1 |
Ma na mgbe ochie ahụ kwa e nwere ọtụtụ ndị amụma ụgha nꞌetiti ha, dị ka a ga-esi nwee ndị ozizi ụgha nꞌetiti unu, ndị na-eweta ozizi ọjọọ nke na-eweta ịla nꞌiyi, ndị ga-agọnarị Onyenwe anyị, onye ji ọbara ya gbapụta ha. Ma ọnwụ ha ga-abụ nnọọ na mberede, ha ga-anwụchakwa ọnwụ. |
2 |
Ma nꞌihi otu ha si ebi ndụ ha ọtụtụ mmadụ ga-ekwu okwu megide ụzọ nke eziokwu ahụ. |
3 |
Ndị nkuzi ụgha a ga-esite nꞌakpịrị ego ha nwere gwa unu ihe ọ bụla, nke ga-eme ka ego unu bata ha nꞌaka. Ma ha bụ rị ndị Chineke mara ikpe kemgbe oge gara aga ọge ịla nꞌiyi ha na-abịa nso. |
4 |
Nꞌihi na Chineke ahapụghị ndị mmụọ ozi ahụ mgbe ha mehiere, kama, o weere ha kpọchie nꞌime ọkụ ala mmụọ, ebe e kere ha agbụ nꞌime ọchịchịrị na-eche ụbọchị ikpe ahụ. |
5 |
Chineke emereghị ndị ụwa mbụ ebere. O mere ka mmiri zoo, kpuchie ụwa ahụ jupụtara na ndị na-amaghị Chineke, ka ọ bụrụ nanị Noa onye gwara ndị ọgbọ ya okwu banyere omume Chineke ka o chebere ndụ, ya na mmadụ asaa ọzọ. |
6 |
Ọzọ, Chineke mara obodo Sodọm na Gomora ikpe, werekwa ọkụ rechapụ obodo ahụ, ya na ndị nile bi nꞌime ya, ime ka nke a bụrụ ihe ịma atụ nye ndị na-amaghị Chineke ihe ga-abụ ọnọdụ ha mgbe Chineke ga-ekpe ha ikpe. |
7 |
Ma nꞌoge ọ na-emebi Sodọm na Gomora, ọ napụtara Lọt site nꞌaka ọnwụ. Lọt bụ onye ezi omume, onye ndụ ọjọọ ndị obodo ahụ na-ebi wutere nke ukwuu. |
8 |
Ụbọhcị nile, ehihie na abalị, ihe ọjọọ nile ọ na-anụ, na nke o ji anya ya na-ahụ, wutere mkpụrụ obi ya nke ukwuu. |
9 |
Nke a na-egosi na Chineke maara otu o si adọpụta mụ na gị site nꞌọnwụnwa gbara anyị gburugburu. Ọ makwaara otu o si ata ndị ọjọọ ahụhụ, tutuu ruo ụbọchị ikpe ahụ. |
10 |
Nke ka nke, Chineke maara otu o si emeso ndị ahụ na-agbaso ọchịchọ rere ure nke anụ ahụ mmeso, bụ ndị ahụ jupụtara na nganga na isi ike, ndị ahụ ụjọ na-adịghị atụ ikwutọ ọ bụladị mmụọ ndị ahụ dị ike na ndị jupụtara nꞌebube nke anya na-adịghị ahụ. |
11 |
Lee, ọ bụ ezie na ndị mmụọ ozi nọ nꞌeluigwe ndị na-eguzo nꞌihu Onyenwe anyị, dị ike karịa mmadụ ndị a, ma ha adịghị eji ọnụ ha ekwulu mmụọ ndị a dị ike, na ndị dị ebube, nke ndị ozizi ụgha ndị a na-emeghe ọnụ ha ha ekwutọ. |
12 |
Ma ana m eche na ndị ozizi ụgha a bụ ndị nzuzu. Ha na-eme ihe ọ bụla ha kpebiri nꞌobi ha. Ha dị ka ụmụ anụ ọhia ndị a na-amụ nanị nꞌihi ka ndị mmadụ gbuo ha rie. Lee ka ha si ekwulu ndị dị ike ha na-aghọtaghị ihe ọ bụla banyere. A ga-alakwa ha nꞌiyi, ha na mmụọ ọjọọ nile na ike nile nke ọkụ ala mmụọ. |
13 |
Nke a ga-abụ ahụhụ dịrị ndị ozizi ụgha ahụ nꞌihi mmehie ha. Nꞌihi na ihe na-atọ ha ụtọ bụ nanị ibi ndụ nke imejupụta ihe ọjọọ ahụ nile na-agụ anụ ahụ ha agụụ. Ha bụ ndị na-ewetara unu ihe ihere mgbe ọ bụla ha so unu na-eri oriri ịhụnanya unu, nꞌihi na nꞌotu akụkụ, ha na-ebi ndụ ajọ omume. Ma ha na-eso unu ezukọ dị ka a ga-asị nꞌezie, na ha bụ ndị dị ọcha nꞌobi ha. |
14 |
O nweghị nwanyị si nꞌebe ha nọ gafee nke ha na-adịghị ele anya ọjọọ; mmehie ịkwa iko anaghị ejukwa ha afọ, nꞌihi na agụụ ime mmehie dị nꞌime ha adịghị akwụsị akwụsị. Ha maara otu ha si arafu ụmụ nwanyị ndị okwukwe ha na-esighị ike, mee ka ha soro ha mee mmehie. Ha na-azụ obi ha inwe anya ukwu. Nꞌezie, Chineke bụrụ ha ọnụ. |
15 |
Ha esitela nꞌezi ụzọ ahụ jehie, bụrụ ndị furu efu dị ka Belam, nwa Beoa onye chọrọ ime ihe ọjọọ nꞌihi ego ọ maara na ọ ga-enweta. |
16 |
Ma e mere ka Belam si nꞌụzọ ọjọọ dị otu a pụta, mgbe e mere ka inyinya ibu ya jiri olu mmadụ gwa ya okwu, baara ya mba. |
17 |
Ndị ozizi ụgha a dịkwa ka iyi tara ata nke mmiri ọ bụla na-adịghị nꞌime ya. Ha dịkwa ka igwe ojii nke oke ifufe na-efesasị nke na-adịghị ezo mmiri ọ bụla. |
18 |
Ha na-agwa ndị a ha na-eduhie okwu sị, “A zọpụtaghị unu nꞌihi ọrụ ọma unu rụrụ, ya mere ọ bụghị ihe ọjọọ ma unu gaa nꞌihu ime mmehie. Nꞌihi nzọpụta a zọpụtara unu, unu enwerela onwe unu, meenụ ihe ọ bụla dị unu mma nꞌanya.” Ma ndị ozizi a na-ezi ndị ọzọ ụzọ ha ga-esi nwere onwe ha site nꞌiwu, bụ ohu mmehie na ịla nꞌiyi nꞌonwe ha. Nꞌihi na mmadụ bụ ohu nye ihe ọ bụla na-achị ya. |
19 |
*** |
20 |
Mgbe mmadụ sitere nꞌụzọ ọjọọ nke ụwa gbapụ, nꞌihi na ọ mụtala ihe banyere Onyenwe anyị na Onye nzọpụta anyị Jisọs Kraịst, ọ ga-abụ onye ọnọdụ ya ga-ajọ njọ karịa ka ọ dị na mbụ, ma ọ bụrụ na onye ahụ emesịa bido ime mmehie, nke ga-eme ka ọ ghọọ ohu mmehie. |
21 |
Ọ gaara akara onye ahụ mma ma ọ bụrụ na o nweghị oge o ji mata ihe banyere Kraịst na ụzọ ya, karịa na ọ matara ya, mụta ihe banyere ya, mesịa gbaketa iwu ahụ nile e nyere ya azụ. |
22 |
Ọ bụrụ na ihe dị otu a emee, a ga-eji omume onye ahụ tụnyere ilu ndị a nke kwuru sị, “Nkịta gbọchaa agbọ, ọ laghachi rachaa ihe ọ gbọrọ.” “A sachaa ezi ahụ, ya eburu onwe ya tụnye nꞌunyi.”
|
Igbo Bible 1988 |
No Data |
|
|
|
|
|
|
|
|
|
|
2 PITA 2:1 |
2 PITA 2:2 |
2 PITA 2:3 |
2 PITA 2:4 |
2 PITA 2:5 |
2 PITA 2:6 |
2 PITA 2:7 |
2 PITA 2:8 |
2 PITA 2:9 |
2 PITA 2:10 |
2 PITA 2:11 |
2 PITA 2:12 |
2 PITA 2:13 |
2 PITA 2:14 |
2 PITA 2:15 |
2 PITA 2:16 |
2 PITA 2:17 |
2 PITA 2:18 |
2 PITA 2:19 |
2 PITA 2:20 |
2 PITA 2:21 |
2 PITA 2:22 |
|
|
|
|
|
|
2 PITA 1 / 2PI 1 |
2 PITA 2 / 2PI 2 |
2 PITA 3 / 2PI 3 |