1 |
Ilu di iche iche nke Solomon. Nwa nke mara ihe nēme ka nna-ya ṅuria: Ma nwa di nzuzu bu iru-újú nne-ya. |
2 |
Àkù nke nmebi-iwu adighi-aba urù: Ma ezi omume nānaputa n'ọnwu. |
3 |
Jehova agaghi-ekwe ka agu gub͕ue nkpuru-obi onye ezi omume: Ma ọchichọ nke ndi nēmebi iwu nāchọsi ike ka Ọ nākwapu. |
4 |
Ob͕eye ka onye ji ọbu-aka ume-ngwu alu ọlu gābu: Ma aka ndi di nkọ nēme ọgaranya. |
5 |
Onye nēkpokọta na mb͕e okpom-ọku bu nwa nēnwe uche: Ma onye nāraru ura n'owuwe-ihe-ubi bu nwa nēweta ihere. |
6 |
Ngọzi nile nādiri isi onye ezi omume: Ma ihe-ike nēkpuchi ọnu ndi nēmebi iwu. |
7 |
Ncheta anēcheta onye ezi omume bu ihe-ngọzi: Ma aha ndi nēmebi iwu gēre ure. |
8 |
Ndi obi-ha mara ihe gānata ihe enyere n'iwu: Ma onye b͕agọrọ ab͕agọ n'eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua ka agākwatu. |
9 |
Onye nēje ije n'izu-okè nēje na ntukwasi-obi: Ma onye nēme ka uzọ-ya nile b͕agọ ab͕agọ, agāmara ya. |
10 |
Onye nēb͕u iku-anya nēnye ihe-nwuta: Ma onye b͕agọrọ ab͕agọ n'eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua ka agākwatu. |
11 |
Isi-iyi nke ndu ka ọnu onye ezi omume bu: Ma ime-ihe-ike nēkpuchi ọnu ndi nēmebi iwu. |
12 |
Ikpọ-asì nākpọte ise-okwu di iche iche: Ma njehie nile ka ihu-n'anya nēkpuchi. |
13 |
N'eb͕ub͕ere-ọnu nke onye nāghọta ihe ka anāchọta amam-ihe: Ma nkpa-n'aka diri azu onye obi amam-ihe kọrọ. |
14 |
Ndi mara ihe nākpakọba ihe-ọmuma: Ma ọnu onye b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ya bu nbibi di nso. |
15 |
Àkù nke ọgaranya bu obodo-ya siri ike: Nbibi nke ndi nēnweghi ike bu ob͕eye ha bu. |
16 |
Ọlu onye ezi omume nēdubà na ndu; Ihe-omume nke onye nēmebi iwu nēdubà na nmehie. |
17 |
Uzọ iru na ndu ka onye nēdebe idọ-aka-na-nti bu: Ma onye nārapu iba-nba nēme ka madu kpafue. |
18 |
Onye nēkpuchi ikpọ-asì nwere eb͕ub͕ere-ọnu okwu-ugha; Ọzọ, onye nēme ka akukọ ọjọ puta, onye ahu bu onye-nzuzu. |
19 |
N'ọtutu okwu njehie adighi-akwusi: Ma onye nēb͕ochi eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua bu onye nwere uche. |
20 |
Ọla-ọcha arọputara arọputa ka ire onye ezi omume bu: Obi ndi nēmebi iwu di ka ihe ntà. |
21 |
Eb͕ub͕ere-ọnu abua nke onye ezi omume nāzù ọtutu madu: Ma ndi b͕agọrọ ab͕agọ n'uche-ha nānwu n'ihi na obi amam-ihe kọrọ ha. |
22 |
Ngọzi Jehova, nke ahu nēme madu ọgaranya, Ọ dighi-atukwasi kwa ya ihe-nwuta. |
23 |
Ọ diri onye-nzuzu dika igwuri-egwú, bú ime ihe-nzube ọjọ: Otú a ka amam-ihe di-kwa-ra onye-nghọta. |
24 |
Ihe onye nēmebi iwu nātu ujọ ya, nke ahu gābiakute ya: Ma ihe ndi ezi omume nāchọsi ike ka agēnye ha. |
25 |
Mb͕e oké ifufe nēfebiga, onye nēmebi iwu anọghi kwa: Ma onye ezi omume bu ntọ-ala ebighi-ebi. |
26 |
Dika manya b͕ara uka si adi n'ebe ezé di, na dika anwuru-ọku si adi n'ebe anya di, Otú a ka onye-ume-ngwu nādi n'ebe ndi nēzì ya ozi nọ. |
27 |
Egwu Jehova nātukwasi ubọchi na ndu madu: Ma arọ nile nke ndi nēmebi iwu gādi nkpunkpu. |
28 |
Nchere ndi ezi omume gābu ọṅù: Ma olile-anya ndi nēmebi iwu gāla n'iyì. |
29 |
Ebe siri ike n'ebe onye zuru okè nọ ka uzọ Jehova bu; Ma ọ bu nbibi n'ebe ndi nālu ajọ ihe nọ. |
30 |
Agaghi-ewezuga onye ezi omume n'ọnọdu-ya rue mb͕e ebighi-ebi: Ma ndi nēmebi iwu agaghi-ebi n'uwa. |
31 |
Ọnu onye ezi omume nāmi amam-ihe dika nkpuru: Ma ire nke nēkwu okwu ib͕akuta Chineke azu, agēbipu ya. |
32 |
Eb͕ub͕ere-ọnu abua nke onye ezi omume mara ihe nātọ utọ: Ma ọnu ndi nēmebi iwu nēkwu okwu ib͕akuta Chineke azu.
|
Igbo Bible 2006 |
© Bible Society of Nigeria © 1906, 2006 |
|
|
|
|
|
|
|
|
|
|
ILU 10:1 |
ILU 10:2 |
ILU 10:3 |
ILU 10:4 |
ILU 10:5 |
ILU 10:6 |
ILU 10:7 |
ILU 10:8 |
ILU 10:9 |
ILU 10:10 |
ILU 10:11 |
ILU 10:12 |
ILU 10:13 |
ILU 10:14 |
ILU 10:15 |
ILU 10:16 |
ILU 10:17 |
ILU 10:18 |
ILU 10:19 |
ILU 10:20 |
ILU 10:21 |
ILU 10:22 |
ILU 10:23 |
ILU 10:24 |
ILU 10:25 |
ILU 10:26 |
ILU 10:27 |
ILU 10:28 |
ILU 10:29 |
ILU 10:30 |
ILU 10:31 |
ILU 10:32 |
|
|
|
|
|
|
ILU 1 / ILU 1 |
ILU 2 / ILU 2 |
ILU 3 / ILU 3 |
ILU 4 / ILU 4 |
ILU 5 / ILU 5 |
ILU 6 / ILU 6 |
ILU 7 / ILU 7 |
ILU 8 / ILU 8 |
ILU 9 / ILU 9 |
ILU 10 / ILU 10 |
ILU 11 / ILU 11 |
ILU 12 / ILU 12 |
ILU 13 / ILU 13 |
ILU 14 / ILU 14 |
ILU 15 / ILU 15 |
ILU 16 / ILU 16 |
ILU 17 / ILU 17 |
ILU 18 / ILU 18 |
ILU 19 / ILU 19 |
ILU 20 / ILU 20 |
ILU 21 / ILU 21 |
ILU 22 / ILU 22 |
ILU 23 / ILU 23 |
ILU 24 / ILU 24 |
ILU 25 / ILU 25 |
ILU 26 / ILU 26 |
ILU 27 / ILU 27 |
ILU 28 / ILU 28 |
ILU 29 / ILU 29 |
ILU 30 / ILU 30 |
ILU 31 / ILU 31 |