1 |
Okwu Lemuel, bú eze; ibu eboro ya nke nne-ya ji dọ ya aka na nti. |
2 |
Gini, nwam? gini kwa, nwa nke afọm? Gini kwa, nwa nke nkwa nile m'kwere? |
3 |
Enyela ndinyom ike-gi, Enye-kwa-la ihe nēbibi ndi-eze uzọ-gi nile. |
4 |
Ka ndi-eze ghara iṅu manya-vine, Lemuel, ka ndi-eze ghara iṅu manya-vine; Ka ndi-isi ghara kwa isi, Òle ebe ka ihe-ọṅuṅu nke nābà n'anya di? |
5 |
Ka ha we ghara iṅu, we chezọ ukpuru atọrọ, We b͕anwe ikpé nke ndi nile ewedara n'ala. |
6 |
Nyenu onye nāla n'iyì ihe-ọṅuṅu nābà n'anya, Nye-kwa-nu ndi nkpuru-obi-ha di ilu manya-vine: |
7 |
Ya ṅua, we chezọ ob͕eye ọ bu, Ghara kwa icheta ọnọdu ọjọ ya ọzọ. |
8 |
Saghere onye-ob͕i ọnu-gi, N'okwu-ikpe nke ndi nile nāla n'iyì. |
9 |
Saghe ọnu-gi, kpe ikpe n'ezi omume, Kpeputa kwa onye ewedara n'ala na ob͕eye. |
10 |
Nwayi nke nējide onwe-ya nke-ọma, ònye gāchọputa ya? N'ihi na ọnu-ahia-ya kariri ruby nke-uku. |
11 |
Obi di-ya atukwasiwo ya obi, Ọ dighi kwa ihe-nkwata nākọ nwoke ahu. |
12 |
Nwayi ahu emesowo ya ezi ihe, ọ bughi kwa ihe ọjọ, Ubọchi nile nke ndu-ya. |
13 |
Ọ chọwo aji-anu na flax, We nālu ọlu nātọ aka-ya abua utọ. |
14 |
Ọ di ka ub͕ọ onye-ahia; Site n'ebe di anya ka ọ nēweta nri-ya. |
15 |
O nēbili kwa mb͕e abali nādi kwa, We nye ulo-ya nri, Nye kwa umu-ab͕ọghọ-ya òkè-ha. |
16 |
O zuwo izùzù ọhia, we nweta ya: Site n'ihe aka-ya abua lutara ka ọ kuworo ubi-vine. |
17 |
O kewo ike n'úkwù-ya dika ihe-ọkiké, Me kwa ka ogwe-aka-ya abua nwe ume. |
18 |
Ọ matawo na ihe-ahia-ya di nma: Oriọna-ya adighi-anyu n'abali. |
19 |
Aka-ya abua ka o setiworo n'osisi ikuku ogho, Ọbu-aka-ya abua ejidesiwo kwa ozele ike. |
20 |
Ọbu-aka-ya ka ọ b͕asapuworo nye onye ewedara n'ala; E, aka-ya abua ka o setiworo rue ob͕eye aru. |
21 |
Ọ dighi-atu egwu snow, na ọ gēme ulo-ya ihe; N'ihi na ulo-ya nile nēyi uwe uhie. |
22 |
Ákwà-nb͕abá mara nma ka ọ kpaworo onwe-ya; Ezi ákwà ọcha na ákwà ododo ka uwe-ya bu. |
23 |
Onye amara n'ọnu-uzọ-ama ka di-ya bu, Mb͕e ọ nānọdu n'etiti ndi-okenye ala. |
24 |
Uwe ákwà ọcha ka nwayi ahu kpaworo, we re ya; Ihe-ọkiké ka ọ nyeworo onye-ahia. |
25 |
Ike na ima-nma bu uwe-oyiyi-ya; Ọ nāchì kwa ubọchi di n'iru ọchì. |
26 |
Ọnu-ya ka ọ sagheworo n'amam-ihe; Iwu nke ebere dikwasi kwa n'ire-ya. |
27 |
Ọ nēche ojije nile nke èzí-na-ulo-ya nche nke-ọma, Ọ bughi kwa nri ume-ngwu ka o nēri. |
28 |
Umu-ya ebiliwo, kpọ ya nwayi ihe nāgara nke-ọma; Di-ya kwa, o nēto kwa ya, si: |
29 |
Ọtutu umu-ndinyom emewo omume kwesiri ndinyom nējide onwe-ha nke-ọma, Ma gi onwe-gi kachasi ha nile. |
30 |
Amara bu ugha, ima-nma bu kwa ihe-efu: Ma nwayi nke nātu egwu Jehova, nwayi ahu gēnwe otuto |
31 |
Nyenu ya ihe sitere na nke aka-ya abua lutara; Ka ọlu-ya nile to kwa ya n'ọnu-uzọ-ama nile.
|
Igbo Bible 2006 |
© Bible Society of Nigeria © 1906, 2006 |
|
|
|
|
|
|
|
|
|
|
ILU 31:1 |
ILU 31:2 |
ILU 31:3 |
ILU 31:4 |
ILU 31:5 |
ILU 31:6 |
ILU 31:7 |
ILU 31:8 |
ILU 31:9 |
ILU 31:10 |
ILU 31:11 |
ILU 31:12 |
ILU 31:13 |
ILU 31:14 |
ILU 31:15 |
ILU 31:16 |
ILU 31:17 |
ILU 31:18 |
ILU 31:19 |
ILU 31:20 |
ILU 31:21 |
ILU 31:22 |
ILU 31:23 |
ILU 31:24 |
ILU 31:25 |
ILU 31:26 |
ILU 31:27 |
ILU 31:28 |
ILU 31:29 |
ILU 31:30 |
ILU 31:31 |
|
|
|
|
|
|
ILU 1 / ILU 1 |
ILU 2 / ILU 2 |
ILU 3 / ILU 3 |
ILU 4 / ILU 4 |
ILU 5 / ILU 5 |
ILU 6 / ILU 6 |
ILU 7 / ILU 7 |
ILU 8 / ILU 8 |
ILU 9 / ILU 9 |
ILU 10 / ILU 10 |
ILU 11 / ILU 11 |
ILU 12 / ILU 12 |
ILU 13 / ILU 13 |
ILU 14 / ILU 14 |
ILU 15 / ILU 15 |
ILU 16 / ILU 16 |
ILU 17 / ILU 17 |
ILU 18 / ILU 18 |
ILU 19 / ILU 19 |
ILU 20 / ILU 20 |
ILU 21 / ILU 21 |
ILU 22 / ILU 22 |
ILU 23 / ILU 23 |
ILU 24 / ILU 24 |
ILU 25 / ILU 25 |
ILU 26 / ILU 26 |
ILU 27 / ILU 27 |
ILU 28 / ILU 28 |
ILU 29 / ILU 29 |
ILU 30 / ILU 30 |
ILU 31 / ILU 31 |