1 |
Ụmụ m, ana m edere unu ihe ndị a nile ka unu si nꞌime mmehie pụta. Ọ bụrụkwanụ na onye ọ bụla nꞌime unu emee mmehie, anyị nwere Jisọs Kraịst, onye na-eguzo nꞌihu Chineke, bụ Nna anyị, arịọrọ anyị arịrịọ. Jisọs Kraịst pụrụ ime nke a nꞌihi na ọ dị ọcha bụrụkwa onye na-eme ihe na-atọ Chineke ụtọ nꞌụzọ nile. |
2 |
Jisọs bụ onye ahụ hụrụ ahụhụ nꞌihi mmehie anyị si otu a mee ka anyị bụrụ ndị nwere ike ịbịakwute Chineke. Ọ bụ Kraịst mere ka Chineke gbaghara anyị mmehie anyị nile, na mmehie ụwa nile. |
3 |
Ya mere anyị nwere ike ịmata na anyị bụ ụmụ Chineke ma ọ bụrụ na anyị na-edebe iwu e nyere anyị. |
4 |
Dị ka ọ dị, onye ọ bụla na-ekwu sị, “Abụ m onye Kraịst”, ga-eme ihe Kraịst nyere nꞌiwu. Ma onye na-akpọ onwe ya onye Kraịst ma ọ dịghị eme ihe o nyere nꞌiwu bụ onye okwu ụgha. |
5 |
Ma ndị ahụ na-edebe iwu Kraịst, ndị na-eme ihe ọ chọrọ ga-amụta otu e si ahụ Chineke nꞌanya. Nke a bụkwa ụzọ e si ama onye bụ onye nke Kraịst nꞌezie. |
6 |
Ọ bụrụ na mmadụ asị na ya bụ onye nke Kraịst, o kwesịrị ibi ndụ dị ka Kraịst si bie. |
7 |
Ụmụnna m ndị m hụrụ nꞌanya, ọ bụghị iwu ọhụrụ ka m na-enye unu idebe kama ọ bụ otu iwu ochie ahụ unu nwere site na mbụ. Ọ bụkwa otu iwu ahụ unu maara ihe banyere ya. |
8 |
Ma ọ bụ iwu na-adị ọhụrụ oge nile, nke nwekwara ike ịrụrụ unu ọrụ dị ka o si rụọra Kraịst ọrụ. Oge nile anyị na-eme ihe iwu ahụ kwuru, ya bụ ịhụ mmadụ ibe anyị nꞌanya, mgbe ahụ ka ọchịchịrị nile dị nꞌime anyị na-apụ, na-enye ìhè ọhụrụ nke ndụ a na-ebi nꞌime Kraịst ohere ka o nwupụta. |
9 |
Ya mere, ọ bụrụ na onye ọ bụla asị na ya na-ejegharị nꞌìhè Kraịst ma ọ dịghị ahụ nwanna ya nꞌime Kraịst nꞌanya onye dị otu a nọ nꞌime ọchịchịrị. |
10 |
Ma onye ọ bụla na-ahụ mmadụ ibe ya nꞌanya na-ejegharị ije ya nꞌime ìhè. Onye ahụ na-ahụ ụzọ nke ọma, matakwa ebe ọ na-eje. Ọ dịkwaghị asụ ngọngọ nꞌije ya. |
11 |
Nꞌihi na onye ọ bụla na-akpọ nwanna nꞌime Kraịst asị na-ejegharị nꞌime ọchịchịrị. Ọ makwaghị ebe ọ na-aga nꞌihi na ọchịchịrị ahụ ekpuchiela ya anya mee ka ọ hapụ ịhụkwa ụzọ. |
12 |
Ana m edere unu ihe ndị a ụmụntakịrị m nꞌihi na a gbagharala unu mmehie nile site nꞌaha Jisọs Onye nzọpụta anyị. |
13 |
Unu ndị okenye ka m na-edere ihe ndị a, nꞌihi na unu maara Kraịst, onye ahụ na-adị ndụ site na mbụ, mgbe ọ na-adịghị ihe e kere eke dị. Ọ bụkwa otu ihe ahụ ka m na-edere unu ụmụ okorọbịa, nꞌihi na unu emeriela ekwensu. Ana m edekwara unu ihe a unu ụmụntakịrị nwoke na nwanyị nꞌihi na unu anụla, kwerekwa na Chineke onye bụ Nna anyị. |
14 |
Ana m agwa unu ndị bụ nna maara Chineke ahụ na-adị ruo mgbe ebighị ebi, na-agwakwa unu ụmụ okorọbịa dị ike, ndị okwu Chineke juru obi, ndị na-emeri ekwensu nꞌọgụ ọ na-alụso unu sị |
15 |
kwụsịnụ ịhụ ụwa ọjọọ a nꞌanya, ya na ihe nile dị nꞌụwa nke unu na-ahụ anya. Nꞌihi na onye na-ahụ ihe ndị a nꞌanya na-egosi na ọ hụghị Chineke nꞌanya. |
16 |
Nꞌihi na ihe ndị a nile dị nꞌụwa, ọchịchọ ọjọọ nke mmekọrịta nwoke na nwanyị nꞌụzọ na-ekwesịghị ekwesị, na ọchịchọ ọjọọ nke ịzụkọrọ ihe nile anya hụrụ, na nganga nke akụ na ụba na-eweta, esighị nꞌebe Chineke nọ abịa, kama ha si nꞌụwa ọjọọ a bịa. |
17 |
Anyị makwaara na ụwa ga-emesịa gabiga. Ihe ọjọọ ndị a nile kwa ga-eso ya laa nꞌiyi. Ma onye ọ bụla na-edebe ihe Chineke nyere nꞌiwu ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi. |
18 |
Ụmụ m, ndị m hụrụ nꞌanya, ọgwụgwụ ụwa abịaruola. Unu anụla ihe banyere onye iro Kraịst ahụ na-abịa a na-akpọ onye na-emegide Kraịst. Nꞌezie, ọtụtụ ndị na-emegide Kraịst ejupụtala ebe nile. Nke a na-egosi anyị na ọgwụgwụ ụwa adịla nso. |
19 |
Ndị a na-emegide Kraịst ugbu a si nꞌọgbakọ anyị pụọ. A sị na ha bụ ndị na-eso Kraịst nꞌezie ha agaraghị esite nꞌọgbakọ anyị pụọ. Ma ha hapụrụ anyị pụọ igosi na o nweghị oge ha ji bụrụ ndị na-eso Kraịst. |
20 |
Ma unu adịghị ka ndị ahụ si nꞌọgbakọ anyị pụọ, nꞌihi na Mmụọ Nsọ Chineke nọ nꞌime unu. Unu amụtakwala eziokwu Chineke. |
21 |
Ya mere, anaghị m edegara unu akwụkwọ a dị ka ndị ịmụta ihe bụ ezi ozizi dị mkpa, kama ọ bụ ka m dọọ unu aka na ntị ka unu bụrụ ndị na-asa anya unu mmiri ịchọpụta ihe bụ eziokwu nꞌoge a ajọ ozizi dị. |
22 |
Ònye bụ onye okwu ụgha ahụ kachasị ndị okwu ụgha nile? Ọ bụ onye ahụ na-asị na Jisọs abụghị Kraịst ahụ. Onye dị otu a bụ onye iro Kraịst, onye na-emegide Kraịst. Nꞌihi na o kwereghị na Chineke ma ọ bụ na Jisọs Ọkpara ya. |
23 |
Ya mere, onye ọ bụla naekweghị na Kraịst enwekwaghị Chineke ma ọlị. Ma onye ahụ nwere Kraịst nwere Chineke bụ Nna. |
24 |
Ya mere, nọgidenụ nꞌokwukwe unu, dị ka e ziri unu site na mbụ. Ọ bụrụ na unu emee nke a, unu na Chineke Nna na Kraịst Ọkpara ya gaenwe ezi nnwekọ na-adịgide. |
25 |
Kraịst nꞌonwe ya ekwela anyị nkwa inye anyị ndụ ebighị ebi. |
26 |
Ana m edere unu ihe ndị a ime ka unu mara ihe banyere ndị iro ahụ na-emegide Kraịst. Nꞌihi na ha na-agbalịsi ike iduhie ndị mmadụ. |
27 |
Ma unu anatala Mmụọ Nsọ, onye bụ otite mmanụ ahụ Chineke tere unu. Mmụọ Nsọ ahụ na-ebigidekwa nꞌime unu mgbe nile izi unu ihe bụ eziokwu. Onye ozizi ọzọ adịghị unu mkpa. Nanị ya bụ onye ozizi na-ezi ihe bụ eziokwu oge nile. Mmụọ Nsọ na-agwakwa unu sị unu nọgide nꞌime Kraịst. Ya mere, unu esitekwala nꞌime ya pụta. |
28 |
Ugbu a ụmụ m, ndị m hụrụ nꞌanya, nọgidesienụ ike nꞌime Kraịst. Mgbe ọ bịara ọzọ ka obi unu bụrụ ihe kwenyesịrị ike nꞌime ya. Nꞌụzọ dị ọtu a unu agaghị abụ ndị ihere ga-eme mgbe unu hụrụ ya. Unu agaghị abụkwa ndị na-adọghachi onwe ha azụ site nꞌebe ọ nọ. |
29 |
Ebe anyị maara na Chineke bụ onye na-eme ihe ziri ezi anyị pụrụ ịsị na ndị nile na-eme ihe ziri ezi bụ ụmụ Chineke.
|
Igbo Bible 1988 |
No Data |
|
|
|
|
|
|
|
|
|
|
1 JỌN 2:1 |
1 JỌN 2:2 |
1 JỌN 2:3 |
1 JỌN 2:4 |
1 JỌN 2:5 |
1 JỌN 2:6 |
1 JỌN 2:7 |
1 JỌN 2:8 |
1 JỌN 2:9 |
1 JỌN 2:10 |
1 JỌN 2:11 |
1 JỌN 2:12 |
1 JỌN 2:13 |
1 JỌN 2:14 |
1 JỌN 2:15 |
1 JỌN 2:16 |
1 JỌN 2:17 |
1 JỌN 2:18 |
1 JỌN 2:19 |
1 JỌN 2:20 |
1 JỌN 2:21 |
1 JỌN 2:22 |
1 JỌN 2:23 |
1 JỌN 2:24 |
1 JỌN 2:25 |
1 JỌN 2:26 |
1 JỌN 2:27 |
1 JỌN 2:28 |
1 JỌN 2:29 |
|
|
|
|
|
|
1 JỌN 1 / 1JỌ 1 |
1 JỌN 2 / 1JỌ 2 |
1 JỌN 3 / 1JỌ 3 |
1 JỌN 4 / 1JỌ 4 |
1 JỌN 5 / 1JỌ 5 |