1 |
O we sim, Nwa nke madu, ihe ahu nke i nāhu, rie ya; rie akwukwọ-npiakọta ahu, je, gwa ulo Israel okwu. |
2 |
M'we saghepu ọnum, O we me ka m'rie akwukwọ-npiakọta ahu. |
3 |
O we sim, Nwa nke madu, me ka afọ-gi rie, ọ bu kwa ngiri-afọ-gi nile ka i gēmeju n'akwukwọ-npiakọta nka nke Mu onwem nēnye gi. M'we rie; o we di n'ọnum dika manu-aṅu n'utọ. |
4 |
O we sim, Nwa nke madu, je, ba n'ulo Israel, were okwum nile gwa ha. |
5 |
N'ihi na ọ bughi ijekuru ndi asusu-ha miri emi nke ire-ha di kwa arọ́ ka ezigaworo gi onwe-gi, ma ọ bu ijekuru ulo Israel; |
6 |
ọ bughi ijekuru ọtutu ndi asusu-ha miri emi nke ire-ha di kwa arọ́, ndi i dighi-anu okwu-ha. N'ezie, ọ buru na ọ bu ha ka M'zigara gi jekuru, ha onwe-ha gēge gi nti. |
7 |
Ma ulo Israel agaghi-ekwe ige gi nti; n'ihi na ha adighi-ekwe igem nti: n'ihi na ulo Israel nile bu ndi nwere egedege-iru siri ike, ọ bu kwa ndi obi-ha siri ike ka ha bu. |
8 |
Le, emewom iru-gi ka ọ di ike megide iru-ha, ọ bu kwa egedege-iru-gi ka M'meworo ka ọ di ike megide egedege-iru-ha. |
9 |
Dika nkume adamant nke di ike kari ọmu, otú a ka M'meworo egedege-iru-gi: atula egwu ha, atu-kwa-la ujọ iru-ha, n'ihi na ulo nnupu-isi ka ha bu. |
10 |
O we sim, Nwa nke madu, okwum nile nke M'gāgwa gi, nara ha n'obi-gi, nuru kwa ha na nti-gi abua. |
11 |
Je kwa, bakuru ndi emere ka ha je biri n'ala ọzọ, bakuru umu ndi-gi, gwa ha okwu, si ha, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri; ma ha gānu, ma ha gāghara. |
12 |
Mọ Chineke we buliem, m'we nu olu nke oké ùzù n'azum, si, Ihe agọziworo agọzi ka ebube Jehova bu site n'ọnọdu-Ya. |
13 |
M'we nu olu nke nkù nile nke ihe anọ ahu di ndu ka ha nēmeturita ibe-ha, na olu wheel nile nke di n'akuku ha, ọbuná olu nke oké ùzù. |
14 |
Mọ Chineke we buliem, bupum: m'we jegharia n'ilu obi, n'ọnuma nke mọm, ọzọ, aka Jehova nke di n'arum di ike. |
15 |
M'we biakute ndi ahu emere ka ha je biri n'ala ọzọ, na Tel-abib, bú ndi bi n'akuku osimiri Keba, m'we biarue ebe ha onwe-ha bi; m'we nọdu n'ebe ahu ubọchi asa n'anya o nējum n'etiti ha. |
16 |
O rue, n'ọgwugwu ubọchi asa, na okwu Jehova rurum nti, si, |
17 |
Nwa nke madu, Onye-nche ka M'doworo gi nye ulo Israel: i gānu kwa okwu site n'ọnum, dọ ha aka na nti site nam. |
18 |
Mb͕e M'nāsi onye nēmebi iwu, I ghaghi inwu; ma i dọghi ya aka na nti, i kwughi kwa okwu idọ onye nēmebi iwu aka na nti ka o si n'uzọ nmebi-iwu ya puta, ime ka ọ di ndu; onye ahu nke nēmebi iwu gānwu n'ajọ omume-ya; ma n'aka-gi ka M'gājuta ọbara-ya. |
19 |
Ma gi onwe-gi, mb͕e i gādọ onye nēmebi iwu aka na nti, ma o sighi na nmebi-iwu-ya na n'uzọ nmebi-iwu ya chigharia, onye ahu gānwu n'ajọ omume-ya; ma gi onwe-gi, nkpuru-obi-gi ka i naputaworo. |
20 |
Ọzọ, mb͕e onye ezi omume si n'ezi omume-ya chigharia, we me ajọ omume, M'we tiye ihe-isu-ngọngọ n'iru ya, onye ahu gānwu; n'ihi na i dọghi ya aka na nti, ọ bu na nmehie-ya ka ọ gānwu, agaghi-echeta kwa ezi omume-ya nile nke o meworo; ma n'aka-gi ka M'gājuta ọbara-ya. |
21 |
Ma gi onwe-gi, mb͕e i gādọ ya, bú onye ezi omume, aka na nti, ka onye ezi omume ghara imehie, onye ahu we ghara imehie, ọ ghaghi idi ndu, n'ihi na adọrọ ya aka na nti; ma gi onwe-gi, nkpuru-obi-gi ka i naputaworo. |
22 |
Aka Jehova we dim n'aru n'ebe ahu; O we sim, Bilie, pua, jerue ndagwurugwu, n'ebe ahu ka M'gākpayere gi uka. |
23 |
M'we bilie, pua, jerue ndagwurugwu ahu: ma, le, n'ebe ahu ka ebube Jehova nēguzo, dika ebube nke m'huru n'akuku osimiri Keba: m'we da kpue irum n'ala. |
24 |
Mọ Chineke we bata nimem, me ka m'guzo n'ukwum abua; O we kpayerem uka, sim, Bia, mechibido onwe-gi uzọ n'etiti ulo-gi. |
25 |
Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, le, ha gātukwasi gi udọ̀ n'aru, chiri ha ke gi ab͕u, i gaghi-apu kwa n'èzí n'etiti ha: |
26 |
M'gēme kwa ka ire-gi rapara n'okpo-ọnu-gi, i we ghọ ob͕i, ghara iburu ha onye nādọ aka na nti: n'ihi na ulo nnupu-isi ka ha bu. |
27 |
Ma mb͕e M'nākpayere gi uka, M'gēmeghe ọnu-gi, i we si ha, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Onye nānu anu, ya nu; onye nāghara aghara, ya ghara: n'ihi na ulo nnupu-isi ka ha bu.
|
Igbo Bible 2006 |
© Bible Society of Nigeria © 1906, 2006 |
|
|
|
|
|
|
|
|
|
|
EZIKIEL 3:1 |
EZIKIEL 3:2 |
EZIKIEL 3:3 |
EZIKIEL 3:4 |
EZIKIEL 3:5 |
EZIKIEL 3:6 |
EZIKIEL 3:7 |
EZIKIEL 3:8 |
EZIKIEL 3:9 |
EZIKIEL 3:10 |
EZIKIEL 3:11 |
EZIKIEL 3:12 |
EZIKIEL 3:13 |
EZIKIEL 3:14 |
EZIKIEL 3:15 |
EZIKIEL 3:16 |
EZIKIEL 3:17 |
EZIKIEL 3:18 |
EZIKIEL 3:19 |
EZIKIEL 3:20 |
EZIKIEL 3:21 |
EZIKIEL 3:22 |
EZIKIEL 3:23 |
EZIKIEL 3:24 |
EZIKIEL 3:25 |
EZIKIEL 3:26 |
EZIKIEL 3:27 |
|
|
|
|
|
|
EZIKIEL 1 / EZI 1 |
EZIKIEL 2 / EZI 2 |
EZIKIEL 3 / EZI 3 |
EZIKIEL 4 / EZI 4 |
EZIKIEL 5 / EZI 5 |
EZIKIEL 6 / EZI 6 |
EZIKIEL 7 / EZI 7 |
EZIKIEL 8 / EZI 8 |
EZIKIEL 9 / EZI 9 |
EZIKIEL 10 / EZI 10 |
EZIKIEL 11 / EZI 11 |
EZIKIEL 12 / EZI 12 |
EZIKIEL 13 / EZI 13 |
EZIKIEL 14 / EZI 14 |
EZIKIEL 15 / EZI 15 |
EZIKIEL 16 / EZI 16 |
EZIKIEL 17 / EZI 17 |
EZIKIEL 18 / EZI 18 |
EZIKIEL 19 / EZI 19 |
EZIKIEL 20 / EZI 20 |
EZIKIEL 21 / EZI 21 |
EZIKIEL 22 / EZI 22 |
EZIKIEL 23 / EZI 23 |
EZIKIEL 24 / EZI 24 |
EZIKIEL 25 / EZI 25 |
EZIKIEL 26 / EZI 26 |
EZIKIEL 27 / EZI 27 |
EZIKIEL 28 / EZI 28 |
EZIKIEL 29 / EZI 29 |
EZIKIEL 30 / EZI 30 |
EZIKIEL 31 / EZI 31 |
EZIKIEL 32 / EZI 32 |
EZIKIEL 33 / EZI 33 |
EZIKIEL 34 / EZI 34 |
EZIKIEL 35 / EZI 35 |
EZIKIEL 36 / EZI 36 |
EZIKIEL 37 / EZI 37 |
EZIKIEL 38 / EZI 38 |
EZIKIEL 39 / EZI 39 |
EZIKIEL 40 / EZI 40 |
EZIKIEL 41 / EZI 41 |
EZIKIEL 42 / EZI 42 |
EZIKIEL 43 / EZI 43 |
EZIKIEL 44 / EZI 44 |
EZIKIEL 45 / EZI 45 |
EZIKIEL 46 / EZI 46 |
EZIKIEL 47 / EZI 47 |
EZIKIEL 48 / EZI 48 |