A A A A A
Facebook Instagram Twitter
Igbo Bible 1988

NKPUGHE 9



1
Mgbe mmụọ ozi nke ise ahụ fụrụ opi ike ya, ahụrụ m otu onye si nꞌeluigwe daa nꞌala. E nyere ya ihe ntụghe ụzọ nke e ji atụghe olulu ahụ na-enweghị nsọtụ.
2
Mgbe o meghere olulu ahụ, anwụrụ ọkụ dị ukwuu sitere nꞌime ya pụta, mee ka oke ọchịchịrị kpuchie ihu anyanwụ. Iku ụme adịkwaghị mfe nye mmadụ ọ bụla nꞌihi anwụrụ ọkụ ahụ.
3
Nꞌotu oge ahụ, e mere ka igurube dị ukwuu, nke a na-apụghị ịgụta ọnụ site nꞌime anwụrụ ọkụ ahụ pụta. Igurube ndi a jupụtara ebe nile nꞌụwa. E nyekwara ha ike ịgba mmadụ ọ bụla dị ka akpị.
4
E nyere ha iwu si ha emebila ahịhịa ndụ ọ bụla, ma ọ bụ osisi na ihe ọ bụla a kụrụ nꞌala, dị ka ihe ubi. Kama ọrụ ha bụ ịbịakwasị mmadụ ọ bụla na-enweghị akara Chineke nꞌegedege ihu ya.
5
Iwu e nyere ha abụghị ka ha gbuo ndị mmadụ kama ọ bụ ka ha mekpaa ha ahụ ọnwa ise. Ndị ha gbara ga-anọkwa nꞌime ahụ ụfụ na nhụju anya dị ka ndị akpị gbara.
6
Nꞌime ụbọchị ndị ahụ ọtụtụ mmadụ ga-achọ iji aka ha gbuo onwe ha ma ha agaghị enwe ike mee ya. Agụụ ịnwụ ọnwụ ga-agụ ha, ma ọnwụ ga-esi nꞌebe ha nọ wezụga onwe ya.
7
Igurube ndị a nwere oyiyi dị ka inyinya a kwadebere maka ibu agha. Ha nwere ihe yiri okpu eze e ji ọlaedo kpụọ nꞌisi ha. Ihu ha dịkwa ka ihu mmadụ.
8
Agịrị isi ha dị ogologo dị ka agịrị isi ụmụ nwanyị. Eze dị ha nꞌọnụ dịkwa ka eze ọdụm.
9
Ha yikwasịrị onwe ha ihe mgbochi obi e ji igwe kpụọ. Nku ha na-eme mkpọtụ dị ka mkpọtụ a na-anụ mgbe ụsụ ndị agha na-aga ibu agha.
10
Ha nwere ọdụdụ na-agba agba dị ka akpị. Ma ike nile e nyere ha imerụ ndị mmadụ ahụ ọnwa ise dị nꞌọdụdụ ha.
11
Onye ahụ na-achịkọta ha bụ eze olulu ahụ omimi ya na-enweghị nsọtụ. Aha ya nꞌasụsụ Hiburu bụ Abadọn. Nꞌasụsụ Griik a na-akpọ ya Apọliọn. (Ma nꞌasụsụ Igbọ a ga-akpọ ya Onye mmebi.)
12
Nꞌebe a ka ihe m buru ụzọ hụ jedebere. Kama e nwekwara ụzọ ihe abụọ na-abịa, nke na-aghaghị imezu.
13
Mgbe mmụọ ozi nke isii fụrụ opi ike ya, anụrụ m olu sitere na mpi anọ ahụ dị nꞌebe ịchụ aja ahụ e jiri ọlaedo wuo, nke dị nꞌihu ocheeze Chineke,
14
gwa mmụọ ozi nke isii ahụ okwu sị, “Tọpụ mmụọ ọjọọ anọ ndị ahụ e kere agbụ nꞌebe osimiri Yufretis dị.”
15
A kwadebere ha ka ha jikere onwe ha nye afọ ahụ na ọnwa ahụ na ụbọchị ahụ, na oge ahụ a kara aka. A tọpụrụ ha ka ha gaa gbuo otu ụzọ nꞌime ụzọ atọ nke mmadụ nile bi nꞌụwa.
16
Mmụọ ọjọọ ndị ahụ du ndị agha ha ọnụ ọgụgụ ha bụ narị nde abụọ. Anụrụ m mgbe e kwuru ole ha dị.
17
Nꞌime ọhụ m, ahụrụ m inyinya ha, hụkwa ndị nọkwasịrị ha nꞌelu. Ndị nọ nꞌelu inyinya ndị a yi uwe igwe e ji ekpuchi obi, nke ụfọdụ nꞌime ha na-acha ọbara ọbara. Ụfọdụ na-acha dị ka akpụkpọ eluigwe, ụfọdụ na-acha odo odo. Ụfọdụ na-acha dị ka anwụrụ ọkụ. Isi inyinya ha dị ka isi ọdụm, anwụrụ ọkụ na ọkụ na nkume ọkụ si ha nꞌọnụ na-apụta.
18
Ọ bụ ihe ndị a na-apụta ha nꞌọnụ ka ha ji gbuo otu ụzọ nꞌime ụzọ atọ nke mmadụ nile bi nꞌụwa.
19
Ike e nyere ha iji gbuo ndị mmadụ adịghị nanị nꞌọnụ ha, kama ọ dịkwa nꞌọdụdụ ha. Nꞌihi na ọdụdụ ha dị ka agwọ. O nwere isi nke ha ji ata ndị mmadụ, wetara ha ọnwụ.
20
Ma ndị mmadụ ahụ nile e mere ka ha dịrị ndụ, ndị ọnwụ a na ihuju anya ndị a na-adakwasịghị, mechiri obi ha, jụ ịkpọ isi ala nye Chineke. Ha jụrụ ịkwụsị ife mmụọ ọjọọ ofufe. Ha jụkwara ịkwụsị ife arụsị ha nile nke ha ji ọlaedo na ọlaọcha na igwe na nkume na osisi kpụọ. Chi ndị a nwere anya ma ha adịghị ahụ ụzọ, nke nwere ụkwụ, ma ha adịghị eje ije.
21
Ọ dịkwaghị mgbe ọ bụla ha chigharịrị site nꞌizu ọjọọ nke obi ha, nke igbu mmadụ na ikpere arụsị na ịkwa iko na izu ohi pụta.











NKPUGHE 9:1
NKPUGHE 9:2
NKPUGHE 9:3
NKPUGHE 9:4
NKPUGHE 9:5
NKPUGHE 9:6
NKPUGHE 9:7
NKPUGHE 9:8
NKPUGHE 9:9
NKPUGHE 9:10
NKPUGHE 9:11
NKPUGHE 9:12
NKPUGHE 9:13
NKPUGHE 9:14
NKPUGHE 9:15
NKPUGHE 9:16
NKPUGHE 9:17
NKPUGHE 9:18
NKPUGHE 9:19
NKPUGHE 9:20
NKPUGHE 9:21






NKPUGHE 1 / NKP 1
NKPUGHE 2 / NKP 2
NKPUGHE 3 / NKP 3
NKPUGHE 4 / NKP 4
NKPUGHE 5 / NKP 5
NKPUGHE 6 / NKP 6
NKPUGHE 7 / NKP 7
NKPUGHE 8 / NKP 8
NKPUGHE 9 / NKP 9
NKPUGHE 10 / NKP 10
NKPUGHE 11 / NKP 11
NKPUGHE 12 / NKP 12
NKPUGHE 13 / NKP 13
NKPUGHE 14 / NKP 14
NKPUGHE 15 / NKP 15
NKPUGHE 16 / NKP 16
NKPUGHE 17 / NKP 17
NKPUGHE 18 / NKP 18
NKPUGHE 19 / NKP 19
NKPUGHE 20 / NKP 20
NKPUGHE 21 / NKP 21
NKPUGHE 22 / NKP 22