A A A A A
Facebook Instagram Twitter
Igbo Bible 1988

1 JỌN 1



1
Ihe anyị na-edere unu banyere ya bụ ihe ahụ na-adịrị ndụ site na mmalite, nke anyị nụrụ banyere ya, nke anyị jikwa anya anyị hụ, na nke aka anyị metụrụ. Anyị na-ekwu ihe banyere Okwu nke ndụ ahụ.
2
Mgbe e mere ka mmadụ nile hụ ndụ ahụ anya, anyị sokwa hụ ya. Ya mere, ihe anyị na-ekwu okwu ya, na ihe anyị na-akọrọ unu bụ banyere ndụ ebighị ebi ahụ nke ya na Nna nọ na mbụ, nke e mere ka ọ pụta ìhè nye anyị.
3
Anyị na-ekwusa banyere ihe ahụ anyị hụrụ, na nke anyị nụrụ, nꞌihi na anyị chọrọ ka unu soro anyị nwee nnwekọ, bụ nnwekọ ahụ anyị na Nna na Ọkpara ya nwekọrọ.
4
Anyị na-edere unu ihe ndị a nꞌihi ime ka ọṅụ anyị zuo oke.
5
Nke a bụ ozi ahụ anyị nụrụ site nꞌaka ya, nke anyị na-ekwusakwara unu. Chineke bụ ìhè, ọchịchịrị ọ bụla adịkwaghị nꞌime ya.
6
Ya mere ọ bụrụ na anyị asị na anyị na ya nọ nꞌezi nnwekọ ma na-ebi nꞌime ọchịchịrị, ọ bụ okwu ụgha ka anyị na-ekwu. Eziokwu nke Chineke adịkwaghị nꞌime anyị.
7
Ma ọ bụrụ na anyị na-ebi ndụ anyị nꞌihè, dị ka ya onwe ya si nọọ nꞌihè na-ebi ndụ ya, mgbe ahụ anyị na ibe anyị ga-enwe ezi nnwekọ. Jisọs Ọkpara Chineke ga-asachapụkwa anyị site na mmehie anyị nile.
8
Ma ọ bụrụ na anyị asị na anyị adịghị eme mmehie, anyị na-eme onwe anyị ndị nzuzu. Anyị na-ajụkwa ịnabata eziokwu ahụ Chineke na-ekwu banyere ndụ anyị.
9
Ma ọ bụrụ na anyị ekwupụta mmehie anyị nile nꞌihu Chineke, ọ bụ onye anyị pụrụ ịtụkwasị obi na onye na-eme ihe ziri ezi, ọ ga-agbaghara anyị mmehie anyị, sachapụkwa anyị site nꞌomume ọjọọ nile anyị mere.
10
Ọ bụrụ na anyị asị na anyị emeghị mmehie ọ bụla, anyị na-akpọ Chineke onye na-ekwu okwu ụgha, okwu ya enwekwaghị ọnọdụ nꞌime anyị.











1 JỌN 1:1
1 JỌN 1:2
1 JỌN 1:3
1 JỌN 1:4
1 JỌN 1:5
1 JỌN 1:6
1 JỌN 1:7
1 JỌN 1:8
1 JỌN 1:9
1 JỌN 1:10






1 JỌN 1 / 1JỌ 1
1 JỌN 2 / 1JỌ 2
1 JỌN 3 / 1JỌ 3
1 JỌN 4 / 1JỌ 4
1 JỌN 5 / 1JỌ 5