1 |
N'ubọchi ahu Jisus puru n'ulo, we nọdu n'usọ oké osimiri. |
2 |
Oké ìgwè madu we zukọ n'ebe Ọ nọ, ya mere Ọ batara n'ub͕ọ, nọdu ala; ìgwè madu ahu nile guzo-kwa-ra n'ótú. |
3 |
O we gwa ha ọtutu okwu n'ilu di iche iche, si, Le, ọgha-nkpuru puru ka ọ gha nkpuru; |
4 |
mb͕e ọ nāgha, ufọdu we da n'akuku uzọ, anu-ufe we bia tùturie ha: |
5 |
nkpuru ọzọ we da n'ebe nkume, ebe ha nēnweghi ájá ri nne: ngwa ngwa ha we púlite, n'ihi na ha enweghi ájá di omimi: |
6 |
ma mb͕e anyanwu wara, ha chanwua; ha we kpọnwua, n'ihi na ha enweghi nkpọrọgwu. |
7 |
Nkpuru ọzọ we da n'elu ogwu; ogwu ahu we tolite, kpab͕ue ha. |
8 |
Nkpuru ọzọ we da n'ala di nma, ha we nāmi nkpuru, otù ọgu ise, ọzọ ọgu atọ, ọzọ orú na iri. |
9 |
Onye nwere nti, ya nu. |
10 |
Ndi nēso uzọ-Ya we biakute Ya, si Ya, N'ìhi gini ka I nāgwa ha okwu n'ilu? |
11 |
O we za, si ha, Ọ bu unu ka enyeworo imara ihe-omimi ala-eze elu-igwe, ma enyeghi ndi ahu. |
12 |
N'ihi na onye ọ bula nke nwere, onye ahu ka agēnye, ọ gēnwebiga kwa ókè: ma onye ọ bula nke nēnweghi, ọbuná ihe o nwere ka agānapu ya. |
13 |
N'ihi nka ka M'nāgwa ha okwu n'ilu; n'ihi na ha adighi-ahu n'ọhuhu, ha adighi-anu kwa n'ọnunu, ha adighi-anuta kwa. |
14 |
Ma anēmezuru ha amuma nke Aisaia, nke si, N'ọnunu unu gānu, ma unu agaghi-anuta ma-ọli; N'ọhuhu unu gāhu kwa, ma unu agaghi-ahuta ma-ọli: |
15 |
N'ihi na obi ndi nka mara abuba, Nti-ha kpọchi-kwa-ra, Ha kpuchi-kwa-ra anya-ha; Ka ha ghara iwere anya-ha hu uzọ ma eleghi anya, Ghara kwa iwere nti-ha nu ihe, Ghara kwa iwere obi-ha ghọta, Ghara kwa ichighari, Ka M'ghara kwa ime ka aru di ha ike. |
16 |
Ma ngọzi nādiri anya-unu, n'ihi na ha nāhu uzọ; na nti-unu, n'ihi na ha nānu ihe. |
17 |
N'ihi na n'ezie asim unu, na agu guru ọtutu ndi-amuma na ndi ezi omume ihu ihe unu nāhu, ma ha ahughi ha; na inu ihe unu nānu, ma ha anughi ha. |
18 |
Ya mere, unu onwe-unu nu ilu nke ọgha-nkpuru ahu. |
19 |
Mb͕e onye ọ bula nuru okwu ala-eze elu-igwe, ma ọ ghọtaghi ya, ajọ onye ahu abia, punara ihe aghaworo n'obi-ya. Onye a bu nke aghara n'akuku uzọ. |
20 |
Onye agha-kwa-ra n'ebe nkume ahu, madu a bu onye nānu okwu ahu, ngwa ngwa o were ọṅù jide ya; |
21 |
ma o nweghi nkpọrọgwu nime onwe-ya, kama ọ nānọ nwa oge; ma mb͕e nkpab͕u ma-ọbu nsob͕u putara n'ihi okwu ahu, ngwa ngwa ọ ma n'ọnyà. |
22 |
Onye agha-kwa-ra n'etiti ogwu ahu, madu a bu onye nānu okwu ahu; ma ncheb͕u nke oge a na aghughọ nke àkù nākpab͕u okwu ahu, o we ghọ ihe nāmighi nkpuru. |
23 |
Onye agha-kwa-ra n'ala ahu di nma, madu a bu onye nānu okwu ahu, we ghọta ya; onye nāmi nkpuru n'ezie, miputa, otù ọgu ise, ọzọ ọgu atọ, ọzọ orú na iri. |
24 |
O were ilu ọzọ che n'iru ha, si, Ejiri ala-eze elu-igwe tuyere madu mb͕e ọ ghara nkpuru ọma n'ubi-ya: |
25 |
ma mb͕e madu nāraru ura, onye-iro-ya biara we gha kwa ata n'etiti ọka, we la. |
26 |
Ma mb͕e npute puru, we mia nkpuru, mb͕e ahu ata ahu puta-kwa-ra ìhè. |
27 |
Ndi-orù nna-nwe-ulo ahu we biakute ya, si ya, Onye-nwe-ayi, i ghaghi nkpuru ọma n'ubi-gi? òle ebe kwa ka o si nwe ata? |
28 |
Ọ si ha, Madu nke bu onye-iro mere nka. Ndi-orù-ya we si ya, Ì nāchọ kwa ka ayi je chikọputa ha? |
29 |
Ma ọ si, É-è; ka unu we ghara iropu ha na ọka ma eleghi anya, mb͕e unu nāchikọputa ata. |
30 |
Rapunu ha abua ka ha nābakọta uba rue owuwe-ihe-ubi: ma n'oge owuwe-ihe-ubi m'gāsi ndi nēwe ihe-ubi, Burunu uzọ chikọta ata ahu, ke kwa ha n'ùkwù ka unu rechapu ha ọku: ma kpokọtanu ọka ahu n'ọba nkem. |
31 |
O were ilu ọzọ che n'iru ha, si, Ala-eze elu-igwe yiri nkpuru mustard, nke madu were, gha n'ubi-ya: |
32 |
nke ọ bu ezie na ọ di ntà kari nkpuru nile; ma mb͕e ọ bara uba, o bùkari ihe nile anāku n'ubi, we ghọ osisi, nke mere ka anu-ufe nke elu-igwe bia nānọ n'alaka-ya. |
33 |
Ọ turu ha ilu ọzọ, si, Ala-eze elu-igwe yiri ihe nēko achicha, nke nwanyi were, zobe na mb͕é utu ọka atọ, rue mb͕e utu ọka ahu dum kosiri. |
34 |
Okwu nile ndia ka Jisus gwara ìgwè madu nile n'ilu; ma O jighi ilu Ọ dighi-agwa ha okwu ọ bula: |
35 |
ka okwu ekwuru site n'ọnu onye-amuma we mezu, si, M'gāsaghe ọnum n'itu ilu; M'gēkwuwa ihe ezoworo ezo site na ntọ-ala uwa. |
36 |
Mb͕e ahu Ọ rapuru ìgwè madu nile, we bà n'ulo-ha: ndi nēso uzọ-Ya we biakute Ya, si, Kọrọ ayi isi ilu ata di n'ubi ahu. |
37 |
O we za, si, Onye nāgha nkpuru ọma ahu bu Nwa nke madu; |
38 |
ubi ahu bu uwa; nkpuru ọma ahu, ndi ahu bu umu ala-eze elu-igwe; ata ahu bu umu ajọ onye ahu; |
39 |
onye-iro ahu nke ghara ha bu ekwensu: owuwe-ihe-ubi bu ọgwugwu oge a; ndi ahu nēwe ihe-ubi bu ndi-mọ-ozi. |
40 |
Ya mere dika anāchikọputa ata rechapu kwa ha n'ọku; otú a ka ọ gādi n'ọgwugwu oge a. |
41 |
Nwa nke madu gēzipu ndi-mọ-ozi-Ya, ha gāchikọputa n'ala-eze-Ya ihe nile nēme ka ama n'ọnyà, na ndi nēme ihe nēmebi iwu, |
42 |
ha gātubà kwa ha n'oké ọku ahu: n'ebe ahu ka ikwa-ákwá na ita-ikekere-ezé ahu gādi. |
43 |
Mb͕e ahu ka ndi ezi omume gēnwupu dika anyanwu n'ala-eze nke Nna-ha. Onye nwere nti, ya nu. |
44 |
Ala-eze elu-igwe yiri àkù ezoworo n'ubi; nke madu huru, zobe kwa; n'ọṅù-ya o we la, re ihe nile o nwere, ka ha ra, we zuta ubi ahu. |
45 |
Ọzọ kwa, ala-eze elu-igwe yiri onye-ahia nāchọ pearl ọma: |
46 |
ma mb͕e ọ huru otù pearl di oké ọnu-ahia, ọ je, re ihe nile o nwere, ka ha ra, we zuta ya. |
47 |
Ọzọ kwa, ala-eze elu-igwe yiri oké úb͕ú awuyere nime oké osimiri, nke kpokọta-kwa-ra ufọdu n'aha azù nile di iche iche: |
48 |
nke, mb͕e o juru, ha dọgotara ya n'ótú; ha we nọdu, chikọta azù di nma tiye nime ihe, ma ha tufuru nke nādighi nma. |
49 |
Otú a ka ọ gādi n'ọgwugwu oge a: ndi-mọ-ozi gāputa, kewaputa ndi bu ajọ madu n'etiti ndi ezi omume, |
50 |
ha gātubà kwa ha n'oké ọku ahu: n'ebe ahu ka ikwa-ákwá na ita-ikekere-ezé ahu gādi. |
51 |
Ùnu aghọtawo ihe ndia nile? Ha si Ya, E. |
52 |
O we si ha, N'ihi nka ode-akwukwọ ọ bula nke emere ka ọ buru onye nēso uzọ ala-eze elu-igwe, o yiri madu nke bu nna-nwe-ulo, onye nēsi n'àkù-ya atuputa ihe ọhu na ihe ochie. |
53 |
O rue, mb͕e Jisus tubìri ilu ndia, O si n'ebe ahu zọlie. |
54 |
O we bia n'ala nke aka Ya, nēzí ha ihe n'ulo-nzukọ-ha, nke mere ka ibobo nwua ha n'aru, ha we si, Òle ebe ka Nwoke a nwere amam-ihe a na ọlu ndia di ike? |
55 |
Nwoke a, Ọ̀ bughi Nwa onye-ọ̀kà-ayi? àdighi-akpọ nne-Ya Meri? nà umu-nne-Ya ndikom, Jemes, na Josef, na Saimon, na Judas? |
56 |
Na umu-nne-Ya ndinyom, hà nile anọghi n'etiti ayi? Òle ebe kwa Nwoke a nwere ihe ndia nile? |
57 |
Ewe me ka ha ma n'ọnyà n'aru Ya. Ma Jisus siri ha, Onye-amuma abughi onye anādighi-asọpuru, ma-ọbughi n'ala nke aka ya, na n'ulo nke aka ya. |
58 |
Ọ lughi kwa ọtutu ọlu di ike n'ebe ahu n'ihi ekweghi-ekwe-ha.
|
Igbo Bible 2006 |
© Bible Society of Nigeria © 1906, 2006 |
|
|
|
|
|
|
|
|
|
|
MATIU 13:1 |
MATIU 13:2 |
MATIU 13:3 |
MATIU 13:4 |
MATIU 13:5 |
MATIU 13:6 |
MATIU 13:7 |
MATIU 13:8 |
MATIU 13:9 |
MATIU 13:10 |
MATIU 13:11 |
MATIU 13:12 |
MATIU 13:13 |
MATIU 13:14 |
MATIU 13:15 |
MATIU 13:16 |
MATIU 13:17 |
MATIU 13:18 |
MATIU 13:19 |
MATIU 13:20 |
MATIU 13:21 |
MATIU 13:22 |
MATIU 13:23 |
MATIU 13:24 |
MATIU 13:25 |
MATIU 13:26 |
MATIU 13:27 |
MATIU 13:28 |
MATIU 13:29 |
MATIU 13:30 |
MATIU 13:31 |
MATIU 13:32 |
MATIU 13:33 |
MATIU 13:34 |
MATIU 13:35 |
MATIU 13:36 |
MATIU 13:37 |
MATIU 13:38 |
MATIU 13:39 |
MATIU 13:40 |
MATIU 13:41 |
MATIU 13:42 |
MATIU 13:43 |
MATIU 13:44 |
MATIU 13:45 |
MATIU 13:46 |
MATIU 13:47 |
MATIU 13:48 |
MATIU 13:49 |
MATIU 13:50 |
MATIU 13:51 |
MATIU 13:52 |
MATIU 13:53 |
MATIU 13:54 |
MATIU 13:55 |
MATIU 13:56 |
MATIU 13:57 |
MATIU 13:58 |
|
|
|
|
|
|
MATIU 1 / MAT 1 |
MATIU 2 / MAT 2 |
MATIU 3 / MAT 3 |
MATIU 4 / MAT 4 |
MATIU 5 / MAT 5 |
MATIU 6 / MAT 6 |
MATIU 7 / MAT 7 |
MATIU 8 / MAT 8 |
MATIU 9 / MAT 9 |
MATIU 10 / MAT 10 |
MATIU 11 / MAT 11 |
MATIU 12 / MAT 12 |
MATIU 13 / MAT 13 |
MATIU 14 / MAT 14 |
MATIU 15 / MAT 15 |
MATIU 16 / MAT 16 |
MATIU 17 / MAT 17 |
MATIU 18 / MAT 18 |
MATIU 19 / MAT 19 |
MATIU 20 / MAT 20 |
MATIU 21 / MAT 21 |
MATIU 22 / MAT 22 |
MATIU 23 / MAT 23 |
MATIU 24 / MAT 24 |
MATIU 25 / MAT 25 |
MATIU 26 / MAT 26 |
MATIU 27 / MAT 27 |
MATIU 28 / MAT 28 |