1 |
Ọziza-okwu di nrò nēme ka ọnuma laghachi azu: Ma okwu nwuta nākpali iwe. |
2 |
Ire ndi mara ihe nēme ka ihe-ọmuma di nma: Ma ọnu ndi-nzuzu nēkwuwa okwu uche b͕agọrọ ab͕agọ. |
3 |
N'ebe nile ọ bula ka anya abua nke Jehova di, Nēche ndi ọjọ na ndi bu ezi madu nche. |
4 |
Ire nke nāgwọ madu bu osisi nēnye ndu: Ma omume b͕agọrọ ab͕agọ nime ya bu ntipia nime mọ madu. |
5 |
Onye uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ nēlelì idọ-aka-na-nti nna-ya: Ma onye nāriba iba-nba ama gaghọ onye nwere ezi uche. |
6 |
N'ulo onye ezi omume ka ọtutu àkù di: Ma n'ihe-omume nke onye nēmebi iwu ka nmekpa-aru di. |
7 |
Eb͕ub͕ere-ọnu nke ndi mara ihe nēfesa ihe-ọmuma: Ma obi ndi-nzuzu adighi-eme otú a. |
8 |
Àjà ndi nēmebi iwu bu ihe-árú n'anya Jehova: Ma ekpere ndi ziri ezi bu ihe nātọ Ya utọ. |
9 |
Ihe-árú n'anya Jehova ka uzọ onye nēmebi iwu bu: Ma onye nāb͕aso ezi omume ka Ọ nāhu n'anya. |
10 |
Idọ-aka-na-nti ọjọ diri onye nārapu uzọ: Onye nākpọ iba-nba asì gānwu. |
11 |
Ala-mọ na ebe-ila-n'iyì di n'iru Jehova? Òbi umu madu gēsi aṅa ghara idi n'iru Ya? |
12 |
Ọ dighi-atọ onye nākwa emò utọ ka abara ya nba: Ọ bughi onye mara ihe ka ọ gējekuru. |
13 |
Obi nke nāṅuri ọṅu nēme ka iru di nma: Ma eji ihe-nwuta nke obi tib͕ue mọ madu. |
14 |
Obi onye-nghọta nāchọ ihe-ọmuma: Ma ọnu ndi-nzuzu nāzù onwe-ya n'uche b͕agọrọ ab͕agọ dika anu-ulo. |
15 |
Ubọchi nile nke onye ewedara n'ala jọrọ njọ: Ma onye obi-ya di nma nēri oké oriri mb͕e nile. |
16 |
Ọ di nma inwe ihe ntà n'egwu Jehova, Kari inwe ọtutu àkù ma ọb͕ub͕a-aghara adi ya. |
17 |
Ọ di nma, bú òkè ihe-oriri nke bu nání akwukwọ nri, ma ihu-n'anya di n'ebe ahu, Kari ehi azùru azù ib͕u eb͕u, ma ikpọ-asì adi ya. |
18 |
Onye-ọnuma nākpali ise-okwu: Ma onye nādighi-ewe iwe ọsọsọ nēme ka ilu-ọ̀gù di jū. |
19 |
Uzọ onye-ume-ngwu di ka ogige ogwu: Ma okporo-uzo ndi ziri ezi bu uzọ atuliri atuli. |
20 |
Nwa nke mara ihe nēme ka nna-ya ṅuria: Ma madu nzuzu nēleda nne-ya anya. |
21 |
Uche b͕agọrọ ab͕agọ buru onye obi amam-ihe kọrọ ọṅù: Ma onye-nghọta nēme ka ije-ije-ya zie ezi. |
22 |
Nmebi èchìchè nile di mb͕e ìzù nzuzo nādigh: Ma n'ọtutu ndi nādu ọdu ka ha nēguzosi ike. |
23 |
Ọṅù diri onye ọ bula n'ọziza-okwu nke ọnu-ya: Ọzọ, okwu ekwuru na mb͕e-ya, le ka o si di nma nke-uku! |
24 |
Uzọ ndu nārigo elu n'ebe onye nwere uche nọ, Ka o we si n'ala-mọ di n'okpuru wezuga onwe-ya. |
25 |
Ulo ndi-npako ka Jehova gēropu: Ma Ọ gēme ka ókè-ala nwanyi di-ya nwuru guzosie ike. |
26 |
Ihe-árú n'anya Jehova ka èchìchè ọjọ nile bu: Ma okwu-ọnu utọ nile di ọcha. |
27 |
Onye nēmekpa èzí-na-ulo nke aka ya aru ka onye akpiri urù nēzighi ezi nākpọ nku bu: Ma onye nākpọ onyinye iri-ngo asì gādi ndu. |
28 |
Obi onye ezi omume nātughari uche n'iza okwu: Ma ọnu ndi nēmebi iwu nēkwuwa ihe ọjọ di iche iche. |
29 |
Jehova di anya n'ebe ndi nēmebi iwu nọ: Ma ekpere ndi ezi omume ka Ọ nānu. |
30 |
Ihe nke nēnye anya ìhè nēme ka obi ṅuria: Ezi ihe anuru anu nēme ka ọkpukpu nile ma abuba. |
31 |
Nti nke nānu iba-nba nke ndu, N'etiti ndi mara ihe ka ọ gānọ ọnọdu-abali. |
32 |
Onye nēzere idọ-aka-na-nti nāju nkpuru-obi nke aka ya: Ma onye nānu iba-nba nēnweta obi amam-ihe. |
33 |
Egwù Jehova bu idọ-aka-na-nti nke amam-ihe; Ọ bu kwa n'iru nsọpuru ka obi ume-ala nāga.
|
Igbo Bible 2006 |
© Bible Society of Nigeria © 1906, 2006 |
|
|
|
|
|
|
|
|
|
|
ILU 15:1 |
ILU 15:2 |
ILU 15:3 |
ILU 15:4 |
ILU 15:5 |
ILU 15:6 |
ILU 15:7 |
ILU 15:8 |
ILU 15:9 |
ILU 15:10 |
ILU 15:11 |
ILU 15:12 |
ILU 15:13 |
ILU 15:14 |
ILU 15:15 |
ILU 15:16 |
ILU 15:17 |
ILU 15:18 |
ILU 15:19 |
ILU 15:20 |
ILU 15:21 |
ILU 15:22 |
ILU 15:23 |
ILU 15:24 |
ILU 15:25 |
ILU 15:26 |
ILU 15:27 |
ILU 15:28 |
ILU 15:29 |
ILU 15:30 |
ILU 15:31 |
ILU 15:32 |
ILU 15:33 |
|
|
|
|
|
|
ILU 1 / ILU 1 |
ILU 2 / ILU 2 |
ILU 3 / ILU 3 |
ILU 4 / ILU 4 |
ILU 5 / ILU 5 |
ILU 6 / ILU 6 |
ILU 7 / ILU 7 |
ILU 8 / ILU 8 |
ILU 9 / ILU 9 |
ILU 10 / ILU 10 |
ILU 11 / ILU 11 |
ILU 12 / ILU 12 |
ILU 13 / ILU 13 |
ILU 14 / ILU 14 |
ILU 15 / ILU 15 |
ILU 16 / ILU 16 |
ILU 17 / ILU 17 |
ILU 18 / ILU 18 |
ILU 19 / ILU 19 |
ILU 20 / ILU 20 |
ILU 21 / ILU 21 |
ILU 22 / ILU 22 |
ILU 23 / ILU 23 |
ILU 24 / ILU 24 |
ILU 25 / ILU 25 |
ILU 26 / ILU 26 |
ILU 27 / ILU 27 |
ILU 28 / ILU 28 |
ILU 29 / ILU 29 |
ILU 30 / ILU 30 |
ILU 31 / ILU 31 |