1 |
Madu ufọdu we si na Judia ridata we zí umu-nna nime Kraist ihe, si, Ọ buru na ebìghi unu úgwù dika ọme-n'ala nke Moses nyere si di, apughi izọputa unu. |
2 |
Ma mb͕e nkewa na ajuju nādighi ntà diri Pọl na Banabas imegide ha, ndi Kraist we dozie ka Pọl na Banabas, na ufọdu ndi ọzọ n'etiti ha, rigoro Jerusalem jekuru ndi-ozi na ndi-okenye bayere ajuju a. |
3 |
Ya mere, mb͕e nzukọ Kraist dupusiri ha n'ije-ha, ha gabigara n'etiti Finisia, gabiga kwa n'etiti Sameria, nākọ nchighari nke ndi mba ọzọ: ha nēme kwa ka oké ọṅù diri umu-nna nime Kraist nile. |
4 |
Mb͕e ha ruru Jerusalem, nzukọ Kraist na ndi-ozi na ndi-okenye we nara ha nke-ọma, ha we kọrọ ha ihe nile, ka ha ra, bú nke Chineke soro ha me. |
5 |
Ma ufọdu nime irọ-òtù ndi-Farisi ndi kwere na Jisus biliri, si, Aghaghi ibì ha úgwù, na inye ha iwu ka ha debe iwu Moses. |
6 |
Ndi-ozi na ndi-okenye we zukọ ile okwu a. |
7 |
Mb͕e ha juritarari onwe-ha ọtutu ajuju, Pita we bilie, si ha, Umu-nnam, unu onwe-unu mara na site n'ubọchi mbu Chineke rọputara n'etiti unu, ka ndi mba ọzọ we site n'ọnum nu okwu nke ozi ọma ahu, kwere kwa. |
8 |
Chineke, Onye mara obi madu, we b͕ara ha àmà, ebe O nyere ha Mọ Nsọ, dika Ọ nye-kwa-ra ayi onwe-ayi; |
9 |
ọ dighi kwa ókè Ọ kpara n'ab͕ata ayi na ha, ebe O mere ka obi-ha di ọcha site n'okwukwe. |
10 |
Ya mere, ub͕u a, gini mere unu nānwa Chineke, n'ikoye yoke n'olu ndi nēso uzọ Jisus, nke ma nna-ayi-hà ma ayi onwe-ayi nēnweghi ike ibūru? |
11 |
Kama ayi kewere na agāzọputa ayi site n'amara Onye-nwe-ayi Jisus, n'otù aka ahu dika ha onwe-ha. |
12 |
Ọra ha nile we kpuchie ọnu-ha; ha we nuru okwu Banabas na Pọl ka ha nakọ akukọ ihe-iriba-ama na ọlu-ebube nile, ka ha ra, bú nke Chineke mere n'etiti ndi mba ọzọ site n'aka-ha. |
13 |
Mb͕e ha kpuchiri ọnu-ha, Jemes we za, si, Umu-nnam, nurunu olum: |
14 |
Simeon kọrọ otú Chineke buru uzọ leta ndi mba ọzọ, isi n'etiti ha weputara aha-Ya otù ndi. |
15 |
Nka na okwu ndi-amuma nwe-kwa-ra otù olu; dika edeworo n'akwukwọ nsọ, si, |
16 |
Mb͕e ihe ndia gasiri M'gālaghchi, M'gāma kwa ulo-ikwū nke Devid ọzọ, nke daworo ada; Ọ bu kwa ebe-ya nile akwaturu akwatu ka M'gēwu ọzọ, M'gēme kwa ka o guzozie ọzọ: |
17 |
Ka ndi fọduru n'etiti madu we chọ Onye-nwe-ayi, Ha na mba nile, ndi aguru aham, |
18 |
Ka Onye-nwe-ayi kwuru, Onye nēme ka amara ihe ndia site na nmalite oge a. |
19 |
N'ihi nka uche nke mu onwem bu, ka ayi ghara isob͕u ndi si n'etiti ndi mba ọzọ chigharikute Chineke: |
20 |
kama ka ayi zigara ha akwukwọ-ozi, ka ha rapu ihe ruru árú nke arusi nile, na ikwa-iko, na anu anyab͕uru anyab͕u, na ọbara. |
21 |
N'ihi na Moses site n'ọb͕ọ mbu nile nwere n'obodo dum ndi nēkwusa ya, ebe anāgu ya n'ulo-nzukọ nile ubọchi-izu-ike dum. |
22 |
Mb͕e ahu ọ di ndi-ozi na ndi-okenye nma, ha na nzukọ Kraist dum, irọputa ndikom ufọdu nime ha, na iziga ha n'Antiọk, ha na Pọl na Banabas; bú Judas anākpọ Basabas, na Sailas, ndikom bu ndi-isi n'etiti umu-nna nime Kraist: |
23 |
ha site-kwa-ra n'aka-ha de akwukwọ, si, Ndi-ozi na umu-nna-unu, bú ndi-okenye, nēdegara umu-nna-ayi akwukwọ, bú ndi sitere na ndi mba ọzọ, ndi bi n'Antiọk na Siria na Silisia, ayi nēkele unu: |
24 |
Ebe ayi nuru na ufọdu ndi siri n'etiti ayi pua were okwu me ka obi lọ unu miri, nēmebi nkpuru-obi-unu; bú ndi ayi nēnyeghi ihe ọ bula n'iwu; |
25 |
ọ di ayi nma, ebe ayi biaworo nwe otù obi, irọputa ndikom na iwere ha zigara unu, ha na Banabas na Pọl, ndi ayi huru n'anya, |
26 |
ndi raraworo ndu-ha nye n'ihi aha Onye-nwe-ayi Jisus Kraist. |
27 |
Ya mere ayi ezitewo Judas na Sailas, ndi ha onwe-ha gākọ-kwa-ra unu otù ihe ndia n'okwu ọnu. |
28 |
N'ihi na ọ di Mọ Nsọ nma, di kwa ayi onwe-ayi nma, ka ayi ghara ibo unu ibu arọ́ kari ihe ndia di nkpà: |
29 |
ka unu rapu ihe nile achuru n'aja nye arusi, na ọbara, na anu anyab͕uru anyab͕u, na ikwa-iko; ọ buru na unu edebe onwe-unu ghara imetu ihe ndia aka, ọ gādiri unu nma. Jisienu ike. |
30 |
Ya mere, mb͕e ezipusiri ha, ha ridatara n'Antiọk; mb͕e ha mesiri ka ọra madu zukọ, ha nye ha akwukwọ-ozi ahu. |
31 |
Mb͕e ha gusiri ya, ha ṅuria n'ihi nkasi-obi di ya. |
32 |
Judas na Sailas, ebe ha onwe-ha bu kwa ndi-amuma, ha we were ọtutu okwu kasie umu-nna ahu obi, me kwa ka obi-ha guzosie ike. |
33 |
Mb͕e ha nọdusiri n'ebe ahu oge ufọdu, ewe si n'ebe umu-nna ahu nọ zilaga ha n'udo lakuru ndi ziputara ha-ri. |
34 |
Ma otú ọ di, ọ di Sailas nma ka ọ nọgide n'ebe ahu. |
35 |
Ma Pọl na Banabas nọgidere n'Antiọk, nēzí nēzisa kwa ozi ọma, bú okwu nke Onye-nwe-ayi, ha na ọtutu ndi ọzọ kwa. |
36 |
Mb͕e ubọchi ufọdu gasiri Pọl we si Banabas, Ka ayi jeghachi ub͕u a leta umu-nna-ayi n'obodo nile n'otù n'otù ebe ayi kwusara okwu Onye-nwe-ayi, ka ayi we le otú ha nēme. |
37 |
Banabas we zube ikuru kwa Jọn, onye anākpọ Mark, ka ya na ha yikọ je. |
38 |
Ma ọ dighi Pọl nma ka ha kuru onye ahu ka ya na ha yikọ je, bú onye si na Pamfilia rapu ha laghachi, ghara iso kwa ha je ọlu-ha. |
39 |
Oké iwe we puta n'etiti ha, nke mere ka ha kewa otù onye n'ebe ibe-ya nọ, Banabas we kuru Mark nye onwe-ya, we ba n'ub͕ọ je Saiprọs; |
40 |
ma Pọl rọputara Sailas, we pua, mb͕e umu-nna nime Kraist rarasiri ya nye n'amara Onye-nwe-ayi. |
41 |
O we gabiga nime Siria na Silisia, nēme ka nzukọ Kraist guzosie ike.
|
Igbo Bible 2006 |
© Bible Society of Nigeria © 1906, 2006 |
|
|
|
|
|
|
|
|
|
|
ỌLU OZI 15:1 |
ỌLU OZI 15:2 |
ỌLU OZI 15:3 |
ỌLU OZI 15:4 |
ỌLU OZI 15:5 |
ỌLU OZI 15:6 |
ỌLU OZI 15:7 |
ỌLU OZI 15:8 |
ỌLU OZI 15:9 |
ỌLU OZI 15:10 |
ỌLU OZI 15:11 |
ỌLU OZI 15:12 |
ỌLU OZI 15:13 |
ỌLU OZI 15:14 |
ỌLU OZI 15:15 |
ỌLU OZI 15:16 |
ỌLU OZI 15:17 |
ỌLU OZI 15:18 |
ỌLU OZI 15:19 |
ỌLU OZI 15:20 |
ỌLU OZI 15:21 |
ỌLU OZI 15:22 |
ỌLU OZI 15:23 |
ỌLU OZI 15:24 |
ỌLU OZI 15:25 |
ỌLU OZI 15:26 |
ỌLU OZI 15:27 |
ỌLU OZI 15:28 |
ỌLU OZI 15:29 |
ỌLU OZI 15:30 |
ỌLU OZI 15:31 |
ỌLU OZI 15:32 |
ỌLU OZI 15:33 |
ỌLU OZI 15:34 |
ỌLU OZI 15:35 |
ỌLU OZI 15:36 |
ỌLU OZI 15:37 |
ỌLU OZI 15:38 |
ỌLU OZI 15:39 |
ỌLU OZI 15:40 |
ỌLU OZI 15:41 |
|
|
|
|
|
|
ỌLU OZI 1 / ỌLOZ 1 |
ỌLU OZI 2 / ỌLOZ 2 |
ỌLU OZI 3 / ỌLOZ 3 |
ỌLU OZI 4 / ỌLOZ 4 |
ỌLU OZI 5 / ỌLOZ 5 |
ỌLU OZI 6 / ỌLOZ 6 |
ỌLU OZI 7 / ỌLOZ 7 |
ỌLU OZI 8 / ỌLOZ 8 |
ỌLU OZI 9 / ỌLOZ 9 |
ỌLU OZI 10 / ỌLOZ 10 |
ỌLU OZI 11 / ỌLOZ 11 |
ỌLU OZI 12 / ỌLOZ 12 |
ỌLU OZI 13 / ỌLOZ 13 |
ỌLU OZI 14 / ỌLOZ 14 |
ỌLU OZI 15 / ỌLOZ 15 |
ỌLU OZI 16 / ỌLOZ 16 |
ỌLU OZI 17 / ỌLOZ 17 |
ỌLU OZI 18 / ỌLOZ 18 |
ỌLU OZI 19 / ỌLOZ 19 |
ỌLU OZI 20 / ỌLOZ 20 |
ỌLU OZI 21 / ỌLOZ 21 |
ỌLU OZI 22 / ỌLOZ 22 |
ỌLU OZI 23 / ỌLOZ 23 |
ỌLU OZI 24 / ỌLOZ 24 |
ỌLU OZI 25 / ỌLOZ 25 |
ỌLU OZI 26 / ỌLOZ 26 |
ỌLU OZI 27 / ỌLOZ 27 |
ỌLU OZI 28 / ỌLOZ 28 |