1 |
Nwanyi ọ bula nke mara ihe ewuwo ulo-ya: Ma nwanyi nke b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ya ji aka-ya abua akwada ya. |
2 |
Onye nēje ije n'izi-ezi-ya nātu egwu Jehova: Ma onye nēsihie n'uzọ-ya nile nēleda Ya anya. |
3 |
N'ọnu onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ya ka ome npako di: Ma eb͕ub͕ere-ọnu nke ndi mara ihe gēdebe ha. |
4 |
Mb͕e ehi nādighi, ulo anāzù ehi nādi ọcha: Ma ihe-omume riri nne nēsite n'ike ehi. |
5 |
Onye-àmà nke kwesiri ntukwasi-obi adighi-ekwu okwu-ugha: Ma onye-àmà okwu-ugha nēkupu okwu-ugha dika ume. |
6 |
Onye nākwa emò achọwo amam-ihe, ma ọ hughi ya: Ma ihe-ọmuma diri onye-nghọta nfe. |
7 |
Je na ncherita-iru onye-nzuzu, I gaghi-amata kwa eb͕ub͕ere-ọnu ihe-ọmuma n'aru ya. |
8 |
Amam-ihe onye nwere ezi uche bu ighọta uzọ-ya: Ma uche b͕agọrọ ab͕agọ nke ndi-nzuzu bu aghughọ. |
9 |
Ndi b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ha, ikpe-ọmuma nākwa emò ha: Ma n'etiti ndi ziri ezi ka ihe nātọ Chineke utọ di. |
10 |
Obi mara ilu nke aka ya; Ọ bu kwa n'ọṅù-ya ka onye nke nābughi nke ya nādighi-agwakọta onwe-ya. |
11 |
Ulo nke ndi nēmebi iwu, agēme ka ọ tọb͕orọ n'efu: Ma ulo-ikwū nke ndi ziri ezi gāma akwukwọ dika ihe akuku aku. |
12 |
Uzọ di nke ziri ezi n'iru madu, Ma nsọtu-ya bu uzọ nile nke ọnwu. |
13 |
Ọbuná n'ọchì ka ihe nēb͕u obi nb͕u; Ọzọ, ikpe-azu ọṅù bu iru-újú. |
14 |
Site n'uzọ nile nke aka ya ka afọ gēju onye laghachiworo azu n'obi: Ma ọ bu site n'onwe-ya ka afọ gēju ezi madu. |
15 |
Onye nēnweghi uche nēkwere okwu nile ọ bula: Ma onye nwere ezi uche nāghọta ije-ukwu-ya. |
16 |
Onye mara ihe nātu egwu, we si n'ihe ọjọ wezuga onwe-ya: Ma onye-nzuzu nēwebiga iwe ókè, we nātukwasi obi. |
17 |
Onye nēwe iwe ọsọsọ gēme ihe nke uche b͕agọrọ ab͕agọ: Ọzọ, onye ọbula nke nēzu nzube ọjọ di iche iche, anākpọ ya asì. |
18 |
Ndi nēnweghi uche eketawo uche b͕agọrọ ab͕agọ: Ma ndi nwere ezi uche ka anēkpube ihe-ọmuma n'isi. |
19 |
Ndi ọjọ erudawo ala n'iru ndi ezi madu; Ndi nēmebi iwu kwa n'ọnu-uzọ-ama nile nke onye ezi omume. |
20 |
Ọbuná onye-ab͕ata-obi nke ob͕eye nākpọ ya asì: Ma ndi nāhu ọgaranya n'anya di ọtutu. |
21 |
Onye nēleda madu-ibe-ya anya nēmehie: Ma onye nēmere ndi ewedara n'ala amara, onye ihe nāgara nke-ọma ka ọ bu. |
22 |
Hà adighi-akpafu, bú ndi nēchèputa ihe ọjọ? Ma ebere na ezi-okwu gādiri ndi nēchèputa ezi ihe. |
23 |
Na ndọb͕u nile nke madu nādọb͕u onwe-ya n'ọlu urù di ya: Ma okwu eb͕ub͕ere-ọnu nēdubà nání n'ihe-ikọ-ukọ. |
24 |
Okpu-eze nke ndi mara ihe bu àkù-ha: Ma uche b͕agọrọ ab͕agọ nke ndi-nzuzu bu nání uche b͕agọrọ ab͕agọ. |
25 |
Onye nānaputa nkpuru-obi di iche iche ka onye-àmà nke nēkwu ezi-okwu bu: Ma onye nēkupu ọtutu okwu-ugha dika ume nāghọ aghughọ. |
26 |
N'egwu Jehova ka ntukwasi-obi siri ike di: Umu-Ya gēnwe kwa ebe-nb͕abà. |
27 |
Egwu Jehova bu isi-iyi nke ndu, Isi n'ọnyà nile nke ọnwu wezuga onwe-gi. |
28 |
N'uba nke ndi ọ bula ka ima-nma eze di: Ma n'ukọ mba ọ bula ka nbibi onye-isi di. |
29 |
Onye nādighi-ewe iwe ọsọsọ nwere ọtutu nghọta: Ma onye nwere obi ọku nēbuli uche b͕agọrọ ab͕agọ. |
30 |
Ndu nke anu-aru ka obi agwọrọ ọria-ya bu: Ma ire-ure nke ọkpukpu nile ka ekworo bu. |
31 |
Onye nēmeb͕u onye nēnweghi ike nāta Onye kèworo ya uta: Ma onye nāsọpuru Ya ka onye nēme ob͕eye amara bu. |
32 |
Anenupu onye nēmebi iwu n'ihe ọjọ ya: Ma onye nwere ebe-nb͕abà n'ọnwu-ya ka onye ezi omume bu. |
33 |
N'obi onye-nghọta ka amam-ihe nānọgide: Ma n'etiti ndi-nzuzu ka ọ nēme ka amara ya. |
34 |
Ezi omume nēbuli mba: Ma ihe-ihere nke ndi nile di iche iche ka nmehie bu. |
35 |
Ihe orù nwere uche nātọ eze utọ: Ma nrubiga-ókè nke iwe-Ya gādi n'aru onye nēweta ihere.
|
Igbo Bible 2006 |
© Bible Society of Nigeria © 1906, 2006 |
|
|
|
|
|
|
|
|
|
|
ILU 14:1 |
ILU 14:2 |
ILU 14:3 |
ILU 14:4 |
ILU 14:5 |
ILU 14:6 |
ILU 14:7 |
ILU 14:8 |
ILU 14:9 |
ILU 14:10 |
ILU 14:11 |
ILU 14:12 |
ILU 14:13 |
ILU 14:14 |
ILU 14:15 |
ILU 14:16 |
ILU 14:17 |
ILU 14:18 |
ILU 14:19 |
ILU 14:20 |
ILU 14:21 |
ILU 14:22 |
ILU 14:23 |
ILU 14:24 |
ILU 14:25 |
ILU 14:26 |
ILU 14:27 |
ILU 14:28 |
ILU 14:29 |
ILU 14:30 |
ILU 14:31 |
ILU 14:32 |
ILU 14:33 |
ILU 14:34 |
ILU 14:35 |
|
|
|
|
|
|
ILU 1 / ILU 1 |
ILU 2 / ILU 2 |
ILU 3 / ILU 3 |
ILU 4 / ILU 4 |
ILU 5 / ILU 5 |
ILU 6 / ILU 6 |
ILU 7 / ILU 7 |
ILU 8 / ILU 8 |
ILU 9 / ILU 9 |
ILU 10 / ILU 10 |
ILU 11 / ILU 11 |
ILU 12 / ILU 12 |
ILU 13 / ILU 13 |
ILU 14 / ILU 14 |
ILU 15 / ILU 15 |
ILU 16 / ILU 16 |
ILU 17 / ILU 17 |
ILU 18 / ILU 18 |
ILU 19 / ILU 19 |
ILU 20 / ILU 20 |
ILU 21 / ILU 21 |
ILU 22 / ILU 22 |
ILU 23 / ILU 23 |
ILU 24 / ILU 24 |
ILU 25 / ILU 25 |
ILU 26 / ILU 26 |
ILU 27 / ILU 27 |
ILU 28 / ILU 28 |
ILU 29 / ILU 29 |
ILU 30 / ILU 30 |
ILU 31 / ILU 31 |