1 |
Ma emere ka Josef ridata n'Ijipt: Potifa, onye nējere Fero ozi, onye-isi nke ndi-ob͕ū, bú nwoke Ijipt, we b͕a ya n'aka ndi Ishmael, ndi mere ya ka ọ ridata n'ebe ahu. |
2 |
Jehova we nọyere Josef, ọ we buru nwoke ihe nāgara nke-ọma; ọ nọ n'ulo onye-nwe-ya, bú onye Ijipt ahu. |
3 |
Onye-nwe-ya we hu na Jehova nọyere ya, ọ hu kwa na ihe nile nke ya nēme, Jehova nēme ka ọ ga nke-ọma n'aka-ya. |
4 |
Josef we huta amara n'iru ya, we jere ya ozi: ọ me ya onye nēlekọta ulo-ya anya, ọ bu kwa ihe nile o nwere ka o tiyere n'aka-ya. |
5 |
O rue, site na mb͕e o mere ya onye-nlekọta n'ulo-ya na onye nēlekọta ihe nile ọ nwere, na Jehova gọziri ulo onye Ijipt ahu n'ihi Josef; ngọzi Jehova we dikwasi ihe nile o nwere, n'ulo na n'ọhia. |
6 |
O we rapu ihe nile o nwere n'aka Josef; ọ maghi kwa ihe ọ bula di n'aka ya, ma-ọbughi nání nri nke ya onwe-ya nēri. Josef makwara mma n'aru, ma kwa mma ile anya. |
7 |
O rue, mb͕e ihe ndia gasiri, na nwunye nke onye-nwe-ya weliri anya-ya abua lekwasi Josef, si, Ka mu na gi dina. |
8 |
Ma ọ juru, si nwunye nke onye-nwe-ya, Le, onye-nwem amaghi ihe di n'akam n'ulo, ọ bu kwa ihe nile o nwere ka o tiyeworo n'akam; |
9 |
ọ dighi uku n'ulo a kari mu onwem; o b͕ochighi kwa ihe ọ bula n'ebe m'nọ ma-ọbughi nání gi, n'ihi na gi onwe-gi bu nwunye-ya: m'gēsi kwa aṅa me oké ihe ọjọ nka, mehie megide Chineke? |
10 |
O rue, mb͕e ọ nāgwa Josef okwu kwa-ubọchi, na ọ geghi ya nti, idina nso ya, ma-ọbu inọyere ya. |
11 |
O rue, dika ubọchi ahu, na ọ bara n'ulo ije ozi-ya; ma ọ dighi onye n'etiti ndikom nke ulo ahu nọ n'ebe ahu n'ulo. |
12 |
Nwayi ahu we jide ya n'uwe-ya, si, Ka mu na gi dina; o we rapu uwe-ya n'aka-ya, b͕alaga, pua n'èzí. |
13 |
O rue, mb͕e nwayi ahu huru na ọ rapururi uwe-ya n'aka-ya, b͕apu n'èzí, |
14 |
na ọ kpọrọ ndikom ulo-ya, gwa ha okwu, si, Lenu, o mewo ka nwoke. Hibru bakute ayi ikwa ayi emò; ọ bakuterem idina-yerem, m'we kpọ nkpu n'oké olu: |
15 |
o rue, mb͕e ọ nuru na ewelirim olum kpọ nkpu, na ọ rapuru uwe-ya n'ebe m'nọ, b͕alaga, pua n'èzí. |
16 |
Nwayi ahu we debe uwe-ya n'ebe ọ nọ, rue mb͕e onye-nwe-ya batara n'ulo-ya. |
17 |
Ọ we gwa ya dika okwu ndia si di, si, Orù Hibru ahu, nke i meworo ka ọ bakute ayi, bakuterem ikwam emò: |
18 |
ma o rue, mb͕e m'weliri olum kpọ nkpu, na ọ rapuru uwe-ya n'ebe m'nọ, b͕apu n'ezí. |
19 |
O rue, mb͕e onye-nwe-ya nuru okwu nile nke nwunye-ya, nke ọ gwara ya, si, Dika ihe ndia si di ka orù-gi merem; na iwe-ya di ọku. |
20 |
Onye-nwe Josef we kuru ya, tiye ya n'ulo-nkpọrọ, bú ebe ndi-nkpọrọ nke eze Ijipt nọ n'ab͕u: o we nọ n'ebe ahu n'ulo-nkpọrọ. |
21 |
Ma Jehova nọyere Josef, me ka ebere-Ya rue ya aru, O nye ya amara n'iru onye-isi ulo-nkpọrọ ahu. |
22 |
Onye-isi ulo-nkpọrọ ahu we tiye n'aka Josef ndi-nkpọrọ nile ndi nọ n'ulo-nkpọrọ ahu; ihe ọ bula ha nēme kwa n'ebe ahu, ya onwe-ya bu onye nēme ya. |
23 |
Ọ dighi ihe ọ bula onye-isi ulo-nkpọrọ ahu nāhu nke di n'aka-ya, n'ihi na Jehova nọyere ya; ihe nke ya onwe-ya nēme, Jehova mere ka ọ ga nke-ọma.
|
Igbo Bible 2006 |
© Bible Society of Nigeria © 1906, 2006 |
|
|
|
|
|
|
|
|
|
|
JENESIS 39:1 |
JENESIS 39:2 |
JENESIS 39:3 |
JENESIS 39:4 |
JENESIS 39:5 |
JENESIS 39:6 |
JENESIS 39:7 |
JENESIS 39:8 |
JENESIS 39:9 |
JENESIS 39:10 |
JENESIS 39:11 |
JENESIS 39:12 |
JENESIS 39:13 |
JENESIS 39:14 |
JENESIS 39:15 |
JENESIS 39:16 |
JENESIS 39:17 |
JENESIS 39:18 |
JENESIS 39:19 |
JENESIS 39:20 |
JENESIS 39:21 |
JENESIS 39:22 |
JENESIS 39:23 |
|
|
|
|
|
|
JENESIS 1 / JEN 1 |
JENESIS 2 / JEN 2 |
JENESIS 3 / JEN 3 |
JENESIS 4 / JEN 4 |
JENESIS 5 / JEN 5 |
JENESIS 6 / JEN 6 |
JENESIS 7 / JEN 7 |
JENESIS 8 / JEN 8 |
JENESIS 9 / JEN 9 |
JENESIS 10 / JEN 10 |
JENESIS 11 / JEN 11 |
JENESIS 12 / JEN 12 |
JENESIS 13 / JEN 13 |
JENESIS 14 / JEN 14 |
JENESIS 15 / JEN 15 |
JENESIS 16 / JEN 16 |
JENESIS 17 / JEN 17 |
JENESIS 18 / JEN 18 |
JENESIS 19 / JEN 19 |
JENESIS 20 / JEN 20 |
JENESIS 21 / JEN 21 |
JENESIS 22 / JEN 22 |
JENESIS 23 / JEN 23 |
JENESIS 24 / JEN 24 |
JENESIS 25 / JEN 25 |
JENESIS 26 / JEN 26 |
JENESIS 27 / JEN 27 |
JENESIS 28 / JEN 28 |
JENESIS 29 / JEN 29 |
JENESIS 30 / JEN 30 |
JENESIS 31 / JEN 31 |
JENESIS 32 / JEN 32 |
JENESIS 33 / JEN 33 |
JENESIS 34 / JEN 34 |
JENESIS 35 / JEN 35 |
JENESIS 36 / JEN 36 |
JENESIS 37 / JEN 37 |
JENESIS 38 / JEN 38 |
JENESIS 39 / JEN 39 |
JENESIS 40 / JEN 40 |
JENESIS 41 / JEN 41 |
JENESIS 42 / JEN 42 |
JENESIS 43 / JEN 43 |
JENESIS 44 / JEN 44 |
JENESIS 45 / JEN 45 |
JENESIS 46 / JEN 46 |
JENESIS 47 / JEN 47 |
JENESIS 48 / JEN 48 |
JENESIS 49 / JEN 49 |
JENESIS 50 / JEN 50 |