1 |
Ya mere ka anyị hapụtụ ozizi ndị ahụ a na-ezi ndị kweere na Kraịst ọhụrụ, ma ka anyị lenye anya nꞌokwu ndị ọzọ gbara ọkpụrụkpụ. Ọ kwesịghị ka anyị malitekwa tọwa ntọ ala gbasara inwe okwukwe na Chineke, na inwe nchegharị site na ndụ ọjọọ ndị ahụ na-eweta ọnwụ. |
2 |
Ọ dịghị mkpa na a ga-akụziri unu ihe banyere ime baptizim, onyinye nke Mmụọ Nsọ, mbilite nꞌọnwụ na ikpe ebighị ebi. |
3 |
Site nꞌike Chineke, anyị ga-aga nꞌihu ikwu ihe ọzọ. |
4 |
Ọ bụ ihe rara ahụ ime, ka ụfọdụ laghachikwute Chineke, ma ọ bụrụ na ha aghọtala ozi ọma ahụ, detụkwa onyinye ahụ si nꞌigwe ire. Ọ bụrụ na ndị a eketakwala oke nꞌime Mmụọ Nsọ. |
5 |
Ma ọ bụrụ na ha anụrụla ụtọ nke okwu Chineke, na ebube ọ dị bụ ike nke ụwa gaje ịbịa. |
6 |
Ọ bụrụ na ndị dị otu a ajụ Chineke, ọ rara ahụ imekwa ka ha chegharịa. Ọ pụghị ime! Ihe ha mere mgbe ha jụrụ Chineke, bụ ịkpọgide Ọkpara Chineke nꞌobe ọzọ, na imekwa ya ihe ihere nꞌihu ọha. |
7 |
Mgbe mmiri zokwasịrị ubi mmadụ, nke mere ka ubi ahụ mịa ezi mkpụrụ, Chineke agọziela ubi ahụ. |
8 |
Ma ọ bụrụ na ubi ahụ epuo nanị ogwu na ahihia, kama ịmị mkpụrụ, ubi a abaghị uru. Ihe a ga-eme ya bụ ịkpọ ya ọkụ. |
9 |
Ma echeghị m na ọ bụ unu ka okwu a dịrị ụmụnna m. Unu bụ ndị kwere ekwe, ya mere unu na-amị ezi mkpụrụ nke ya na nzọpụta unu so bịa. |
10 |
Nꞌihi na Chineke bụ onye na-ekpe ikpe ziri ezi. Olee otu ọ ga-esi chefuo ọrụ nile unu rụụrụ ya? Olee otu ọ ga-esi chefuo ịhụnanya unu gosiri nꞌihi ya site nꞌinyere ibe unu ndị kwere ekwe aka? |
11 |
Anyị chọrọ ka unu nọgide na-eme ka ịnụ ọkụ nꞌobi unu dịgide na-aga nꞌihu tutuu ruo ọgwụgwụ ndụ. Unu ga-anata ụgwọ ọrụ unu nke zuru ezu. |
12 |
Anyị achọghị ka unu bụrụ ndị umengwụ, kama na-adịnụ ka ndị ahụ ji okwukwe na ntachi obi na-anata ihe ọ bụla Chineke kwere na nkwa. |
13 |
Ihe ịma atụ bụ nkwa nke Chineke kwere Eberaham. Mgbe Chineke kwere Eberaham nkwa, ọ ṅụrụ iyi. O jiri aha ya, Chineke, ṅụọ iyi, nꞌihi na ọ dịghị onye ọzọ dị ukwuu karịa ya. |
14 |
Ọ ṅụrụ iyi sị “Nꞌezie aga m agọzi gị. Aga m eme ka ị ghọọ nna nke mba dị ukwuu.” |
15 |
Eberaham jiri ntachi obi chere tutuu Chineke emezuo nkwa ya. Eberaham nwetara nwa nwoke. |
16 |
Anyị na-eji ndị dimkpa ṅụọ iyi ka anyị mezuo nkwa anyị kwere. Nkwa e kwere nꞌụzọ dị otu a enweghị ịrụ ụka. |
17 |
Chineke jiri ịṅụ iyi kee onwe ya agbụ, ka ndị nile nwere nkwa ya hapụ inwe obi abụọ. Ha agaghị eche na Chineke ga-agbanwe ihe o zubere ime. |
18 |
Ugbu a Chineke ji ụzọ ihe abụọ nke na-enweghị mgbanwe kee onwe ya agbụ ime ka nkwa ya guzosie ike. Ọ bụ ihe na-apụghị ime eme na Chineke ga-ekwu okwu ụgha. Ya mere, anyị nwere oke ntụkwasị obi na ọ ga-echebe anyị mgbe anyị gbakwuuru ya, |
19 |
Ntụkwasị obi nchebe ebighị ebi a nke guzo chịm bụ ebe mkpụrụ obi anyị na-adabere nꞌime olileanya. Ntụkwasị obi a dị ka eriri nke jikọtara anyị na Chineke. |
20 |
Jisọs eburula anyị ụzọ laa nꞌeluigwe. Ebe ahụ ka ọ na-arịrịọ anyị arịrịọ dị ka onyeisi nchụaja anyị ruo mgbe ebighị ebi. Ọnọdụ ya dịkwa dị ka nke Melikizedeki.
|
Igbo Bible 1988 |
No Data |
|
|
|
|
|
|
|
|
|
|
HIBRU 6:1 |
HIBRU 6:2 |
HIBRU 6:3 |
HIBRU 6:4 |
HIBRU 6:5 |
HIBRU 6:6 |
HIBRU 6:7 |
HIBRU 6:8 |
HIBRU 6:9 |
HIBRU 6:10 |
HIBRU 6:11 |
HIBRU 6:12 |
HIBRU 6:13 |
HIBRU 6:14 |
HIBRU 6:15 |
HIBRU 6:16 |
HIBRU 6:17 |
HIBRU 6:18 |
HIBRU 6:19 |
HIBRU 6:20 |
|
|
|
|
|
|
HIBRU 1 / HI 1 |
HIBRU 2 / HI 2 |
HIBRU 3 / HI 3 |
HIBRU 4 / HI 4 |
HIBRU 5 / HI 5 |
HIBRU 6 / HI 6 |
HIBRU 7 / HI 7 |
HIBRU 8 / HI 8 |
HIBRU 9 / HI 9 |
HIBRU 10 / HI 10 |
HIBRU 11 / HI 11 |
HIBRU 12 / HI 12 |
HIBRU 13 / HI 13 |