1 |
Gịnị bụ ihe na-ebute ọgụ na esemokwu nꞌetiti unu? Ọ̀ bụghị ọchịchọ ọjọọ unu nwere nꞌime onwe unu? |
2 |
Ọtụtụ ihe dị nke ọ na-agụ unu agụụ inweta ma unu adịghị enweta ya. Nꞌihi ya unu na-egbu mmadụ nara ha ihe ahụ. Ọzọ, ọ bụrụ na unu ahụ ihe onye ọzọ nwere nke dị unu mma, unu na-enwe anya ukwu nꞌebe onye ahụ nọ. Ma nꞌihi na unu apụghị inweta ihe ahụ, unu na-alụ ọgụ na-ese okwu. Ma unu adịghị enweta ihe unu chọrọ nꞌihi na unu adịghị arịọ Chineke ihe ndị a. |
3 |
Ọ bụladị mgbe unu rịọrọ Chineke, ọ dịghị enye unu ihe unu rịọrọ ya nꞌihi na ihe unu chọrọ iji ihe ndị ahụ mee abụghị ezi ihe. Ọ bụ iji ha mee nanị ihe ga-atọ obi unu ụtọ. |
4 |
Ndị na-ekwesịghị ntụkwasị obi! Ọ̀ bụ na unu amaghị na unu na ụwa bụrụ enyi, unu ga-esi otu a bụrụ ndị iro Chineke? Ọ bụrụ na uche unu bụ inwe aṅụrị nꞌihe nke ụwa, unu apụghị ịbụ enyi Chineke. |
5 |
Gịnị ka unu na-eche na akwụkwọ nsọ na-ekwu mgbe e dere nꞌime ya sị, “Mmụọ Nsọ Chineke bi nꞌime anyị na-eche anyị nche ka anyị hapụ ịbụ ndị na-ekwesịghị ntụkwasị obi nꞌebe Chineke nọ?” |
6 |
Ma Chineke na-enye anyị amara anyị pụrụ isite na ya jụ ime ihe ọchịchọ ọjọọ nke obi anyị na-achọ. Nꞌihi na akwụkwọ nsọ kwuru sị, “Amara Chineke dịịrị ndị dị umeala nꞌobi, ma ọ naeguzo megide ndị na-ebuli onwe ha elu.” |
7 |
Ya mere, nyenụ Chineke onwe unu. Guzonụ megide ekwensu, ọ ga-esi nꞌebe unu nọ gbapụ. |
8 |
Bịakwụtenụ Chineke nso, ya onwe ya ga-abịakwutekwa unu nso. Kwọọnụ aka unu, ndị mmehie, ma meekwanụ ka obi unu dị ọcha. Unu abụla ndị obi abụọ. |
9 |
Ruonụ uju, tienụ aka nꞌobi nꞌọnọdụ mwute, kwaakwanụ akwa. Ka ọchị unu ghọọ ihu mgbarụ, ka iru uju werekwa ọnọdụ ịṅụrị ọṅụ ọ bụla dị nꞌime unu. |
10 |
Wedanụ onwe unu ala nꞌihu Chineke ka o nwee ike ibuli unu elu. |
11 |
Ụmụnna m, unu ekwula okwu ọjọọ megide ibe unu. Nꞌihi na onye na-ekwu okwu ọjọọ megide nwanna ya, ma ọ bụ onye na-ekpe nwanna ya ikpe, na-ekwu okwu megide iwu Chineke. Ọ na-ekpekwa iwu ahụ ikpe. |
12 |
Ọ bụ nanị otu onye dị nke na-enye ndị mmadụ iwu. Ọ bụkwa nanị otu onye ikpe dị, Chineke nꞌonwe ya. Ọ bụ nanị ya nwere ike ịzọpụta mmadụ. O nwekwara ike ịla onye ọ bụla nꞌiyi. Ma gị, nwanna m, ònye ka ị na-eche na ị bụ i ji na-ekpe nwanna gị ikpe? |
13 |
Ugbu a geenụ ntị unu bụ ndị na-asị, “Taa ma ọ bụ echi, anyị ga-aga ebe dị otu a, ma ọ bụ obodo dị otu a, ịzụ ahia na ire ahia, anyị ga-anọkwa ebe ahụ otu afọ kpaa ego.” |
14 |
Olee otu unu si mara ihe ga-eme echi? Gịnị ka unu na-eche na ndụ unu bụ? Mmadụ dị ka anwụrụ ọkụ nke a na-ahụ anya nwa oge nta, nke ikuku na-emesịa bufuo. |
15 |
Kama ihe unu ga-ekwu bụ nke a, “Ọ bụrụ na Onyenwe anyị ekwe, anyị gaadị ndụ. Anyị ga-emekwa ihe dị otu a.” |
16 |
Ma ihe unu na-eme bụ ịnya isi banyere ihe unu chọrọ ime. Ụdị ịnya isi a adịghị atọ Chineke ụtọ, nꞌihi na ha dị njọ. |
17 |
Ya mere, mmadụ ọ bụla maara ihe bụ ezi ihe ma jụ ime ya na-emehie megide Chineke.
|
Igbo Bible 1988 |
No Data |
|
|
|
|
|
|
|
|
|
|
JEMES 4:1 |
JEMES 4:2 |
JEMES 4:3 |
JEMES 4:4 |
JEMES 4:5 |
JEMES 4:6 |
JEMES 4:7 |
JEMES 4:8 |
JEMES 4:9 |
JEMES 4:10 |
JEMES 4:11 |
JEMES 4:12 |
JEMES 4:13 |
JEMES 4:14 |
JEMES 4:15 |
JEMES 4:16 |
JEMES 4:17 |
|
|
|
|
|
|
JEMES 1 / JEM 1 |
JEMES 2 / JEM 2 |
JEMES 3 / JEM 3 |
JEMES 4 / JEM 4 |
JEMES 5 / JEM 5 |