1 |
Unu ndị inyom nwere di na-eruberenụ di unu isi nꞌihi na ọ bụ site na mmeso unu na-emeso ha ka ndị na-ekweghị nꞌokwu Chineke nwere ike ikwere. |
2 |
Ndụ ọma unu na-ebi pụrụ ime ka ha chegharịa karịa okwu ọnụ ọ bụla unu ga-agwa ha. |
3 |
Unu abụla ndị na-achọ ịkwa mma nke anụ ahụ nanị, ndị na-atụfu oge ijikwa ma ọ bụ iyi iyeri ma ọ bụ ihe ntị dị iche iche ma ọ bụkwanụ ndị na-achọ ka ha yie uwe ọhụrụ ma ọ bụ maa akwa ọhụrụ pụtara mgbe ọ bụla. |
4 |
Kama meenụ ka mma unu bụrụ mma si nꞌime ime unu pụta, mma ahụ na-adịghị eme agadi, mma nke mmụọ ịdị nwayọọ, ma mmụọ ịdị nsọ, mma dị oke ọnụ ahịa nꞌihu Chineke. |
5 |
Nke a bụ ụdị ịma mma a hụrụ na ndụ ndị inyom ihe ha dị Chineke mma na mgbe ochie. Ndị inyom tụkwasịrị Chineke obi, na ndị echiche ha na nzube di ha dakọtara. |
6 |
Nke a bụ ihe Sera nꞌonwe ya mere. O doro onwe ya nꞌokpuru di ya bụ Eberaham, sọpụrụ ya dị ka nna nwe ụlọ. Ugbu a ọ bụrụ na unu emee otu a, unu na-agbaso nzọ ụkwụ Sera dị ka ụmụ na-eme ezi ihe. Mgbe ahụ ịtụ egwu agaghị adịrị unu na unu ga-emejọ di unu. |
7 |
Unu bụ di na-alụ nwụnye lezienụ nwụnye unu anya nke ọma. Cheenụ echiche banyere ihe na-akpa ha mkpa nꞌihi adịghị ike ha. Nye ha ugwu ruuru ha nꞌihi na ọ bụ unu na nwụnye unu ga-abụ otu ịnata ndụ ahụ Chineke ga-enye. Ọ bụrụ na unu emesoghị ha mmeso dị ka o si kwesị Chineke agaghị aza ekpere unu. |
8 |
Ihe ọzọ m chọrọ ịgwa unu bụ nke a, nweenụ otu obi, ka ihe na-ewute ibe unu na-ewute unu. Bụrụnụ ndị nwere obi ọma na obi dị umeala. |
9 |
Unu ejila ihe ọjọọ akwụghachi ihe ọjọọ e mere unu, ma ọ bụ gwa mmadụ okwu ọjọọ mgbe ha gwara unu okwu ọjọọ. Kama kpeenụ ekpere ka Chineke gọzie ha, nꞌihi na anyị kwesịrị ịbụ ndị na-emere ndị ọzọ ebere. Chineke ga-agọzikwa unu nꞌihi ya. |
10 |
Nꞌihi na akwụkwọ nsọ kwuru sị, “Onye ọ bụla chọrọ ibi ndụ dị ụtọ, nke chọrọ ịhụ ụbọchị ọma ahụ anya, ya kwụsị ikwu okwu ọjọọ na okwu ụgha. |
11 |
Ya sitekwa nꞌajọ omume ya tụgharịa bido ime ezi ihe. Ya gbalịakwa ibi ndụ udo, ma na-agbasokwa ndụ udo. |
12 |
Nꞌihi na Chineke si nꞌelu na-ele ndị ezi omume anya mgbe nile, ọ na-egekwa ntị nꞌekpere ha, ma ọ na-ele ndị ajọ omume anya ọjọọ.” |
13 |
O nweghị onye ga-emerụ unu ahụ nꞌihi na unu na-eme ezi ihe. |
14 |
Ma a sịkwarị na ha ataa unu ahụhụ nꞌihi na unu mere ihe dị mma, ngọzi dịrị unu. Unu atụla ha egwu, ka obi gharakwa ịlọ unu mmiri. |
15 |
Na-enyenụ Chineke nsọpụrụ nꞌime obi unu. Nọọkwanụ na njikere mgbe nile iguzo kọwaara onye ọ bụla jụrụ unu ajụjụ banyere olileanya ahụ unu nwere nꞌime unu. Ma werenụ obi dị umeala na nsọpụrụ na-eme ya. |
16 |
Meenụ obi unu ka ọ dị ọcha, ka ndị na-akọ unu ọnụ na ndị na-ekwulu unu bụrụ ndị ihere ga-eme mgbe ha hụrụ na ihe ha na-ebo unu ebubo banyere ya bụ ihe ọma. |
17 |
Nꞌihi na ọ ka mma ịta ahụụ nꞌihi ọrụ ọma ma ọ bụrụ uche Chineke, karịa ịta ahụụ nꞌihi ọrụ ọjọọ. |
18 |
Nꞌihi na Kraịst nꞌonwe ya hụrụ ahụhụ nwụọ nꞌihi unu. Ọ nwụrụ ọnwụ nanị otu ugboro nꞌihi anyị nile bụ ndị mmehie. Ezi mmadụ na-emeghị ihe ọjọọ ọ bụla nwụrụ nꞌihi ndị ajọ omume, nꞌihi ime ka anyị bịa nꞌihu Chineke. Ọ bụ ezie na e gburu ya nꞌanụ ahụ ma e mere ka ọ dịrị ndụ nꞌime mmụọ ya. |
19 |
Ọ bụkwa nꞌime mmụọ ya ka ọ gara kwusaa ozi ọma nye mmụọ ndị ahụ a kpọchiri nꞌụlọ mkpọrọ. |
20 |
Nke a bụ mmụọ ndị ahụ jụrụ ime ihe Chineke chọrọ mgbe ahụ o ji ntachi obi chere ha nꞌoge ahụ Noa nọ na-ewu ụgbọ mmiri ya. Ọ bụ nanị mmadụ asatọ nꞌime ndị bi nꞌoge ahụ ka a zọpụtara site na mmiri ahụ riri ndị bi nꞌụwa. |
21 |
Nke a bụ ihe ịma atụ na-ezi anyị ihe baptizim pụtara. Mgbe e mere anyị baptizim, anyị na-egosi na a zọpụtala anyị site nꞌọnwụ na mbibi nꞌihi mbilite nꞌọnwụ Kraịst. O gosighị na e meela ka anụ ahụ anyị dịrị ọcha nꞌihi baptizim e mere anyị, kama ọ na-egosi na anyị, ndị e mere baptizim na-alọghachikwute Chineke na-arịọ ya ka ọ sachaa mmehie dị nꞌobi anyị. |
22 |
Ugbu a Kraịst nọ nꞌeluigwe. Ọ nọkwa nꞌakụkụ aka nrị Chineke. Ọ bụ ya na-achị ndị mmụọ ozi nile, ndị ọchịchị nile, na ike nile nke eluigwe.
|
Igbo Bible 1988 |
No Data |
|
|
|
|
|
|
|
|
|
|
1 PITA 3:1 |
1 PITA 3:2 |
1 PITA 3:3 |
1 PITA 3:4 |
1 PITA 3:5 |
1 PITA 3:6 |
1 PITA 3:7 |
1 PITA 3:8 |
1 PITA 3:9 |
1 PITA 3:10 |
1 PITA 3:11 |
1 PITA 3:12 |
1 PITA 3:13 |
1 PITA 3:14 |
1 PITA 3:15 |
1 PITA 3:16 |
1 PITA 3:17 |
1 PITA 3:18 |
1 PITA 3:19 |
1 PITA 3:20 |
1 PITA 3:21 |
1 PITA 3:22 |
|
|
|
|
|
|
1 PITA 1 / 1PI 1 |
1 PITA 2 / 1PI 2 |
1 PITA 3 / 1PI 3 |
1 PITA 4 / 1PI 4 |
1 PITA 5 / 1PI 5 |