1 |
Hụrịtaanụ onwe unu nꞌanya, nꞌihi na unu bụ otu nꞌime Kraịst. |
2 |
Unu echefula ịnabata ndị ọbịa, nꞌihi na ụfọdụ ndị mere nke a lekọtara ndị mmụọ ozi ma ha amataghị na ọ bụ ndị mmụọ ozi ka ha lekọtara. |
3 |
Chetanụ ndị nọ nꞌụlọ mkpọrọ dị ka a ga-asị na unu so ha nọdụ nꞌụlọ mkpọrọ. Sorokwanụ ndị a na-emegbu nwekọọ ahụhụ dị ka a ga-asị na ọ bụ unu ka a na-emegbu. |
4 |
Ọlụlụ di na nwụnye bụ ihe mmadụ nile ga-enye ugwu. Njikọta ya ka a ga-asọpụrụ. A gaghị elefuru ya anya, nꞌihi na Chineke ga-enye ndị nile na-akwa iko ahụhụ, ha na ndị nile na-adịghị asọpụrụ ahụ ha. |
5 |
Unu abụla ndị na-achọbiga ego oke ghọọ ndị na-efe ego. Ka afọ ju unu nꞌihe unu nwere. Nꞌihi na Chineke ṅụrụ iyi sị, “Agaghị m ahapụ gị. O nwekwaghị mgbe m ga-eji gbaketa gị azụ.” |
6 |
Ya mere anyị pụrụ iji nganga na-atụghị egwu kwuo sị, “Chineke bụ onye inye aka m. Agaghị m atụ egwu. Gịnị ka mmadụ pụrụ ime m?” |
7 |
Chetanụ ndị isi unu ndị wetaara unu ozi ọma Chineke. Ha bụ mkpụrụ ndụ ọma ahụ. Unu ga-ejekwa ije na nzọ ụkwụ ha, tụkwasịkwa Chineke obi dị ka ha mere. |
8 |
Jisọs Kraịst adịghị agbanwe agbanwe. Ihe ọ bụ ụnyaahụ ka ọ bụkwa taa. Nke a ka ọ ga-abụkwa ruo mgbe ebighị ebi. |
9 |
Unu ekwela ka e jiri ozizi ọhụrụ nke dịkwa iche duhie unu site nꞌịgbaso ezi ụzọ ahụ. Ọ dị mma ka e site nꞌamara mee ka mkpụrụ obi anyị bụrụ ihe dị ike, ọ bụghị site nꞌidebe iwu ụfọdụ e nwere maka iri nri. Ndị na-edebe iwu ndị a enweghị inye aka ọ bụla site na ya. |
10 |
Anyị nwere ebe ịchụ aja, ebe ndị nile na-eje ozi ha nꞌụlọ nzute ndị Juu na-enweghị ike iri aja a chụrụ nꞌelu ya. |
11 |
Dị ka iwu ndị Juu si dị, onyeisi nchụaja na-eji ọbara anụ e gburu egbu baa nꞌime ime ụlọ ikwu ahụ ịchụ aja nꞌihi mmehie. Emechaa, a na-esite nꞌime obodo wepụ ahụ anụ ndị a e gburu kpọọ ha ọkụ nꞌezi. |
12 |
Ọ bụ nke a mere Jisọs ji nwụọkwa, ma ọ bụghị nꞌime obodo. Ebe ahụ ka ọbara ya sachapụrụ mmehie anyị. |
13 |
Ya mere, ka anyị si nꞌime obodo pụọ, ka anyị pụkwuru Kraịst nꞌazụ obodo, sorokwa ya nwekọọ ihe ihere. |
14 |
Nꞌihi na ụwa abụghị ụlọ anyị, anyị na-ele anya ụlọ ebighị ebi anyị dị nꞌeluigwe. |
15 |
Site nꞌinye aka Jisọs, anyị ga-anọgide na-achụrụ Chineke aja otuto. Anyị ga-eto ya site nꞌịgwa ndị ọzọ ihe banyere ebube aha ya. |
16 |
Unu echefula iyikwasị onwe unu ịma mma dị ka uwe. Meekwanụ ka ndị nile chọrọ inye aka unu soro unu nwekọọ ihe unu nwere. Nke a bụ ụdị aja na-atọ Chineke ụtọ. |
17 |
Ruberenụ ndị isi unu isi. Gbalịanụ ime ihe ha gwara unu. Nꞌihi na ọrụ ha bụ ịhụ maka mkpụrụ obi unu. Chineke ga-ekpekwa ha ikpe dị ka ọrụ ha si dị. Ruberenụ ha isi ka ha nwee obi aṅụrị ịrụ ọrụ ha. Nꞌihi na ọ bụrụ na ha ejiri ihu mgbarụ rụọ ọrụ ha, ọrụ ha agaghị abara unu uru. |
18 |
Kpeerenụ anyị ekpere nꞌihi na akọnuche anyị amaghị anyị ikpe. Anyị chọkwara ibi ndụ anyị nꞌime nkwanye ugwu nꞌihe nile. |
19 |
Eji m nwayọọ na-arịọ unu ka unu kpeere m ekpere, ka m nwee ike ịlọghachikwute unu ọsịịsọ. |
20 |
Ugbu a ka Chineke ahụ na-enye udo, Chineke ahụ sitere nꞌọbara ọgbụgba ndụ ebighị ebi ahụ kpọghachite Onyenwe anyị Jisọs Onye ọzụzụ atụrụ ukwuu ahụ ndụ site nꞌọnwụ |
21 |
nye unu ihe ọma nile unu chọrọ, nke ga-enyere unu aka ime uche ya. Ka Chineke mejupụta nꞌime unu ihe ndị ahụ nile na-atọ ya ụtọ site na Jisọs Kraịst. Ka otuto dịrị Kraịst ruo mgbe nile ebighị ebi. Amin. |
22 |
Ụmụnna m bikonụ werenụ ntachi obi nụrụ okwu agbamume m gwara unu nꞌime akwụkwọ mkpụmkpụ a. |
23 |
Ezi ụmụnna m, ana m eme ka unu mata na nwanna anyị Timoti esitela nꞌụlọ mkpọrọ pụta. Mụ na ya ga-esoro bịa leta unu ma ọ bụrụ na ọ bịa nꞌebe a na mgbe na-adịghị anya. |
24 |
Kelerenụ m ndị isi unu nile na ndị ọzọ bụ ndị kwere ekwe nọ nꞌebe ahụ. Ndị kwere ekwe si Itali na-ezitere unu ekele ha. |
25 |
Ka amara Chineke dịnyere unu nile.
|
Igbo Bible 1988 |
No Data |
|
|
|
|
|
|
|
|
|
|
HIBRU 13:1 |
HIBRU 13:2 |
HIBRU 13:3 |
HIBRU 13:4 |
HIBRU 13:5 |
HIBRU 13:6 |
HIBRU 13:7 |
HIBRU 13:8 |
HIBRU 13:9 |
HIBRU 13:10 |
HIBRU 13:11 |
HIBRU 13:12 |
HIBRU 13:13 |
HIBRU 13:14 |
HIBRU 13:15 |
HIBRU 13:16 |
HIBRU 13:17 |
HIBRU 13:18 |
HIBRU 13:19 |
HIBRU 13:20 |
HIBRU 13:21 |
HIBRU 13:22 |
HIBRU 13:23 |
HIBRU 13:24 |
HIBRU 13:25 |
|
|
|
|
|
|
HIBRU 1 / HI 1 |
HIBRU 2 / HI 2 |
HIBRU 3 / HI 3 |
HIBRU 4 / HI 4 |
HIBRU 5 / HI 5 |
HIBRU 6 / HI 6 |
HIBRU 7 / HI 7 |
HIBRU 8 / HI 8 |
HIBRU 9 / HI 9 |
HIBRU 10 / HI 10 |
HIBRU 11 / HI 11 |
HIBRU 12 / HI 12 |
HIBRU 13 / HI 13 |