe kwa mu onwem ikpé ọzọ dika onye-nmehie? |
8 |
gini me-kwa-ra ayi asighi, Ka ayi me ihe ọjọ, ka ezi ihe we puta? (dika anēkwulu ayi, dika ufọdu nēkwu kwa na ayi nāsi), ndi ikpé-ha ziri ezi. |
9 |
Gini kwa? àyi ka ha nma? É-è, ayi akaghi ha nma ma-ọli: n'ihi na ayi buru uzọ bo ndi-Ju bo kwa ndi-Grik ebubo, na ha nile nọ n'okpuru nmehie; |
10 |
dika edeworo ya n'akwukwọ nsọ, si, Ọ dighi onye bu onye ezi omume, ọ dighi otù onye ma-ọli; |
11 |
Ọ dighi onye nāghọta, Ọ dighi onye nāchọ Chineke; |
12 |
Ha nile ewezugawo onwe-ha, ha nile abaghi n'ihe n'otù; Ọ dighi onye nēme ihe ọma, ọ dighi ọbuná otù onye: |
13 |
Ílì ghere oghe ka akpiri-ha bu; Ha jiri ire-ha ghọ aghughọ: Edide aju-ala di n'okpuru eb͕ub͕ere-ọnu-ha: |
14 |
Ndi ọnu-ha juru n'ọb͕ub͕a-iyi na ihe-ilu: |
15 |
Ukwu-ha di ngwa iwusì ọbara; |
16 |
Nbibi na ihuju-anya di n'uzọ nile ha; |
17 |
Uzọ udo ka ha nāmaghi kwa: |
18 |
Egwù Chineke adighi n'anya-ha. |
19 |
Ma ayi matara na ka ha ra, bú ihe iwu Chineke nēkwu, ọ nāgwa ndi nọ n'okpuru iwu ahu; ka ewe kpuchita ọnu nile n'otù n'otù, ka ewe kwe na ikpé mara uwa nile n'ebe Chineke nọ: |
20 |
n'ihi na site n'ọlu nile nke iwu ọ dighi madu ọ bula agāgu n'onye ezi omume n'iru Ya: n'ihi na ọ bu n'aka iwu ka nmazu nke nmehie sitere. |
21 |
Ma ub͕u a emewo ka ezi omume Chineke puta ìhè nke nēguzo iche n'ebe iwu di, nke iwu ahu na ndi-amuma nāb͕ara ya àmà; |
22 |
ma ọ bu ezi omume Chineke, site n'okwukwe ekwere na Jisus Kraist, nke diri ndi nile kwere: n'ihi na ọ dighi ihe di iche; |
23 |
n'ihi na madu nile emehiewo, ha adighi-eru kwa otuto Chineke; |
24 |
anēwere kwa amara-Ya nāgu ha na ndi ezi omume n'onyinye efu site na nb͕aputa ahu nke di nime Kraist Jisus: |
25 |
Onye Chineke chere n'iru ọra madu ka Ọ buru ihe ijuru Ya obi, site n'okwukwe ekwere n'ọbara-Ya, igosi ezi omume-Ya, n'ihi nb͕aghara nmehie nile emehiereri n'oge gara aga, n'oge nnagide nke Chineke; |
26 |
ka O we gosi ezi omume-Ya n'oge di ub͕u a, ka m'kwuru: ka Ya onwe-ya we buru onye ezi omume, buru kwa onye nāgu onye ahu n'onye ezi omume, bú onye nọ n'okwukwe ekwere na Jisus. |
27 |
Òle ebe inya-isi-ayi di kwa? Emechibidowo ya n'èzi. Sìte n'aha iwu gini? ọ̀ bu nke ọlu? É-è: kama ọ bu site n'iwu nke okwukwe. |
28 |
Ya mere ayi guru na anāgu madu n'onye ezi omume site n'okwukwe, mb͕e ọ kālughi ọlu iwu. |
29 |
Ma-ọbu Chineke, Ọ̀ bu Chineke nke nání ndi-Ju? Ọ̀ bughi kwa Chineke nke ndi mba ọzọ? E, ọ bu kwa nke ndi mba ọzọ: |
30 |
asi na ọ bu ezie na Chineke bu otù, Onye gāgu ndi obibì-úgwù na ndi ezi omume site n'okwukwe, were kwa okwukwe ahu gua ndi ebìghi-úgwù na ndi ezi omume. |
31 |
Àyi nēsite kwa n'okwukwe-ayi me ka iwu ghara idi irè? Chineke ekwela: kama ayi nēme ka iwu guzo.
|
Igbo Bible 2006 |
© Bible Society of Nigeria © 1906, 2006 |
|
|
|
|
|
|
|
|
|
|
ROM 3:1 |
ROM 3:2 |
ROM 3:3 |
ROM 3:4 |
ROM 3:5 |
ROM 3:6 |
ROM 3:7 |
ROM 3:8 |
ROM 3:9 |
ROM 3:10 |
ROM 3:11 |
ROM 3:12 |
ROM 3:13 |
ROM 3:14 |
ROM 3:15 |
ROM 3:16 |
ROM 3:17 |
ROM 3:18 |
ROM 3:19 |
ROM 3:20 |
ROM 3:21 |
ROM 3:22 |
ROM 3:23 |
ROM 3:24 |
ROM 3:25 |
ROM 3:26 |
ROM 3:27 |
ROM 3:28 |
ROM 3:29 |
ROM 3:30 |
ROM 3:31 |
|
|
|
|
|
|
ROM 1 / ROM 1 |
ROM 2 / ROM 2 |
ROM 3 / ROM 3 |
ROM 4 / ROM 4 |
ROM 5 / ROM 5 |
ROM 6 / ROM 6 |
ROM 7 / ROM 7 |
ROM 8 / ROM 8 |
ROM 9 / ROM 9 |
ROM 10 / ROM 10 |
ROM 11 / ROM 11 |
ROM 12 / ROM 12 |
ROM 13 / ROM 13 |
ROM 14 / ROM 14 |
ROM 15 / ROM 15 |
ROM 16 / ROM 16 |