1 |
Mbe ha nābiaru Jerusalem nso, rue Betfagi na Betani nso, n'uzọ ugwu Olive, o we ziga madu abua n'etiti ndi nēso uzọ-Ya, |
2 |
si ha, Jenu n'obodo ntà nke di na ncherita-iru unu: ngwa ngwa mb͕e unu nābà nime ya, unu gāhu nwa-inyinya-ibu elibeworo, nke madu ọ bula akānọkwasighi; tọpunu ya, sekputa ya. |
3 |
Ọ buru kwa na onye ọ bula si unu, Gini mere unu nēme nka? sinu, Ọ di Onye-nwe-ayi nkpà; ngwa ngwa Ọ gēzighachi ya n'ebe a ọzọ. |
4 |
Ha we je, hu nwa-inyinya-ibu elibere n'ọnu-uzọ n'èzí n'amá; ha we tọpu ya. |
5 |
Ufọdu nime ndi guzoro n'ebe ahu we si ha, Ùnu nēme gini, nātọpu nwa-inyinya-ibu ahu? |
6 |
Ha we gwa ha okwu dika Jisus kwuru: ha we rapu ha. |
7 |
Ha we sekputara Jisus nwa-inyinya-ibu ahu, wukwasi ya uwe-ha; O we nọkwasi ya. |
8 |
Ọtutu madu we tusa uwe-ha n'uzọ; ndi ọzọ akwukwọ osisi, nke ha b͕ubitara n'ubi. |
9 |
Ndi naga n'iru, na ndi nēso, nēti nkpu, si, Hosanna; Onye agọziri agọzi ka Onye ahu bu Nke nābia n'aha Onye-nwe-ayi: |
10 |
Ihe agọziri agọzi ka ala-eze bu nke nābia, ala-eze nke nna-ayi Devid: Hosanna n'ebe kachasi ihe nile elu. |
11 |
O we ba Jerusalem, n'ulo uku Chineke; mb͕e O lesiri ihe nile anya buruburu, ebe ọ bu mb͕e anyasi ub͕u a, O we pua je Betani, Ya na ndi-ozi iri na abua ahu. |
12 |
N'echi-ya, mb͕e ha putara na Betani, agu guru Ya. |
13 |
Mb͕e Ọ huru osisi fig n'ebe di anya nke nwere akwukwọ ndu, Ọ bia, ma ebe ọ di otú a Ọ gāhu ihe n'elu ya: ma mb͕e Ọ biaruru ya aru, Ọ hughi ihe ọ bula ma-ọbughi akwuwọ ndu: n'ihi na ọ bughi oge nkpuru fig. |
14 |
O we za, si ya, Onye ọ bula eri-kwa-la nkpuru ọzọ si n'elu gi puta ebighi-ebi. Ndi nēso uzọ-Ya we nu ya. |
15 |
Ha we bia rue Jerusalem: O we ba n'ulo uku Chineke, malite ichupu ndi nēre na ndi nāzu n'ulo uku Chineke, O we kpùe table nile nteke ndi nāb͕anwe ego iru, na oche nile nke ndi nēre nduru; |
16 |
O kweghi kwa ka onye ọ bula būru ihe gabiga n'etiti ulo uku Chineke. |
17 |
O we zí ihe, si ha, Èdeghi ya n'akwukwọ nsọ, si, Agākpọ ulom ulo ekpere mba nile? ma unu onwe-unu emewo ya ọb͕à ndi nāpunara madu ihe. |
18 |
Ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ we nu ya, ha we nāchọ uzọ ha gēsi la Ya n'iyì: n'ihi na ha nātu egwu Ya, n'ihi na ibobo ozizí-Ya nwuru ìgwè madu nile n'aru. |
19 |
Mb͕e ọ bula o ruru anyasi Ọ nēsi n'obodo apu. |
20 |
Mb͕e ha nāga n'ututu, ha we hu osisi fig ahu na ọ kpọnwururi site na nkpọrọgwu. |
21 |
Pita we cheta, si Ya, Rabai, le, osisi fig nke I buru ọnu akpọnwuwo. |
22 |
Jisus we za, si ha, Nwenu okwukwe Chineke. |
23 |
N'ezie asim unu, Onye ọ bula nke gāsi ugwu a, Ka ewelie gi, tubà gi nime oké osimiri; nke nāgaghi-enwe obi abua, kama o kwere na ihe ọ nēkwu nēme; ọ gādiri ya. |
24 |
Ya mere M'ji si unu, Ihe nile, ka ha ra, bú nke unu nēkpe n'ekpere riọ kwa, kwenu na unu anatawo ha, ha gādiri unu. |
25 |
Ọzọ, mb͕e ọ bula unu guzoro nēkpe ekpere, b͕agharanu, ma o buru na unu nwere ihe ọ bula megide onye ọ bula; ka Nna-unu Nke bi n'elu-igwe we b͕aghara kwa unu ndahie nile unu. |
26 |
Ma ọ buru na unu onwe-unu ab͕agharaghi, Nna-unu Nke bi n'elu-igwe agaghi-ab͕aghara unu ndahie nile unu. |
27 |
Ha we bia rue Jerusalem ọzọ: mb͕e Ọ nējeghari n'ulo uku Chineke, ndi-isi-nchu-àjà na ndi-ode-akwukwọ na ndi-okenye we biakute Ya; |
28 |
ha we si Ya, Ọ̀ bu n'aha ike gini ka I nēme ihe ndia? ma-ọbu ònye nyere Gi ike a ka I we me ihe ndia? |
29 |
Ma Jisus siri ha, M'gāju unu otù okwu, unu zakwam, emesia M'gāgwa unu aha ike M'ji eme ihe ndia. |
30 |
Baptism nke Jọn, ò sitere n'elu-igwe, ma-ọbu na ò sitere n'aka madu? zanum. |
31 |
Ha we kwurita n'etiti onwe-ha, si, Ọ buru na ayi asi, O sitere n'elu-igwe; Ọ gasi, N'ìhi gini kwa ka unu nējighi kwe ya? |
32 |
Ma àyi gāsi kwa, O sitere n'aka madu? ha nātu egwu ndi-Ju: n'ihi na madu nile guru Jọn na ọ bu onye-amuma n'ezie. |
33 |
Ha we za Jisus, si, Ayi amataghi. Jisus we si ha, Mu onwem agaghi-agwa kwa unu aha ike M'ji eme ihe ndia.
|
Igbo Bible 2006 |
© Bible Society of Nigeria © 1906, 2006 |
|
|
|
|
|
|
|
|
|
|
MAK 11:1 |
MAK 11:2 |
MAK 11:3 |
MAK 11:4 |
MAK 11:5 |
MAK 11:6 |
MAK 11:7 |
MAK 11:8 |
MAK 11:9 |
MAK 11:10 |
MAK 11:11 |
MAK 11:12 |
MAK 11:13 |
MAK 11:14 |
MAK 11:15 |
MAK 11:16 |
MAK 11:17 |
MAK 11:18 |
MAK 11:19 |
MAK 11:20 |
MAK 11:21 |
MAK 11:22 |
MAK 11:23 |
MAK 11:24 |
MAK 11:25 |
MAK 11:26 |
MAK 11:27 |
MAK 11:28 |
MAK 11:29 |
MAK 11:30 |
MAK 11:31 |
MAK 11:32 |
MAK 11:33 |
|
|
|
|
|
|
MAK 1 / MAK 1 |
MAK 2 / MAK 2 |
MAK 3 / MAK 3 |
MAK 4 / MAK 4 |
MAK 5 / MAK 5 |
MAK 6 / MAK 6 |
MAK 7 / MAK 7 |
MAK 8 / MAK 8 |
MAK 9 / MAK 9 |
MAK 10 / MAK 10 |
MAK 11 / MAK 11 |
MAK 12 / MAK 12 |
MAK 13 / MAK 13 |
MAK 14 / MAK 14 |
MAK 15 / MAK 15 |
MAK 16 / MAK 16 |