A A A A A
Facebook Instagram Twitter
Igbo Bible 1988

NKPUGHE 21



1
Mgbe ahụ elere m anya hụ elu ụwa ọhụrụ nke osimiri na-adịghị nꞌime ya, na mbara eluigwe ọhụrụ, nꞌihi na elu ụwa mbụ na mbara eluigwe mbụ ahụ, bụ ndị dị ugbu a, adịkwaghị.
2
Mụ onwe m bụ Jọn hụkwara obodo nsọ ahụ bụ Jerusalem ọhụrụ ka o si nꞌeluigwe ebe Chineke nọ na-arịdata. Ọ bụ ihe dị ebube ma e lee ya anya. Ọ mara mma dị ka nwagbọghọ e jikwara nke ọma maka ịgba akwụkwọ ya.
3
Anụkwara m oke olu si nꞌocheeze ahụ kwuo okwu sị, “Leenụ! Ebe obibi Chineke adịla ugbu a nꞌetiti ụmụ mmadụ. Ya na ha ga-ebikwa. Ha ga-abụkwa ndị ya. Ee, nꞌezie, Chineke nꞌonwe ya ga-anọkwa nꞌetiti ha bụrụkwa Chineke ha.
4
Ọ ga-ehichapụ anya mmiri nile dị nꞌanya ha. Ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ. Ọ bụladị iru uju na ịkwa akwa na ahụhụ agaghị adịkwa. Ihe ndị a nile agabigala ruo mgbe ebighị ebi.”
5
Onye ahụ nọ nꞌocheeze ahụ gwara m okwu sị, “Lee, ana m eme ka ihe nile dị ọhụrụ. Dee ihe ndị a nꞌakwụkwọ nꞌihi na ihe m na-agwa gị ugbu a bụ ihe e kwesịrị ịtụkwasị obi, bụrụkwa eziokwu.
6
E mezuola ihe nile. Mụ onwe m bụ Mmalite na Ọgwụgwụ ihe nile. Aga m enye ndị akpịrị na-akpọ nkụ isi iyi nke mmiri ndụ, dị ka ihe onyinye.
7
Onye ọ bụla meriri ga-eketa ngọzi ndị a nile. Aga m abụkwa Chineke ya, ya onwe ya ga-abụ nwa m.
8
Ma ndị na-atụ ụjọ, ndị na-alaghachi azụ site nꞌiso m, ha na ndị na-adịghị atụkwasị m obi, na ndị na-emetọ onwe ha, na ndị ogbu mmadụ, na ndị na-akwa iko, na ndị ha na mmụọ ọjọọ na-akparịta ụka, na ndị na-ekpere arụsị, na ndị ụgha nile, ihe ha ga-eketa bụ ikpe ọmụma nke ịbanye nꞌime olulu ahụ e ji nkume na-enwụ ọkụ kwanye ọkụ.”
9
Otu nꞌime mmụọ ozi asaa ahụ wụsara ihe dị nꞌefere ha ji bịakwutere m sị m, “Soro m ka m gosi gị nwagbọghọ ahụ bụ nwụnye Nwa atụrụ ahụ.”
10
O buuru m nꞌime mmụọ buga m nꞌotu ugwu buru ibu nke ịdị elu ya dịkwa ukwuu. Site nꞌebe ahụ o gosiri m obodo nsọ ahụ bụ Jerusalem ka o si na mbara eluigwe ebe Chineke nọ na-arịdata.
11
O jupụtara nꞌebube Chineke, na-enwụ ma na-achakwa dị ka nkume dịkarịsịrị oke ọnụ ahịa, dị ka nkume jaspa, dị ka nkume kristal.
12
Mgbidi ya nile dị obosara dịkwa elu. O nwekwara ọnụ ụzọ iri na abụọ e si abanye nꞌime ya. Ọ bụkwa ndị mmụọ ozi iri na abụọ na-eche ọnụ ụzọ ndị a nche. E dekwara aha ebo iri na abụọ nke ụmụ Izirel nꞌọnụ ụzọ ama ndị a nꞌotu nꞌotu.
13
Ọnụ ụzọ atọ dị nꞌotu akụkụ mgbidi ahụ, atọ dị nꞌugwu, atọ na ndịda, atọ nꞌọwụwa anyanwụ, atọ nꞌọdịda anyanwụ.
14
Mgbidi ahụ nwere nkume iri na abụọ e ji tọọ ntọ ala ya. Nꞌelu nkume ndị a nꞌotu nꞌotu ka e dere aha ndị ozi iri abụọ nke Nwa atụrụ ahụ.
15
Mmụọ ozi ahụ ji osisi e ji atụ ihe, nke e ji ọlaedo mee, nꞌaka ya. O ji ya tụọ obodo ahụ na ọnụ ụzọ ya, na mgbidi ya.
16
Mgbe ọ tụchara ya, ọ chọpụtara na ogologo ya na obodobo ya bụ otu. Nꞌezie, o nweghị otu akụkụ nꞌime akụkụ anọ nke mgbidi a nwere ka ibe ya. Ogologo otu akụkụ nꞌime akụkụ anọ ndị a dị puku kilomita abụọ na narị kilomita anọ.
17
Mmụọ ozi ahụ tụkwara ịdị igbidi nke mgbidi ahụ chọpụta na ọ dị narị nzọ ụkwụ atọ. Mgbe mmụọ ozi a na-atụ ihe ndị a ọ na-agwa m ihe ọnụ ọgụgụ ha bụ dị ka m nwere ike ịghọta.
18
Ihe e ji rụọ mgbidi obodo ahụ bụ nkume dị oke ọnụ ahịa a na-akpọ jaspa. Ọ bụkwa ezi ọlaedo a nụchara anụcha, nke na-enwụ dị ka enyo, ka e ji rụọ obodo ahụ.
19
E ji nkume dị oke ọnụ ahịa ndị a chọọ ntọ ala mgbidi obodo ahụ mma: Ntọ ala nke mbụ, nkume a na-akpọ jaspa, ntọ ala nke abụọ nkume a na-akpọ safaia, ntọ ala nke atọ nkume a na-akpọ kaldoni, nke anọ nkume a na-akpọ emeralụdụ, nke ise nkume a na-akpọ sadonks,
20
nke isii nkume a na-akpọ sadiusu, nke asaa nkume a na-akpọ krisolait, nke asatọ nkume a na-akpọ beril, nke toolu nkume a na-akpọ topaazi, nke iri nkume a na-akpọ krisoprez, nke iri na otu nkume a na-akpọ jasint, nke iri na abụọ nkume a na-akpọ ametisiti.
21
E jikwa nkume dị oke ọnụ ahịa a na-akpọ paọl rụọ ọnụ ụzọ ama iri na abụọ ahụ. Ọnụ ụzọ ama ọ bụla ka e ji otu nkume a rụọ nꞌotu nꞌotu. Ihe e ji rụọ okporo ụzọ dị nꞌobodo ahụ bụ nanị ọlaedo a nụchara anụcha, nke na-enwụ dị ka enyo e hichaziri nke ọma.
22
O nweghị ụlọ nsọ bụla m hụrụ nꞌime obodo ahụ nꞌihi na Onyenwe anyị Chineke pụrụ ime ihe nile na Nwa atụrụ ahụ bụ ụlọ nsọ obodo ahụ nwere.
23
Ọ dịkwaghị mkpa ọ dịrị obodo ahụ ka anwụ ma ọ bụ ọnwa nye ya ìhè nꞌihi na ebube Chineke na-enye ya ìhè. Nwa atụrụ ahụ bụkwa oriọna ya.
24
Ọ bụkwa ìhè ya ga-enye mba nile dị nꞌelu ụwa ìhè. Ndị eze ụwa nile ga-abịakwa webata ebube ha nꞌime ya.
25
A naghị emechi ọnụ ụzọ obodo ahụ emechi. Ha na-eghe oghe ụbọchị nile. Abalị ọ bụla adịkwaghị nꞌebe ahụ.
26
Ebube na nsọpụrụ nke mba nile ka a ga-ewebata nꞌime ya.
27
Ọ dịkwaghị ihe ọ bụla rụrụ arụ ga-abata nꞌime ya. Otu a kwa ọ dịkwaghị onye na-eme ihe arụ, ma ọ bụ onye ụgha ga-abata nꞌime ya. Kama ndị ga-abata nꞌime ya bụ nanị ndị ahụ e dere aha ha nꞌakwụkwọ nke ndụ Nwa atụrụ ahụ.











NKPUGHE 21:1
NKPUGHE 21:2
NKPUGHE 21:3
NKPUGHE 21:4
NKPUGHE 21:5
NKPUGHE 21:6
NKPUGHE 21:7
NKPUGHE 21:8
NKPUGHE 21:9
NKPUGHE 21:10
NKPUGHE 21:11
NKPUGHE 21:12
NKPUGHE 21:13
NKPUGHE 21:14
NKPUGHE 21:15
NKPUGHE 21:16
NKPUGHE 21:17
NKPUGHE 21:18
NKPUGHE 21:19
NKPUGHE 21:20
NKPUGHE 21:21
NKPUGHE 21:22
NKPUGHE 21:23
NKPUGHE 21:24
NKPUGHE 21:25
NKPUGHE 21:26
NKPUGHE 21:27






NKPUGHE 1 / NKP 1
NKPUGHE 2 / NKP 2
NKPUGHE 3 / NKP 3
NKPUGHE 4 / NKP 4
NKPUGHE 5 / NKP 5
NKPUGHE 6 / NKP 6
NKPUGHE 7 / NKP 7
NKPUGHE 8 / NKP 8
NKPUGHE 9 / NKP 9
NKPUGHE 10 / NKP 10
NKPUGHE 11 / NKP 11
NKPUGHE 12 / NKP 12
NKPUGHE 13 / NKP 13
NKPUGHE 14 / NKP 14
NKPUGHE 15 / NKP 15
NKPUGHE 16 / NKP 16
NKPUGHE 17 / NKP 17
NKPUGHE 18 / NKP 18
NKPUGHE 19 / NKP 19
NKPUGHE 20 / NKP 20
NKPUGHE 21 / NKP 21
NKPUGHE 22 / NKP 22