1 |
Ndị enyi m m hụrụ nꞌanya, unu ekwenyela okwu nile unu nụrụ nꞌihi na mmadụ sị na ọ bụ ozi si nꞌebe Chineke nọ bịa. Kama nwapụtanụ ma ọ bụ okwu Chineke nꞌezie. Nꞌihi na ọtụtụ ndị amụma ụgha na ndị ozizi ụgha ejupụtala ebe nile. |
2 |
Ụzọ unu ga-esi mata ma okwu unu nụrụ o si nꞌaka Mmụọ Chineke bụ nke a, ọ̀ na-ekwupụta na Jisọs Kraịst Ọkpara Chineke ghọrọ mmadụ jiri anụ ahụ mmadụ bịa nꞌụwa? Ọ bụrụ na okwu ahụ kwagidere na Jisọs bịara nꞌụdị mmadụ nꞌụwa mgbe ahụ okwu ahụ bụ nke si nꞌebe Chineke nọ bịa. |
3 |
Ma ọ bụrụ na nkwusa ahụ asị na Jisọs esighị otu a bịa, ọ bụghị nke si nꞌebe Chineke nọ pụta. Ọ bụ nkwusa okwu ụgha ahụ, nke si nꞌebe onye iro Kraịst bịa. Unu anụla ihe banyere ọbịbịa ya. Ndị ozi ya jupụtara ụwa taa. |
4 |
Ma unu bụ ụmụ Chineke, ndị enyi m. Unu emeriela ndị ozizi ụgha ndị a nile. Nꞌihi na onye ahụ bi nꞌime unu dị ike karịa onye ahụ nọ nꞌụwa. |
5 |
Nꞌihi na ndị a nile si nꞌime ụwa pụta. Ya mere, ihe ha na-ekwu okwu ya bụ nanị ihe banyere ụwa. Ụwa na-aṅakwa ha ntị. |
6 |
Ma anyị bụ ụmụ Chineke, ya mere, ọ bụ nanị ndị maara Chineke ga-ege anyị ntị. Ndị ụwa agaghị ege anyị ntị nꞌihi na ha amaghị Chineke. Nke a bụkwa ụzọ anyị pụrụ isi chọpụta onye si nꞌọnụ ndị nkwusa na-ekwu okwu. Nꞌihi na ọ bụrụ na Chineke esi nꞌọnụ ha kwuo okwu ụwa agaghị anabata ya. |
7 |
Ndị enyi m, o kwesịrị ka anyị hụrịtaa onwe anyị nꞌanya nꞌihi na ịhụnanya na-esi nꞌebe Chineke nọ abịa. Ndị nile na-ahụ ibe ha nꞌanya na-egosi na ha bụ ụmụ Chineke. Ha na-egosikwa na ha na-amata Chineke nke ọma nke ọma. |
8 |
Ọ bụrụ na mmadụ adịghị ahụ ibe ya nꞌnya ọ na-ezipụta na ọ maghị onye Chineke bụ, nꞌihi na Chineke bụ ịhụnanya. |
9 |
Nꞌihi na Chineke gosiri anyị ịdị ukwuu nke ịhụnanya ya site nꞌizite Ọkpara ya ka o wetara anyị ndụ ebighị ebi site nꞌọnwụ ọ nwụrụ. |
10 |
Site nꞌihe a Chineke meere anyị, anyị na-ahụ ihe a na-akpọ ịhụ mmadụ nꞌanya nꞌezie. Ọ bụghị na anyị buru ụzọ hụ Chineke nꞌanya kama ọ bụ na Chineke nꞌonwe ya hụrụ anyị nꞌanya zite Ọkpara ya ka ọ bụrụ ihe ịjụrụ ya obi nꞌihi mmehie anyị. |
11 |
Ndị enyi m, ebe ọ bụ na Chineke si otu a hụ anyị nꞌanya, anyị kwesịrị ịhụrịta onwe anyị nꞌanya. |
12 |
Ọ bụ ezie na o nwebeghị mgbe ọ bụla anyị ji anyạ anyị hụ Chineke anya, ma ọ bụrụ na anyị ahụ ibe anyị nꞌanya, Chineke na-ebi nꞌime anyị. Ịhụnanya ya kwa na-eto eto nꞌime anyị. |
13 |
O tinyekwala Mmụọ Nsọ ya nꞌime anyị igosi anyị na o bi nꞌime anyị, na anyị bikwa nꞌime ya. |
14 |
Karịsịa, anyị ejirila anya anyị hụ Ọkpara ahụ Chineke zitere. Ugbu a anyị na-akọrọ ụwa nile na Chineke zitere Ọkpara ya ka ọ bụrụ Onye nzọpụta ụwa. |
15 |
Chineke bi nꞌime onye ọ bụla kweere, na nꞌime onye bụla meghere ọnụ ya kwupụta na Jisọs bụ Ọkpara Chineke. Onye dị otu a bikwa nꞌime Chineke. |
16 |
Anyị maara na Chineke hụrụ anyị nꞌanya nꞌihi mmetụta ịhụnanya ya metụtara anyị, na nꞌihi na anyị kweere na ya mgbe ọ gwara anyị na ọ hụrụ anyị nꞌanya. Chineke bụ ịhụnanya. Onye ọ bụla kwa na-ebi ndụ ịhụnanya na-anọgide nꞌime Chineke. Chineke nꞌonwe ya na-ebinyekwara onye dị otu a. |
17 |
Ọ bụrụ na anyị na-ebi ndụ nꞌime Kraịst, ịhụnanya anyị gaaba ụba tutuu ruo mgbe ọ ghọrọ ihe zuru oke. Mgbe ahụ ihere agaghị eme anyị nꞌụbọchị ikpe ahụ. Kama anyị ga-eji ntụkwasị obi na ọṅu guzoro nꞌihi Chineke nꞌụbọchị ahụ, nꞌihi na ọ hụrụ anyị nꞌanya dị ka anyị onwe anyị si hụ ya nꞌanya. |
18 |
Anyị adịghị atụ onye hụrụ anyị nꞌanya ụjọ. Ezi ịhụnanya o nwere nꞌebe anyị nọ na-ewezụga ụjọ ọ bụla anyị nwere banyere ihe ọ ga-eme anyị. Ọ bụrụ na anyị na-atụ ya ụjọ, o gosiri na anyị enweghị afọ ojuju na ọ hụrụ anyị nꞌanya nꞌezie. |
19 |
Ma ihe pụtara ìhè bụ na anyị hụrụ Chineke nꞌanya nꞌihi na o buru ụzọ gosi anyị na ọ hụrụ anyị nꞌanya. |
20 |
Ọ bụrụ na onye ọ bụla asị, “Ahụrụ Chineke nꞌanya,” ma nọgide na-akpọ nwanna ya asị, onye ahụ bụ nnọọ onye ụgha. Nꞌihi na ọ bụrụ na ọ hụghị nwanna ya nꞌanya, bụ onye ọ na-ahụ anya kwa ụbọchị, ọ̀ ga-esi aṅaa hụ Chineke nꞌanya bụ onye ọ na-ahụbeghị anya? |
21 |
Chineke nꞌọnwe ya kwuru sị, “Onye na-ahụ Chineke nꞌanya kwesịkwara ịhụ nwanna ya nꞌanya.”
|
Igbo Bible 1988 |
No Data |
|
|
|
|
|
|
|
|
|
|
1 JỌN 4:1 |
1 JỌN 4:2 |
1 JỌN 4:3 |
1 JỌN 4:4 |
1 JỌN 4:5 |
1 JỌN 4:6 |
1 JỌN 4:7 |
1 JỌN 4:8 |
1 JỌN 4:9 |
1 JỌN 4:10 |
1 JỌN 4:11 |
1 JỌN 4:12 |
1 JỌN 4:13 |
1 JỌN 4:14 |
1 JỌN 4:15 |
1 JỌN 4:16 |
1 JỌN 4:17 |
1 JỌN 4:18 |
1 JỌN 4:19 |
1 JỌN 4:20 |
1 JỌN 4:21 |
|
|
|
|
|
|
1 JỌN 1 / 1JỌ 1 |
1 JỌN 2 / 1JỌ 2 |
1 JỌN 3 / 1JỌ 3 |
1 JỌN 4 / 1JỌ 4 |
1 JỌN 5 / 1JỌ 5 |