A A A A A
Facebook Instagram Twitter
Igbo Bible 2006

JOB 7



1
Ọ̀ dighi obubu-agha diri madu n'elu uwa? Ùbọchi-ya adighi ka ubọchi onye egoro ọlu?
2
Dika orù si ekusie ume ike ibà n'okpuru ǹdò, Na dika onye egoro ọlu si ele anya ugwọ-olu-ya:
3
Otú a ka emeworom ha m'keta ọtutu ọnwa nke ihe-efu, Ọtutu abali nke m'nādọb͕u onwem n'ọlu ka ha gutawo-kwa-ra nyem.
4
Ọ buru na edinam, m'si, Òle mb͕e m'gēbili? ma anyasi esetiwo onwe-ya; Afọ ejuwokwam na ntugharim rue chi-ọbubọ.
5
Anu-arum nēyi ikpuru na ob͕e ájá; Akpukpọ-arum atawo ata, we b͕aze.
6
Ubọchim di garagara kari ọ́kpà eji kpa ákwà, Ha we gwusia nenweghi olile-anya.
7
Cheta na ndum bu ifufe: Anyam agaghi-alaghachi ihu ezi ihe.
8
Anya onye nāhum agaghi-ekirim: Anya-Gi gādi n'arum, ma m'gaghi-adi.
9
Dika igwe-oji si agwusi, we la, Otú a onye nārida n'ala agaghi-arigota.
10
Ọ gaghi-alata n'ulo-ya ọzọ, Ebe-ya agaghi-amata kwa ya ọzọ.
11
Mu onwem kwa, m'gaghi-eb͕ochi ọnum; Ka m'kwue nime nkpab͕u nke mọm; Ka m'tamue ntamu n'idi-ilu nke nkpuru-obim.
12
Ọ̀ bu oké osimiri ka m'bu, ma-ọbu ogologo anu nke di n'oké osimiri, Na I nēdo ndi-nche ichem?
13
Mb͕e m'siri, Ihe m'ji dina gākasim obi, Ihe-ndinam gēbupu ntamum;
14
I we were nrọ me ka m'tua ujọ, I site-kwa-ra n'ọhù me ka m'tua egwu nke-uku:
15
Nkpuru-obim we rọputa ntọb͕u, Na ọnwu kari ọkpukpum ndia.
16
Ajuwom ndu; m'gaghi-adi ndu rue mb͕e ebighi-ebi: Rapum; n'ihi na otù nku-ume ka ubọchim nile bu.
17
Gini ka madu bu, na I nēme ya ka ọ di uku, Na I nātukwasi kwa ya obi-Gi,
18
Na I nēleta kwa ya ututu nile, Na I nānwaputa ya na mb͕e dikarisiri ntà nile?
19
Rùe ole mb͕e ka I nāgaghi-elepum anya, Ka I nāgaghi-arapum rue mb͕e m'lodara ọnu-mirim?
20
Asi na emehiewom, gini ka m'nēme Gi, Gi Onye nēche madu? N'ìhi gini ka I doworom ibu ihe-ndakwasi n'ebe I nọ, M'we ghọrọ onwem ibu?
21
Ma gini mere I nādighi-ebupu njehiem, me ka ajọ omume gabiga? N'ihi na ub͕u a m'gēdina n'ájá: I gāchọsikwam ike, ma m'gaghi-anọ.











JOB 7:1
JOB 7:2
JOB 7:3
JOB 7:4
JOB 7:5
JOB 7:6
JOB 7:7
JOB 7:8
JOB 7:9
JOB 7:10
JOB 7:11
JOB 7:12
JOB 7:13
JOB 7:14
JOB 7:15
JOB 7:16
JOB 7:17
JOB 7:18
JOB 7:19
JOB 7:20
JOB 7:21






JOB 1 / JOB 1
JOB 2 / JOB 2
JOB 3 / JOB 3
JOB 4 / JOB 4
JOB 5 / JOB 5
JOB 6 / JOB 6
JOB 7 / JOB 7
JOB 8 / JOB 8
JOB 9 / JOB 9
JOB 10 / JOB 10
JOB 11 / JOB 11
JOB 12 / JOB 12
JOB 13 / JOB 13
JOB 14 / JOB 14
JOB 15 / JOB 15
JOB 16 / JOB 16
JOB 17 / JOB 17
JOB 18 / JOB 18
JOB 19 / JOB 19
JOB 20 / JOB 20
JOB 21 / JOB 21
JOB 22 / JOB 22
JOB 23 / JOB 23
JOB 24 / JOB 24
JOB 25 / JOB 25
JOB 26 / JOB 26
JOB 27 / JOB 27
JOB 28 / JOB 28
JOB 29 / JOB 29
JOB 30 / JOB 30
JOB 31 / JOB 31
JOB 32 / JOB 32
JOB 33 / JOB 33
JOB 34 / JOB 34
JOB 35 / JOB 35
JOB 36 / JOB 36
JOB 37 / JOB 37
JOB 38 / JOB 38
JOB 39 / JOB 39
JOB 40 / JOB 40
JOB 41 / JOB 41
JOB 42 / JOB 42