1 |
Job we za, si, |
2 |
Nurunu okwum nke-ọma; Ka nka buru kwa nkasi-obi-nnu. |
3 |
Nagidenum, mu onwem gēkwu kwa okwu; Ma mb͕e m'kwusiri okwu, i gāchì ọchì. |
4 |
Mu onwem, ọ̀ bu madu ka m'nātamuru ntamu? Ma ọ buru na ọ di otú a, gini mere mọm nējighi arapu ibu ihe nādighi-ewe iwe ọsọsọ? |
5 |
Chenum iru, ka ibobo nwu kwa unu n'aru, Tukwasi-kwa-nu aka n'ọnu. |
6 |
Ọ buru kwa na echetam, anam-ama jijiji, Ima-jijiji ejidewo kwa anu-arum. |
7 |
Gini mere ndi nēmebi iwu nādi ndu, Ghọ okenye, nābu kwa ndi di ike bu dìnkpà? |
8 |
Emewo ka nkpuru-ha so ha guzosie ike n'iru ha, Emewo kwa ka umu nke putara n'aru-ha guzosie ike n'anya-ha. |
9 |
Ulo-ha di n'udo pua n'oké egwu, Nkpa-n'aka Chineke adighi kwa n'aru ha. |
10 |
Oke-ehi-ya nāb͕à nne-ehi, ọ dighi-ab͕ahie; Nne-ehi-ya nāmu nwa, ọ dighi-ekwo ime. |
11 |
Ha nēzipu umu-ha nāṅu ara dika ìgwè ewu na aturu, Umu-ha nēte kwa egwú. |
12 |
Ha nēweli olu-ha n'egwú-otiti na ubọ-akwara, Nāṅuri kwa ọǹu n'olu ọ̀jà. |
13 |
Ha nāla ubọchi nile ha n'iyì n'ọdi-nma, Ma n'otù ntabi-anya ha nārida n'ala-mọ. |
14 |
Ha we si Chineke, Si n'ebe ayi nọ wezuga Onwe-gi; N'ihi na ọmuma uzọ-Gi nile atọghi ayi utọ. |
15 |
Gini bu Onye Nke puru ime ihe nile, nke ayi gābu orù-Ya? Gini ka ọ gābara ayi, ma ayi riọ Ya aririọ? |
16 |
Le, ọ bughi n'aka-ha ka ọdi-nma-ha di: Ndum-ọdu nke ndi nēmebi iwu di anya n'ebe m'nọ. |
17 |
Ùb͕ò ole ka anēmenyu oriọna ndi nēmebi iwu? Ùb͕ò ole ka nhuju-anya-ha nābiakwasi ha? Ùb͕ò ole ka Chineke nēkesa ihe-nb͕u n'iwe-Ya? |
18 |
Ùb͕ò ole ka ha di ka ahihia-ọka n'iru ifufe, Na dika ib͕ob͕o-ọka nke oké ifufe nēzupu dika onye-ori? |
19 |
Unu nāsi, Chineke nēzobere umu-ya ajọ ihe-ya. Ka Ọ kwughachi onye ahu n'onwe-ya, ka o we mara ya. |
20 |
Ka anya-ya abua hu nbibi-ya, Ya ṅua ufọdu nime ọnuma nke Onye Nke puru ime ihe nile. |
21 |
N'ihi na ìhe ulo-ya gēsi aṅa tọ ya utọ mb͕e ọ nwusiri, Mb͕e ekepusiri ọnu-ọgugu ọnwa-ya nile n'etiti? |
22 |
Ọ̀ di onye gēzí Chineke ọmuma-ihe? Ebe Ya onwe-ya nēkpe ndi di elu ikpe. |
23 |
Otù onye nānwu n'ume-ya zuru okè, Mb͕e ọ nānọzu jū na n'udo: |
24 |
Ihe-ya nile juputara na miri-ara-ehi, Umi ọkpukpu-ya nile edewo kwa miri. |
25 |
Onye ọzọ nānwu n'ilu nkpuru-obi, Ọ dighi kwa mb͕e o riri ezi ihe. |
26 |
Ha abua n'otù, n'elu ájá ka ha nēdinakọ, Ikpuru nēkpuchi kwa ha. |
27 |
Le, amawom èchìchè-unu, Na nzube nile unu ji megidem ihe-ike. |
28 |
N'ihi na unu nāsi, Òle ebe ulo onye-isi di? Òle ebe ulo-ikwū nke ebe-obibi ndi nēmebi iwu di kwa? |
29 |
Ùnu ajughi ndi nāgabiga n'uzọ? Ùnu amaghi kwa ihe-iriba-ama-ha? |
30 |
Na ọ bu rue ubọchi nhuju-anya ka anēb͕ochi onye ọjọ? Na ọ bu rue ubọchi ọnuma ka anēdupu ha? |
31 |
Ònye gēgosi uzọ-ya n'iru ya? Ihe ahu kwa nke o mere, ònye gākwughachi ya? |
32 |
Ma agēburu onye ahu rue ílì, Ọ gēche kwa nche n'elu obo-ya. |
33 |
Ọkpurukpu-àjà nke ndagwurugwu gātọ ya utọ, Madu nile gādọrọ onwe-ha iso ya n'azu, Dika ndi anāpughi igu ọnu buru ya uzọ. |
34 |
Ùnu si kwa aṅa kasiem obi n'efu, Ebe nání nmekpu fọduru nime nzaghachi nile unu?
|
Igbo Bible 2006 |
© Bible Society of Nigeria © 1906, 2006 |
|
|
|
|
|
|
|
|
|
|
JOB 21:1 |
JOB 21:2 |
JOB 21:3 |
JOB 21:4 |
JOB 21:5 |
JOB 21:6 |
JOB 21:7 |
JOB 21:8 |
JOB 21:9 |
JOB 21:10 |
JOB 21:11 |
JOB 21:12 |
JOB 21:13 |
JOB 21:14 |
JOB 21:15 |
JOB 21:16 |
JOB 21:17 |
JOB 21:18 |
JOB 21:19 |
JOB 21:20 |
JOB 21:21 |
JOB 21:22 |
JOB 21:23 |
JOB 21:24 |
JOB 21:25 |
JOB 21:26 |
JOB 21:27 |
JOB 21:28 |
JOB 21:29 |
JOB 21:30 |
JOB 21:31 |
JOB 21:32 |
JOB 21:33 |
JOB 21:34 |
|
|
|
|
|
|
JOB 1 / JOB 1 |
JOB 2 / JOB 2 |
JOB 3 / JOB 3 |
JOB 4 / JOB 4 |
JOB 5 / JOB 5 |
JOB 6 / JOB 6 |
JOB 7 / JOB 7 |
JOB 8 / JOB 8 |
JOB 9 / JOB 9 |
JOB 10 / JOB 10 |
JOB 11 / JOB 11 |
JOB 12 / JOB 12 |
JOB 13 / JOB 13 |
JOB 14 / JOB 14 |
JOB 15 / JOB 15 |
JOB 16 / JOB 16 |
JOB 17 / JOB 17 |
JOB 18 / JOB 18 |
JOB 19 / JOB 19 |
JOB 20 / JOB 20 |
JOB 21 / JOB 21 |
JOB 22 / JOB 22 |
JOB 23 / JOB 23 |
JOB 24 / JOB 24 |
JOB 25 / JOB 25 |
JOB 26 / JOB 26 |
JOB 27 / JOB 27 |
JOB 28 / JOB 28 |
JOB 29 / JOB 29 |
JOB 30 / JOB 30 |
JOB 31 / JOB 31 |
JOB 32 / JOB 32 |
JOB 33 / JOB 33 |
JOB 34 / JOB 34 |
JOB 35 / JOB 35 |
JOB 36 / JOB 36 |
JOB 37 / JOB 37 |
JOB 38 / JOB 38 |
JOB 39 / JOB 39 |
JOB 40 / JOB 40 |
JOB 41 / JOB 41 |
JOB 42 / JOB 42 |