1 |
Ma ob͕ub͕u-ya di Sọl ezi nma. Oké nsob͕u we puta n'ubọchi ahu megide nzukọ Kraist di na Jerusalem; ha nile we b͕asasia n'ala Judia na Sameria dum, ma-ọbughi ndi-ozi. |
2 |
Ndikom ufọdu ndi nātu egwu Chineke we lìe Stifen, kwa-kwa-ra ya oké ákwá. |
3 |
Ma Sọl nēsob͕u nzukọ Kraist nke-uku, nābà n'ulo nile n'otù n'otù, ọ nādọkpu kwa ndikom na ndinyom we rara ha nye ka atubà ha n'ulo-nkpọrọ. |
4 |
Ya mere ndi b͕asara jeghariri nēzisa ozi ọma, bú okwu Chineke. |
5 |
Filip we rida n'obodo Sameria, kwusara ha Kraist-ayi. |
6 |
Ìgwè madu nile we were otù obi nāṅa nti ihe nile Filip nēkwu, mb͕e ha nuru, hu kwa ihe-iriba-ama ọ nēme. |
7 |
N'ihi na site n'aru ọtutu ndi nwere ndi-mọ nādighi ọcha ka mọ ahu putara, nēwere oké olu ti nkpu: eme-kwa-ra ka aru ọtutu madu di ike, bú ndi akuku-aru-ha nwuru anwu, na ndi dara ngwurọ. |
8 |
Oké ọṅù we di n'obodo ahu. |
9 |
Ma otù nwoke di, Saimon bu aha-ya, onye n'oge gara aga nēme mb͕asi n'obodo ahu, nēme kwa ka ibobo nwua mba Sameria n'aru, nāsi na ya onwe-ya bu onye uku: |
10 |
onye ha nile, site n'onye ntà rue onye uku nāṅa nti, si, Onye a bu ike ahu nke Chineke nke anākpọ Ike Uku. |
11 |
Ha we nāṅa ya nti, n'ihi na o wereri mb͕asi-ya nile me ka ibobo nwua ha n'aru n'oge di anya. |
12 |
Ma mb͕e ha kwere Filip ka o nēzisa ozi ọma bayere ala-eze Chineke na aha Jisus Kraist, ewe me ha baptism, ma ndikom ma ndinyom. |
13 |
Saimon onwe-ya we kwere kwa: mb͕e emesiri ya baptism, o we nọgidesi ike n'ebe Filip nọ; mb͕e ọ nāhu na anēme ihe-iriba-ama na oké ọlu di ike di iche iche, ibobo we nwua ya n'aru. |
14 |
Ma mb͕e ndi-ozi ndi nọ na Jerusalem nuru na Sameria anarawori okwu Chineke nke-ọma, ha zigara ha Pita na Jọn: |
15 |
ndi, mb͕e ha ridatara, ha kpere ekpere bayere ha, ka ha we nara Mọ Nsọ: |
16 |
n'ihi na ọ kādakwasighi n'isi onye ọ bula n'etiti ha: ọ bu nání na emere ha-ri baptism ibà n'aha Onye-nwe-ayi Jisus. |
17 |
Mb͕e ahu ha bikwasiri ha aka-ha n'isi, ha we nara Mọ Nsọ. |
18 |
Ma mb͕e Saimon huru na anēnye Mọ Nsọ site n'ibikwasi aka nke ndi-ozi, o chere ego n'iru ha, |
19 |
si, Nye-kwa-num ike a, ka, onye ọ bula m'gēbikwasi akam abua n'isi, ka o we nara Mọ Nsọ. |
20 |
Ma Pita siri ya, Ka ọla-ọcha-gi so gi la n'iyì, n'ihi na i chère na i gānata onyinye Chineke site n'ego. |
21 |
I nweghi òkè ma-ọbu ihe-nketa n'okwu a: n'ihi na obi-gi ezighi ezi n'iru Chineke. |
22 |
Ya mere chègharia n'obi ọjọ gi a, riọ Onye-nwe-ayi, ma eleghi anya agāb͕aghara gi èchìchè obi-gi. |
23 |
N'ihi na ahurum na i nọ n'òlùlù ilu na ab͕u nke ajọ omume. |
24 |
Saimon we za, si, Unu onwe-unu riọrọm Onye-nwe-ayi, ka ihe ọ bula nime ihe unu kwuworo ghara ibiakwasim. |
25 |
Ya mere, mb͕e ha dusiri ọdu kwu kwa okwu Onye-nwe-ayi, ha laghachiri na Jerusalem, nēzisa kwa ozi ọma nye ọtutu obodo ntà ndi Sameria. |
26 |
Ma mọ-ozi nke Onye-nwe-ayi gwara Filip okwu, si, Bilie, nāga n'akuku Ndida rue uzọ nke si na Jerusalem arida rue na Geza: uzọ ahu bu ọhia. |
27 |
O we bilie ga: ma le, otù nwoke nke Etiopia, bú onozi nke di ike nke-uku n'okpuru Kandesi, eze-nwanyi ndi Etiopia, onye emere onye-isi àkù-ya nile, onye biarari na Jerusalem ikpọ isi ala nye Chineke; |
28 |
o we nālaghachi, nānọdu kwa n'ub͕ọ-ya, nāgu kwa akwukwọ Aisaia onye-amuma. |
29 |
Mọ Nsọ we si Filip, Jekuru ub͕ọ-ala ahu, nọnyaba kwa ya nso. |
30 |
Filip we b͕akuru ya, we nu ya ka ọ nāgu akwukwọ Aisaia onye-amuma, o we si, Ì nāmata ihe i nāgu? |
31 |
Ọ si, É-è, n'ihi na #m'gēsi aṅa pu imata, ma ọ buru na ọ dighi onye gēdum? O we riọ Filip ka ọ rigota, ka ya na ya nọdu. |
32 |
Ma ibe ihe edeworo n'akwukwọ nsọ nke ọ nāgu bu nka, Esekpuru Ya, dika aturu, je ob͕ub͕u; Dika nwa-aturu da-kwa-ra ob͕i n'iru onye nākpacha ya aji, Otú a ka Ọ nādighi-asaghe ọnu-Ya: |
33 |
Ewepuru ikpé-Ya nime ọnọdu-Ya di ala: Ònye gākọ ọb͕ọ Ya? N'ihi na anēwepu ndu-Ya n'uwa. |
34 |
Onozi ahu we za Filip, si, Ariọm i, ònye ka onye-amuma nka nēkwu okwu a bayere? ọ̀ bu ya onwe-ya ma-ọbu onye ọzọ di iche? |
35 |
Filip we saghe ọnu-ya, zì ya ozi ọma Jisus, nāmalite site n'ihe a edeworo n'akwukwọ nsọ. |
36 |
Ma mb͕e ha nāga n'uzọ, ha biaruru otù miri; onozi ahu we si, Le, miri; gini nānapu imem baptism? |
37 |
Filip we si ya, Ọ buru na i ji obi-gi dum we kwere, agēme gi. O we za, si, Ekwerem na Jisus Kraist bu Ọkpara Chineke. |
38 |
O we kwue ka ub͕ọ-ala-ya guzo: ha abua we rida na miri, ma Filip ma onozi ahu; o we me ya baptism. |
39 |
Ma mb͕e ha siri na miri rigota, Mọ nke Onye-nwe-ayi wepuru Filip; onozi ahu ahughi kwa ya ọzọ, n'ihi na ọ nāga n'uzọ-ya nāṅuri ọṅu. |
40 |
Ma ahuru Filip n'Azotọs: mb͕e ọ nāgabiga ọ nēzisa kwa ozi ọma gwa ndi obodo ahu nile, rue mb͕e ọ biaruru Sisaria.
|
Igbo Bible 2006 |
© Bible Society of Nigeria © 1906, 2006 |
|
|
|
|
|
|
|
|
|
|
ỌLU OZI 8:1 |
ỌLU OZI 8:2 |
ỌLU OZI 8:3 |
ỌLU OZI 8:4 |
ỌLU OZI 8:5 |
ỌLU OZI 8:6 |
ỌLU OZI 8:7 |
ỌLU OZI 8:8 |
ỌLU OZI 8:9 |
ỌLU OZI 8:10 |
ỌLU OZI 8:11 |
ỌLU OZI 8:12 |
ỌLU OZI 8:13 |
ỌLU OZI 8:14 |
ỌLU OZI 8:15 |
ỌLU OZI 8:16 |
ỌLU OZI 8:17 |
ỌLU OZI 8:18 |
ỌLU OZI 8:19 |
ỌLU OZI 8:20 |
ỌLU OZI 8:21 |
ỌLU OZI 8:22 |
ỌLU OZI 8:23 |
ỌLU OZI 8:24 |
ỌLU OZI 8:25 |
ỌLU OZI 8:26 |
ỌLU OZI 8:27 |
ỌLU OZI 8:28 |
ỌLU OZI 8:29 |
ỌLU OZI 8:30 |
ỌLU OZI 8:31 |
ỌLU OZI 8:32 |
ỌLU OZI 8:33 |
ỌLU OZI 8:34 |
ỌLU OZI 8:35 |
ỌLU OZI 8:36 |
ỌLU OZI 8:37 |
ỌLU OZI 8:38 |
ỌLU OZI 8:39 |
ỌLU OZI 8:40 |
|
|
|
|
|
|
ỌLU OZI 1 / ỌLOZ 1 |
ỌLU OZI 2 / ỌLOZ 2 |
ỌLU OZI 3 / ỌLOZ 3 |
ỌLU OZI 4 / ỌLOZ 4 |
ỌLU OZI 5 / ỌLOZ 5 |
ỌLU OZI 6 / ỌLOZ 6 |
ỌLU OZI 7 / ỌLOZ 7 |
ỌLU OZI 8 / ỌLOZ 8 |
ỌLU OZI 9 / ỌLOZ 9 |
ỌLU OZI 10 / ỌLOZ 10 |
ỌLU OZI 11 / ỌLOZ 11 |
ỌLU OZI 12 / ỌLOZ 12 |
ỌLU OZI 13 / ỌLOZ 13 |
ỌLU OZI 14 / ỌLOZ 14 |
ỌLU OZI 15 / ỌLOZ 15 |
ỌLU OZI 16 / ỌLOZ 16 |
ỌLU OZI 17 / ỌLOZ 17 |
ỌLU OZI 18 / ỌLOZ 18 |
ỌLU OZI 19 / ỌLOZ 19 |
ỌLU OZI 20 / ỌLOZ 20 |
ỌLU OZI 21 / ỌLOZ 21 |
ỌLU OZI 22 / ỌLOZ 22 |
ỌLU OZI 23 / ỌLOZ 23 |
ỌLU OZI 24 / ỌLOZ 24 |
ỌLU OZI 25 / ỌLOZ 25 |
ỌLU OZI 26 / ỌLOZ 26 |
ỌLU OZI 27 / ỌLOZ 27 |
ỌLU OZI 28 / ỌLOZ 28 |